Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 9/15 p. 20-23
  • Ha Ji Ọmịiko Na-azụ Ìgwè Atụrụ Nta Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Ji Ọmịiko Na-azụ Ìgwè Atụrụ Nta Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịzụ Ìgwè Atụrụ   Chineke
  • Ndị Ọzụzụ Atụrụ Na-enwe Nchegbu n’Ezie
  • Ọzụzụ Atụrụ nke Na-ewuli Elu
  • Ndị Na-azụ Atụrụ—Rụzuonụ Ibu Ọrụ Unu
  • Iji Ịdị Nro Na-azụ Atụrụ Jehova Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ndị Ọzụzụ Atụrụ, Ṅomienụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Kacha Ukwuu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Nyere Ndị Si n’Ìgwè Atụrụ Chineke Kpafuo Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Na-erubere Ndị Na-azụ Atụrụ Jehova Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 9/15 p. 20-23

Ha Ji Ọmịiko Na-azụ Ìgwè Atụrụ Nta Ahụ

N’ETITI anụmanụ nile na-ebidebe mmadụ nso, ọ dịghị ndị yiri nnọọ atụrụ ụlọ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’etiti ụmụ anụmanụ nwere ume na echiche ebumpụta ụwa dị mkpa iji chọta nri ma gbanarị ihe ndị e kere eke na-eri ha, ma atụrụ dị iche. Anụ ndị ọzọ na-erigbu ya, ọ dịghịkwa emekebe ihe ọ bụla iji zọrọ isi ya. Ma e nweghị onye ọzụzụ atụrụ, atụrụ na-atụ egwu ma ghara inwe enyemaka. Ọ nọpụ iche n’ebe ìgwè ahụ dị, ọ na-adị mfe ya ifu. Ya mere, atụrụ ndị dị mfe iduzi nwere ihe ndị siri ike mere ha ji achọ ịnọ onye na-azụ ha nso. Ma ọ nọghị ya, ha nwere ohere dị ntakịrị ịlanarị. N’ihi àgwà ndị a, Bible ji atụrụ eme ihe n’ụzọ ihe atụ iji kọwaa ndị aka ha dị ọcha, ndị e mejọrọ, ma ọ bụ ndị na-apụghị ịzọrọ isi onwe ha.

N’ezie, ụgwọ ọrụ onye na-azụ atụrụ na-esite n’ịrụsi ọrụ ike. Ndụ ya abụghị nke dị mfe. E kpughepụrụ ya nye ma okpomọkụ ma oyi, ọ na-anọkwa ọtụtụ abalị n’ehighị ụra. Ọ ghaghị ichebe ìgwè atụrụ ahụ site n’anụ ndọgbu dị iche iche, ọtụtụ mgbe na-etinye onwe ya n’ihe ize ndụ. Ebe onye na-azụ atụrụ na-aghaghị ịchịkọta ìgwè atụrụ ahụ ọnụ, ọ na-etinye ihe ka ukwuu n’oge ya n’ịchọta atụrụ kpafuru akpafu ma ọ bụ nke furu efu. Ọ ghaghị ime nke na-arịa ọrịa na nke merụrụ ahụ ọgwụ. A ga-ebu ụmụ atụrụ ndị ụkwụ na-esighị ike ma ọ bụ ndị ike gwụrụ agwụ. A na-enwe nchegbu mgbe nile maka inweta nri na mmiri zuru ezu. Ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkebe bụ́ onye na-azụ atụrụ ịrahụbọ chi n’ọhịa iji hụ na ọ dịghị ihe mere ìgwè atụrụ ya. Ya mere, ịzụ atụrụ bụ ndụ ndọlị nke chọrọ ije ozi nke nwoke nwere obi ike, dị uchu, ma na-arụpụta ihe. Karịsịa, ọ ghaghị inwe àgwà nke igosi ezi nchegbu maka ìgwè atụrụ e nyere ya ilekọta.

