Jehova, Nchekwube M Site N’oge Ntorobịa Gaa N’ihu
DỊ KA BASIL TSATOS SI KỌỌ
Afọ ahụ bụ 1920; ebe ahụ, ugwu Arcadia dị n’ọmarịcha Peloponnisos, Gris. Edina m n’elu àkwà, na-arịa ọrịa ahụ a na-atụ egwu bụ́ ahụ ọkụ Spain nke na-agbasa n’ụwa.
MGBE ọ bụla mgbịrịgba chọọchị kụrụ, amatara m na ọ mara ọkwa ọnwụ nke onye ọrịa ọzọ. Oge nke m ò ruwo? Ọ dabaara m nke ọma na m gbakere, ma ọtụtụ nde agbakeghị. Ọ bụ ezie na m dị nanị afọ asatọ mgbe ahụ, ahụmahụ nke a na-atụ egwu ka dịkwa ọhụrụ n’uche m.
Nchegbu Ime Mmụọ na Nwata
N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Papa Nnukwu nwụrụ. Mgbe olili ozu ya gasịrị, echetara m ka Mama sonyeere mụ na nwanne m nwanyị na varanda ụlọ anyị. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ebe ọ chọrọ ibelata iru újú anyị, o ji nwayọọ kwuo, sị: “Leenụ, ụmụ m, anyị nile aghaghị ime agadi ma nwụọ.”
Ọ bụ ezie na o kwuru ya n’ụzọ dị nro, ihe o kwuru nyere m nsogbu. ‘Lee ihe mwute ọ bụ! Lee ihe mmegbu ọ bụ!’ ka m chere. Ma ihu anyị abụọ gbachapụrụ mgbe Mama kwukwara, sị: “Otú ọ dị, mgbe Onyenwe anyị ga-abịa ọzọ, ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, anyị agaghị anwụkwa ọzọ!” Aa, nke ahụ na-akasi obi!
Malite n’oge ahụ enwere m mmasị miri emi n’ịchọpụta kpọmkwem mgbe oge obi ụtọ ahụ pụrụ ịbịa. Ajụrụ m ọtụtụ ndị mmadụ, ma ọ dịghị onye nwere ike ịgwa m, ma ọ bụkwanụ, onye yiri ọbụna ka o nwere mmasị n’ịtụle okwu ahụ mgbe e welitere ya.
Otu ụbọchị mgbe m dị ihe dị ka afọ 12, nna m natara otu akwụkwọ site n’aka nwanne ya nwoke nke bi na United States. A kpọrọ ya The Harp of God, nke Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara. Elenyere m anya n’ebe e dere ihe ndị dị n’ime ya, anya m gbukepụkwara mgbe m hụrụ isiakwụkwọ ahụ bụ́ “Nlaghachi nke Onyenwe Anyị.” Eji m oké mmasị gụọ ya, ma enwetaghị m ihe m tụrụ anya ya n’ihi na ọ dịghị afọ e nyere maka nlaghachi ahụ. Otú ọ dị, akwụkwọ ahụ gosiri na ọ dịkwaghị anya.
N’oge na-adịghị anya amalitere m ịga ụlọ akwụkwọ dị elu wee tinye obi m nile n’agụmakwụkwọ m. Otú ọ dị, site n’oge ruo n’oge, nwanne nna m nọ America na-ezite mbipụta nke Ụlọ Nche, bụ́ ndị m nwere ọṅụ ịgụ. Ọzọ, kwa Sunday, m gara Sunday school, bụ́ ebe bishọp na-abịakarị ma na-agwa anyị okwu.
N’otu ụbọchị Sunday, oké iwe ji bishọp ahụ, o wee sị: “Ndị ọbịa na-ewebataju akwụkwọ ndị jụrụ okwukwe n’obodo anyị.” Mgbe ahụ o welitere otu mkpụrụ Ụlọ Nche elu wee tie mkpu, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu ahụ akwụkwọ ndị yiri nke a n’ụlọ ya, weta ha na chọọchị, m ga-akpọkwa ha ọkụ.”
Ụda olu ya nyere m nsogbu n’obi, ma mmụọ ịbọ ọ́bọ̀ ya nyere m nsogbu ọbụna karịa. Ya mere, emeghị m dị ka o si kwuo. Otú ọ dị, edegaara m nwanne nna m akwụkwọ ma kwuo ka ọ ghara izitere m akwụkwọ ndị Watch Tower ọzọ. Ma, m nọgidere na-atụgharị uche n’okwu banyere nlaghachi Kraịst.
Agụụ Ime Mmụọ Amụbaa
Mgbe ezumike oge okpomọkụ bịara, ebupụtara m akpa ákwà m ịkwanye uwe m. N’ike akpa ahụ e nwere akwụkwọ nta atọ nke ndị Watch Tower Society bipụtara. N’ihi ihe ụfọdụ ahụbeghị m ha mbụ. A kpọrọ otu Where Are the Dead?
‘Nke ahụ yiri ihe na-adọrọ mmasị,’ ka m chere. Ọ bụ ezie na m chetara ịdọ aka ná ntị bishọp ahụ, ekpebiri m ịgụ akwụkwọ nta ahụ nke ọma iji chọta ntụpọ ndị m chere na ha nwere. Eweere m otu pensil wee jiri nlezianya malite nnyocha m. N’ụzọ juru m anya, ihe nile dị n’akwụkwọ nta ahụ yiri ihe ezi uche dị na ha, ihe ọ bụla e kwukwara nwere akụkụ akwụkwọ nsọ a kpọtụrụ uche ka onye na-agụ ya nwee ike ịtụle ya na Bible.
Ebe anyị na-enweghị Bible, echere m echiche ma a kọwahiewo akụkụ akwụkwọ nsọ a kpọtụrụ uche iji kwekọọ ná nzube nke ndị dere ya. Ya mere edegaara m nwanne nna m akwụkwọ wee gwa ya ka o zitere m otu Bible zuru ezu. O mere nke ahụ ozugbo. Agụchapụrụ m ya ugboro abụọ, ọ bụkwa ezie na e nwere ọtụtụ ihe dị na ya nke m na-apụghị ịghọta, akwụkwọ Daniel na Mkpughe kpaliri mmasị m. Achọrọ m ịghọta ihe ndị ha buru n’amụma, ma ọ dịghị onye nọnụ nke pụrụ inyere m aka.
Ahapụrụ m ụlọ akwụkwọ na 1929, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke ahụ gasịrị, nwanne nna m bi n’America zitekwaara m mbipụta nke Ụlọ Nche. Amalitere m inweta obi ụtọ ka ukwuu n’ịgụ ha, m wee gwa ya ka ọ na-ezitere m ha mgbe nile. Amalitekwara m ịgwa ndị ọzọ banyere olileanya maka ọdịnihu nke m na-amụta na magazin ndị ahụ. Ma mgbe ahụ ndụ m gbanwere n’ụzọ pụtara ìhè.
Ọganihu Ime Mmụọ na Burma
Ụmụnne mama m ndị nwoke akwagawo na Burma (nke bụ Myanmar ugbu a), ezinụlọ anyị kpebikwara na ọ bụrụ na mụ esonyere ha, ọ ga-eme ka ahụmahụ m saa mbara, ma eleghị anya mepeekwara m ohere azụmahịa. Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa agụsiwo m agụụ ike mgbe nile, ya mere obi tọrọ m ụtọ n’olileanya nke ịga n’ebe ahụ. Na Burma, anọgidere m na-anata Ụlọ Nche site n’aka nwanne nna m, ma ọ dịbeghị mgbe mụ onwe m zutere otu n’ime Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ.
Otu ụbọchị obi tọrọ m ụtọ ịhụ otu ịma ọkwa dị n’Ụlọ Nche maka akwụkwọ Light, mpịakọta abụọ ndị kọwara akwụkwọ Bible bụ Mkpughe. Tinyere nke ahụ, amụtara m na ọrụ Ndị Mmụta Bible nọ na Burma bụ nke a na-elekọta site n’alaka ụlọ ọrụ India nke Watch Tower Society, nke dị na Bombay. Edere m akwụkwọ ozugbo ka e wetara m akwụkwọ Light, kwuokwa ka e zite Ndị Mmụta Bible nọ n’India ka ha bịa kwusaa ozi ọma na Burma.
Akwụkwọ ndị ahụ bịarutere site na post ọfịs, ma mgbe otu izu ma ọ bụ ihe dị ka ya gasịrị, ndị Burma bụ́ Ndị Mmụta Bible letara m. Enwere m obi ụtọ ịmụta na e nwere otu obere ìgwè n’ime ha ebe m bi na Rangoon (nke bụ Yangon ugbu a), isi obodo Burma. Ha kpọrọ m òkù ịbịa klasị ọmụmụ Bible ha na-enwe mgbe nile nakwa isoro ha kere òkè n’ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Obi m anabatachaghị ya na mbụ ma n’oge na-adịghị anya amalitere m inwe obi ụtọ n’isoro ndị okpukpe Buddha, Hindu, na Alakuba na-ekerịta ihe ọmụma Bible, tinyekwara ndị Kraịst egbugbere ọnụ.
Mgbe ahụ alaka ụlọ ọrụ India zitere mmadụ abụọ na-eje ozi oge nile (ndị a na-akpọ ndị ọsụ ụzọ) na Rangoon, bụ́ Ewart Francis na Randall Hopley. Ha abụọ sitere n’England na mbụ ma ha anọwo na-eje ozi n’India ruo ọtụtụ afọ. Ha gbara m ume nke ukwuu, n’afọ 1934, e mekwara m baptism ná ngosipụta nke nrara m nye Jehova.
Onyeàmà Nwere Obi Ike
Mgbe oge na-aga alaka ụlọ ọrụ India zitere ndị ọsụ ụzọ ọzọ na Burma. Abụọ n’ime ha, Claude Goodman na Ron Tippin, gara n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè wee gwa Sydney Coote okwu, bụ́ onye nlekọta ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ. Ọ natara akwụkwọ ndị ahụ, gụchaa ha, wee malite idegara nwanne ya nwanyị nke tọrọ ya nọ na di, bụ́ Daisy D’Souza, akwụkwọ na Mandalay. Ya onwe ya chọpụtara na akwụkwọ ndị ahụ dị mma ọgụgụ wee kwuo ka e zitekwuo ndị ọzọ.
Daisy, bụ́ onye nọsiworo ike na Katọlik, bụ onye nwere obi ike pụrụ iche. Ọ malitere ịga na nke ndị agbata obi ya ma na-agwa ha banyere ihe ndị ọ na-amụta. Mgbe onye ụkọchukwu parish ya bịakwara na nke ya, bụ́ onye jụrụ ya ihe mere o jiworo kwụsị ịbịa chọọchị, o gosiri ya na Bible akwadoghị ihe ndị ọ na-akụzi, dị ka hell na-ere ọkụ.
N’ikpeazụ, ọ jụrụ ya, sị: “Kemgbe afọ a nile a nọworo na-agwa ha banyere hell na-ere ọkụ, olee ụzọ m pụrụ isi gwa ha ugbu a na e nweghị ebe dị otú ahụ? Ọ dịghị onye ga-achọ ịbịa chọọchị.”
“Ọ bụrụ na ị bụ onye Kraịst na-ekwu eziokwu,” ka Daisy zaghachiri, “ị ga-akụziri ha eziokwu, n’agbanyeghị ihe ga-esi na ya pụta.” Mgbe ahụ o kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na i meghị otú ahụ, m ga-eme ya!” O mekwara otú ahụ.
E mere Dick na Daisy na ụmụ ha nwanyị abụọ topụtaworonụ baptism na Rangoon n’otu oge ahụ e mere mụ onwe m. Mgbe afọ atọ gasịrị, na 1937, alụrụ m nwa ha nwanyị nke abụọ, bụ́ Phyllis.
Mgbapụ gaa India
Ndị agha Japan wakwasịrị Burma n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, Rangoon dakwara na March 8, 1942. A manyere ndị nkịtị si ná mba ọzọ iji ọsọ gbaga India. Ọtụtụ narị mmadụ nwara ịga site n’ụzọ ọhịa, ma ọtụtụ nwụrụ n’ụzọ. Ọ dabara na m maara ọfịsa na-ahụ maka ọpụpụ ahụ n’onwe m, ya mere enwere m ike ịgbata tiketi iso otu n’ime ụgbọ mmiri ndị ikpeazụ na-ahapụ Rangoon ịga Calcutta. Ịhapụ ụlọ anyị na ihe ka ọtụtụ n’ihe onwunwe anyị n’ọkụ n’ọkụ otú ahụ bụ oge mwute nye anyị nile. Ndị Japan weghaara Burma malite na 1942 ruo 1945.
Ego anyị nwere dị ala mgbe anyị rutere n’India, ịchọtakwa ọrụ adịghị mfe. Nke a kpatara ule nke okwukwe. Ezutere m otu onye Britain bụ́ ọfịsa nke nyere m ọrụ na-enye ego nke na-emetụtaghị ije agha, ma o metụtara ije ozi dị ka akụkụ nke ụlọ ọrụ ndị agha. Site n’enyemaka Jehova, enwere m ike ịjụ ịnara ọrụ ahụ wee si otú a nwee akọ na uche ndị Kraịst dị ọcha. (Aịsaịa 2:2-4) N’ụzọ ndị ọzọkwa, anyị hụrụ enyemaka ịhụnanya nke Jehova.
Anyị kwagara na New Delhi, isi obodo India, bụ́ ebe ọ fọrọ ntakịrị ka ọ ghara ikwe omume inweta ụlọ obibi. Otú o sina dị, anyị chọtara ụlọ sara mbara nke dị n’etiti obodo ahụ. O nwere otu palọ buru ibu nke nwere ụzọ mbata nke aka ya, ọnụ ụlọ nke a ghọkwara Ụlọ Nzukọ Alaeze maka Ọgbakọ Delhi nke Ndịàmà Jehova ruo afọ ole na ole na-esonụ. Otú ọ dị, n’ihi iwu ahụ a machibidoro akwụkwọ nile nke Watch Tower Society na 1941 n’India, anyị enweghị ike inweta akwụkwọ Bible.
Ụzọ E Si Wepụ Mmachibido Iwu Ahụ
Otu Sunday na 1943, ndị na-aga ife ofufe na chọọchị nile dị na Delhi natara otu mpempe akwụkwọ nke ndị ụkọchukwu 13 sitere na chọọchị dị iche iche bịanyere aka na ya. Ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “ỤMỤ AMAALA DELHI NA-EZENỤ NDỊÀMÀ JEHOVA EZE.” Ebubo ha bụ na a machibidowo anyị iwu n’India maka ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Site ná nnwapụta nke alaka ụlọ ọrụ dị na Bombay, anyị mere ngwa ngwa bipụta ma kesaa otu mpempe akwụkwọ nke kpughere ndị ụkọchukwu. Ebe m bụ onye isi oche ndị nlekọta, e biri aha m na adres m n’okpuru mpempe akwụkwọ e ji okwu dị ike dee. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe ndị uwe ojii chọtara mụ na Margrit Hoffman ka anyị na-ekesa mpempe akwụkwọ ndị ahụ, e jidere anyị ma tụọ anyị mkpọrọ. Otú ọ dị, a napụtara anyị n’akaebe n’oge na-adịghị anya.
Mgbe e mesịrị, n’oge ije ozi ya, Margrit gara n’ụlọ nke Sir Srivastava, bụ́ onye minista a maara nke ọma n’usoro ọchịchị ndị India. Sir Srivastava nabatara ya nke ọma, n’oge ha na-enwekwa nkwurịta okwu, ọ gwara ya na a machibidowo akwụkwọ anyị iwu n’ụzọ na-ezighị ezi n’India. N’ụbọchị ahụ ọ dabara na Margrit zutere otu onye so n’òtù ndị omeiwu sitere na steti Madras. Ọ bịara n’obodo ahụ ịga nzukọ nke ndị omeiwu. Ọ gwatara ya okwu banyere ezighị ezi nke iwu ahụ a machibidoro akwụkwọ anyị, nwoke ahụ kwekwara nkwa iwelite okwu ahụ ná nzukọ ọzọ ha ga-enwe.
N’oge ahụ, ana m arụ ọrụ dị ka onye ọkà n’usoro ịgwọ ọrịa n’ejighị ọgwụ n’otu ụlọ ọgwụ dị n’obodo ahụ. Leenụ, ọ dabara na Sir Srivastava merụrụ ahụ, ndị ụlọ ọgwụ ahụ wee kpọọ m ịhụ ma usoro ịgwọ ọrịa n’ejighị ọgwụ ọ̀ pụrụ inyere ya aka. Achọpụtara m na Sir Srivastava bụ onye ihe na-adabara ya na mmadụ, ka anyị na-akpakwa nkata, agwatara m ya ná nkịtị na a napụtawo mụ na Nwaada Hoffman n’ụlọ mkpọrọ n’akaebe. Akọwara m na ọ bụ n’ihi nrụgide ndị ụkọchukwu ka e jiworo machibido akwụkwọ Bible anyị n’ihi ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma na anyị adịghị etinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọlị. Onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ anyị, bụ́ Edwin Skinner, ka m gara n’ihu ikwu, arịọwo ka e nye ya ohere ikwu okwu iji kọwaa ọnọdụ anyị, ma a jụwo ige ya ntị.
N’ụbọchị ole na ole mgbe e mesịrị, Sir Srivastava gwara m, sị: “Maazị Jenkins [onye isi ọrụ gọọmenti nke nọworo ọrụ anyị ọnọdụ ọjọọ] ga-ala ezumike nká n’ụbọchị ole na ole, Sir Francis Mudie ga-anọchikwa ya. Gwa Maazị Skinner ka ọ bịa, m ga-emekwa ka ya na Sir Francis mata.”
Sir Srivastava haziri nzukọ ahụ dị ka o kweworo ná nkwa. N’oge a na-anọ na ya, Sir Francis Mudie gwara Nwanna Skinner, sị: “Apụghị m ikwe gị nkwa ihe ọ bụla, ma m ga-eleba anya n’okwu ahụ.” Ebe ọ bụ na nnọkọ ndị omeiwu ga-amalite n’ụbọchị ole na ole, Nwanna Skinner nọrọ ịhụ ihe ga-esi na ya pụta. Dịkwa ka o kwuru, onye so ná nnọkọ omeiwu nke sitere Madras biliri ọtọ wee jụọ, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na a machibidoro akwụkwọ ndị Watch Tower Bible and Tract Society iwu n’ihi ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị?”
“Ee e, a machibidoro ha iwu ahụ iji nọrọ na nche,” ka Sir Francis Mudie zaghachiri, “ma gọọmenti ekpebiwo ugbu a iwepụ mmachibido ahụ.”
Lee oge obi ụtọ ọ bụ nye anyị mgbe anyị nụrụ akụkọ ahụ! Mgbe otu izu gasịrị alaka ụlọ ọrụ ahụ dị na Bombay natara otu akwụkwọ ozi nke na-anwapụta ọgwụgwụ nke mmachibido ahụ.
Ịlaghachi na Burma nke Agha Tisara
Ọchịchị ndị Britain laghachiri na Burma mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, mmadụ iri n’ime anyị bụ́ Ndịàmà gaghachikwara na Rangoon mgbe ọnwa ole na ole gasịrị. Anyị nwere obi ụtọ ịhụ ndị obodo ahụ ole na ole ka bụ Ndịàmà ọzọ. Mba ahụ nọ n’ọnọdụ dị imere ebere. Ije ozi ọha, gụnyere ọkụ eletrik na usoro ime njem ọha mmadụ, adịghị. Ya mere anyị zụtara otu ụgbọ ala jeep ndị agha wee jiri ya mee ihe bara uru n’ibute ndị mmadụ ná nzukọ ndị ahụ anyị haziri ozugbo anyị laghachiri.
Otu onye nwere mmasị nyere anyị ala, sitekwa n’enyemaka nke ndị nwere obi ọma n’ebe ahụ, anyị wuru otu Ụlọ Nzukọ Alaeze buturu ibu. E wuru ya site n’iji ọtọsị buru ibu mee ogidi, ọtọsị e kpuchiri ute mee ahụ ụlọ, jirikwa akịrịka kpuchie elu ya. N’ebe a, n’April 1947, Nathan H. Knorr, onye isi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, na odeakwụkwọ ya, bụ́ Milton G. Henschel, kwuru okwu n’oge ha letara Rangoon. N’oge ahụ, anyị nwere Ndịàmà 19 na Burma nile. Ma okwu ihu ọha nke Nwanna Knorr, nke e nwere n’Ụlọ Nkiri New Excelsior, bụ nke 287 mmadụ bịara!
Anyị Ejee Biri n’Australia
Na January 4, 1948, e nyere Burma nnwere onwe site n’aka Great Britain, ihe kakwa n’ọnụ ọgụgụ ndị Europe chere na ọ kaara ha mma ịhapụ mba ahụ. Mgbe anyị jisịrị ekpere tụlee ya, mụ na Phyllis kpebiri ịkpọrọ nwa anyị nwanyị gaa Australia. Anyị jere biri na Perth, bụ́ isi obodo nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia.
Ịhapụ Burma ọzọ, n’ụzọ na-adịgide adịgide ugbu a, bụ oge mwute nye anyị. Site n’oge ruo n’oge, anyị natara ozi site n’aka ndị anyị hụrụ n’anya n’ebe ahụ, anyị nwekwara obi ụtọ ịmara na ọrụ Alaeze ji nwayọọ nwayọọ na-aga n’ihu ná mba ahụ.
Na-amalite na 1978, ruo afọ anọ anyị nwere obi ụtọ ije ozi n’ọgbakọ nile na-asụ Grik dị n’obodo ndị bụ isi n’Australia. Nke a pụtara ime njem dị anya, ebe ọ dị ihe karịrị 4,200 kilomita site n’ụsọ osimiri ọdịda anyanwụ ruo n’ụsọ osimiri ọwụwa anyanwụ nke mba nke a buru ibu. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọnọdụ ihu igwe, nke dị iche nke ukwuu site n’otu obodo gaa n’ọzọ, keere òkè ná ndakpọ ahụ ike anyị. Ya mere anyị jere biri ọzọ na Perth, bụ́ ebe m nọgidere na-eje ozi dị ka onye okenye n’otu n’ime ọgbakọ 44 dị n’obodo ahụ.
Ka afọ ndị ahụ gafeworo, ọhụhụ ụzọ m adịwo njọ karị, ịgụ akwụkwọ aghọwo nke siri ike. Ma, n’agbanyeghị nsogbu ahụ ike, obi anyị ka dị ọhụrụ. Anyị abụọ ji obi ike na-echere ụbọchị obi ụtọ ahụ mgbe ndị nile na-atụ egwu Jehova ga-ahụ anyanwụ nke amara ya ka ọ ‘ga-awa, ọgwụgwọ dịkwa na nku ya; anyị ga-apụkwa, wulie elu dị ka ụmụ ehi nke ụlọ ebe a na-eme ka anụ maa abụba.’—Malakaị 4:2.a
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Na December 13, 1992, ka a na-edecha akụkọ ndụ nke a, Nwanna Tsatos dara n’ụra ọnwụ.
[Foto dị na peeji nke 24]
Ezinụlọ m na Nwanna Henschel na Knorr na Burma (Myanmar) n’afọ 1947
[Foto dị na peeji nke 25]
Basil Tsatos na nwunye ya, Phyllis, n’Australia