Enweghị Echiche Ọ Bụla Nke Imebi Okwukwe!
AKA Jehova dịnyeere ndị mbụ na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. (Ọrụ 11:21) Site n’enyemaka Chineke, ha gbasoro ụzọ ziri ezi n’emebighị okwukwe ha. Ọ bụkwa ihe a maara nke ọma n’akụkọ ihe mere eme na ha nwetara mkpọrọmasị na oké mkpagbu.
Nguzosi ike n’ezi ihe nke ndị mbụ na-eso ụzọ Kraịst n’ikwesị ntụkwasị obi abụwo ihe e ji ama atụ. Ọbụna mgbe ọ ga-ata isi ha, ha jụrụ imebi okwukwe ha. Ma n’ihi gịnị ka e ji meso ha omume n’ụzọ obi ọjọọ otú a?
Ndị A Kpọrọ Asị n’Efu
Dị ka Jisọs, ezi ndị Kraịst ekereghị òkè ná nchụso na nkwenkwe dị iche iche nke ụwa nke a. (1 Jọn 4:4-6) Ọzọkwa, uto nke Iso Ụzọ Kraịst “agawo ngwa ngwa nke ukwuu, ọganihu ya adịwokwa ịrịba ama nke ukwuu, nke na ọ bụ ihe a na-apụghị izere ezere [iso ike ọchịchị onyeeze Rom] sukọọ isi n’ụzọ dị ụjọ,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Edmond de Pressensé rịbara ama.
N’otu mgbe Jisọs zoro aka n’onwe ya n’otu abụ amụma, na-asị: “Ha kpọrọ m asị n’efu.” (Jọn 15:25; Abụ Ọma 69:4) Tupu ọ gwa ndị na-eso ụzọ ya nke a, ọ dọwo ha aka ná ntị, sị: “Ohu adịghị aka onye nwe ya ukwuu. Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu.” (Jọn 15:20) Ọ gaghị adị mfe ịgbaso ijeụkwụ ya. Otu ihe kpatara ya bụ na ndị ndú okpukpe n’etiti ndị Juu ga-emeso ndị Juu na-eso ụzọ Jisọs dị ka ndị si n’okpukpe ndị Juu dapụ. Otú ọ dị, mgbe e kwuru ka ndị na-eso ụzọ Jisọs ghara ikwukwa banyere ya, ha jụrụ irube isi ma si otú ahụ mebie okwukwe ha.—Ọrụ 4:17-20; 5:27-32.
N’akaebe a gbara n’ihu Sanhedrin ndị Juu ngwa ngwa ka Pentikọst 33 O.A. gasịrị, e boro Stifen onye na-eso ụzọ ebubo na ọ “na-ekwu okwu na-ekwulu Mosis na Chineke.” Ọ bụ ezie na ebubo ndị ahụ bụ okpotokpo ụgha, e ji nkume tugbuo ya. N’ihi ya, “oké nsogbu wee pụta n’ụbọchị ahụ megide nzukọ Kraịst dị na Jerusalem; ha nile wee gbasasịa n’ala Judia na Sameria dum, ma ọ bụghị ndị ozi.” (Ọrụ 6:11, 13; 8:1) A tụrụ ọtụtụ mkpọrọ.
Ndị Juu ji “ịkpọasị kpụ ọkụ n’ọnụ” chụsoo ndị na-eso ụzọ Jisọs, ka akwụkwọ bụ́ Christianity and the Roman Empire na-ekwu. Ọbụna na ọtụtụ mgbe gọọmenti Rom aghaghị ime ihe iji chebe ndị Kraịst! Dị ka ihe atụ, ndị soja Rom napụtara Pọl onyeozi site n’aka ndị Juu kpebisiri ike igbu ya. (Ọrụ 21:26-36) Ka o sina dị, mmekọrịta dị n’etiti ndị Kraịst na ndị Rom nọgidere na-abụ nke na-akpata ahụ erughị ala.
