Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 11/15 p. 8-13
  • “Ònye Dị Ka Jehova, Bụ́ Chineke Anyị?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ònye Dị Ka Jehova, Bụ́ Chineke Anyị?”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwukwe na Otuto Kwesịrị Ekwesị
  • Toonụ Ja!
  • Jehova Enweghị Atụ
  • Jehova Dị Ọmịiko
  • Ihe Nnwapụta nke Ịdị Iche Jehova
  • N’adịghị ka Chi Arụsị Dị Iche Iche
  • Àgwà Ndị Dị Ebube nke Jehova
  • Jehova Kwesịrị Inweta Otuto Ebighị Ebi
  • Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Ise nke Akwụkwọ Abụ Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ndị E Doro Iche Ịbụ Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto n’Ụwa Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Toonụ Jehova Maka Ihe Ukwu Dị Iche Iche Ọ Na-eme!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Abụ Ọma
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 11/15 p. 8-13

“Ònye Dị Ka Jehova, Bụ́ Chineke Anyị?”

“Ònye dị ka Jehova, bụ́ Chineke anyị? Nke na-eme onwe ya ka ọ dị elu ịnọdụ ka eze.”—ABỤ ỌMA 113:5.

1, 2. (a) Olee otú Ndịàmà Jehova si ele Chineke na Bible anya? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa kwesịrị ka anyị tụlee?

NDỊ na-eto Jehova bụ ndị a gọziri agọzi n’ezie. Lee oké ihe ùgwù ọ bụ isonye n’ìgwè ndị obi ụtọ nke a! Dị ka Ndịàmà ya, anyị na-anakwere ndụmọdụ, iwu, nkụzi, nkwa, na amụma nile nke Okwu Chineke, bụ́ Bible. Anyị nwere ọṅụ ịmụta ihe site n’Akwụkwọ Nsọ na ịbụ ndị “Chineke ziworo ihe.”—Jọn 6:45.

2 N’ihi nsọpụrụ ofufe dị omimi ha nwere maka Chineke, Ndịàmà Jehova pụrụ ịjụ, sị: “Ònye dị ka Jehova, bụ́ Chineke anyị?” (Abụ Ọma 113:5) Okwu ndị ahụ onye ọbụ abụ kwuru metụtara okwukwe. Ma n’ihi gịnị ka Ndịàmà ji nwee okwukwe dị otú ahụ na Chineke? Oleekwa ihe ndị mere ha ji na-eto Jehova?

Okwukwe na Otuto Kwesịrị Ekwesị

3. Gịnị bụ Abụ Ọma Hallel ndị ahụ, n’ihi gịnịkwa ka e ji kpọọ ha aha ahụ?

3 Okwukwe na Jehova bụ ihe a chọrọ n’ihi na ọ bụ Chineke pụrụ iche. E mesiri nke a ike n’Abụ Ọma 113, 114, na 115, akụkụ nke Abụ Ọma Hallel isii ahụ. Dị ka Ụlọ Akwụkwọ Hillel nke ndị rabaị na-ekwu, a bụrụ Abụ Ọma 113 na 114 n’oge oriri Ememe Ngabiga ndị Juu mgbe a wụpụtara iko nke abụọ nke mmanya, a kọwaakwa ihe ememe ahụ pụtara. A bụrụ Abụ Ọma 115 ruo 118 mgbe iko nke anọ nke mmanya gasịrị. (Tụlee Matiu 26:30.) A kpọrọ ha “Abụ Ọma Hallel” n’ihi na ugboro ugboro ha jiri mkpu ahụ bụ Haleluja!—‘Toonụ Ja!’ mee ihe.

4. Gịnị ka okwu ahụ bụ “Haleluya” pụtara, ugbo olekwa ka ọ pụtara na Bible?

4 “Haleluja!” bụ ndegharị gaa n’asụsụ ọzọ nke okwu Hibru pụtara 24 ugboro n’Abụ Ọma. N’ebe ndị ọzọ na Bible, ụdị ya nke Grik pụtara ugboro anọ n’ihe banyere ọṅụ e nwere n’ihi mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, na ọṅụ nke e jikọrọ ya na Jehova Chineke ịmalite ịchị achị dị ka Eze. (Mkpughe 19:1-6) Ka anyị na-atụle ugbu a atọ n’ime Abụ Ọma Halel ndị ahụ, anyị pụrụ nnọọ iche echiche banyere onwe anyị ịdị na-abụ abụ ndị a maka otuto Jehova.

Toonụ Ja!

5. Olee ajụjụ Abụ Ọma 113 na-aza, ònyekwa ka ihe e nyere n’iwu n’Abụ Ọma 113:1, 2 metụtara karịsịa?

5 Abụ Ọma 113 na-aza ajụjụ ahụ bụ, N’ihi gịnị ka a ga-eji too Jehova? Ọ na-emeghe site n’ihe e nyere n’iwu bụ: “Toonụ Ja. Toonụ, unu ndị ohu Jehova, Toonụ aha Jehova. Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 113:1, 2) “Haleluja!” Ee, ‘Toonụ Ja!’ Ihe ahụ e nyere n’iwu metụtara karịsịa ndị Chineke n’ime “mgbe ọgwụgwụ” nke a. (Daniel 12:4) Site ugbu a ruokwa mgbe nile ebighị ebi, a ga-ebuli aha Jehova elu n’ụwa nile. Ndịàmà ya na-akpọsa na Jehova bụ Chineke, Kraịst bụ Eze, e guzobewokwa Alaeze ahụ n’eluigwe. Setan bụ Ekwensu na nzukọ ya apụghị igbochi otuto nke a a na-eto Jehova.

6. Olee otú e si na-eto Jehova ‘site n’ọwụwa anyanwụ ruo ọdịda anyanwụ’?

6 Abụ otuto ga-anọgide na-ada ruo mgbe Jehova mere ka o jupụta ụwa. “Site n’ọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya aha Jehova ga-abụ ihe a na-eto eto.” (Abụ Ọma 113:3) Nke a pụtara ihe karịrị ofufe kwa ụbọchị nke ụfọdụ ihe ndị e kere eke n’ụwa na-efe. Anyanwụ na-awa n’ebe ọwụwa anyanwụ ma na-ada n’ebe ọdịda anyanwụ, na-ekpuchite ụwa nile. N’ebe nile anyanwụ na-amụke, n’isi nso ndị nile a tọhapụrụ n’agbụ nye okpukpe ụgha na nzukọ Setan ga-eto aha Jehova. N’ezie, abụ nke a nke ọ na-adịghị mgbe ọ ga-akwụsị akwụsị bụ nke Ndịàmà Jehova e tere mmanụ na ndị ga-abụ ụmụ elu ala nke Eze ya bụ Jisọs Kraịst, na-abụ ugbu a. Lee oké ihe ùgwù ha nwere dị ka ndị na-abụku Jehova abụ otuto!

Jehova Enweghị Atụ

7. Akụkụ abụọ dị aṅaa nke ọkaaka Jehova ka e zoro aka na ha n’Abụ Ọma 113:4?

7 Onye ọbụ abụ ahụ kwukwara, sị: “Jehova dị elu n’elu mba nile, n’elu eluigwe ka ebube ya dị.” (Abụ Ọma 113:4) Nke a na-elebara akụkụ abụọ nke ịkachasị dị elu nke Jehova anya: (1) Nye Jehova, Onye Kachasị Ihe Nile Elu, “dị elu n’elu mba nile,” ha dị ka otu ntụ mmiri site n’ite mmiri na dị ka uzuzu nke ihe ọ̀tụ̀tụ̀; (Aịsaịa 40:15; Daniel 7:18) (2) ebube ya dị elu nke ukwuu karịa nke eluigwe nkịtị, n’ihi na ndị mmụọ ozi na-eme uche ya kasị elu.—Abụ Ọma 19:1, 2; 103:20, 21.

8. N’ihi gịnị, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Jehova na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị anya n’ihe ndị na-eme n’eluigwe na n’ụwa?

8 N’ihi ịbụ onye ịdị elu Chineke kpaliri, onye ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ònye dị ka Jehova, bụ́ Chineke anyị? Nke na-eme onwe ya ka ọ dị elu ịnọdụ dị ka eze, nke na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya.” (Abụ Ọma 113:5, 6) Chineke dị elu nke ukwuu nke na ọ ghaghị ime onwe ya ka ọ dị ala iji hụ ihe ndị na-eme n’eluigwe na n’elu ụwa. Ọ bụ ezie na Jehova adịghị ala karịa onye ọ bụla ma ọ bụ nọrọ n’okpuru ndị ọzọ, ọ na-egosi ịdị umeala n’obi n’igosi ebere na ọmịiko n’ebe ndị mmehie dị ala nọ. Inye Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, dị ka “ihe ịjụrụ Chineke obi” maka ndị Kraịst e tere mmanụ na maka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ ngosipụta nke ịdị umeala n’obi Jehova.—1 Jọn 2:1, 2.

Jehova Dị Ọmịiko

9, 10. Olee otú Chineke si ‘ebuli ogbenye elu, ime ka o soro ndị a maara aha ha nọkọọ’?

9 Imesi ọmịiko Chineke ike, onye ọbụ abụ ahụ kwukwasịrị na Jehova ‘bụ onye na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie, ọ na-esi n’ebe ikpofu ahịhịa bulie ogbenye elu; ime ka ya na ndị a maara aha ha nọkọọ, ka ya na ndị a maara aha ha n’etiti ndị ya nọkọọ. Ọ bụ onye na-eme ka nwanyị àgà nke ụlọ biri n’ezinụlọ nke aka ya, bụrụ nne na-aṅụrị ọṅụ nke mụworo ụmụ ndị ikom. Toonụ Jehova!’ (Abụ Ọma 113:7-9) Ndị Jehova nwere okwukwe na ọ pụrụ ịgbapụta ndị ziri ezi nọ ná mkpa, gbanwee ọnọdụ ha, ma gboo mkpa na ọchịchọ ha ndị ziri ezi. ‘Onye Dị Elu nke e mekwara ka Ọ Dị Elu na-eme ka mmụọ nke ndị dị umeala n’obi dị ndụ, na ime ka obi nke ndị a zọpịara azọpịa n’ime mmụọ ha dị ndụ.’—Aịsaịa 57:15.

10 Olee otú Jehova si ‘ebuli onye ogbenye elu, na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nọkọọ’? Mgbe ọ bụ uche Chineke, ọ na-etinye ndị na-ejere ya ozi n’ọnọdụ otuto hà ka nke ndị a maara aha ha. O mere otú ahụ n’ọnọdụ nke Josef, onye ghọrọ onye nlekọta nri nke Ijipt. (Jenesis 41:37-49) N’Israel, iso ndị a maara aha ha, ma ọ bụ ndị ikom nwere ikike n’etiti ndị Jehova, bụ ihe ùgwù a ga-eji kpọrọ mkpa. Dị ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye taa, ndị ikom dị otú ahụ nwere enyemaka na ngọzi Chineke.

11. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Abụ Ọma 113:7-9 metụtara ndị Jehova n’oge dị ugbu a karịsịa?

11 Gịnị banyere ‘ime nwanyị aga nne nke nwere ọṅụ’? Chineke nyere Hana bụ nwanyị àgà nwa nwoke—Samuel, onye o nyefere n’ijere Ya ozi. (1 Samuel 1:20-28) N’ụzọ dị ịrịba ama karị, n’ịmalite na Jisọs, na ná mwụpụ nke mmụọ nsọ n’isi ndị na-eso ụzọ ya na Pentikọst nke 33 O.A., nwanyị ihe atụ nke Chineke, Zaịọn nke eluigwe, malitere ịmụpụta ụmụ ime mmụọ. (Aịsaịa 54:1-10, 13; Ọrụ 2:1-4) Dịkwa nnọọ ka Chineke si weghachi ndị Juu n’ala nke aka ha mgbe ndọrọ n’agha gaa ala ọzọ na Babilọn gasịrị, na 1919 ọ tọhapụrụ ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ nke “Israel nke Chineke” site n’agbụ Babilọn, ọ gọziwokwa ha nke ukwuu n’ụzọ ime mmụọ nke na okwu ndị dị n’Abụ Ọma 113:7-9 metụtara ha. (Ndị Galetia 6:16) Dị ka Ndịàmà Jehova na-eguzosi ike n’ihe, ihe ahụ fọdụrụ n’Israel ime mmụọ na ndị na-esonyere ha bụ́ ndị nwere olileanya nke elu ala ji obi ụtọ na-anakwere okwu ndị ikpeazụ nke Abụ Ọma 113: ‘Toonụ Jehova!’

Ihe Nnwapụta nke Ịdị Iche Jehova

12. Olee otú Abụ Ọma 114 si egosi ịdị iche Jehova?

12 Abụ Ọma 114 na-egosi ịdị iche Jehova site n’izo aka n’ihe omume ndị pụrụ iche metụtara ndị Israel. Onye ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Mgbe Israel siri n’Ijipt pụta, mgbe ụlọ Jekọb siri ná ndị na-atatọ okwu pụta; Juda ghọrọ ebe nsọ ya, Israel ghọrọ ala ọ na-achị.” (Abụ Ọma 114:1, 2) Chineke gbapụtara ndị Israel site n’ịbụ ohu nye ndị Ijipt, ndị asụsụ ha bụ ihe ala ọzọ ná ntị ha. Mgbapụta nke ndị Jehova, ndị a kpọrọ Juda na Israel n’ụzọ okwu yiri ibe ha nke ịbụ abụ, na-egosi na Chineke pụrụ ịgbapụta ndị nile na-ejere ya ozi taa.

13. Olee otú Abụ Ọma 114:3-6 si egosi ọkaaka Jehova ma na-emetụta ahụmahụ dị iche iche ndị Israel oge ochie nwere?

13 Ọkaaka Jehova n’isi ihe nile e kere eke doro anya n’okwu ndị bụ: “Oké osimiri hụrụ ya, wee gbalaga; Jọdan chigharịrị laa azụ. Ugwu nile wuliri elu dị ka ebulu, ugwu nta nile wuliri elu dị ka ụmụ atụrụ. Gịnị na-eme gị, oké osimiri, na ị na-agba ọsọ? Gịnị na-eme gị, Jọdan, na ị na-echigharị laa azụ? Gịnị na-eme unu, ugwu, na unu na-awụli elu dị ka ebulu? Gịnị na-eme unu, ugwu nta, na unu na-awụli elu dị ka ụmụ atụrụ?” (Abụ Ọma 114:3-6) Osimiri Uhie ‘gbara ọsọ’ mgbe Chineke meghere ụzọ n’etiti ya maka ndị ya. Mgbe ahụ Israel hụrụ oké aka Jehova n’ọrụ megide ndị Ijipt nwụrụ n’ime mmiri ndị ahụ lọghachiri. (Ọpụpụ 14:21-31) Ná ngosipụta yiri nke ahụ nke ike Chineke, Osimiri Jọdan “chigharịrị laa azụ,” na-enye ndị Israel ohere ịgabiga banye Kenean. (Joshua 3:14-16) ‘Ugwu nile wuliri elu dị ka ebulu’ ka Ugwu Saịnaị na-akwụ anwụrụ ma na-ama jijiji mgbe a na-eguzobe ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. (Ọpụpụ 19:7-18) Ka abụ ya na-eru nso ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu, onye ọbụ abụ ahụ kwuru okwu n’ụzọ ịjụ ajụjụ, ma eleghị anya na-atụ aro na oké osimiri, osimiri nta, ugwu, na ugwu nta nile na-enweghị ndụ tụrụ egwu n’ihi ngosipụta ndị a nke ike Jehova.

14. Gịnị ka e ji ike Jehova mee na Meriba na Kadesh, oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta ndị na-ejere ya ozi n’oge a?

14 Ka ọ ka na-ekwukwa maka ike Jehova, onye ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ka o gbuo gị mgbu, gị ụwa, site n’ihu Onyenwe anyị, site n’ihu Chineke nke Jekọb; onye gbanwere oké nkume ka ọ ghọọ ọdọ mmiri jupụtara ná mmiri, gbanwee ọmụ ka ọ ghọọ isi iyi mmiri.” (Abụ Ọma 114:7, 8) N’ụzọ ihe atụ, onye ọbụ abụ ahụ si otú a na-egosi na ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị iguzo n’egwu nke Jehova, Onyenwe na Onye Ọchịchị Kasị Elu nke elu ụwa nile. Ọ bụ “Chineke nke Jekọb,” ma ọ bụ Israel, dị ka ọ bụ nke Israel ime mmụọ na ndị na-esonyere ha n’elu ụwa. Na Meriba na Kadesh n’ime ọzara ahụ, Jehova gosipụta ike ya site n’iji ọrụ ebube nye Israel mmiri, ‘na-agbanwe oké nkume ka ọ ghọọ ọdọ mmiri jupụtara ná mmiri, gbanwee ọmụ ka ọ ghọọ isi iyi mmiri.’ (Ọpụpụ 17:1-7; Ọnụ Ọgụgụ 20:1-11) Ihe ncheta ndị dị otú ahụ nke ike dị egwu na nlekọta dị nro nke Jehova na-enye Ndịàmà ya ezi ihe mere ha ga-eji nwee okwukwe n’ajụghị ajụjụ n’ebe ọ nọ.

N’adịghị ka Chi Arụsị Dị Iche Iche

15. Olee otú a pụrụ isiworị bụọ Abụ Ọma 115?

15 Abụ Ọma 115 na-agba anyị ume ito na ịtụkwasị Jehova obi. Ọ na-ekwu na ọ bụ na-enye ngọzi na enyemaka ma na-anwapụta na arụsị abaghị uru. A pụrụ ịbụwo abụ ọma nke a n’ụzọ a na-agụ a na-ekwe. Ya bụ, otu olu pụrụ ịgụ, sị: “Unu ndị na-atụ egwu Jehova, tụkwasịnụ Jehova obi.” Ndị mkpọkọta ahụ pụrụ ịzaghachiwo sị: “Inye aka ha na ọtà ha ka ọ bụ.”—Abụ Ọma 115:11.

16. Ọdịiche dị aṅaa ka a pụrụ iguzobe n’etiti Jehova na arụsị nile nke mba dị iche iche?

16 Ọ bụghị anyị ka otuto kwesịrị ịgara kama aha Jehova, Chineke nke ebere, ma ọ bụ ịhụnanya na-anọgidesi ike n’ihe, na eziokwu. (Abụ Ọma 115:1) Ndị iro pụrụ iji ịkwa emo jụọ, sị: “Olee ebe Chineke ha nọ?” Ma ndị Jehova pụrụ ịzaghachi, sị: ‘Chineke anyị nọ n’eluigwe, ọ na-emekwa ihe ọ bụla masịrị ya.’ (Amaokwu nke 2, 3) Otú ọ dị, arụsị nile nke mba dị iche iche apụghị ime ihe ọ bụla n’ihi na ha bụ ihe ọlaọcha na ọlaedo ndị mmadụ kpụrụ. N’agbanyeghị ọnụ, anya, na ntị ha nwere, ha adịghị ekwu okwu, kpuo ìsì, chiekwa ntị. Ha nwere imi ma ha apụghị ịnụ ísìsì, ụkwụ ma ha apụghị ịga ije, akpịrị ma ha apụghị ime ụṅara. Ndị na-eme arụsị ndị na-enweghị ike nakwa ndị na-atụkwasị ha obi ga-aghọkwa ndị na-enweghị ndụ.—Amaokwu nke 4-8.

17. Ebe ndị nwụrụ anwụ na-apụghị ito Jehova, gịnị ka anyị kwesịrị ime, na-enwekwa olileanya ndị dị aṅaa?

17 Ihe ọzọ e nyere bụ agbamume ịtụkwasị Jehova obi dị ka Onye Enyemaka na Ọta nchebe nke Israel, nke ụlọ ndị nchụàjà Erọn, na nke ndị nile na-atụ egwu Chineke. (Abụ Ọma 115:9-11) Dị ka ndị na-atụ egwu Jehova, anyị nwere nsọpụrụ ofufe dị omimi maka Chineke na egwu dị mma maka imejọ ya. Anyị nwekwara okwukwe na “Onye meworo eluigwe na ụwa” na-agọzi ndị na-eguzosi ike n’ihe na-efe ya ofufe. (Amaokwu nke 12-15) Eluigwe bụ ebe ocheeze ya dị, ma Chineke mere ụwa ịbụ ebe obibi ebighị ebi nke ihe a kpọrọ mmadụ na-eguzosi ike n’ihe, na-erubekwa isi. Ebe ọ bụ na ndị nwụrụ anwụ na-anọ duu, na-amaghịkwa ihe ọ bụla, apụghị ito Jehova, anyị, bụ́ ndị dị ndụ, kwesịrị ime otú ahụ ná nraranye zuru ezu na iguzosi ike n’ihe. (Eklisiastis 9:5) Nanị ndị na-eto Jehova ga-enweta ndụ agwụ agwụ ma nwee ike ‘ịgọzi Ja’ ruo mgbe ebighị ebi, na-ekwu ihe ọma banyere ya “ruo mgbe ebighị ebi.” Ya mere ka anyị jiri ịnọgidesi ike n’ihe sonyere ndị na-anakwere agbamume ahụ bụ: ‘Toonụ Ja!’—Abụ Ọma 115:16-18.

Àgwà Ndị Dị Ebube nke Jehova

18, 19. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka àgwà dị iche iche nke Jehova si edebe ya iche site ná chi ụgha nile?

18 N’adịghị ka arụsị ndị na-enweghị ndụ, Jehova bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-egosipụta àgwà ndị dị ebube. Ọ bụ isi iyi nke ịhụnanya, ọ bụkwa onye “obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere.” (Ọpụpụ 34:6; 1 Jọn 4:8) Lee ka o si dị iche n’ebe chi obi ọjọọ bụ Mọlek nke ndị Kenean nọ, bụ́ onye a na-achụrụ ụmụaka n’àjà! E kwuru na ihe oyiyi chi ahụ nwere ọdịdị nke mmadụ na isi oké ehi. A kọrọ na a na-eme ka arụsị ahụ nụrụ ọkụ nke ukwuu, a na-atụnyekwa ụmụaka n’aka ọ gbatịpụrụ agbatịpụ, ha na-adanye n’ọdọ na-enwu ọkụ nke dị n’okpuru. Ma Jehova nwere ịhụnanya na obi ebere nke ukwuu nke na echiche àjà mmadụ ndị dị otú ahụ adịghị mgbe ọ ‘batara n’obi ya.’—Jeremaịa 7:31.

19 Àgwà ndị bụ isi nke Jehova gụnyekwara ikpe zuru okè, amamihe a na-akparaghị okè, na ike ime ihe nile. (Deuterọnọmi 32:4; Job 12:13; Aịsaịa 40:26) Gịnị banyere chi ndị dị n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme? Kama ịdị na-ekpe ikpe ziri ezi, chi na chi nwanyị nile nke Babilọn na-achọkarị ịbọ ọbọ. Chi ndị Ijipt abụghị ndị ọkà nke amamihe kama a na-egosipụta ha dị ka ndị nwere adịghị ike dị iche iche nke mmadụ. Nke ahụ abụghị ihe ijuanya, ebe ọ bụ na chi na chi nwanyị ụgha dị iche iche abụwo ihe ndị sitere n’ụmụ mmadụ bụ “ihe efu” bụ́ ndị na-eme nzọrọ na ha maara ihe. (Ndị Rom 1:21-23) A sịrị na chi ndị Gris na-akpa nkata nzuzo megide ibe ha. Dị ka ihe atụ, n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, Zeus jiri ike ya mee ihe na-ezighị ezi n’ịchụtụ nna ya, Cronus, n’ọkwá, bụ́ onye chụtuworo nna nke ya, bụ́ Uranus, n’ọkwá. Lee ihe ngọzi ọ bụ ijere Jehova ozi, nanị ezi Chineke na nke dị ndụ, nyekwa ya otuto, bụ́ onye na-egosipụta ịhụnanya, ikpe ziri ezi, amamihe na ike, zuru okè!

Jehova Kwesịrị Inweta Otuto Ebighị Ebi

20. Ihe ndị dị aṅaa ka Eze Devid nyere mere a ga-eji too aha Jehova?

20 Dị ka Abụ Ọma Halel ndị ahụ na-egosi, Jehova kwesịrị otuto ebighị ebi. N’otu aka ahụ, mgbe Devid na ndị Israel ibe ya tụrụ ụtụ maka owuwu ụlọ nsọ ahụ, o kwuru n’ihu mkpọkọta ahụ, sị: “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, Jehova, bụ́ Chineke Israel nna anyị, site na mgbe ebighị ebi wee ruo mgbe ebighị ebi. Jehova, gị nwe ịdị ukwu, na ịdị ike, na ịma mma, na mmeri, na ebube: n’ihi na ihe nile dị n’eluigwe na n’ụwa bụ nke gị; Jehova, gị nwe alaeze, gị bụkwa onye a na-eweli elu ịbụrụ ihe nile onye isi. Ma àkụ̀ ma nsọpụrụ na-esite n’ebe ị nọ bịa, gị onwe gị na-achịkwa ihe nile; ọ bụkwa n’aka gị ka ume na ịdị ike dị; n’aka gị ka ọ dịkwa ime ukwuu, na ime ka ihe nile dị ike. Ma ugbu a, Chineke anyị, anyị onwe anyị na-ekele gị, na-etokwa aha gị mara mma.”—1 Ihe Emere 29:10-13.

21. Mkpughe 19:1-6 na-enye ihe àmà dị aṅaa nke Jehova ịbụ onye ìgwè ndị nọ n’eluigwe na-eto?

21 A ga-agọzikwa ma too Jehova ruo mgbe ebighị ebi n’eluigwe. Jọn onyeozi nụrụ ka “oké ìgwè ndị nọ n’eluigwe” na-asị: “Haleluya; nzọpụta nile na otuto nile na ike nile na-adịrị Chineke anyị: n’ihi na ikpe ya nile bụ eziokwu bụrụkwa ikpe ziri ezi; n’ihi na o kpere oké nwanyị ahụ na-akwa iko [Babilọn Ukwu ahụ] ikpe, bụ́ nwanyị nke weere ịkwa iko ya mebie ụwa, ọ bọkwara ọ́bọ̀ ọbara ndị ohu ya n’isi ya.” Ọzọ ha kwuru, sị: “Haleluya.” Otú ahụ ka “ndị okenye [iri abụọ na anọ] ahụ na ihe anọ ahụ nke dị ndụ” mekwara. Otu olu sitere n’ocheeze ahụ sịrị: “Na-etonụ Chineke anyị, unu ndị ohu ya nile, ndị na-atụ egwu ya, ndị nta na ndị ukwu.” Jọn wee gbakwụnye, sị: “M wee nụ ihe dị ka olu nke oké ìgwè ndị, dịkwa ka olu ọtụtụ mmiri, dịkwa ka olu égbè eluigwe dị ike, na-asị, Haleluya: n’ihi na Onyenwe anyị Chineke anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, na-abụ eze.”—Mkpughe 19:1-6.

22. Olee otú a ga-esi too Jehova n’ụwa ọhụrụ ya e kwere ná nkwa?

22 Lee ka o si kwesị ekwesị na ìgwè ndị nọ n’eluigwe ga-eto Jehova! N’ụwa ọhụrụ ya dị nso, ndị na-eguzosi ike n’ihe a kpọlitere n’ọnwụ ga-esonyere ndị lanarịrị ọgwụgwụ usoro ihe nke a n’ito Ja. Ugwu ndị dị oké elu ga-eweli isi ha n’ịbụ abụ otuto nye Chineke. Ugwu nta ndị jupụtara n’ahịhịa ndụ na osisi ndị na-amị mkpụrụ ga-abụ abụ otuto ya. Leenụ, ihe ọ bụla e kere eke nke dị ndụ ma na-eku ume ga-eto aha Jehova n’oké ukwe Haleluya ahụ! (Abụ Ọma 148) À ga-anụ olu gị n’ìgwè ahụ na-enwe ọṅụ? A ga-anụ ya ma ọ bụrụ na i jiri ịnọgidesi ike n’ihe soro ndị ya jeere Ja ozi. Nke ahụ kwesịrị ịbụ nzube gị ná ndụ, n’ihi na ònye dị ka Jehova, bụ́ Chineke anyị?

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka a ga-eji too Jehova Chineke?

◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova si bụrụ onye na-enweghị atụ?

◻ Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na Jehova nwere ọmịiko?

◻ Olee otú Jehova si dị iche site n’arụsị na chi ụgha ndị na-enweghị ndụ?

◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jehova ga-anata otuto ebighị ebi n’eluigwe na n’elu ụwa?

[Foto dị na peeji nke 9]

A bụrụ Abụ Ọma Hallel ndị ahụ n’oriri Ememe Ngabiga

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya