Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
È kwesịrị ịkpọ Jọn onye mere Jisọs baptism aha dị ka “Jọn Baptist” ka ọ̀ bụ “Jọn Onye Na-eme Baptism”?
Aha abụọ ahụ ziri ezi ma nwee nkwado Bible.
Jọn gaje “idozi nye Onyenwe anyị otu ndị nke a kwadebewooro ya,” bụ́ nke o mere site ‘n’ikwusa baptism nke nchegharị ka e wee gbaghara mmehie.’ (Luk 1:17; 3:3) Matiu onyeozi dere, sị: “Jọn Baptist bịara, na-ekwusa n’ọhịa nke Judia, sị, Chegharịanụ; n’ihi na alaeze eluigwe dị nso. . . . Mgbe ahụ Jerusalem, na Judia nile . . . na-apụkwuru ya; ọ na-emekwa ha baptism n’Osimiri Jọdan, ha na-ekwupụta mmehie nile ha.”—Matiu 3:1-16.
Rịba ama na Matiu kọwara Jọn dị ka “Baptist.” Matiu, bụ́ onye ihe àmà gosiri na ọ na-ahazi ihe ndekọ ya nye ndị Juu, aghaghị icheworị na ndị Juu ga-amata onye “Baptist” ahụ bụ. O ji “Baptist” mee ihe n’ụdị nke útú aha.a Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya jikwa “Jọn Baptist” mee ihe, dịkwa ka ndị ohu Herọd mere.—Matiu 11:11, 12; 14:2; 16:14.
Mak onye na-eso ụzọ kọrọ banyere ojiji yiri nke ahụ e ji “Baptist” mee ihe. (Mak 6:25; 8:28) Ma mgbe ọ na-akọwapụta onye Jọn bụ, Mak kpọrọ ya ‘Jọn Onye Na-eme Baptism.’ (Mak 1:4) Okwu Grik e ji mee ihe na Mak 1:4 dị iche nke nta pụọ na nke e ji mee ihe n’amaokwu ndị ọzọ. A pụkwara ịsụgharị Mak 1:4 ịbụ “onye ahụ na-eme baptism.” Mak na-eme ka ihe Jọn na-eme pụta ìhè, ọ bụ onye ahụ na-eme baptism, onye na-eme baptism.
Otú ọ dị, o yighị ka ọ bụ na anyị aghaghị iwepụta ọdịiche dị n’etiti ụzọ ndị a e si akpọ Jọn. Na Mak 6:24, 25, anyị na-agụ banyere Salome, sị: “O wee pụọ, sị nne ya, Gịnị ka m ga-arịọrọ onwe m? O wee sị, Isi Jọn onye na-eme baptism. O were ọsọ bata ngwa ngwa n’ebe eze ahụ nọ, wee rịọ, sị, Ana m achọ ka i nye m isi Jọn Baptist.” E ji aha abụọ ahụ mee ihe n’ụzọ mgbanwerịta.
Ụfọdụ ndị pụrụ ịghọta “Baptist” dị ka nkọwa nke abụọ dị n’akwụkwọ ọkọwa okwu si dị: “Onye òtù ma ọ bụ onye nọ n’okpukpe okwuchukwu Protestant nke a maara site ná ndọrọ ndọrọ ọgbakọ nakwa baptism site ná mmikpu na mmiri nke nanị ndị kwere ekwe.” N’ezie Jọn abụghị onye dị otú ahụ.
Ya mere, ma “Jọn Baptist” ma “Jọn Onye Na-eme Baptism” ziri ezi ma kwesị ekwesị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Onye Juu ahụ na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus dere banyere “Jọn, onye a na-etu Baptist.”