Rom Emee Ka Ihe Siwanye Ike
Ihe dị ka afọ itoolu mgbe ọnwụ Stifen gasịrị, onye ọchịchị ndị Rom bụ́ Herod Agripa nke Mbụ mere ka e gbuo Jemes onyeozi iji nweta ihu ọma ndị Juu. (Ọrụ 12:1-3) N’oge ahụ, nkwenye n’ime Kraịst agbasaruwo na Rom. (Ọrụ 2:10) Na 64 O.A., ọkụ gbapịara akụkụ ka ukwuu nke obodo ahụ. Ajọ mkpagbu nke ndị Kraịst sochiri mgbe Nero boro ha ebubo maka ọdachi ahụ ná mgbalị ya ịbịanyụ àsị̀rị̀ a na-agba nke na ọ bụ ya kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ. Ọ̀ mụnyere obodo ahụ ọkụ iji nwee ihe ọ ga-ejide aka maka iwughachi ya n’ụzọ dị ebube karị ma jiri aha ya bagharịa ya aha bụ́ Neropolis? Ka nwunye ya bụ́ Poppaea, onye na-eso ụzọ ndị Juu nke a maara na ọ kpọrọ ndị Kraịst asị, ò nwere mmetụta ná mkpebi ya ibo ha ebubo? Ndị nchọpụta ejighị n’aka, ma mmetụta ya dị ụjọ.
Onye Rom na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Tacitus na-asị: “E jikọrọ ịkwa emo na ọnwụ; ka e yikwasịrị ha akpụkpọ anụ ọhịa, nkịta dọkasịrị [ndị Kraịst]; a kpọgidere ha n’elu obe; e mere ka ha na-enwu ọkụ, ka mgbe uhuruchi rutere, ha pụrụ ije ozi dị ka ìhè,” tọọchị e ji mmadụ mee iji nye ìhè n’ubi dị iche iche nke eze. Tacitus, onye na-enweghị mmasị ma ọlị n’ebe ndị Kraịst nọ, na-agbakwụnye: “Ọ bụ ezie na ikpe mara ha, kwesịkwa inweta ntaramahụhụ e ji ama atụ, ha kpaliri ọmịiko, dị ka ndị a na-ebibi, ọ bụghị maka ọdịmma ọha na eze, kama site n’obi ịta mmiri nke otu nwoke,” Nero.
Ọdịiche Ndị Doro Anya
Ọ bụ ezie na ibo ndị Kraịst ebubo ibibi Rom mezuru nzube Nero, ọ dịghị mgbe ọ machibidoro ha iwu ma ọ bụ kagbuo Iso Ụzọ Kraịst dị ka okpukpe n’ime Mba ahụ. Ya mere n’ihi gịnị ka ndị Rom ji gaa n’ihu ná mkpagbu ahụ? N’ihi na “ógbè nta dị iche iche nke ndị Kraịst na-enye ụwa ikpere arụsị ahụ nke ihe ụtọ na-emebi isi nsogbu site n’ime nsọ nsọ ha na ịdị ọcha ha,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant na-ekwu. Ọdịiche dị n’etiti Iso Ụzọ Kraịst na ịwụfu ọbara nke ịsọ mpi n’ịlụ ọgụ ntụrụndụ nke Rom apụghị nnọọ ịdị njọ karị. Ohere ndị Rom nwere ikpochapụ ndị Kraịst wee si otú a mejụọ akọ na uche nke ha magburu onwe ya nke na a gaghị ekwe ka ọ gafenahụ.
Dị ka ike ọchịchị ụwa, Rom yiri nke a na-apụghị imeri emeri. Ndị Rom kwenyere na otu ihe kpatara ịbụ dike n’agha ha bụ ofufe ha na-efe chi nile. N’ihi ya o siiri ha ike ịghọta ịdị iche nke nkwenye na nanị otu chi nke ndị Kraịst na ọjụjụ ọ jụrụ chi ọzọ nile, gụnyere ofufe nke onyeeze. Ọ bụghị ihe ijuanya na Rom lere Iso Ụzọ Kraịst anya dị ka ikike na-erichapụ kpọmkwem ntọala nke alaeze ukwu ahụ.
Ọnụ Ahịa nke Ịgba Àmà
Ná ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A., a chụlagara Jọn onyeozi n’agwaetiti Patmọs “n’ihi okwu Chineke na àmà Jisọs.” (Mkpughe 1:9) E kwenyere na ọ bụ onye ọchịchị alaeze ukwu Rom bụ́ Domitian kpatara nke a. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nrụgide a wụkwasịrị ndị na-eso ụzọ Jisọs, ka narị afọ ahụ na-agwụ, Iso Ụzọ Kraịst agbasaruwo n’Alaeze Ukwu nile nke Rom. Olee otú nke a si kwe omume? Akwụkwọ A History of the Early Church na-asị na Iso Ụzọ Kraịst bụ nke “ozi ya kwadoro.” Dị ka Jọn, ndị Kraịst mbụ a kpagburu agaghị emebi okwukwe ha kama ha ji ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-ekwu banyere Chineke, na-agbakwa àmà banyere Jisọs.—Ọrụ 20:20, 21; 2 Timoti 4:2.
Mkpagbu nke ndị Kraịst weere akụkụ ọhụrụ ka ọ na-erule 112 O.A., afọ abụọ mgbe Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu Trajan họpụtasịrị Pliny dị ka gọvanọ nke Bitinia (akụkụ ndida ebe ọdịda anyanwụ Turkey ugbu a). Ịchịisi e nweburu n’ebe ahụ esighị ike, na-akpata ọgba aghara. Ọ fọrọ nke nta ka ụlọ nsọ dị iche iche tọgbọ nkịtị, ahịa nri a na-enye anụ ndị e ji achụ àjà dakwara nke ukwuu. Ndị ahịa tara ịdị mfe nke ofufe ndị Kraịst ụta maka ya n’ihi na o nweghị ma ịchụ àjà anụmanụ ma arụsị n’ime ya.
Pliny rụsiri ọrụ ike iweghachi ofufe arụsị, ebe ndị Kraịst ji ndụ ha kwụọ ụgwọ n’ihi ịjụ iche mmanya na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu ihe ọkpụkpụ nke onye ọchịchị alaeze ukwu. E mesịa, ndị isi Rom kwekọrịtara na ndị Kraịst “bụ ndị dị mma n’omume, ma n’ụzọ na-enweghị nkọwa kpọọ omenala oge ochie ahụ nke okpukpe asị,” ka Professor Henry Chadwick na-ekwu. Ọ bụ ezie na ịbụ onye Kraịst nọgidere na-abụ ịda iwu na-eweta ọnwụ, ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs enweghị echiche ọ bụla nke imebi okwukwe ha.
Mkpọrọmasị sitekwara ná “mkpasu iwe a kpasuru n’ime ezinụlọ ndị ọgọ mmụọ site ná ntọghata nke ndị òtù ha n’otu n’otu,” ka Professor W. M. Ramsay na-asị. “E mere ka ndụ sie ike nke ukwuu n’etiti ọha mmadụ mgbe onye agbata obi mmadụ na-apụghị ikwenyekọ n’ọdịnala dịkarịsịrị nta n’ihe ndabere nke na o metụtara ịnakwere chi dị iche iche nke ikpere arụsị,” ka Dr. J. W. C. Wand na-asị. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ji lee ndị Kraịst mbụ anya dị ka ndị kpọrọ ihe a kpọrọ mmadụ asị ma ọ bụ were ha dị ka ndị na-ekwenyeghị na Chineke.
Uto Eweta Mkpagbu Ka Ukwu
Polycarp, onye a sịrị na Jọn onyeozi ziri ihe, ghọrọ onye okenye a na-akwanyere ùgwù n’obodo Smụana (Izmir ugbu a). N’ihi okwukwe ya a gbara ya ọkụ n’elu osisi na 155 O.A. Gọvanọ Rom na-achị otu ógbè buru ibu bụ́ Statius Quadratus kpọkọrọ ìgwè mmadụ. Ámá egwuregwu ahụ jupụtara ná ndị ọgọ mmụọ iwe ji bụ́ ndị ledara Polycarp gbara 86 afọ anya n’ihi ịgba ume ka a ghara ife chi ha dị iche iche ofufe, na ndị Juu na-anụbiga ọkụ n’obi ókè bụ́ ndị sitere n’obi ha kpakọta nkụ, ọ bụ ezie na ha gaje ime ya n’ụbọchị Izu Ike ukwu.
Ajọ ikuku nke mkpagbu kukwasịziri ndị Kraịst n’akụkụ nile nke ógbè Rom. N’okpuru Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Marcus Aurelius, a wụfuru ọbara ha nke ukwuu ọbụna karị. Ọ bụrụ na ha bụ ụmụ amaala Rom, ha na-anwụ site ná mma agha; ma há abụghị, anụ ọhịa na-egbu ha n’ogige ntụrụndụ. Gịnị bụ mpụ ha mere? Nanị ịbụ ndị Kraịst bụ́ ndị jụrụ imebi ma ọ bụ ịgọnarị okwukwe ha.
Obodo France nke oge a bụ́ Lyons si na colony Rom bụ́ Lugdunum topụta, bụ́ ebe ọchịchị bụ isi na nanị ogige ndị agha Rom nwere n’agbata Rom na Osimiri Rhine. Ka ọ na-erule 177 O.A., o nwere ógbè ndị Kraịst siri ike bụ́ nke ndị amaala bụ́ ndị ọgọ mmụọ ji iwe bilie imegide. Nke a malitere mgbe e wezụgara ndị Kraịst pụọ n’ebe ọha mmadụ na-anọ. Ìgwè ndị ọjọọ ahụ kpalitere ọgba aghara, mkpagbu sochikwara ya siri ike nke ukwuu nke na ọ dịghị onye Kraịst nwara ịpụta èzí. Gọvanọ Rom ahụ nyere iwu ka a chọta ndị Kraịst ma mee ka ha nwụọ.
Nkwụghachi Ụgwọ Ya
Ka ndị ozi Jisọs nwụsịrị, mmetụta njighachi azụ ha agabigakwa, ndapụ n’ezi ofufe malitere ibilite n’etiti ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:7) Ka ọ na-eru ọgwụgwụ nke narị afọ nke anọ O.A., Iso Ụzọ Kraịst dapụrụ n’ezi ofufe ghọrọ okpukpe Mba ahụ. Ka ọ na-eru mgbe ahụ, e merụwo ya, ọ dịkwa njikere imebi okwukwe ya na iyi ụwa—ihe Jisọs na ndị mbụ na-eso ụzọ ya na-adịghị mgbe ha mere. (Jọn 17:16) Otú ọ dị, ogologo oge tupu mgbe ahụ, e dezuwo Bible nke mmụọ nsọ kwadoro, ya na ndekọ ya nke okwukwe ndị Kraịst.
Nhụjuanya na ọnwụ nke ọtụtụ puku nke ndị Kraịst mbụ ọ̀ bụ n’efu? Ee e ma ọlị! N’enweghị echiche ọ bụla nke imebi okwukwe ha, ha ‘gosiri onwe ha ịbụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ, e nyekwara ha okpueze ahụ, bụ́ ndụ.’ (Mkpughe 2:10) Ndị na-ejere Jehova ozi ka na-enwetakwa okpomọkụ nke mkpagbu, ma okwukwe na ịnọgidesi ike n’ezi ihe nke ndị ibe ha kwere ekwe n’oge mbụ nọgidere na-abụ isi iyi nke oké agbamume nye ha. N’ihi ya, ndị Kraịst oge ugbu a adịghịkwa enwe echiche ọ bụla nke imebi okwukwe ha.
[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
Nero
Ihe oyiyi nke Rom onyeeze na-achị
Ebe ịchụàjà a raara nye ofufe Siza
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Nero: A natara The British Museum ikike
Museo della Civiltà Romana, Roma
[Foto dị na peeji nke 10]
Marcus Aurelius
[Ebe E Si Nweta Foto]
The Bettmann Archive