Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 11/15 p. 17-22
  • Nwee Obi Ike!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwee Obi Ike!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Obi Ike Iji Ṅomie Kraịst
  • Obi Ike Iji Nọgide Na-eme Nkwusa
  • Obi Ike Iji Guzo n’Akụkụ Jehova
  • Obi Ike n’Ezinụlọ Ndị Kewara Ekewa
  • Obi Ike Iji ‘Tọgbọ Olu Anyị’
  • Obi Ike Na-eweta Ọṅụ
  • Nọgide Na-enwe Obi Ike
  • “Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike Nke Ukwuu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • “Nwee Obi Ike . . . Meekwa Ihe”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • ‘Nwee Obi Ike, Nweekwa Ume!’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Nwee Obi Ike, Jehova Nọnyeere Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 11/15 p. 17-22

Nwee Obi Ike!

“Were obi ike sị, Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka.”—NDỊ HIBRU 13:6.

1. Nkwuwa okwu dị aṅaa ka ndị mụtara eziokwu Chineke na narị afọ mbụ O.A. gosipụtara?

Ọ BỤ narị afọ mbụ nke Oge Anyị. Mesaịa ahụ a nọworo na-eche eri mgbe abịawo. Ọ kụziworo ndị na-eso ụzọ ya ihe nke ọma, malitekwa ọrụ nkwusa dị oké mkpa. Ọ bụ oge ka ndị mmadụ nụ ozi ọma nke Alaeze Chineke. N’ihi ya, ndị ikom na ndị inyom mụtaworo eziokwu ahụ ji nkwuwa okwu zie ozi ahụ dị ebube.—Matiu 28:19, 20.

2. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji nwee mkpa maka obi ike taa?

2 E guzobeghị Alaeze ahụ n’ụbọchị ndị ahụ. Ma Onye Gaje Ịbụ Eze, Jisọs Kraịst, ebuwo amụma banyere ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya n’ọdịnihu n’ike Alaeze. A ga-aka ya akara site n’ihe ndị dị ka mburịta agha na-enweghị atụ, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, ala ọma jijiji, na nkwusa ozi ọma zuru ụwa ọnụ. (Matiu 24:3-14; Luk 21:10, 11) Dị ka Ndịàmà Jehova, obi ike dị anyị mkpa iji nagide ọnọdụ ndị a na mkpagbu anyị na-enweta. Ya mere ọ ga-aba uru ịtụle ihe ndekọ Bible banyere ndị nkwusa Alaeze nwere obi ike nke narị afọ mbụ O.A.

Obi Ike Iji Ṅomie Kraịst

3. Ònye na-enye ihe nlereanya kasị mma nke obi ike, gịnịkwa ka e kwuru banyere ya ná Ndị Hibru 12:1-3?

3 Jisọs Kraịst na-enye ihe nlereanya kasị mma nke obi ike. Mgbe o zosịrị aka ‘n’oké ìgwè ojii’ nke ndị àmà Jehova nwere obi ike tupu oge ndị Kraịst, Pọl onyeozi lekwasịrị anya na Jisọs site n’ịsị: “Ebe anyị nwere oké ìgwè ndị àmà dị otú a ndị gbara anyị gburugburu dị ka igwe ojii, ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, ya na mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, na-elegide Jisọs anya, bụ́ onye ndú na onye mmezu nke okwukwe anyị, Onye n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’elu osisi ịta ahụhụ, NW], na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke. N’ihi na, tụgharịanụ uche n’Onye ahụ Nke tachiworo obi ná nkwugide dị otú a, bụ́ nke ndị mmehie na-ekwugide onwe ha, ka ike ghara ịgwụ unu, unu wee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.”—Ndị Hibru 12:1-3.

