Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 10/15 p. 17-22
  • Ịhụnanya (Agape)—Ihe Ọ Na-abụghị na Ihe Ọ Bụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịhụnanya (Agape)—Ihe Ọ Na-abụghị na Ihe Ọ Bụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Ịhụnanya Na-abụghị
  • Ihe Ndị Ọzọ Ịhụnanya Na-abụghị
  • Ihe Ndị Ịhụnanya Bụ
  • ‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Ịhụnanya’
    Bịaruo Jehova Nso
  • “Nke Kachasị n’Ihe Ndị A Bụ Ịhụnanya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Bụrụ Onye Ịhụnanya Na-ewuli Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ịhụnanya Bụ Àgwà Bara Ezigbo Uru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 10/15 p. 17-22

Ịhụnanya (Agape)—Ihe Ọ Na-abụghị na Ihe Ọ Bụ

“Nyezuokwanụ . . . ịhụnanya n’ime ịhụnanya ụmụnna unu.”—2 PITA 1:5, 7.

1. (a) Àgwà dị aṅaa ka Bible na-enye ọkwá kasị elu? (b) Okwu Grik anọ ndị dị aṅaa ka a na-asụgharịkarị ịbụ “ịhụnanya,” oleekwa nke a na-ezo aka na ya na 1 Jọn 4:8?

Ọ BỤRỤ na ọ dị otu àgwà ma ọ bụ omume ọma nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, nyere ọkwá kasị elu, ọ bụ ịhụnanya. Na Grik, bụ́ asụsụ mbụ e ji dee Akwụkwọ Nsọ Ndị Kraịst, e nwere okwu anọ a na-asụgharịkarị ịbụ “ịhụnanya.” Ịhụnanya nke anyị nwere mmasị na ya ugbu a abụghị nke eʹros (bụ́ okwu a na-adịghị ahụ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst), bụ́ nke dabeere ná ndọrọ mmekọahụ; ọ bụghịkwa nke stor·geʹ, bụ́ mmetụta nke dabeere ná mmekọrịta si n’ọbara; ọ bụghịkwa phi·liʹa, bụ́ ịhụnanya ọbụbụenyi na-ekpo ọkụ nke dabeere ná nkwanyerịta ùgwù, nke a tụleworo n’isiokwu bu ụzọ. Kama, ọ bụ a·gaʹpe—ịhụnanya nke dabeere n’ụkpụrụ, nke a pụrụ ikwu na ọ pụtakwara achọghị ọdịmma onwe onye nanị, ịhụnanya nke Jọn onyeozi zoro aka na ya mgbe ọ sịrị: “Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:8.

2. Olee ihe e kwuworo n’ụzọ ziri ezi banyere ịhụnanya (a·gaʹpe)?

2 Banyere ịhụnanya (a·gaʹpe) nke a, Professor William Barclay n’akwụkwọ ya bụ́ New Testament Words na-asị: “Agapē bụ ihe na-esite n’uche: ọ bụghị nanị mmetụta nke na-adịghị esi n’obi anyị ebilite [dị ka ọ pụrụ ịbụ eziokwu banyere phi·liʹa]; ọ bụ ụkpụrụ nke anyị leziri anya jiri na-adị ndụ. Agapē bụ kpọmkwem ihe na-esite n’ọchịchọ. Ọ bụ inwe mmeri, na imezu ihe. Ọ dịbeghị onye siteworo n’obi ya hụ ndị iro ya n’anya. Mmadụ ịhụ ndị iro ya n’anya bụ inwe mmeri nke mkpali echiche na mmetụta anyị nile sitere n’obi. Agapē nke a . . . bụ n’ezie ikike nke inwe ịhụnanya maka ndị ị na-apụghị ịhụ n’anya, inwe ịhụnanya maka ndị anyị na-enweghị mmasị n’ebe ha nọ.”

3. Olee ịdị mkpa Jisọs Kraịst na Pọl tụkwasịrị n’ịhụnanya?

3 Ee, n’ime ihe ndị ahụ na-egosi na ofufe dị ọcha nke Jehova Chineke dị iche n’ebe ụdị ofufe ndị ọzọ nile dị bụ otú o si na-egosi ịdị mkpa nke ụdị ịhụnanya nke a. N’ụzọ ziri ezi Jisọs Kraịst kwupụtara iwu abụọ ndị kasị ukwuu: “Nke mbụ bụ, . . . ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum. Nke abụọ bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị. Ọ dịghị ihe ọzọ e nyere n’iwu nke dịkarịrị ndị a.” (Mak 12:29-31) Pọl onyeozi gosikwara ịdị mkpa ịhụnanya nke a n’otu ụzọ ahụ n’isi nke 13 nke 1 Ndị Kọrint. Mgbe o mesịrị ka ọ pụta ìhè na ịhụnanya bụ àgwà dị oké mkpa nke nọ n’ọkwá mbụ, o kwubiri site n’ịsị: “Ma ugbu a ka okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a, na-anọgide; ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya.” (1 Ndị Kọrint 13:13) Jisọs kwuru n’ụzọ ziri ezi na ịhụnanya ga-abụ akara e ji amata ndị na-eso ụzọ ya.—Jọn 13:35.

Ihe Ndị Ịhụnanya Na-abụghị

4. Akụkụ ole na-ezighị ezi na akụkụ ole ziri ezi nke ịhụnanya ka Pọl na-ehota ná 1 Ndị Kọrint 13:4-8?

4 E mewo ka okwu ahụ pụta ìhè nke bụ na ọ dị mfe ikwu ihe ịhụnanya na-abụghị karịa ikwu ihe ọ bụ. E nwere eziokwu ụfọdụ dị na nke ahụ, n’ihi na Pọl onyeozi n’isiakwụkwọ ya banyere ịhụnanya, 1 Ndị Kọrint 13, n’amaokwu nke 4 ruo 8, na-ehota ihe itoolu ndị ịhụnanya na-abụghị na ihe asaa ndị ọ bụ.

5. Olee ụzọ e si akọwa “ekworo,” oleekwa ụzọ e si jiri ya mee ihe n’echiche ziri ezi n’Akwụkwọ Nsọ?

5 Ihe mbụ Pọl sịrị na ịhụnanya abụghị bụ na ọ ‘dịghị ekwo ekworo.’ Nke ahụ chọrọ obere nkọwa n’ihi na e nwere akụkụ ndị ziri ezi na ndị na-ezighị ezi nke ekworo. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa “ekworo” dị ka “anabataghị ịma aka” na dị ka “ịchọ nraranye a na-akpaghịrị ókè.” Otú a, Mosis kwupụtara n’Ọpụpụ 34:14, sị: “Ị gaghị akpọ isiala nye chi ọzọ: n’ihi na Jehova, nke Onye Ekworo bụ aha ya, Chineke ekworo ka ọ bụ.” N’Ọpụpụ 20:5, Jehova na-asị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo.” N’otu ụzọ ahụ, Pọl onyeozi dere, sị: “Eji m ekworo Chineke na-ekworo unu.”—2 Ndị Kọrint 11:2.

6. Ihe atụ Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa na-egosi ihe mere na ịhụnanya adịghị ekwo ekworo?

6 Otú ọ dị, n’ozuzu ya, “ekworo” nwere aha ọjọọ, bụ́ ihe mere e ji depụta ya n’etiti ọrụ nile nke anụ ahụ ná Ndị Galetia 5:20. Ee, ekworo dị otú ahụ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ọ na-akwalitekwa ịkpọasị, ịkpọasị na-emegidekwa ịhụnanya. Ekworo mere ka Ken kpọọ Ebel asị ruo n’ókè nke igbu ya, o mekwara ka ụmụnne iri Josef otu nna ji ha na ya kpọọ ya asị ruo n’ókè nke ịchọ iwepụ ndụ ya. Ịhụnanya adịghị eji ekworo enwere ndị ọzọ anya ụfụ maka ihe onwunwe ma ọ bụ ọdịmma ha, dị ka Eze Ehab ji ekworo nweere Nebot anya ụfụ maka ubi vine ya.—1 Ndị Eze 21:1-19.

7. (a) Olee otu ihe merenụ nke na-egosi na Jehova adịghị enwe obi ụtọ banyere ịnya isi? (b) N’ihi gịnị ka ịhụnanya na-adịghị eji anya isi ọbụna n’echeghị echiche?

7 Pọl gara n’ihu ịgwa anyị na ịhụnanya “adịghị anya isi.” Ịnya isi na-ekpughe enweghị ịhụnanya, n’ihi na ọ na-eme ka mmadụ dobe onwe ya n’ọnọdụ dị elu karịa nke ndị ọzọ. Jehova adịghị ele ndị na-anya isi anya ọma, dị ka a pụrụ ịhụ site n’ụzọ o si wedaa Eze Nebukadneza ala mgbe ọ nyara isi. (Daniel 4:30-35) Ịnya isi na-abụkarị nke a na-eme n’echeghị echiche n’ihi mmadụ inwebiga obi ụtọ ókè banyere ihe ndị o mepụtara ma ọ bụ ihe onwunwe ya. Ụfọdụ pụrụ inwe ọchịchọ itu ọnụ banyere ọganihu ha n’ozi ndị Kraịst. Ndị ọzọ yiri onye okenye ahụ nke ọ na-ahụ àhụ̀ ịkpọ ndị enyi ya na fon ịkọrọ ha na ya zụtara otu ụgbọ ala ọhụrụ nke ọnụ ahịa ya chọrọ iru $50,000. Ihe nile dị otú ahụ bụ enweghị ịhụnanya n’ihi na ọ na-egosipụta onye ahụ na-anya isi dị ka onye dị elu karịa ndị na-ege ya ntị.

8. (a) Gịnị bụ àgwà Jehova n’ebe ndị ahụ na-afụli onwe ha elu nọ? (b) N’ihi gịnị ka ịhụnanya na-adịghị eji akpa àgwà otú ahụ?

8 Mgbe ahụ a gwara anyị na ịhụnanya ‘adịghị afụli onwe ya elu.’ Onye na-afụli onwe ya elu, ma ọ bụ onye mpako, na-eji enweghị ịhụnanya na-ebuli onwe ya elu karịa ndị ọzọ. Amamihe adịghị n’echiche uche dị otú ahụ ma ọlị n’ihi na “Chineke na-edo onwe ya imegide ndị mpako, ma ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.” (Jemes 4:6) Ịhụnanya na-eme kpọmkwem ihe megidere nke ahụ; ọ na-ewere ndị ọzọ dị ka ndị dị elu karị. Pọl dere ná Ndị Filipaị 2:2, 3, sị: “Meenụ ka ọṅụ m jupụta, ka unu wee tụkwasị uche unu n’otu ihe ahụ, nweekwa otu ịhụnanya ahụ, na-enwekọ otu mkpụrụ obi, na-enwe otu uche; unu emela ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma.” Echiche uche dị otú ahụ na-eme ka ndị ọzọ nwee ntụsara ahụ, ebe onye mpako n’ihi ịkpa iche iche, na-eme ka ndị ọzọ ghara inwe ntụsara ahụ.

9. N’ihi gịnị ka ịhụnanya na-adịghị eji eme ihe na-adịghị mma n’anya?

9 Pọl gara n’ihu ikwu na ịhụnanya ‘adịghị eme ihe na-adịghị mma n’anya.’ Akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa “adịghị mma n’anya” dị ka “ihe jọgburu onwe ya ma ọ bụ rụọ arụ n’ụzọ omume ma ọ bụ ụkpụrụ omume.” Onye na-akpa àgwà na-adịghị mma n’anya (na-eji enweghị ịhụnanya) na-eleda mmetụta nke ndị ọzọ anya. Ọtụtụ nsụgharị Bible na-asụgharị okwu Grik ahụ dị ka “inye mkparị.” Onye dị otú ahụ na-emebi ihe e lere anya na o ziri ezi ma dịkwa mma. N’ezie, nchebara echiche ịhụnanya maka ndị ọzọ ga-apụta izere ihe nile na-eweta mkparị ma ọ bụ na-adịghị mma n’anya, ihe ndị na-akpasu iwe, nweekwa ike ọbụna ịnwụ ibubo n’ahụ.

Ihe Ndị Ọzọ Ịhụnanya Na-abụghị

10. N’ụzọ dị aṅaa ka ịhụnanya na-adịghị eji achọ ihe nke aka ya?

10 A gara n’ihu ịgwa anyị na ịhụnanya ‘adịghị achọ ihe nke aka ya,’ ya bụ, mgbe e nwere okwu metụtara ọdịmma onwe anyị na nke ndị ọzọ. Onyeozi ahụ kwuru n’ebe ọzọ, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla kpọrọ ahụ onwe ya asị mgbe ọ bụla; kama ọ na-azụ ya na-elezikwa ya anya nke ọma.” (Ndị Efesọs 5:29) Otú ọ dị, mgbe ọdịmma anyị na ọdịmma nke onye ọzọ na-azọ ụzọ, ma e nweghịkwa ụkpụrụ Bible ndị ọzọ o metụtara, anyị kwesịrị ime dị ka Abraham mesoro Lọt, jiri ịhụnanya kwere ka onye nke ọzọ buru ụzọ họrọ.—Genesis 13:8-11.

11. Na ịhụnanya adịghị ewe oké iwe pụtara gịnị?

11 Ịhụnanya adịghịkwa ewe iwe ọsọ ọsọ. Ya mere Pọl na-agwa anyị na “oké iwe adịghị ewe” ịhụnanya. Obere ihe adịghị akpasu ya iwe. Ọ na-enwe njide onwe onye. Ndị bụ di na nwunye karịsịa kwesịrị iji ndụmọdụ nke a kpọrọ ihe nke ukwuu site n’ịnọ na nche megide ime ka olu ha na-arị elu n’enweghị ndidi ma ọ bụ ịgwa onwe ha okwu n’olu na-ada oké ụda. E nwere ọnọdụ mgbe ọ na-adị mfe iwe iwe, bụ́ nke mere Pọl ji chee na ọ dị mkpa ịdụ Timoti ọdụ, sị: “Ohu nke Onyenwe anyị aghaghị ịbụ onye na-adịghị alụ ọgụ, kama ọ ghaghị ịdị nwayọọ n’ebe mmadụ nile nọ, ọ ghaghịkwa ịbụ onye nwere ike izi ihe, onye na-anagide ihe ọjọọ”—ee, ọ dịghị ewe oké iwe—“n’ịdị nwayọọ na-adọ ndị na-edo onwe ha imegide ya aka ná ntị.”—2 Timoti 2:24, 25.

12. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ịhụnanya na-adịghị eji agụkọ mmejọ? (b) N’ihi gịnị ka amamihe na-ejighị dị n’ịgụkọ mmejọ?

12 N’ịga n’ihu n’ihe ndị ịhụnanya na-abụghị, Pọl dụrụ ọdụ, sị: ‘Ịhụnanya adịghị agụ ihe ọjọọ e mere ya.’ Nke ahụ apụtaghị na ịhụnanya adịghị achọpụta mmejọ. Jisọs gosiri ụzọ anyị ga-esi dozie okwu mgbe e mejọworo anyị n’ụzọ dị njọ. (Matiu 18:15-17) Ma ịhụnanya adịghị ekwe ka anyị nọgide na-ewe iwe, na-ebu iwe n’obi. Ịghara ịgụkọ mmejọ pụtara ịgbaghara na ichezọ ya ozugbo e doziworo okwu ahụ n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ. Ee, emekpala onwe gị ahụ ma ọ bụ wetara onwe gị nhụjuanya site n’ịtụgharị uche n’ebe e mejọrọ gị, na-agụkọ mmejọ!

13. Gịnị ka ọ pụtara ịṅụrị ọṅụ n’ime ajọ omume, n’ihi gịnịkwa ka ịhụnanya na-adịghị eji eme otú ahụ?

13 Ọzọkwa, a gwara anyị na ịhụnanya ‘adịghị aṅụrị ọṅụ n’ime ajọ omume.’ Ụwa na-aṅụrị ọṅụ n’ime ajọ omume, dị ka a pụrụ ịhụ site n’iwu ewu nke akwụkwọ ọgụgụ, ihe nkiri, ihe omume TV ndị na-egosi ime ihe ike na ihe mkpali mmekọahụ. Nṅụrị ọṅụ nile dị otú ahụ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, enweghị nsọpụrụ maka ụkpụrụ ezi omume Chineke ma ọ bụ ọdịmma nke ndị ọzọ. Nṅụrị ọṅụ nile dị otú ahụ nke na-achọ ọdịmma onwe onye nanị bụ ịkụ mkpụrụ n’ụzọ anụ ahụ, mgbe oge rukwara ọ ga-aghọrọ mkpụrụ nke mmerụ site n’anụ ahụ.—Ndị Galetia 6:8.

14. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo n’obi ike na ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla?

14 Ugbu a ihe ikpeazụ nke ịhụnanya na-adịghị eme: “Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” Otu ihe mere bụ na ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla ma ọ bụ gwụsịa n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya, ọ bụkwa “Eze nke mgbe nile.” (1 Timoti 1:17) Ná Ndị Rom 8:38, 39, a na-emesi anyị obi ike na ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ agaghị ada mgbe ọ bụla: “E mewo ka m kwenye, na ọnwụ, ma ọ bụ ndụ, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ịbụisi dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị ugbu a, ma ọ bụ ihe gaje ịdị, ma ọ bụ ike dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị elu, ma ọ bụ ihe dị omimi, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke, agaghị apụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke, nke dị n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.” Ọzọ, ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla n’ihi na ọ dịghị mgbe ihe na-akọ ya. Ịhụnanya na-anagide ọnọdụ ọ bụla, ihe ịma aka ọ bụla.

Ihe Ndị Ịhụnanya Bụ

15. N’ihi gịnị ka Pọl ji buru ụzọ depụta ogologo ntachi obi n’ime akụkụ ndị ziri ezi nke ịhụnanya?

15 N’ịbịa ugbu a n’akụkụ ziri ezi, ihe ndị ịhụnanya bụ, Pọl na-amalite, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi.” E kwuwo na a pụghị inwe ihe ọ bụla dị ka mkpakọrịta ndị Kraịst ma e nweghị ogologo ntachi obi, ya bụ, ejighị ndidi na-anagiderịta ibe anyị. Otú ahụ ka ọ dị n’ihi na anyị nile ezughị okè, ezughị okè na mmehie anyị na-etinyekwa ndị ọzọ n’ule. Ka a sịkwa ihe mere Pọl onyeozi ji buru ụzọ depụta akụkụ nke a dị ka ihe ịhụnanya bụ!

16. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị òtù ezinụlọ pụrụ isi gosi ibe ha obi ọma?

16 Pọl na-ekwu na ịhụnanya bụkwa “obi ọma.” Ya bụ, ịhụnanya bụ ihe na-enye aka, ihe na-echebara ndị ọzọ echiche, na-eburu ha n’obi. Obi ọma na-egosipụta onwe ya n’oké ihe nakwa obere ihe. Onye Sameria ahụ nke bụ onye agbata obi na-egosi obi ọma n’ezie n’ebe nwoke ahụ ndị abalị dị egwu wakporo n’ụzọ nọ. (Luk 10:30-37) Ịhụnanya na-enwe obi ụtọ n’ịsị “biko.” Ịsị, “Bụnye m bredị ahụ” bụ inye iwu. Ibu ụzọ kwuo “biko” na-eme ka ọ bụrụ arịrịọ. Ndị bụ di na-enwe obi ọma n’ebe nwunye ha nọ mgbe ha ṅara ntị ná ndụmọdụ ahụ dị na 1 Pita 3:7: “Ndị bụ di, otú ahụ, soonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị, dị ka unu na ha bụkwa ndị na-eketakọ amara nke bụ ndụ; ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” Ndị bụ nwunye na-enwe obi ọma n’ebe di ha nọ mgbe ha gosiri ha “nsọpụrụ dị omimi.” (Ndị Efesọs 5:33, NW) Ndị bụ nna na-enwe obi ọma n’ebe ụmụ ha nọ mgbe ha gbasoro ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Efesọs 6:4: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”

17. Olee ụzọ abụọ ịhụnanya na-esi aṅụrị ọṅụ n’ime eziokwu?

17 Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ n’ime ajọ omume kama “ọ na-eso eziokwu ṅụrịkọọ ọṅụ.” Ịhụnanya na eziokwu na-agakọ ụkwụ na ụkwụ—Chineke bụ ịhụnanya, n’otu oge ahụkwa, ọ bụ “Chineke nke eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) Ịhụnanya na-aṅụrị ọṅụ n’ịhụ ka eziokwu nwere mmeri ma na-ekpughe okwu ụgha; nke a so na-akpata oké mmụba ahụ na-ewere ọnọdụ n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-efe Jehova ofufe taa. Otú ọ dị, ebe e nwere ọdịiche dị n’etiti eziokwu na ajọ omume, echiche dị na ya pụkwara ịbụ na ịhụnanya na-aṅụrị ọṅụ n’ezi omume. Ịhụnanya na-aṅụrị ọṅụ ná mmeri nke ezi omume, dị ka e nyere ndị na-efe Jehova ofufe iwu ime n’oge Babilọn Ukwu ahụ dara.—Mkpughe 18:20.

18. N’echiche dị aṅaa ka ịhụnanya na-anagide ihe nile?

18 Pọl na-agwakwa anyị na ịhụnanya “na-anagide ihe nile.” Dị ka Kingdom Interlinear na-egosi, echiche dị na nke ahụ bụ na ịhụnanya na-ekpuchigide ihe nile. Ọ dịghị ‘ebo ebubo ụgha’ megide nwanne ya, dị ka ndị ajọ omume na-enwe ọchịchọ ime. (Abụ Ọma 50:20; Ilu 10:12; 17:9) Ee, echiche dị na nke a bụ otu ihe ahụ dị na 1 Pita 4:8: “Ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” Otú ọ dị, ịnọgidesi ike n’ihe na-eme ka mmadụ ghara ikpuchi ajọ mmehie megide Jehova nakwa megide ọgbakọ ndị Kraịst.

19. N’ụzọ dị aṅaa ka ịhụnanya na-ekwere ihe nile?

19 Ịhụnanya “na-ekwere ihe nile.” Ịhụnanya na-eme ihe ziri ezi, ọ bụghị ihe na-ezighị ezi. Nke a apụtaghị na ịhụnanya na-ekwere ihe ọ bụla n’ajụghị ase. Ọ naghị adị ngwa ikwere okwu mkpali. Ma ka mmadụ wee nwee ike inwe okwukwe na Chineke, mmadụ aghaghị inwe ọchịchọ ikwere. Ya mere ịhụnanya adịghị arụ ụka, na-eme nkatọ iberibe. Ọ dịghị eguzogide ikwere dị ka onye na-ekweghị na Chineke na-eme, bụ́ onye na-eji echeghị echiche na-ekwu na e nweghị Chineke, ọ dịghịkwa ka onye na-amaghị Chineke, bụ́ onye na-eji echeghị echiche na-ekwu na ọ gaghị ekwe nnọọ omume ịmara ebe anyị si bịa, ihe mere anyị ji nọrọ n’ebe a, na ihe ọdịnihu ga-adị ka ya. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike n’ihe banyere ihe ndị a nile. Ịhụnanya dịkwa njikere ikwere n’ihi na ọ na-atụkwasị obi, ọ bụghị ịdị na-enyo ihe enyo n’ụzọ iberibe.

20. Olee ụzọ e si jikọta ịhụnanya na olileanya?

20 Pọl onyeozi gara n’ihu imesi anyị obi ike na ịhụnanya “na-ele anya ihe nile.” Ebe ịhụnanya bụ ihe ziri ezi, ọ bụghị ihe na-ezighị ezi, o nwere olileanya siri ike n’ihe nile e kwere nkwa ha n’Okwu Chineke. A na-agwa anyị, sị: “Onye na-arụ ọrụ ubi kwesịrị ịrụ ọrụ ubi n’olileanya, onye na-azọcha ọka kwesịkwara ịzọcha n’olileanya na ọ ga-eketa.” (1 Ndị Kọrint 9:10) Ọbụna dị ka ịhụnanya na-atụkwasị obi, ọ na-enwekwa olileanya, na-enwe olileanya mgbe nile maka ihe kasị mma.

21. Mmesi obi ike dị aṅaa nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ka e nwere na ịhụnanya na-atachi obi?

21 N’ikpeazụ, a na-emesi anyị obi ike na ịhụnanya “na-enwe ntachi obi n’ihe nile.” Ọ na-enwe ike ime otú ahụ n’ihi ihe Pọl onyeozi na-agwa anyị ná 1 Ndị Kọrint 10:13: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide: ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karịa nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” Ịhụnanya ga-eme ka anyị na-eṅomi ọtụtụ ihe atụ dị n’Akwụkwọ Nsọ nke ndị ohu Chineke bụ́ ndị tachiworo obi, nke onye bụ isi n’ime ha bụ Jisọs Kraịst, dị ka a na-echetara anyị ná Ndị Hibru 12:2, 3.

22. Dị ka ụmụ nke Chineke, àgwà dị aṅaa dị n’ọkwá kasị elu ka anyị na-aghaghị ịnọgide na-enwe nchegbu igosipụta?

22 N’ezie, ịhụnanya (a·gaʹpe) bụ àgwà nwere ọkwá kasị elu nke anyị dị ka ndị Kraịst, Ndịàmà Jehova, kwesịrị ịzụlite, ma n’ihe banyere ihe ọ na-abụghị ma banyere ihe ọ bụ. Dị ka ụmụ nke Chineke, ka anyị nọgide na-enwe nchegbu banyere igosipụta mkpụrụ nke a nke mmụọ Chineke. Ime otú ahụ bụ ịdị ka Chineke, n’ihi na, cheta, “Chineke bụ ịhụnanya.”

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee ụzọ Jisọs Kraịst na Pọl si gosi ọkwá kasị elu nke ịhụnanya?

◻ Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo n’echiche dị aṅaa?

◻ Olee ụzọ ịhụnanya na-esi ‘anagide ihe nile’?

◻ N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla?

◻ N’ụzọ abụọ dị aṅaa ka ịhụnanya na-aṅụrị ọṅụ n’ime eziokwu?

[Igbe dị na peeji nke 21]

ỊHỤNANYA (AGAPE)

Ihe Ọ Na-abụghị Ihe Ọ Bụ

1. Ekworo 1. Ogologo ntachi obi

2. Adịghị anya isi 2. Obi ọma

3. Adịghị afụli onwe ya elu 3. Na-aṅụrị ọnụ n’ime eziokwu

4. Eme ihe na-adịghị mma n’anya 4. Na-anagide ihe nile

5. Achọ ihe nke aka ya 5. Na-ekwere ihe nile

6. Ewe oké iwe 6. Na-ele anya ihe nile

7. Agụkọ ihe e mejọrọ ya 7. Na-atachi obi n’ihe nile

8. Aṅụrị ọṅụ n’ime ajọ omume

9. Adịghị ada mgbe ọ bụla

[Foto dị na peeji nke 18]

Jehova wedara Nebukadneza ala maka ịnya isi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya