Chineke Adịghị Echezọ “Ịhụnanya Ahụ Unu Gosiri N’ebe Aha Ya Dị”
“CHINEKE abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha ya dị, ebe unu jeere ndị nsọ ozi, na-ejekwara ha ozi.” (Ndị Hibru 6:10) Okwu ndị a nke Pọl onyeozi bụ eziokwu n’ebe Ndịàmà Jehova n’Ọwụwa Anyanwụ Europe nọ. N’iji ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi maka ọdịmma nke aha Chineke, ruo ọtụtụ iri afọ ha adọgbuwo onwe ha n’ọrụ ruo ogologo oge na n’ụzọ siri ike n’okpuru ihe mgbochi ndị gọọmenti dị iche iche nke Soviet oge mbụ tinyere. Jehova na-echeta ihe ọma ndị ha rụrụ ma na-awụkwasị ha ngọzi dị iche iche nke Alaeze. Dị ka ihe atụ, ka anyị lee anya n’akụkọ ozi nke afọ ije ozi gara aga site nanị n’atọ n’ebe ndị a.
Ókèala Dị Iche Iche nke Soviet Union Oge Mbụ
Ókèala dị iche iche nke Soviet Union oge mbụ na-akọ na n’oge afọ ije ozi 1992, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa Alaeze ji 35 pasent rịa elu—site na 49,171 ruo 66,211! Ma ọ gwụbeghị n’ebe ahụ, ebe ndị nkwusa ahụ nọworo na-arụsi ọrụ ike, dị ka a hụrụ site n’ịrị elu dị mma nke ọnụ ọgụgụ akwụkwọ Bible, gụnyere magazin, ndị e tinyere. Ha ejiwo akwụkwọ nta dị iche iche meekwa ihe nke ọma, na-etinye 1,654,559. Nke ahụ ji ihe karịrị okpukpu atọ karịa ọnụ ọgụgụ nke afọ gara aga bụ́ 477,235! Gịnị bụworo nzaghachi nye akwụkwọ a nile e tinyere? Ịrị elu okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ ọmụmụ Bible ebe obibi. Ugbu a a na-eduzi 38,484 ọmụmụ Bible.
Ọzọ, ikere òkè n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka ji 94 pasent rịa elu. O doro anya na nke a so kpata ngụkọta dị ịrịba ama nke ndị ọhụrụ na-eso ụzọ e mere baptism, 26,986 ma e jiri ya tụnyere 6,570, bụ́ ọnụ ọgụgụ nke afọ gara aga, ịrị elu dị egwu nke 311 pasent!
Olee otú ụfọdụ n’ime ndị ọhụrụ a na-eso ụzọ e mere baptism si nwee mmasị nke mbụ ya n’ozi ọma ahụ? Mgbe ụfọdụ, nchegbu miri emi nke Onyeàmà na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ so n’ihe na-akpata ya. Otu onye isi oche ndị nlekọta si Moldova na-akọ, sị:
“Mụ na nwunye m letara otu nwanyị onye gosiworo mmasị na mbụ n’eziokwu Bible. A malitere iduziri ya ọmụmụ Bible. Otú ọ dị, di ya egosighị mmasị ọ bụla. Otu ụbọchị mgbe anyị nọ n’ụzọ ileta nwanyị ahụ iji gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ, ihu igwe jụrụ oyi nke ukwuu, snow na-adakwa. O siri ike onye ọ bụla ịpụta n’okporo ámá, ma anyị ruru ụlọ ya kpọmkwem n’oge a kara aka. Ọ gwara di ya, sị: ‘Ị̀ hụrụ ókè hà aṅaa ndị a na-eche banyere anyị? Ha bịara n’oge n’agbanyeghị snow na-ada.’ Ihe a merenụ kpaliri di ya iche echiche. Ọ gbanwere uche ya ma sonye n’ọmụmụ ihe ahụ, ugbu a kwa ya na nwunye ya bụ Ndịàmà e mere baptism.”
N’oge ndị ọzọ àgwà ọma nke Onyeàmà pụrụ ịkpalite mmasị n’ozi ọma ahụ. Otu okenye, nke sikwa Moldova, nwere ahụmahụ nke a:
“Otu nwoke m letara n’ókèala ebe m na-eme nkwusa enweghị mmasị ná Ndịàmà Jehova. Ọ sị na ya na-ekpe chọọchị Orthodox, otu chọọchị ahụ nna ya na nna nna ya na-ekpe. Ya mere ọ gwara m ka m hapụ ụlọ ya. Otú ọ dị, tupu m hapụ, o nyere m ohere ịgwa ya ihe mere m ji leta ya. M zoro aka na Matiu 28:19, nke na-asị: ‘Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ.’ M nyezịrị ya adres ebe anyị na-enwe nzukọ wee pụọ. Dị ka ihe ijuanya nye m, mgbe otu izu gasịrị nwoke a bịara nzukọ anyị! Ọ nọgidere ruo mgbe usoro ihe omume ahụ gasịrị. Ọ kọwara na n’izu ahụ dum, ọ nọwo na-akwa ụta n’ihi imesowo m omume na-adịghị mma. A maliteere ya ọmụmụ Bible ozugbo ahụ, ugbu a kwa ọ bụ otu n’ime ụmụnna anyị.”
Ihe ọzọ pụtara ihe n’afọ ije ozi a abụwo nzaghachi dị ukwuu maka mkpa nke ụmụnna anyị ndị nọ n’ebe ahụ. N’oge oyi nke afọ 1991 na 1992, e zigaara ndị nọ ná mkpa ihe dị ka 400 tọn nke nri na ókè dị ukwuu nke uwe ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka. E kesara ihe ndị a kpọmkwem n’akụkụ nile nke ókèala Soviet Union oge mbụ, ọbụna ruo Irkutsk dị na Siberia na Khabarovsk, nso Japan. N’ezie ọ bụ ihe àmà dị ịrịba ama na-egosi na Jehova echezọbeghị ịhụnanya ụmụnna anyị gosiworo n’ebe aha ya dị! Ihe àmà nke a nke ịhụnanya ụmụnna nke mmụọ Jehova kpaliri arụpụtawokwa ime ka ha na ezinụlọ ha gburugburu ụwa dịrị n’otu. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwanyị na Ukraine degaara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ, sị:
“Aka unu nyeere anyị metụrụ anyị n’ala ala obi. O mere ka anya mmiri gbaa anyị, anyị wee kelee Jehova Chineke n’ihi na o chezọghị anyị. N’eziokwu, anyị nwere ihe isi ike nke ihe onwunwe ugbu a, ma n’ihi enyemaka rutere site n’aka ụmụnna anyị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, anyị nwetaghachiri onwe anyị n’ụzọ ihe onwunwe. Ugbu a, n’ihi enyemaka unu, ezinụlọ anyị ga-enwe ike itinyekwu oge n’ozi Jehova. Ọ bụrụ uche Jehova, mụ na ada m ga-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa nile nke oge okpomọkụ.”
Ọzọkwa, ọrụ enyemaka ahụ gbaara ndị nọ n’èzí ama n’ihi na ndị na-ekiri ihe na-emenụ pụrụ ịhụ na Ndịàmà na-egosipụta ịhụnanya site n’omume ha. Otu ezinụlọ si ọgbakọ ọzọ dere, sị: “Anyị natara ihe enyemaka ihe onwunwe ahụ nke nri na uwe mejupụtara. O buru ibu nke ukwuu! Nkwado na agbamume unu bụ ihe mmụta nye anyị na anyị onwe anyị kwa kwesịrị imere ndị ọzọ ihe ọma. Ihe omume ịhụnanya nke a abụghị ihe nzuzo nye ndị na-ekweghị ekwe na ndị nwere mmasị na ezinụlọ ha; ọ bụwo oké àmà banyere ezi òtù ụmụnna.”
Mgbakọ distrikti ise na otu mgbakọ mba nile e nwere n’ọnwa June na July gara aga, ndị nwere isiokwu bụ “Ndị Na-enye Ìhè” bụ ihe àmà ọzọ nke ngọzi Jehova n’ịrụsi ọrụ ike nke Ndịàmà ya na ịhụnanya ha gosiworo maka ime ka a mara aha ya. Ndị bịara mgbakọ ndị a dị 91,673 mmadụ, e mekwara 8,562 mmadụ baptism. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara bụ na St. Petersburg, ebe e nwere mgbakọ mba nile ahụ, ebe 46,214 mmadụ—gụnyere ndị bịara abịa site 30 mba gburugburu ụwa—zukọrọ na n’ama egwuregwu Kirov Stadium.
Na Siberia otu nwoke dị ihe dị ka 60 afọ bịara n’ala mgbakọ ahụ na Irkutsk nanị iji kirie anya. Ọ sịrị: “Ndị nile bịara yi ákwà nke ọma, nwee ihu ọchị, na-emesokwa ibe ha ihe n’obi ọma. Ndị a dị ka otu ezinụlọ dị n’otu. Mmadụ pụrụ ịhụta na ha bụ ndị enyi ọ bụghị nanị n’ama egwuregwu ahụ kamakwa ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị. Enwetara m akwụkwọ Bible mara nnọọ mma ma mụta nke ọma karị ụdị nzukọ nke a bụ. Achọrọ m ịnọgide na-eso Ndịàmà Jehova na-emekọ ihe na iso ha na-amụ Bible.”
N’otu mgbakọ ahụ na Irkutsk, ebe 5,051 mmadụ bịara, otu nwanyị nwere mmasị si Yakut Republic, Siberia, kwuru, sị: “M lere ndị ahụ anya, ọ gụọkwa m agụụ ibe ákwá n’ọṅụ. Enwere m ekele dị ukwuu nye Jehova na o nyeere m aka ịmata ndị dị otú ahụ. N’ebe a ná mgbakọ a, enwetawo m akwụkwọ, achọkwara m isoro ndị ọzọ kwurịta okwu banyere ya. Achọsiri m ike ịbụ onye na-efe Jehova ofufe.”
Onye nlekọta nke ama egwuregwu Central Stadium dị n’Alma Ata, Kazakhstan, ebe 6,605 mmadụ bịara mgbakọ, kwuru ihe na-esonụ: “Akparamagwa unu masịrị m nke ukwuu. Ugbu a emewo ka m kweta na unu nile, ụmụaka na ndị okenye, bụ ndị dị ùgwù. Apụghị m ikwu na m kwere na Chineke, ma ekwenyere m n’ihe nsọ ndị òtù ụmụnna unu gosipụtara, n’akparamagwa unu n’ebe ihe ime mmụọ na ndị nke ihe onwunwe dị.”
Otu onye uwe ojii ná mgbakọ e mere n’Alma Ata kwuru, sị: “Ezutewo m unu ugbo abụọ, nke ọ bụla ná mgbakọ. Ọ bụ ihe na-enye ọṅụ nke ukwuu iso Ndịàmà Jehova rụkọọ ọrụ.”
Romania
Jehova echezọbeghịkwa ịhụnanya ụmụnna nọ na Romania gosiworo n’ebe aha ya dị. Ọtụtụ ihe obi ụtọ weere ọnọdụ maka Ndịàmà n’afọ ije ozi a gara aga. Nke mbụ, e guzobekwara ọzọ otu alaka ụlọ ọrụ na Bucharest. Ọrụ ikpeazụ iwu kwadoro kwụsịrị na 1949. Ụlọ ọrụ ahụ nwere ihe dị ka 20 ụmụnna ndị ikom na ndị inyom na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ọhụrụ ahụ. Alaka ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka 24,752 ndị nkwusa—ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwetụworo mgbe ọ bụla nke e ruru n’April nke bụkwa ịrị elu 21 pasent karịa nkezi nke afọ gara aga.
Mgbe ọtụtụ afọ nke ime nkwusa nzuzo gasịrị, ndị nkwusa ahụ na-emewanye mgbanwe nke ọma ikwekọ n’ọrụ ịgba àmà n’ihu ọha site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Otu ahụmahụ sitere na Mureş County na-egosi otú ụfọdụ Ndịàmà siworo jiri ohere ọ bụla nke ikwusara ndị ọzọ ozi ọma, ọbụna mgbe ha na-eme njem, mee ihe nke ọma. Alaka ụlo ọrụ ahụ na-ede, sị:
“Otu onye nkwusa kpebiri ime nkwusa site n’otu nkeji ụgbọ okporo ígwè gaa n’ọzọ. Mmeghachi omume nke ndị mmadụ bụkarịrị nke dị mma, ma ná nkeji nke ikpeazụ, ihe isi ike ụfọdụ malitere. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị ahụ na-eme njem chọrọ iwere magazin anyị. N’ikpeazụ, otu nwoke, onye oké iwe were, biliri ọtọ tie mkpu, sị: ‘M ga-esi na windo tụfusịa magazin gị nile! Gịnị ka i ji jiri okpukpe gị na-enye anyị nsogbu otú a?’ Onye nkwusa ahụ ji nwayọọ zaghachi na ọbụna ma ọ bụrụ na ọ tụfuo magazin ndị ahụ, onye ọzọ pụrụ irite uru site n’ihe o mere—ndị ga-atụtụrụ magazin ndị ahụ. Ka ọ hụtara ịdị jụụ nke onye nkwusa ahụ, ọ masịrị nwoke ahụ nke ukwuu nke na ọ naara magazin ndị ahụ malite ikesa ha n’onwe ya nye ndị ọzọ na-eme njem nọ ná nkeji ụgbọ ahụ. Dị ka ihe ijuanya, ha nile weere magazin. Mgbe o kesasịrị ha, nwoke ahụ enweghị nke ọ bụla maka onwe ya. Ya mere, onye nkwusa ahụ jụrụ ya, sị: ‘Ọga, ị̀ chọghị magazin nke ọ bụla maka onwe gị?’ Mgbe ahụ nwoke ahụ pụụrụ otu n’ime magazin ndị ahụ site n’aka onye njem nwere abụọ wee sị: ‘Ugbu a otu magazin erutewo m!’”
N’ọtụtụ mba, ọrụ nkwusa Ndịàmà Jehova akpalitewo mgbe ụfọdụ mmegide nke ndị ụkọchukwu Krisendọm. Na Romania, ndị ụkọchukwu nke Chọọchị Orthodox na-enwekarị ọnụma n’ebe Ndịàmà nọ. Ma nke a apụghị ịkwụsị Jehova ịgọzi ndị ya n’ihi ịhụnanya ha gosiworo n’ebe aha ya dị. Otu onye nlekọta sekit na-ede, sị:
“Anyị so ọgbakọ anyị na-eleta jee ozi n’ime ime obodo. E nwere otu narị ụmụnna. Anyị nwetara otu ụgbọ bọs nke buuru anyị banye 50 kilomita n’ime ime obodo ahụ, gaa n’otu obodo nta. Anyị kpọrọ ọtụtụ ndị òkù ịbịa maka okwu ihu ọha nke e nwere n’Ụlọ Nzukọ Omenala. Ozugbo nzukọ ahụ malitere, ụkọchukwu chọọchị Orthodox ahụ bịarutere iji kpaghasịa nzukọ anyị. Ndị uwe ojii nwara ịkwụsị ụkọchukwu ahụ. Ka o sina dị, ọ jụrụ iwelata obi. Ihe gaara ya nke ọma n’ịkwụsị nzukọ ahụ mgbe ọ kụwara ugegbe dị n’ụzọ mbata bụ isi. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị bi n’ógbè ahụ ekwenyeghị n’àgwà ụkọchukwu ahụ. A pụzịrị ịgbara ndị nile bịaranụ àmà dị mma, e kesakwara ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke akwụkwọ.”
