Ezinụlọ Ndị Kraịst Na-enyere Ndị Agadi Aka
“Etufula m na mgbe agadi; mgbe ike m gwụsịrị a hapụla m.”—ABỤ ỌMA 71:9.
1. Olee otú e si emeso ndị agadi n’ọtụtụ ọdịbendị?
“NNYOCHA ndị e mere na-egosi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na isii n’ime asaa (86%) nke ndị agadi e metọrọ bụ ndị ndị ezinụlọ ha megburu,” ka akwụkwọ The Wall Street Journal kwuru. Magazin bụ́ Modern Maturity kwuru, sị: “Imeso ndị agadi ihe n’ụzọ na-adịghị mma bụ nanị [ime ihe ike ezinụlọ] ọhụrụ pụtara ìhè karịsịa na peji dị iche iche nke akwụkwọ akụkọ ndị e nwere ná mba a.” Ee, ndị agadi n’ọtụtụ ọdịbendị abụwo ndị e mejọrọ ma leghara anya n’ụzọ dị oké njọ. Oge anyị bụ n’ezie mgbe ọtụtụ bụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, . . . ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ.”—2 Timoti 3:1-3.
2. Dị ka Akwụkwọ Nsọ Hibru na-ekwu, olee otú Jehova si ele ndị agadi anya?
2 Ma, ọ bụghị otú ahụ ka a ga-emeso ndị agadi n’Israel oge ochie. Iwu ahụ sịrị: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye, tụọkwa egwu Chineke gị: Mụ onwe m bụ Jehova.” Akwụkwọ nke ilu amamihe ndị sitere n’ike mmụọ nsọ na-adụ ọdụ, sị: “Gee nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi.” Ọ na-enye iwu, sị: “Nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” Iwu Mosis kụziri nkwanye ùgwù na ichebara ndị meworo okenye bụ́ ma ndị inyom ma ndị ikom, echiche. N’ụzọ doro anya, Jehova chọrọ ka a na-asọpụrụ ndị agadi.—Levitikọs 19:32; Ilu 1:8; 23:22.
Ilekọta Ndị Agadi n’Oge Bible
3. Olee otu Josef si gosi ọmịiko maka nna ya kara nká?
3 A ga-akwanye ùgwù ọ bụghị nanị n’okwu kamakwa n’omume ọmịiko. Josef gosiri ọmịiko dị ukwuu maka nna ya meworo agadi. Ọ chọrọ ka Jekọb mee njem site Kenean gaa Ijipt, ogologo ụzọ karịrị 300 kilomita. Ya mere Josef zijeere Jekọb “ịnyịnya ibu iri na-ebu ụfọdụ n’ezi ihe nke Ijipt, na nne ịnyịnya ibu iri na-ebu ọka na achịcha na nri nna ya ga-eri n’ụzọ.” Mgbe Jekọb rutere Goshen, Josef gakwuuru ya wee “dakwasị ya n’olu, kwaa ákwá n’olu ya mgbe dị anya.” Josef wụkwasịrị nna ya ịhụnanya miri emi. Lee ihe atụ na-akpali akpali nke nchegbu maka ndị agadi nke ahụ bụ!—Jenesis 45:23; 46:5, 29.
4. N’ihi gịnị ka Rut ji bụrụ ezi ihe nlereanya a ga-agbaso?
4 Ihe atụ ọzọ mara ama ịgbaso n’igosi obi ọma maka ndị agadi bụ Rut. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye Jentaịl, ọ rapagidere n’ahụ nne di ya nke meworo agadi bụ onye Juu di ya nwụrụ, Naomi. Ọ gbahapụrụ ndị nke ya ma nakwere ihe ize ndụ nke enwetaghị di ọzọ. Mgbe Naomi gbara ya ume ka ọ laghachikwuru ndị nke ya, Rut ji okwu ụfọdụ makarịsịrị mma na Bible zaghachi: “Arịọla m ịhapụ gị, isi n’iso gị laghachi: n’ihi na ebe ị na-eje ka m ga-eje; ọ bụkwa ebe ị na-anọ ọnọdụ abalị ka m ga-anọ ọnọdụ abalị: ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m: ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli m: Jehova mee m otú a, meekwa m ihe ọzọ otú a, mgbe ihe na-abụghị ọnwụ onwe ya ga-ekewa mụ na gị.” (Rut 1:16, 17) Rut gosikwara àgwà ndị mara mma mgbe ọ dị njikere ịlụ Boaz meworo agadi n’okpuru ndokwa alụmdi na nwunye nkuchi onye ikwu.—Rut, isi nke 2 ruo 4.
5. Àgwà ndị dị aṅaa ka Jisọs gosiri n’imeso ndị mmadụ?
5 Jisọs setịpụrụ ihe atụ yiri nke ahụ n’ụzọ o si mesoo ndị mmadụ. O nwere ndidi, ọmịiko, obi ọma, ma na-enye ume ọhụrụ. O nwere mmasị onwe onye n’otu ogbenye nke nwere ọrụsị, n’enweghị ike ịga ije, ruo 38 afọ ma gwọọ ya. O chebaara ndị inyom di ha nwụrụ echiche. (Luk 7:11-15; Jọn 5:1-9) Ọbụna n’oge ọ nọ ahụ ụfụ nke ọnwụ ihe mgbu ya n’elu osisi ịta ahụhụ, ọ hụrụ na a ga-elekọta nne ya, nke nọ ná mmalite afọ ndụ ndị 50 ya ma eleghị anya. E wezụga nye ndị iro ya dị ihu abụọ, Jisọs bụ onye na-enye onye ọ bụla ume ọhụrụ. N’ihi ya, ọ pụrụ ikwu, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu.”—Matiu 9:36; 11:28, 29; Jọn 19:25-27.
Ònye Kwesịrị Ka E Chebara Echiche?
6. (a) Olee ndị ka nlekọta pụrụ iche ruuru? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?
6 Ebe Jehova Chineke na Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, setịpụrụ ezigbote ihe nlereanya n’ihe banyere nlekọta, ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị ka ndị Kraịst raara onwe ha nye ṅomie ihe atụ ha. N’etiti anyị, anyị nwere ụfọdụ ndị dọgbuworo onwe ha n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ ruo ọtụtụ afọ—ụmụnna ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị agadi afọ ndụ ha na-agwụsị. Ụfọdụ pụrụ ịbụ nne na nna anyị ma ọ bụ nne na nna anyị ochie. Ànyị na-ewere ha ná ndị na-adịghị mkpa? Ànyị na-eme ha ka ụmụaka? Ka ànyị ji ahụmahụ na amamihe ha buru ibu kpọrọ ihe n’ezie? N’eziokwu, ụfọdụ pụrụ itinye ndidi anyị n’ule site n’àgwà ha na mmegheri ha, bụ́ ndị a na-ahụkarị ná nká. Ma jụọ onwe gị sị, ‘Ruo ókè hà aṅaa ka m ga-adị iche n’okpuru ọnọdụ ndị ahụ?’
7. Gịnị na-enye ihe atụ nke mkpa ọ dị inwe ọmịiko maka ndị meworo okenye?
7 E nwere akụkọ na-emetụ n’obi sitere n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa banyere ọmịiko otu nwa agbọghọ maka ndị agadi. Nne ochie na-enye aka na kichin wee tụhapụ otu efere nkụwa n’amaghị ama ma kụwaa ya. Aka ịma jijiji ya mere ka obi ghara izu ya ike; nwa ya nwanyị nwere ahụ mgbakasị karị. Mgbe ahụ ọ kpọrọ nwa nwanyị nke ya ma ziga ya n’ụlọ ahịa dị n’ógbè ahụ ịzụta efere osisi na-adịghị akụwa akụwa maka nne ya ochie. Nwata nwanyị ahụ ji efere osisi abụọ lọta. Nne ya jụrụ sị: “Gịnị mere i ji zụta efere abụọ?” Nwa nwa ahụ gbatụrụ nkịtị, zaa, sị: “Otu maka mama nnukwu, nke ọzọkwa maka gị mgbe i mere agadi.” Ee, n’ụwa a anyị nile na-atụ anya ime agadi. Ọ̀ bụ na ọ gaghị amasị anyị ka e mesoo anyị ihe ná ndidi na obi ọma?—Abụ Ọma 71:9.
8, 9. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi mesoo ndị meworo okenye n’etiti anyị? (b) Gịnị dị ụfọdụ ndị ka ghọrọ ndị Kraịst ọhụrụ mkpa icheta?
8 Ya adịla mgbe i chezọrọ na ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom ndị meworo agadi nwere ihe ndekọ dị ogologo nke ọrụ ikwesị ntụkwasị obi nke ndị Kraịst. Ha ruru nnọọ eru inweta nsọpụrụ na nchebara echiche anyị, enyemaka obi ọma na agbamume anyị. Onye amamihe ahụ kwuru n’izi ezi, sị: “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.” Isi awọ ahụ kwa, nke nwoke ma ọ bụ nke nwanyị, kwesịrị ka a kwanyere ya ùgwù. Ụfọdụ n’ime ndị ikom na ndị inyom a meworo okenye ka na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ na-ekwesị ntụkwasị obi, ọtụtụ ndị ikom nọgidere na-eje ozi n’ikwesị ntụkwasị obi dị ka ndị okenye ọgbakọ; ụfọdụ na-arụ ọrụ na-esetịpụ ihe nlereanya dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị.—Ilu 16:31.
9 Pọl dụrụ Timoti ọdụ, sị: “Abarala okenye oké mba, kama na-arịọ ya arịrịọ dị ka nna; na-emesokwa ụmụ okorobịa dị ka ụmụnne: ndị inyom, ndị bụ okenye, dị ka ndị bụ nne; ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne nwanyị, n’ịdị ọcha nile.” (1 Timoti 5:1, 2) Ndị bataworo ọhụrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst site n’ụwa nke na-adịghị akwanye ùgwù kwesịrị karịsịa iburu okwu Pọl n’obi, bụ́ ndị dabeere n’ịhụnanya. Ndị na-eto eto, eṅomila àgwà ọjọọ ndị unu pụrụ ịhụ n’ụlọ akwụkwọ. Ajụla ndụmọdụ obi ọma nke Ndịàmà meworo okenye. (1 Ndị Kọrint 13:4-8; Ndị Hibru 12:5, 6, 11) Otú ọ dị, mgbe onye agadi chọrọ enyemaka n’ihi ahụ esichaghị ike ma ọ bụ nsogbu ego, ònye ka ọ bụ ibu ọrụ ya n’ụzọ bụ isi inyere ha aka?
Òkè Ezinụlọ Na-ekere n’Ilekọta Ndị Agadi
10, 11. (a) Dị ka Bible na-ekwu, ònye kwesịrị ibute ụzọ n’ilekọta ndị agadi? (b) N’ihi gịnị ka o ji ghara ịdị na-adị mfe mgbe nile ilekọta ndị agadi?
10 N’ọgbakọ ndị Kraịst oge ochie, nsogbu bilitere banyere ilekọta ụmụ nwanyị di ha nwụrụ. Olee otú Pọl onyeozi si gosi na e kwesịrị ilekọta mkpa ndị dị otú ahụ? “Na-asọpụrụ ndị inyom di ha nwụrụ, bụ́ ndị nọ n’ezie n’ọnọdụ ndị inyom di ha nwụrụ. Ma ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ka ha buru ụzọ mụta ịsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị ezinụlọ nke aka ha, na inyeghachi ndị mụrụ ha ihe: n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.”—1 Timoti 5:3, 4, 8.
11 N’oge mkpa, ndị òtù ezinụlọ nọ nso kwesịrị ịbụ ndị mbụ n’inyere ndị agadi aka.a N’ụzọ dị otú a, ụmụ ndị toworo eto pụrụ igosi ekele maka afọ nile nke ịhụnanya, ọrụ, nlekọta nke ndị mụrụ ha nyeworo ha. Nke a nwere ike ghara ịdị mfe. Ka ndị mmadụ na-emewanye okenye, ịdị gara gara ha na-ebelatakarị, ọbụna na ụfọdụ adịkwaghị enwe ike ime ihe ọ bụla. Ndị ọzọ pụrụ ịmalite ichebara nanị onwe ha uche ma na-achọ inweta ihe nile, ma eleghị anya n’amataghị ya. Ma mgbe anyị bụ ụmụ ọhụrụ, ọ̀ bụkwa na anyị adịghị echebara nanị onwe anyị echiche ma na-achọ inweta ihe nile? Ọ̀ bụkwa na ndị mụrụ anyị adịghị agbata inyere anyị aka? Ugbu a ihe agbanwewo n’oge nká ha. Ya mere, gịnị ka a chọrọ? Ọmịiko na ndidi.—Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8.
12. Àgwà ndị dị aṅaa ka a chọrọ n’ilekọta ndị meworo okenye—na ndị ọzọ nile nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst?
12 Pọl onyeozi nyere ndụmọdụ dị irè mgbe o dere, sị: “Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ ndị a hụwokwara n’anya, yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi; na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a: ma n’elu ihe ndị a nile yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè.” Ọ bụrụ na anyị kwesịrị igosipụta ụdị ọmịiko na ịhụnanya nke a n’ọgbakọ, ọ bụ na anyị ekwesịghị igosipụta ya ọbụna karị n’ime ezinụlọ?—Ndị Kọlọsi 3:12-14.
13. Olee ndị, e wezụga nne na nna ma ọ bụ nne na nna ochie meworo agadi, pụrụ ịchọ enyemaka?
13 Mgbe ụfọdụ ụdị enyemaka a pụrụ ịbụ ihe dị mkpa ọ bụghị nanị maka ndị nne na nna ma ọ bụ ndị nne na nna ochie kamakwa maka ndị ikwu ndị ọzọ meworo agadi. Ụfọdụ ndị meworo okenye bụ́ ndị na-enweghị ụmụ ejewo ozi ruo ọtụtụ afọ n’ozi ala ọzọ, ozi ngagharị, na ọrụ oge nile ndị ọzọ. Ha etinyewo n’ezie Alaeze ahụ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha nile. (Matiu 6:33) Mgbe ahụ, ọ̀ gaghị ekwesị ekwesị igosi ha mmụọ nke nlekọta? N’ezie anyị nwere ezi ihe nlereanya n’ụzọ Watch Tower Society si elekọta ndị òtù ezinụlọ Betel ya ndị meworo agadi. N’isi ụlọ ọrụ Betel na n’ọtụtụ n’ime alaka ụlọ ọrụ nile nke Society, ọtụtụ ụmụnna ndị ikom na ndị inyom na-enweta nlekọta kwa ụbọchị n’aka ndị òtù ezinụlọ a zụrụ azụ bụ́ ndị e kenyere ọrụ a. Ha nwere obi ụtọ ilekọta ndị a meworo okenye dị ka ha bụ nne na nna ma ọ bụ nne na nna ochie nke ha. N’otu mgbe ahụ, ha na-amụta ihe dị ukwuu site n’ahụmahụ nke ndị ahụ meworo okenye.—Ilu 22:17.
Òkè Ọgbakọ Na-ekere n’Inye Nlekọta
14. Olee ndokwa ndị e meere ndị agadi n’ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ?
14 Ọtụtụ mba taa nwere usoro ihe omume nke ịkwụ ndị agadi ụgwọ ọnwa nakwa nlekọta ahụ ike maka ndị agadi nke Gọọmenti na-enye. Ndị Kraịst pụrụ iji ndokwa ndị a mee ihe n’ụzọ zuru ezu n’ebe o ruuru ha ime otú ahụ. Otú ọ dị, na narị afọ mbụ, e nweghị ndokwa ndị dị otú ahụ. Ya mere ọgbakọ ndị Kraịst mere ihe doro anya inyere ndị di ha nwụrụ bụ́ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha aka. Pọl nyere ntụzi, sị: “Ka a ghara ide aha nwanyị ọ bụla n’akwụkwọ dị ka nwanyị di ya nwụrụ [maka enyemaka ọgbakọ] nke a ka agbaghị [iri afọ isii], onye bụworo nwunye nke otu di, onye a na-agbara ya ezi àmà n’ọrụ ọma; ọ bụrụ na ọ zụpụtawo ụmụ, ọ bụrụ na o lewo ndị ọbịa anya nke ọma, ọ bụrụ na ọ sawo ụkwụ ndị nsọ, ọ bụrụ na o gbowo mkpa ndị a na-akpagbu, ọ bụrụ na o sosiwo ezi ọrụ nile ọ bụla ike.” Otú a, Pọl gosiri na ọgbakọ nwekwara òkè ha ga-ekere n’inyere ndị agadi aka. Ndị inyom uche ha dị n’ihe ime mmụọ bụ́ ndị na-enweghị ụmụ kwere ekwe ruru eru maka enyemaka dị otú ahụ.—1 Timoti 5:9, 10.
15. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji chọọ enyemaka iji nweta enyemaka Gọọmenti?
15 N’ebe e nwere ndokwa Gọọmenti mere maka ndị agadi, ndị a na-agụnyekarị idejupụta akwụkwọ nke pụrụ iyi ihe na-akụda obi. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, o kwesịrị ekwesị ka ndị nlekọta n’ọgbakọ mee ndokwa ka e nyere ha aka, ka ndị agadi nwee ike itinye akwụkwọ maka, nata, ma ọ bụ ọbụna welite ọkwá enyemaka dị otú ahụ. Mgbe ụfọdụ mgbanwe n’ọnọdụ pụrụ ịkpata ụgwọ ọrụ ezumike nká ka elu. Ma e nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ bara uru ndị nlekọta pụrụ ịhazi ka e wee lekọta ndị agadi. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ndị a?
16, 17. N’ụzọ dịgasị iche iche dị aṅaa ka anyị pụrụ isi lee ndị agadi nọ n’ọgbakọ ọbịa nke ọma?
16 Ile ọbịa anya nke ọma bụ omenala nke malitere laa azụ n’oge Bible. Ruo taa n’ọtụtụ mba nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, a na-ele ndị ọbịa anya nke ọma, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè inye ha iko tii ma ọ bụ kọfị. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na Pọl dere, sị: “N’akụkụ ihe na-akpa ndị nsọ, na-enwekọnụ ihe; na-agbasonụ ọrụ ile ndị ọbịa anya nke ọma.” (Ndị Rom 12:13) Okwu Grik e nwere maka ile ọbịa nke ọma, phi·lo·xe·niʹa, pụtara n’ụzọ nkịtị “ịhụnanya (inwe mmasị, ma ọ bụ obi ọma) maka ndị ọbịa.” Ọ bụrụ na onye Kraịst kwesịrị ile ndị ọbịa anya nke ọma, ọ̀ bụ na o kwesịrị ile ndị ikwu ya n’okwukwe ọbịa nke ọma karị? Òkù ịbịa maka nri bụ ihe ezumike na-amasị onye meworo okenye n’usoro ime ihe ya. Ọ bụrụ na ị chọrọ olu nke amamihe na ahụmahụ ná nnọkọ ntụrụndụ gị, gụnye ndị agadi.—Tụlee Luk 14:12-14.
17 E nwere ọtụtu ụzọ a pụrụ isi gbaa ndị meworo okenye ume. Ọ bụrụ na anyị nwere ìgwè anyị so enweta ụgbọ ala iji gaa Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ mgbakọ, è nwere ụfọdụ ndị meworo okenye ọ ga-amasị iso anyị n’ụgbọ? Echela ka ha rịọ gị. Gwa ha ka ị kpọrọ ha. Enyemaka ọzọ bara uru bụ ịzụrụ ha ahịa. Ma ọ bụ ọ bụrụ na ha nwere ike, ànyị pụrụ ịkpọrọ ha ịga zụọ ahịa nke anyị? Ma jide n’aka na e nwere ebe ndị ha pụrụ izu ike ma nweta ume ndụ a dị ama ama nke ahụ dị mkpa. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-achọ ndidi na obi ọma, ma ezi obi ekele onye agadi pụrụ ịbụ nnọọ ihe nkwụghachi ụgwọ.—2 Ndị Kọrint 1:11.
Ihe Abamuru Mara Mma nye Ọgbakọ
18. N’ihi gịnị ka ndị meworo okenye ji bụrụ ngọzi nye ọgbakọ?
18 Lee aha ngọzi ọ bụ ịhụ ụfọdụ isi awọ na ntutu ọcha (nakwa isi ndị kwọchara akwọcha n’ihi nká) n’ọgbakọ! Ọ pụtara na n’etiti ume ọrụ na ike nke ndị na-eto eto, anyị nwere amamihe na ahụmahụ nke na-efesasị ka mmiri—ezigbo ihe abamuru nye ọgbakọ ọ bụla. Ihe ọmụma ha dị ka mmiri na-enye ume ọhụrụ nke a na-aghaghị isi n’olulu mmiri dọpụta. Ọ bụ dị ka Ilu 18:4 si kwuo ya: “Mmiri nke miri emi ka okwu nile nke ọnụ mmadụ bụ; iyi na-eru eru ka isi iyi amamihe bụ.” Lee ka o si bụrụ ihe agbamume nye ndị meworo okenye inwe mmetụta nke na a chọrọ ha, jirikwa ha kpọrọ ihe nke ukwuu!—Tụlee Abụ Ọma 92:14.
19. Olee otú ụfọdụ siworo chụọ àjà maka nne na nna ha meworo agadi?
19 Ụfọdụ ndị nọ n’ije ozi oge nile ahụwo mkpa ọ dị ịhapụ ihe ùgwù ije ozi ha iji laghachi ụlọ ilekọta nne na nna meworo agadi, nke na-arịa ọrịa. Ha achụwo àjà maka ndị chụworo àjà ná mbụ maka ha. Otu di na nwunye, ndị bụbu ndị ozi ala ọzọ ma ka nọrọ n’ije ozi oge nile, laghachiri ụlọ ilekọta nne na nna ha meworo agadi. Nke a ka ha meworo ihe karịrị 20 afọ. Afọ anọ gara aga ọ dịrị mkpa itinye nne nwoke ahụ n’ebe a na-elekọta ndị agadi. Di ahụ, nke nọ ugbu a n’afọ ndị 60 ya, na-eleta nne ya dị afọ 93 kwa ụbọchị. Ọ na-akọwa, sị: “Olee otú m pụrụ isi gbahapụ ya? Ọ bụ nne m!” N’ọnọdụ ndị ọzọ, ọgbakọ na ndị mmadụ n’otu n’otu apụtawo ma wepụta onwe ha itinye anya n’ebe ndị meworo okenye nọ ka ụmụ ha wee nọgide n’ọrụ e kenyere ha. Ịhụnanya dị otú ahụ nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị kwesịkwara ka a jaa ya mma nke ukwuu. E kwesịrị iji nlezianya hụ maka ọnọdụ nke ọ bụla n’ihi na a gaghị eleghara ndị agadi anya. Gosi na ị hụrụ nne na nna gị meworo agadi n’anya.—Ọpụpụ 20:12; Ndị Efesọs 6:2, 3.
20. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jehova nyeworo anyị n’ilekọta ndị agadi?
20 N’ezie, ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom ndị meworo okenye bụ okpueze nke ịma mma nye ezinụlọ ma ọ bụ ọgbakọ. Jehova sịrị: “Ọzọ, ruo agadi mụ onwe m bụ Onye ahụ, ruokwa isi awọ mụ onwe m ga-eku unu n’aka: mụ onwe m emewo, mụ onwe m ga-ebukwa; ee, mụ onwe m ga-eku n’aka, meekwa ka unu wepụga onwe unu.” Ka anyị gosi otu ụdị ndidi na nlekọta ahụ n’ebe ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom meworo okenye n’ime ezinụlọ ndị Kraịst nọ.—Aịsaịa 46:4; Ilu 16:31.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nweta aro sara mbara n’ihe ndị òtù ezinụlọ pụrụ ime iji nyere ndị agadi aka, lee Ụlọ Nche nke June 1, 1987, peji nke 13-18.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Ihe atụ Bible ndị dị aṅaa ka anyị nwere n’ilekọta ndị agadi?
◻ Olee otú anyị kwesịrị isi mesoo ndị agadi?
◻ Olee otú ndị òtù ezinụlọ pụrụ isi lekọta ndị agadi ha hụrụ n’anya?
◻ Gịnị ka ọgbakọ pụrụ ime iji nyere ndị agadi aka?
◻ N’ihi gịnị ka ndị agadi ji bụrụ ngọzi nye anyị nile?
[Foto dị na peeji nke 23]
Rut gosiri Naomi meworo agadi obi ọma na nkwanye ùgwù
[Foto dị na peeji nke 24]
Ndị agadi bụ ndị bara uru n’ọgbakọ