Ọ Pụrụ Ikwe Mee Ịhụ Onye Agbata Obi N’anya
IHE atụ Jisọs Kraịst nke onye Sameria ahụ gosiri ihe ezigbo ịhụnanya agbata obi pụtara n’ezie. (Luk 10:25-37) Jisọs kụzikwara, sị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya. Nke a bụ ihe ukwu na ihe mbụ e nyere n’iwu. Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—Matiu 22:37-39.
Dị ka ọtụtụ mmadụ, ọ̀ na-esiri gị ike ịhụ onye agbata obi gị n’anya nke si n’ìgwè agbụrụ ọzọ na-abụghị nke gị? Ma eleghị anya ọ dị otú a n’ihi na ị mawo banyere ma ọ bụ nwee ahụmahụ n’onwe gị nke ịkpa iche na ikpe na-ezighị ezi. Gị ma ọ bụ ndị ị hụrụ n’anya atawo ahụhụ mmejọ n’aka ndị si n’ìgwè ọzọ.
Ebe Jisọs gosiri na otu n’ime ihe ndị Chineke nyere n’iwu bụ ka anyị hụ onye agbata obi anyị n’anya, ọ ghaghị ikwe omume imeri mmetụta ndị dị otú ahụ siri ike. Isi ihe dị n’ime otú ahụ bụ ile ndị mmadụ anya otú Chineke na Kraịst si ele ha. Na nke a ka anyị tụlee ihe nlereanya Jisọs na ndị Kraịst mbụ.
Ihe Nlereanya Ọma nke Jisọs
Ndị Juu nke narị afọ mbụ nwere mmetụta ndị siri ike megide ndị Sameria, ndị bi n’ókèala dị n’agbata Judia na Galili. N’otu oge ndị mmegide bụ́ ndị Juu ji ịkwa emo jụọ Jisọs: “Ànyị onwe anyị ekwughị nke ọma, sị na gị onwe gị bụ onye Sameria, i nwekwara mmụọ ọjọọ?” (Jọn 8:48) Mmetụta ịkpọasị megide ndị Sameria siri ike nke ukwuu nke na ọbụna na ụfọdụ ndị Juu bụrụ ndị Sameria ọnụ n’ihu ọha n’ụlọ nzukọ ma na-ekpe ekpere kwa ụbọchị ka a ghara inye ndị Sameria ndụ ebighị ebi.
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe ọmụma banyere mkpọrọmasị nke a bamiri abami kpaliri Jisọs inye ihe atụ ahụ banyere onye Sameria nwapụtara onwe ya ịbụ ezi onye agbata obi site n’ilekọta nwoke onye Juu ahụ ndị ohi tiri ihe. Olee otú Jisọs gaara esiworị zaa mgbe nwoke onye Juu ahụ maara Iwu Mosis nke ọma jụrụ, sị: “Ònye bụkwa onye agbata obi m?” (Luk 10:29) Ọ dị mma, Jisọs pụrụ ịzaghachiworị kpọmkwem site n’ịsị: ‘Onye agbata obi gị gụnyere ọ bụghị nanị ndị Juu ibe gị kamakwa ndị ọzọ, ọbụna onye Sameria.’ Otú ọ dị, ọ gaara esiworo ndị Juu ike ịnakwere. Ya mere ọ kọrọ akụkọ ihe atụ ahụ banyere onye Juu nke nwetara ebere onye Sameria. Jisọs si otú a nyere ndị Juu na-ege ya ntị aka ịbịa ná nkwubi okwu na ezi ịhụnanya agbata obi ga-eruru ndị na-abụghị ndị Juu.
Jisọs enweghị mkpọrọmasị ọ bụla megide ndị Sameria. Ka ọ na-agabiga Sameria n’otu oge, o zuru ike n’akụkụ otu ọdọ mmiri mgbe ndị na-eso ụzọ ya gara n’obodo dị nso ịzụta nri. Mgbe otu nwanyị onye Sameria bịara isere mmiri, ọ sịrị: “Nye m mmiri ka m ṅụọ.” Ebe ndị Juu na ndị Sameria na-adịghị emekọrịta ihe, ọ jụrụ, sị: “Gị onwe gị si aṅaa arịọ mmiri n’aka m ka ị ṅụọ, ebe ị bụ onye Juu, ma mụ bụ nwanyị Sameria?” Mgbe ahụ Jisọs gbaara ya àmà, ọbụna na-ekwupụta hoo haa na ya bụ Mesaịa ahụ. Ọ zaghachiri site n’ịbanye n’ime obodo ahụ ma kpọọ ndị ọzọ ka ha bịa ṅaa ya ntị. Gịnị ka ọ rụpụtara? “Ọtụtụ ndị Sameria si n’obodo ahụ kweere na ya.” Lee ezi ihe si na ya pụta n’ihi na e jichighị Jisọs site n’àgwà juru ebe nile nke ndị Juu dị ndụ n’oge ya!—Jọn 4:4-42.
Chineke Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu
Ọ bụ nzube Chineke ka Jisọs mee nkwusa n’ụzọ bụ isi nye ndị Juu, “atụrụ furu efu nke ụlọ Israel.” (Matiu 15:24) Ya mere, ndị mbụ na-eso ụzọ ya sitere n’etiti ndị Juu. Ma nanị afọ atọ mgbe a wụpụsịrị mmụọ nsọ na Pentikọst 33 O.A., Jehova mere ka doo anya na ya chọrọ ka ndị Juu kwere ekwe mee ka ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ruo ndị nke mba nile, ndị Jentaịl.
N’echiche onye Juu, ịhụ onye Sameria n’anya dị ka onwe onye ga-esi ike nke ukwuu. Ọ ga-esi ike ọbụna karị igosi ịhụnanya agbata obi n’ebe ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù nọ, ndị ndị Sameria nwere ihe jikọrọ ha na ndị Juu karịa ha. Ka ọ na-ekwu banyere àgwà ndị Juu n’ebe ndị Jentaịl nọ, akwụkwọ The International Standard Bible Encyclopaedia na-asị: “Anyị na-ahụ, n’oge A[gba] Ọ[hụrụ], ịsọ oyi, nlelị, na ịkpọasị kasị njọ. E lere ha [ndị Jentaịl] anya dị ka ndị na-adịghị ọcha, ndị a machibidoro iwu iso ha nwee mmekọrịta enyi ọ bụla. Ha bụ ndị iro Chineke na ndị Ya, ndị a na-enyeghị ihe ọmụma banyere Chineke ọ gwụla ma ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ ndị Juu, ọbụnakwa mgbe ahụ a pụghị, dị ka n’oge ochie, ịnabata ha dị ka ndị òtù n’ụzọ zuru ezu. A machibidoro ndị Juu iwu inye ha ndụmọdụ, ọ bụrụkwa na ha ajụọ ajụjụ banyere ihe ndị metụtara Chineke, a ga-abụ ha ọnụ.”
Ka ọtụtụ ndị jigidere echiche ndị a, Jehova mere ka Pita onyeozi nwee ọhụụ nke a nọ na ya gwa ya ka ‘ọ kwụsị ịkpọ ihe Chineke meworo ka ọ dị ọcha ihe rụrụ arụ.’ Mgbe ahụ Chineke dugara ya n’ụlọ Kọniliọs onye Jentaịl. Pita gbaara Kọniliọs, ezinụlọ ya, na ndị Jentaịl ndị ọzọ, àmà banyere Kraịst. “N’ezie,” ka Pita kwuru, “ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye ọ na-anara nke ọma.” Ka Pita ka na-eme nkwusa, mmụọ nsọ dakwasịrị ndị ọhụrụ ahụ kwere ekwe, bụ́ ndị e meziri baptism mgbe ahụ ha wee ghọọ ndị Jentaịl mbụ na-eso ụzọ Kraịst.—Ọrụ Ndị Ozi, isi nke 10.
Ndị Juu na-eso ụzọ nabatara ihe omume nke a, na-aghọta na a kparaghị iwu Jisọs nyere nke ‘ime ndị nke mba nile ndị na-eso ụzọ’ ókè nye ndị Juu n’ala nile kama na ọ gụnyere ndị Jentaịl. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 11:18) Imeri mmetụta ọ bụla nke ịkpọ ndị Jentaịl asị ha pụrụ inwewo, ha ji ịnụ ọkụ n’obi hazie mkpọsa ime nkwusa iji mee ndị na-eso ụzọ n’etiti mba nile. Ihe na-erughị 30 afọ n’ihu, a pụrụ ikwu na e kwusawo ozi ọma ahụ “n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.”—Ndị Kọlọsi 1:23.
Onye butere ụzọ n’ọrụ nkwusa a bụ Pọl onyeozi, ya onwe ya bụ onye Kraịst nke sitere n’etiti ndị Juu. Tupu ọ ghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst, ọ bụwo onye òtù na-anụ ọkụ n’obi nke ịrọ òtù okpukpe ndị Farisii. Ha na-elelị ọ bụghị nanị ndị Jentaịl kama ọbụna ndị nkịtị bụ́ ndị obodo nke aka ha. (Luk 18:11, 12) Ma Pọl ekweghị ka echiche ndị ahụ jighachi ya azụ igosi ndị ọzọ ịhụnanya agbata obi. Kama nke ahụ, ọ ghọrọ “onyeozi nke ndị mba ọzọ [ndị Jentaịl],” na-enyefe ndụ ha n’ọrụ nke ime ndị na-eso ụzọ n’akụkụ nile nke ala Mediterranean.—Ndị Rom 11:13.
N’oge ozi ya, a tụrụ Pọl nkume, tie ya ihe, tụọkwa ya mkpọrọ. (Ọrụ 14:19; 16:22, 23) Ahụmahụ dị ike ndị dị otú ahụ hà mere ka o nwee obi ilu wee kwubie na ya na-egbu oge ya n’etiti mba na ìgwè agbụrụ ụfọdụ? Ee e ma ọlị. Ọ maara na e nwere ndị obi ha ziri ezi nọsasịrị n’akụkụ nile nke ọtụtụ ìgwè agbụrụ ndị dị n’ụbọchị ya.
Ka Pọl na-ahụ ka ndị Jentaịl dị njikere ka e zie ha ụzọ Chineke, ọ malitere ịhụ ha n’anya. Dị ka ihe atụ, o degaara ndị Tesalọnaịka, sị: “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nwanyị nke na-azụ nwa na-elezi ụmụ nke aka ya anya nke ọma: otú a, ebe unu dị anyị n’obi nke ukwuu, ọ dịịrị anyị ezi mma ime ka unu keta, ọ bụghị nanị ozi ọma nke Chineke, kama ọ bụkwa mkpụrụ obi nke aka anyị, n’ihi na e mere ka unu bụrụ ndị anyị hụrụ n’anya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8) Okwu ndị a sitere n’obi na-egosi na Pọl hụrụ ndị Tesalọnaịka bụ́ ndị Jentaịl n’anya n’ezie ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla mebie ọṅụ nke mmekọrịta ọma ya na ha nwere.
Ịhụnanya Agbata Obi n’Ọrụ
Taa, dị ka na narị afọ mbụ, ndị rapagidere onwe ha n’ọgbakọ ndị Kraịst na-azụlite ịhụnanya agbata obi maka ndị nke ìgwè agbụrụ nile. Site n’ịzụlite echiche Chineke banyere ndị ọzọ na site n’iso ha kerịta ozi ọma Alaeze ahụ, ezi ndị Kraịst agbasapụwo nghọta ha banyere ndị mmadụ ọ pụrụ ịbụ na ha agaraghị amata. Ha nwere ọbụna ịhụnanya ụmụnna maka ha. (Jọn 13:34, 35) Nke a pụkwara ịbụ ahụmahụ gị.
Ịhụnanya dị otú ahụ dị n’etiti Ndịàmà Jehova, ọ bụ ezie na a na-achọta ha na 229 ala, ha na-anọchitekwa anya “mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile.” (Mkpughe 7:9) Dị ka òtù ndị bụ ụmụnna zuru ụwa ọnụ, e jikọrọ ha ọnụ n’ofufe Jehova, n’ọjụjụ ha na-ajụ ikere òkè n’esemokwu na ọgụ dị iche iche nke agbụrụ, na n’ọjụjụ ha na-ajụ mkpọrọmasị nke na-anapụ ndị mmadụ mmekọrịta dị mma n’etiti ha na ndị mmadụ ibe ha.
Soro Ndịàmà na-akpakọrịta, ị ga-ahụkwa otú ndị sitere n’agbụrụ dị iche iche si na-eme uche Chineke. Ị ga-ahụ ịhụnanya agbata obi n’ọrụ ka ha na-akpọsa ozi ọma Alaeze Chineke. Ee, n’ọgbakọ ha nile kwa, ị ga-ezute ndị dị obi ọma, nwere obi eziokwu, ndị na-egosi site ná ndụ ha na ha amụtawo n’ezie ịhụ onye agbata obi ha n’anya.
[Foto dị na peeji nke 6]
N’ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova, ị ga-ahụ ndị nwere obi ụtọ sitere n’agbụrụ nile
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]
Mbịarute nke Ezi Onye Sameria Ahụ n’Ụlọ Ndị Ọbịa Ahụ/The Doré Bible Illustrations/Dover Publications, Inc.