Ọ bụ ihe mwute na n’akụkụ ụfọdụ nke mba ahụ, e nwere ọnụ ọgụgụ Ndịàmà dị nnọọ nta. Mgbe otu onye ọsụ ụzọ oge nile rutere nke mbụ ya n’ógbè mba Olt, ọ hụrụ nanị ụmụnna itoolu n’ógbè ahụ dum na ókèala buru ibu a ga-ekwusa ozi ọma na ya. Mgbe otu afọ gasịrị ọnụ ọgụgụ Ndịàmà ahụ rịrị elu ruo 27, nke ise n’ime ha bụ ndị nkwusa a tụteghachiri. Onye ọsụ ụzọ ahụ nwetara ebe obibi n’obodo Corabia, bụ́ ebe a na-enweghị Ndịàmà ọ bụla. Mgbe Ndịàmà ahụ nọworo nanị 45 ụbọchị, onye ụkọchukwu na-elekọta chọọchị dị n’ebe ahụ kwugidere ọrụ ha na redio ndị Craiova. Ọ sịrị na ha ejiriwo ozizi ha “wakpo” obodo Corabia, na-anwa ime ka ndị mmadụ gbanwee okpukpe ha. Mwakwasị ahụ gara n’ihu, na-enwe nzube nke ịkwụsị ọrụ ahụ na ibibi ezi aha Ndịàmà ahụ n’ógbè ahụ. O ruru nsọtụ ya mgbe ụmụnna nọ n’ebe ahụ nọ na Bucharest maka mgbakọ distrikti. Ụkọchukwu na-elekọta chọọchị Orthodox dị na Corabia mara ọkwa siri ike mgbe o duzisịrị chọọchị ya: “Anyị nile kwesịrị ime ngagharị n’okporo ámá iji kpalie ndị uwe ojii ka ha mee ihe megide Ndịàmà, bụ́ ndị kesasịworo akwụkwọ ha n’ógbè ahụ dum, meekwa ndị mmadụ nsí.” Ma kpọmkwem n’abalị tupu ụbọchị nzukọ ahụ ga-ewere ọnọdụ, ihe dị egwu mere. Otu ìgwè ndị na-ebibi ihe ọha bibiri katidral ahụ na Ụlọ Nzukọ Omenala Obodo ahụ. Ya mere, nzukọ mmegide ahụ adịghị mgbe o weere ọnọdụ!
Ókèala ebe bụbu Yugoslavia
Afọ ije ozi 1992 abụwo nke siri oké ike maka ụmụnna n’ókèala Yugoslavia. Ma, n’otu oge ahụ ha enwewo ahụmahụ ụfọdụ na-enye ọṅụ. Ọ bụ ihe obi ụtọ na Jehova adịghị echezọ ọrụ ha na ịhụnanya ha gosiri n’ebe aha ya dị.
Agha bu ụzọ malite na Slovenia, e mesịa na Croatia, e mesịakwa na Bosnia na Herzegovina. N’ime otu afọ, site n’otu mba ukwu, Mba ise ọhụrụ na-achọsi ike iguzobe ókèala, iwu, na ego ndị nke ha. Ọtụtụ narị Ndịàmà aghaghị ịhapụ ebe obibi ha wee soro ụmụnna ha biri n’ebe ndị ọzọ. Dị ka e mere ná mba ndị ọzọ n’Ọwụwa Anyanwụ Europe, a họpụtara kọmitii dị iche iche na-ahụ maka ọnọdụ mberede n’obodo ndị ka ibu, ha na-ahụ maka inye ụlọ, nri, na uwe maka ụmụnna anyị ndị nọ ná mkpa. N’ime afọ ije ozi 1992, e kesaara ụmụnna ihe dị ka 55 tọn nke nri n’ọgbakọ ndị dị n’ebe ndị e nwere nsogbu. A natawo ọtụtụ akwụkwọ ozi ekele.
Ụmụnna nọ na Dubrovnik kọrọ otú ha si nwee obi ekele maka enyemaka a natara. Ka otu nwanyị ji ngwugwu nri ya na-ala n’ebe obibi ya, otu onye agbata obi jụrụ ya ebe o si zụta àkwá ndị ahụ. Nwanna nwanyị ahụ gwara ya na ụmụnna ime mmụọ ya nọ ná mpaghara ọzọ zitere ha. Ọ tụrụ onye agbata obi ahụ n’anya. N’ihe ọzọ merenụ, otu nwoke a na-amaghị ama si Slovenia kpọrọ otu okenye wee sị: “Anụwo m na Ndịàmà Jehova na-ekesa nri ha natara n’aka ụmụnna ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ezigaworo m ndị mmadụ ọtụtụ ngwugwu; otú ọ dị, ọ dịghị nke ruru ebe e zigara ya. M̀ pụrụ izitere unu ihe enyemaka ndị ahụ ka unu wee kesaa ha?” Akwụkwọ akụkọ dị iche iche na redio kọkwara akụkọ ọma banyere ọrụ enyemaka anyị.
