Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 12/15 p. 8-10
  • “Chọọnụ Jehova, Unu Nile Ndị Dị Umeala N’obi”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Chọọnụ Jehova, Unu Nile Ndị Dị Umeala N’obi”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Chọọ Umeala n’Obi?
  • Ndị ‘Na-achọ Umeala n’Obi’ Taa
  • Jiri Umeala n’Obi Zaghachi
  • Na-adị Umeala n’Obi ma Na-eme Ihe Dị Jehova Mma
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Na-eme Uche Chineke N’agbanyeghị na Ọnọdụ Gị Agbanweela
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Chọọnụ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe Ya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Chọọ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 12/15 p. 8-10

“Chọọnụ Jehova, Unu Nile Ndị Dị Umeala N’obi”

“CHỌỌNỤ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe O kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”—Zefanaịa 2:3.

Zefanaịa onye amụma gwara “ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa” okwu ndị ahụ, ọ gbakwara ha ume ‘ịchọ umeala n’obi’ iji bụrụ ndị e chebere “n’ụbọchị iwe Jehova.” Ọ na-eme ka a ghara ịrụ ụka na umeala n’obi bụ otu ihe a chọrọ maka nlanarị. Ma ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Chọọ Umeala n’Obi?

Umeala n’obi bụ àgwà nke ịdị na-eme nwayọọ nwayọọ, na-adịghị mpako ma ọ bụ okomoko. E jikọrọ ya na àgwà ọma ndị ọzọ, dị ka iwetu onwe onye ala na ịdị nwayọọ, n’ụzọ chiri anya. Ebe ọ dị otú ahụ, ndị dị umeala n’obi na-ekwe ịkụziri ihe, na-adịkwa njikere ịnakwere ahụhụ site n’aka Chineke, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ ga-eyi ihe mwute mgbe ahụ.—Abụ Ọma 25:9; Ndị Hibru 12:4-11.

N’onwe ya ọ pụrụ ịbụ na ịdị umeala n’obi nwere ihe dị nta jikọrọ ya na agụmakwụkwọ ma ọ bụ ọkwá mmadụ ná ndụ. Otú ọ dị, ndị gụrụ akwụkwọ nke ukwuu ma ọ bụ nwee ihe ịga nke ọma n’ụzọ ụwa na-echekarị na ha ruru eru imere onwe ha mkpebi n’ihe nile, ọbụna n’ihe banyere ofufe. Nke a pụrụ igbochi ha ikwere ka onye ọzọ kụziere ha ihe ma ọ bụ ịnakwere ndụmọdụ na ime mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ ha. Ndị ọzọ bara ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe pụrụ ịdaba n’echiche hiere ụzọ nke na ịnọ ná nchebe ha dabeere n’ihe ndị ha nwere. N’ihi ya, ha adịghị eche na ha nwere mkpa ọ bụla maka akụ ime mmụọ site n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.—Matiu 4:4; 5:3; 1 Timoti 6:17.

Tụlee ndị odeakwụkwọ, ndị Farisii, na ndị isi nchụàjà nke ụbọchị Jisọs. N’otu oge mgbe ndị uwe ojii ha zipụrụ ijide Jisọs lọghachitere n’akpụtaghị ya, ndị Farisii sịrị: “È duhiewokwa unu onwe unu? Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti ndị isi, ma ọ bụ n’etiti ndị Farisii, kwere na Ya? Ma ìgwè mmadụ a nke na-amaghị iwu anyị bụ ndị a na-abụ ọnụ.” (Jọn 7:45-49) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, nye ha, nanị ndị na-amaghị nke a na-akọ na ndị na-agụghị akwụkwọ ga-adịru nzuzu ikwenye na Jisọs.

N’agbanyeghị nke ahụ, a dọtara ụfọdụ ndị Farisii n’ebe eziokwu ahụ dị, ọbụna na ha gbachitekwaara Jisọs na ndị Kraịst. N’etiti ha e nwere Nikọdimọs na Gameliel. (Jọn 7:50-52; Ọrụ 5:34-40) Mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, “oké ìgwè ndị nchụàjà na-aṅakwa okwukwe ahụ ntị.” (Ọrụ 6:7) N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya, ihe nlereanya kasị pụta ìhè bụ Pọl onyeozi. E ziri ya ihe n’ụkwụ Gameliel, o wee ghọọ onye na-ewu ewu na onye a na-akwanyere ùgwù na-akwado okpukpe ndị Juu. Otú ọ dị, mgbe oge na-aga o weturu onwe ya ala nabata òkù Kraịst Jisọs kpọrọ ma ghọọ onye na-eso ụzọ ya na-anụ ọkụ n’obi.—Ọrụ 22:3; 26:4, 5; Ndị Galetia 1:14-24; 1 Timoti 1:12-16.

Ihe a dum na-eme ihe atụ nke na n’agbanyeghị ihe ọnọdụ mmadụ bụ ma ọ bụ ụzọ mmadụ pụrụ isi were ozi sitere na Bible, okwu ndị ahụ Zefanaịa kwuru ka dịkwa irè. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka Chineke nwapụta ya ma bụrụ onye Okwu ya na-eduzi, umeala n’obi bụ ihe a na-agaghị eji gwurie egwu.

Ndị ‘Na-achọ Umeala n’Obi’ Taa

Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa na-anabata ozi ọma nke Alaeze. Ndịàmà Jehova na-eduziri ihe karịrị nde mmadụ anọ ọmụmụ Bible kwa izu n’ebe obibi ndị dị otú ahụ. Ndị a sitere n’ụdị nzụlite dị iche iche na ọnọdụ dị iche iche nke akụ na ụba na ọkwá n’etiti ọha na eze. Ma, otu ihe ha nwekọrọ ọnụ bụ na ha weturu onwe ha ala n’ụzọ zuru ezu ịnakwere ozi Bible nke mmadụ ziri ha n’ebe obibi ha ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ. Ọtụtụ n’ime ha na-enwe ọganihu dị mma n’ihi na ha dị njikere itinye mgbalị imeri ihe mgbochi ndị dị n’ụzọ ha. Ee, ha so ná “ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa” taa.

Dị ka ihe atụ, were Maria bi na Mexico. Ọ mụrụ nkà iwu na mahadum ma nwee akụ zuru ezu n’ihi ihe nketa ezinụlọ. N’ihi nke a, ọ zụlitere echiche ụfọdụ nke ịnakwere ọtụtụ ihe, bụ́ nke gbanwere ya, dị ka o si kwuo ya, ịghọ onye “nnupụisi, onye mkparị, onye na-arụgide ndị ọzọ, na onye na-ekweghị na Chineke.” “Amalitere m iche na a pụrụ iji ego dozie okwu ọ bụla nakwa na Chineke adịghị mkpa. Echere m na ọ dịghịdị adị,” ka Maria chetaghachiri. “Nye m, chọọchị bụ ihe nzuzu nakwa nanị ihe dị mkpa maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya,” ka o kwukwasịrị.

E mesịa, Maria hụtara mgbanwe ndị nwa nwanne nna ya mere mgbe ọ ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. “Omume ya jọbigara njọ ókè na mbụ, ugbu a kwa ọ bụ onye udo nke na-akwụwa aka ya ọtọ,” ka Maria kọwara. “Ndị ikwu ya sịrị na ọ bụ onye nkwusa ma na-agụ Bible, n’ihi nke ahụ kwa ọ dịghị aṅụkwa mmanya ma ọ bụ na-achụgharị ụmụ nwanyị. Ya mere m chọrọ ka ọ bịa na-agụrụ m Bible n’ihi na m chere na n’ụzọ dị otú a m gaje ịchọta udo na ịdị jụụ m chọsiri ike.” Ihe si na ya pụta bụ na Maria nakweere ọmụmụ Bible nke otu di na nwunye bụ Ndịàmà na-eduziri ya.

O nwere ọtụtụ ihe ọ ga-emeri, o sikwaara ya ike nke ukwuu ịnakwere ụkpụrụ Bible nke ịbụ isi iji nọrọ n’okpuru di ya. Ma o mere oké mgbanwe dị iche iche ná ndụ na àgwà ya. O kwupụtara, sị: “Echere m na eri mgbe ụmụnna batara n’ụlọ m ma jiri enyemaka Jehova bịa, enwewo obi ụtọ, ịdị jụụ, na ngọzi Chineke n’ụlọ m.” Taa, Maria bụ Onyeàmà Jehova raara onwe ya nye, nke e mere baptism.

N’ịchụso ezi ofufe, e nwere akụkụ ọzọ ebe ịdị umeala n’obi, ma ọ bụ adịghị ya, na-ekere òkè dị mkpa. Ọtụtụ mgbe nnọọ, onye bụ nwunye n’ezinụlọ na-anakwere eziokwu ma chọọ ijere Chineke ozi, ma di ya na-ala azụ. Ma eleghị anya o siiri ụfọdụ ndị bụ di ike ịnakwere na e nwere onye ọzọ—Jehova Chineke—onye nwunye ya na-aghaghị ido onwe ya n’okpuru ya ugbu a. (1 Ndị Kọrint 11:3) Otu nwanyị na Chihuahua, Mexico, kwuru ka e duziere ya ọmụmụ Bible, mgbe oge na-agakwa ya na ụmụ ya asaa batara n’eziokwu. Na mbụ di ya megidere ha. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ chọghị ka ezinụlọ ya na-aga ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-enyefe akwụkwọ Bible. Ọ ghaghị ịbụ na o chere na nke a bụ ịkparị onwe ya. Otú ọ dị, ezinụlọ ya kwụsiri ike ná mkpebi ha ijere Chineke ozi. Mgbe oge na-aga, onye ahụ bụ di malitere ịhụ uru nke ịnakwere ndokwa Chineke. Ma afọ 15 gafere tupu ọ rara onwe ya nye Jehova.

N’akụkụ nile nke Mexico, a ka nwere ọtụtụ ógbè ndị dịpụrụ adịpụ ebe ndị bi na ha ka nwere asụsụ India na omenala ala nna ha. Ozi Bible na-erute ndị a, ọ na-enyekwara ha aka inwe ọganihu n’ọnọdụ ha n’etiti ọha mmadụ, ebe ụfọdụ na-amụta ịgụ ihe na ide ihe mgbe ha na-amụ eziokwu. Otú ọ dị, na ndị mmadụ nwere agụmakwụkwọ dị nta ma ọ bụ ihe onwunwe ole na ole apụtaghị nnọọ na ha ga-aṅa ntị karị. Nganga n’ihi agbụrụ na nrapagidesi ike n’ebe omenala ndị nna ochie dị na-eme ka o siere ụfọdụ ndị ike mgbe ụfọdụ ịnakwere eziokwu ahụ. Nke a na-akọwakwa ihe mere na n’ime obodo ụfọdụ nke ndị India, ndị na-anakwere eziokwu ahụ na-abụ ndị ndị ọzọ bi n’ime obodo ahụ na-emenye ụjọ. Ya mere ịdị umeala n’obi dị n’ọtụtụ ụdị.

Jiri Umeala n’Obi Zaghachi

Gịnị banyere gị onwe gị? Ị̀ na-anabata eziokwu nke Okwu Chineke? Ka ò siiri gị ike ịnakwere eziokwu ụfọdụ nke Bible? Ma eleghị anya ị ga-achọ inyocha onwe gị ịchọpụta ihe na-egbochi gị. Ọ̀ na-agbakasị gị ahụ n’ihi na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ a na-adọta n’eziokwu ahụ bụ ndị sitere n’ọnọdụ dị ala? Ọ̀ pụrụ ịbụ na echiche gị metụtara nganga onwe onye? Ọ dị mma ịtụgharị uche n’okwu Pọl onyeozi: “Ọ bụ ihe nzuzu nke ụwa ka Chineke họpụtara, ka O wee mee ka ihere mee ndị maara ihe; ọ bụkwa ihe na-adịghị ike nke ụwa ka Chineke họpụtara, ka O wee mee ka ihere mee ihe dị ike; ọ bụkwa ihe dị ala nke ụwa, na ihe a kpọrọ ihe efu, ka Chineke họpụtara, bụ́ ihe nke na-adịghị, ka O wee mee ka ihe nke na-adị ghara ịdị irè: ka anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, wee ghara ịnya isi n’ihu Chineke.”—1 Ndị Kọrint 1:27-29.

Ị̀ ga-ajụ otu akụ̀ nanị n’ihi na ị chọtara ya n’ime mkpọ ájá ụrọ nke na-adịghị mma n’anya? Ee e ma ọlị! Ma nke ahụ bụ ụzọ Chineke họọrọ isi wepụtara anyị Okwu eziokwu ya nke na-azọpụta ndụ, dị ka Pọl onyeozi na-akọwa: “Anyị nwere akụ̀ a n’ite ájá, ka ọkịka nke ike ahụ wee bụrụ nke Chineke, gharakwa isite n’anyị onwe anyị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ịdị umeala n’obi na iwetu onwe onye ala ga-enyere anyị aka ịhụ ezi abamuru nke akụ̀ ahụ, ọ bụghịkwa nanị ‘ite ájá,’ ma ọ bụ ụmụ mmadụ, na-ebutere anyị ya. N’ime nke ahụ, anyị ga-emekwa ka o kwe omume karị anyị ịbụ ndị ‘e zobere n’ụbọchị iwe Jehova’ ma nọrọ n’etiti ndị dị umeala n’obi “ga-eketa ụwa.”—Zefanaịa 2:3; Matiu 5:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya