Nọgide Na-eto Eto N’ihe Ọmụma
‘Nyezuokwanụ ihe ọmụma n’okwukwe unu.’—2 PITA 1:5.
1, 2. (a) Gịnị ka ị pụrụ ịmụta site n’ile anya n’eluigwe? (Ndị Rom 1:20) (b) Olee ókè mmadụ ruru n’ezie n’ịmụba n’ihe ọmụma?
OLEE ihe ị pụrụ ịmụta site n’ịpụ n’èzí n’oge abalị mmiri na-adịghị eru na ile anya n’ọnwa na-eti zaa na kpakpando a na-apụghị ịgụta ọnụ? Ị pụrụ ịmụta ihe banyere Onye nke kere ihe ndị a nile.—Abụ Ọma 19:1-6; 69:34.
2 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụba ihe ọmụma ahụ, ị̀ ga-arịgo n’elu ụlọ gị wee si n’ebe ahụ lepụ anya? Eleghị anya ị gaghị. Albert Einstein nwere mgbe o jiri ihe atụ dị otú ahụ mee ihe iji mee ka a ghọta na ndị ọkà mmụta sayensị amụbabeghị nke ukwuu n’ezie n’ihe ọmụma ha banyere eluigwe na ala, nweekwa ntakịrị ihe ọmụma banyere Onye nke kere ya.a Dr. Lewis Thomas dere, sị: “Otu ihe kasị ukwuu sayensị mepụtaworo na narị afọ nke a kasị narị afọ nile mịpụta mkpụrụ n’ụzọ nkà mmụta sayensị bụ nchọpụta nke na ọ dịghị ihe anyị ma ma ọlị; anyị maara ntakịrị ihe banyere okike, anyị na-aghọkwa ọbụna ihe dị ala karị.”
3. N’echiche dị aṅaa ka mmụba n’ihe ọmụma na-amụba ihe mgbu?
3 Ọbụna ma à sị na i jiri ihe fọrọ afọ n’afọ ndụ mmadụ mee ihe ịchọ ihe ọmụma dị otú ahụ, ị pụrụ nanị ịmata banyere otú ndụ si bụrụ ihe dị mkpirikpi, hụkwa n’ụzọ doro anya karị na mmadụ iji ihe ọmụma ya mee ihe nwere ịkpa ókè site n’ezughị okè nakwa site ‘n’ịgbagọ agbagọ’ nke ụwa nke a. Solomọn kwupụtara isi ihe ahụ, na-ede, sị: “N’ọtụtụ amamihe ka ọtụtụ mkpasu iwe dị: ọzọ, onye na-atụkwasị ihe ọmụma na-atụkwasị ihe mgbu.” (Eklisiastis 1:15, 18) Ee, inweta ihe ọmụma na amamihe nke na-enweghị ihe jikọrọ ya na nzube Chineke na-akpatakarị ihe mgbu na mkpasu iwe.—Eklisiastis 1:13, 14; 12:12; 1 Timoti 6:20.
4. Ihe ọmụma dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịchọ inweta?
4 Bible ọ̀ na-atụ aro ka anyị ghara inwe mmasị n’ịmụba ihe ọmụma anyị? Pita onyeozi dere, sị: “Ma, na-abanụ ụba n’amara na ọmụma nke Onyenwe anyị, bụ́ Onye Nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto dịịrị ma ugbu a ma ruo ụbọchị nke mgbe ebighị ebi.” (2 Pita 3:18) Anyị pụrụ ma kwesị ịnakwere agbamume ahụ dị ka nke e nyere anyị, na-agba anyị ume ito eto n’ihe ọmụma. Ma ọ bụ n’ụdị ihe ọmụma dị aṅaa? Olee ụzọ anyị pụrụ isi mụbaa na ya? Ànyị na-emekwa otú ahụ n’ezie?
5, 6. Olee ụzọ Pita si mesie okwu ike na anyị nọ ná mkpa inweta ihe ọmụma?
5 Ịmụba n’ezi ihe ọmụma banyere Onye Okike nke eluigwe na ala na banyere Jisọs bụ echiche bụ isi dị n’akwụkwọ ozi Pita nke abụọ. Ná mmalite ya o dere, sị: “Ka e mee ka amara baara unu ụba, ya na udo, n’ime mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị; dị ka ike o ji bụrụ Chineke nyeworo n’aka anyị ihe nile dịịrị ndụ na nsọpụrụ Chineke n’efu, site ná mmazu nke onye ahụ onye ji ebube na ịdị mma nke aka ya kpọọ anyị.” (2 Pita 1:2, 3) Ya mere o jikọtara inwe amara na udo n’anyị inweta ihe ọmụma banyere Chineke na Ọkpara ya. Ezi uche dị na nke ahụ, ebe ọ bụ na Onye Okike, bụ́ Jehova, bụ nsọtụ bụ isi nke ezi ihe ọmụma. Onye na-atụ egwu Chineke na-enwe ike ịghọta ihe n’ụzọ ziri ezi, na-enwekwa nkwubi okwu ndị dị irè.—Ilu 1:7.
6 Mgbe ahụ Pita gbara ume, sị: “Nyezuokwanụ ịdị mma n’okwukwe unu; nyezuokwa ihe ọmụma n’ịdị mma unu; nyezuokwa ijisi onwe unu ike n’ihe ọmụma unu; nyezuokwa ntachi obi n’ijisi onwe unu ike; nyezuokwa nsọpụrụ Chineke n’ime ntachi obi unu; nyezuokwa ịhụnanya ụmụnna n’ime nsọpụrụ Chineke unu nyezuokwa ịhụnanya n’ime ịhụnanya ụmụnna unu. N’ihi na a sị na unu nwere ihe ndị a, a sịkwa na unu nwere ha hie nne, ha na-edo unu ndị na-abụghị ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ ruo ịmazu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (2 Pita 1:5-8)b N’isi nke na-esonụ, anyị na-agụ na inweta ihe ọmụma na-enyere ndị mmadụ aka ịgbanahụ mmerụ nile nke ụwa. (2 Pita 2:20) Pita si otú a mee ka o doo anya na ndị na-aghọ ndị Kraịst nwere mkpa nke ihe ọmụma, dịkwa ka ndị ahụ maliteworo ijere Jehova ozi. Ị̀ nọ n’otu n’ime akụkụ ndị ahụ?
Mụọ Ihe, Mụgharịa, Jiri Ya Mee Ihe
7. N’ụzọ dị aṅaa ka ọtụtụ siworo nweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu Bible ndị bụ isi?
7 Ọ pụrụ ịbụ na i so Ndịàmà Jehova na-enwe ọmụmụ Bible n’ihi na ị ghọtara eziokwu dị n’ozi ha. Otu ugbo n’izu, ruo otu hour ma ọ bụ ihe ruru ya, ị na-atụle otu isiokwu Bible site n’iji ihe na-enye aka dị ka Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Nke ahụ dị mma! Ọtụtụ ndị na-eso Ndịàmà Jehova na-enwe ọmụmụ ihe dị otú ahụ enwetawo ezi ihe ọmụma. Otú ọ dị, gịnị ka ị pụrụ ime iji mụbaa ókè nke ihe gị onwe gị na-amụ? Lee aro ụfọdụ ndị a tụrụ.c
8. Ka a na-akwadebe maka ọmụmụ ihe, gịnị ka onye a na-eduziri ọmụmụ ihe pụrụ ime iji mụtakwuo ihe?
8 Tupu oge eruo, ka ị na-akwadebe ọmụmụ ihe gị, leruo anya n’isiokwu a ga-atụle. Nke ahụ pụtara ịgụ ihe a kpọrọ isiakwụkwọ ahụ, isiokwu nta dị iche iche, na ihe osise ọ bụla a pụrụ iji mee ihe atụ nke isiokwu ahụ. Mgbe ahụ, ka ị na-agụ otu paragraf ma ọ bụ nkebi nke akwụkwọ ahụ, chọọ echiche ndị bụ isi na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-akwado ha, na-aka ihe n’okpuru ndị a ma ọ bụ na-eme ka ha pụta ìhè. Iji hụ ma ị mụtara eziokwu ndị a tụlere, gbalịa ịza ajụjụ ndị a jụrụ na paragraf dị iche iche. N’ime nke a, gbaa mbọ ịhazi azịza ha n’okwu nke gị. N’ikpeazụ, tụleghachi ihe mmụta ha, na-agbalị icheta isi ihe ndị ahụ na ịrụ ụka ndị na-akwado ha.
