Ì Kwesịrị Ịbụ Onye E Mere Baptism?
NDỊÀMÀ JEHOVA mere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu nde mmadụ baptism n’afọ atọ gara aga. Nke a bụ nkezi nke 824 mmadụ kwa ụbọchị, ma ọ bụ mmadụ 4 n’ime minit 7 ọ bụla. Nke a ọ bụ nanị ụdị nke ịnụ ọkụ n’obi okpukpe nke narị afọ nke 15 na nke 16?
Ee e, e meghị ndị a baptism ná mmanye, dị ka akụkụ nke ntọghata n’ìgwè, ma ọ bụ dị ka ihe sitere ná ndọrọ mmetụta uche nke onye ọkà okwu okpukpe kpalitere. E mere ha baptism n’ihi na Jisọs Kraịst, Onyenwe na Onyendú nke ndị Kraịst, nyere iwu ka e mee nke a. Ha agbasowo nzọụkwụ na ụkpụrụ ime ihe ndị Jisọs setịpụrụ na ndị ndị ozi ahụ ọ họpụtara n’onwe ya ma zụọ, jiri mee ihe.
Mgbe a kpọlitesịrị Jisọs n’ọnwụ, tupu ọ rịgorokwa n’eluigwe, o nyere ụmụazụ ya ọrụ nke a ha ga-arụ mgbe ọ lara: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu: ma lee, mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 28:19, 20) Site n’oge ahụ gaa n’ihu, nke a bụ nanị baptism ime mmiri nke nwere nkwado Chineke.
N’ụzọ kwekọrọ na nke a, Bible na-agwa anyị na ụmụazụ ndị mbụ ahụ nke Kraịst ghọrọ “ndị àmà [Jisọs] n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) Dị ka Jisọs bu ụzọ kwuo, ọrụ nkwusa na nkụzi ha ga-akpata baptism nke ndị kwere ekwe bụ́ ndị ga-abụkwa ụmụazụ Kraịst.
Ihe atụ mbụ e mere ndekọ ya banyere nke a weere ọnọdụ na Jerusalem n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A. N’oge ahụ Pita onyeozi “guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ,” wee gwa ìgwè mmadụ zukọrọnụ okwu banyere Jisọs bụ́ Mesaịa. Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị na okwu ya ‘dụrụ ha n’ime obi ha,’ ha wee jụọ maka ihe ha kwesịrị ime. “Chegharịanụ, ka e meekwa unu nile baptism n’otu n’otu n’aha Jisọs Kraịst ka e wee gbaghara mmehie nile unu,” ka Pita kwuru. Ihe si na ya pụta bụ na “ndị naara okwu ya nke ọma, e mere ha baptism: n’ụbọchị ahụ e wee tụkwasịrị ha ihe hà ka [puku mmadụ atọ].” (Ọrụ 2:14-41) Ihe ndekọ ndị ọzọ sochiri na-emesi ya ike na ndị na-eso ụzọ na-ebu ụzọ anụ ozi ndị Kraịst, na-ekwere n’ozi ọma ahụ, na-echegharịkwa, tupu baptism ha.—Ọrụ 8:12, 13, 34-38; 10:34-48; 16:30-34; 18:5, 8; 19:1-5.
N’ụzọ Dị Aṅaa?
Ma olee otú a gaje isi mee ndị ọhụrụ ndị a na-eso ụzọ baptism n’ime mmiri? Ọ̀ gaje ịbụ site ná ntasa (ifesa mmadụ mmiri), mgbasa (ịwụkwasị ya n’isi), ma ọ bụ mmikpu (ndekpu zuru ezu)? Gịnị ka ihe ndekọ Bible na-egosi? Ebe Jisọs hapụụrụ anyị ihe ilereanya ka anyị “wee soo ijeụkwụ ya nile,” n’ụzọ dị aṅaa ka e si mee ya baptism?—1 Pita 2:21.
Bible na-egosi na e mere Jisọs baptism n’ime Jọdan, osimiri butụrụ ibu. Mgbe e mesịrị ya baptism, o “si na mmiri na-arịgo.” (Mak 1:10; Matiu 3:13, 16) Ya mere e mikpuru Jisọs n’ezie n’ime Osimiri Jọdan. Jọn mere ya baptism, bụ́ onye, ka ọ na-achọ ebe dị mma ịnọ na-eme baptism, họọrọ otu ebe dị ná Ndagwurugwu Jọdan nke dị nso Selem “n’ihi na mmiri hiri nne n’ebe ahụ.” (Jọn 3:23) Eziokwu bụ na ndekpu kpam kpam n’ime mmiri bụ ụzọ ime baptism bụ isi n’etiti ụmụazụ Jisọs ka a na-ahụta site n’okwu ndị onozi Etiopia kwuru. Ka ọ na-azaghachi ná nkụzi Filip, o tiri mkpu, sị: “Lee, mmiri, gịnị na-anapụ ime m baptism?” Mgbe ahụ anyị hụrụ na “ha abụọ wee rịda na mmiri,” mesịakwa “ha siri na mmiri rịgota.”—Ọrụ 8:36-39.
Akụkọ ihe mere eme nkịtị ọ̀ na-ezokwu aka n’ime baptism site ná mmikpu n’etiti ndị Kraịst? N’ezie ọ na-eme otú ahụ. Ọ dịkwa mma ịrịba ama na nnukwute ọdọ mmiri ndị dị mma iji mikpuo mmadụ na mmiri ka dị n’ọtụtụ ala. “Ihe àmà nke nkà ihe mgbe ochie ndị e gwupụtara n’ala na-agba akaebe bara ụba nke ukwuu maka mmikpu dị ka ụzọ a na-ejikarị eme baptism n’ime narị afọ iri ruo iri na anọ ndị mbụ,” ka akwụkwọ bụ́ Ministry kwuru. Ọ na-agbakwụnye, sị: “N’ime mkpọmkpọ ihe nile nke ihe owuwu ndị Kraịst nke oge mbụ, nakwa na chọọchị oge ochie ndị a ka ji eme ihe, a pụrụ ịhụ akụkọ nke baptism ndị Kraịst. Ihe ndị e sere n’ebe olili ozu na chọọchị dị iche iche, nkume ndị a chọrọ mma n’ala ụlọ, mgbidi ájá, na n’uko ụlọ, ihe ndị a kpụrụ kpụrụ, na ihe osise ndị dị n’ihe odide ndị ochie nke Agba Ọhụrụ na-etinye akụkụ dị iche iche n’akụkọ ihe mere eme nke a . . . Nke a bụ tinyere ihe àmà ndị dị n’ihe ndị nna chọọchị dere nke na mmikpu bụ ụzọ chọọchị mbụ ahụ na-ejikarị eme ihe maka ime baptism.”
Akwụkwọ New Catholic Encyclopedia na-ekweta, sị: “Ihe àmà na-egosi na Baptism na Chọọchị oge mbụ bụ site ná mmikpu.” Mgbe ahụ ọ bụghị ihe ijuanya na anyị na-ahụ isi akụkọ akwụkwọ akụkọ ndị dị ka ndị a: “Ndị Katọlik Eweghachite Baptism Mmikpu” (The Edmonton Journal, Canada, September 24, 1983), “Baptism Site ná Mmikpu Ebiri Ọkụ n’Ebe Ndị Katọlik Nọ n’Ebe A” (St. Louis Post-Dispatch, April 7, 1985), “Ọtụtụ Ndị Katọlik Na-ahọrọ Baptism Site ná Mmikpu” (The New York Times, March 25, 1989), na “Baptism Mmikpu Abụrụ nke A Tụteghachiri” (The Houston Chronicle, August 24, 1991).
N’ihi Nzube Dị Aṅaa?
N’ihi gịnị ka Jisọs ji chọọ ka e mee ndị na-eso ụzọ ya baptism? Ọ dị mma, ọ bụ ihe atụ kwesịrị ekwesị nke nraranye sitere n’obi ha dum nye Chineke. A gaje ikwusa “ozi ọma” ahụ gburugburu ụwa, a gajekwa ime “ndị nke mba nile” ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, NW) Nke a pụtara na Chineke adịghịkwa emeso nanị mba ndị Juu, bụ́ nke ndị a raara nye site n’ọmụmụ mejupụtara. Kọniliọs na ezinụlọ ya bụ ndị Jentaịl mbụ, ma ọ bụ ndị na-abụghị ndị Juu, nakweere eziokwu banyere Jisọs Kraịst, e wee mee ha baptism.
Ịbụ onye a sụnyere n’okpuru mmiri na-egosi na ndị a na-eme baptism anwụwo n’otu ụzọ ndụ nke dabewooro n’onwe ha. Ịbụ ndị e selitere site n’ime mmiri na-enye ihe atụ na ha dị ndụ ugbu a maka ime uche Chineke nakwa na ha na-edebe ya n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha, dị ka Jisọs meworo. (Matiu 16:24) Ịbụ onye e mere baptism “baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ” gosiri na ha amụtawo ma nakwere eziokwu banyere nke ọ bụla n’ihe ndị a, ghọtakwa ihe ha bụ n’ezie. (Matiu 28:19; tụlee Ọrụ 13:48.) Baptism bụ nanị nzọụkwụ mbụ nke nrubeisi nye Chineke na ido onwe onye n’okpuru uche ya.
Akwụkwọ Nsọ adịghị akwado echiche okpukpe nke ọtụtụ ndị nwere nke na baptism bụ sakaramenti, ya bụ ememe okpukpe nke na-enye onye a na-eme baptism ihe o ruru ogo ya—ebube, ịdị nsọ, ma ọ bụ uru ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ ahụ Pope Eugenius nke Anọ dere bụ́ nke e hotara n’isiokwu bu ụzọ gara n’ihu ikwu banyere baptism, sị: “Mmetụta nke sakaramenti a bụ mgbaghara nke mmehie nile, nke mbụ ahụ na nke e mere n’ezie; n’otu aka ahụ kwa ntaramahụhụ nile n’ihi mmehie. Dị ka ihe si na ya pụta, a dịghị agụrụ onye e mere baptism mmehie ndị o mere na mbụ; ọ bụrụkwa na ha anwụọ tupu ha emee mmehie ọ bụla, ha na-aga ozugbo n’alaeze eluigwe ma hụ Chineke.”
Otú ọ dị, e mere Jisọs baptism ọ bụ ezie na “ọ dịghị mmehie ọ bụla o mere.” (1 Pita 2:22) Ọzọkwa, dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru, a na-enwe mgbaghara nke mmehie nanị site n’àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst. Ananaịas gbara Sọl nke Tasọs ume, sị: “Bilie, ka e mee gị baptism, sachapụkwa mmehie gị nile, na-akpọku aha [Jisọs].” (Ọrụ 22:12-16) Ee, a pụrụ inwe nzọpụta nanị site n’ọbara Jisọs a wụfuru na site n’iji okwukwe “na-akpọku aha ya.”—Ndị Hibru 9:22; 1 Jọn 1:7.
Mgbe ahụ, gịnị banyere okwu ndị Pita kwuru na 1 Pita 3:21? N’ebe ahụ o kwuru, sị: “Bụ́ mmiri nke na-azọpụtakwa unu ugbu a n’ụzọ yiri ihe atụ a, ya bụ baptism, ọ bụghị ịtụpụ unyi nke ahụ, kama ọ bụ ajụjụ nke ezi akọ na uche n’ebe Chineke nọ, site ná mbilite n’ọnwụ nke Jisọs Kraịst.” Pita ji baptism na-atụnyere ahụmahụ Noa nke ịgabiga mmiri nile nke Iju Mmiri ahụ. (Amaokwu nke 20) Noa, n’igosipụta okwukwe zuru ezu na Chineke, wuru ụgbọ ahụ maka nchebe nke ezinụlọ ya. (Ndị Hibru 11:7) N’otu aka ahụ, site n’itinye okwukwe na Jehova Chineke na ndokwa o mere maka nzọpụta site na Kraịst Jisọs, a pụrụ ịzọpụta ndị mmadụ taa site n’ụwa obi ọjọọ nke a. Ha aghaghịkwa iji okwukwe ahụ mee ihe. Site n’ichegharị site ná mmehie ha, na-echigharị pụọ n’ụzọ ọjọọ, na ime nraranye a na-akparaghị ókè nye Jehova Chineke n’ekpere, a na-arịọ Chineke arịrịọ maka ezi akọ na uche. Ma ọ bụ ná ndabere nke àjà Jisọs, na mbilite n’ọnwụ ya nke o ji chee uru nke àjà ahụ n’ihu Chineke n’eluigwe, ka a na-agbaghara mmehie, na-enyekwa nzọpụta.—1 Pita 3:22.
Gịnị ka Ị Ga-eme?
Ị̀ bụ onye nọworo na-esonyere Ndịàmà Jehova ruo oge ụfọdụ? Ma eleghị anya i meworị mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ gị n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ dị iche iche nke Bible ma i werebeghị nzọụkwụ ndị ahụ nke nraranye na baptism. Ị pụrụ ịchọ ime uche Chineke ma ị pụrụ ịdị na-atụ egwu na baptism ga-eme ka ọ bụrụ iwu nye gị. N’ihi ya, ị pụrụ ịhọrọ izere ibu ọrụ na ịbụ onye ga-aza ajụjụ dị otú ahụ ruo oge ụfọdụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 11.5 nde mmadụ bịara oriri Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe anyị n’afọ gara aga. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa nke ozi ọma n’afọ ahụ dum dị nta karịa 4.5 nde. Nke a pụtara na ihe dị ka nde mmadụ asaa na-egosi nghọta ụfọdụ nke eziokwu Chineke, ọ bụ ezie na ha abụghị Ndịàmà Jehova e mere baptism. Otú ọ dị, ụfọdụ n’ime ndị a bụ ụmụntakịrị na ndị ọhụrụ nwere mmasị. Ma ụfọdụ n’ime ndị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ ka bụkwa ndị a na-emebeghị baptism. Ya mere e nwere ọtụtụ ndị narawooro ezi ihe ọmụma nke Bible ma ha etinyebeghị onwe ha n’ụzọ zuru ezu ná ndokwa Chineke maka nzọpụta site n’ịbụ ndị e mere baptism.
Otu isi ihe a ga-echeta bụ na ọ bụ ihe ọmụma nke ihe Chineke chọrọ gị n’aka na-eweta ọnọdụ ịbụ onye ga-aza ajụjụ. “Onye matara ime ihe ọma, ma o meghị ya, ọ bụụrụ onye ahụ mmehie,” ka Jemes 4:17 kwuru. Ezikiel 33:7-9 na-egosi na onye a gwara ihe ndị Chineke nyere n’iwu na ntụziaka ya nile nwere ibu ọrụ nke imezu ha. Ya mere, ajụjụ dị na ya bụ ma mmadụ ò nwere ịhụnanya si n’ezi obi maka Chineke na ọchịchọ bụ ezie maka ime ihe na-atọ ya ụtọ. Onye nwere ịhụnanya dị otú ahụ n’ezie ma chọọ iso Jehova Chineke nwee mmekọrịta pụrụ iche agaghị ala azụ n’ịbụ onye ji ọchịchọ onwe ya rara ndụ ya nye ya. Baptism bụ nanị ihe atụ a na-ahụ anya nke nraranye ahụ. Ọ bụ nzọụkwụ dị mkpa nke na-eduje ná nzọpụta. A na-eme ndị kwere ekwe n’ezie baptism.—Ọrụ 8:12.
Ọdịnihu dị ebube nke Chineke kwadebere maka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, ndị raara onwe ha nye, n’ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ karịrị abamuru ọ bụla na-adịru nwa oge nke ajọ usoro ihe ochie nke a pụrụ iyi ka o nwere inye nke ukwuu. Egwu maka mmadụ ibe anyị na-apụsị mgbe anyị tụlere aka dị ike nke Chineke. (1 Ndị Kọrint 10:22; 1 Pita 5:6, 7) N’eziokwu, ugbu a bụ oge ịjụ onwe gị, dị ka onye onozi Etiopia jụrụ Filip, sị: “Gịnị na-anapụ ime m baptism?”
[Foto dị na peeji nke 7]
Dị ka onye onozi Etiopia ahụ, ị na-ajụ onwe gị, sị: “Gịnị na-anapụ ime m baptism?”