Ịzụ Ìgwè Atụrụ   Chineke

Bible na-egosipụta ndị Chineke dị ka atụrụ na-adịghị achọ okwu na ndị na-elekọta ha dị ka ndị na-azụ atụrụ. Jehova n’onwe ya bụ ‘onye na-azụ atụrụ na onye nlekọta nke mkpụrụ obi anyị.’ (1 Pita 2:25) Jisọs Kraịst, “onye ọzụzụ atụrụ ọma,” kwupụtara ọchịchọ ya ka atụrụ ahụ nweta nlekọta ọmịiko mgbe ọ gwara Pita onyeozi, sị: ‘Nye atụrụ m nri, zụọ atụrụ nta m, nye atụrụ nta m nri.’ (Jọn 10:11; 21:15-17) E tinyewo ‘nlekọta nke ọgbakọ Chineke’ n’aka ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst n’ụzọ siri ike. (Ọrụ 20:28) Ọrụ ha kwa dị ka ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ na-achọ àgwà ndị ahụ nke onye ọzụzụ atụrụ nkịtị—inwe obi ike, ịdị uchu, ịdị na-arụpụta ihe, na, n’ụzọ bụ́ isi, nchegbu sitere n’obi maka ọdịmma nke ìgwè atụrụ ahụ.

N’ụbọchị Ezikiel onye amụma Chineke, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’etiti ndị ọzụzụ atụrụ a họpụtara ịhụ maka mkpa ndị Jehova n’Israel dara ada n’ịrụzu ọrụ ha. Ìgwè atụrụ Chineke tara ahụhụ nke ukwuu, ihe ka ukwuu n’ime ha na-agbakụta ezi ofufe azụ. (Ezikiel 34:1-10) Taa, ndị ụkọchukwu Krisendọm na-egosi onwe ha dị ka ndị ọzụzụ atụrụ nke ndị sị na ha bụ ọgbakọ ndị Kraịst, ma ọnọdụ ọrịa ime mmụọ ya na-anwapụta na ndị ụkọchukwu dị ka ndị obi ọjọọ ahụ na-asị na ha bụ ihe ha na-abụghị bụ́ ndị leghaara ndị ahụ anya ma mejọọ ha mgbe Jisọs nọ n’elu ụwa. Ndị ndú okpukpe Krisendọm dị ka “onye ọrụ e goro ego” nke ‘na-akpọghịkwa atụrụ ahụ ihe.’ (Jọn 10:12, 13) Ọ dịghị otú ha si dị njikere, nwee ike, ma ọ bụ ruo eru ịzụ ìgwè atụrụ Chineke.

Ndị Ọzụzụ Atụrụ Na-enwe Nchegbu n’Ezie

Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè maka ndị nile ga-azụ ìgwè atụrụ Jehova. N’ụzọ ọ bụla ọ na-ahụ n’anya, dị obi ọma, ọmịiko, ma na-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka. O ji aka ya malite ịchọpụta ndị nọ ná mkpa. Ọ bụ ezie na Jisọs ji ọrụ n’aka, ike na-agwụkwa ya ọtụtụ mgbe, ọ na-ewepụta oge mgbe nile ige ntị ná nsogbu ha ma nye ha agbamume. Ịdị njikere ya ịtọgbọ ndụ ya n’ihi ha bụ ngosipụta kasị elu nke ịhụnanya.—Jọn 15:13.

Taa, ndị okenye nile a họpụtara ahọpụta nke ọgbakọ, nakwa ndị ohu na-eje ozi, na-ekerịta ibu ọrụ nke a n’ebe ìgwè atụrụ ahụ dị. N’ihi ya, ọbụna ọnọdụ ka mma a pụrụ inweta n’ụzọ ihe onwunwe ná mba ọzọ adịghị akpali ihe ka ukwuu n’ime ndị ikom ndị a ji ihe akpọrọ ihe ịkwagharị wee si otú ahụ hapụ ọgbakọ dị iche iche n’enweghị enyemaka na nleru anya zuru ezu. Ebe ha na-ebi ‘n’oge dị oké egwu,’ ìgwè atụrụ ahụ nọ ná mkpa agbamume na nduzi. (2 Timoti 3:1-5) E nwere ihe ize ndụ na-adị mgbe nile na ụfọdụ ga-adaba n’ọnyà Setan, onye “dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) Ọ dị oké mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka ndị Kraịst na-azụ atụrụ ‘na-adụ ndị na-adịghị agazi ije ọdụ, na-agụgụ ndị dara mbà n’obi, na-enyere ndị na-adịghị ike aka.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ịnọ na nche mgbe nile dị mkpa ma ọ bụrụ na ha ga-egbochi ndị na-eguzosighị ike ka ha ghara ịdapụ site n’ìgwè atụrụ ahụ.—1 Timoti 4:1.

Olee otú onye ọzụzụ atụrụ ahụ pụrụ isi mata mgbe atụrụ chọrọ enyemaka? Ụfọdụ n’ime ihe mgbaama ndị na-apụtakarị ìhè bụ ịghara ịbịa nzukọ ndị Kraịst, ekerechighị òkè anya n’ozi ubi, na ọchịchọ ịhapụ iso ndị ọzọ na-akpachi anya. A pụkwara ịhụta adịghị ike site n’iji nlezianya chọpụta àgwà atụrụ ahụ na ụdị nkata ha. Ha pụrụ ịdị na-akatọ ndị ọzọ, ma eleghị anya na-egosipụta mmetụta nke mkpasu iwe. Nkata ha pụrụ ịdabere n’ụzọ gabigara ókè ná nchụso ihe onwunwe kama ịbụ n’ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ. Enweghị ịnụ ọkụ n’obi, olileanya, na ọṅụ n’ihe nile pụrụ ịpụta na okwukwe ha esikwaghị ike. Ọdịdị ihu nke nkụda mmụọ pụrụ ịbụ ihe na-egosi na ndị ikwu na-emegide ha ma ọ bụ ndị enyi bụ́ ndị ụwa na-arụgide ha. Mgbe a hụtara ihe mgbaama ndị a, onye ọzụzụ atụrụ ahụ pụrụ ịrụ ọrụ iji kpebie ụdị enyemaka a chọrọ.

Mgbe a na-eme nleta iji nyere onye kwere ekwe ibe ha aka, ọ dị ndị Kraịst na-azụ atụrụ mkpa iburu n’uche ihe bụ nzube ha bụ́ isi. Ọ bụghị nanị nleta enyi na enyi na nkata n’ụmụ irighiri ihe. Ihe mgbaru ọsọ Pọl onyeozi n’ilekọta ụmụnna ya bụ iji ‘kenye ha onyinye ime mmụọ ụfọdụ ka e wee mee ka ha dị ike na ka e wee nwee nkasirịta obi.’ (Ndị Rom 1:11, 12) Iji mezuo nke a, ibu ụzọ mee nkwadebe dị mkpa.

Nke mbụ, tụlee onye ahụ, gbalịakwa ịchọpụta ihe bụ ọnọdụ ime mmụọ ya. Mgbe ị matara nke ahụ, chetụ echiche banyere ụdị nduzi, agbamume, ma ọ bụ ndụmọdụ ga-akasị baa uru. Okwu Chineke, bụ́ Bible, kwesịrị ịbụ isi iyi bụ́ isi nke ihe ọmụma n’ihi na ọ “na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) A pụrụ ile anya na magazin Ụlọ Nche na Teta! maka isiokwu ndị kwuru kpọmkwem maka mkpa ndị atụrụ chere nsogbu ndị pụrụ iche ihu nwere. A pụrụ ịhụ ahụmahụ ndị na-akpali mmụọ ma na-enye ume ndụ n’akwụkwọ Yearbook of Jehovah’s Witnesses. Ihe mgbaru ọsọ ya bụ inyefe ihe ime mmụọ nke ‘ga-adị mma maka iwuli onye ahụ elu dị ka ụlọ.’—Ndị Rom 15:2.

Ọzụzụ Atụrụ nke Na-ewuli Elu

Onye na-azụ ìgwè atụrụ nkịtị maara na ha dabeere n’ebe ọ nọ maka nchebe na nlekọta. Ihe ize ndụ kasịnụ na-esite n’ịkpafu, ọrịa, ike ọgwụgwụ, mmerụ ahụ, na anụ ndị na-eri ibe ha. N’otu ụzọ ahụ onye ọzụzụ atụrụ ime mmụọ aghaghị ịmata ma chee ihe ize ndụ ndị yiri ha ihu bụ́ ndị na-eyi ọdịmma nke ìgwè atụrụ ahụ egwu. Ihe na-esonụ bụ nsogbu ụfọdụ a na-ahụkarị na aro ole na ole maka ihe a pụrụ ikwu iji nyefee ihe ọmụma na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ.

(1) Dị ka atụrụ na-adịghị elezi anya, ụfọdụ ndị Kraịst esiwo n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo n’ihi na ihe ndọrọ ndị yiri ka ha adịghị njọ ma na-atọ ụtọ rafuru ha. A pụrụ ịdọpụ uche ha, ọbụna ha akpafuo n’ihi ịchụso ihe mgbaru ọsọ e jikọrọ ha na ịhụ ihe onwunwe n’anya, ma ọ bụ ntụrụndụ. (Ndị Hibru 2:1) A pụrụ ichetara ndị dị otú ahụ ịdị ngwa nke oge ndị a, mkpa ọ dị ịdị na-anọ nzukọ Jehova nso, na mkpa ọ dị idebe ọdịmma Alaeze ahụ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ. (Matiu 6:25-33; Luk 21:34-36; 1 Timoti 6:8-10) A na-achọta ndụmọdụ bara uru n’isiokwu bụ́ “Debe Nguzozi Gị—N’ụzọ Dị Aṅaa?” n’Ụlọ Nche nke November 15, 1984, peji nke 8-11.

(2) Ọ dị onye na-azụ atụrụ mkpa inye atụrụ dara ọrịa ọgwụ. N’otu aka ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ aghaghị inyere ndị Kraịst na-arịa ọrịa ime mmụọ n’ihi ihe ọjọọ ndị mere ná ndụ ha aka. (Jemes 5:14, 15) Ọ pụrụ ịbụ na ha enweghị ọrụ, nwee ike nwee nsogbu ahụ ike siri ike, ma ọ bụ na-enwe ihe isi ike ná ndụ ezinụlọ ha. Ndị dị otú ahụ pụrụ inwe agụụ dị nta maka nri ime mmụọ ma ọ bụ iso ndị Chineke kpakọrịta. Nke a kwa na-akpata ịnọpụ iche na ịda mbà n’obi. Ọ dị ha mkpa ka e mesie ha obi ike na Jehova na-eche banyere ha, ọ ga-akwadokwa ha gabiga oge ndị siri ike. (Abụ Ọma 55:22; Matiu 18:12-14; 2 Ndị Kọrint 4:16-18; 1 Pita 1:6, 7; 5:6, 7) Ọ pụrụ ịbụ ihe enyemaka ịtụleghachi isiokwu bụ̀ “Na-elegide Anya n’Ihu Dị Ka Onye Kraịst,” nke a na-achọta n’Ụlọ Nche nke December 1, 1980, peji nke 12-15.

(3) Onye ọzụzụ atụrụ ahụ aghaghị ịdị na-eleru anya maka atụrụ nke ike gwụrụ. Ụfọdụ ejiwo ikwesị ntụkwasị obi tachie obi n’ijere Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ. Ha agbawo mgba gabiga ọtụtụ ule na ọnwụnwa. Ugbu a ha na-egosi ihe mgbaama nke ike ọgwụgwụ n’ọdịmma ha, ma eleghị anya ọbụnakwa na-egosipụta obi abụọ banyere mkpa oké ọrụ nkwusa dị. Ọ dị mkpa ịtụteghachi mmụọ ha, na-eme ka ekele ha dị ọhụrụ maka ọṅụ na ngọzi ndị na-esite n’ijere Chineke ozi site n’obi nile n’iṅomi Jisọs Kraịst. (Ndị Galetia 6:9, 10; Ndị Hibru 12:1-3) Ma eleghị anya a pụrụ inyere ha aka ịhụ na Jehova ji ije ozi ịnọgidesi ike n’ihe ha kpọrọ ihe, ọ pụkwara inye ha ume maka ọrụ dị iche iche n’ọdịnihu maka otuto ya. (Aịsaịa 40:29, 30; Ndị Hibru 6:10-12) Ọ pụrụ ịba uru ikerịta echiche ndị sitere n’isiokwu bụ́ “Ike Agwụla Unu n’Ime Ihe Ọma,” pụtara n’Ụlọ Nche nke July 15, 1988, peji nke 9-14.

(4) Dị ka atụrụ merụrụ ahụ, e merụwo ụfọdụ ndị Kraịst ahụ site n’ihe he lere anya dị ka àgwà na-akpasu iwe. Ma, ọ bụrụ na anyị na-agbaghara ndị ọzọ, Nna anyị nke eluigwe ga-agbaghara anyị dị ka ọ dị mkpa. (Ndị Kọlọsi 3:12-14; 1 Pita 4:8) Ụmụnna ụfọdụ ndị ikom na ndị inyom pụrụ inwetawo ndụmọdụ ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị nke ha chere na o kwesịghị ekwesị. Otú ọ dị, anyị nile pụrụ irite uru site na ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị ime mmụọ, ọ bụkwa ihe nkasi obi ịmara na Jehova na-adọ ndị ọ hụrụ n’anya aka ná ntị. (Ndị Hibru 12:4-11) N’ihi na e nyebeghị ha ihe ùgwù ije ozi ụfọdụ nke ha chere na ha ruru eru maka ya, ndị ọzọ enyewo ohere ka iwe kpata nkewa n’etiti ha na ọgbakọ. Ma ọ bụrụ na anyị ga-akpapụ onwe anyị iche site ná nzukọ Jehova, a gaghị enwe ebe ọ bụla ọzọ a ga-aga maka nzọpụta na ezi ọṅụ. (Tụlee Jọn 6:66-69.) A pụrụ ịchọta ihe ọmụma na-enye aka banyere ihe ndị a n’isiokwu bụ́ “Ịnọgide n’Ịdị n’Otu Anyị nke Ndị Kraịst,” nke a na-achọta n’Ụlọ Nche nke August 15, 1988, peji nke 28-30.

(5) A ghaghị ichebe atụrụ site n’anụ ndị na-eri ibe ha. N’ụzọ a pụrụ iji tụnyere ya, ndị ikwu ma ọ bụ ndị ọrụ na-ekweghị ekwe pụrụ ịdị na-emegide ụfọdụ ma ọ bụ na-emenye ha egwu. A pụrụ ịwakpo iguzosi ike n’ezi ihe ha mgbe a rụgidere ha ibelata ozi ha na-ejere Chineke ma ọ bụ ịkwụsị ikere òkè n’ozi ndị Kraịst. Otú ọ dị, a na-ewusi ha ike mgbe e nyeere ha aka ịmata na a ga-atụ anya mmegide, ọ bụkwa n’ezie otu n’ime ihe ndị na-anwapụta na anyị bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. (Matiu 5:11, 12; 10:32-39; 24:9; 2 Timoti 3:12) Ọ pụrụ ịba uru igosipụta na ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi, ọ dịghị mgbe Jehova ga-ahapụ ha, ọ ga-enyeghachikwa ntachi obi ha ụgwọ ọrụ. (2 Ndị Kọrint 4:7-9; Jemes 1:2-4, 12; 1 Pita 5:8-10) Isiokwu ahụ a kpọrọ “Iji Ọṅụ Na-atachi Obi n’Agbanyeghị Nsogbu” n’Ụlọ Nche nke October 15, 1982, peji nke 16-22, na-enyekwu agbamume.

Ndị Na-azụ Atụrụ—Rụzuonụ Ibu Ọrụ Unu

Mkpa nke ìgwè atụrụ Chineke dị ọtụtụ, ezigbo nleru anya bụkwa ọrụ siri ike. Ya mere, ndị Kraịst na-azụ atụrụ aghaghị ịdị ọmịiko, nwee nchegbu n’ezie, nweekwa mmasị inye aka. Ndidi na nghọta dị mkpa. Ebe ndị ụfọdụ pụrụ inwe mkpa ndụmọdụ na okwu nduzi, ndị ọzọ na-erite uru karịsịa site n’agbamume. Nleta onwe onye ole na ole pụrụ izu n’ọnọdụ ụfọdụ, ebe a pụrụ ịchọ ọmụmụ Bible a na-enwe mgbe nile ná ndị ọzọ. N’ọnọdụ ọ bụla ihe mgbaru ọsọ bụ́ isi bụ inyefe nduzi ime mmụọ na-ewuli elu ma ọ bụ ndụmọdụ ịhụnanya nke ga-akwali onye ahụ ịmalite àgwà ọmụmụ ihe dị mma, ghọọ ma ọ bụ nọgide na-abịachi nzukọ ọgbakọ anya, ma na-ekeresi òkè ike n’ozi ndị Kraịst. Ndị a bụ ụzọ ndị bụ́ isi isi nyere ndị kwere ekwe ibe anyị aka ma nyere ha aka imeghe ụzọ maka mmụọ nsọ Jehova ịdị na-erugharị na-enweghị ihe mgbochi ọ bụla.

Ndị ọzụzụ atụrụ na-enye ụdị nkwado ahụ na-eje ozi bara uru nke ukwuu maka ìgwè atụrụ Chineke. (Lee Ụlọ Nche nke July 15, 1986, peji nke 23-27.) Ìgwè atụrụ ahụ na-enwe ekele dị ukwuu maka ihe ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ na-eme. Mgbe ọ natasịrị enyemaka dị otú ahụ, otu onye isi ezinụlọ kwuru, sị: ‘Mgbe anyị nọworo n’eziokwu ahụ ruo 22 afọ, ịhụ ihe onwunwe n’anya dọbara anyị n’ụwa. Ọtụtụ mgbe anyị chọrọ ịga nzukọ, ma ọ na-eyi nnọọ ka ọ bụ na anyị apụghị. Anyị ekwekọghị n’ezie n’usoro ihe Setan, ya mere anyị koro n’elu, nọpụ iche. Nke a mere ka anyị nwee obi nkoropụ na ịda mbà n’obi. Okwu agbamume dị anyị mkpa. Mgbe otu okenye letara anyị, anyị ji ọṅụ nabata ndokwa nke ọmụmụ Bible n’ebe obibi anyị. Ugbu a anyị nile alọghachiwo ná nzukọ Jehova dị nchebe. Apụghị m ịkọwa obi ụtọ m nwere!’

E nwere ihe mere a ga-eji ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu mgbe a tụteghachiri ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom na-akpafu akpafu ma ọ bụ nwee nkụda mmụọ, meekwa ka ha maliteghachi ọrụ. (Luk 15:4-7) A na-emezu nzube Jehova n’ebe ndị ya nọ mgbe e jikọrọ ha ọnụ ‘dị ka ìgwè atụrụ n’ebe ịta nri ya.’ (Maịka 2:12) N’ebe udo a dị nchebe, ha ‘na-achọta izu ike nye mkpụrụ obi ha’ site n’enyemaka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, Jisọs Kraịst. (Matiu 11:28-30) Ìgwè atụrụ zuru ụwa ọnụ nke dị n’otu na-enweta nduzi, nkasi obi, na nchebe tinyere ụba nke nri ime mmụọ.

Taa, site n’ọrụ ọzụzụ atụrụ a, Jehova na-ahụ na a na-arụ ọrụ ịhụnanya nke kwekọrọ ná nkwa ochie ya bụ́: “M ga-achọkwa ìgwè ewu na atụrụ nke m, chọpụta ha. . . . M ga-anapụtakwa ha n’ebe nile ha gbasara . . . Ezi ihe ọzụzụ atụrụ ka m ga-eji zụọ ha . . . Nke furu efu ka m ga-achọ, . . . ọkpụkpụ a gbajiri agbaji ka m ga-ekezikwa, nke ahụ ya na-adịghị ike ka m ga-emekwa ka ọ dị ike.” (Ezikiel 34:11-16) Lee ihe nkasi obi e nwere n’ịmara na Jehova bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị!—Abụ Ọma 23:1-4.

N’ihi ndokwa ndị Chineke mere maka ịzụ ìgwè atụrụ Chineke, dị ka ndị na-ejere Jehova ozi anyị pụrụ ikere òkè n’okwu mmetụta Devid, onye sịrị: “N’udo ka m ga-eji otu mgbe ahụ dinaa ala, rahụ ụra: n’ihi na gị onwe gị, Jehova, nanị gị, na-eme ka m biri ná ntụkwasị obi.” (Abụ Ọma 4:8) Ee, ndị Jehova na-anọ ná ntụkwasị obi ná nlekọta ịhụnanya ya, ha na-enwekwa ekele na ndị okenye bụ́ ndị Kraịst ji ọmịiko na-azụ ìgwè atụrụ nta ahụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20, 21]

Potter’s Complete Bible Encyclopedia

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya