Ikpughe Ihe Omimi Nke Aha Ahụ Kasị Ukwuu
Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị na ma Koran ndị Alakụba na Bible ndị Kraịst na-ezo aka n’aha ahụ kasị ukwuu. Ntụle nke a na-akọwa ihe aha ahụ kasị ukwuu pụtara na ịdị mkpa ya. Ọ na-egosikwa ụzọ aha ahụ si emetụta ihe nile a kpọrọ mmadụ na ọdịnihu anyị n’elu ala ebe a.
ỌTỤTỤ nde ndị ikom na ndị inyom adịwo ndụ ma nwụọ n’ụwa nke a. Aha ihe ka ọtụtụ n’ime ha esorowo ha nwụọ, e chezọwokwa ncheta ha. Ma ụfọdụ aha ndị dị ukwuu—dị ka Avicenna, Edison, Pasteur, Beethoven, Gandhi, na Newton—ka dị ndụ. Aha ndị a nwere njikọ n’ebe ihe ndị nwe ha rụzuru, chọpụta ma mepụta.
Otú ọ dị, e nwere aha nke karịrị aha nile ọzọ. Ihe nile dị ebube n’ime eluigwe na ụwa dum n’oge gara aga na ugbu a nwere njikọ n’ebe ọ dị. Ee, olileanya ihe a kpọrọ mmadụ maka ogologo ndụ na nke obi ụtọ nwere njikọ n’ebe aha nke a dị!
Ọtụtụ ndị achọwo ịmara aha nke a. Ha achọwo ya ma jụọ ajụjụ banyere ya, ma ha achọtabeghị ya. Nye ha ọ nọgidewo na-abụ ihe omimi. N’ezie, ọ dịghị onye pụrụ ịchọpụta aha nke a ọ gwụlakwa ma Onye Nwe ya o kpughere ya nye ya. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, e kpughewo ihe omimi nke aha nke a na-enweghị atụ. Chineke n’onwe ya emewo nke a ka ọ ga-abụ na ndị kwere na ya ga-amara banyere ya. O kpughere aha ya nye Adam, e mesịa nye Abraham, nye Mosis, na nye ndị ohu Ya ndị ọzọ nke oge ochie.
Ịchọ Aha ahụ Kasị Ukwuu
Koran na-akọ banyere otu onye “nke maara Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ miri emi.” (27:40) N’ịkọwa amaokwu nke a, otu akwụkwọ nkọwa ihe a maara dị ka Tafsīr Jalālayn na-ekwu, sị: “Asaf nwa Barkhiyā bụ onye ezi omume. Ọ maara aha kasị ukwuu nke Chineke, mgbe ọ bụlakwa ọ kpọkuru ya, a na-aza ya.” Nke a na-echetara anyị banyere Esaf onye so dee Bible, bụ́ onye kwuru n’Abụ Ọma 83:18, sị: “Ka ha wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, nanị gị, bụ Onye Kachasị Ihe Nile Elu n’elu ụwa nile.”
Na Koran 17:2, anyị na-agụ, sị: “Anyị nyere Mosis Akwụkwọ Nsọ wee mee ka ha bụụrụ ndị Israel ihe nduzi.” N’ime Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ, Mosis gwara Chineke, sị: “Mgbe mụ onwe m na-abịakwute ụmụ Israel, sị ha, Chineke nke nna unu hà ezitewo m n’ebe unu nọ; mgbe ha ga-asịkwa m, Gịnị bụ aha ya? ọ̀ bụ gịnị ka m ga-asị ha?” Chineke zara Mosis site n’ịsị: “Otú a ka ị ga-asị ụmụ Israel, Jehova, bụ́ Chineke nke nna unu hà, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb, o zitewo m n’ebe unu nọ: nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọpụpụ 3:13, 15.
N’oge ochie, ndị Israel maara aha ukwu nke a nke Chineke. Ọbụna na e jiri ya mee ihe dị ka akụkụ nke aha ha dị iche iche. Dị nnọọ ka mmadụ na-ahụ aha ahụ bụ Abdullah, nke pụtara “Ohu Chineke,” ndị Israel oge ochie nwere aha ahụ bụ́ Obadaịa, nke pụtara “Ohu Jehova.” Aha nne Mosis onye amụma bụ Jokebed, nke pụtara ma eleghị anya “Jehova Bụ Ebube.” Aha ahụ bụ Jọn pụtara “Jehova Adịwo Amara.” Aha Elaịja onye amụma pụtakwara “Chineke M Bụ Jehova.”
Ndị amụma maara aha ukwu nke a ma site ná nkwanye ùgwù miri emi jiri ya mee ihe. A na-achọta ya ihe karịrị 7,000 ugbo n’ime Akwụkwọ Nsọ. Jisọs Kraịst, nwa Meri, kọwapụtara ya mgbe o kwuru n’ekpere ya nye Chineke, sị: “Emere m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i nyere m site n’ụwa . . . Emekwara m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka ha mara ya; ka ịhụnanya i ji hụ m wee dị n’ime ha, mụ onwe m kwa n’ime ha.” (Jọn 17:6, 26) Ná nkọwa ya a ma ama banyere Koran, Bayḍāwī kọwara Koran 2:87, na-ekwu na Jisọs ‘na-akpọlitebu ndị nwụrụ anwụ site n’aha kasị ukwuu nke Chineke.’
Mgbe ahụ gịnị weere ọnọdụ nke mere ka aha ahụ bụrụ ihe omimi? Gịnị ka aha ahụ nwere ime n’ihe banyere ọdịnihu nke onye ọ bụla n’ime anyị?
Olee Otú Aha ahụ Si Ghọọ Ihe Omimi?
Ụfọdụ na-eche na “Jehova” n’asụsụ Hibru pụtara “Allah” (Chineke). Ma “Allah” na-ekwekọ n’okwu Hibru ahụ bụ́ ʼElo·himʹ, ihe karịrị otu nke e ji akọwa onye dị ebube nke okwu ahụ bụ ʼelohʹah (chi). Otu nkwenkwe ụgha bilitere n’etiti ndị Juu bụ́ nke gbochiri ha ịkpọpụta aha Chineke ahụ, bụ́ Jehova. N’ihi ya, mgbe ha na-agụ Akwụkwọ Nsọ ma hụ aha ahụ bụ Jehova, ọ ghọrọ omenala ha ikwu ʼAdho·naiʹ, nke pụtara “Onyenwe Anyị.” N’ebe ụfọdụ, ha gbanwere ọbụna ihe odide Hibru mbụ site na “Jehova” gaa na ʼAdho·naiʹ.
Ndị ndú nke Krisendọm gbasoro otu ụzọ ahụ. Ha ji “Chineke” (“Allah” n’asụsụ Arabic) na “Onyenwe anyị” dochie aha ahụ bụ́ Jehova. Nke ahụ nyere aka ná mbilite nke ozizi ụgha nke Atọ n’Ime Otu, bụ́ nke na-enweghị ihe ndabere ọ bụla n’ime Akwụkwọ Nsọ. N’ihi nke a, ọtụtụ nde mmadụ na-ehie ụzọ site n’ife Jisọs na mmụọ nsọ ma na-ewere ha dị ka ndị ha na Chineke hà.a
N’ihi ya, ndị ndú nke okpukpe ndị Juu na nke Krisendọm ka ụta dịịrị maka enweghị ihe ọmụma gbasazuru ebe nile banyere aha ahụ kasị ukwuu. Ma Chineke buru amụma, sị: “M ga-edokwa aha ukwu m nsọ, . . . mba nile ga-amakwa na mụ onwe m bụ Jehova.” Ee, Jehova ga-eme ka mba nile mara aha ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụghị nanị Chineke nke ndị Juu ma ọ bụ nke otu mba ọ bụla ọzọ ma ọ bụ ndị. Jehova bụ Chineke nke ihe nile a kpọrọ mmadụ.—Ezikiel 36:23; Jenesis 22:18; Abụ Ọma 145:21; Malakaị 1:11.
Aha ahụ Kasị Ukwuu na Ọdịnihu Anyị
Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.” (Ndị Rom 10:13) Nzọpụta anyị n’ụbọchị ikpe ga-enwe ihe jikọtara ya na anyị ịmara aha Chineke. Ịmara aha ya na-agụnye ịmara àgwà, ọrụ, na nzube ya dị iche iche, na ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya nile dị elu. Dị ka ihe atụ, Abraham matara aha Chineke ma kpọkuo aha ahụ. Dị ka ihe si na ya pụta, o nwetara obi ụtọ n’ezi mmekọrịta dị n’etiti ya na Chineke, gosi okwukwe n’ebe ọ nọ, dabere na ya, ma rubere ya isi. Otú a, Abraham ghọrọ enyi Chineke. N’otu aka ahụ, ịmara aha Chineke na-eme ka a dọta anyị nso n’ebe ọ nọ ma na-enyere anyị aka isoro ya wulite mmekọrịta onwe onye, na-ejidesi ịhụnanya ya ike.—Jenesis 12:8; Abụ Ọma 9:10; Ilu 18:10; Jemes 2:23.
N’ime Bible anyị na-agụ, sị: “Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha ya, akwụkwọ ncheta n’ihu ya.” (Malakaị 3:16) N’ihi gịnị ka anyị ga-eji ‘na-eche echiche banyere’ aha ahụ kasị ukwuu? N’ụzọ nkịtị aha ahụ bụ́ Jehova pụtara “Ọ Na-eme Ka Ihe Dị.” Nke a na-ekpughe Jehova dị ka Onye na-eme onwe ya ka ọ bụrụ Onye Mmezu nke nkwa ya nile. Ọ na-eme mgbe nile ka e mezuo nzube ya nile. Ọ bụ Chineke onye pụrụ ime ihe nile, nanị Onye Okike dịnụ, bụ́ onye nwere àgwà nile mara mma. Ọ dịghị otu mkpụrụ okwu ọ bụla nke pụrụ ịkọwazu ọdịdị dị nsọ nke Chineke. Ma Chineke họọrọ n’onwe ya aha kasị ukwuu—Jehova—ọ na-emekwa ka mmadụ cheta àgwà ya, na nzube ya nile.
N’ime Akwụkwọ Nsọ, Chineke na-agwa anyị banyere nzube ya dị iche iche n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ dị. Jehova Chineke kere mmadụ ịdị ndụ obi ụtọ ruo ebighị ebi n’ime Paradaịs. Uche ya maka ihe a kpọrọ mmadụ bụ na mmadụ nile kwesịrị imejupụta otu ezinụlọ, ndị dị n’otu n’ịhụnanya na udo. Chineke nke ịhụnanya ga-emezu nzube nke a n’ọdịnihu dị nso.—Matiu 24:3-14, 32-42; 1 Jọn 4:14-21.
Chineke na-akọwa ihe mere ihe a kpọrọ mmadụ ji na-ahụju anya ma na-egosi na nzọpụta kwere omume. (Mkpughe 21:4) N’Abụ Ọma 37:10, 11, anyị na-agụ, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Leekwa Koran 21:105.
Ee, a ga-eji aha ukwu Chineke mara ya. Mba nile ga-amakwa na ọ bụ Jehova. Lee ihe ùgwù dị ebube ọ bụ ịmara aha ahụ kasị ukwuu, ịgba àmà banyere ya, na ịrapagide na ya! N’ụzọ dị otú ahụ, a ga-emezu nzube obi ụtọ Chineke n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ: “N’ihi na ọ hụwo m n’anya sie ike, m ga-emekwa ka ọ gbapụta: m ga-eme ka ọ nọọ n’ebe dị elu, n’ihi na ọ mawo aha m. Ọ ga-akpọku m, m ga-azakwa ya. . . . Ụbọchị ndụ dị ogologo ka m ga-eji mee ka afọ ju ya, m ga-emekwa ka o lekwasị nzọpụta m anya.”—Abụ Ọma 91:14-16.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ihe nnwapụta nke na Atọ n’Ime Otu abụghị ozizi Bible, lee akwụkwọ nta ahụ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu? nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1989.
[Foto dị na peeji nke 5]
N’ọhịa ahụ na-ere ọkụ, Chineke kọwaara Mosis onwe ya dị ka ‘Jehova, Chineke nke Abraham’
[Ebe E Si Nweta Foto]
Mosis na Ọhịa ahụ Na-ere Ọkụ, site n’aka W. Thomas, Sr.