9. Olee ụzọ itinye aro ndị a tụrụ banyere ọmụmụ ihe n’ọrụ pụrụ isi nyere mmadụ aka ịmụ ihe?
9 Ị pụrụ ịtụ anya ịmụba n’ihe ọmụma gị ma ọ bụrụ na i tinye aro ndị a n’ọrụ. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Otu ihe kpatara ya bụ na ị ga na-agụ isiokwu site n’ọchịchọ siri ike nke ịmụta ihe, na-emezi ala ahụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Site n’ịghọta ihe a na-atụle, mgbe ahụkwa ịchọ isi ihe dị na ya na usoro ntụgharị uche dị na ha, ị ga-ahụ ụzọ ụmụ irighiri ihe ụfọdụ si metụta isiokwu ma ọ bụ nkwubi okwu ahụ. Ntụleghachi ikpeazụ ga-enyere gị aka icheta ihe ị mụworo. Gịnị banyere mgbe e mesịrị, n’oge a na-eduziri gị ọmụmụ Bible?
10. (a) N’ihi gịnị ka ikwughachi isi ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ọhụrụ ji baa ntakịrị uru? (b) Gịnị ka “ncheta a na-eme ná nkebi nkebi gụnyere”? (ch) Olee ụzọ ụmụntakịrị ndị Israel pụrụ isiworị rite uru site ná mmụgharị?
10 Ndị ọkachamara n’okwu agụmakwụkwọ maara abamuru nke mmụgharị dabara n’oge dị mma na nke nwere nzube. Nke a abụghị nanị ikwughachi okwu, nke ị pụrụ ịnwaleworị n’ụlọ akwụkwọ ka ị na-amụ aha, ihe mere eme, ma ọ bụ echiche ụfọdụ site n’ibu ha n’isi. Otú ọ dị, ị̀ na-achọpụta na n’oge na-adịghị anya ị na-echezọ ihe i kwuworo n’eleghị anya n’akwụkwọ, na ọ na-agbafu n’uche gị ọsọ ọsọ? N’ihi gịnị? Ibu nnọọ okwu ma ọ bụ ihe ọhụrụ n’isi pụrụ ịbụ ihe na-agwụ ike, ihe ndị na-esi na ha apụta na-adịru nwa oge. Gịnị pụrụ ịgbanwe nke ahụ? Gị ịchọ n’ezie ịmụta ihe ga-enye aka. Ihe ọzọ na-enye aka bụ mmụgharị e ji nzube mee. Minit ụfọdụ mgbe ị mụtasịrị otu isi ihe, tupu ọ gbafuo n’uche gị, gbalịa iche echiche n’ime onwe gị banyere ihe ị mụtara. A kpọwo nke a “ncheta a na-eme ná nkebi nkebi.” Site n’ichetaghachiri onwe gị ihe tupu ọ gbafuo n’uche, ị na-agbatị ịdị anya nke ike ncheta. N’Israel, ndị bụ nna ga-ezi ụmụ ha ihe Chineke nyere n’iwu. (Deuterọnọmi 6:6, 7) “Izi” pụtara ịkụzi ihe site ná mmụgharị. O yikarịrị ka ọtụtụ n’ime ndị ahụ bụ́ nna bu ụzọ kọọrọ ụmụ ha banyere iwu ndị ahụ; mgbe e mesịrị ha kwughachiri ihe ọmụma ahụ; mgbe ahụkwa jụọ ụmụ ha ajụjụ banyere ihe a mụtara.
11. Gịnị ka a pụrụ ime n’oge a na-enwe ọmụmụ Bible iji mụbaa ọmụmụ ihe?
11 Ọ bụrụ na Onyeàmà na-eduziri gị ọmụmụ Bible, ọ pụrụ inyere gị aka ịmụta ihe site n’ịchịkọta ihe a na-amụ site n’oge ruo n’oge mgbe a na-amụ ihe. Nke a abụghị ime ihe ụmụaka. Ọ bụ nkà nke na-emeziwanye ọmụmụ ihe, ya mere jiri obi ụtọ kere òkè ná ntụleghachi a na-eme site n’oge ruo n’oge. Mgbe ahụ, ná ngwụsị nke ọmụmụ ihe ahụ, kere òkè ná ntụleghachi ikpeazụ nke ị ga-aza ajụjụ site n’ihe i chetara. Ị pụrụ, n’okwu nke aka gị, ịkọwa isi ihe ndị ahụ dị ka ị ga-eme mgbe ị na-akụziri onye ọzọ ihe. (1 Pita 3:15) Nke a ga-enyere gị aka ime ka ihe ị mụtara bụrụ akụkụ nke ihe ị na-echeta n’oge dị anya.—Tụlee Abụ Ọma 119:1, 2, 125; 2 Pita 3:1.