Otu nwanna e mere baptism ná mgbakọ mba nile e mere na Zagreb na 1991 maara banyere ihe isi ike ndị ahụ na-arịwanye elu wee zụrụ otu ụlọ ahịa na-ere nri. O bugara nri ahụ n’ụlọ ya nke dị nso n’ebe ahụ a na-alụ agha. Ka ụkọ nri ahụ kawanyere njọ, ihe nke a ghọrọ ezi ngọzi nye ụmụnna ahụ.
O kwere omume ịnata ikike ka nnukwu gwongworo buga nri ndị bụ isi maka ụmụnna ahụ e ji eji na Sarajevo. Obi dị anyị ụtọ ikwu na e nwere ihe ịga nke ọma n’ibuga nri ndị ahụ.
Ọgụ ahụ egbuwo ọtụtụ ndị nkịtị. Ka ọ na-erule ọgwụgwụ afọ ije ozi ahụ, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị isii na mmadụ abụọ nwere mmasị atụfuwo ndụ ha, e merụwokwa ụfọdụ ahụ.
Otú ọ dị, ọtụtụ ahụmahụ na-egosi na ọ bụ ihe nchebe ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’otu ihe merenụ, ụmụnna na-aga mgbakọ distrikti e nwere na Belgrade mgbe ndị soja kwụsịrị bọs ahụ, na-ajụ ma e nwere ndị òtù nke otu okpukpe kpọmkwem n’etiti ha. Ụmụnna ahụ zaghachiri na e nweghị. Ọ dị mkpa ha igosi kaadị e ji amata ha, ụfọdụ n’ime ha nwekwara aha ndị na-egosi na ha pụrụ ịnọ n’okpukpe ahụ. Ndị soja ahụ boro ha ebubo ịgha ụgha, ma ụmụnna nwere akwụkwọ ịma ọkwa ha na ha ahapụwo chọọchị ahụ; n’agbanyeghị na a mụnyere ha n’ime okpukpe ahụ, ka ha kwuru, ha bụ ugbu a Ndịàmà Jehova, na-aga mgbakọ ha. N’ihi nke a ndị soja ahụ nyere ha ohere ka ha gawa.
Ndị ọsụ ụzọ na-anọgide n’ozi ha n’ịnụ ọkụ n’obi na-adịghị adanyụ adanyụ, nke a abụwokwa ezi ike mkpali n’ọrụ ahụ. A na-asụgharị Ụlọ Nche, nke ihu ya nwere kọlọ zuru ezu ndị mara mma, n’asụsụ nile bụ isi n’ógbè ahụ n’otu oge ahụ. Mgbe nile ọ na-enye ndị hụrụ eziokwu na ezi omume n’anya ‘òkè nri ime mmụọ ha n’oge ya.’ (Luk 12:42) N’ime afọ ije ozi 1992, e mere 674 ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị baptism.
N’ikwu eziokwu, Chineke echezọbeghị ọrụ ụmụnna nọ n’Ọwụwa Anyanwụ Europe na ịhụnanya ha gosiworo n’ebe aha ya dị. Ọzọkwa, ọ na-achọ ka ndị nile na-efe ya ofufe, n’agbanyeghị ebe ha bi, na-agbaso ndụmọdụ ọma ọzọ Pọl nyere, ná Ndị Hibru 6:11, nke na-asị: “Ọ na-agụ anyị agụụ ka unu nile n’otu n’otu wee na-egosi otu ịnụ ọkụ n’obi ahụ ka unu wee nwezuo olileanya anyị ruo ọgwụgwụ ihe nile.”