Ihe Ndị A Hụrụ n’Ala Nkwa Ahụ
Ṅụrịa Ọṅụ! Ebe Nzọcha Mmanụ ahụ Jupụtara ná Mmanụ
JOEL onye amụma gbara ume ka ‘ụmụ Zaịọn tegharịa egwu ọṅụ, ṅụrịakwa ọṅụ na Jehova.’ O ji mmanụ olive mee ihe n’ịkọwa ọṅụ na ịba ụba ha: “Ebe nzọcha ọka nile ga-ejupụtakwa n’ọka wheat, ebe ịnara mmanya vine na mmanụ ga-erubigakwa ná mmanya vine ọhụrụ na mmanụ ọhụrụ.”—Joel 2:23, 24.
Ọ bụrụ na i biri n’Israel n’oge Bible, ị gaara enwe obi ụtọ inwe osisi olive dị nso n’ụlọ gị, ma ọ bụ n’ubi gị, dị ka nke ahụ e gosiri n’elu.a Ọ gaara eme ka ndụ dịịrị gị mfe karị, dị ụtọ karị. N’ihi gịnị ka osisi olive ga-eji dị oké mkpa?—Tụlee Ndị Ikpe 9:8, 9.
Nke mbụ, leruo osisi gị anya nke ọma. Osisi olive pụrụ ịdị ndụ ruo ọtụtụ narị afọ, ụfọdụ ruo ihe karịrị otu puku afọ, ya mere nnyocha yikarịrị ka ọ ga-egosi úkwù nke nwere akpụ̀, nke na-acha ntụ ntụ. Osisi gị pụrụ iru 6 mita n’ịdị elu, n’ezie o torughị ogologo dị ka osisi cedar ma ọ bụ maa mma dị ka osisi nkwu. Akwụkwọ ya nke na-adịghị achanwụ achanwụ, nke nwetụrụ ụcha ọlaọcha, na-enye ndo n’oge nile n’afọ. Ma, ị gaghị eji osisi gị kpọrọ ihe n’ụzọ bụ isi maka ọdịdị ya ma ọ bụ ndo ya. Ọ dịghị otú ahụ n’ezie.
Mkpụrụ osisi ahụ bụ ihe dị mkpa, ọtụtụ puku olive ndị ahụ na-acha ka akwụkwọ ndụ ma ọ bụ na-eji nji! Nke ahụ bụ ihe ga-eme ka osisi olive bụrụ isi ihe dị mkpa ná ndụ na ihe omume ndị a na-eme n’Israel. Osisi ahụ na-ejupụta n’okooko osisi na-achatụ ọcha na May, ná nkwadebe maka mkpụrụ olive ndị ahụ. (Job 15:33) Ka mkpụrụ ndị a na-acha, ha pụrụ ịgbanwe site n’ịchatụ ka ngwakọrịta odo odo na akwụkwọ ndụ gaa ná nchara na-eji nji ma ọ bụ ojii.
Ịghọ mkpụrụ olive n’agbata October na November bụ ọrụ siri ike. Ị ga-eji mkpara osisi na-apịa n’osisi ahụ ka mkpụrụ ndị chara acha wee danye n’ákwà ndị a tọrọ n’ala. (Deuterọnọmi 24:20) A ga-asa mkpụrụ olive ndị ahụ mmiri tupu e jiri ya mepụtawa ihe, dị ka site n’ịbanye ya ná mmiri nnu iji wepụ ilu ahụ na-adịkarị ha n’ahụ. Gịnị ọzọ?
Nke ahụ ga-adabere n’ụzọ ị chọrọ isi rie ya ma ọ bụ rite uru n’owuwe ihe ubi gị bara ụba. Ị pụrụ ịta mkpụrụ olive ná ndụ, ma ọ bụ ị pụrụ ichebe ha ná mmiri nnu ka ezinụlọ gị wee nwee nke dị ụtọ ha ga na-eri ruo ọtụtụ ọnwa. Olive pụrụ ịbụ akụkụ bụ isi nke nri a na-eri mgbe mgbe, bụ́ ihe oriri nke ihe mejupụtara ya ma eleghị anya bụ olive nwere ụtọ nke ya na achịcha barley.
Otú ọ dị, ma eleghị anya ị ga-etinye ihe ka ọtụtụ ná mkpụrụ olive n’usoro ahụ dị mkpa iji nweta ihe ahụ bara oké uru ma dị oké mkpa—mmanụ olive. Ị pụrụ inweta mmanụ ndị dị n’ụdị dị iche iche, na-eji ndị a eme ihe n’ọtụtụ ụzọ. Nke mbụ, ị pụrụ ịsụtụ ya asụ ma ọ bụ kwọrie mkpụrụ olive ndị ahụ n’ikwe ma ọ bụ ọbụna jiri ụkwụ zọchaa ha. (Maịka 6:15) Nke ahụ na-emepụta mmanụ kasị mma, nke a na-akpọ ugbu a mmanụ kasị bụrụ ọkpọka, bụ́ nke kwesịrị ekwesị maka oriọna ndị na-enye ìhè n’ụlọ ikwuu ahụ. (Ọpụpụ 25:37; 27:20, 21) Cheedị echiche otú ị ga-esi nwee mmasị inwe mmanụ nke a na-achọsi ike maka iji sie nri n’oge ndị pụrụ iche!
Olive, ọbụna ndị ahụ na-adịchaghị mma, pụrụ ịbụ ndị a wụnyere n’ebe mpịcha mmanụ iji pịpụtakwuo mmanụ site n’uru ya, ọ bụ ezie na ọ na-adị n’ụdị dị ala. Ebe uru ya bụ nke 50 pasent mmanụ mejupụtara. A pụrụ iji usoro ịpịpụta mmanụ dị iche iche mee ihe, ma e sere otu n’ebe a. E tinyere olive ndị a kwọriri nke ọma ma ọ bụ ndị a kwọrọ ọkara n’ọkwa dị okirikiri. Nkume igwe nri, nke ịnyịnya ibu ma ọ bụ mmadụ na-adọkpụgharị, na-agbagharị n’elu ha, na-apịpụta mmanụ ahụ, bụ́ nke na-agbapụta ma bụrụ nke a na-ekunye n’ite.—Matiu 18:6.
A pụrụ iji mmanụ olive tụnyere ọlaedo mmiri mmiri—ọ bara oké uru, bụrụkwa nke e ji eme ọtụtụ ihe. Otu osisi pụrụ imepụta mmanụ ga-ezuru ezinụlọ nke mmadụ ise ma ọ bụ isii mejupụtara n’otu afọ. Ọ ga-abụ akụkụ bụ isi nke nri ha na-eri mgbe mgbe, ebe ọ bụ nke na-abanye n’ahụ ngwa ngwa ma jupụta n’ihe na-enye ume. (Tụlee Jeremaịa 41:8; Ezikiel 16:13.) Ị pụrụ itinye mmanụ ụfọdụ ihe na-esi ísì ụtọ ma jiri ya mee ihe dị ka ude ma ọ bụ wụsa ụfọdụ n’isi onye ọbịa dị ka ihe ngosipụta nke ile ọbịa. (2 Samuel 12:20; Abụ Ọma 45:7; Luk 7:46) Ị pụrụ iji ya mee ihe dị ka ọgwụ na-adajụ ụfụ nke ọnyà.—Aịsaịa 1:6; Mak 6:13; Luk 10:34.
Nke ahụ agaghị abụ nanị ihe ndị ị ga-eji mmanụ olive ahụ bara ụba eme. Ị pụrụ iji ya na-amụ ọkụ n’ebe obibi gị, ịbụ akụkụ nke onyinye a na-enye Chineke, ma ọ bụ dị ka ihe a pụrụ ire iji nweta uru. Ee, n’oge Bible, osisi olive bụ osisi kachasị baa uru, ya mere Joel pụrụ iji ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị iji nọchie anya ịba ụba na ọṅụ.—Deuterọnọmi 6:11; Abụ Ọma 52:8; Jeremaịa 11:16; Matiu 25:3-8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji hụ ihe osise nke a n’ụzọ buru ibu karị, lee 1993 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.