Ụkpụrụ Ka Ọ̀ Bụ Iwu Ewu—Olee Nke Na-eduzi Gị?
NORIHITO nke nọ na prịamarị nke isii na-ekere òkè n’otu ihe omume egwuregwu. Na mberede, otu mkpebi chere ya ihu. A chọrọ ka ụmụ akwụkwọ nile kere òkè n’otu ememe ịhụ mba n’anya. Ò kwesịrị isonyere ụmụ akwụkwọ ibe ya n’ihe omume nke a yiri ihe a na-eme oge nile?
Norihito amụtawo site na Bible na ọ dị njọ isonye n’ihe omume ofufe ọ bụla nye chi ọ bụla ọzọ nke na-abụghị Jehova. (Ọpụpụ 20:4, 5; Matiu 4:10) Ọ makwaara na ndị Kraịst kwesịrị ịnọpụ iche n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile nke ụwa. (Daniel 3:1-30; Jọn 17:16) Ya mere ọ bụ ezie na ụmụ akwụkwọ ibe ya gbara ya ume isonye, o ji obi ike na nkwanye ùgwù guzosie ike ná mkpebi ya. Gịnị ka ị gaara emeworị n’ọnọdụ yiri nke ahụ?
Ọchịchọ nke Isonyere Ndị Ibe
Akwụkwọ Nsọ na-egosi na Chineke kere ụmụ mmadụ ịbụ ndị ha na ibe ha na-emekọrịta, iso ibe ha na-adị ná mma, na inweta ọṅụ n’imekọ ihe ọnụ. Ọ bụ ihe a na-ahụ ná ndụ mmadụ ịchọ ịnọnyere ndị ọgbọ ya, ịbụ onye a nabatara, isonyere ndị ibe. Mmetụta dị otú ahụ na-eme ka ndụ dị ụtọ karị ma na-akpata ịnọ n’udo na ịdị n’otu ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ.—Jenesis 2:18; Abụ Ọma 133:1; 1 Pita 3:8.
A na-egosipụta ọchịchọ ebumpụta ụwa nke isonyere ndị ibe ná mmesi ike a na-emesi nkwekọrịta nke a na-ahụ n’ọdịnala ụfọdụ ọbụna n’oge a. Dị ka ihe atụ, a na-azụlite ụmụaka ndị Japan n’oge ha dị ntakịrị ịmara na ikwekọ n’ụkpụrụ nile nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ. Ọdịbendị ha na-akụziri ha na otu n’ime ibu ọrụ kasị ukwuu ha nwere bụ ikwekọ n’ógbè ha. “O yikarịrị ka ndị Japan ga na-emekọ ihe n’ìgwè karịa ndị Ọdịda Anyanwụ Ụwa,” ka Edwin Reischauer kwuru, onye bụbu onye nnọchianya United States na Japan nakwa onye na-ewetu anya ala ịghọta àgwà ndị Japan. O kwukwara, sị: “N’ebe ndị Ọdịda Anyanwụ Ụwa pụrụ ma ọ dịghị ihe ọzọ igosipụta omume nnwere onwe na ihe onwe onye, ihe ka ọtụtụ ná ndị Japan ga-enwe nnọọ afọ ojuju ịdị ka ibe ha n’uwe oyiyi, omume, ụzọ ibi ndụ, na ọbụna iche echiche ha n’ikwekọ n’ụkpụrụ nke ìgwè ha.” Otú ọ dị, ọchịchọ nke mmadụ ịdị ka ibe ya abụghị nanị na Japan ka a na-ahụ ya. O zuru ụwa nile.
Nrụgide nke Ịdị Ka Ibe
Ọ bụ ezie na o kwesịrị ekwesị mmadụ ime ike ya nile n’iso ndị ọzọ dị ná mma, e nwere ihe ize ndụ dị n’isonyere ibe n’ìsì na-eme ihe na-ewu ewu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe na-ewu ewu n’etiti ìgwè mmadụ na-emegidekarị ihe Chineke na-anakwere. “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” ka Bible na-agwa anyị. (1 Jọn 5:19) N’ụzọ aghụghọ Setan na-eji ụzọ ọ bụla ọ maara na-eme ihe—ịhụ ihe onwunwe n’anya, ajọ omume, ịkpọasị agbụrụ, oké ịnụ ọkụ n’obi okpukpe, ịhụ mba n’anya, na ihe ndị ọzọ—iji kpalie ọha mmadụ na ịdọpụ ha n’ebe Chineke nọ. Ikwekọ n’omume ndị dị otú ahụ gaje, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, itinye mmadụ n’ọnọdụ na-emegide Jehova Chineke na nzube ya nile. Nke ahụ mere e ji dụọ ndị Kraịst ọdụ, sị: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa ya ezi ụtọ nke zukwara okè.”—Ndị Rom 12:2.
N’ibi n’usoro ihe nke a, ndị Kraịst nọ n’okpuru nrụgide mgbe nile ime ihe kwekọrọ n’ihe na-ewu ewu. Ndị ntorobịa karịsịa nọ n’ihe ize ndụ n’akụkụ nke a. Ọchịchọ nke ịdị na ime ka ụmụ akwụkwọ ibe ha siri ike nke ukwuu. Ọ na-ewe ezi obi ike n’aka ha iji kọwaara ndị ọgbọ ha ihe mere na ha adịghị ekere òkè n’ihe omume ụfọdụ. Otú ọ dị, ịghara ikwupụta okwu pụrụ ịpụta ọdachi ime mmụọ nye ha.—Ilu 24:1, 19, 20.
Ndị toworo eto na-echekwa nrụgide dị otú ahụ ihu n’ebe ha na-arụ ọrụ. A pụrụ ịtụ anya ka ha kere òkè n’ihe omume mkpakọrịta ụfọdụ n’oge a gbasara ọrụ ma ọ bụ n’ezumike ụfọdụ. Ịjụ na ha agaghị eme otú ahụ pụrụ ime ka ha yie ndị na-anọpụ iche na ndị isi ike, na-ewepụta ọnọdụ ihe isi ike n’ụlọ ọrụ. Ụfọdụ pụrụ ịnọ ná nrụgide nke itinye ogologo hour n’ọrụ ma ọrụ gbasaa nanị n’ihi na ndị ọzọ na-eme otú ahụ, ọ bụkwa ihe a na-atụ anya ya n’aka ha. Ikwere n’ihe ndị dị otú ahụ ga-abụ ihe na-emebi ọnọdụ ime mmụọ nye ha tinyekwara igbochi ha ka ha ghara ịrụzu ibu ọrụ ha ndị ọzọ.—1 Ndị Kọrint 15:33; 1 Timoti 6:6-8.
Nrụgide nke ịdị ka ibe na-adị ọbụna n’ebe na-abụghị ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ụlọ ọrụ. Onye Kraịst bụ́ nne kọrọ na n’otu oge ọ hapụrụ inye nwa ya ịdọ aka ná ntị, ọ bụ ezie na ọ dị mkpa nke ukwuu, nanị n’ihi na o chere na ndị nne nwanyị ndị ọzọ nọ ya agaghị anabata nke ahụ.—Ilu 29:15, 17.
Ìgwè Mmadụ Pụrụ Ihie Ụzọ
Bible na-enye ọtụtụ ndụmọdụ doro anya nke ọma mgbe a bịara n’ihe banyere isoro ìgwè mmadụ. Dị ka ihe atụ, a gwara mba Israel, sị: “Esola ọtụtụ mmadụ n’azụ baa n’ihe ọjọọ dị iche iche: agbakwala àmà banyere iseokwu ka i wee wezụga onwe gị iso ọtụtụ mmadụ n’azụ iwezụga ikpe.” (Ọpụpụ 23:2; tụlee Ndị Rom 6:16.) Ọ bụghị mgbe nile ka a gbasoro ndụmọdụ nke a. N’otu mgbe, ná mkpirikpi oge mgbe ha hapụsịrị Ijipt, mgbe Mosis na-anọghị ya, ụfọdụ ndị kpaliri Erọn na ndị obodo ha ime nwa ehi ọlaedo na ife ya ofufe ‘n’ememe Jehova.’ Ndị ahụ riri oriri ma ṅụọ mmanya, meekwa onwe ha obi ụtọ n’abụ na egwú ọgbụgba ka ha na-achụ àjà nye nwa ehi ọlaedo ahụ. N’ihi omume ikpere arụsị nke a, nke rụrụ arụ, e gburu ihe dị ka 3,000 ndị ndú ha. Ma Jehova tikwara ọtụtụ ndị ọzọ ihe otiti maka ha ịgbaso ìgwè mmadụ ahụ n’echeghị echiche.—Ọpụpụ 32:1-35.
Ihe atụ ọzọ nke isoro ìgwè mmadụ mee ihe ọjọọ weere ọnọdụ na narị afọ mbụ n’ihe metụtara ọnwụ Jisọs Kraịst. N’ịbụ ndị a gbara ume site n’aka ndị ndú okpukpe nwere ekworo, ọtụtụ n’ime ndị ahụ sonyere n’ịkpọ òkù maka ogbugbu Jisọs. (Mak 15:11) Mgbe Pita gosipụtara ajọ mmehie ha na Pentikọst mgbe Jisọs bilitesịrị n’ọnwụ ma rịgoo n’eluigwe, ọtụtụ bụ ndị ‘a dụrụ n’ime obi,’ ha wee ghọta ihe ha meworo n’ịgbaso ìgwè mmadụ.—Ọrụ 2:36, 37.
Ụkpụrụ Bible Ka Mma
Dị ka ihe ndekọ ndị a na-egosi n’ụzọ doro, ịgbaso ihe na-ewu ewu n’ìsì pụrụ ịrụpụta ihe ndị dị njọ. Lee ka o si ka mma ịgbaso Bible ma kwere ka ụkpụrụ ya nile bụrụ ihe nduzi ná ndụ anyị! “Dị ka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otú a ka ụzọ m nile dị elu karịa ụzọ nile unu, ọ bụkwa otú a ka echiche m nile dị elu karịa echiche nile unu,” ka Jehova kwuru. (Aịsaịa 55:9) N’ihe ndị metụtara omume ọma na mmekọrịta ụmụ mmadụ—n’ezie, ná mkpebi nile nke ndụ—e gosipụtawo ọtụtụ mgbe na ịgbaso ụzọ nile nke Jehova dị mma nke ukwuu karịa ịgbaso ihe na-ewu ewu. Ọ bụ isi ihe dị n’ibi ndụ obi ụtọ na ahụ ike karị.
Were, dị ka ihe atụ, ahụmahụ nke Kazuya. Ọ bụ ezie na ọ mụwo Bible ruo oge ụfọdụ, ọ nọgidere na-agbaso ụzọ ndị na-ewu ewu—na-agbalị ịba ọgaranya na inwe ihe ịga nke ọma. Mgbalị ya nile ime ihe ga-atọ ndị isi ya ụtọ na ịbụ onye ndị ọrụ ibe ya na-akpọ aha ọma dujere ọtụtụ mgbe na ya ime mkpapụ ịṅụ mmanya ruo mgbe ọ gafere etiti abalị. Ọ ghọrọ onye oké ọchịchọ, onye na-adịghị edili ihe, onye na-ewekarị iwe. N’oge na-adịghị anya, ụzọ ndụ ya nke gabigara ókè dugara n’ahụ mkpọnwụ, nke mere ka otu akụkụ ahụ ya kpọnwụọ. Ka ahụ na-adị ya mma n’ebe o dina n’àkwà ụlọ ọgwụ, o nwere oge iji tụgharịa uche n’ihe ọ mụtaworo site na Bible nakwa ụzọ o si na-ebi ndụ ya. O kpebiri na oge eruwo mgbe ọ ga-amalite itinye ihe ọ mụtaworo n’ọrụ. O tinyere akwụkwọ arụkwaghịm ịhapụ ọkwá maneja ya wee gbanwee ndị mkpakọrịta ya. O tinyesikwara mgbalị ike iyikwasị ọdịdị onye Kraịst ma gbanwee echiche ya banyere ihe onwunwe. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, ihe ndị na-amasị ya gbanwere, ahụ ike ya kakwara mma. N’ikpeazụ, ọ raara ndụ ya nye Jehova, e wee mee ya baptism.
Iji mee nke ọma n’ịgbaso ụzọ nke na-adịghị ewu ewu, mmadụ aghaghị ịmara ụkpụrụ ndị o metụtara ma kweta n’ụzọ zuru ezu na ha ziri ezi. Ahụmahụ nke Masaru na-egosi na nke a bụ eziokwu. Mgbe ọ nọ na klasị nke isii, n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, ndị klasị ya họpụtara ya iso zọọ ọkwá maka onye isi oche nke kansụl ụmụ akwụkwọ. Ọ bụụrụ ya ihe ihere icheta na n’ihi aghọtachaghị ụkpụrụ Bible ndị o metụtara, o nweghị ike ịkọwara ndị klasị ya ihe mere na ya apụghị ịzọ ọkwá ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ụjọ nke ọ na-atụ mmadụ emewo ka ọ ghara ikpughe na ya bụ onye Kraịst. Nanị ihe ọ pụrụ ime bụ ihulata isi ya ala ma jiri anya mmiri na-ekwu, sị, “Apụghị m ime ya.”
Ahụmahụ nke a dị ilu mere ka o mee nnyocha ịmara ihe mere na onye Kraịst adịghị etinye aka n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Tụlee Jọn 6:15.) E mesịa, mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ kọleji mmalite, ọnọdụ yiri nke ahụ bilitere. Otú ọ dị, n’oge a ọ dị nkwadebe iji ihe ido anya kọwaara onye nkụzi ya ọnọdụ ya. Onye nkụzi ahụ nakweere nkọwa ya, dịkwa ka ọtụtụ n’ime ndị klasị ya mere bụ́ ndị jụrụ ya ajụjụ banyere nkwenkwe ya ndị dabeere na Bible.
Mgbe Mmadụ Nile Ga-eme Ihe Ziri Ezi
N’ime ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ n’okpuru ọchịchị Kraịst, ihe na-ewu ewu a ga-eme ga-abụ ime ihe ziri ezi. Ruo mgbe ahụ, anyị aghaghị ịnọ na nche megide mkpali nke ime ihe kwekọrọ n’ihe na-ewu ewu. Anyị pụrụ inweta agbamume site ná ndụmọdụ Pọl bụ́: “Ebe anyị nwere oké ìgwè ndịàmà dị otú a ndị gbara anyị gburugburu dị ka ìgwè ojii, ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, ya na mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.”—Ndị Hibru 12:1.
Mgbe ihe iseokwu na ihe ịma aka na-abịara gị, gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-eji n’ihi ụjọ nke mmadụ mee ihe nke na-ewu ewu? Ka ị̀ ga-agakwuru Okwu Chineke, bụ́ Bible, ma gbasoo ụkpụrụ ya nile? Ime nke ikpeazụ ahụ agaghị nanị abụ ihe abamuru nye gị ugbu a kamakwa ọ ga-enye gị olileanya nke iso ná ndị ahụ “ji okwukwe na ogologo ntachi obi na-eketa nkwa ahụ.”—Ndị Hibru 6:12.