Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 12/1 p. 21-25
  • Ọṅụ Nke Ijere Jehova Ozi Wetawooro M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọṅụ Nke Ijere Jehova Ozi Wetawooro M
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Itolite na United States
  • Site n’Ọrụ Redio gaa n’Ụlọ Mkpọrọ
  • Ije Ozi Oge Nile
  • Ịmụ Ụmụ na Ime Nkwusa n’Okpuru Mmachibido
  • Ịzụ Ụmụ Anyị na United States
  • Ije Ozi na Peru
  • Ecuador Na-akpọ Òkù
  • Ndụ Dị Ụtọ, nke Na-akwụghachi Ụgwọ
  • Ibu Ụzọ Achọ Alaeze Ahụ—Ndụ E Ji n’Aka na nke Na-enye Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ịtụkwasị Anya na Obi n’Ihe Nrite Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịchụso Ihe Mgbaru Ọsọ nke M Setịpụrụ Mgbe M Dị Afọ Isii
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • “Ebere Gị Dị Mma Karịa Ndụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 12/1 p. 21-25

Ọṅụ Nke Ijere Jehova Ozi Wetawooro M

DỊ KA GEORGE BRUMLEY SI KỌỌ

M ka kụzichara ihe banyere redio nye ndị na-eto eto na-anata ọzụzụ ndị uwe ojii nke Emperor Haile Selassie mgbe otu n’ime ndị a gwara m na nzuzo na ya maara na m bụ onye ozi ala ỌZỌ nke Ndịàmà Jehova. “Ị̀ ga-eduziri m ọmụmụ Bible?” ka o jiri ịnụ ọkụ n’obi jụọ.

EBE ọ bụ na n’oge ahụ a machiri ọrụ anyị n’iwu n’Etiopia, a gaara achụpụ m ná mba ahụ, dị ka e meworo Ndịàmà ndị ọzọ ma ọ bụrụ na ndị isi ọchịchị amatawo banyere m. Echere m echiche ma nwa akwụkwọ ahụ ò nwere ezi obi ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ bụ onye na-ejere gọọmentị ozi nke e zitere ịmata m n’ọnyà. Dị ka onye isi ezinụlọ nke nwere obere ụmụaka atọ ọ ga-azụpụta, echiche nke ịkwụsị m ọrụ na ịmanye m ịhapụ mba ahụ na ndị enyi m hụrụ n’anya tụrụ m ụjọ.

‘Ma,’ ka ị pụrụ ịjụ, ‘olee otú onye America nke nwere ezinụlọ ọ ga-elekọta si nwee mmasị ibi n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Africa, nke dị anya n’ebe obodo na ndị ikwu ya nọ?’ Nye m ohere ka m kọwaa.

Itolite na United States

N’afọ ndị 1920, mgbe m ka nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, nna m tụrụ ụtụ magazin Ụlọ Nche, nwetakwa nchịkọta nke akwụkwọ ahụ bụ Studies in the Scriptures. Ịgụ akwụkwọ na-atọ nna m ụtọ, o wee gụchapụ akwụkwọ ndị ahụ. Ọ bụ onye akọ na onye aghụghọ, dị ka ihe àmà na-egosi site n’ụzọ o si aghọgbu ndị ọbịa ọ na-akpọ ka ha bịa n’ụbọchị Sunday dị iche iche. O nwere otu akwụkwọ ukwu mara mma e ji akpụkpọ anụ mee mkpo ya nke e dere “Bible Nsọ” ná mkpụrụ okwu na-acha ọlaedo ọlaedo n’ihu nakwa n’akụkụ ya. Ọ na-amalite nkwurịta okwu site n’ịsị, “Taa bụ Sunday. Ị̀ ga-agụpụtara anyị amaokwu ole na ole?” Onye ọbịa ahụ na-ekwetakarị, ma mgbe o mepere akwụkwọ ahụ, ọ dịghị peji nke ọ bụla nwere ihe e dere na ha! N’ezie, ọ na-eju onye ahụ anya. Mgbe ahụ nna m ga-asị na ‘ndị nkwusa amaghị ihe ọ bụla banyere Bible,’ mgbe ahụ ọ ga-ewepụta otu ma gụọ Jenesis 2:7. N’ebe ahụ, n’ịkọwa okike nke mmadụ mbụ ahụ, Bible na-asị: “Mmadụ ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.”—Jenesis 2:7, King James Version.

Nna m ga-akọwa na mmadụ enweghị mkpụrụ obi kama ọ bụ otu, na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, na mgbe mmadụ nwụrụ, ọ nwụwo n’ezie, n’amaghịkwa ihe ọ bụla ma ọlị. (Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4; Ndị Rom 6:23) Ọbụna tupu m nwee ike ịgụ ihe nke ọma, eburuwo m Jenesis 2:7 n’isi. Ndị a bụ ihe mbụ ndị m na-echeta banyere ezi ọṅụ a na-enwe ịmara eziokwu Bible na isoro ndị ọzọ kerịta ha.

Ebe ọ bụ na mgbe ahụ anyị na-enweta Ụlọ Nche n’ebe obibi anyị, ezinụlọ anyị nile malitere iri nri ime mmụọ nke a na-edozi ahụ. Nne nne m so anyị biri, o wee ghọọ onye nkwusa mbụ nke ozi ọma ahụ n’ezinụlọ anyị. Ọgbakọ ọ bụla adịghị na Carbondale, Illinois, bụ́ ebe anyị bi, ma a na-enwe nzukọ ma ọ dapụta. Nne m na-akpọrọ anyị ụmụ ya ise gaa n’akụkụ nke ọzọ nke obodo bụ́ ebe ndị inyom meworo agadi na-eduzi ọmụmụ ihe Ụlọ Nche. Anyị malitekwara ikere òkè n’ozi ubi.

Site n’Ọrụ Redio gaa n’Ụlọ Mkpọrọ

Alụrụ m nwunye na 1937 mgbe m dị nanị afọ 17. Agbalịrị m ịkpata ihe m ji adị ndụ site n’ịrụzi redio ma kụzie nkà nke a. Mgbe anyị mụtara ụmụ abụọ, bụ́ Peggy na Hank, alụmdi na nwunye m tikpọrọ. Ọ bụ m kpatara ịgba alụkwaghịm ahụ; adịghị m ebi ndụ ndị Kraịst. Eziokwu ahụ bụ na m ejighị aka m zụọ ụmụ m abụọ ndị m bu ụzọ mụta abụworo m ihe obi mgbu ná ndụ m nile.

Agha Ụwa nke Abụọ malitere wee mee ka m chee echiche banyere ọtụtụ ihe. Ìgwè ndị agha dị iche iche nyere m ohere ịghọ onye leftinant ma na-akụziri ndị agha e were ọhụrụ redio, ma nchegbu m maka ihe Jehova chere banyere agha kpaliri m ịmalite ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ụtụ m maka Ụlọ Nche agwụsịwo, Lucille Haworth natakwara ihe ahụ e ji ama na ụtụ agwụsịwo wee bịa na nke m. Perry Haworth, bụ́ nna Lucille, na ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ ya buru ibu aghọwo Ndịàmà kemgbe afọ ndị 1930. Mụ na Lucille hụrụ onwe anyị n’anya, anyi lụkwara di na nwunye na December 1943.

Na 1944, e mere m baptism, m wee sonyere nwunye m n’ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ. N’oge na-adịghị anya a kpọrọ m ịbịa ka e wee m n’ọrụ agha ma ajụrụ m idebanye aha m. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, a mara m ikpe ịga mkpọrọ afọ atọ n’ebe a na-enye ndị isi ike ọzụzụ ná mba ahụ nke dị na El Reno, Oklahoma. Ọ bụụrụ m ọṅụ ịta ahụhụ n’ihi Jehova. N’ụtụtụ ọ bụla mgbe m tetara n’ụra ma ghọta ebe m nọ na ihe kpatara ya, enwere m oké afọ ojuju ma kelee Jehova. Mgbe agha ahụ kwụsịrị, a malitere inye anyị, bụ́ ndị karịworo 25 afọ, ohere ịkpagharị. A tọhapụrụ m na February 1946.

Ije Ozi Oge Nile

Mgbe m sonyeere Lucille ọzọ, ọ na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ n’obere obodo ahụ bụ Wagoner, Oklahoma. Anyị enweghị ụgbọ ala, ya mere anyị ji ụkwụ gaa n’ebe nile, na-agazu obodo ahụ dum. E mesịa, anyị kwagara na Wewoka, Oklahoma. N’oge na-adịghị anya, enwetara m ọrụ n’otu ụlọ ọrụ redio dị nso wee malite ọrụ mgbasa ozi. Ịrụ ọrụ hour isii kwa ụbọchị na itinye oge n’ọrụ ọsụ ụzọ adịghị mfe, ma anyị nwere ọṅụ n’ihe ùgwù anyị na-enweta ijere Jehova ozi. Anyị jisiri ike zụta otu ụgbọ ala meworo ochie kpọmkwem n’oge maka mgbakọ ukwu ahụ e nwere na Los Angeles na 1947. N’ebe ahụ, anyị malitere iche echiche itinye akwụkwọ ịga Watchtower Bible School of Gilead maka ọzụzụ ndị ozi ala ọzọ.

Anyị matara na nke a ga-abụ oké nzọụkwụ, anyị achọghịkwa ịdị ngwa n’ime mkpebi ịhapụ United States. Ọ ka na-egbu m mgbu n’obi na ụmụ m esoghị m nọrọ, ya mere anyị gbalịrị ọzọ ịma ma a ga-akpọnye anyị ha. N’ihi ụdị ndụ m biri na mbụ nakwa ịbụ onye gaworo mkpọrọ, nke ahụ enweghị isi. Ya mere, anyị kpebiri ịgbalị ịghọ ndị ozi ala ọzọ. A kpọrọ anyị òkù ịbịa klasị nke 12 nke Gilead.

Anyị gụsịrị akwụkwọ na 1949, ma na mbụ e kenyere anyị ọrụ ileta ọgbakọ ndị dị na Tennessee. Mgbe anyị nọsịrị afọ atọ n’ọrụ njegharị na United States, anyị natara otu akwụkwọ ozi sitere n’ụlọ ọrụ onye isi oche nke Watch Tower Society nke na-ajụ ma ànyị ga-achọ ịkụzi nkụzi n’Etiopia ya na ịrụ ọrụ nkwusa ahụ. Otu n’ime ihe ndị gọọmentị ahụ chọrọ bụ na ndị ozi ala ọzọ ga na-akụzi nkụzi. Anyị kwetara, n’oge okpomọkụ nke afọ 1952, anyị gawara Etiopia.

Mgbe anyị rutere n’Etiopia, anyị kụziri na klasị dị iche iche nke ndị praịmarị n’ụtụtụ ọ bụla, duziekwa ọmụmụ ihe Bible n’efu n’oge ehihie ọ bụla. N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ ndị malitere ịbịa maka ọmụmụ Bible nke na ọtụtụ mgbe, anyị na-akụzi Bible hour atọ ma ọ bụ anọ kwa ụbọchị. Ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ bụ ndị uwe ojii; ndị ọzọ bụ ndị nkụzi ma ọ bụ ndị dikọn nọ n’ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nakwa n’ụlọ akwụkwọ Orthodox nke Etiopia. Mgbe ụfọdụ a na-enwe 20 ma Ọ bụ karịa na klasị ọmụmụ Bible Ọ bụla! Ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ hapụrụ okpukpe ụgha wee malite ijere Jehova ozi. Anyị nwere obi ụtọ dị ukwuu. Ọzọkwa, mgbe m tetara ụra n’ụtụtụ ọ bụla, enyere m Jehove ekele.

Ịmụ Ụmụ na Ime Nkwusa n’Okpuru Mmachibido

Na 1954, a gwara anyị na anyị gaje ịmụta nwa, ya mere anyị aghaghị ikpebi ma ànyị ga-alaghachi United States ma Ọ bụ nọgide n’Etiopia. Otú ọ dị, ịnọgide ga-adabere ma m nwetara ọrụ ego. Enwetara m ọrụ dị ka onye injinia mgbasa ozi, na-elekọta otu ụlọ ọrụ redio maka Emperor Haile Selassie. Ya mere, anyị nọgidere.

Na September 8, 1954, a mụrụ nwa anyị nwanyị bụ́ Judith. Echere m na m nwere ọrụ guzosiri ike n’ihi ịrụrụ onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ ọrụ, ma mgbe afọ abụọ gasịrị a na-pụrụ m ọrụ ahụ. Otú ọ dị, n’ihe na-erughị otu ọnwa, Ngalaba Ndị Uwe Ojii goro m ọrụ—na-kwa n’ụgwọ ọnwa dị elu karị—ịkụziri otu klasị nke ụmụ okorobịa ka e si arụzi redio e ji ezipụ ma na-anata ozi. N’ime afọ atọ ndị na-esonụ, a mụrụ ụmụ anyị ndị nwoke bụ́ Philip na Leslie.

Ka ọ dị mgbe ahụ, nnwere onwe anyị ikere òkè n’ọrụ nkwusa nọ na-agbanwe. Chọọchị Orthodox nke Etiopia aranyewo ndị gọọmentị ịchụpụ ndị ozi ala ọzọ nile nke Ndịàmà Jehova. Ná ndụmọdụ Society, agbanwere m akwụkwọ ikike m ji nọrọ ná mba ahụ site n’ọrụ ozi ala ọzọ gaa n’ọrụ ego. A machibidoro ọrụ ozi ala ọzọ anyị n’iwu, anyị aghaghịkwa ịdị akọ, nweekwa uche. Nzukọ nile nke ọgbakọ nọgidere na-aga n’ihu, ma anyị zukọrọ n’obere ìgwè ọmụmụ ihe.

Ndị uwe ojii nyochara ebe obibi dị iche iche nke Ndịàmà a na-enyo enyo. Otú ọ dị, n’ịbụ ndị na-amaghị, otu onye leftinant ndị uwe ojii bụ́ onye na-efe Jehova na-adụkarị anyị ọdụ mgbe e mere atụmatụ ime nchọgharị. Dị ka ihe si na ya pụta, ọ dịghị akwụkwọ ọ bụla a chịkọọrọ n’afọ ndị ahụ. Anyị nwere Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche anyị n’ụbọchị Sunday ọ bụla site n’ịga n’ụlọ oriri ndị dị na nsọtụ nke obodo ahụ bụ́ ebe e nwere table maka ndị na-eme mkpagharị na-anọ n’èzí na-eri ihe.

Ọ bụ n’oge a, mgbe m na-akụzi redio nye ndị ọhụrụ e were n’ọrụ uwe ojii, ka nwa akwụkwọ ahụ m hotara ná mmalite rịọrọ m maka ọmụmụ Bible. Echere m na obi ya ziri ezi, ya mere anyị malitere. Mgbe anyị nwesịrị nanị ọmụmụ ihe nke abụọ, nwa akwụkwọ nke abụọ so ya bịa, mgbe ahụ nke atọ. Adọrọ m ha aka ná ntị ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla na ha so m na-amụ ihe, ọ dịghịkwa mgbe ha mere otú ahụ.

Na 1958 e nwere Mgbakọ Uche Chineke nke Mba Nile n’ámá egwuregwu Yankee Stadium na Polo Grounds nke New York. Ka ọ dị mgbe ahụ, Peggy na Hank, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ so n’ezinụlọ m buru ibu, aghọwo Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike. Lee otú obi si dị m ụtọ na m nwere ike ịga! Ọ bụghị nanị na m nwere ọṅụ isoro ụmụ m abụọ ndị m bu ụzọ mụọ na ndị ọzọ so n’ezinụlọ anyị nọkọta ọzọ kama enwekwara m obi ụtọ ịhụ ìgwè ahụ buru ibu nke ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke nde ndị mmadụ ka ha zukọtara n’ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ukwu ahụ!

N’afọ na-eso nke ahụ, onye isi oche Society, bụ́ Nathan H. Knorr, bịara ileta anyị n’Etiopia. Ọ tụrụ aro ndị dị mma maka ịrụ ọrụ ahụ n’okpuru mmachibido, o nwekwara mmasị n’ezinụlọ anyị na otú anyị si eme n’ụzọ ime mmụọ. Akọwara m na anyị na-akụziri ụmụ anyị ikpe ekpere. Ajụrụ m ya ma ọ ga-enwe mmasị ige ntị ka Judith kpee ekpere. Ọ sịrị ee, mgbe o kpesịrị ọ gwara ya, sị: “Judith, nke ahụ dị nnọọ mma.” Mgbe ahụ, n’oge nri, agwara m Nwanna Knorr ka o duo anyị n’ekpere, mgbe o kpesịkwara, Judith sịrị: “Nwanna Knorr, nke ahụ dị nnọọ mma!”

Ịzụ Ụmụ Anyị na United States

Ọrụ m na-arụrụ Ngalaba Ndị Uwe Ojii ahụ gwụsịrị na 1959. Anyị chọrọ ịnọ, ma ndị gọọmentị achọghị inye m ikike ịrụ ọrụ ọhụrụ ọ bụla. Ya mere olee ebe anyị pụrụ ịga? Agbalịrị m ịga ná mba ndị ọzọ ebe e nwere mkpa dị ukwuu maka ụmụnna ma enweghị m ike ime otú ahụ. N’ịbụ ndị o wutetụrụ, anyị laghachiri United States. Mgbe anyị larutere, anyị nwere nnọkọrịta ezinụlọ na-enye ọṅụ; ụmụ m ise nile matara onwe ha wee hụrịta onwe ha n’anya ozugbo. Kemgbe ahụ ha anọwo onwe ha nso.

Anyị kwagara na Wichita, Kansas, bụ́ ebe m nwetara ọrụ dị ka onye injinia redio na onye na-ekwu okwu ma egwú kpọsịa. Lucille rụwaziri ọrụ ndị dị n’ụlọ, ụmụ anyị gakwara n’ụlọ akwụkwọ dị nso n’ụlọ anyị. Eduziri m ọmụmụ ihe Ụlọ Nche ezinụlọ kwa uhuruchi Monday ọ bụla, na-agbalị mgbe nile ime ka Ọ dị ụtọ ma na-adọrọ mmasị. Anyị na-ajụ ase kwa ụbọchị ịhụ ma è nwere nsogbu n’ụlọ akwụkwọ.

Ka nke Ọ bụla n’ime ụmụaka ahụ sonyere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ọzụzụ nke a nyeere ha aka n’agụmakwụkwọ ha. Anyị nyere ha ọzụzụ site na nwa ọhụrụ n’ozi ubi. Ha mụtara inye akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ọnụ ụzọ, ha sokwa anyị jee duzie ọmụmụ Bible ebe obibi dị iche iche.

Anyị gbalịkwara ịkụziri ụmụaka ahụ ihe ndị bụ isi ná ndụ, na-akọwa na onye ọ bụla n’ime ha apụghị inwe mgbe nile ihe onye nke ọzọ nwere. Dị ka ihe atụ, a dịghị enye ha nile otu ụdị onyinye. “Ọ bụrụ na nwanne gị nwoke ma ọ bụ nwanyị enweta ihe e ji egwuri egwu,” ka anyị na-eso ha atụgharị uche, “ma Ọ dịghị nke e nyere gị, ọ̀ bụ ihe ziri ezi gị ime mkpesa?” Otú ọ dị, n’oge ndị ọzọ, ụmụ ndị ọzọ na-enweta otu ihe, ya mere ọ dịghị onye e leghaara anya. Anyị hụrụ ha nile n’anya mgbe nile, ọ dịghị mgbe anyị na-emere otu onye amara karịa mmadụ abụọ ọzọ.

Mgbe ụfọdụ a na-ekwere ka ụmụaka ndị ọzọ na-eme ihe ndị a na-enyeghị ụmụ anyị ohere ime. Ọtụtụ mgbe, ana m anụ, “Onye dị otú a pụrụ ime ya, n’ihi gịnị ka anyị na-apụghị?” Agbalịrị m ịkọwa, ma mgbe ụfọdụ azịza ya aghaghị ịbụ nnọọ, “Ị nọghị n’ezinụlọ ahụ; ị nọ n’ezinụlọ Brumley. Anyị nwere ụkpụrụ ndị dị iche.”

Ije Ozi na Peru

Kemgbe anyị si Etiopia laghachi, mụ na Lucille enwewo ọchịchọ ikere òkè ọzọ n’ọrụ ozi ala ọzọ. N’ikpeazụ, na 1972, ohere pụtara ịga na Peru, n’Ebe Ndịda America. Ọ dịghị ebe anyị gaara ahọrọ ga-aka ebe ahụ mma ịnọrọ zụlite ụmụ anyị n’oge ha nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu. Mkpakọrịta ha nwere n’etiti ndị ozi ala ọzọ, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, na ndị ỌZỌ bịara na Peru ije ozi nyeere ha aka iji anya ha hụ otú ha si bụrụ ndị na-enwe ọṅụ, bụ́ ndị na-ebu ụzọ achọ ọdịmma nile nke Alaeze. Philip kpọrọ mkpakọrịta ya nrụgide ndị ọgbọ nke dị mma.

Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ụfọdụ ndị enyi ochie anyị sitere Kansas matara banyere oké ihe ịga nke ọma anyị na-enwe n’ozi Alaeze ahụ, ha sonyekwaara anyị na Peru. Ahaziri m ebe obibi anyị dị ka ebe obibi ndị ozi ala ọzọ. Onye ọ bụla nwere ọrụ e kenyere ya ka mmadụ nile wee nwee oge ikere òkè n’ozi ubi. Anyị nwere ntụle nke ihe mmụta Bible na table n’ụtụtụ ọ bụla. Oge ndị ahụ bụ oge obi ụtọ nye anyị nile. Ọzọkwa, ka m tetara ụra n’ụtụtụ Ọ bụla wee ghọta ebe m nọ na ihe kpatara ya, m nyere Jehova ekele miri emi n’ime obi m.

Mgbe oge na-aga, Judith lụrụ di wee laghachi na States, bụ́ ebe Ọ nọgidere n’ije ozi oge nile. Mgbe Ọ nọsịrị afọ atọ n’ozi ọsụ ụzọ pụrụ iche, Philip tinyere akwụkwọ, e wee nabata ya n’ozi Betel na Brooklyn, New York. N’ikpeazụ, Leslie laghachikwara na United States. Ha lara n’amaghị otú ha ga-esi hapụ anyị, ọtụtụ mgbe ha agwawokwa anyị na ịkpọrọ ha bịa na Peru bụ ihe kachasị mma anyị meworo ha mgbe Ọ bụla.

Ka ọnodụ akụ na ụba nke Peru kawanyere njọ, anyị chọpụtara na anyị onwe anyị aghaghị ịla. Mgbe anyị laghachiri na Wichita na 1978, anyị chọtara ìgwè Ndịàmà na-asụ asụsụ Spanish. Ha rịọrọ anyị ka anyị nọrọ wee nyere ha aka, anyị jikwa obi ụtọ mee otú ahụ. E guzobere otu ọgbakọ, ngwa ngwa, Ọ ghọkwara nke anyị hụrụ n’anya dị ka ndị ahụ anyị jeworo ozi na ha na mbụ.

Ecuador Na-akpọ Òkù

N’agbanyeghị ahụ mkpọnwụ nke mere ka m ghara ịdị na-emegharị akụkụ ahụ m ụfọdụ, enwere m olileanya siri ike ná mmezu nke na mụ na Lucille pụrụ ije ozi ọzọ ná mba ọzọ. Na 1984, otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị gwara anyị banyere mmụba a na-enwe n’Ecuador na mkpa e nwere maka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye. Emere m ka ọ pụta ìhè na m pụrụ ime ihe dị nta n’ozi ubi n’ihi ịda ngwụrọ m, ma o mesiri m obi ike na ọbụna onye dị 65 afọ, nke na-adịghị emegharị akụkụ ahụ ya ụfọdụ pụrụ inye aka.

Mgbe ọ lara, anyị apụghị ihi ụra n’abalị, ebe anyị nọ na-ekwu banyere otú ọ ga-esi kwe mee ije Ecuador. Lucille nwere otu ọchịchọ ahụ na-anụ ọkụ nke m nwere ịga. Ya mere, anyị kpọsara orire nke obere azụmahịa anyị nke imepụta ọgwụ na-egbu ụmụ ahụhụ ma ree ya n’ime izu abụọ. Anyị rere ụlọ anyị n’ime nanị ụbọchị iri. Otú a, n’afọ agadi anyị, anyị laghachiri ọzọ n’ihe kasị na-enye anyị ọṅụ, nke bụ ije ozi n’ala ọzọ.

Anyị kwagara na Quito, ozi ubi na-enyekwa obi ụtọ, ụbọchị ọ bụla na-ewetakwa ahụmahụ ma ọ bụ ihe mmụta ọhụrụ. Ma mgbe ahụ, na 1987, e nyochapụtara na m nwere cancer eriri afọ; ọ dị mkpa ka a waa m ahụ ozugbo. Anyị laghachiri Wichita maka ịwa ahụ ahụ, bụ́ nke gara nke ọma. Anyị laghachiri Quito nanị afọ abụọ mgbe a chọpụtara cancer ahụ ỌZỌ, anyị wee laghachi na States kpam kpam. Anyị kwagara na North Carolina, bụ ebe anyị bi ugbu a.

Ndụ Dị Ụtọ, nke Na-akwụghachi Ụgwọ

Ọdịnihu anụ ahụ m bụ nke a na-ejighị n’aka. Enwewo m mgbanwe nke otule na 1989. Ọbụna otú ahụ, m ka nwere ike ije ozi dị ka onye okenye ma na-eduziri ndị na-abịa n’ebe obibi m ọmụmụ Bible. Eri ọtụtụ afọ, anyị enyeworo n’ụzọ nkịtị ọtụtụ narị ndị mmadụ aka site n’ịkụ, ịkwọsa mmiri, ma ọ bụ iwulite mkpụrụ nke eziokwu. Nke ahụ bụ ọṅụ nke na-adịghị apụ apụ, n’agbanyeghị ugbo ole e kwughachiri ya.

Tụkwasị na nke ahụ, enwewo m oké ọṅụ n’ịhụ ka ụmụ m nile na-ejere Jehova ozi. Peggy anọwo kemgbe 30 afọ na-esonyere di ya, bụ́ Paul Moske, n’ọrụ njegharị na United States. Philip na nwunye ya, bụ́ Elizabeth, ya na Judith, nọgidere n’ozi pụrụ iche na Betel nke Brooklyn, New York. Hank na Leslie na ndị ha na-alụ bụ Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike, ụmụnne m anọ ndị nwoke na nwanyị na ezinụlọ ha, gụnyere ihe karịrị 80 ndị ikwu m mụ na ha si n’otu ọbara, na-ejechara Jehova ozi. Lucille abụwokwa onye Kraịst bụ́ nwunye e ji ama atụ ruo ihe ruru 50 afọ nke alụmdi na nwunye. N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, o jiwo emeghị mkpesa rụọ ọtụtụ ọrụ na-adịghị enye obi ụtọ n’inyere m aka maka ahụ m na-adakpọ adakpọ.

N’ezie, ndụ m abụwo nke na-enye ọṅụ. Ọ dịwo ụtọ karịa ka a pụrụ ịkọwa. Ijere Jehova ozi bụ ihe na-enye oké ọṅụ nke na Ọ bụ ọchịchọ sitere n’obi m ife Jehova ruo mgbe ebighị ebi n’elu ụwa a. Anọgidewo m na-echeta Abụ Ọma 59:16, nke na-asị: “Ma mụ onwe m ga-abụ abụ banyere ike gị; ee, m ga-eti mkpu ọṅụ banyere ebere gị n’ụtụtụ: n’ihi na ị bụrụworo m ụlọ elu, na ebe mgbalaga n’ụbọchị mkpagbu dịrị m.”

[Foto dị na peeji nke 23]

George Brumley na onye ọchịchị Etiopia bụ́ Haile Selassie

[Foto dị na peeji nke 25]

George Brumley na nwunye ya, bụ Lucille

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya