Ntachi Obi—Dị Ndị Kraịst Oké Mkpa
“N’okwukwe unu . . . nyezuokwa ntachi obi.”—2 PITA 1:5, 6.
1, 2. N’ihị gịnị ka anyị nile na-aghaghị iji tachie obi ruo ọgwụgwụ?
ONYE nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị na nwunye ya na-eleta onye Kraịst ibe ha nọ n’afọ ndụ ya ndị nke 90. O tinyewo ọtụtụ iri afọ n’ozi oge nile. Ka ha na-ekwurịta okwu, nwanna nke ahụ ka mee okenye chetara ihe ùgwù ndị o nweburu n’afọ ndị gara aga. “Ma,” ka ọ kwara arịrị mgbe anya mmiri malitere ịgbaju ya ihu, “ugbu a enweghị m ike ime ihe dị ukwuu.” Onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị mepere Bible ya ma gụọ Matiu 24:13, ebe e hotara Jisọs Kraịst ka ọ na-asị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” Mgbe ahụ onye nlekọta ahụ lere ezi nwanna nwoke ahụ anya wee sị: “Ọrụ ikpeazụ e kenyere anyị nile, n’agbanyeghị otú ihe anyị pụrụ ime dịruru ukwuu ma ọ bụ dị nta, bụ ịtachi obi ruo ọgwụgwụ.”
2 Ee, dị ka ndị Kraịst anyị nile aghaghị ịtachi obi ruo ọgwụgwụ usoro ihe a ma ọ bụ ọgwụgwụ nke ndụ anyị. E nweghị ụzọ ọzọ isi nata nnwapụta Jehova maka nzọpụta. Anyị nọ n’ọsọ ndụ, anyị aghaghịkwa ‘iwere ntachi obi gbaa ọsọ’ ruo mgbe anyị gbaruru ebe a na-akwụsị. (Ndị Hibru 12:1) Pita onyeozi mesiri ịdị mkpa nke àgwà nke a ike mgbe ọ gbara ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “N’okwukwe unu . . . nyezuokwa ntachi obi.” (2 Pita 1:5, 6) Ma gịnị n’ezie bụ ntachi obi?
Ntachi Obi—Ihe Ọ Pụtara
3, 4. Gịnị ka ịtachi obi pụtara?
3 Gịnị ka ịtachi obi pụtara? Okwu Grik maka “ịtachi obi,” (hy·po·meʹno) pụtara n’ụzọ nkịtị “nọgide ma ọ bụ nọrọ n’okpuru.” Ọ pụtara ugboro 17 n’ime Bible. Dị ka ndị ọkà n’ide akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ W. Bauer, F. W. Gingrich, na F. Danker, ọ pụtara “nọgide kama ịgba ọsọ . . . , mmadụ ịkwụsị ike n’ebe ọ kwụ, ịkwụrụ chịm.” Mkpọaha Grik maka “ntachi obi” (hy·po·mo·neʹ) pụtara ihe karịrị ugboro 30. Banyere ya, akwụkwọ A New Testament Wordbook, nke William Barclay dere, na-asị: “Ọ bụ mmụọ nke pụrụ idi ihe, ọ bụghị nanị n’ihi nkụda aka, kama site n’olileanya na-egbukepụ egbukepụ . . . Ọ bụ àgwà nke na-eme ka mmadụ guzo n’ụkwụ ya ma na-eche ikuku ihu. Ọ bụ àgwà nke pụrụ ịgbanwe ule kasị sie ike ịghọ ebube n’ihi ọ na-ahụ ihe mgbaru ọsọ gabiga ihe mgbu ahụ.”
4 Mgbe ahụ, ntachi obi na-enyere anyị aka iguzo ebe anyị guzo n’enweghị ndakpọ olileanya n’ihi ihe mgbochi ma ọ bụ ihe isi ike dị iche iche. (Ndị Rom 5:3-5) Ọ na-ele anya gabiga ihe mgbu a na-enwe ugbu a gaa n’ihe mgbaru ọsọ—ihe mgbata n’ọsọ, ma ọ bụ onyinye, nke ndụ ebighị ebi, ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa.—Jemes 1:12.
Ntachi Obi—N’ihi Gịnị?
5. (a) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst nile ji ‘nwee mkpa ntachi obi’? (b) N’ụzọ abụọ dị aṅaa ka a pụrụ ikewa ọnwụnwa anyị nile?
5 Dị ka ndị Kraịst, ‘ntachi obi dị anyị nile mkpa.’ (Ndị Hibru 10:36) N’ihi gịnị? N’ụzọ bụ isi n’ihi na anyị ‘na-adaba n’ọnwụnwa dị iche iche.’ Akụkụ ihe odide Grik n’ebe a na Jemes 1:2 na-atụ aro nzute a na-atụghị anya ya ma ọ bụ nke a na-achọghị, dị ka mgbe mmadụ zutere onye ohi. (Tụlee Luk 10:30.) Anyị na-ezute ọnwụnwa ndị a pụrụ ikewa ụzọ abụọ: ndị na-abịara mmadụ nile dị ka ihe sitere ná mmehie e ketara eketa, na ndị na-ebilite n’ihi nsọpụrụ Chineke anyị. (1 Ndị Kọrint 10:13; 2 Timoti 3:12) Gịnị bụ ụfọdụ n’ọnwụnwa ndị a?
6. Olee otú otu Onyeàmà si tachie obi mgbe ọ na-eche ọrịa na-egbu mgbu ihu?
6 Ajọ ọrịa. Dị ka Timoti, ndị Kraịst ụfọdụ aghaghị ịtachiri ‘nrịanrịa a na-arịa ọtụtụ mgbe’ obi. (1 Timoti 5:23) Karịsịa mgbe a na-eche ọrịa na-adịghị ala ala, ma eleghị anya nke na-egbu mgbu ihu, ka ọ dị anyị mkpa ịtachi obi, iguzo n’ụkwụ anyị, site n’enyemaka Chineke ma ghara ichefu olileanya ndị Kraịst anyị. Tụlee ihe atụ nke otu Onyeàmà nọ n’afọ ndị mbụ nke 50 ya nke gbara mgba dị ogologo, siekwa ike, megide akpụ ime ahụ na-eweta ọnwụ nke na-eto ngwa ngwa. O guzosiri ike ná mkpebi ya ịghara ịnara mmịnye ọbara gabiga ịwa ahụ ugbo abụọ. (Ọrụ 15:28, 29) Ma akpụ ahụ pụtaghachiri n’afọ ya ma nọgide na-eto nso nso ọkpụkpụ azụ ya. Dị ka o mere, ọ nụrụ ụfụ a na-apụghị ikwu n’ọnụ nke ọ na-adịghị ọgwụ pụrụ ibelata ya. Ma ka o sina dị, o lere anya gabiga ihe mgbu dị n’oge ahụ gaa n’ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Ọ nọgidere na-eso ndị dọkịta, ndị nọọsụ, na ndị nleta na-ekerịta olileanya ya na-egbuke egbuke. Ọ tachiri obi ruo ọgwụgwụ kpọmkwem—ọgwụgwụ nke ndụ ya. Nsogbu ahụ ike i nwere nwere ike ọ gaghị abụ nke na-eyi ndụ egwu ma ọ bụ na-egbu mgbu dị ka nke ezi nwanna nwoke ahụ nwere, ma ọ ka pụkwara iweta oké ule nke ntachi obi.
7. Ihe mgbu dị aṅaa ka ntachi obi na-agụnye nye ụfọdụ n’ime ụmụnna ime mmụọ anyị ndị nwoke na ndị nwanyị?
7 Ihe mgbu mmetụta uche. Site n’oge ruo n’oge, ụfọdụ ndị Jehova ezutewo “ihe mwute nke obi” nke na-arụpụta ‘mmụọ e tigburu etigbu.’ (Ilu 15:13) Ajọ ịda mbà n’obi abụghị ihe a na-adịghị ahụkarị ‘n’oge ndị a dị oké egwu.’ (2 Timoti 3:1) Science News nke December 5, 1992, kọrọ, sị: “Ọ̀tụ̀tụ̀ nke ajọ ịda mbà n’obi, nke na-akụnwụ ahụ ọtụtụ mgbe, arịwo elu n’ọgbọ nke ọ bụla na-esochi a mụrụ eri 1915.” Ihe ndị na-akpata ịda mbà n’obi dị otú ahụ dị iche iche, malite n’ihe ndị metụtara ọnọdụ ahụ ike ruo n’ahụmahụ ọjọọ ndị na-egbu mgbu n’obi. Nye ụfọdụ ndị Kraịst, ntachi obi gụnyere ịgba mgba kwa ụbọchị iji guzo n’ụkwụ ha n’agbanyeghị ihe mgbu mmetụta uche. Ka o sina dị, ha adịghị ada mbà. Ha na-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova n’agbanyeghị anya mmiri ndị ahụ.—Tụlee Abụ Ọma 126:5, 6.
8. Ọnwụnwa ego dị aṅaa ka anyị pụrụ izute?
8 Ule dị iche iche anyị na-ezute pụrụ ịgụnye oké ihe isi ike ọnọdụ akụ na ụba. Mgbe otu nwanna nwoke na New Jersey, U.S.A., hụrụ onwe ya na mberede n’enweghị ọrụ, o kwere nghọta na o nwere nchegbu banyere ịzụ ezinụlọ ya na ka a ghara ịnapụ ya ụlọ ya. Otú ọ dị, a dọpụghị uche ya n’olileanya Alaeze ahụ. Ka ọ na-achọ ọrụ ọzọ, o ji ohere ahụ dapụtaranụ jee ozi dị ka ọsụ ụzọ inyeaka. N’ikpeazụ, ọ chọtara ọrụ.—Matiu 6:25-34.
9. (a) Olee otú ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya pụrụ isi weta mkpa maka ntachi obi? (b) Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị aṅaa na-egosi na ọ dịghị njọ ịgba anya mmiri nke iru újú?
9 Ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’anya anwụnahụwo gị, ntachi obi nke na-adịgide ogologo oge dị gị mkpa mgbe ndị nọ gị gburugburu laghachisịrị n’ihe omume ha. Ị pụrụ ọbụna ịhụ na ọ na-esiri gị ike karịsịa kwa afọ mgbe o ruru oge ahụ onye ị hụrụ n’anya nwụrụ. Ịtachiri mfu dị otú ahụ obi apụtaghị na ọ dị njọ ịkwa ákwá nke iru újú. Ọ bụ dị ka okike si dị iru újú n’ihi ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya, nke a abụghịkwa ma ọlị ngosipụta nke enweghị okwukwe n’olileanya nke mbilite n’ọnwụ. (Jenesis 23:2; tụlee Ndị Hibru 11:19.) “Anya mmiri pụrụ n’anya” Jisọs mgbe Lazarọs nwụsịrị, ọ bụ ezie na O jiwo obi ike gwa Mata, sị: “Nwanne gị nwoke ga-esi n’ọnwụ bilie.” Lazarọs bilikwara!—Jọn 11:23, 32-35, 41-44.
10. N’ihi gịnị ka ndị Jehova ji nwee mkpa pụrụ iche maka ntachi obi?
10 Tinyere ịtachi obi n’ule ndị na-abịara mmadụ nile, ndị Jehova nwere mkpa pụrụ iche maka ntachi obi. “Mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m,” ka Jisọs dọrọ aka ná ntị ya. (Matiu 24:9) O kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu.” (Jọn 15:20) Gịnị kpatara mkpọrọmasị na nsogbu nile ahụ? N’ihi na n’agbanyeghị ebe anyị bi n’ụwa a dị ka ndị na-ejere Chineke ozi, Satan na-anwa imebi nguzosi ike n’ezi ihe anyị nye Jehova. (1 Pita 5:8; tụlee Mkpughe 12:17.) Iji mezuo nke a ọtụtụ mgbe Setan akpalitewo ajọ nsogbu, na-etinye ntachi obi anyị n’oké ule.
