N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kwere n’Ihe E Mehiere?
Ọ BỤ otu n’ime nzute ndị kasị dị ịtụnanya n’akụkọ ihe mere eme nke ibu agha. Onye nnọchite anya na-ejighị ngwá agha chigharịrị 400 ndị soja kpọrọ ekwo nkụ bụ́ ndị kpebisiri ike ịbọ ọ́bọ̀ otu mkparị, ihu. Mgbe ọ nụsịrị arịrịọ nke nanị otu nwanyị na-adịghị atụ egwu, onye ndu ndị ikom ndị ahụ hapụrụ ime ihe o bu n’uche.
Onye ndú ahụ bụ Devid, onye mesịrị ghọọ eze Israel. Ọ ṅara nwanyị ahụ bụ́ Abigail ntị n’ihi na ọ chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Mgbe o ji akọ gosi ya na ịbọ ọ́bọ̀ n’isi di ya bụ́ Nebal, ga-eduba n’ikpe ọmụma ọbara, Devid tiri mkpu, kwuo: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke Israel, bụ, Onye zitere gị taa izute m: ihe a gọziri agọzi ka ị bụkwa, onye gbochiworo m taa ka m ghara ịba n’ikpe ọmụma ọbara, ka aka m gharakwa ịzọpụta m.” Devid nwere ekele na Chineke jiri Abigail gbochie ya ka ọ ghara ihie ụzọ dị oké njọ.—1 Samuel 25:9-35.
N’otu abụ ọma, Devid jụrụ, sị: “Mmehie e mehieworo n’amaghị ama, ònye ga-aghọta ha?” (Abụ Ọma 19:12) Dị ka ya, ọ pụrụ ịbụ na anyị amataghị ihie ụzọ anyị ọ gwụla ma mmadụ egosipụtaara anyị ya. N’ọnọdụ ndị ọzọ ihe ndị na-adịghị mma ha kpatara na-amanye anyị ịghọta na anyị emehiewo ihe, ghara igosipụta amamihe, ma ọ bụ ghara igosipụta obi ọma.
Ọ Bụghị Ihe Obi Nkoropụ
Ọ bụ ezie na anyị nile na-emehie ihe, ọ bụghị iwu na ndị a ga-abụ ihe na-akpata obi nkoropụ. Onye na-anọchite anya mba ya n’ofesi bụ́ Edward John Phelps mere nchọpụta nke a: “Nwoke nke na-adịghị emehie ihe ma ọlị adịghị emekebe ihe ọ bụla.” Onye na-eso ụzọ Kraịst bụ́ Jemes kwukwara, sị: “Anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe.” (Jemes 3:2) Nwata ọ̀ pụrụ ịmụtali ịga ije n’adịghị mgbe ọ dara? Ee e, n’ihi na nwata na-amụta ihe site n’ịdị na-azọhie ụkwụ iche ma nọgide na-agbalị ruo mgbe o nwere ike iguzosi ike.
Iji bie ndụ a haziri nke ọma, ọ dịkwa anyị mkpa ịmụta ihe site n’ihie ụzọ anyị nile na nke ndị ọzọ. Ebe Bible na-akọ ahụmahụ nke ọtụtụ ndị ọnọdụ ha pụrụ iyi nke anyị, a pụrụ inyere anyị aka izere imehie otu ihe ndị ahụ ha mehiere. Mgbe ahụ, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihie ụzọ ha dị iche iche?
Obi Umeala Bụ Àgwà Dị Oké Mkpa
Otu ihe mmụta bụ na Chineke adịghị ama ndị nile mehiere ihe ikpe kama ọ na-ekpe nanị ndị jụrụ imezi ha ma ọ bụrụ na o kwere omume, ikpe. Eze mbụ nke Israel bụ́ Sọl nupụụrụ ntụziaka Jehova banyere ikpochapụ ndị Amalek isi. Mgbe Samuel onye amụma jekwuuru ya, Sọl bu ụzọ mee ka ọ bụ na ihe adịruchaghị njọ otú ha dị ma nwaakwa ibo ya ndị ọzọ. O chegburu onwe ya karị maka ịbụ onye e menyere ihere n’ihu ndị ya karịa imezi ihe e mebiri. N’ihi ya, ‘Jehova jụrụ ya ịbụ eze.’—1 Samuel 15:20-23, 30.
Ọ bụ ezie na onye nọchiri Sọl, bụ́ Devid, hiere ụzọ ndị siri oké ike, a gbaghaara ya n’ihi na o ji obi umeala nakwere ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị. Obi umeala Devid kwaliri ya ịṅa ntị n’okwu Abigail. Usuu ndị agha ya ejikerewo maka ọgụ. Ma, n’ihu ndị ya, Devid nabatara na ya emewo mkpebi oké ngwa ngwa. Ná ndụ ya nile, obi umeala dị otú ahụ nyeere Devid aka ịchọ mgbaghara ma dozie nzọụkwụ ya.
Obi umeala kwalikwara ndị na-ejere Jehova ozi aka ikwuzigharị okwu ndị a na-echeghị eche kwuo. N’otu oge a na-anụrụ ikpe n’ihu Sanhedrin, onye isi nchụàjà nyere iwu ka a maa Pọl ọra. Onyeozi ahụ ji iwe kwuo, sị: “Chineke gaje iti gị aka, gị mgbidi e tere nzụ.” (Ọrụ 23:3) Ma eleghị anya n’ihi ahụzighị ụzọ nke ọma, Pọl amataghị onye ọ na-agwa okwu ruo mgbe ndị kwụ n’akụkụ jụrụ ya: “Ị̀ na-ekwutọ onye isi nchụàjà nke Chineke?” Mgbe ahụ, Pọl nakweere ihie ụzọ ya ozugbo, na-asị: “Amataghị m, ụmụnne m, na ọ bụ onye isi nchụàjà: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ekwula okwu ọjọọ megide onye isi ọ bụla nke ndị nke gị.” (Ọrụ 23:4, 5; Ọpụpụ 22:28) Ee, Pọl ji obi umeala nabata ihe o mehiere.
Ha Nabatara Ihe Ha Mehiere
Bible gosikwara na ụfọdụ gbanwere ụzọ hiere ụzọ ha si eche echiche. Dị ka ihe atụ, tụlee ọbụ abụ bụ́ Esaf. N’ihi na o yiri ka ihe ọ̀ na-agara ndị ọjọọ nke ọma, ọ sịrị: “N’efu ka m meworo ka obi m dị ọcha.” Ma Esaf nwetaghachiri onwe ya mgbe ọ gara n’ụlọ Jehova ma tụgharịa uche n’uru dị iche iche nke ezi ofufe. E wezụgakwa nke ahụ, ọ nabatara ihie ụzọ ya n’Abụ Ọma nke 73.
Jona kwekwara ka echiche na-ezighị ezi gbaa ụzọ ile ihe anya ya ọchịchịrị. Mgbe o mesịrị nkwusa na Nineve, o chegburu onwe ya maka ịbụ onye a nwapụtara na o kwuru eziokwu karịa mgbaghara nke ndị bi n’obodo ahụ. O wutere Jona mgbe Jehova na-ataghị ndị Nineve ahụhụ n’agbanyeghị nchegharị ha, ma Chineke gbaziri ya olu. Jona bịara ghọta na ụzọ ile ihe anya ya hiere ụzọ, n’ihi na akwụkwọ Bible bu aha ya ji eziokwu nakwere ihe nile o mehiere.—Jona 3:10–4:11.
Site n’iche n’ụzọ hiere ụzọ na Jehova Chineke, ọ bụghị Setan Ekwensu, na-akpata ihe isi ike ya, nwoke ahụ bụ́ Job nwara ịnwapụta na nhụjuanya ya nile ekwesịghị ịbịara ya. Ọ mataghị ihe iseokwu ahụ ka ukwuu: Ndị na-ejere Chineke ozi hà ga-anọgidesi ike n’ihe nye ya n’okpuru ule? (Job 1:9-12) Mgbe Elaịhu, e mesịakwa Jehova, nyeere Job aka ịhụ ihie ụzọ ya, o kwetara, sị: “M gosiworo ihe nke m na-adịghị aghọta . . . N’ihi nke a ka m na-ajụ onwe m ajụ, wee chegharịa n’elu ájá na ntụ.”—Job 42:3, 6.
Ịnabata ihe ndị e mehiere na-enyere anyị aka ịnọgide soro Chineke na-enwe mmekọrịta dị mma. Dị ka ihe atụ ndị a tụlere na-egosi, ọ gaghị ama anyị ikpe n’ihi ihe ndị anyị mehiere ma ọ bụrụ na anyị anabata ha ma mee ihe anyị pụrụ ime iji dozie echiche na-ezighị ezi, okwu a na-echeghị eche kwuo, ma ọ bụ omume bụ nnọọ nke nzuzu. Olee otú anyị pụrụ isi tinye ihe ọmụma nke a n’ọrụ?
Ime Ihe Banyere Ihe Ndị Anyị Mehiere
Iji obi umeala nakwere ihe e mehiere ma na-eme ihe banyere ya pụrụ ime ka ihe nkekọ ezinụlọ sie ike. Dị ka ihe atụ, ma eleghị anya n’ihi ike ọgwụgwụ ma ọ bụ iwe, nne ma ọ bụ nna pụrụ ịdọwo nwa ya aka ná ntị n’obi ọjọọ. Ịjụ idozi ihe e mehiere nke a pụrụ inwe mmetụta ndị dị njọ. N’ihi ya, Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”—Ndị Efesọs 6:4.
Otu onye Kraịst bụ́ onye na-eto eto nke aha ya bụ Paul ji obi ụtọ cheta, sị: “Papa m na-arịọkarị mgbaghara ma ọ chee na ya emeghachiwo omume gabiga ókè. Nke ahụ nyeere m aka ịkwanyere ya ùgwù.” Ma ịrịọ mgbaghara ọ̀ dị mkpa n’otu ọnọdụ kpọmkwem ma ọ bụ na ọ dịghị bụ ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya. Ka o sina dị, ọ dị mkpa iji ezi mgbalị iji gbochie ihie ụzọ ndị yiri ya n’ọdịnihu sochie ịrịọ mgbaghara.
Gịnị ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye ehie ụzọ nke kpatara ihe isi ike? Nnabata n’obi eziokwu, arịrịọ sitere n’obi, na mmụọ mgbaghara ga-enye aka n’ijigide mmekọrịta ịhụnanya ha. (Ndị Efesọs 5:33; Ndị Kọlọsi 3:13) Jesús, onye Spain na-akpọ ekwo nkụ nke nọ n’afọ ndụ nke 50 na ụma, adịghị mpako nke ukwuu ịrịọ nwunye ya, bụ́ Albina mgbaghara. “Anyị nwere omenala nke ịrịọ mgbaghara mgbe anyị mejọrọ ibe anyị,” ka nwunye ya kwuru. “Nke a na-enyere anyị aka ibikọ ọnụ n’ịhụnanya.”
Mgbe Onye Okenye Mehiere Ihe
Ịnabata ihe e mehiere na ịrịọ arịrịọ ndị sitere n’obi ga-enyekwara ndị okenye ndị Kraịst aka ịrụkọ ọrụ ọnụ ma ‘na-asọpụrịtara ibe ha.’ (Ndị Rom 12:10) Onye okenye pụrụ ịla azụ ịnabata ihe o mehiere n’ihi na ọ na-atụ egwu na nke a ga-ewetu ikike ya n’ọgbakọ ala. Otú ọ dị, ịnwa ịgọpụrụ ihie ụzọ ya, ileghara ya anya, ma ọ bụ ime ya ka ọ bụ na ọ bụghị ihe siri ike, yikarịrị ka ọ ga-eme ka ndị ọzọ ghara inwekwa obi ike ná nlekọta ya. Nwanna tozuru okè nke ji obi umeala rịọ mgbaghara, ma eleghị anya n’ihi okwu ụfọdụ a na-echeghị eche kwuo, na-enweta nkwanye ùgwù nke ndị ọzọ.
Fernando, onye okenye na Spain, na-echeta otu mgbe otu onye nlekọta sekit nọ n’isi oche otu nnukwu mgbakọ nke ndị okenye kwuru ihe na-ezighị ezi banyere otu e kwsịrị isi na-eduzi nzukọ. Mgbe otu nwanna ji nkwanye ùgwù kwuzie ihe o kwuru, onye nlekọta sekit ahụ nabatara ozugbo na ya emehiewo ihe. Fernando na-echetaghachi, sị: “Mgbe m hụrụ ka ọ nabatara ihe o mehiere n’ihu ndị okenye ahụ nile, ọ masịrị m nke ukwuu. M kwanyeere ya ùgwù ọbụna karị mgbe ọ rịọsịrị mgbaghara ahụ. Ihe nlereanya ya kụziiri m otú ọ dịruru mkpa ịnabata ngahie ndị nke m.”
Dị Ngwa Ịnabata Ihe E Mehiere
A na-anabatakarị arịrịọ mgbaghara, karịsịa ma e mee ya ngwa ngwa. N’ezie, ọ ka mma ịnabata ihe e mehiere ngwa ngwa. Iji maa atụ: N’October 31, 1992, Pope John Paul nke Abụọ nabatara na Agha Njụta Okwukwe ahụ emewo ihe “n’ihie ụzọ” 360 afọ gara aga n’ịta Galileo ahụhụ n’ihi ikwusi ike na ụwa abụghị ebe etiti nke eluigwe na ala. Ma, ibufe arịrịọ mgbaghara ruo ogologo oge dị otú ahụ yiri ka ọ na-eme ka uru ya ghara ịpụta ìhè.
Otu ihe ahụ bụ eziokwu ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Arịrịọ mgbaghara dị ngwa pụrụ ịla ọnyá okwu ma ọ bụ omume ọjọọ kpatara. Jisọs gbara anyị ume ka anyị ghara igbu oge n’ikpe udo, na-asị: “Ọ bụrụ na ị na-eche onyinye gị n’ihu Chineke n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na nwanne gị nwere ihe megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, laba, buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụ bịakwa chee onyinye gị.” (Matiu 5:23, 24) Ọtụtụ mgbe, iweghachi mmekọrịta udo na-achọ nanị ịnabata na anyị mere ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma rịọ mgbaghara. Ka anyị na-echere ogologo oge ime nke a, otú ahụ ka ọ na-esiwanye ike.
Obi Ụtọ n’Ịnabata Ihe E Mehiere
Dị ka ihe nlereanya Sọl na Devid mara atụ ya, ụzọ anyị si hụ maka ihe ndị anyị mehiere pụrụ imetụta ndụ anyị. Sọl gbara isi akwara megide ndụmọdụ, ihie ụzọ ya mụbakwara, mesịa duba n’ọnwụ ya n’enweghị ihu ọma Chineke. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihie ụzọ na mmehie nile nke Devid, o ji nchegharị nakwere mgbazi olu ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova. (Tụlee Abụ Ọma 32:3-5.) Nke a ọ̀ bụghị ihe anyị na-achọsi ike?
Nkwụghachi ụgwọ kasịnụ maka ịnabata na idozi ihe e mehiere ma ọ bụ ichegharị site ná mmehie bụ ịmata na Chineke agbagharawo ya. “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ . . . onye e kpuchiworo mmehie ya,” ka Devid sịrị. “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ mmadụ nke Jehova na-adịghị agụrụ ya ajọ omume.” (Abụ Ọma 32:1, 2) Mgbe ahụ, lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya ịnabata ihe e mehiere!
[Foto dị na peeji nke 29]
Nwata ọ̀ ga-amụta ịga ije n’adịghị mgbe ọ dara?