Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 1/15 p. 3-4
  • À Ga-eweli gị Gaa N’eluigwe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Ga-eweli gị Gaa N’eluigwe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Echiche Dị Iche Iche Banyere Nnwogha
  • ‘Ịbụ Ndị E Weliri Izute Onyenwe Anyị’—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Nnapụta Unu Na-eru Nso”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • “Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 1/15 p. 3-4

À Ga-eweli gị Gaa N’eluigwe?

ỌTỤTỤ ndị kwere na ha ga-aga eluigwe mgbe ha nwụrụ. Ma ụfọdụ chere na a ga-eweli ha gaa n’eluigwe n’ihe a kpọrọ nnwogha. Nke ahụ ọ̀ bụ olileanya gị?

Nnwogha bụ “nde kwụrụ nde mmadụ isoro ikuku laa na mberede n’enweghị ụzọ ọ bụla a ga-esi chọpụta ebe ha gara!” Otú ahụ ka otu onye okwuchukwu Protestant kwuru. Dị ka akwụkwọ bụ́ Evangelical Dictionary of Theology si kwuo, okwu ahụ bụ́ “nnwogha” na-ezo aka ná “njikọ nke chọọchị na Kraịst n’ọbịbịa ya nke ugbo abụọ.”

Ọ na-enye ụfọdụ nsogbu n’obi iche echiche banyere ịhapụ ndị enyi na ndị ezinụlọ ha ije zute Jisọs Kraịst. Ma, ọtụtụ kwere na nnwogha ahụ aghaghị iwere ọnọdụ. Ọ̀ ga-ewere ọnọdụ? Ya bụrụ otú ahụ, olee mgbe?

Echiche Dị Iche Iche Banyere Nnwogha

Bible na-egosi na tupu mmalite nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst nke e kwere na nkwa, a ga-enwe oge a kpọrọ “mkpagbu ukwu.” Jisọs kwuru, sị: “Mgbe ahụ ka mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21; Mkpughe 20:6) Ụfọdụ na-ekwu na nnwogha ahụ ga-eme tupu mkpagbu ukwu ahụ. Ndị ọzọ na-atụ anya ya n’oge ahụ. Ma ndị ọzọkwa na-eche na nnwogha ahụ ga-abịa mgbe ihe isi ike ahụ na-eweghị atụ gasịrị.

Echiche nke na nnwogha ahụ ga-eme mgbe mkpagbu ahụ gasịrị jupụtara ebe nile ruo ná mmalite nke narị afọ nke 19. N’oge ahụ, n’England otu òtù bilitere nke onye nọ n’isi ya bụ otu onye bụbu ụkọchukwu Chọọchị nke Ireland, bụ́ John Nelson Darby. Ya na ndị Anglikan nwere otu echiche ahụ ghọrọ ndị a maara dị ka Ndị Brọda. Site n’ebe o guzobere chọọchị ya na Plymouth, Darby mere njem ime nkwusa na Switzerland nakwa n’ebe ndị ọzọ na Europe. O kwusiri okwu ike na nlọghachi Kraịst ga-ewere ọnọdụ ná nkebi abụọ. Ọ ga-amalite site ná nnwogha nzuzo, nke a ga-anọ na ya welie “ndị senti” tupu oge mkpagbu ga-ewe afọ asaa ebibie elu ala. Mgbe ahụ Kraịst ga-apụta n’ụzọ a ga-ahụ ya anya, ya na “ndị senti” ndị a, ha ga-ejikọkwa aka ọnụ wee chịa elu ala ruo otu puku afọ.

Darby mesiri ike mkpa ọ dị ịnọpụ iche n’ụwa, ndị nwere ụdị echiche ya ahụ mesịkwara ghọọ ndị a maara dị ka Ndị Brọda Nọpụrụ Iche. B. W. Newton nọ n’isi òtù dị iche nke kwere ná nnwogha, kama ọ bụghị na nke ga-eme tupu oge mkpagbu. Onye na-akpọsa nnwogha nke ga-eme mgbe mkpagbu gasịrị bụ́ Alexander Reese nọgidere na-ekwu na “ozizi Nnwogha Nzuzo na-eyi olileanya nke Ọbịbịa Kraịst egwu.”

Ndị kwere ná nnwogha nke ga-eme tupu oge mkpagbu kwere na ọdịiche nke e nwere n’ụzọ e si eche echiche dị oké njọ nke na ọ pụrụ imetụta “ọdịdị nke olileanya [ha] n’ihe banyere ọbịbịa nke Kraịst.” Ndị ọzọ tụkwasịrị obi ike ha ‘n’ozizi nnwogha ụzọ abụọ,’ na-ekwere na a ga-ebu ụzọ welie ndị ahụ kasị nọgidesie ike n’ihe nye Kraịst, e mesịakwa a ga-eweli ndị bitụrụ ndụ ụwa.

Ọtụtụ ìgwè ndị na-ekwu okwuchukwu na-akpọsa nnwogha nke dị nso nye ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi. Otú ọ dị, n’ihi echiche dịgasị iche iche e nwere, otu akwụkwọ nta nke Chọọchị Elim Pentecostal nke Britain bipụtara na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na anyị kwetara n’usoro sara mbara nke ihe omume ndị metụtara nlọghachi nke Onyenwe anyị Jisọs . . . , a hapụrụ ka onye ọ bụla nwere onwe ya n’ịkọwa amụma n’ụzọ kwekọrọ ná nkweta nke onye ahụ. Ọtụtụ na-anakwere ịghara ijigidesi nkwenkwe ike, jiri ndidi na-echere ka ihe omume ndị ahụ onwe ha kpughee usoro ihe omume amụma ahụ.”

Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, bụ ụkpụrụ nke ọ dị mkpa ka anyị jiri tụọ eziokwu nke nkwenkwe nile n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. (2 Timoti 1:13; 3:16, 17) Ya mere, gịnị ka ọ na-ekwu banyere nnwogha?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya