Ntaramahụhụ Ebighị Ebi—N’ihi Gịnị Ka O Ji Bụrụ Ozizi Na-enye Nsogbu n’Uche?
“M nụrụ na unu chụpụrụ ụkọchukwu unu. Gịnị mere?”
“Ihe merenụ bụ na ọ nọgidere na-agwa anyị na anyị nile ga-eje ‘hell.’”
“Gịnị ka ụkọchukwu ọhụrụ ahụ na-ekwu?”
“Ụkọchukwu ọhụrụ ahụ na-ekwukwa na anyị ga-eje ‘hell.’”
“Ọ bụrụ otú ahụ gịnị bụ ọdịiche dịnụ?”
“Eem, ọdịiche dị ya bụ na mgbe ụkọchukwu nke mbụ ahụ kwuru ya, o kwuru ya dị ka à ga-asị na obi dị ya ụtọ banyere ya; ma mgbe onye nke ọhụrụ ahụ na-ekwu ya, ọ na-ekwu ya dị ka à ga-asị na ọ na-agbawa ya obi.”
N’ỊBỤ nke e setịpụrụ n’akwụkwọ ihe atụ, akụkọ nke a na-egosi n’ụzọ nke onwe ya na ọtụtụ ndị nkụzi Bible, tinyere ndị na-aga chọọchị, adịghị enwe obi iru ala n’ihi ozizi hell. N’ọnọdụ ka buo ibu, ọ na-eme ka ihe onye ọkà mmụta okpukpe Canada bụ́ Clark H. Pinnock kwuru bụrụ eziokwu: “N’isiokwu nile nke nkà mmụta okpukpe bụ́ nke nyeworo akọ na uche ụmụ mmadụ nsogbu eri ọtụtụ narị afọ, m chere na ọ bụ ole na ole pụrụ ịkpataworị nchegbu ọ bụla dị ukwuu karịa nkọwa a nabatara anabata nke hell dị ka ntaramahụhụ ebighị nke anụ ahụ na mkpụrụ obi na-anụ ụfụ ya.”
Ihe Ndị Ọ Pụtara n’Ụzọ Omume
Mgbe ahụ, n’ihi gịnị ka onyinyo ọkụ na-enwusi ike nke a na-eche n’ihu ndị mmadụ na Krisendọm ji na-enye ọtụtụ ndị nsogbu? (Lee igbe.) Professor Pinnock na-eme ka ọ pụta ìhè, sị: “Echiche nke na ihe e kere eke nke maara ihe kwesịrị inweta ntaramahụhụ n’ụzọ anụ ahụ na n’uche n’ime oge na-adịghị agwụ agwụ bụ nke na-enye nsogbu n’uche n’ụzọ dị omimi, echiche ahụ bụkwa na a na-ebokwasị ha nke a n’ihi iwu Chineke nyere na-emebi ihe m kwere banyere ịhụnanya Chineke.”
Ee, nkụzi nke ntaramahụhụ ebighị ebi na-eme ka nsogbu nke omume chee mmadụ ihu. Dị ka ihe atụ, ezi ndị Kraịst na-atụgharị uche n’ajụjụ dị iche iche Hans Küng, bụ́ onye ọkà mmụta okpukpe ndị Katọlik jụrụ: “Chineke ịhụnanya ò kwesịrị . . . ikiri ruo mgbe nile ebighị ebi ntaramahụhụ anụ ahụ na nke uche nke a na-adịghị agwụ agwụ, nke olileanya na-adịghị na ya, nke ọmịiko na-adịghị na ya, nke ịhụnanya na-adịghị na ya, nke obi ilu, nke ihe ndị o kere?” Küng na-aga n’ihu, sị: “Ọ̀ bụ onye obi tara mmiri dị otú ahụ nke e ji ụgwọ? . . . Gịnị ka anyị ga-eche banyere mmadụ nke na-emezu ọchịchọ ya maka ịbọ ọ́bọ̀ n’ụzọ a na-apụghị ịrịọta n’arịrịọ otú a na n’ụzọ afọ na-apụghị iju eju otú a?”a N’ezie, olee otú Chineke nke na-agwa anyị n’ime Bible ka anyị na-ahụ ndị iro anyị n’anya pụrụ isi nwee ọchịchọ nke ịta ndị iro ya ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi? (1 Jọn 4:8-10) Ọ bụghị ihe na-atụ n’anya na ụfọdụ ndị na-eru ná nkwubi okwu bụ na ọdịdị nke hell enweghị nkwekọ n’ebe ọdịdị nke Chineke dị, na ozizi nke a abụghị ihe amamihe dị na ya n’ụzọ omume.
Ọtụtụ ndị ọzọ kwere n’ozizi ahụ na-anwa imechi akọ na uche ha ọnụ site n’izere ajụjụ ndị a. Otú ọ dị, ileghara ajụjụ ndị a anya adịghị eme ka ajụjụ ndị a dị mgbagwoju anya pụọ n’anya. Ya mere ka anyị chee isiokwu ahụ ihu. Olee mmetụta dị iche iche ozizi nke a nwere n’ebe omume dị? N’akwụkwọ bụ́ Criswell Theological Review, Professor Pinnock na-ede, sị: “Ntaramahụhụ ebighị ebi bụ nke a na-apụghị ịnakwere n’ile ya anya n’ụzọ omume n’ihi na ọ na-eme ka Chineke bụrụ ajọ onye akpịrị ọbara na-akpọ nkụ bụ́ onye meworo ka ebe ịta ahụhụ Auschwitz ebịghị ebi dịgide maka ndị na-ata ahụhụ n’ime ya bụ́ ndị ọ na-achọghị ọbụna ka ha nwụọ.” Ọ na-ajụ, sị: “Olee otú mmadụ nke nwere ọmịiko n’ime ya pụrụ isi nọrọ jụụ, na-atụgharị uche n’echiche dị otú ahụ [ozizi si n’aka fere n’aka nke hell]? . . . Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi ma eleghị anya gosipụta chi nke a nke nwere oké obi ọjọọ na mmụọ nke ịbọ ọ́bọ̀ dị otú ahụ?”
N’igosi mmetụta ọjọọ nke ozizi a pụrụ inweworị n’àgwà mmadụ, Pinnock na-ekwu, sị: “M na-enwe ọbụna ihe ijuanya banyere ihe ọjọọ dị iche iche nke ndị ahụ meworo, bụ́ ndị kwenyeworo na Chineke nke na-ata ndị iro ya ahụhụ?” Ọ na-ekwubi, sị: “Nke a ọ́ bụghị echiche kasị enye nsogbu n’uche nke chọrọ nchebaraghachi echiche?” Ee, ọ bụrụ na a ga-ejikọta Chineke na obi ọjọọ dị otú ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ndị na-aga chọọchị bụ́ ndị ihe na-emetụ n’ahụ na-elebaghachi anya n’ihe banyere ọkụ ala mmụọ. Gịnịkwa ka ha na-ahụ? Nsogbu ọzọ nke na-eche echiche nke ntaramahụhụ ebighị ebi ihu.
Hell na Ikpe Ziri Ezi
Ọtụtụ ndị na-eche echiche banyere ozizi si n’aka fere n’aka nke hell na-achọpụta na o yiri ka ọ̀ na-egosipụta Chineke dị ka onye na-eme ihe n’ikpe na-ezighị ezi, ya mere ọ na-emejọ echiche ebumpụta ụwa ha nke ikpe ziri ezi. N’ụzọ dị aṅaa?
Chọta otu azịza site n’iji ozizi nke ntaramahụhụ ebighị ebi tụlee ụkpụrụ nke ikpe ziri ezi, bụ́ nke Chineke nyere: “Anya laara anya, ezé laara ezé.” (Ọpụpụ 21:24) Maka iji rụọ ụka, jiri iwu Chineke nyere Israel oge ochie, iwu ịbọ ọ́bọ̀ nke ihe ya na ihe hà nhata, tụlee ozizi ọkụ ala mmụọ. Nkwubi okwu dị aṅaa ka o yiri ka ị̀ ga-eru na ya? Na nanị ndị mmehie kpataworo ntaramahụhụ ebighị ebi ka ntaramahụhụ ebighị ebi há otú ahụ kwesịịrị n’otu aka ahụ—ntaramahụhụ ebighị ebi maka ntaramahụhụ ebighị ebi. Ma ebe ụmụ mmadụ (n’agbanyeghị otú ha jọruru ná njọ) pụrụ ịkpata nanị ntaramahụhụ nwere njedebe, ịma ha ikpe ntaramahụhụ ebighị ebi na-eme ka a ghara inwe ịha nhata n’etiti mpụ ha na ntaramahụhụ na-adịghị agwụ agwụ nke ọkụ ala mmụọ.
N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ntaramahụhụ ahụ ga-adị oké ike. Ọ ga-agabiga “anya laara anya, ezé laara ezé.” Mgbe ị tụlekwara na nkụzi dị iche iche nke Jisọs belatara echiche nke imegwara ihe, ị pụrụ ikweta na ezi ndị Kraịst ga-abụ ndị o siiri ike nke ukwuu ịhụ ikpe ziri ezi ná ntaramahụhụ ebighị ebi.—Matiu 5:38, 39; Ndị Rom 12:17.
Ịchọ Igosipụta Izi Ezi nke Ozizi Ahụ
Otú o sina dị, ọtụtụ ndị kwere n’ozizi ahụ anọgidewo na-agbalị igosipụta izi ezi nke ozizi ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Onye Britain na-ede akwụkwọ bụ Clive S. Lewis na-ekwuchite ọnụ ihe ka ọtụtụ ná ndị na-akwado ozizi ahụ n’akwụkwọ ya bụ́ The Problem of Pain: “Ọ dịghị ozizi ọ bụla nke m ga-adị njikere karị iwepụ site n’Iso Ụzọ Kraịst karịa nke a, ma ọ bụrụ na m nwere ikike ime otú ahụ. Ma o nwere nkwado zuru ezu nke Akwụkwọ Nsọ na, karịsịa, nke okwu ndị ahụ Onyenwe Anyị kwuru n’onwe ya.” Otú a, ndị na-akwado ozizi ahụ na-ekwupụta na ntaramahụhụ ebighị ebi dị nnọọ njọ, ma n’otu mgbe ahụ, ha na-ekwusi ike na ozizi ahụ bụ ihe a na-aghaghị ikwere na ya n’ihi na ha na-eche na Bible na-ezi ya. Onye ọkà mmụta okpukpe bụ Pinnock na-ekwu, sị: “Site n’ikweta n’ịdị njọ ya, ha nwere olileanya igosipụta okwukwe siri ike ha nwere n’ebe Bible nọ na oké obi ike ná nkweta ha kwetara n’eziokwu nke a na-ama ahụ jijiji nanị n’ihi na akwụkwọ nsọ na-akụzi ya. Ha na-eme ka o yie ka adaghị ada nke Bible ọ̀ nọ n’ihe ize ndụ. Ma ọ̀ dị otú ahụ n’ezie?”
Gị onwe gị pụkwara iche echiche ma inwe okwukwe siri ike n’ebe Bible dị ọ̀ na-eme ka ị ghara inwe ihe ọzọ ị ga-eme ma ọ́ bụghị ịnakwere ozizi nke a. Gịnị n’ezie ka Bible na-ekwu?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Eternal Life?—Life After Death as a Medical, Philosophical, and Theological Problem, peji nke 136.
[Igbe dị na peeji nke 5]
IHE OYIYI ATỌ NWERE OTU UCHE
Nkwupụta Okwukwe nke Westminster, bụ́ nke ọtụtụ ndị Protestant nakweere, na-ekwu na ndị ahụ na-agaghị eje eluigwe “bụ ndị a ga-atụba ná ntaramahụhụ ebighị ebi, ma bụrụ ndị e ji mbibi ebighị ebi taa ahụhụ.” “N’Iso Ụzọ Kraịst nke Ndị Roman Katọlik,” ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-akọwa, “a na-eche na hell bụ ọnọdụ nke ntaramahụhụ ebighị ebi . . . nke ihe e ji mara ya . . . bụ inwe nhụjuanya nke ọkụ na ntaramahụhụ ndị ọzọ.” Akwụkwọ ihe ọmụma nke a na-ekwukwa na “Iso Ụzọ Kraịst nke Ndị Orthodox n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ” nwere otu “nkụzi ahụ bụ na hell bụ ọnọdụ a kara aka nke ọkụ na ntaramahụhụ ebighị ebi nke na-echere ndị a bụrụ ọnụ.”—Mpịakọta nke 6, peji nke 238-239.