Ụzọ E Si Eji Ihe Osise Okpukpe Eme Ihe Na Ụzọ E Si Eji Ha Eme Ihe N’ụzọ Na-ezighị ezi
EBE ahụ bụ na St. Petersburg, Russia. Ụbọchị ahụ bụ August 2, 1914. Ndị mmadụ nwere mkpali na-efegharị ihe osise okpukpe gbakọtara n’obí czar. A wụwo otu ọlta n’etiti otu ụlọ nzukọ buru ibu. Ihe osise nke otu nwanyị nke ku nwa n’aka guzo n’elu ọlta ahụ. A na-akpọ ihe osise nke a “Vladimir Nne nke Chukwu.” Ìgwè mmadụ ahụ na-ele ya anya dị ka akụ dị oké ọnụ ahịa nke kasị nsọ na Russia.
N’ezie, ihe osise okpukpe ahụ bụ nke e kwetara na ọ na-arụ ọrụ ebube. Na 1812, mgbe ndị agha Russia zọrọ njem megide Napoléon, Ọchịagha Kutuzov kpere ekpere n’ihu ya. Ugbu a, mgbe o dubasịrị mba ya n’agha, Czar Nicholas nke Abụọ na-eguzo n’ihu ya. N’iweli aka nri ya elu, ọ ṅụrụ iyi, sị: “M na-aṅụsi iyi ike na m gaghị eme udo ọ bụla ọ bụrụhaala na otu mkpụrụ onye iro ka fọdụrụ n’ala Russia.”
Izu abụọ mgbe e mesịrị, onye czar ahụ mere njem nsọ gaa Moscow iji chọọ ngọzi nke Chineke n’ahụ ìgwè ndị agha ya. N’ime ụlọ ụka Cathedral of the Assumption, o gbunyere ikpere n’ala ma kpee ekpere n’ihu ụlọ ihe osise okpukpe ahụ buru ibu nke e ji nkume dị oké ọnụ ahịa chọọ mma—obere ọnụ ụlọ nke nwere ihe osise Jisọs, Meri, ndị mmụọ ozi, na “ndị senti.”
Ihe omume ndị a nke okpukpe dara n’ime ka e zere ọdachi. N’ihe na-erughị afọ anọ, ihe karịrị nde isii nke ndị agha Russia nwụrụ, ha tụfukwara ihe dị ukwuu n’ókèala ha. Ọzọkwa, czar ahụ, nwunye ya, na ụmụ ha ise bụ ndị e gburu n’ụzọ obi ọjọọ. N’ọnọdụ usoro ọchichị ahụ dịruworo ọtụtụ narị afọ, ọchịchị nke ndị na-achọ mgbanwe bụ́ nke megidere okpukpe malitere ịchị mba ahụ. Ntụkwasị obi Czar Nicholas nwere n’ihe osise okpukpe ghọrọ ihe efu.
Ma, ruo taa na Russia na ala ndị ọzọ, ọtụtụ nde ndị mmadụ anọgidewo na-efe ihe osise okpukpe. Nke a na-ewelite ajụjụ ndị dị mkpa. Olee otú Chineke si ele ofufe ndị a na-anọ n’ihu ihe osise ndị dị otú ahụ efe anya? Gịnịkwa banyere omenala nke ikonye ha n’ahụ ájá n’ebe obibi?
Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, o rubere isi n’Iwu Chineke nke e nyere site n’aka Mosis. Nke a gụnyere nke abụọ n’ihe ahụ a kpọrọ Iwu Iri, bụ́ nke kwuru, sị: “Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe: n’ihi na mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo.”—Ọpụpụ 20:4, 5.
N’ụzọ kwekọrọ na nke a, Jisọs ejighị enyemaka nke ihe osise dị iche iche ndị aka mmadụ mere efe Chineke ofufe. Kama nke ahụ, ofufe ya bụ nke kwekọrọ n’ihe Nna ya kwupụtara, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m: m gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m, m gaghị enyekwa arụsị dị iche iche a pịrị apị otuto m.”—Aịsaịa 42:8.
Ọzọkwa, Jisọs kọwara ihe mere na e kwesịghị iji ihe enyemaka ndị a na-ahụ anya efe Chineke. “Oge hour na-abịa,” ka o kwuru, “mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isi ala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye ya. Chineke bụ mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:23, 24.
Dị ka Jisọs, ezi ndị na-eso ụzọ ya kụziiri ndị ọzọ ụzọ ziri ezi e si efe ofufe. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi n’otu oge gwara otu ìgwè nke ndị ọkà ihe ọmụma Grik okwu, bụ́ ndị na-eji arụsị a pịrị apị fee chi dị iche iche a na-adịghị ahụ anya. Ọ gwara ha banyere Onye Okike mmadụ ma kwuo, sị: “O kwesịghị ka anyị na-eche na ihe a kpọrọ Chineke yiri ọlaedo, ma ọ bụ ọlaọcha, ma ọ bụ nkume, ihe a pịrị apị site na nkà na ihe dị n’obi mmadụ.” N’ikpeazụ, otu onyeozi ahụ kọwara na ndị Kraịst “sitere n’okwukwe na-ejegharị, ọ bụghị n’ọhụhụ ụzọ” nakwa na ndị Kraịst aghaghị ‘ịgbanahụ ikpere arụsị.’—Ọrụ 17:16-31; 2 Ndị Kọrint 5:7; 1 Ndị Kọrint 10:14.
Ahụmahụ nke ndụ nke Pita onyeozi na-egosi na ọ dị ngwa n’imezi omume ọ bụla nke pụrụ iduga n’ikpere arụsị. Mgbe ọchịagha ndị agha Rom bụ́ Kọniliọs dara n’ala n’ụkwụ ya, Pita jụrụ ajụ. O kuliri Kọniliọs elu, na-asị: “Bilie; mụ onwe m bụkwa mmadụ.”—Ọrụ 10:26.
Banyere Jọn onyeozi, ọhụụ ndị ahụ sitere n’aka Chineke tụrụ ya egwu nke ukwuu nke na ọ dara n’ala n’ụkwụ otu onye mmụọ ozi. “Lezie anya ka ị ghara ime ya” ka mmụọ ozi ahụ nyere ná ndụmọdụ. “Abụ m ohu ibe gị, bụrụkwa ohu ibe nke ụmụnna gị, bụ́ ndị amụma, ha na ndị na-edebe okwu nile nke akwụkwọ a: kpọọ isiala nye Chineke.” (Mkpughe 22:8, 9) Onyeozi ahụ ghọtara ndụmọdụ nke a. N’ụzọ ịhụnanya, o dekọrọ ihe ahụ merenụ maka ọdịmma anyị.
Ma olee otú ahụmahụ ndị ahụ dị n’elu si nwee ihe jikọrọ ha na iji ihe osise okpukpe eme ihe? Ọ dị mma, ọ bụrụ na ọ bụ ihe na-adịghị mma maka Kọniliọs ịda n’ala kpọọ isiala nye otu n’ime ndị ozi Kraịst, gịnị banyere ife ihe osise na-adịghị ndụ nke “ndị senti”? Ọ bụrụkwa na ọ bụ ihe na-adịghị mma maka otu n’ime ndị ozi Kraịst ịda n’ala ịkpọ isiala nye otu mmụọ ozi nke na-adị ndụ, mgbe ahụ gịnị banyere ihe osise na-adịghị ndụ nke ndị mmụọ ozi? N’ezie, omume ndị ahụ megidere ịdọ aka ná ntị Jọn: “Ụmụntakịrị m, cheenụ onwe unu nche ka unu ghara ikpere arụsị.”—1 Jọn 5:21.
Dị Ka Ihe Ịchọ Mma Na-enye Aka Ịkụzi Ihe
Nke a apụtaghị na nanị inwe ihe osise nke ihe ndị mere na Bible bụ ikpere arụsị. Magazin nke a na-eji ihe osise nke ihe ndị mere na Bible na-eme ihe nke ọma dị ka ihe ndị na-enye aka ịkụzi ihe. Ọzọkwa, a pụrụ iji ihe osise nke ihe ndị mere na Bible mee ihe n’ịchọ mgbidi ụlọ na ihe owuwu dị iche iche mma. Ma, ezi onye Kraịst agaghị achọ idebe ihe osise nke a maara na ndị ọzọ na-efe ya ofufe, ọ gaghịkwa ekonye ná mgbidi ụlọ ihe osise nke na-emegide ihe Bible kwuru.—Ndị Rom 14:13.
Ihe ka ukwuu n’ihe osise okpukpe ndị Krisendọm na-egosipụta ọkụ gbara okirikiri gburugburu isi Jisọs, Meri, ndị mmụọ ozi, na “ndị senti.” A na-akpọ nke a halo. Olee ebe halo malitere? “Mmalite ya esiteghị n’aka ndị Kraịst,” ka akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia (mbipụta 1987) kwuru, “n’ihi na ndị na-ekpere arụsị na-ese ihe osise na ndị na-apị ihe ọpịpị jiri ya mee ihe iji mee ihe atụ nke oké ùgwù na ike nke chi dị iche iche.” Ọzọkwa, akwụkwọ bụ The Christians, nke Bamber Gascoigne dere, nwere ihe osise chi anyanwụ nke nwere halo, bụ́ nke e nwetara site n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Capitoline na Rom. Ndị Rom na-ekpere arụsị fere chi nke a ofufe. N’ikpeazụ, ka Gascoigne kwuru, “halo nke anyanwụ” bụ nke “ndị Kraịst gbaziiri.” Ee, halo nwere njikọ n’ebe ofufe anyanwụ nke ndị na-ekpere arụsị dị.
Ihe osise nke na-agwakọta ihe omume dị iche iche nke Bible na ihe nnọchianya dị iche iche nke ofufe arụsị nke ndị na-ekpere arụsị hà kwesịrị ekwesị ka e konye ha ná mgbidi nke ebe obibi onye Kraịst? Ee e. Bible na-adụ ọdụ, sị: “Olee nkwekọ ụlọ nsọ nke Chineke na arụsị na-ekwekọ? . . . N’ihi nke a sinụ n’etiti ha pụta, guzokwanụ iche, ka Onyenwe anyị kwuru, Unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka; mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.”—2 Ndị Kọrint 6:16, 17.
Ka oge na-aga, ndị kwuru na ha bụ ndị Kraịst malitere ileghara ndụmọdụ dị otú ahụ anya. Ndapụ n’ezi ofufe malitere, dị ka Jisọs na ndị ozi ya buru n’amụma. (Matiu 24:24; Ọrụ 20:29, 30; 2 Pita 2:1) Ná mmalite nke narị afọ nke anọ nke O.A., onye ọchịchị alaeze ukwu nke Rom bụ́ Constantine mere Iso Ụzọ Kraịst nke si n’ezi ofufe dapụ okpukpe nke Ọchịchị kwadoro. Ugbu a ìgwè bara ụba ndị na-ekpere arụsị malitere ịkpọ onwe ha “ndị Kraịst.” Otu omume nke zuru ha ọnụ bụ ofufe nke ihe oyiyi dị iche iche nke onye ọchịchị alaeze ukwu. Ha jikwara ihe osise e konyere ekonye nke ndị nna ha ochie na nke ndị ọzọ a ma ama mee ihe. “N’ụzọ kwekọrọ n’òtù ofufe nke onye ọchịchị alaeze ukwu,” ka John Taylor na-akọwa n’akwụkwọ ya bụ́ Icon Painting, “ndị mmadụ fere ihe osise ya nke e sekwasịrị n’elu ibe ákwà e ji ese ihe na n’elu ibe osisi, sitekwa na nke ahụ gaa n’ofufe nke ihe osise okpukpe abụghịkwa ihe dị anya.” Otú a, ofufe nke ihe osise nke ndị na-ekpere arụsị bụ nke e ji ofufe nke ihe osise Jisọs, Meri, ndị mmụọ ozi, na “ndị senti” dochie anya ya.
Olee Otú Ndị Ndú Okpukpe Si Gosi Izi Ezi Nke A?
Dị ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion si kwuo, ndị ndú okpukpe jiri otu ụdị ịrụ ụka ochie ahụ nke ndị ọkà ihe ọmụma na-ekpere arụsị ji mee ihe meekwa ihe. Ndị ikom dị ka Plutarch, Dio Chrysostom, Maxim nke Taịa, Celsus, Porphyry, na Julian kwetara na arụsị enweghị ndụ. Ma ndị a na-ekpere arụsị gosiri izi ezi nke ojiji e ji arụsị eme ihe site n’ịrụ ụka na ihe ndị a bụ ihe enyemaka n’ife chi ha ndị a na-adịghị ahụ anya. Onye Russia na-ese ihe osise okpukpe bụ́ Leonid Ouspensky na-ekweta n’akwụkwọ ya bụ́ The Meaning of Icons, sị: “Ndị Nna Chọọchị jiri ihe ọrụ nke nkà ihe ọmụma ndị Grik mee ihe, na-ewebata nghọta na asụsụ ya n’ime nkà mmụta okpukpe ndị Kraịst.”—Tụlee Ndị Kọlọsi 2:8.
Ọtụtụ ndị na-ahụ ngosipụta e ji ụzọ nkà mmụta okpukpe na-egosi izi ezi nke ife ihe oyiyi dị iche iche ofufe dị ka ihe siri ike ịghọta. “Ọdịiche dị n’etiti ife ihe osise okpukpe n’ihi ihe ọ pụrụ ịnọchite anya ya, ma ọ bụ ife ya n’ihi ihe ọ bụ . . . dị ntakịrị nke ukwuu onye ọ bụla ịmata ma ọ bụghị ndị gụrụ akwụkwọ dị elu,” ka John Taylor na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ Icon Painting.
N’ile ya anya n’ụzọ ọzọ, ihe Bible na-ekwu banyere ihe oyiyi dị iche iche nke okpukpe dị mfe nghọta. Tụlee ihe banyere Emilia, bụ́ onye bi na Johannesburg, South Africa. Ọ bụ onye na-ekpesi Katọlik ike, ọ na-egbunyebukwa ikpere n’ala, na-ekpekwa ekpere n’ihu ihe osise. Mgbe ahụ, otu n’ime Ndịàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ya. O nwere mkpali obi ụtọ dị ukwuu ịhụ na n’ime Bible nke e dere n’asụsụ Portuguese na Chineke nwere aha, bụ́ Jehova. (Abụ Ọma 83:18, Almeida) N’oge ọmụmụ Bible ha, ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka m na-aghaghị ime iji zere ime ihe na-adịghị atọ Jehova ụtọ?” Onyeàmà ahụ tụrụ aka n’ihe osise ndị e konyere n’ahụ mgbidi ụlọ ya ma gwa ya ka ọ gụọ Abụ Ọma 115:4-8. N’abalị ahụ mgbe di Emilia lọtara ụlọ, ọ gwara ya na ya chọrọ iwepụsị ihe osise okpukpe ya. O kwetara. N’ụbọchị na-esonụ, o mere ka ụmụ ya ndị ikom abụọ, Tony na Manuel, tirisịa ihe osise ndị ahụ ma suo ha ọkụ. Taa, ihe dị ka 25 afọ mgbe nke a gasịrị, Emilia ọ̀ na-akwa ụta banyere nke a? Ee e. N’ezie, ya na ezinụlọ ya enyeworo ọtụtụ ndị agbata obi ha aka ịghọ ndị obi ụtọ na-efe Jehova ofufe.
E nwewo ahụmahụ yiri ndị a ọtụtụ ugbo. Dị ka ihe si n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile pụta, ọtụtụ nde ndị mmadụ na-amụta ife Chineke ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.” Gị onwe gị kwa pụrụ inweta ngọzi dị iche iche site n’ụzọ nke a ka mma nke ofufe n’ihi na, dị ka Jisọs kwuru, “ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye ya.”—Jọn 4:23, 24.
[Foto dị na peeji nke 26]
Czar Nicholas nke Abụọ ji ihe osise okpukpe na-agọzi ìgwè ndị agha ya
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto sitere n’aka C.N.