Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Na-achụso?
“Na-agbanahụ agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa, na-agbasokwa ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo, gị na ndị na-akpọku Onyenwe anyị site n’obi dị ọcha.”—2 TIMOTI 2:22.
1. Gịnị bụ olileanya anyị maka ndị na-eto eto n’etiti anyị?
“NDỊÀMÀ JEHOVA,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Dagen (Ụbọchị Ahụ) nke Chọọchị Mmụọ Nsọ ndị Sweden kwuru “bụ òtù nke na-enweta ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị òtù ọhụrụ kwa afọ, o nwekwara ọnụ ọgụgụ kasị ibu nke ndị ntorobịa.” Ma eleghị anya ị bụ akụkụ nke ìgwè nke a dị ọcha, nke ndị ntorobịa na-atụ egwu Chineke. Ọ pụrụ ịbụ na a zụlitere gị n’ụzọ nke ndị Kraịst site na nwata, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ị nụwo ma nara ozi Alaeze ahụ n’onwe gị. N’agbanyeghị ọnọdụ nke ọ bụ, obi dị anyị ụtọ inwe unu n’etiti anyị. Ọ bụkwa olileanya anyị na unu ga-agbaso ụzọ nke ezi omume, dị ka ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe na narị afọ nke mbụ mere. Okwu Jọn onyeozi pụrụ ịkọwa unu nke ọma: “Unu dị ike, okwu Chineke na-anọgidekwa n’ime unu, unu emeriwokwa ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 2:14.
2. Ihe ndị dị aṅaa pụrụ ime ka nchụso a na-achụso ụzọ ezi omume ‘n’oge ntoju ntorobịa’ bụrụ ihe siri ike?
2 Ọtụtụ ndị—ee ihe ka n’ọnụ ọgụgụ—nke ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst taa na-eguzogide ihe nrụgide nke ụwa. Otú ọ dị, ị pụrụ ịchọpụta na ịnọgide n’ụzọ dị otú ahụ adịghị mfe. Mgbe ị nọ ‘n’oge ntoju ntorobịa,’ ị pụrụ inwe mmetụta nke ịbụ onye mmetụta uche ndị dị ọhụrụ na ndị siri ike rikpuru. (1 Ndị Kọrint 7:36) N’otu oge ahụ, ị pụrụ ịdị na-enwe mmetụta nke ibu ọrụ ndị na-arị elu n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe obibi, na n’ime ọgbakọ. E nwekwara ọbụna ihe nrụgide site n’aka Setan Ekwensu n’onwe ya. N’inwe mkpebi siri ike iduhie ọtụtụ ndị ruo ókè o kwere mee, ọ na-awakwasị ndị pụrụ iyi ndị na-enweghị nchebe—dị nnọọ ka o mere n’ogige Iden. Laa azụ na mgbe ahụ, o mere ka aghụghọ ya na-arụgide arụgide lekwasị anya, ọ bụghị n’Adam ahụ ka okenye, nke ka nwee ihe ọmụma, kama na nwanyị ahụ, bụ́ Iv, nke ka nwata na nke na-enwechabeghị ahụmahụ. (Jenesis 3:1-5) Ọtụtụ narị afọ n’ihu, Setan jiri aghụghọ yiri nke ahụ mee ihe n’ahụ ọgbakọ ndị Kraịst ahụ ka bụ nwa ọhụrụ na Kọrint. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ana m atụ egwu, ma ò nwere ụzọ ọ bụla a ga-emebi uche unu ka unu pụọ n’afọ ofufo na ịdị ọcha nke dị n’ebe Kraịst nọ, dị ka agwọ ahụ weere aghụghọ ya ghọgbuo Iv.”—2 Ndị Kọrint 11:3.
3, 4. Gịnị bụ ngwá ọrụ ụfọdụ nke Setan Ekwensu na-eji eme ihe n’iduhie ndị na-eto eto, ihe dị aṅaa ma eleghị anya na-esi n’ime ya apụta?
3 Taa ndị mụrụ gị bụ́ ndị Kraịst pụrụ n’otu aka ahụ ịdị na-atụ egwu n’ihi gị. Ọ bụghị na ha na-eche na i nwere echiche ihe ọjọọ, kama ha maara site n’ahụmahụ na ndị na-eto eto bụ karịsịa ndị na-anọchaghị ná nchebe pụọ “n’ọrụ aghụghọ dị iche iche” nke Setan. (Ndị Efesọs 6:11, NW, nkọwa ala ala peji) N’ịbụ nke na-adịtụdịghị ka ihe ọjọọ, e mere ka ọnyà dị iche iche nke Setan yie ihe na-adọrọ adọrọ, ihe a na-achọsi ike. Telivishọn na-eji nnọọ ụzọ dị mfe na-egosi ịhụ ihe onwunwe n’anya, ngosipụta mmekọahụ doro anya, ime ihe ike pụtara ìhè, na mgbaasị dị ka ihe ntụrụndụ. Uche ndị na-enwebeghị ahụmahụ pụrụ ijupụta n’ihe ndị na-abụghị ma ọlị ‘eziokwu, ihe kwesịrị nsọpụrụ, ihe ziri ezi, ihe dị ọcha, ihe kwesịrị ịhụnanya.’ (Ndị Filipaị 4:8) Nrụgide ndị ọgbọ bụ ngwá ọrụ ọzọ dị ike nke Setan. Ndị ọgbọ pụrụ itinye gị n’okpuru nrụgide siri ike ime ka ndụ gị kwekọọ n’ụdị ndụ ha, uwe, na ejiji. (1 Pita 4:3, 4) Onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ bụ́ William Brown kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwere otu Chineke maka ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu nke ihe banyere okpukpe na-emetụtaghị, ọ bụ Chineke nke nkwekọ. . . . Ịdị iche nye ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itolu bụ ihe ndabara njọ karịa ọnwụ.” Otu nwa agbọghọ bụ́ Onyeàmà n’Itali kwupụtara, sị: “Ihere mere m ime ka ụmụ akwụkwọ ibe m mara na m bụ Onyeàmà. N’ihi na m makwa na Jehova enweghị obi ụtọ n’ebe m nọ, enwere m mwute, daakwa mbà n’obi.”
4 Ekwela ka e duhie gị—Setan chọrọ iduga gị ná mbibi gị. Ọtụtụ ndị na-eto eto n’ime ụwa ga-atụfu ndụ ha n’oge oké mkpagbu ahụ n’ihi na ha hapụrụ onwe ha ka e duhie ha. (Ezikiel 9:6) Nanị ụzọ a ga-esi lanarị bụ ịchụso ihe ziri ezi.
Nọrọ na Nche Megide Mkpakọrịta Ọjọọ
5, 6. (a) Nwa okoro ahụ bụ́ Timoti chere ihe ịma aka ndị dị aṅaa ihu mgbe o bi n’Efesọs? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere Timoti?
5 Nke ahụ bụ isi ihe dị n’okwu ndụmọdụ ahụ Pọl onyeozi gwara nwa okoro ahụ bụ́ Timoti. Ruo ihe karịrị afọ iri, Timoti esonyerewo Pọl onyeozi ná njem ozi ala ọzọ ya. N’otu oge mgbe Timoti na-eje ozi n’obodo ndị na-ekpere arụsị bụ́ Efesọs, Pọl nọ n’otu ụlọ mkpọrọ ndị Rom na-echere ogbugbu. Ka oge ọnwụ ya na-abịaru nso, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Pọl nwere nchegbu n’otú ọnọdụ ga-adịrị Timoti. Efesọs bụ obodo a maara amara n’ihi akụ na ụba ya, omume rụrụ arụ, na ntụrụndụ na-eweta ndakpọ omume ọma, Timoti agaghịkwa enwe nkwado nke onye ndụmọdụ ya na-ahụ n’anya ọzọ.
6 N’ihi ya Pọl degaara ‘nwa ya ọ hụrụ n’anya’ ihe na-esonụ: “Ma n’ime ụlọ ukwu ọ bụghị nanị ihe ọlaedo na ihe ọlaọcha dị, kama ihe osisi na ihe ájá dịkwa; e mekwara ụfọdụ ka ha bụrụ ihe nsọpụrụ, meekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ihe ihere. Ya mere ọ bụrụ na onye ọ bụla asachaa onwe ya pụọ n’ihe ndị a, ọ ga-abụ ihe e mere ka ọ bụrụ ihe nsọpụrụ, ihe e doworo nsọ, ihe bara n’ihe ka onyenwe ya were ya mee ihe, ihe e doziworo iji rụọ ezi ọrụ nile ọ bụla. Ma na-agbanahụ agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa, na-agbasokwa ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo, gị na ndị na-akpọku Onyenwe anyị site n’obi dị ọcha.”—2 Timoti 1:2; 2:20-22.
7. (a) Gịnị bụ ‘ihe ájá ndị bụ ihe ihere’ nke Pọl dọrọ aka ná ntị banyere ha? (b) Olee otú ndị ntorobịa taa pụrụ isi tinye okwu ndị ahụ nke Pọl n’ọrụ?
7 N’ụzọ dị otú a Pọl dọrọ Timoti aka ná ntị na ọbụna n’etiti ndị Kraịst ibe ya na ọ pụrụ ịbụ na e nwere ‘ihe ájá ndị bụ ihe ihere’—mmadụ ndị na-akpaghị àgwà ziri ezi. Ugbu a ọ bụrụ na isoro ụfọdụ ndị Kraịst e tere mmanụ na-akpakọ pụrụ ịbụrụ Timoti ihe mmerụ ahụ, lee ka isoro ndị ụwa na-akpakọrịta ga-esi bụrụ ihe mmerụ ahụ nke ukwuu karị nye ndị Kraịst bụ́ ndị ntorobịa taa! (1 Ndị Kọrint 15:33) Nke a apụtaghị imeso ụmụ akwụkwọ ibe gị omume nke enweghị mmetụta. Ma i kwesịrị ilezi anya ịghara ikekọ onwe gị n’ebe ha nọ gabiga ókè, ọbụna ọ bụrụ na nke ahụ ga-eme ka i yie onye na-akpa nanị ya mgbe ụfọdụ. Nke a pụrụ ịbụ ihe siri ike nke ukwuu. Otu nwa agbọghọ onye Brazil kwuru, sị: “O siri ike. Mgbe nile ụmụ akwụkwọ ibe m na-akpọ m òkù ịbịa nnọkọ oriri na ebe dị iche iche na-ekwesịghị ekwesị maka ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst. Ha na-asị: ‘Gịnị! Ị̀ naghị aga? Ara na-agba gị!’”
8, 9. (a) Olee otú mkpakọrịta, ọbụna nke e so ndị ụwa yiri ka ha dị mma na-enwe, pụrụ isi bụrụ ihe ize ndụ nye onye Kraịst? (b) Olee ebe ị pụrụ inweta ndị enyi na-ewuli elu?
8 Ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị ụwa purụ iyi ndị dị mma nanị n’ihi na ha adịghị ese ụtaba, adịghị eji okwu jọrọ njọ na-eme ihe, ma ọ bụ na-etinye aka n’omume rụrụ arụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha adịghị achụso ezi omume, echiche na omume anụ ahụ ha pụrụ n’ụzọ dị mfe imetụta gị. E wepụkwa nke ahụ, nnwekọ hà aṅaa ka gị na ndị na-ekweghị ekwe pụrụ inwe? (2 Ndị Kọrint 6:14-16) Ee, ụkpụrụ ọma nke ime mmụọ iji kpọrọ ihe dị oké ọnụ ahịa bụụrụ ha “ihe nzuzu”! (1 Ndị Kọrint 2:14) Ị̀ pụrụ ime ka enyi gị na ha dịgide n’emebighị ụkpụrụ ndị i nwere?
9 Ya mere zere mkpakọrịta ndị na-adịghị ewuli elu. Mee ka mkpakọrịta gị bụrụ nke a kpaara ókè ijede n’ebe ndị Kraịst nwere uche ime mmụọ nọ, bụ́ ndị hụrụ Jehova n’anya n’ezie. Kpachara anya maka ọbụna ndị ntorobịa nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị na-enweghị echiche ziri ezi ma ọ bụ ndị na-eme nkatọ. Ka ị na-eto n’ụzọ ime mmụọ, ihe ndị bụ mmasị gị n’ihe banyere ndị enyi ma eleghị anya pụrụ ịgbanwe. Otu nwa agbọghọ bụ Onyeàmà nke nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu sịrị: “Anọwo m na-eme ndị enyi ọhụrụ n’ọgbakọ dị iche iche. O mewo ka m ghọta ụzọ o si bụrụ ihe na-adịghị mkpa inwe enyi ndị ụwa.”
Ịgbanahụ Agụụ Ihe Ọjọọ
10, 11. (a) Gịnị ka ọ pụtara bụ́ “na-agbanahụ agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa”? (b) Olee otú mmadụ pụrụ isi ‘gbanahụ ịkwa iko’?
10 Pọl gbakwara Timoti ume ka ọ “na-agbanahụ agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa.” Mgbe ị bụ onye na-eto eto, ọchịchọ nke ịbụ onye a ma ama, inwe oge obi ụtọ, ma ọ bụ imeju ọchịchọ mmekọahụ pụrụ ịbụ ihe na-arụgide arụgide. Ọ bụrụ na a chịkwaghị ha achịkwa, ọchịchọ ndị dị otú ahụ pụrụ iduba gị ná mmehie. N’ihi ya Pọl kwuru ka a gbanahụ ọchịchọ na-emerụ ahụ—ịgba ọsọ dị ka à ga-asị na ndụ mmadụ nọ n’ihe ize ndụ.a
11 Ọchịchọ mmekọahụ, dị ka ihe atụ, edubawo ọtụtụ ndị ntorobịa ndị Kraịst n’ime mbibi ime mmụọ. Mgbe ahụ, Bible nwere ezi ihe mere o ji na-agwa anyị ka anyị ‘gbanahụnụ ịkwa iko.’ (1 Ndị Kọrint 6:18) Ọ bụrụ na nwoke na nwanyị na-eme mbedo, na-eme mkpapụ, ha pụrụ itinye ụkpụrụ a n’ọrụ site n’izere ọnọdụ ndị na-akpata ọnwụnwa—dị ka ịnọ nanị ha n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe a na-akwụba ụgbọ ala. Inwe onye na-anọnyere unu pụrụ iyi ihe mgbe ochie, ma ọ pụrụ ịbụ ezi ihe nchebe. Ọ bụkwa ezie na ụfọdụ okwu na omume ngosipụta ịhụnanya pụrụ ikwesị ekwesị, a ghaghị inwe ihe ịkpa ókè ndị ezi uche dị na ha iji zere àgwà na-adịghị ọcha. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:7) Ịgbanahụ ịkwa iko ga-agụnyekwa izere ihe nkiri ma ọ bụ ihe ngosi TV ndị pụrụ ịkpali ọchịchọ ọjọọ. (Jemes 1:14, 15) Ọ bụrụ na echiche rụrụ arụ abata n’obi gị mgbe ị na-anabataghị ha, gbanwee isiokwu ahụ n’uche gị. Gaa mee njegharị; gụọ ihe ọgụgụ ụfọdụ; rụọ ọrụ ụfọdụ n’ụlọ. Ekpere bụ kpọmkwem ihe enyemaka dị ike n’ihe banyere nke a.—Abụ Ọma 62:8.b
12. Olee otú ị ga-esi mụta ịkpọ ihe ọjọọ asị? Nye ihe atụ.
12 Nke kasị mkpa, ị ghaghị ịmụta ịkpọ ihe ọjọọ asị, ịjụ ihe ọjọọ, na ịbụ onye ihe ọjọọ na-adịghị atọ ụtọ. (Abụ Ọma 97:10) Olee otú i si akpọ ihe pụrụ ịbụ ihe ọṅụ ma ọ bụ ihe ụtọ ná mbụ asị? Site n’iche echiche banyere ihe bụ ihe ndị ga-esi n’ime ya pụta! “Unu ekwela ka e duhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi. N’ihi na onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi.” (Ndị Galetia 6:7, 8) Mgbe a nwara gị ọnwụnwa ịdaba n’ire ọkụ nke ahụ, chee echiche banyere ihe ka ukwuu nke ọ pụrụ ịrụpụta—otú nke a pụrụ isi wute Jehova Chineke. (Tụlee Abụ Ọma 78:41.) Cheekwa echiche banyere ikwe omume nke ibute afọ ime a na-achọghị ma ọ bụ ibute ọrịa, dị ka AIDS. Tụlee ntisasị nke mmetụta uche na ntụfu nke ùgwù onwe onye nke ị ga-ata ahụhụ ya. A pụkwara inwe ihe ndị si na ya pụta bụ́ ndị na-adịte aka. Otu nwanyị bụ onye Kraịst kwetara, sị: “Mụ na di m esorowo ndị ọzọ nwee mmekọahụ tupu anyị ezute onwe anyị. Ọ bụ ezie na anyị bụcha ndị Kraịst taa, ndụ mmekọahụ anyị n’oge gara aga bụ isi iyi nke esemokwu na ekworo n’ime alụmdi na nwunye anyị.” Ihe ọzọ nke a na-agaghị elefurukwa anya bụ ntụfu nke ihe ùgwù ọchịchị Chineke nke i nwere ma ọ bụ ma eleghị anya ịbụ onye a chụpụrụ site n’ọgbakọ ndị Kraịst! (1 Ndị Kọrint 5:9-13) Ihe ụtọ ọ bụla a na-enwe na mkpirikpi oge ò kwesịrị oké ọnụ ahịa dị elu otú ahụ?
Ịchụso Mmekọrịta Chiri Anya n’Ebe Jehova Nọ
13, 14. (a) N’ihi gịnị ka ịgbanahụ ihe ọjọọ na-ejighị zuo ezu? (b) Olee otú mmadụ pụrụ isi “gbasoo ịmara Jehova”?
13 Otú ọ dị, o zughị ezu ịgbanahụ ihe ọjọọ. A gbakwara Timoti ume ka ọ “na-agbasokwa ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo.” Nke a na-egosi ime ihe n’ụzọ siri ike. N’otu aka ahụ onye amụma bụ Hosea rịọrọ mba Israel ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi arịrịọ, sị: “Bịanụ, ka anyị laghachikwute Jehova . . . ka anyị gbasoo ịmara Jehova.” (Hosea 6:1-3) I mewo nchụso dị otú ahụ n’onwe gị? Ọ gụnyere ihe karịrị nanị ije nzukọ dị iche iche na isoro ndị mụrụ gị na-aga ozi ubi. Otu nwanyị bụ onye Kraịst kwupụtara, sị: “Ndị mụrụ m zụlitere m n’eziokwu, e mekwara m baptism mgbe m nọ n’afọ ndụ dị nta. . . . M naghị ahapụkebe ije nzukọ, ọ dịghịkwa mgbe m hapụrụ ije ozi n’ọnwa ọ bụla, ma ọ dịghị mgbe m zụlitere mmekọrịta onwe onye chiri anya n’ebe Jehova nọ.”
14 Otu onye ntorobịa ọzọ na-ekweta na ya onwe ya kwa dara n’imata Jehova dị ka Enyi na Nna, na-ele ya anya karị dị ka Mmụọ nke a na-adịghị ahụ anya. Ọ dabara n’omume rụrụ arụ ma ghọọ nne nke na-alụghị di mgbe ọ dị afọ 18. Emela otu ụdị mmehie ihe ahụ! “Gbasoo ịmara Jehova,” di ka Hosea gbara ume. Site n’ekpere na iso Jehova na-eje ije kwa ụbọchị, ị pụrụ ime ya enyi gị ị pụrụ ịtụkwasị obi. (Tụlee Maịka 6:8; Jeremaịa 3:4.) “Ọ nọghị n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị” ma ọ bụrụ na anyị achọọ ya. (Ọrụ 17:27) Otú a usoro ihe omume nke ọmụmụ Bible onwe onye dị mkpa. Usoro ime ihe dị otú a nke na-adịgide adịgide adịghị mkpa na ọ ga-ebu ibu ma ọ bụ jupụta n’ọtụtụ ihe. “Kwa ụbọchị m na-agụ Bible ruo ihe dị ka minit 15,” ka otu nwa agbọghọ na-eto eto aha ya bụ Melody na-ekwu. Wepụta oge ịgụ mbipụta nke ọ bụla nke Ụlọ Nche na Teta! Kwadebe maka nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ ka i wee nwee ike “ịkpasu ịhụananya na ọrụ ọma dị iche iche.”—Ndị Hibru 10:24, 25.
Nye Ndị Mụrụ Gị Obi Gị
15. (a) N’ihi gịnị ka o ji esi ike mgbe ụfọdụ mmadụ irubere ndị mụrụ ya isi? (b) N’ihi gịnị ka nrubeisi ji abụkarị maka abamuru nke onye ntorobịa?
15 Ndị mụrụ ụmụ na-atụ egwu Chineke pụrụ ịbụ isi iyi nke ezi enyemaka na nkwado. Ma rịba ama akụkụ nke ị na-aghaghị ikere òkè na ya: “Na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi. Sọpụrụ nna gị na nne gị (nke bụ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nkwa dịrị ya), ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” (Ndị Efesọs 6:1-3) N’eziokwu, ị na-eme okenye karị ma eleghị anya na-achọ inwekwu nnwere onwe. Ị pụkwara ịdị na-amatakwu erughị eru nke ndị mụrụ gị. “Ndị nna anyị bụ́ mmadụ,” ka Pọl onyeozi kwetara, “pụrụ ime nanị ihe ha chere kasị mma.” (Ndị Hibru 12:10, The Jerusalem Bible) Otú o sina dị, n’ịtụle abamuru ya nile, ọ ka bụ maka abamuru gị irubere ha isi. Ndị mụrụ gị hụrụ gị n’anya, marakwa gị karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ị gaghị na-ekwenyere ha mgbe nile, ha na-ebu ọdịmma gị kasị mma n’uche mgbe nile. N’ihi gịnị ka ị na-eguzogide mgbalị ha dị iche iche ịzụlite gị “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyi”? (Ndị Efesọs 6:4) N’ezie, ọ bụ nanị onye nzuzu “na-elelị ịdọ aka ná ntị nna ya anya.” (Ilu 15:5) Onye ntorobịa maara ihe na-anakwere ikike nke ndị mụrụ ya ma gosi nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị.—Ilu 1:8.
16. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya bụ́ ndị ntorobịa izochiri ndị mụrụ ha nsogbu ha? (b) Gịnị ka ndị ntorobịa pụrụ ime iji kwalite nkwurịta okwu nke ha na ndị mụrụ ha?
16 Nke ahụ ga-agụnye ịgwa ndị mụrụ gị eziokwu, ime ka ha mara ma ì nwere nsogbu, dị ka inwe obi abụọ ndị na-enye nsogbu banyere eziokwu ahụ ma ọ bụ ịdaba n’omume na-adịghị mma. (Ndị Efesọs 4:25) Izochi ọnọdụ ndị dị otú ahụ na-enye nsogbu pụọ n’ebe ndị mụrụ ụmụ nọ na-ewetakwu nsogbu. (Abụ Ọma 26:4) Ee, ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ na-eme mgbalị dị nta ikwurịta okwu. “Ọ dịghị mgbe nne m na-anọdụ ala ma soro m kwurịta okwu,” ka otu nwa agbọghọ na-eto eto mere mkpesa ya. “Ọ dịghị mgbe m nwere obi ike ikwu ihe m chere n’ihi egwu na-atụ m na ọ ga-akatọ m.” Ọ bụrụ na ị nọ n’otu ọnọdụ ahụ, jiri amamihe họpụta oge kwesịrị ekwesị iji mee ka ndị mụrụ gị mara ihe bụ uche gị. “Nwa m, nye m obi gị,” ka Ilu 23:26 na-agba ume ya. Nwaa isoro ha kwurịta nsogbu gị mgbe nile, tupu nsogbu ndị siri ike ebilie.
Nọgide Na-achụso Ezi Omume!
17, 18. Gịnị ga-enyere onye ntorobịa aka ịnọgide ná nchuso ọ na-achụso ezi omume?
17 Ná mmechi nke akwụkwọ ozi ya nke abụọ, Pọl gbara Timoti ume, sị: “Nọgide n’ime ihe nile ị mụtara, nke e mekwara ka i kwere ha.” (2 Timoti 3:14) Ị ghaghị ime otu ihe ahụ. Ekwela ka onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla dọpụ gị site ná nchuso ị na-achụso ezi omume. Ụwa Setan—n’ihe ndọrọ ya nile—bụ nke ihe ọjọọ jupụtara. N’oge na-adịghị anya ya na ihe nile bụ akụkụ ya ga-ata ahụhụ mbibi. (Abụ Ọma 92:7) Kpebisie ike ịghara ịbụ onye e bibikọtara ya na ìgwè ndị na-akwado Setan.
18 N’iburu nzube nke a n’uche, ị ghaghị inyocha ihe mgbaru ọsọ gị, ọchịchọ gị, na ihe ndị na-amasị gị mgbe nile. Jụọ onwe gị sị, ‘M na-anọgide na-enwe ụkpụrụ dị elu nke okwu na omume mgbe ndị mụrụ m na ndị òtù ọgbakọ na-apụghị ịhụ m? Ụdị ndị enyi dị aṅaa ka m na-ahọrọ? Ọ̀ bụ ndị ọgbọ bụ́ ndị ụwa na-atụrụ m ụdị uwe m ga-eyi na ụdị ejiji m ga-eji? Ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa ka m na-esetipụrụ onwe m? Obi m ò nwere ọchịchọ siri ike ije ozi oge nile—ka ọ bụ n’inwe aka ọrụ n’ime usoro ihe na-anwụ anwụ nke Setan?’
19, 20. (a) Gịnị mere na onye ntorobịa ekwesịghị inwe mmetụta nke ịbụ onye ike gwụrụ n’ihi ihe ndị Jehova chorọ n’aka ya? (b) Ihe onyinye ndị dị aṅaa ka ndị ntorobịa pụrụ inwetara onwe ha?
19 Ma eleghị anya ị na-ahụ mkpa ọ dị ime mgbanwe ụfọdụ n’echiche gị. (2 Ndị Kọrint 13:11) Enwela mmetụta nke ịbụ onye e meriri. Cheta, Jehova adịghị atụ anya ihe dị ukwuu karịa otú ezi uche dị na ya n’aka gị. Maịka onye amụma jụrụ, sị: “Ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” (Maịka 6:8) Nke a agaghị abụ ihe siri oké ike ma ọ bụrụ na i jiri ndokwa nile ndị Jehova mere iji nyere gị aka na-eme ihe. Nọrọ ndị mụrụ gị nso. Soro ọgbakọ ndị Kraịst na-akpakọrịta mgbe nile. Karịsịa, mee mgbalị ịmara ndị okenye ọgbakọ. Ha na-enwe nchegbu banyere ọdịmma gị, ha pụkwara ịbụ isi iyi nke nkwado na nkasi obi. (Aịsaịa 32:2) Karịsịa ihe nile, wulite ezi mmekọrịta chiri anya n’ebe Jehova Chineke nọ. Ọ ga-enye gị ikike na ume iji chụsoo ezi ihe!
20 Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-eto eto na-emebi mgbalị ha na-eme ito uto ime mmụọ site n’ige ntị n’egwú ndị na-adịghị ewuli elu. Isiokwu na-esonu ga-elebara isiokwu nke a anya n’ụzọ pụrụ iche.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Okwu Grik maka “gbanahụ” bụkwa nke e jiri mee ihe na Matiu 2:13, ebe a gwara Meri na Josef ka ha “gbalaga n’Ijipt” iji gbapụnahụ atụmatụ igbu mmadụ nke Herọd.—Tụlee Matiu 10:23.
b Ị ga-achọta aro ụfọdụ na-enye aka maka ịchịkwa ọchịchọ mmekọahụ n’isiakwụkwọ nke 26 nke akwụkwọ ahụ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị karịsịa ka ndị ntorobịa ji bụrụ ndị na-anọghị ná nchebe nye ‘ọrụ aghụghọ dị iche iche’ nke Setan?
◻ N’ihi gịnị ka isoro ndị ntorobịa bụ́ ndị ụwa na-akpakọrịta ji bụrụ ihe ize ndụ?
◻ Olee otú ị pụrụ isi gbanahụ omume mmekọahụ rụrụ arụ?
◻ Olee otú ị pụrụ isi chụsoo mmekọrịta chiri anya nke gị na Jehova?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa gị isoro ndị mụrụ gị na-ekwurịta okwu?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ndị na-eme mbedo na-eji amamihe na-amara onwe ha n’ọnọdụ ndị dị ka ịgbagharị n’elu “ice” bụ́ nke na-adịghị eme ka ha nọpụ iche n’ebe ndị ọzọ nọ