Inwe Ihe Ịga Nke Ọma N’ịlụ Ọgụ Megide Aṅụrụma
“N’oge a nọ n’ọrụ, ihe dị ka elekere iri n’ụtụtụ, m ga-amalite iche echiche banyere mmanya. Ka ọ na-erule elekere 12 nke ehihie, m ga-apụ ije ṅụọ otu karama mmanya ma ọ bụ abụọ. Ka ọ na-erule elekere nke atọ, ahụ ga na-ama m jijiji. Ọ na-agụ m agụụ ka a gbasaa ka m wee ṅụọ mmanya ọzọ. Ọtụtụ mgbe m ga-aṅụ karama ole na ole n’ụzọ ụla. Ihe dị ka elekere asaa m ga-enwe nrụgide ahụ ọzọ. M ga-aṅụ mmanya, dapụ n’elu oche n’amaghị onwe m, nyụọ mamiri na trauza m, ma dinara na mamiri m ruo ụtụtụ. Chịkọta nke a wee mụbaa ya ụbọchị 7 kwa izu; jiri 52 izu mụbaa ihe o nyere; jiri 29 afọ mụbaa nke ahụ.”
NWOKE a bụ onye aṅụrụma. Ọ bụghị nanị ya. Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa na-alụ ọgụ megide ọnọdụ nke a na-akpata ọnwụ nke, dị ka Dr. Vernon E. Johnson si kwuo, “na-emetụta onye ahụ dum: n’ụzọ anụ ahụ, uche, akparamagwa, na ime mmụọ.”a
Ọtụtụ ndị ọkachamara na-asị na a pụghị ịgwọta aṅụrụma kama a pụrụ ịchịkwa ya site n’ihe omume nke isepụ aka na ya n’oge nile a dị ndụ. Nke a abụghị ịchọ ihe ezi uche na-adịghị ya n’aka mmadụ, n’ihi na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya adịghị mkpa maka ịdị ndụ. N’ezie, iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-akpata enweghị nnwapụta Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ọ ka mma ịbanye n’ụwa ọhụrụ Chineke dị ka onye a napụrụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya karịa ịṅụ otú o si gụọ gị ma ghara inweta ndụ ebighị ebi.—Matiu 5:29, 30.
Inwere onwe onye pụọ—na etinyekwaghị aka ọzọ—n’iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-abụkarị ihe ịma aka na-egbu mmụọ. (Tụlee Ndị Rom 7:21-24.) Gịnị pụrụ inye aka? Ka anyị nye ndụmọdụ ụfọdụ pụtara ìhè. Ọbụna ma ọ bụrụ na ị dịghị aṅụ mmanya ma ọlị, ndụmọdụ nke a ga-akụziri gị ihe, ọ pụkwara ime ka i nwee ike inyere enyi ma ọ bụ onye ikwu gị aka bụ́ onye na-alụ ọgụ megide aṅụrụma.
Iji Eziokwu Leruo Onwe Gị Anya
Otu n’ime ihe mgbochi kasị ukwuu imeri bụ ịgọpụ eziokwu ahụ bụ na ị bụ onye aṅụrụma. Ngọpụ bụ ụdị nke emeghị ihe n’eziokwu. Ọ bụ arụmụka nke nwere nzube: ichebe nnwere onwe gị ịṅụ mmanya. ‘Nsogbu m adịghị oké njọ otú ahụ,’ ka ị pụrụ ịtụgharị uche. ‘Mụ na ezinụlọ m ka bi. M ka na-arụ ọrụ m.’ Nke kasị mkpa, ị ka nwere mmanya gị.
Ngọpụ pụrụ ime ka ị ghara ige ndị enyi gị ntị bụ́ ndị chọrọ inyere gị aka. Robert chọpụtara na nna kuchiri nne nwunye ya mụtara omume na-adịghị mma nke ịṅụ mmanya na àgwà mkparị. “Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, agakwuuru m ya,” ka Robert kwuru, “na-ajụ ya ma ò chere na ịṅụ mmanya ya so na-akpata ụzọ o si akpa àgwà.” Gịnị si na ya pụta? “Ọ nọ n’ihu m gọọ ụkwụ na aka, na-ekwu ihe ndị dị ka, ‘I nweghị ihe àmà ọ bụla’ nakwa, ‘Ị maghị ihe bụ mmetụta m.’”
Ọ bụrụ na otu onye ezinụlọ gị ma ọ bụ enyi gị abịakwute gị bụ́ onye na-enwe nchegbu banyere ịṅụ mmanya gị, jiri obi eziokwu chebara onwe gị echiche. (Ilu 8:33) Ị̀ pụrụ ịdị ndụ n’aṅụghị mmanya ruo otu izu, ruo otu ọnwa, ma ọ bụ ruo ọtụtụ ọnwa? Ma ị́ pụghị, ọ bụ n’ihi gịnị? Adịla ka nwoke nke na-aghọgbu onwe ya site n’iche echiche efu. Jemes na-asị: “Onye ahụ yiri nwoke nke na-ekiri ihu ya n’enyo, bụ́ ihu o nwere mgbe a mụpụtara ya: n’ihi na o kiriri onwe ya, ọ pụwokwa, ngwa ngwa o wee chezọọ aha mmadụ ọ bụ.”—Jemes 1:22-25.
Ọbụna mgbe a malitere ịgbake, ị ka ga-akpachara anya ime ngọpụ. Akwụkwọ bụ́ Willpower’s Not Enough na-akọwa, sị: “Onye malitere ọhụrụ ịkwụsị ya pụrụ ikwere n’ụzọ hiere ụzọ na n’ihi na o nwewo ike ịkwụsị iji ya na-eme ihe ruo oge ụfọdụ—eleghị anya nke mbụ ya—na ahụ adịwo ya mma ugbu a.” Nke a bụ echiche ihe iri ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ sikarịsiri ike, ọ bụkwa ihe mbụ na-eduje ná ndaghachi azụ. Ọ bụrụ na ị gaje iguzogide ngọpụ dị otú ahụ, ị gaghị eguzoro nanị gị.
Nweta Enyemaka
N’ịchọpụta na ya apụghị imeri àgwà aṅụrụma nanị ya, otu nwoke anyị pụrụ ịkpọ Leo chọrọ enyemaka ndị maara anya ya. Mgbe e nyesịrị ya usoro ịgwọ ọrịa siri ike, ọ malitere ịgbake. Leo na-eche na abamuru nke enyemaka ndị ọkachamara abụghị obere ihe.b Ọ bụrụ na enyemaka dị otú ahụ dị n’ógbè unu, ọ pụrụ ịdị mma ka i kpebie ịnara ya.
Otú ọ dị, ị ghaghị ịghọta na mgbake gụnyere ọtụtụ ihe nke karịrị nanị isepụ aka na ya. N’okpuru àgwà aṅụrụma ahụ e nwere nsogbu ndị yiri ka hà dị omimi karị ndị ị na-aghaghị iche ihu. Ileghara ndị a anya pụrụ ịdị ize ndụ. Dr. Charlotte Davis Kasl dere, sị: “Agbawo m ndị mmadụ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị gabigara usoro ịgwọ ọrịa maka iji ihe na-eri ahụ eme ihe ihe ruru ugbo iri na anọ n’ihi na e lebaghị anya n’isi nsogbu nke mmetọ ahụ, bụ́ ndabere, na nleghara anya.”
Dennis chọpụtara na nke a bụ eziokwu. “Abụ m onye aṅụrụma anya doro nke ka nwere ọtụtụ nsogbu,” ka o dere. “Ọ bụghị ihe zuru ezu ịkwụsị ịṅụ mmanya. Ọ dị mkpa ka m tụlee ihe mere m n’oge gara aga, tụlee ihe ndị m mụtara n’oge m dị na nwata, ghọta ụzọ ha si na-emetụta m, ma mee mgbanwe ụfọdụ n’àgwà m.”
N’otu aka ahụ, ọ dị mkpa ka Leo tụlee onwe ya n’ụzọ miri ezi iji nwee ọganihu ná mgbake ya. “Abụ m onye na-ekwo ekworo, nke na-eme ihe ike nke ukwuu,” ka o kwuru. “Obi m wagharịrị n’agbata ùgwù onwe onye dị ala na echiche ụgha nke ịdị oké mkpa.” Leo tinyere ndụmọdụ Bible nke dị ná Ndị Efesọs 4:22 n’ọrụ: ‘Ka unu tụpụ mmadụ ochie unu nke dị ka ibi obi unu na mbụ si dị.’ Ee, “ibi obi unu na mbụ” enwewo mmetụta dị ike n’ọdịdị mmadụ gị. Dị ka plasta na-ekwekọ n’ihe ọ nyakọdoro, otú a ọdịdị mmadụ gị abụwo nke a kpụziri n’akụkụ ụfọdụ site n’ibi obi gị nke oge gara aga. Mgbe e wepụrụ omume ọjọọ, gịnị fọdụrụ? Ọ bụ ọdịdị mmadụ nke a kpụziworo ma eleghị anya n’ime ọtụtụ afọ. Ya mere, mgbake aghaghị ịgụnye ịgbanwe ọdịdị mmadụ ochie nke na-ekwekọ n’ibi obi gị na mbụ.
Guzobe Mmekọrịta n’Ebe Chineke Nọ
Mgbake nke Leo metụtakwara ịzụlite mmekọrịta onwe onye n’ebe Chineke nọ. “Ịmụta ịdabere n’ebe Jehova nọ gbanwere àgwà, omume, na ụzọ m si ele ihe anya kpam kpam,” ka o kwuru.
Otú ọ dị, ịkpachara anya kwesịrị ekwesị. Mmekọrịta ọ bụla—n’ebe mmadụ ma ọ bụ Chineke nọ—chọrọ imepe obi, ikwu eziokwu, na ntụkwasị obi. Ndị a bụ àgwà aṅụrụma na-emebi. A pụrụ ịzụlite ha, ma ọ na-ewe oge.
Dị ka onye aṅụrụma, ọ pụrụ ịbụ na ị maghị ihe mmekọrịta chiri anya dị ka ya. Eleghị anya i nwebeghị ahụmahụ otú ọ na-adị. Ya mere nwee ndidi. Achụla nzọụkwụ nke a n’ike, na-atụ anya ka mmekọrịta n’ebe Chineke nọ pụta ìhè ozugbo dị ka ihe nkwụsị ahụ kpatara. Rụsie ọrụ ike ịghọta Chineke na àgwà ya nile. Na-atụgharị uche mgbe nile, eleghị anya na-eji nlezianya agụ abụ ọma ndị dị na Bible ndị na-akọwa mmetụta ekele miri emi maka Jehova na ụzọ ya nile.c
“Ọkịka nke Ike”
Inwe mmekọrịta nke ntụkwasị obi na obi ike n’ebe Chineke nọ pụrụ inwe mmetụta dị ike n’ahụ gị. Jehova ga-akwado mgbalị gị nile ịgbake. (Tụlee Abụ Ọma 51:10-12; 145:14.) Ị pụrụ ịgakwuru ya n’ekpere sitere n’obi n’oge ọ bụla, na-enwe obi ike na ọ ga-enye gị “ọkịka nke ike.”—1 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Filipaị 4:6, 7.
Onye Okike maara ọdịdị gị karịa mmadụ ọ bụla. (Abụ Ọma 103:14) Ndị ndụmọdụ bụ mmadụ, bụ́ ndị dabeere n’amamihe mmadụ, pụrụ inye aka; ma lee ka Onye Okike nke mmadụ pụrụ isi nyere gị aka n’ọgụ nke a karị! (Aịsaịa 41:10; 48:17, 18) O nyewo nkwado ịhụnanya n’ime ọgbakọ ndị Kraịst.
Usoro Nkwado
Ndị okenye ime mmụọ tozuru etozu n’ime ọgbakọ ndị Kraịst pụrụ ịbụ oké isi iyi nke enyemaka. Ole na ole n’ime ha ga-asị na ha nwere nkà n’okwu metụtara ọgwụ na ahụ ike ma ọ bụ ahụ ike nke uche, ma ha maara ma na-atụkwasị obi n’Okwu na ụkpụrụ nile nke Chineke. Ha pụrụ ịghọ “ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” (Aịsaịa 32:2) Nara enyemaka nile nke ha na-enye.d
Otú ọ dị, ndị okenye ndị Kraịst dị otú ahụ, ha na ndị ọzọ so n’ezinụlọ gị na ndị enyi gị, agaghị ekpuchi gị pụọ n’ihe ndị omume gị ga-arụpụta. Akwụkwọ ahụ bụ́ Coming Off Drink na-akọwa, sị: “Ihe dị mkpa e ji agwọ ọrịa ahụ bụ ịkọwara ndị aṅụrụma banyere ajọ ihe ndị ga-esi n’ịdabere na ya pụta na inyere ha aka ịnakwere ibu ọrụ maka ihe ndị si n’omume ha pụta.” Ya mere ha ga-enwe obi ọma ma gwa gị eziokwu, na-agba gị ume ịnakwere ọnọdụ ahụ na ịrapara n’usoro ịgwọ ọrịa na ibi obi ọ bụla dị mkpa iji merie n’agha ahụ megide mmanya.
Mgbake Bụ Ibu Ọrụ Gị
Ka ị na-erite uru site ná nkwado nke ndị ọzọ, ọ dị mkpa ka ị mara na ọ dịghị mmadụ ma ọ bụ mmụọ ọ bụla pụrụ ịmanye gị ịgbake. Ị bụ onye nweere onwe ya ime nhọrọ. Mee elu mee ala mgbake gị bụ ibu ọrụ gị. (Tụlee Jenesis 4:7; Deuterọnọmi 30:19, 20; Ndị Filipaị 2:12.) Nakwere ibu ọrụ ahụ, Jehova ga-agọzikwa gị. A na-emesi anyị obi ike ná 1 Ndị Kọrint 10:13, sị: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide: ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karị nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” Ya mere, nwee nkasi obi—ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịlụ ọgụ megide aṅụrụma.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ ezie na anyị ga-ezo aka n’ebe onye aṅụrụma nọ dị ka ikom, ụkpụrụ ndị a tụlere n’ebe a na-emetụtakwa inyom aṅụrụma n’otu aka ahụ.
b E nwere ọtụtụ ogige ịgwọ ọrịa, ụlọ ọgwụ, na ihe omume mgbake ndị ọzọ ndị pụrụ inye aka. Ụlọ Nche adịghị atụ aro usoro ịgwọ ọrịa ọ bụla kpọmkwem. A ghaghị iji nlezianya mee ihe ka mmadụ ghara itinye aka n’ihe omume ndị ga-emebi ụkpụrụ nile nke Akwụkwọ Nsọ. Otú ọ dị, n’agbanye ihe e kwuru, onye ọ bụla ga-ekpebiri onwe ya ụdị usoro ịgwọ ọrịa dị mkpa.
c Ihe atụ ụfọdụ bụ Abụ Ọma nke 8, 9, 18, 19, 24, 51, 55, 63, 66, 73, 77, 84, 86, 90, 103, 130, 135, 139, 145.
d A na-achọta ntụziaka ndị na-enye aka maka ndị okenye n’Ụlọ Nche, November 1, 1983, peji nke 8-11.
[Igbe dị na peeji nke 24]
Eleghị anya ị na-ata ahụhụ mweda n’ala na nhụjuanya nke aṅụrụma na-akpata. Ya bụrụ otú ahụ, enwela ndakpọ olileanya. Enyemaka dị.
[Igbe dị na peeji nke 26]
Ọ BỤRỤ NA Ị DAGHACHI AZỤ
“Ịdị njikere maka ndaghachi azụ dị ka ịmụ ihe a ga-eme ma ọkụ malite ịgba,” ka akwụkwọ bụ́ Willpower’s Not Enough kwuru. “Ọ pụtaghị na ị ga-atụ anya ọkụ ọgbụgba kama na ị dị nkwadebe ime ihe ziri ezi ma e nwee ka o si were ọnọdụ.” Ọ bụrụ na ị daghachi azụ:
□ Kpegara Jehova ekpere. Nwee obi ike na ọ ghọtara nsogbu gị ma chọọ inye aka.—Abụ Ọma 103:14; Aịsaịa 41:10.
□ Kọọrọ otu onye okenye ndị Kraịst ihe dị gị n’obi, ebe i buworo ụzọ kpebie onye ị ga-ejekwuru ma e nwee mkpa. Kwuo eziokwu banyere ihe merenụ, ṅaakwa ntị nke ọma na ndụmọdụ ya nke Akwụkwọ Nsọ.
□ Nọrọ na nche megide ndakpọ olileanya. Nanị ihe ịkpọ onwe gị asị na-eme bụ iweta gị nso ná ndaghachi azụ zuru ezu karị, ya mere na-ele ndahie gị anya n’ụzọ ziri ezi. Ịbụ onye e meriri n’otu ọgụ apụtaghị na e meriwo gị n’agha ahụ. Mgbe onye na-agba ọsọ dị ogologo dara, ọ naghị alaghachi azụ n’ebe o si malite; ọ na-ebili ma nọgide n’ọsọ ahụ. Na-eme otú ahụ n’ihe banyere mgbake gị. Ị ka nọ n’ụzọ ahụ. Izu, ọnwa, ma ọ bụ afọ ndị ahụ ị kwụsịrị ịṅụ mmanya agafebeghị.
[Foto dị na peeji nke 25]
Guzogide ngọpụ site n’iji obi eziokwu chesiere onwe gị echiche ike