12. Onye a na-eduziri ọmụmụ ihe n’onwe ya pụrụ ime gịnị iji meziwanye ncheta ihe ya?
12 Nzọụkwụ ọzọ na-enye aka ga-abụ gị, n’ime otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ, ịkọrọ onye ọzọ banyere ihe ị mụtara, eleghị anya nwata akwụkwọ ibe gị, onye ọrụ ibe gị, ma ọ bụ onye agbata obi. Ị pụrụ ihota isiokwu ahụ ma kwuokwa na ị chọrọ nnọọ ịhụ ma ị pụrụ icheta usoro ihe ndị bụ isi e ji tụgharịa uche ma ọ bụ akụkụ akwụkwọ nsọ na-akwado ha, bụ́ ndị sitere na Bible. Nke ahụ pụrụ ịkpali mmasị nke onye nke ọzọ. Ọbụna ọ bụrụ na o meghị otú ahụ, usoro ahụ nke ikwughachi ihe ọmụma ọhụrụ ahụ mgbe otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ gasịrị ga-eme ka ọ nọrọ n’uche gị. Mgbe ahụ ị ga-amụtaworị ya n’ezie, na-eme ihe 2 Pita 3:18 gbara ume.
Ịmụ Ihe n’Ụzọ Dị Irè
13, 14. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji chọọ ime ihe karịrị nanị inweta na icheta ihe ọmụma?
13 Ịmụ ihe bụ ihe karịrị nnọọ ịnara ozizi ma ọ bụ inwe ike icheta ihe ọmụma. Ndị okpukpe n’oge Jisọs mere nke ahụ site n’ekpere mkpekwasị ha. (Matiu 6:5-7) Ma olee ụzọ ihe ọmụma ahụ si metụta ha? Hà na-amịpụta mkpụrụ nke ezi omume? Ọ dịghị ma ọlị. (Matiu 7:15-17; Luk 3:7, 8) Ihe so kpata nsogbu ahụ bụ na ihe ọmụma ahụ abamighị nke ọma n’ime obi ha ma rụpụta ihe bara uru n’ime ha.
14 Dị ka Pita si kwuo, o kwesịrị ịdị iche n’ebe ndị Kraịst nọ, laa azụ n’oge ahụ ma ugbu a. Ọ gbara anyị ume inyezu okwukwe anyị ihe ọmụma nke ga-enyere anyị aka izere ịbụ ndị na-agbasighị ike ma ọ bụ ndị na-adịghị amipụta mkpụrụ. (2 Pita 1:5, 8) Ka nke a wee ghọọ eziokwu n’ọnọdụ anyị, anyị aghaghị ito eto n’ihe ọmụma ahụ ma mee ka o metụta anyị n’ụzọ ruru ala, na-akpali ime obi anyị. Nke ahụ pụrụ ịbụ ihe na-adịghị mgbe nile.
15. Nsogbu dị aṅaa bilitere n’ebe ụfọdụ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst nọ?
15 N’ụbọchị Pọl, ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst nwere otu nsogbu n’akụkụ nke a. N’ịbụ ndị Juu, ha nwere ihe ọmụma ụfọdụ banyere Akwụkwọ Nsọ. Ha maara banyere Jehova na ụfọdụ n’ime ihe ọ chọrọ ha n’aka. Mgbe e mesịrị, ha nwetakwara ihe ọmụma banyere Mesaịa, nwee okwukwe, e wee mee ha baptism dị ka ndị Kraịst. (Ọrụ 2:22, 37-41; 8:26-36) Ruo ọtụtụ ọnwa na afọ, ha aghaghị ịnọworị na-abịa nzukọ ndị Kraịst, ebe ha pụrụ ikere òkè n’ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ na ịza ajụjụ. Ma, ụfọdụ etoghị eto n’ihe ọmụma. Pọl dere, sị: “N’ihi na mgbe unu kwesịrị ịbụ ndị ozizi n’ihi oge, ọ dị unu mkpa ọzọ ka mmadụ zie unu ihe bụ ihe ozizi mbụ nke mmalite okwu si n’ọnụ Chineke pụta; unu aghọwokwa ndị mmiri ara dị mkpa, ọ bụghị nri siri ike.” (Ndị Hibru 5:12) Olee ụzọ ọ pụrụ isi dị otú ahụ? Ihe dị otú ahụ ọ̀ pụkwara ime anyị?
16. Gịnị bụ ala mkpụkọ mmiri, oleekwa ụzọ ọ na-esi emetụta ihe ọkụkụ?
16 Dị ka ihe atụ, tụlee ala mkpụkọ mmiri, ala ebe mmiri na-akpụkọ n’oge nile n’Arctic nakwa n’ógbè ndị ọzọ ebe ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ dị ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ na-eme ka mmiri kpụkọọ. Ala, nkume na mmiri dị n’okpuru ala na-akpụkọ ghọọ nnukwu ọkpụrụkpụ ihe, mgbe ụfọdụ na-eru 900 mita n’ịdị omimi. N’oge okpomọkụ, mgbaze pụrụ iwere ọnọdụ n’elu ala (nke a na-akpọ mpekere ala na-agbanwe agbanwe). Otú ọ dị, mpekere ala nke a gbazere agbaze na-agbakarị apịtị n’ihi mmiri nke na-apụghị idebanye n’okpuru ala mkpụkọ mmiri. Ihe ọkụkụ ndị na-eto ná mpekere elu ala ahụ na-adịkarị obere ma ọ bụ mkpụmkpụ; mkpọrọgwụ ha apụghị ịbanye n’okpuru ala mkpụkọ mmiri ahụ. ‘Gịnị,’ ka ị pụrụ ịjụ, ‘ka ala mkpụkọ mmiri nwere ime ma m̀ na-eto eto n’ihe ọmụma nke eziokwu Bible?’
17, 18. Olee ụzọ a pụrụ isi jiri ala mkpụkọ mmiri na mpekere ala ya na-agbanwe agbanwe mee ihe iji kọwaa ihe bilitere n’ebe ụfọdụ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst nọ?
17 Ala mkpụkọ mmiri na-akọwa nke ọma ọnọdụ nke onye ọgụgụ isi ya na-adịghị ekere òkè n’ụzọ dị irè n’ịnara, icheta, na iji ezi ihe ọmụma na-eme ihe. (Tụlee Matiu 13:5, 20, 21.) O yikarịrị ka onye ahụ ò nwere ọgụgụ isi iji mụta isiokwu dị iche iche, gụnyere eziokwu Bible. Ọ mụrụ “ozizi mbụ nke mmalite okwu si n’ọnụ Chineke pụta,” ọ pụkwara iruwo eru ịbụ onye e mere baptism, dị ka ndị Hibru ahụ bụ́ ndị Kraịst mere. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na o ‘rubeghị n’itozu okè,’ ịmara ihe ndị karịrị “okwu nke mmalite nke Kraịst.”—Ndị Hibru 5:12; 6:1.
18 Jiri anya uche gị hụ ndị Kraịst nọ ná nzukọ laa azụ mgbe ahụ. Ha nọ n’ebe ahụ ma mụrụ anya, ma uche ha ọ̀ dị n’ịmụ ihe? Hà ji ụzọ dị irè na obi ha nile na-eto eto n’ihe ọmụma? Eleghị anya ha emeghị otú ahụ. Nye ndị na-etozughị okè, òkè ọ bụla ha keere weere ọnọdụ n’elu mpekere ala na-agbanwe agbanwe, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ebe okpuru ya bụ ịdị omimi kpụkọrọ akpụkọ. Mkpọrọgwụ nke eziokwu siri ike ma ọ bụ gbagwojuru anya apụghị ịbanye n’ógbè nghọta nke a nke ala mkpụkọ mmiri.—Tụlee Aịsaịa 40:24.
19. N’ụzọ dị aṅaa ka onye Kraịst nweworo ahụmahụ n’oge a pụrụ isi ghọọ onye dị ka ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst?