11, 12. (a) Ndịàmà Jehova na ụmụ ha chere ule dị aṅaa nke ntachi obi ihu n’afọ ndị 1930 na mmalite afọ ndị 1940? (b) N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova na-ejighị ekele ihe nnọchianya mba?
11 Dị ka ihe atụ, n’afọ ndị 1930 na mmalite afọ ndị 1940, Ndịàmà Jehova na ụmụ ha na United States na Canada ghọrọ ndị a kpagburu maka na ha ekeleghị ihe nnọchianya mba n’ihi ihe ndị metụtara akọ na uche ha. Ndịàmà na-akwanyere ihe nnọchianya mba ha bi na ya ùgwù, ma na-ekwenye n’ụkpụrụ e setịpụrụ n’Iwu Chineke n’Ọpụpụ 20:4, 5: “Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe: n’ihi na mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo.” Mgbe a chụpụrụ ụmụ akwụkwọ ụfọdụ bụ́ Ndịàmà n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ha chọrọ iwegara nanị Jehova Chineke ofufe ha, Ndịàmà guzobere ụlọ akwụkwọ dị iche iche nke Alaeze maka izi ha ihe. Ụmụ akwụkwọ ndị a laghachiri n’ụlọ akwụkwọ ọha obodo mgbe Ụlọikpe Kasị Elu nke United States nakweere ọnọdụ okpukpe ha, dị ka mba ndị maara ihe a na-akọ na-eme taa. Otú ọ dị, ntachi obi site n’obi ike nke ndị a na-eto eto ghọrọ ihe nlereanya magburu onwe ya karịsịa maka ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị pụrụ iche ịkwa emo ihu ugbu a n’ihi na ha na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible.—1 Jọn 5:21.
12 Ule dị iche iche anyị na-ezute—ma ndị na-abịara mmadụ nile ma ndị anyị na-eche ihu n’ihi okwukwe ndị Kraịst anyị—na-egosi ihe mere anyị ji nwee mkpa maka ntachi obi. Ma olee otú anyị pụrụ isi tachie obi?
Tachie Obi ruo Ọgwụgwụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
13. Olee otú Jehova si enye ntachi obi?
13 Ndị Chineke nwere ọnọdụ ka mma nke doro anya karịa ndị na-adịghị efe Jehova. Maka enyemaka, anyị pụrụ ịrịọ “Chineke nke ntachi obi.” (Ndị Rom 15:5) Ma, olee otú Jehova si enye ntachi obi? Otu ụzọ o si eme otú ahụ bụ site n’ihe atụ ntachi obi ndị e dekọrọ n’Okwu ya, bụ́ Bible. (Ndị Rom 15:4) Ka anyị na-atụgharị uche na ndị a, ọ bụghị nanị na a na-agba anyị ume ịtachi obi kama anyị na-amụtakwa ihe dị ukwuu banyere otú e si atachi obi. Tụlee ihe atụ abụọ pụtara ìhè—ntachi obi n’obi ike nke Job na ntachi obi na-agbaghị ọrụ nke Jisọs Kraịst.—Ndị Hibru 12:1-3; Jemes 5:11.
14, 15. (a) Olee ọnwụnwa ndị Job tachiiri obi? (b) Olee otú Job si nwee ike ịtachiri ọnwụnwa ndị o chere ihu obi?
14 Olee ọnọdụ ndị tinyere ntachi obi Job n’ule? Ọ tara ahụhụ ihe isi ike ọnọdụ akụ na ụba mgbe ihe ka ukwuu n’ihe onwunwe ya funahụrụ ya. (Job 1:14-17; tụlee Job 1:3.) Job nwere mmetụta ihe mgbu nke mfu mgbe ajọ ifufe gburu ụmụ iri ya nile. (Job 1:18-21) Ọ rịara ọrịa jọrọ oké njọ, nke na-egbu mgbu nke ukwuu. (Job 2:7, 8; 7:4, 5) Nwunye nke aka ya rụgidere ya ka ọ gbakụta Chineke azụ. (Job 2:9) Ndị enyi ya dị ya nso kwuru ihe ndị na-afụ ụfụ n’obi, ndị obi ọjọọ, ndị na-abụghị eziokwu. (Tụlee Job 16:1-3 na Job 42:7.) Otú ọ dị, n’ihe a nile, Job guzoro n’ụkwụ ya, na-ejigide nguzosi ike ya n’ezi ihe. (Job 27:5) Ihe ndị dakwasịrị ya yiri ọnwụnwa ndị ndị Jehova na-ezute taa.
15 Olee otú Job si nwee ike ịtachiri ọnwụnwa ahụ nile obi? Otu ihe kpọmkwem nke kwagidere Job bụ olileanya. “N’ihi na olileanya dịịrị osisi,” ka o kwupụtara. “Na ọ ga-epute ọzọ, ma e gbutuo ya, na ome ya agaghị akwụsịkwa.” (Job 14:7) Olee olileanya Job nwere? Dị ka a rịbara ama n’amaokwu ole na ole sochiri, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ? . . . Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe ga-azakwa gị: agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị [ma ọ bụ, chọsie ike].” (Job 14:14, 15) Ee, Job lere anya gabiga ihe mgbu ọ na-enwe mgbe ahụ. Ọ maara na ọnwụnwa ya dum agaghị adịru ebighị ebi. Ọ dịkarịa anya, ọ gaje ịtachi obi ruo ọnwụ. Ihe o ji olileanya na-atụ anya ya bụ na Jehova, onye ji ịhụnanya na-achọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, ga-eweghachite ya ná ndụ.—Ọrụ 24:15.
16. (a) Gịnị ka anyị na-amụta banyere ntachi obi site n’ihe atụ Job? (b) Olileanya Alaeze ahụ aghaghị ịbụ ihe e ji n’aka nye anyị ruo ókè hà aṅaa, n’ihi gịnịkwa?
16 Gịnị ka anyị na-amụta site ná ntachi obi Job? Iji tachie obi ruo ọgwụgwụ, anyị agaghị echefu olileanya anyị mgbe ọ bụla. Chetakwa na olileanya Alaeze ahụ ịbụ ihe e ji n’aka pụtara na ahụhụ ọ bụla anyị zutere bụ nnọọ “ihe nwa oge.” (2 Ndị Kọrint 4:16-18) Olileanya anyị dị oké ọnụ ahịa gbanyesiri mkpọrọgwụ ike ná nkwa Jehova maka oge dị n’ọdịnihu dị nso mgbe “ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya [anyị]; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” (Mkpughe 21:3, 4) Olileanya ahụ, nke na-adịghị eme “ka ihere mee anyị,” aghaghị ichekwa echiche anyị. (Ndị Rom 5:4, 5; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:8) Ọ ghaghị ịbụ ihe e ji n’aka nye anyị—bụrụ ihe e ji n’aka nke ukwuu nke na site n’anya nke okwukwe anyị, anyị pụrụ ịhụ onwe anyị n’ụwa ọhụrụ ahụ—na-adịghịkwa alụso ọrịa na ịda mbà n’obi ọgụ kama na-eteta kwa ụbọchị n’ezi ahụ ike ma nwee uche zuru okè; na-adịghịkwa enwe nchekasị banyere ajọ nrụgide ọnọdụ akụ na ụba kama na-ebi ndụ ná ntụkwasị obi; na-adịghịkwa akwa ákwá n’ihi ọnwụ nke ndị a hụrụ n’anya kama na-enwe ihe mkpali ọṅụ nke ịhụ ka a kpọlitere ha. (Ndị Hibru 11:1) Ma e nweghị olileanya dị otú a, ọnwụnwa ndị anyị na-enwe ugbu a pụrụ irikpu anyị nke ukwuu nke na ike ga-agwụ anyị. Site n’olileanya anyị, lee aha ihe mkpali dị ukwuu anyị nwere iji nọgide na-alụ ọgụ, iji nọgide na-atachi obi ruo ọgwụgwụ!
17. (a) Olee ọnwụnwa ndị Jisọs tachiiri obi? (b) A pụrụ ịhụta oké nhụjuanya Jisọs tachiiri obi ma eleghị anya site n’eziokwu dị aṅaa? (Lee ntụaka ala ala peji.)
17 Bible na-agba anyị ume ‘ilegide’ Jisọs anya ma ‘tụgharịa uche n’ebe ọ nọ.’ Olee ọnwụnwa ndị ọ tachiri obi na ha? Ụfọdụ n’ime ha sitere ná mmehie na ezughị okè nke ndị ọzọ. Jisọs tachiri obi ọ bụghị nanị “nkwugide . . . nke ndị mmehie” kamakwa nsogbu dị iche iche bilitere n’etiti ndị na-eso ụzọ ya, gụnyere esemokwu ha mgbe mgbe banyere onye kasịnụ. Karịa nke ahụ, o zutere ule na-enweghị atụ nke okwukwe. Ọ “tachiri obi n’elu osisi ịta ahụhụ.” (NW) (Ndị Hibru 12:1-3; Luk 9:46; 22:24) O siri ike ọbụna ichetụ n’echiche ahụhụ nke uche na nke elu ahụ dị n’ihe mgbu nke mkpọgide n’elu osisi na mmechuihu nke ịbụ onye e gburu dị ka onye nkwulu.a
18. Dị ka Pọl onyeozi na-ekwu, ihe abụọ dị aṅaa kwadoro Jisọs?
18 Gịnị nyeere Jisọs aka ịtachi obi ruo ọg̣wụgwụ? Pọl onyeozi rụtụrụ ihe abụọ kwagidere Jisọs: “ekpere na arịrịọ” nakwa “ọṅụ e debere n’ihu ya.” Jisọs, Ọkpara Chineke nke zuru okè, emeghị ihere ịrịọ maka enyemaka. o ji “ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri” chee ekpere. (Ndị Hibru 5:7; 12:2) Karịsịa mgbe ọnwụnwa ya kasịnụ na-eru nso ka ọ hụrụ na ọ dị mkpa ikpe ekpere maka ume ugboro ugboro na site n’ala ala obi. (Luk 22:39-44) Ná nzaghachi nye arịrịọ Jisọs, Jehova ewepụghị ọnwụnwa ahụ, kama ọ gbara Jisọs ume ịtachiri ya obi. Jisọs tachikwara obi n’ihi na o lere anya gabiga osisi ịta ahụhụ ahụ gaa n’ụgwọ ọrụ ya—ọṅụ ọ ga-enwe n’iso doo aha Jehova nsọ na ná mgbapụta nke ezinụlọ mmadụ site n’ọnwụ.—Matiu 6:9; 20:28.
19, 20. Olee otú ihe atụ Jisọs si enyere anyị aka inwe echiche ziri ezi banyere ihe ntachi obi gụnyere?
19 Site n’ihe atụ Jisọs, anyị na-amụta ihe ụfọdụ na-enyere anyị aka inwe echiche ziri ezi banyere ihe ntachi obi gụnyere. Ụzọ nke ntachi obi abụghị nke dị mfe. Ọ bụrụ na ịtachi obi n’otu ọnwụnwa na-esiri anyị ike, e nwere nkasi obi n’ịmara na ọ dịkwa otú ahụ nye ọbụna Jisọs. Iji tachie obi ruo ọgwụgwụ, anyị aghaghị ikpe ekpere ugboro ugboro maka ume. Mgbe a nọ n’ọnwụnwa, mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịdị anyị ka anyị erughị eru ikpe ekpere. Ma Jehova na-akpọ anyị òkù ịwụpụrụ ya obi anyị ‘n’ihi na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) N’ihi ihe Jehova kwewokwara nkwa ya n’Okwu ya, ọ gbawo onwe ya iyi inye ndị na-akpọku ya n’okwukwe “ọkịka nke ike.”—2 Ndị Kọrint 4:7-9.
20 Mgbe ụfọdụ anyị aghaghị ịtachi obi n’anya mmiri. Nye Jisọs ihe mgbu nke osisi ịta ahụhụ abụghị n’onwe ya ihe na-enye ọṅụ. Kama nke ahụ, ọṅụ ahụ dị n’ụgwọ ọrụ e setịpụrụ ya n’ihu. N’ọnọdụ anyị, ọ gaghị ezi ezi ịtụ anya na mgbe nile anyị ga na-enwe ihu ọchị na obi ụtọ mgbe anyị na-enwe ọnwụnwa. (Tụlee Ndị Hibru 12:11.) Otú ọ dị, site n’ilepụ anya maka ụgwọ ọrụ ahụ, anyị pụrụ inwe ike ‘ịgụ ha nile ịbụ ihe ọṅụ’ ọbụna mgbe anyị zutere ọnọdụ ndị sikarịsịrị ike. (Jemes 1:2-4; Ọrụ 5:41) Ihe dị mkpa bụ ka anyị nọgidesie ike—ọ bụrụgodi na ọ ga-abụ site n’anya mmiri. E kwuwerị, Jisọs asịghị, ‘Onye gbara anya mmiri nke dị nta karịsịa ka a ga-azọpụta’ kama, “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 24:13.
21. (a) Na 2 Pita 1:5, 6, a gbara anyị ume inyezu ntachi obi anyị gịnị? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
21 Ya mere ntachi obi dị mkpa maka nzọpụta. Ma ná 2 Pita 1:5, 6, a na-agba anyị ume inyezu ntachi obi anyị nsọpụrụ Chineke. Gịnị bụ nsọpụrụ Chineke? Gịnị jikọrọ ya na ntachi obi, oleekwa otú ị pụrụ isi nweta ya? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A pụrụ ịhụta oké nhụjuanya nke Jisọs tachiiri obi ma eleghị anya site n’eziokwu bụ na anụ ahụ ya zuru okè kubiri ume mgbe nanị hour ole na ole ọ nọrọ n’elu osisị ahụ gasịrị, ebe ọ dịrị mkpa ka a gbajie ụkwụ ndị ajọ mmadụ a kpọgburu ya na ha iji mee ka ha nwụọ ọsọ ọsọ. (Jọn 19:31-33) Ha enwetaghị nhụjuanya nke uche na anụ ahụ nke e mere ka Jisọs nwee n’oge ajọ mmeso ahụ e mesoro Jisọs ogologo abalị nile ọ na-ehighị ụra tupu a kpọgbuo ya, ma eleghị anya ruo n’ókè nke na ọ pụghịdị ibu osisi ịta ahụhụ nke ya.—Mak 15:15, 21.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị ka ịtachi obi pụtara?
◻ N’ihi gịnị ka ndị Jehova ji nwee mkpa pụrụ iche maka ntachi obi?
◻ Gịnị nyeere Job aka ịtachi obi?
◻ Olee otú ihe atụ Jisọs si enyere anyị aka inwe echiche ziri ezi maka ntachi obi?
[Foto dị na peeji nke 10]
E guzobere Ụlọ Akwụkwọ Alaeze iji kụziere ụmụaka ndị Kraịst a chụpụrụ n’ụlọ akwụkwọ n’ihi iwegara nanị Jehova ofufe ha
[Foto dị na peeji nke 12]
Ebe o kpebisiri ike ịsọpụrụ Nna ya, Jisọs kpere ekpere maka ume iji tachie obi