A Ga-emeri “Onye Iro Ikpeazụ”!
MGBE ị bụ nwata, ọ pụrụ ịbụ na ị na-atụ egwu ebe gbara ọchịchịrị. Akụkọ ihe ụjọ na ọbụna akụkọ ụfọdụ banyere ndị mmụọ pụrụ imewo ka i nwee oké nchekasị. Lee ka o si abụ ihe na-emesi obi ike mgbe nne ma ọ bụ nna gị hapụrụ oriọna ka ọ nọgide na-enwu ka ị na-agbalị ịrahụ ụra!
Ọnwụ n’otu aka ahụ na-emenye ọtụtụ ndị ụjọ. Ma, ọ bụghị iwu na ọ ga-adị otú ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi ihe ọnwụ bụ n’ezie.
Mata Onye Iro Gị
Eze Solomọn nwere amamihe nke Israel oge ochie kwupụtara, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Dị ka echiche nke a nke Chineke bụ́ nke a na-achọta n’ime Bible nke gị, si kwuo, ọnwụ bụ nanị ọdịiche e nwere maka ndụ. Ndị nwụrụ anwụ adịghị adị, ha amaghịkwa ihe.
N’izo aka n’ọnwụ n’ụzọ ihe atụ, Pọl onyeozi bụ́ onye Kraịst na-ede, sị: “Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ọgbụgba gị dị?” Gịnị bụ ihe ọgbụgba nke ọnwụ? Pọl na-asị: “Ihe ọgbụgba nke ọnwụ bụ mmehie.” (1 Ndị Kọrint 15:55, 56; Hosea 13:14) Mgbe ahụ, gịnị bụ mmalite nke ihe ọgbụgba a na-egbu egbu? N’ebe ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ, Pọl na-asị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Onyeozi ahụ ahapụghị ihe ịrụ ụka ọ bụla banyere onye “otu mmadụ” ahụ bụ mgbe ọ sịrị: “Ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam.” (1 Ndị Kọrint 15:22) Ee, site ná nnupụisi nke nna nna anyị mbụ, bụ́ Adam, anyị nile pụrụ ịnata ihe ọgbụgba nke ọnwụ.—Jenesis 3:1-19.
E nwee ezi ahụ ike na ezinụlọ na-ahụ n’anya na gburugburu ebe dị ụtọ, ọ dịghị onye n’ime anyị ga-ahọrọ ịnwụ. Otú ọ dị, dị ka Bible na-egosi, “mgbe na ihe ndapụta” pụrụ ịnapụ anyị ndụ. (Eklisiastis 9:11) N’ezie, anyị amaghị ihe ga-eme ndụ anyị echi. (Jemes 4:14) Otu ihe doro anya—anyị nile eketawo mmehie na ọnwụ. Ya mere, ọnwụ na-ede anyị ede ma na-awakwasị anyị dị ka onye iro.
Ịnagide Ọnwụ nke Onye A Hụrụ n’Anya
Ọnwụ na-abụ onye iro karịsịa mgbe ọ wakwasịrị onye a hụrụ n’anya. “Ọ ga-akara gị njọ,” ka otu nwanyị na-arịa ọrịa ga-eweta ọnwụ gwara di ya mgbe ọ na-eche banyere ọnwụ. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji kwuo nke ahụ? N’ihi na Bible na-asị: “Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya; n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị n’ala mmụọ [ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ], ebe gị onwe gị n’ala.” (Eklisiastis 9:10) Onye nwụrụ anwụ adịghị atakwa ahụhụ ọzọ. Ma ibu nke iru újú na-adakwasị ndị ikwu na ibe ka dị ndụ. Ọ̀ dị ihe a pụrụ ime banyere nhụjuanya dị otú a?
Peji dị iche iche nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, nwere ọtụtụ okwu nkasi obi. Dị ka ihe atụ, ịgụ na ịtụgharị uche n’abụ ọma ndị ahụ bụ n’ezie otu isi iyi nke okwu ngụgụ. N’ezie, ihe nkasi obi ka okwu ndị dị otú a bụ: “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, kwa ụbọchị ka Ọ na-eburu anyị ibu, bụ́ Chineke Nke nzọpụta anyị.”—Abụ Ọma 68:19.
Isi iyi ọzọ nke nkasi obi bụ ọgbakọ ndị Kraịst. Na narị afọ mbụ O.A., Pọl onyeozi dere, sị: “Na-asọpụrụ ndị inyom di ha nwụrụ, bụ́ ndị nọ n’ezie n’ọnọdụ ndị inyom di ha nwụrụ. Ma ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ [ndị nwere ike ilekọta ya n’ụzọ ihe onwunwe], ka ha buru ụzọ mụta ịsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị ezinụlọ nke aka ha, na inyeghachi ndị mụrụ ha ihe: n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke. Ka a ghara ide aha nwanyị ọ bụla n’akwụkwọ dị ka nwanyị di ya nwụrụ nke a ka agbaghị [iri afọ isii], onye bụworo nwunye nke otu di, onye a na-agbara ya ezi àmà n’ọrụ ọma; ọ bụrụ na ọ zụpụtawo ụmụ, ọ bụrụ na o lewo ndị ọbịa anya nke ọma, ọ bụrụ na ọ sawo ụkwụ ndị nsọ, ọ bụrụ na o gbowo mkpa ndị a na-akpagbu, ọ bụrụ na o sosiwo ezi ọrụ nile ọ bụla ike.” (1 Timoti 5:3, 4, 9, 10) Ndịàmà Jehova n’otu aka ahụ taa na-enyere ndị ibe ha kwere ekwe nọ n’ọnọdụ ahụ aka ma na-akasi ha obi.
Ọtụtụ mgbe nhazigharị kasịnụ nke onye mmadụ nwụnahụrụ gaje ime bụ nke mmetụta uche. “M hụrụ nwunye m n’anya nke ukwuu,” ka otu nwoke nwunye ya nwụrụ afọ abụọ tupu mgbe ahụ kwuru. “Nke a bụ ihe omume kasị mwute ná ndụ m, ọ na-esikwara m ike idi ya.” Onye nọworo n’alụmdi na nwunye ruo oge ụfọdụ ekerịtawo ndụ ya ná mmekọrịta kasị dị ịhụnanya nke ụmụ mmadụ. Mgbe di ma ọ bụ nwunye mmadụ nwụrụ, onye nke dị ndụ na-enwekarị mmetụta nke oké ihe ifunahụ ya. Ònye ka onye ahụ pụrụ ichigharịkwuru maka enyemaka?
N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ezi mkpakọrịta ndị Kraịst na-ewuli elu. “Ezi enyi na-ahụ n’anya mgbe nile, ọ bụkwa nwanne nke a na-amụ na mgbe e nwere ahụhụ,” ka otu ilu amamihe na-ekwu. (Ilu 17:17, NW) Nwoke nwunye ya nwụrụ ma ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ nwere mkpa maka enyemaka—ndị enyi na-enye ezi nkwado. Ndị enyi maara ihe na-agba onye ahụ na-eru újú ume ikwu okwu, ọbụna ma ọ bụrụ na ime otú ahụ ga-eweta anya mmiri. Ma eleghị anya onye Kraịst nwewororị ahụmahụ nke ihe mgbu na obi mgbu nke di ma ọ bụ nwunye ya ịnwụnahụ ya pụrụ inye aka n’ụzọ obi ọma. “Na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi,” ka Bible na-adụ ọdụ. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ma cheta na obi onye ha lụrụ na-eme ndị ikom nwunye ha nwụrụ na ndị inyom di ha nwụrụ. Ya mere, onye mmadụ nwụnahụrụ kwesịrị ịkọrọ ndị ọzọ obi ha nanị n’ọnọdụ ndị ga-enyere mmadụ nile aka ịnọgide n’omume dị ọcha.—1 Pita 2:12.
Ọgwụ kasị mma maka ihe mgbu ọnwụ na-akpata bụ ijigide ọrụ n’aka n’inyere ndị ọzọ aka—oké ihe ịma aka nye ndị kwere na ọ bụ ha bụ ndị nọ ná mkpa enyemaka! Nke a bụ ebe achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-arụ ọrụ. Imere ndị ọzọ ihe n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-enye aka ịchụfu obi ilu na iru újú, n’ihi na Jisọs kwuru, sị: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
Imeri Ọnwụ
Aṅụ ịgba mmadụ pụrụ ịfụ ụfụ nke ukwuu, ọbụna kpata ọnwụ. Otú ọ dị, ifopu ipi ahụhụ ahụ nke a gbanyere n’ime akpụkpọ ahụ ga-enyekarị aka ibelata ụfụ ya. Ma olee olileanya e nwere maka ahụ efe site n’ihe ọgbụgba nke ọnwụ?
Ka ọ kọwasịrị na mmehie bụ ihe ọgbụgba nke ọnwụ, Pọl tiri mkpu, sị: “Ekele dịrị Chineke, Onye na-enye anyị mmeri site n’aka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 15:57) Olee otú e si jikọọ imeri ọnwụ na Kraịst? Jisọs gosiri na ọ bụ otú a ka ọ dị mgbe o kwuru banyere onwe ya, sị: “Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi, ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Ee, maka ndị na-egosipụta okwukwe n’Ọkpara Chineke bụ́ Jisọs Kraịst, na àjà mgbapụta nke Jehova chụworo site na ya, ọnwụ nke e ketara site n’aka Adam agaghị akpata adịghị adị na-adịgide adịgide.—Jọn 3:16.
Ha bụ ihe na-agụgụ obi bụ́ okwu ndị a nke Jisọs: “Oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa; ndị mere ezi ihe ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ; ma ndị mere ihe na-adịghị mma ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”—Jọn 5:28, 29.
Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, onye amụma Chineke bụ́ Aịsaịa ebuwo amụma, sị: “O [Jehova Chineke] lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.” (Aịsaịa 25:8) Ọzọ, ná Mkpughe 21:4, Bible na-enye olileanya a magburu onwe ya: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” N’ịbụ ndị e wusiri ike site n’olileanya nke a nke Bible maka ndị dara n’ụra ọnwụ, ọ dịghị mkpa na ndị mmadụ nwụnahụrụ ‘ga-enwe mwute dị ka ọ na-ewute ndị fọdụrụnụ, ndị na-enweghị olileanya.’—1 Ndị Tesalọnaịka 4:13.
Nwaa iji anya nke uche hụ ihe Chineke kwadebeere ihe a kpọrọ mmadụ, dị ka Bible kpughere ya. ‘Oké mkpagbu’ ahụ na-eru nso pụtara mbibi maka ajọ usoro ihe dị ugbu a. (Mkpughe 7:14) Ndị na-ekpe okpukpe ụgha eruo ọgwụgwụ ha. Ndị anyaukwu bụ́ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị azụmahịa bụ́ ndị so akpata ụnwụ nri na ibu agha adịkwaghị. Jisọs Kraịst agaa n’ihu itinye Setan Ekwensu n’abyss, bụ́ onye kpataworo ọnwụ ọtụtụ mmadụ. Mgbe ahụ Kraịst amalite Ọchịchị Narị Afọ Iri ya, nke ọ ga-anọ n’ime ya tinye uru nke àjà mgbapụta n’ọrụ maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ndị nwụrụ anwụ alọghachi ná mbilite n’ọnwụ a na-ele anya ya, ìhè sitere n’Okwu Chineke a na-egbukepụ nke ukwuu nke na echiche nkwenkwe ụgha nile banyere ọnwụ, onye iro ihe a kpọrọ mmadụ, adịkwaghị. Ndị nile dị ndụ mgbe ahụ nwere ohere ịmụta ụzọ nile nke Chineke na ikwekọ n’ụkpụrụ ezi omume ya.—Ilu 4:18; Ọrụ 24:15; Ndị Hibru 2:14, 15; Mkpughe 18:4-8; 19:19-21; 20:1-3.
‘E mesịa, ọgwụgwụ,’ ka Pọl na-asị, ‘mgbe Kraịst Jisọs ga-arara alaeze ya nye n’aka Chineke, Onye bụkwa Nna. N’ihi na ọ ghaghị ịbụ eze, ruo mgbe Chineke ga-edebeworị ndị iro Ya nile n’okpuru ụkwụ Ya. Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.’ (1 Ndị Kọrint 15:24-26) Ọrụsị ọ bụla sitere ná mmehie Adam apụwo n’anya. Ule ikpeazụ ewere ọnọdụ, ndị hụrụ Chineke n’anya agabigakwa ya n’ikwesị ntụkwasị obi. (Mkpughe 20:4-10) N’ịbụ ndị e weghachiri n’izu okè, ụmụ mmadụ ndị a na-erube isi ga-adị ndụ, ọ bụghị nanị ọgụ afọ atọ na iri ma ọ bụ ọbụna maka ọgụ afọ ise na iri, kama ruo mgbe ebighị ebi. Lee aha onyinye ọ bụ site n’aka Chineke site n’Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya!—Ndị Rom 6:23.
Ya mere, mgbe ahụ, ogologo oge hà aṅaa ka ị pụrụ ịdị ndụ? Ogologo ndụ gị pụrụ ịgbatịrị ruo mgbe nile ebighị ebi. Ebe ị na-ebi ndụ na “mgbe ọgwụgwụ” nke ụwa a, ọ pụrụ ịbụ na ị gaghị anwụ anwụ ma ọlị. (Daniel 12:4; Jọn 11:25, 26; 17:3) I mee uche Chineke, ị pụrụ ịdịrị ndụ banye kpọmkwem n’ụwa ọhụrụ Chineke e kwere nkwa ya.—2 Pita 3:13.
Otú ọ dị, ọ bụrụ na i mewo okenye, ọ dị gị mkpa iji ezi uche tụlee ohere e nwere maka ịnwụ anwụ. N’ezie, olileanya mbilite n’ọnwụ na-eweta ọṅụ. Ma ị pụrụ inwe ijuanya banyere ụzọ Jehova ga-esi hazie ndụ ezinụlọ n’usoro ihe ọhụrụ ahụ. Ekwela ka ihe ndị dị otú ahụ na-echegbu gị, n’ihi na Jehova ga-ahụ maka obi ụtọ ebighị ebi nke ndị nọgidere ruo mgbe ebighị ebi na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya.
Ka “mgbe ikpeazụ” ndị a dị oké egwu nke ajọ usoro ihe Setan na-eru ọgwụgwụ ya, ekwela ka egwu nke ọnwụ napụ gị ihe ùgwù nke ijere Jehova ozi ugbu a. (2 Timoti 3:1) Ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’anya anwụnahụ gị, gụgụọ onwe gị site n’ịdịru nwa oge nke ike ya. (Mkpughe 20:13, 14) Tụkwasị obi n’olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ. Mgbe ahụ, ma è kwere ka ị banye n’ụwa ọhụrụ ahụ site n’ịlanarị oké mkpagbu ahụ ma ọ bụ site ná mbilite n’ọnwụ, jide n’aka nkwa ahụ nke na a gaje ime ka ọnwụ, bụ́ onye iro ikpeazụ, ghara ịdị irè.—Mkpughe 7:9, 14.
[Foto dị na peeji nke 5]
Ezi ndị mkpakọrịta bụ́ ndị Kraịst pụrụ iwulite onye mmadụ nwụnahụrụ elu n’ime mmụọ
[Foto dị na peeji nke 7]
Ijigide ọrụ n’aka n’inyere ndị ọzọ aka na-ebelata iru újú nke ọnwụ onye a hụrụ n’anya kpatara