Ihe Ọma Megide Ihe Ọjọọ—Agha Nọworo Ogologo oge
N’IHE nkiri nke oge ndị gara aga, “onye ọma” na-emerikarị ike nile dị njọ. Ma ihe bụ eziokwu adịchabeghị mfe otú ahụ. Ọtụtụ mgbe, n’ihe na-eme eme n’ezie n’ụwa, ihe ọjọọ yiri ka ọ na-enwe mmeri.
Akụkọ ndị na-eyi egwu banyere ihe ọjọọ na-ejupụta n’akụkọ ụwa ndị a na-enye n’oge abalị. N’ebe ugwu nke United States, otu nwoke onye Milwaukee gburu mmadụ 11 ma dọbanye ozu ha e berisịrị eberisị n’ime friji ya. Gbadaa n’ebe ndịda, otu onye a na-amaghị ebe o si wabatara n’ime otu ụlọ oriri dị na Texas wee malite ịkwa mgbọ aghara aghara ruo minit iri, na-egbu 23 mmadụ, gụnyere onwe ya. Otu onye mmegide obi jọrọ njọ na Korea mụnyere ọkụ n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, na-egbu 14 ndị na-efe ofufe.
Ọ bụghị nanị na e nwere ntiwapụ ihe ọjọọ ndị a na-eme mgbe ụfọdụ kama e nwekwara ihe ọjọọ ọzọ na-eyi egwu nke na-emetụta ụwa—mkpochapụ. A na-agbakọ na a lawo otu nde ndị Armenia, nde ndị Juu isii, na ihe karịrị otu nde ndị Cambodia n’iyi ná mkpochapụ agbụrụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị e meworo na nanị narị afọ nke a. Ihe ahụ a kpọrọ ihichasị agbụrụ adakwasịwo ọtụtụ ndị n’ebe bụbu Yugoslavia. Gburugburu ụwa, ọ dịghị onye maara ọtụtụ nde ole nke ndị aka ha dị ọcha e mekpọworo ọnụ n’ụzọ ọjọọ.
Ọdachi ndị yiri ndị a na-amanye anyị iche ajụjụ ahụ na-enye nsogbu n’obi ihu, nke bụ́, N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji eme omume n’ụzọ dị otú ahụ? Anyị apụghị iwezụga omume ọjọọ ndị a n’akụkụ dị ka ihe mmadụ ole na ole uche ha na-ezughị òkè na-akpata. Nanị ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe ọjọọ e meworo na narị afọ anyị a na-emegide nkọwa dị otú ahụ.
A na-akọwa àgwà ọjọọ dị ka nke dị njọ n’omume. Ọ bụ omume nke sitere n’uche onye pụrụ ime nhọrọ n’etiti ime ihe ọma na ime ihe ọjọọ. N’otu ụzọ echiche ya nke ime ihe ọma na-ehie ụzọ, ihe ọjọọ na-enwekwa mmeri. Ma n’ihi gịnị na n’ụzọ dị aṅaa ka nke a si eme?
Nkọwa dị iche iche okpukpe na-enye ihe ọjọọ adịghị eju afọ ọtụtụ mgbe. Onye ọkà ihe ọmụma Katọlik bụ́ Thomas Aquinas sịrị na “a ga-ewepụ ọtụtụ ihe ọma ma ọ bụrụ na Chineke ekweghị ka ihe ọjọọ dịrị.” Ọtụtụ ndị ọkà ihe ọmụma Protestant nwere echiche ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, dị ka e kwuru n’akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica, Gottfried Leibniz lere ihe ọjọọ anya ịbụ “nanị ihe na-eme ka ihe ọma dị n’ụwa pụta ìhè, bụ́ nke ọ na-eme ka ọ baa ụba n’ihi ọdịiche dịnụ.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, o kwetara na ihe ọjọọ dị anyị mkpa ka anyị wee ghọta ọdịmkpa nke ihe ọma. Ụdị iche echiche dị otú ahụ yiri ịgwa onye na-arịa ọrịọ cancer na ọrịa ya bụ kpọmkwem ihe dị mkpa iji mee ka onye ọzọ nwee ezi mmetụta nke ịdị ndụ na inwe ahụ ike.
Nzube ọjọọ dị iche iche aghaghị isite n’otu ebe. Ụta ọ̀ dịịrị Chineke n’ụzọ ụfọdụ na-apụtachaghị ìhè? Bible na-aza, sị: “Ka onye ọ bụla ghara ịsị, mgbe a na-anwa ya, A na-esite n’aka Chineke anwa m: n’ihi na Chineke bụ Onye a na-apụghị iwere ihe ọjọọ nwaa ya, ya onwe ya adịghị anwakwa onye ọ bụla.” Ọ bụrụ na o siteghị n’aka Chineke, ọ̀ bụ site n’aka onye? Amaokwu ndị na-esonu na-enye azịza ya: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụwooro ime, o wee mụpụta mmehie.” (Jemes 1:13-15) Otú a a na-amụ ihe ọjọọ mgbe a zụlitere ọchịchọ ọjọọ kama ịjụ ya ajụ. Otú ọ dị, ọ gụnyere ihe karịrị nke ahụ.
Akwụkwọ Nsọ na-akọwa na ọchịchọ ọjọọ na-ebilite n’ihi na ihe a kpọrọ mmadụ nwere ọrụ́ bụ isi—ezughị okè dị n’ime. Pọl onyeozi dere, sị: “Dị ka mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) N’ihi mmehie e ketara eketa, ọchịchọ ọdịmma onwe onye pụrụ imebi obi ọma n’echiche anyị, obi ọjọọ pụkwara imeri ọmịiko.
N’ezie, ihe ka n’ọtụtụ mmadụ maara site n’amamihe ha nwere site n’okike na omume ụfọdụ dị njọ. Akọ na uche ha—ma ọ bụ ‘iwu e deworo n’obi ha’ dị ka Pọl na-akpọ ya—na-adụ ha ọdụ megide ime ihe ọjọọ. (Ndị Rom 2:15) N’agbanyeghị nke ahụ, gburugburu ebe dị oké njọ pụrụ ịbịada mmetụta ndị dị otú ahụ, akọ na uche pụkwara ịghọ nke nwụrụ anwụ ma ọ bụrụ na a na-eleghara ya anya ọtụtụ mgbe.a—Tụlee 1 Timoti 4:2.
Ezughị okè mmadụ nanị ọ̀ pụrụ ịbụ ihe kpatara ihe ọjọọ a haziri ahazi nke oge anyị? Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Jeffrey Burton Russell kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe ọjọọ n’ime onye ọ bụla n’ime anyị, ma ịgbakọta ọbụna ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ihe ọjọọ dị iche iche adịghị eme ka a ghọta ihe mere a e ji nwee ogige ịta ahụhụ Auschwitz . . . Ihe ọjọọ n’ogo dị otú a na-eyi ka ọ dị iche n’ọdịdị na n’ịdị ukwuu.” Ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ ma ọ́ bụghị Jisọs Kraịst bụ onye kọwara n’ụzọ pụtara ìhè ọdịdị nke a nke isi iyi ihe ọjọọ dị iche.
N’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya, Jisọs kọwara na ndị ikom ahụ na-eme atụmatụ igbu ya abụghị kpam kpam ná nchepụta nke onwe ha ka ha na-eme ya. Ike a na-adịghị ahụ anya duziri ha. Jisọs gwara ha, sị: “Unu onwe unu sitere na nna unu, bụ́ ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime. Onye ahụ bụ ogbu mmadụ site na mbụ, o guzoghịkwa n’eziokwu.” (Jọn 8:44) Ọ pụtara ìhè na Ekwensu, onye Jisọs kpọrọ “onye isi ụwa,” nwere ọrụ dị ukwuu ọ na-arụ n’iwulite ihe ọjọọ.—Jọn 16:11; 1 Jọn 5:19.
Ma ezughị òkè mmadụ ma ikike nke Setan arụpụtawo ịta ahụhụ dị ukwuu ruo ọtụtụ puku afọ. Ọ dịghị kwa ihe àmà dịnụ na ha na-ebeleta aka ha ji ihe a kpọrọ mmadụ. Ihe ọjọọ ọ̀ ga-anọgide n’ebe a? Ka ike nile nke ihe ọma ọ̀ ga-emesi n’ikpeazụ kpochapụ ihe ọjọọ?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’oge na-adịbeghị anya ndị na-eme nnyocha ahụwo ihe njikọ dị n’etiti ime ihe ike doro anya a na-ahụ na telivishọn na mpụ nke ụmụaka. N’ogbe ebe ndị a na-emekarị mpụ na ezinụlọ ndị na-adịghị n’otu bụkwa ihe ndị dị n’àgwà ọjọọ nke ọha mmadụ. N’otu Nazi nke Germany, okwu mmegide nke ịkpa ókè agbụrụ a na-ekwu mgbe nile dubara ọtụtụ ndị igosi izi ezi—na ọbụna ito—oké ihe ọjọọ e mere megide ndị Juu na ndị Slav.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
Ihu peji: Foto U.S. Army
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Foto U.S. Army