Ọrụ Nzọpụta Ndị Jehova Na-arụ Ugbu A
BIBLE na-agwa anyị nke a banyere Jehova: “Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya” na, “Onyenwe anyị matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke.”—Abụ Ọma 34:19; 2 Pita 2:9.
Olee otú Jehova si agbatara ndị ya ọsọ enyemaka mgbe ha nọ n’ihe isi ike? Ọ bụghị site n’iji ọrụ ebube chigharịa ikike ihe ndị sitere n’okike ihu ma ọ bụ site n’ime ihe ụfọdụ karịrị mmadụ, dị ka ọtụtụ ndị chere na o kwesịrị ime, kama ọ bụ site n’ike ọzọ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-adịghị aghọta n’ezie—ịhụnanya. Ee, Jehova hụrụ ndị ya n’anya, ọ zụlitewokwa n’etiti ha ịhụnanya otu onye n’ebe ibe ya nọ nke siri oké ike nke na o nwere ike ịrụzuru ha ihe yiri ọrụ ebube.—1 Jọn 4:10-12, 21.
Ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka na n’oge mkpa, ihe a chọrọ bụ nri, ọgwụ, na ihe ọrụ—ọ bụghị ịhụnanya. N’ezie, nri, ọgwụ, na ihe ọrụ dị mkpa. Otú ọ dị, Pọl onyeozi tụgharịrị uche otú a sị: “A sịkwa ne enwere m okwukwe nile, nke mere m ga-enwe ike ibubiga ugwu, ma enweghị m ịhụnanya, abụghị m ihe ọ bụla. A sịkwa na ewere m ihe nile m nwere zụọ ndị ogbenye, a sịkwa na arara m ahụ m nye ka e wee ree m ọkụ, ma enweghị m ịhụnanya, ọ baghịrị m uru ọ bụla.”—1 Ndị Kọrint 13:2, 3.
Ọtụtụ mgbe anyị na-agụ banyere ihe enyemaka dọ n’ebe a na-adọba ibu n’ọdụ ụgbọ mmiri, bụ́ ndị na-eretọ ma ọ bụ bụrụ ndị ụmụ òké na-ata ebe ụmụ mmadụ nọ ná mkpa na-ala n’iyi site n’ọrịa na ịnọ n’agụụ. Ma ọ bụ nke ka njọ, ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ịdaba n’aka ndị anyaukwu na-arụ arụrụala bụ́ ndị na-eji ha emere onwe ha uru. Otú a, inwe ihe a chọrọ na ịhụ na ndị nọ n’ihe isi ike ritere uru site na ha abụghị otu ihe ahụ. Ezi ịhụnanya na nchegbu pụrụ ịkpata ọdịiche ahụ.
Ịhụnanya E Tinyere n’Ọrụ
Na September 11, 1992, Ajọ Ifufe Iniki fekwasịrị agwaetiti Kauai nke Hawaii, ọnụ ọgụgụ ndị bi na ya bụ 55,000. Ka ọ na-ekusi ike 210 kilomita kwa hour ma feruo 260 kilomita kwa hour, o gburu mmadụ 2 ma merụọ 98 mmadụ ahụ, bibie 75 pasent nke ụlọ nile, mee ka 8,000 mmadụ ghara inwe ebe obibi, ma kpata mbibi e mere atụmatụ na o ruru $1 billion. N’etiti ndị bi n’obere agwaetiti a, e nwere 800 Ndịàmà Jehova n’ọgbakọ isii. Olee otú ihe si gaara ha?
Tupu Iniki etiwapụ n’ezie, ndị okenye ọgbakọ, n’okpuru nduzi nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ejekwuruwo ndị nile nọ n’ọgbakọ nile iji hụ na ha nọ ná nchebe ma ghara ịnọ n’ihe ize ndụ, dị njikere maka mwakwasị ahụ. Nlekọta ịhụnanya dị otú ahụ so gbochie oké mmerụ ahụ ma ọ bụ ọnwụ n’etiti Ndịàmà.—Tụlee Aịsaịa 32:1, 2.
Ọ bụ ezie na a kpaghasịrị usoro nzirịta ozi na ime njem nke ukwuu, mmadụ atọ na-anọchite anya alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society dị na Honolulu so ná ndị mbụ rutere n’ebe ọdachi ahụ mere mgbe ajọ ifufe ahụ gasịrị, ebe ụlọ ọrụ ndị nkịtị na-eche nche nyeworo ha ikike pụrụ iche iji ụgbọ elu fega Kauai. Ozugbo, ha chọtara Ndịàmà e nwere n’ebe ahụ, n’ụtụtụ echi ya kwa, hazie nzukọ iji guzobe usoro a ga-eji nye aka. E guzobere kọmitii enyemaka ịchọpụta ihe dị mkpa na inweta ihe ndị a chọrọ site n’alaka ụlọ ọrụ dị na Honolulu. N’arụ ọrụ ma n’abalị ma n’ehihie nile, ha duziri ọrụ inweta ihe ndị a chọrọ maka ndị nọ ná mkpa na ihichasị ihe na idozisị ụlọ ndị e mebiri.
Ndịàmà nọ n’agwaetiti ndị ọzọ zaghachiri ngwa ngwa maka ụmụnna ha nọ ná mkpa. Ozugbo e meghere ọdụ ụgbọ elu dị na Kauai, 70 Ndịàmà febatara ịbịa nye aka. E bubatara ihe enyemaka ọnụ ahịa ya ruru $100,000, gụnyere injin ọkụ eletrik, stoovu nta, oriọna, na nri. E jiri otu n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’agwaetiti ahụ mee ihe dị ka ebe nkwasa ihe; otú ọ dị, e nwere egwu ụfọdụ na ndị omekome pụrụ izu ohi na ya. Mgbe ahụ gwongworo ụfọdụ nke Ndị Agha kwụsịrị n’ebe a na-adọba ụgbọ ala n’ala Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, ndị na-anya ha jụọkwa ma ha pụrụ ịkwọsa gwongworo ha n’ebe ahụ. Ndị soja e nyere ọrụ ichekwa gwongworo ndị ahụ wepụkwara nsogbu ọ bụla nke izuru ihe enyemaka ndị ahụ.
Ụmụnna buuru injin ọkụ eletrik ndị ahụ gaa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, mee ka ha rụọ ọrụ n’ụlọ nke ọ bụla ruo hour abụọ ma ọ bụ atọ iji nyere ndị mmadụ aka ịhụ na frij ha na-arụ ọrụ. E zipụrụ ìgwè ụmụnna ụfọdụ ịga n’ụlọ dị iche iche ihichasị ihe na idozi ihe e mebiri. Mgbe ha rụrụ ọrụ n’ụlọ otu nwanna nwanyị onye di ya na-emegide n’ụzọ dị ilu n’oge gara aga, a kpaliri di ya nke ukwuu nke na nanị ihe ọ pụrụ ime bụ iguzoro n’akụkụ bee ákwá. Onye si n’obodo dị n’elu ala leta ebe ahụ bụ́ onye hụrụ ìgwè ọzọ nke Ndịàmà ka ha na-arụ ọrụ nwere mmasị nke ukwuu site n’àgwà ha na nhazi ha nke na o jekwuuru ha ma jụọ ihe mere ha ji dị iche nke ukwuu otú ahụ. Mgbe otu nwanna kọwara na ọ bụ ịhụnanya ha maka Chineke na maka ndị Kraịst ibe ha, nwoke ahụ zaghachiri sị: “Olee otú m pụrụ isi mara Chineke?” (Matiu 22:37-40) Mgbe ahụ o kwukwasịrị: “A haziri unu nke ọma nke ukwuu nke na ma eleghị anya unu ga-ahụ na ọ dị onye na-eche m mgbe m lọghachiri Florida!”
Ná ngụkọta, Ndịàmà Jehova nyere aka n’ihichasị na idozi 295 ụlọ na Kauai. N’ime ndị a, 207 chọrọ mmezi dị nta, ma e mebiri 54 nke ukwuu, e bibikwara 19 kpam kpam. Ọrụ ha gụnyekwara ịkpọtụrụ onye ọ bụla a maara na ọ bụ Onyeàmà n’agwaetiti ahụ iji jide n’aka na e lekọtara onye nke ọ bụla. Mgbe e wegaara otu nwanna nwanyị ihe, onye agbata obi ya bụ onye okpukpe Buddha chọpụtara na ya anatabeghịdị otu ngwungwu tii site n’aka ndị òtù ya. Nwaada ọzọ, onye ìgwè Ndịàmà hichaara ụlọ ya, sịrị: “Unu anọwo na-abịa n’ụlọ m ruo ogologo oge, elekwara m unu anya dị ka ezi ndị agbata obi, ma ngosipụta nke a nke ịhụnanya ndị agbata obi na-egosi m ihe nzukọ unu bụ maka ya. Ndeewonụ maka ọrụ nile unu na-arụsi ike.”
E wezụga ilekọta mkpa anụ ahụ nke ndị Kraịst ibe ha nile, ndị na-ahụ maka ọrụ enyemaka ahụ nwekwara nchegbu n’otu aka ahụ maka ọdịmma ime mmụọ ha. Ihe na-erughị ụbọchị abụọ oké ifufe ahụ gasịrị, ọgbakọ dị iche iche nọ na-enwe nzukọ ha. Ngwa ngwa, ìgwè ndị dị nta nke ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ amalitewo ịrụ ọrụ. Ndị okenye iri site n’agwaetiti ndị ọzọ bịara Kauai inyere ndị okenye e nwere n’ebe ahụ aka ka e wee nwee ike ime nleta ọzụzụ atụrụ na nke Onyeàmà ọ bụla nọ n’agwaetiti ahụ. Na Sunday na-esonụ, ọgbakọ isii ahụ dum nwere otu Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, okwu were 30 minit banyere usoro ihe enyemaka nke otu onye so na Kọmitii Enyemaka kwuru, na okwu mmechi were 30 minit nke otu onye so na Kọmitii Alaka kwuru, bụ́ onye si Honolulu bịara maka nzube nke a. Otu akụkọ a natara n’ebe ahụ na-asị: “A kasiri mmadụ nile obi site n’ezi nduzi e nyere, ha adịkwa njikere n’ụzọ ime mmụọ iche nsogbu ndị fọrọ ihu. E nwere nanị mmadụ ole na ole ndị anya mmiri na-ejupụtaghị n’anya n’etiti ndị na-ege ntị mgbe usoro ihe omume ahụ na-agwụsị, a malitekwara nnọọ ịkụ aka.”
Òtù Ụmụnna Zuru Ụwa Ọnụ
Ịhụnanya na nchegbu dị otú ahụ bụ akara e ji mara ndị Jehova gburugburu ụwa. Mgbe Ajọ Ifufe Val fekwasịrị Ebe Ọdịda Anyanwụ Samoa ihe dị ka otu afọ bu ụzọ, o bibiri ọtụtụ ihe, ma Ndịàmà Jehova n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa gbatara ngwa ngwa inyere ụmụnna ha nọ n’ebe ahụ aka. E mesịa, mgbe ndị gọọmenti wepụtara ego maka okpukpe nile—gụnyere Ndịàmà Jehova—iji dozie ihe owuwu ha nile, Ndịàmà weghachiri ego nke ha na otu akwụkwọ ozi nke na-ekwu na e dozisịwo ihe ha nile mebiri, na a pụkwara iji ego ndị ahụ dozie ụlọ ụfọdụ nke gọọmenti. A kọrọ ihe ha mere n’akwụkwọ akụkọ obodo ahụ. Mgbe ọ hụrụ nke a, otu onye ọrụ gọọmenti gwara otu Onyeàmà na ihere chọọchị ya na-eme ya nnọọ n’ihi na ha naara ego ahụ site n’aka gọọmenti, ọ bụ ezie na ụlọ ha nile ndị e mebiri n’oge ajọ ifufe ahụ dị n’aka ndị inshọransị.
N’otu aka ahụ, na September 1992, mgbe Osimiri Ouvèze n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ France jubigara ókè ma bibie Vaison-la-Romaine na ógbè 15 ndị dị ya gburugburu, Ndịàmà zaghachiri ngwa ngwa. Mgbe chi na-efo, idei mmiri ahụ egbuwo 40 mmadụ, bibie 400 ụlọ, mebie ọtụtụ narị ndị ọzọ, hapụkwa ọtụtụ ezinụlọ n’enweghị mmiri na ọkụ eletrik. N’isi ụtụtụ echi ya, Ndịàmà sitere n’ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ bụ ndị mbụ bịara inyere ndị idei mmiri metụtara aka. Ndị nọ ná mkpa ụlọ bụ ndị ezinụlọ Ndịàmà ndị bi n’ógbè ahụ ji ịhụnanya kpọbata n’ụlọ ha. Ọtụtụ narị Ndịàmà si n’ebe dị iche iche bịa inye aka. E guzobere kọmitii inyeaka n’obodo Orange dị nso ịchịkọta mgbalị nile nke ìgwè anọ nke ndị ọrụ afọ ofufo, bụ́ ndị wepụsịrị ụrọ ma hichasịa ụlọ dị iche iche, sụọ nnukwute ùkwù ákwà ndị jupụtara n’ájá ụrọ, kwadebekwa nri ma kesaa ya na mmiri ọṅụṅụ n’ebe nile ahụ o metụtara. Ha wepụtara onwe ha ọbụna ihichasị otu ụlọ akwụkwọ dị n’ebe ahụ na ọtụtụ ụlọ ọha na eze. Ụmụnna ha nakwa ndị bi n’ógbè ahụ nwere ekele maka mgbalị ha nile n’enweghị ike ọgwụgwụ.
N’ọtụtụ ebe ndị ọzọ, Ndịàmà Jehova atawo ahụhụ site n’ọdachi dị iche iche, dị ka idei mmiri, ajọ ifufe, na ala ọma jijiji, dị ka onye ọ bụla ọzọ. N’ịghọta na ndị a bụ ihe sitere n’ọnọdụ ihe ndabara ma ọ bụ ndị a na-apụghị izere ezere, ha adịghị ata Chineke ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ụta. (Eklisiastis 9:11) Kama nke ahụ, ha nwere obi ike na ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà maka ndị kwere ekwe ibe ha ga-agbatara ha ọsọ enyemaka n’agbanyeghị ụdị ajọ ọnọdụ pụrụ ịdakwasị ha. Ọrụ ịhụnanya ndị dị otú ahụ bụ ihe sitere n’okwukwe nke ha na-enwekọ ọnụ. Jemes onye na-eso ụzọ na-akọwa, sị: “Ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị gba ọtọ, n’enweghịkwa ihe oriri ga-ezuru ya kwa ụbọchị, ma otu onye n’etiti unu sị ha, Labanụ n’udo, nyaanụ ọkụ, rijuokwanụ afọ; ma unu enyeghị ha ihe na-akpa ahụ ha; uru gịnị ka ọ bara? Ọbụna otú a okwukwe, ma ọ bụrụ na o nweghị ọrụ, ọ bụ ihe nwụrụ anwụ n’onwe ya.”—Jemes 2:15-17.
Isi Iyi nke Ezi Nchebe
Kama ịtụ anya ọrụ ebube n’ụdị nke Chineke itinye aka n’ụzọ ụfọdụ, Ndịàmà Jehova matara na a ga-enweta nchebe n’òtù ụmụnna ha nke ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ. N’ikwu eziokwu, ihe òtù ụmụnna ahụ nwere ike ịrụzu n’oge ihe isi ike adịghị nta ma ọlị karịa ọrụ ebube. Ha na-echeta okwu Jisọs ndị a na-achọta na Matiu 17:20: “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe dịka mkpụrụ mustard, unu ga-asị ugwu a, Si n’ebe a gabiga n’ebe ahụ; ọ ga-agabigakwa; ihe ọ bụla agaghị adịkwa nke unu na-apụghị ime.” Ee, ihe mgbochi ndị yiri ugwu na-apụ n’anya mgbe ezi okwukwe ndị Kraịst, nke e jikọrọ ya na ịhụnanya, banyere n’ọrụ.
Ndị Jehova gburugburu ụwa na-enwe mmetụta nke aka nchebe Chineke ha n’oge ndị a na-agbanwe agbanwe, ndị dịkwa ize ndụ. Ha na-enwe mmetụta dị ka ọbụ abụ ahụ: “N’udo ka m ga-eji otu mgbe ahụ dinaa ala, rahụọ ụra: n’ihi na Gị onwe gị, Jehova, nanị Gị, na-eme ka m biri ná ntụkwasị obi.” (Abụ Ọma 4:8) N’obi ike, ha na-atụkwasị uche ha n’ọrụ e ji n’aka: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) N’enweghịkwa obi abụọ ọ bụla, ha na-elega anya n’ihu ná nguzobe nke ụwa ọhụrụ nke udo, nke ezi omume nke Jehova kwere ná nkwa, ebe ha na-agaghị enwekwa ahụmahụ nke ọdachi nke ụdị ọ bụla, ma ọ bụ nke mmadụ kpatara ma ọ bụ nke na-emere onwe ya.—Maịka 4:4.
[Foto ndị dị na peeji nke 12]
Ndịàmà si ebe dị iche iche bịa inyere ndị idei mmiri metụtara aka