Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 12/15 p. 3-4
  • Gịnị n’Ezie Bụ Ozi Ọma Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị n’Ezie Bụ Ozi Ọma Ahụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Oziọma Ahụ?
  • Ịmata Oziọma Ahụ
  • Ozi Doro Anya
  • Olee Akwụkwọ Bụ́ “Oziọma Judas”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Olee Ụzọ Oziọma ahụ Pụrụ Isi Baara Gị Uru?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ole Mgbe E Dere Akụkọ Jizọs?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • È Kwesịrị Ịtụkwasị Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 12/15 p. 3-4

Gịnị n’Ezie Bụ Ozi Ọma Ahụ?

N’OGE Krismas, ndị mmadụ n’ọtụtụ ala na-anụ banyere, ọbụna na-ekwukwa okwu n’onwe ha banyere, Oziọma ahụ. A na-anụkarị okwu ahụ, ma ọ̀ dị ihe ọ pụtara karịa otú ọtụtụ mmadụ na-eche? Oziọma ahụ ọ̀ pụrụ ịpụta ihe dị nnọọ mma nye gị na ndị gị ị hụrụ n’anya?

“Oziọma” pụtara “akụkọ ọma,” n’eziekwa, a na-anabata akụkọ ọma ọ bụghị nanị n’oge Krismas, kama n’oge nile. Otú ọ dị, Oziọma ahụ abụghị nnọọ akụkọ ọma ọ bụla. Ọ bụ otu akụkọ ọma kpọmkwem site n’isi iyi doro anya banyere otu isiokwu kpọmkwem. Ọ bụ n’ezie, ozi Chineke họpụtaworo ka a kpọsaa nye ihe nile a kpọrọ mmadụ.

Eugênio Salles, bụ́ achịbishọp nke Rio de Janeiro, Brazil, kwuru banyere akụkọ ọma ahụ mgbe ọ gbara ume, sị: “Anyị kwesịrị ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’Oziọma ahụ, ọ bụghịkwa ná ndabere nke nchepụta efu dị iche iche.” Achịbishọp ahụ kwuru ihe ziri ezi. Otú ọ dị, ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’Oziọma ahụ chọrọ ka anyị mata ihe Oziọma ahụ bụ. Olee otú anyị pụrụ isi mụta nke ahụ? Oleekwa otú ịdị na-eme ihe kwekọrọ n’Oziọma ahụ ga-esi nyere anyị aka?

Gịnị Bụ Oziọma Ahụ?

A na-aghọtahiekarị ọdịdị nke Oziọma ahụ. Na 1918, Òtù Nzukọ Chọọchị Nile nke Kraịst n’America nabatara njikọ ụwa ahụ na-adịkwaghị ugbu a bụ́ Njikọ Mba Nile dị ka ngosipụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Alaeze Chineke n’ụwa wee kpọsaa na ọ “gbara mkpọrọgwụ n’oziọma ahụ.” Òtù ahụ dara ọdịda dị ihere n’ihe mgbaru ọsọ ya nke ichebe udo. N’ụzọ doro anya, òtù ahụ ezighị ezi. Òtù League of Nations enweghị ihe jikọrọ ya na Oziọma ahụ.

N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, ndị na-akwalite nkà mmụta okpukpe nnwere onwe ejiwo Oziọma ahụ mee ihe n’akpaghị ókè ọ bụla mgbe ha na-ekwu banyere echiche ha dị iche iche maka mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ nke ọha mmadụ. N’ime nke ahụ ha elegharawo Oziọma ahụ nke bụ ezie anya. Magazin ndị Brazil bụ́ Veja kwuru, sị: “Chọọchị Katọlik malitere ikwenyere alaeze nke ọha na eze, na-eleghara mkpa ime mmụọ ndị nke ndị nọ na ya anya. Ndị tụrụ anya ịnụ okwu ahụ bụ Chineke n’okwuchukwu na-ahụkarị arụmụka ndị a na-adịghị enye azịza maka ha megide ikpe na-ezighị ezi nke ọha mmadụ.”

Mmeziwanye n’ọnọdụ ibi ndụ ma ọ bụ mgbanwe n’usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị pụrụ ịbụrụ ụfọdụ akụkọ ọma. Ma, ihe dị otú ahụ abụghị akụkọ ọma ahụ, Oziọma ahụ. Ka ọ na-anakwere ọdịda chọọchị ya n’ikwusa Oziọma ahụ nke bụ ezie, otu bishọp sịrị: “Anyị leghaara nkụzi ime mmụọ nke ndị okpukpe anyị anya kemgbe afọ ndị 1960 n’ihi mbata nke ịhụ ihe onwunwe n’anya n’ozizi anyị.”

Otu akụkọ dị na magazin akụkọ ndị U.S. bụ́ Time na-atụ aro na a dọpụwokwa uche ndị Protestant site n’Oziọma ahụ. Magazin ahụ kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị na òtù okpukpe ndị a ma ama na-ada ada n’ime ka a ghọta ozi ha; ha na-enwewanye mgbagwoju anya banyere ihe ozi ahụ bụ n’ezie.” Gịnị ka ozi ha kwesịrị ịbụ? Gịnị bụ Oziọma ahụ?

Ịmata Oziọma Ahụ

Ọkọwa okwu bụ́ Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary na-akọwa “Oziọma” dị ka “ozi ahụ banyere Kraịst, alaeze Chineke, na nzọpụta.” A kọwakwara okwu ahụ bụ “oziọma” dị ka “nkọwa nke ozi ndị Kraịst (ozi ọrụ ebere)”; “ozi ma ọ bụ nkụzi nile nke onye nkụzi okpukpe.” Nkọwa nile ndị a hà dabara adaba? Ee e, ha adabaghị ma ọ bụrụ na anyị na-ekwu banyere Oziọma ahụ. Oziọma ahụ nke bụ ezie dabeere na Bible; n’ihi ya, nanị nke mbụ ná nkọwa atọ ndị ahụ ziri ezi. Abụọ ndị ikpeazụ na-egosipụta nanị otú e siworo na-eji okwu ahụ bụ “oziọma” na-eme ihe taa.

N’ikwekọ n’echiche nke a, akwụkwọ bụ́ Vine’s Expository Dictionary of New Testament Words na-ekwu na n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst (“Testamenti Ọhụrụ”), Oziọma ahụ “na-enye echiche nke mkpọsa obi ụtọ nile nke Alaeze Chineke na nke nzọpụta site na Kraịst, nke a ga-eji okwukwe nakwere, ná ndabere nke ọnwụ ihe mgbu ya iji kwụọ ụgwọ.” Ọ dị mkpa ịghọta nke a n’ihi na nghọta ziri ezi nke akụkọ ọma ahụ nke bụ ezie nwere ọtụtụ ihe ime banyere ọdịmma anyị ugbu a na obi ụtọ anyị n’ọdịnihu.

Ozi Doro Anya

Dị ka akwụkwọ ntụaka ahụ e hotara na-egosi, e jikọrọ Oziọma ahụ na Jisọs Kraịst n’ụzọ chiri anya—nke ukwuu nke na a na-akpọ ihe ndekọ anọ nke Bible nke ndụ ya n’elu ụwa Oziọma anọ ahụ. Site ná mmalite nke ndụ mmadụ ya, akụkọ banyere Jisọs bụ akụkọ ọma. Mgbe ọ na-akpọsa ọmụmụ ya, otu mmụọ ozi sịrị: “Lee, ana m ezi unu ozi ọma [ma ọ bụ akụkọ ọma] nke oké ọṅụ nke ga-adịrị ndị Israel nile: n’ihi na taa . . . ka a mụrụ nye unu Onye Nzọpụta, nke bụ Kraịst Onyenwe anyị.”—Luk 2:10, 11.

Jisọs ahụ a mụrụ ọhụrụ ga-etolite ịbụ Kraịst ahụ, Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ọ ga-ekpughe nzube Chineke maka nzọpụta, nye ndụ mmadụ ya zuru okè n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ, a kpọlite ya n’ọnwụ, o wee bụrụ Eze a họpụtara nke Alaeze Chineke. Akụkọ ọma n’ezie! Ọ bụ ihe mere e ji akpọ ozi banyere ya Oziọma.

Ná mkpirikpi oge ozi ya n’ụwa, Jisọs nụrụ ọkụ n’obi nke ukwuu ná nkwusa nke akụkọ ọma. Anyị na-agụ n’Oziọma Matiu, sị: “Jisọs wee na-ejegharị n’obodo na obodo nta ha nile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ nile ha, na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ.” (Matiu 9:35) Nkwusa ya abụghị nanị iji mee ka ndị mmadụ nwetụ ahụ iru ala. Mak dekọrọ ka Jisọs na-asị: “Oge ezuwo, alaeze Chineke dịkwa nso: chegharịanụ, kwekwanụ n’ozi ọma.” (Mak 1:15) Ee, ndị zaghachirinụ ma rube isi n’akụkọ ọma ahụ hụrụ na ọ gbanwere ndụ ha.

Mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya nọgidere na-ekwusa Oziọma ahụ. Ọ bụghị nanị na ha kwuru banyere Alaeze ahụ kama ha gbakwunyere akụkọ obi ụtọ ahụ nke na a kpọlitewo Jisọs n’ọnwụ gaa n’aka nri nke Chineke n’eluigwe nakwa na o chewo uru nke àjà mmadụ ya zuru okè n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ. Dị ka onye nke Chineke họrọwooro ịchịisi n’elu ụwa nile dị ka Eze nke Alaeze Chineke, ọ ga-abụ Onyeọrụ Chineke n’ibibi ndị iro nile nke Chineke na n’iweghachi ụwa ịghọ paradaịs.—Ọrụ 2:32-36; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10; Ndị Hibru 9:24-28; Mkpughe 22:1-5.

Taa, akụkọ ọma ahụ gụnyere ihe ọzọ. Dị ka ihe àmà nile nke mmezu amụma na-egosi, a nọkwasịwo Jisọs n’ocheeze, anyị na-ebikwa na mgbe ikpeazụ nke usoro ihe nke a. (2 Timoti 3:1-5; Mkpughe 12—:7-12) Oge mgbe Alaeze ahụ ga-eme ihe megide ndị iro nile nke Chineke ji ọsọ na-abịarute. Olee akụkọ pụrụ ịka nke ahụ mma?

Anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ otú Oziọma ahụ siruru n’ike. O nyeere otu nwanyị aka bụ́ onye majik ojii keworo agbụ, inwere onwe ya. O nyeere otu nwoke nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi izu ohi aka ịchọta obi ụtọ. Ọ ga-abakwara gị onwe gị uru nke ukwuu—ma ọ bụrụ na i gee ntị ma rubere akụkọ ọma ahụ isi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya