Jehova—Ezi Chineke Ahụ Nke Na-adị ndụ
FERO nke Ijipt ji ịma aka na nleda anya kwuo okwu mgbe ọ jụrụ, sị: “Ònye bụ Jehova?” (Ọpụpụ 5:2) Dị ka e gosipụtara n’isiokwu bu ụzọ, omume ahụ wetaara ndị Ijipt ihe otiti na ọnwụ, tinyere ili mmiri maka Fero na usuu ndị agha ya.
N’ijipt oge ochie, Jehova Chineke gosipụtara ọkịka ọ ka chi ụgha nile. Ma e nwere ọtụtụ ihe a ga-amụta banyere ya. Gịnị bụ ụfọdụ akụkụ nke ọdịdị ya? Gịnịkwa ka ọ chọrọ anyị n’aka?
Aha na Ịdị Ukwuu Ya
Mgbe o kwuru ihe ọ chọrọ n’aka Fero Ijipt, Mosis asịghị: ‘Onyenwe anyị kwuru ihe dị otú a.’ Fero na ndị Ijipt ndị ọzọ lere ọtụtụ chi ụgha ha anya dị ka ndị nwenụ. Ee e, Mosis kpọrọ aha Chineke, bụ́ Jehova. Ya onwe ya anụwo ka a kpọrọ ya site n’eluigwe mgbe ọ nọ n’ọhịa na-ere ọkụ n’ala Midian. Ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-asị:
“Chineke wee gwa Mosis okwu, sị ya, Mụ onwe m bụ Jehova. . . . Mụ onwe m anụwo ịsụ ude ụmụ Israel, ndị ndị Ijipt na-eme ka ha bụrụ ohu; echetawokwa m ọgbụgba ndụ m. N’ihi ya sị ụmụ Israel, Mụ onwe m bụ Jehova, m ga-emekwa ka unu si n’okpuru ibu nile nke ndị Ijipt pụọ, m ga-anapụtakwa unu n’ofufe ha, werekwa ogwe aka e setịrị esetị, werekwa ikpe ukwu dị iche iche, gbapụta unu: m ga-ewerekwa unu n’onwe m ka unu bụrụ otu ndị, m ga-abụkwara unu Chineke: unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova Chineke unu, nke na-eme ka unu si n’okpuru ibu nile nke ndị Ijipt pụta. M ga-emekwa ka unu bata n’ala [Kenean] ahụ, nke m weliri aka m iwere ya nye [ndị nna ochie unu bụ́] Abraham, nyekwa Aịsak, nyekwa Jekọb; m ga-enyekwa unu ya ka ọ bụrụ ihe nnweta: mụ onwe m bụ Jehova.”—Ọpụpụ 6:1-8.
Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe Jehova mere. Ọ tọhapụrụ ndị Israel pụọ n’agbụ Ijipt ma mee ka ha nwee ike ibiri n’ala Kenean. Dị ka o kwere na nkwa, Chineke mere ka ihe ndị a nile were ọnọdụ. Lee ka o si kwesi ekwesị! Aha ya, bụ́ Jehova, pụtara “Ọ Na-eme Ka O Were Ọnọdụ.” Bible na-ezo aka n’ebe Jehova nọ site n’aha ndị dị ka “Chineke,” “Eze Onyenwe Anyị,” “Onye Okike,” “Nna,” “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,” na “Onye Kasị Elu.” Ma aha ya bụ́ Jehova na-akọwa ya dị ka ezi Chineke nke na-eme ka nzube ukwu ya nwee mmezu n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu.—Aịsaịa 42:8.
Ọ bụrụ na anyị agụọ Bible n’asụsụ mbụ e ji dee ya, anyị ga-ahụ aha Chineke ọtụtụ puku ugbo. Na Hibru a nọchitere ya site ná mkpọaha anọ bụ́ Yod He Waw He (יהוה), nke a na-akpọ Tetragrammaton, nke a na-agụ site n’aka nri gaa n’aka ekpe. Ndị na-asụ Hibru na-etinye ụdaume e ji akpọ ya, ma ndị oge ugbu a amaghị kpọmkwem ihe ụdaume ndị ahụ bụ. Ọ bụ ezie na ụfọdụ na-akwado odide bụ́ Yahweh, ụdị ahụ bụ Jehova zuru ebe nile ma bụrụ nke e ji amata Onye Okike anyị nke ọma.
Iji aha Jehova na-eme ihe na-egosikwa ọdịiche n’etiti Chineke na onye ahụ a kpọrọ “Onyenwe m” n’Abụ Ọma 110:1, ebe otu nsụgharị bụ: “ONYENWE anyị [Hibru, יהוה] gwara Onyenwe m, sị, Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe m mere ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ gị.” (King James Version) N’ịchọpụta na aha Chineke pụtara n’ebe a n’ihe odide Hibru, nsụgharị New World Translation na-agụ, sị: “Ihe si n’ọnụ Jehova pụta na-agwa Onyenwe m, sị: ‘Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m ga-edo ndị iro gị dị ka ihe mgbakwasị dịịrị ụkwụ gị abụọ.’” Okwu ndị ahụ nke Jehova Chineke na-ezo aka n’ụzọ amụma n’ebe Jisọs Kraịst nọ, nke onye dere abụ ọma kpọrọ “Onyenwe m.”
Jehova meere onwe ya aha n’ụbọchị Fero. Site n’ọnụ Mosis, Chineke gwara onye ọchịchị ahụ obi kpọrọ nkụ, sị: “Ọ bụ na mgbe a ka mụ gaje izite ihe otiti m nile n’obi gị, na n’ahụ ndị ohu gị, na n’ahụ ndị gị; ka i wee mara na ọ dịghị onye dị ka m n’ụwa nile. N’ihi na ugbu a m ga-esetịpụworị aka m, were ajọ ọrịa na-efe efe tigbuo gị na ndị gị, e wee zopu gị n’ụwa: ma otú ọ dị ọ bụ n’ihi nke a ka m guzoworo gị, ka m wee mee ka ị hụ ike m, ka e wee kọọkwa akụkọ aha m n’ụwa nile.”—Ọpụpụ 9:14-16.
Banyere ọpụpụ Israel pụrụ n’Ijipt nakwa nkwatu nke ndị eze Kenean ụfọdụ, nwanyị ahụ bụ Rehab nke Jeriko gwara ndị nledo Hibru abụọ, sị: “Amawo m na Jehova enyewo unu [ndị Israel] ala nke a, amawokwa m na oké ụjọ unu adakwasịwo anyị, amawokwa m na ndị nile na-ebi n’ala nke a agbazewo n’ihu unu. N’ihi na anyị anụwo otú Jehova mere ka mmiri Oké Osimiri Uhie takọrọ n’ihu unu, mgbe unu siri n’Ijipt pụta; na ihe unu mere eze abụọ nke ndị Amọraịt, ndị bi n’ofe Jọdan, bụ́ Saịhọn na Og, ndị unu wezụgara ka e bibie ha. Ma mgbe anyị nụrụ ya, obi anyị wee lọọ anyị mmiri, ọ dịghịkwa mmụọ guzoro ọzọ n’ime nwoke ọ bụla, n’ihi unu: n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke unu, ya onwe ya bụ Chineke n’eluigwe dị n’elu, na n’elu ụwa dị n’okpuru.” (Joshua 2:9-11) Ee, ịdị ukwuu nke Jehova agbasawo.
Jehova na Àgwà Ya Nile
Onye ọbụ abụ ahụ kwupụtara ọchịchọ nke a sitere n’obi: “Ka ha wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, nanị gị, bụ onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Abụ Ọma 83:18) Ebe ọ bụ na ọkaaka Jehova zuru eluigwe na ala, ndị na-eso ụzọ Jisọs a kpagburu pụrụ ikpe ekpere, sị: “Onyenwe anyị, gị onwe gị bụ onye kere eluigwe na ala na oké osimiri, na ihe nile dị ha n’ime.” (Ọrụ 4:24) Leekwa ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere”!—Abụ Ọma 65:2.
Àgwà bụ isi nke Jehova bụ ịhụnanya. N’ezie, “Chineke bụ ịhụnanya”—kpọmkwem isi iyi nke àgwà nke a. (1 Jọn 4:8) Ọzọkwa, “n’aka ya ka amamihe na ịdị ike dị.” Jehova bụ onye kasị mara ihe na onye kasị dị ike, ma ọ dịbeghị mgbe o jiri ike ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. (Job 12:13; 37:23) Anyị pụkwara ijide n’aka na Jehova ga-anọgide na-emeso anyị omume ziri ezi, n’ihi na “ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ọnọdụ guzosiri ike nke ocheeze ya.” (Abụ Ọma 97:2) Ọ bụrụ na anyị emehie ma nwee nchegharị, anyị pụrụ inwe nkasi obi n’ihe ọmụma nke bụ na Jehova bụ “Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6) Ka a sịkwa ihe mere anyị pụrụ iji nwee ọṅụ n’ijere Jehova ozi!—Abụ Ọma 100:1-5.
Eze Eluigwe ahụ nke Na-enweghị Atụ
Ọkpara Jehova, bụ́ Jisọs Kraịst, sịrị: “Chineke bụ Mmụọ.” (Jọn 4:24) Ya mere, anya ụmụ mmadụ apụghị ịhụ Jehova. N’ezie, Jehova gwara Mosis, sị: “Ị pụghị ịhụ ihu m anya: n’ihi na mmadụ agaghị ahụ m anya, dịkwa ndụ.” (Ọpụpụ 33:20) Eze eluigwe nke a dị ebube nke ukwuu nke na ụmụ mmadụ agaghị enwe ike ịtachi obi n’ahụmahụ nke ịhụ ya anya.
Ọ bụ ezie na anyị apụghị iji anya anyị ahụ Jehova, e nwere ọtụtụ ihe àmà na-egosi ịdị adị ya dị ka Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. N’ezie, “ihe ya anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi ya na ụdị Chineke ya.” (Ndị Rom 1:20) Ụwa—ya na ahịhịa, úkwù osisi, mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri, na okooko osisi ya nile—na-agba àmà banyere ịbụ Chineke nke Jehova. N’adịghị ka chi arụsị ndị na-abaghị n’ihe, Jehova na-enye oge mmiri ozuzo na ihe ọkụkụ. (Ọrụ 14:16, 17) Legodị anya na kpakpando ndị dị n’eluigwe n’oge abalị. Lee ihe àmà dị ukwuu nke na-egosi ịbụ Chineke nke Jehova na ikike ime nhazi ya!
Jehova ahaziwokwa ndị mmụọ ya e kere eke dị nsọ, nwee ọgụgụ isi, n’eluigwe. Dị ka nzukọ nke dị n’otu, ha na-emezu uche Chineke, dị ka onye ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Gọzienụ Jehova, ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dike dị ike, ndị na-eme okwu ya, n’ige ntị olu nke okwu ya. Gọzienụ Jehova, usuu ndị agha ya nile; unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ.” (Abụ Ọma 103:20, 21) Jehova ahaziwokwa ndị ya n’elu ụwa. A haziri mba Israel nke ọma, otú ahụ ka ọ dịkwa ndị na-eso ụzọ Ọkpara Chineke n’oge mbụ. N’otu aka ahụ taa, Jehova nwere nzukọ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà na-anụ ọkụ n’obi, ndị na-ekwusa ozi ọma nke na Alaeze ya dị nso.—Matiu 24:14.
Jehova Bụ Ezi Chineke ahụ nke Na-adị Ndụ
E gosipụtawo ịbụ Chineke nke Jehova n’ọtụtụ ụzọ! O weturu ùgwù nke chi ụgha nile nke Ijipt ala ma kpọbata ndị Israel n’udo n’ime Ala Nkwa ahụ. Ihe e kere eke na-enye ihe àmà bara ụba nke ịbụ Chineke nke Jehova. E nweghịkwa nnọọ ntụnyere ọ bụla n’etiti ya na chi arụsị nile na-abaghị n’ihe nke okpukpe ụgha.
Jeremaịa onye amụma gosiri oké ọdịiche dị n’etiti Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na arụsị nile nwụrụ anwụ nke mmadụ mere. A kọwara ọdịiche ahụ nke ọma na Jeremaịa isi nke 10. Gụnyere ihe ndị ọzọ, Jeremaịa dere, sị: “Jehova bụ Chineke n’ezie; ya onwe ya bụ Chineke dị ndụ, na Eze na-adị mgbe ebighị ebi.” (Jeremaịa 10:10) Ezi Chineke ahụ nke na-adị ndụ, bụ́ Jehova, kere ihe nile. Ọ gbapụtara ndị Israel ahụ na-ata ahụhụ n’agbụ nke Ijipt. Ọ dịghị ihe karịrị ya omume.
Jehova, bụ́ “Eze nke mgbe nile,” ga-aza ekpere ahụ bụ: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (1 Timoti 1:17; Matiu 6:9, 10) Alaeze Mesaịa eluigwe ahụ, nke dị ugbu a n’aka Jisọs Kraịst, ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya megide ndị ajọ omume ma bibie ndị iro nile nke Jehova. (Daniel 7:13, 14) Alaeze ahụ ga-ewebatakwa ụwa ọhụrụ nke ngọzi na-adịghị agwụ agwụ maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi.—2 Pita 3:13.
E nwere ọtụtụ ihe a ga-amụta banyere Jehova na nzube ya nile. Gịnị ma i mee mkpebi ịnara ihe ọmụma dị otú ahụ ma mee omume n’ụzọ kwekọrọ na ya? Ya bụrụ na i mee nke a, ị ga-enwe ihe ùgwù nke inweta ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala n’okpuru ọchịchị Alaeze. Ị ga-adị ndụ mgbe iru újú, ihe mgbu, na ọbụna ọnwụ gabigaworo, ihe ọmụma Jehova ewee jupụta n’elu ụwa. (Aịsaịa 11:9; Mkpughe 21:1-4) Nke ahụ pụrụ ịbụ òkè nke gị ma ọ bụrụ na ị chọọ, chọta, ma mee ihe kwekọrọ n’azịza ndị ahụ dabeere na Bible nke ajụjụ ahụ bụ, “Ònye bụ Jehova?”
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 7]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.