19 Ọ pụrụ ịbụ otu ihe ahụ taa n’ebe onye Kraịst nọ. Ọ bụ ezie na ọ nọ ná nzukọ, ọ pụrụ ịbụ na o jighị oge ndị ahụ mee ihe ito eto n’ihe ọmụma. Gịnị banyere ikeresi òkè ike na ha? Ka onye ọhụrụ ma ọ bụ onye na-eto eto wepụta onwe ya ịgụ otu akụkụ akwụkwọ nsọ ma ọ bụ zaa ajụjụ n’okwu ndị dị na paragraf pụrụ iwe mgbalị dị ukwuu, na-egosipụta iji ikike ya mee ihe n’ụzọ dị mma ma kwesị ịja mma. Ma Pọl gosiri na n’ebe ndị ọzọ nọ, n’ihi ogologo oge nile ha nọworo na-abụ ndị Kraịst, ha kwesịrị inwe ọganihu gafee ọnọdụ mbụ ahụ nke ikere òkè dị ka onye na-amalite ọhụrụ ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịnọgide na-eto eto n’ihe ọmụma.—Ndị Hibru 5:14.
20. Nnyocha onwe onye dị aṅaa ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ime?
20 Ọ bụrụ na onye Kraịst nweworo ahụmahụ enweghị ọganihu gafee ịgụ nanị otu amaokwu Bible ma ọ bụ ịza ajụjụ kpọmkwem site na paragraf, o yikarịrị ka ikere òkè ya ò sitere nanị ná “mpekere ala na-agbanwe agbanwe” nke uche ya. Ọtụtụ nzukọ pụrụ ịgabiga ma ịdị omimi nke ọgụgụ isi pụrụ ịnọgide n’ọnọdụ kpụkọrọ akpụkọ, iji laghachi n’ihe atụ anyị nke ala mmiri mkpụkọ. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ọnọdụ m ọ̀ dị otú ahụ? Ekwewo m ka ihe yiri mkpụkọ mmiri n’ọgụgụ isi bụrụ omume m? Ruo ókè hà aṅaa ka ọgụgụ isi m na-adị nkọ ma nwee mmasị n’ịmụ ihe?’ Ọbụna a sị na ahụ erughị anyị ala n’ihi azịza anyị sitere n’obi eziokwu, anyị pụrụ ịmalite ugbu a ime ihe iji too eto n’ihe ọmụma.
21. Nzọụkwụ ndị dị aṅaa a tụleworo ná mmalite ka ị pụrụ iji mee ihe n’ịkwadebe maka ma ọ bụ ịbịa nzukọ nile?
21 N’otu n’otu anyị pụrụ itinye aro ndị dị na paragraf nke 8 n’ọrụ. N’agbanyeghị ogologo oge anyị nọworo na-eso ọgbakọ na-akpakọrịta, anyị pụrụ ikpebi inwe ọganihu ruo ntozu okè nakwa ihe ọmụma ka ukwuu. N’ebe ndị ụfọdụ nọ, nke ahụ ga-apụta iji ịdị uchu ka ukwuu na-akwadebe maka nzukọ nile, eleghị anya na-atụteghachi àgwà nke a na-akpa n’afọ ndị gara aga ma bụrụ nke e jiworo nwayọọ nwayọọ hapụ. Ka ị na-akwadebe, gbalịa ikpebi ihe ndị bụ isi ihe na ịghọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-edoghị anya ndị e ji wulite usoro ntụgharị uche ahụ. Chọọ ma ị ga-ahụ ngalaba ma ọ bụ akụkụ ọhụrụ n’ihe ọmụmụ ahụ. N’otu aka ahụ, n’oge a na-enwe nzukọ, gbalịa itinye n’ime onwe gị aro ndị e hotara na paragraf nke 10 na 11. Gbaa mbọ ịdị nkọ n’ọgụgụ isi, dị ka à ga-asị na ị na-eme ka ọnọdụ uche gị na-ekpo ọkụ. Nke ahụ agaghị ekwe ka ihe ọ bụla yiri inwe “mkpụkọ” were ọnọdụ; mgbalị nke a e ji nghọta na-eme ga-enye aka ịgbaze ọnọdụ ọ bụla “kpụkọrọ akpụkọ” nke pụrụ ibiliteworị na mbụ.—Ilu 8:12, 32-34.
Ihe Ọmụma, Ihe Inyeaka n’Ịmịpụta Mkpụrụ
22. Olee ụzọ anyị pụrụ isi rite uru ma ọ bụrụ na anyị arụọ ọrụ n’ịmụba ihe ọmụma anyị?
22 Olee ụzọ anyị ga-esi rite uru n’otu n’otu ma ọ bụrụ na anyị arụọ ọrụ n’okwu a nke metụtara ito eto n’amara na ihe ọmụma nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jisọs Kraịst? Site n’anyị iji nghọta na-eme mgbalị ime ka ọgụgụ isi anyị dị nkọ, dị njikere ịnara ihe ọmụma, mkpụrụ nke eziokwu Bible ndị dị ọhụrụ ma dị mgbagwoju anya ga-agbamikwa mkpọrọgwụ, nghọta anyị ga-amụbakwa ma ghọọ nke na-adịgide adịgide. A ga-eji ya tụnyere ihe Jisọs kwuru n’otu ihe atụ dị iche banyere obi. (Luk 8:5-12) Mkpụrụ ndị na-ada n’ala mara mma pụrụ inwe mkpọrọgwụ ndị siri ike iji kwadoo ihe ọkụkụ ndị na-emepụta ihe ma na-amị mkpụrụ.—Matiu 13:8, 23.
23. Ihe ndị dị aṅaa pụrụ isi na ya pụta mgbe anyị ji obi anyị nakwere 2 Pita 3:18? (Ndị Kọlọsi 1:9-12)
23 Ihe atụ Jisọs dịtụ iche, ma ezi ihe ndị si na ya pụta yiri ihe Pita kwere na nkwa: “N’ihi otu ihe a n’akụkụ unu tụkwasịnụ ịnụ ọkụ n’obi nile, nyezuokwanụ ịdị mma n’okwukwe unu; nyezuokwa ihe ọmụma n’ịdị mma unu . . . N’ihi na a sị na unu nwere ihe ndị a, a sịkwa na unu nwere ha hie nne, ha na-edo unu ndị na-abụghị ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ ruo ịmazu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (2 Pita 1:5-8) Ee, anyị ito eto n’ihe ọmụma ga-enyere anyị aka ịmịpụta mkpụrụ. Anyị ga-achọpụta na ịnara ọbụna ihe ọmụma ka ukwuu ga-abụ ihe obi ụtọ ruo mgbe nile. (Ilu 2:2-5) Ihe ị na-amụta ga-abụ ihe ndị ị ga-echeta ngwa ngwa, bụrụkwa ihe bara uru ka ị na-akụziri ndị ọzọ ihe ịghọ ndị na-eso ụzọ. Ya mere n’ụzọ dị otú a, ị ga na-amị mkpụrụ karị ma na-ewetara Chineke na Ọkpara ya otuto. Pita mechiri akwụkwọ ozi ya nke abụọ, sị: “Na-abanụ ụba n’amara na ọmụma nke Onyenwe anyị, bụ́ Onye Nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto dịịrị ma ugbu a ma ruo ụbọchị nke mgbe ebighị ebi.”—2 Pita 3:18.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a “[Ọ] dị ka iji ya tụnyere ihe mmadụ, bụ́ onye nwere mmasị n’ịmụtakwu banyere ọnwa, na-enweta mgbe ọ rịgoro n’elu ụlọ ya iji hụ ihe ahụ na-enye ìhè nke ọma.”
b A tụlere okwukwe na ịdị mma, bụ́ àgwà abụọ mbụ ndị dị n’ihe odide a, ná mbipụta anyị nke July 15, 1993.
c Aro ndị a pụkwara inyere ndị Kraịst nọworo ogologo oge aka iritekwu uru site n’ọmụmụ ihe onwe ha na ịkwadebe maka nzukọ.
Ị̀ Pụrụ Icheta?
◻ N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji nwee mmasị n’ịmụba ihe ọmụma gị?
◻ Olee ụzọ onye ọhụrụ a na-eduziri ọmụmụ Bible pụrụ isi ritekwuo uru n’ọmụmụ ihe ya?
◻ Ihe ize ndụ dị aṅaa ka ị chọrọ izere, dị ka e ji ala mkpụkọ mmiri mee ihe atụ ya?
◻ N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji kpebie imeziwanye ikike gị ịmụba ihe ọmụma gị?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ènwere m nsogbu nke ala mkpụkọ mmiri nke ọgụgụ isi?