4. Olee otú Jisọs si gosipụta obi ike mgbe Setan nwara ya?

4 Mgbe baptism ya na 40 ụbọchị nke ntụgharị uche, ekpere, na ibu ọnụ n’ọzara, gasịrị, Jisọs guzogidere Setan n’anya ike. Mgbe Ekwensu nwara ya ime ka nkume ghọọ achịcha, Jisọs jụrụ n’ihi na ọ dị njọ ịrụ ọrụ ebube iji mejuo ọchịchọ onwe onye. “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị,” ka Jisọs sịrị, “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” Mgbe Setan mara ya aka isi n’elu akụkụ ụlọ nsọ ahụ wụtuo, Jisọs jụrụ n’ihi na ọ ga-abụwo mmehie ịnwa Chineke ọnwụnwa ịnapụta ya n’ihe pụrụ ịbụ igbu onwe onye. “Ọzọkwa e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị,” ka Kraịst sịrị, “Anwala Onyenwe anyị Chineke gị.” Setan nyere ya alaeze nile nke ụwa ná mgbanwerịta maka otu ‘ịda n’ala kpọọ isi ala,’ ma Jisọs agaghị esi n’ezi ofufe dapụ wee kwado ihe ịma aka Ekwensu na ụmụ mmadụ agaghị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’okpuru ule. Ya mere Jisọs kwupụtara, sị: “Laba, Setan: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” Mgbe ahụ, Onye Ọnwụnwa ahụ “wee si n’ebe Ọ nọ pụọ ruo mgbe ọzọ.”—Matiu 4:1-11; Luk 4:13.

5. Gịnị pụrụ inyere anyị aka iguzogide ọnwụnwa?

5 Jisọs doro onwe ya n’okpuru Jehova, guzogidekwa Setan. Ọ bụrụ na anyị n’otu aka ahụ ‘edoo onwe anyị n’okpuru Chineke ma guzogide Ekwensu, ọ ga-agbapụ n’ebe anyị nọ.’ (Jemes 4:7) Dị ka Jisọs, anyị pụrụ iji obi ike guzogide ọnwụnwa ma ọ bụrụ na anyị etinye Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ, ma eleghị anya ọbụna na-ehota ya n’oge a na-anwa anyị ime ihe bụ mmehie. Ọ̀ pụrụ ikwe mee na anyị ga-adaba n’ọnwụnwa izu ohi ma ọ bụrụ na n’oge ahụ anyị agụghachiri onwe anyị iwu Chineke bụ́: “Ezula ohi”? Ọ̀ pụrụ ikwe mee ndị Kraịst abụọ ịdaba ná mmekọahụ rụrụ arụ ma ọ bụrụ na ọbụna otu n’ime ha ejiri obi ike hota okwu ndị bụ́: “Akwala iko”?—Ndị Rom 13:8-10; Ọpụpụ 20:14, 15.

6. Olee otú Jisọs si bụrụ onye ji obi ike merie ụwa?

6 Dị ka ndị Kraịst ụwa a kpọrọ asị, anyị pụrụ izere mmụọ na omume mmehie ya. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ụwa unu na-enwe mkpagbu: ma nweenụ obi ike; Mụ onwe m emeriwo ụwa.” (Jọn 16:33) O meriri ụwa site n’adịghị ka ya. Ihe nlereanya ya dị ka onye mmeri na ihe sitere n’ụzọ ya nke iguzosi ike n’ezi ihe pụrụ ime ka anyị jupụta n’obi ike iji ṅomie ya site n’ịdị na-anọpụ iche n’ụwa nke a, gharakwa ịbụ ndị o tetọrọ.—Jọn 17:16.

Obi Ike Iji Nọgide Na-eme Nkwusa

7, 8. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eme nkwusa n’agbanyeghị mkpagbu?

7 Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya dabeere na Chineke maka obi ike iji nọgide na-eme nkwusa n’agbanyeghị mkpagbu. Kraịst ji anya ike jezuo ozi ya n’agbanyeghị mkpagbu, mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịkwara, ndị na-eso ụzọ ya a kpagburu gakwara n’ihu ikwusa ozi ọma ahụ n’agbanyeghị na ndị ndú okpukpe ndị Juu nwara ịkwụsị ha. (Ọrụ 4:18-20; 5:29) Ndị ahụ na-eso ụzọ kpere ekpere, sị: “Onyenwe anyị, leekwa ịba mba ha anya: nyekwa ndị ohu Gị ike ka ha were nkwuwa okwu nile kwuo okwu Gị.” Gịnị mekwara? “Mgbe ha rịọsịrị arịrịọ, e wee mee ka ebe ha nọ ná nzukọ mee mkpatụ,” ka ihe ndekọ ahụ na-ekwu, “ha nile wee jupụta na Mmụọ Nsọ, wee were nkwuwa okwu na-ekwu okwu Chineke.”—Ọrụ 4:24-31.

8 Ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ taa na-adịghị anakwere ozi ọma ahụ, nkwuwa okwu na-adịkarị mkpa iji nọgide na-ekwusara ha ozi ọma. Karịsịa mgbe a na-akpagbu ha, ndị na-ejere Jehova ozi na-enwe mkpa obi ike Chineke nyere iji gbaa àmà zuru ezu. (Ọrụ 2:40; 20:24) Ya mere onye nkwusa Alaeze ahụ nwere obi ike bụ́ Pọl gwara onye ọrụ ibe ya bụ onye na-eto eto, nke nwere ahụmahụ dị nta karị, sị: “Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ; kama ọ bụ nke ike na ịhụnanya na ime ka uche zuo okè. Ya mere ka ihere àmà nke Onyenwe anyị, ma ọ bụ ihere nke mụ onye mkpọrọ Ya, ghara ime gị: kama soo ozi ọma Ya hụjukọọ anya dị ka ike nke Chineke si dị.” (2 Timoti 1:7, 8) Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka obi ike, anyị ga-enwe ike ịnọgide na-eme nkwusa, ọbụnakwa mkpagbu agaghị anapụ anyị ọṅụ anyị dị ka ndị nkwusa Alaeze.—Matiu 5:10-12.

Obi Ike Iji Guzo n’Akụkụ Jehova

9, 10. (a) Gịnị ka ndị Juu na ndị Jentaịl narị afọ mbụ mere iji bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst e mere baptism? (b) N’ihi gịnị ka o ji wee obi ike iji ghọọ onye Kraịst?

9 Ọtụtụ ndị Juu na ndị Jentaịl nke narị afọ mbụ ji obi ike gbakụta omenala ndị Akwụkwọ Nsọ n’akwadoghị azụ iji ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst e mere baptism. Ngwa ngwa Pentikọst 33 O.A. gasịrị, “ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs na-abakwa ụba na Jerusalem hie nne; oké ìgwè ndị nchụàjà na-aṅakwa okwukwe ahụ ntị.” (Ọrụ 6:7) Ndị Juu ndị ahụ nwere obi ike igbubi ihe jikọrọ ha n’okpukpe dị iche iche ma nakwere Jisọs dị ka Mesaịa.

10 Na-amalite na 36 O.A., ọtụtụ ndị Jentaịl ghọrọ ndị kwere ekwe. Mgbe Kọniliọs, ndị òtù ezinụlọ ya, na ndị Jentaịl ndị ọzọ nụrụ ozi ọma ahụ, ha nakweere ya ozugbo, nata mmụọ nsọ, e wee “mee ha baptism n’aha Jisọs Kraịst.” (Ọrụ 10:1-48) Na Filipaị onye Jentaịl na-eche ụlọ mkpọrọ na ezinụlọ ya nabatara Iso Ụzọ Kraịst ngwa ngwa, “e wee mee ya baptism, ya onwe ya na ndị ya nile.” (Ọrụ 16:25-34) A chọrọ obi ike iji were nzọụkwụ ndị dị otú ahụ n’ihi na ndị Kraịst bụ ìgwè dị nta nke ndị a na-akpagbu, ndị a na-enweghị mmasị na ha. Ha ka bụkwa otu ihe ahụ. Ma ọ bụrụ na ị rarabeghị onwe gị nye Chineke, e meekwa gị baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ̀ bụ na oge erubeghị ka iwere nzọụkwụ ndị a chọrọ obi ike?

Obi Ike n’Ezinụlọ Ndị Kewara Ekewa

11. Yunaịsi na Timoti nyere ihe nlereanya ọma dị aṅaa nke obi ike?

11 Yunaịsi na nwa ya bụ́ Timoti setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke okwukwe n’obi ike n’ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe. Ọ bụ ezie na Yunaịsi nwere di bụ onye ọgọ mmụọ, ọ kụziiri nwa ya nwoke “ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ” site na nwa ọhụrụ. (2 Timoti 3:14-17) Mgbe ọ ghọrọ onye Kraịst, o gosipụtara “okwukwe ihu abụọ na-adịghị ya.” (2 Timoti 1:5) O nwekwara obi ike inye Timoti ozizi ndị Kraịst ka ọ nọ na-akwanyere ịbụisi nke di ya na-ekweghị ekwe ùgwù. N’ezie, e nyeghachiri ụgwọ ọrụ maka okwukwe na obi ike ya mgbe a họọrọ nwa ya nwoke e ziri ihe nke ọma isonyere Pọl ná njem ozi ala ọzọ. Lee ka nke a pụrụ isi gbaa ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst ume bụ́ ndị na-achọta onwe ha n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ!

12. Ụdị onye dị aṅaa ka Timoti ghọrọ, oleekwa ndị na-anwapụta onwe ha ugbu a ịdị ka ya?

12 Ọ bụ ezie na Timoti biri n’ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe, o ji obi ike nakwere Iso Ụzọ Kraịst ma ghọọ onye mmụọ na-achị nke Pọl pụrụ ikwu banyere ya, sị: “Ana m ele anya n’ime Onyenwe anyị na m ga-ezigara unu [Ndị Filipaị] Timoti ọsọ ọsọ, ka mụ onwe m wee nweekwa obi ụtọ, mgbe m maara ọnọdụ unu. N’ihi na enweghị m onye ọ bụla nke mkpụrụ obi ya yiri nke ya, bụ́ onye ga-echegbu onwe ya banyere ọnọdụ unu n’ezie. . . . Unu maara ọnwụnwa ya, na, dị ka nwa na-eso nna ya, otú a ka o sooro m bụrụ ohu n’izisa ozi ọma.” (Ndị Filipaị 2:19-22) Taa, ọtụtụ ụmụ okorobịa na agbọghọbịa n’ezinụlọ ndị e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe ji anya ike na-anabata Iso Ụzọ Kraịst. Dị ka Timoti ha na-anwapụta onwe ha, leekwa ka anyị si aṅụrị ọṅụ na ha bụ akụkụ nke nzukọ Jehova!

Obi Ike Iji ‘Tọgbọ Olu Anyị’

13. N’ụzọ dị aṅaa ka Akwịla na Prisila si gosipụta obi ike?

13 Akwịla na nwunye ya bụ́ Prisila (Priska), setịpụrụ ihe nlereanya site n’iji obi ike ‘tọgbọ olu nke aka ha’ maka onye kwere ekwe ibe ha. Ha nabatara Pọl n’ụlọ ha, soro ya rụkọọ ọrụ n’ịkpa ákwà ụlọikwuu, nyekwara ya aka iwulite ọgbakọ ọhụrụ na Kọrint. (Ọrụ 18:1-4) N’ime afọ 15 nke ọbụbụenyi ha, ha tinyere ọbụna ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ihi ya n’ụzọ a na-ekpugheghị ekpughe. Ha bi na Rom mgbe ọ gwara ndị Kraịst nọ ebe ahụ, sị: “Keleenụ Priska na Akwịla ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ n’ime Kraịst Jisọs, mmadụ ndị tọgbọrọ olu nke aka ha n’ihi ndụ m; ndị ọ bụghị nanị mụ onwe m na-ekele, kama nzukọ Kraịst nile nke ndị mba ọzọ kwa.”—Ndị Rom 16:3, 4.

14. Site n’ịtọgbọ olu ha n’ihi Pọl, Akwịla na Priska na-eme ihe kwekọrọ n’iwu dị aṅaa?

14 Site n’ịtọgbọ olu ha maka Pọl, Akwịla na Priska mere ihe kwekọrọ n’okwu Jisọs: “Iwu ọhụrụ ka M na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka M hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya.” (Jọn 13:34) Iwu a dị “ọhụrụ” n’echiche nke na ọ gabigara ihe Iwu Mosis chọrọ nke bụ ka mmadụ hụ onye agbata obi ya dị ka ọ hụrụ onwe ya. (Levitikọs 19:18) Ọ chọrọ ịhụnanya na-achụ onwe onye n’àjà nke ga-erurị n’inye ndụ onwe onye maka ndị ọzọ, dị ka Jisọs mere. Onye na-ede ihe bụ́ Tertullian nke narị afọ nke abụọ na nke atọ O.A. hotara okwu ndị ụwa banyere ndị Kraịst mgbe o dere, sị: “‘Lee,’ ka ha na-ekwu, ‘otú ha si hụ ibe ha n’anya . . . na otú ha si dị njikere otu onye ọbụna ịnwụ maka ibe ya.’” (Apology, isiakwụkwọ XXXIX, 7) Karịsịa ná mkpagbu, ka ọ bụrụ iwu na anyị aghaghi igosipụta ịhụnanya ụmụnna site n’iji obi ike tọgbọ olu anyị iji zere ịgba ndị kwere ekwe ibe anyị àmà nye mmekpọ ọnụ ma ọ bụ ọnwụ n’aka ndị iro.—1 Jọn 3:16.

Obi Ike Na-eweta Ọṅụ

15, 16. Dị ka e gosiri n’Ọrụ Ndị Ozi isi nke 16, olee otú a pụrụ isi jikọọ obi ike na ọṅụ?

15 Pọl na Saịlas na-enye ihe àmà nke na igosipụta obi ike n’ime ule pụrụ iweta ọṅụ. Site n’iwu ndị ikpe obodo nyere n’obodo Filipaị, a pịara ha ụtarị n’ihu ọha ma kpọọ ha ọtọsị n’ụkwụ. Ma, ha ejighị obi nkoropụ mịlaa n’ụjọ. N’agbanyeghị ọnọdụ ha siri ike, ha ka nwekwara obi ike Chineke na-enye na ọṅụ ọ na-ewetara ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi.

16 N’ihe dị ka n’etiti abalị, Pọl na Saịlas nọ na-ekpe ekpere ma na-eto Chineke n’abụ. Na mberede, ala ọma jijiji mara ụlọ mkpọrọ ahụ, tọsaa agbụ e kere ha, meghepụkwa ụzọ nile. A gbaara onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ egwu ji na ezinụlọ ya àmà ná nkwuwa okwu bụ́ nke dujere na baptism ha dị ka ndị na-ejere Jehova ozi. “Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu, ya na ezinụlọ ya nile, ebe o kwere na Chineke.” (Ọrụ 16:16-34) Lee aha ọṅụ nke a na-aghaghị iwetaworo Pọl na Saịlas! Ebe anyị tụleworo ndị a na ihe nlereanya ndị ọzọ nke Akwụkwọ Nsọ nke obi ike, olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe obi ike dị ka ndị na-ejere Jehova ozi?

Nọgide Na-enwe Obi Ike

17. Dị ka e gosiri n’Abụ Ọma nke 27, olee otú ile anya Jehova si metụta obi ike?

17 Inwe olileanya na Jehova ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe obi ike. Devid bụrụ abụ, sị: “Na-ele anya Jehova: dị ike, ka obi gị nweekwa ume; ee, na-ele anya Jehova.” (Abụ Ọma 27:14) Abụ Ọma nke 27 na-egosi na Devid dabeere na Jehova dị ka “ebe siri ike” nke ndụ ya. (Amaokwu 1) Ebe ọ hụworo ụzọ Chineke si mesoo ndị iro Devid n’oge ochie nyere ya obi ike. (Amaokwu nke 2, 3) Obi ekele maka ebe a na-efe Jehova ofufe bụ ihe ọzọ. (Amaokwu 4) Ịtụkwasị obi n’enyemaka, nchebe, na mgbapụta Jehova wulitekwara obi ike Devid. (Amaokwu nke 5-10) Ntụziaka a nọgidere na-enwe n’ụkpụrụ dị iche iche nke ụzọ ezi omume Jehova nyekwara aka. (Amaokwu nke 11) Ekpere n’obi siri ike maka mgbapụta site n’aka ndị iro ya, tinyere okwukwe na olileanya, nyeere Devid aka inwe obi ike. (Amaokwu nke 12-14) Anyị pụrụ iwulite obi ike anyị n’ụzọ ndị dị otú ahụ, si otú ahụ na-egosi na anyị “na-ele anya Jehova” n’ezie.

18. (a) Gịnị na-egosi na isonyere ndị ọzọ na-efe Jehova mgbe nile pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-enwe obi ike? (b) Nzukọ ndị Kraịst na-ekere òkè dị aṅaa n’iwulite obi ike?

18 Isonyere ndị ọzọ na-efe Jehova mgbe nile pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-enwe obi ike. Mgbe Pọl kpọkuru Siza, ọ na-agakwa Rom, ndị kwere ekwe ibe ya zutere ya n’Ahịa Apiọs na Ụlọ Ndị Ije Atọ. “Mgbe Pọl hụrụ ha,” ka ihe ndekọ ahụ na-ekwu, “o kelee Chineke, nweekwa obi ike.” (Ọrụ 28:15) Ka anyị na-agachi nzukọ ndị Kraịst anya, anyị na-erube isi ná ndụmọdụ Pọl: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ hà otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Gịnị ka ịdụsi ndị ọzọ ọdụ ike pụtara? Ịdụsi ọdụ ike pụtara “ịkpali obi ike, mmụọ, ma ọ bụ olileanya.” (Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary) Anyị pụrụ ime ihe dị ukwuu ịkpali ndị Kraịst ndị ọzọ inwe obi ike, agbamume ha pụkwara iwulite àgwà nke a n’ime anyị.

19. Olee otú Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị Kraịst si metụta anyị ịnọgide na-enwe obi ike?

19 Iji nọgide na-enwe obi ike, anyị aghaghị ịmụchi Okwu Chineke anya ma tinye ndụmọdụ ya n’ọrụ ná ndụ anyị. (Deuterọnọmi 31:9-12; Joshua 1:8) Ọmụmụ ihe anyị na-enwechi anya kwesịrị ịgụnye akwụkwọ ndị Kraịst dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, n’ihi na ezi ndụmọdụ e si otú ahụ nye ga-enyere anyị aka iji obi ike Chineke na-enye zute ule dị iche iche nke okwukwe. Site n’ihe ndekọ Bible, anyị ahụwo ụzọ ndị na-ejere Jehova ozi siworo nwee obi ike n’ọnọdụ dị iche iche. Kpọmkwem ugbu a, ọ pụrụ ịbụ na anyị amaghị ụzọ ihe ọmụma dị otú a pụrụ isi nyere anyị aka, ma Okwu Chineke dị ike, ihe anyị mụtakwara na ya pụrụ inyere anyị aka mgbe nile. (Ndị Hibru 4:12) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na egwu mmadụ amalite imetụta ozi anyị, anyị pụrụ icheta ụzọ Inọk si nwee obi ike izi ozi Chineke nye ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.—Jud 14, 15.

20. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ekpere dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-enwe obi ike dị ka ndị na-ejere Jehova ozi?

20 Iji nọgide na-enwe obi ike dị ka ndị na-ejere Jehova ozi, anyị aghaghị ịnọgidesi ike n’ekpere. (Ndị Rom 12:12) Jisọs ji obi ike nagide ule ya nile n’ihi na ‘o weere ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri chee ekpere na arịrịọ n’ihu Onye ahụ pụrụ ịzọpụta Ya n’ọnwụ, mgbe a nụsịkwara olu Ya n’ihi na Ọ tụrụ egwu Chineke.’ (Ndị Hibru 5:7) Site n’ịnọ Chineke nso n’ekpere, anyị agaghị adị ka ndị ụwa na-atụ ụjọ, ndị na-aghaghị inwe ahụmahụ nke “ọnwụ nke abụọ ahụ” nke a na-enweghị mbilite n’ọnwụ site na ya. (Mkpughe 21:8) Nchebe Chineke na ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke bụ maka ndị ji obi ike na-ejere ya ozi.

21. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova na-eguzosi ike n’ihe pụrụ iji nwee obi ike?

21 Dị ka Ndịàmà Jehova na-eguzosi ike n’ihe, ọ dịghị anyị mkpa ịtụ egwu ndị iro bụ́ ndị mmụọ ọjọọ na ụmụ mmadụ, n’ihi na anyị nwere nkwado Chineke na ihe nlereanya obi ike nke Jisọs dị ka onye meriri ụwa. Iso ndị Jehova na-enwe mkpakọrịta na-ewuli ewuli n’ime mmụọ na-enyekwara anyị aka n’otu aka ahụ inwe obi ike. A na-ewulitekwa obi ike anyị site ná nduzi na ndụmọdụ nke Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị Kraịst. Ihe ndekọ Bible kwa nke na-ejere Chineke ozi n’oge gara aga na-enyere anyị aka ijegharị n’ụzọ ya n’obi ike. Ya mere, n’ụbọchị ikpeazụ ndị a dị oké egwu, ka anyị zọrọ ije na-aga n’ihu n’ihu ná nkwuwa okwu n’ije ozi dị nsọ. Ee, ka ndị Jehova nile nwee obi ike!

Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?

◻ Olee otú ihe nlereanya Jisọs pụrụ isi mee ka anyị jupụta n’obi ike?

◻ Gịnị nyere Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya obi ike ịnọgide na-eme nkwusa?

◻ N’ihi gịnị ka ndị Juu na ndị Jentaịl ji nwee mkpa obi ike iji were nguzo ha n’akụkụ Jehova?

◻ Ihe nlereanya ndị dị aṅaa nke obi ike ka Yunaịsi na Timoti gosipụtara?

◻ Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na obi ike na-eweta ọṅụ ọbụna n’okpuru mkpagbu?

[Foto dị na peeji nke 18]

Dị ka Jisọs, anyị pụrụ iguzogide ọnwụnwa ma ọ bụrụ na anyị etinye Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ma na-ehota ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya