Ịzụlite Egwu Chineke
“Tụọ egwu Jehova, wee si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị.”—ILU 3:7.
1. Olè ndị ka e deere Ilu?
AKWỤKWỌ Bible bụ́ Ilu nwere ụba nke ndụmọdụ ime mmụọ. Jehova wepụtara akwụkwọ nduzi nke a na mbụ iji nye mba ihe atụ ya bụ́ Israel ntụziaka. Taa, ọ na-enye mba ya dị nsọ nke ndị Kraịst, “ndị ọgwụgwụ oge ndị a ruteworo,” okwu ndị amamihe dị na ha.—1 Ndị Kọrint 10:11; Ilu 1:1-5; 1 Peter 2:9.
2. N’ihi gịnị ka ịdọ aka ná ntị dị n’Ilu 3:7 ji kwesị ekwesị taa karịsịa?
2 N’ịsapeta Ilu 3:7, anyị na-agụ, sị: “Abụla onye maara ihe n’anya gị onwe gị; tụọ egwu Jehova, wee si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị.” Eri oge nne na nna anyị mbụ, mgbe Agwọ ahụ ji nkwa nke ha ịdị “na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ” rafuo Iv, amamihe nkịtị nke mmadụ adawo ada n’igbo mkpa nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Jenesis 3:4, 5; 1 Ndị Kọrint 3:19, 20) Ọ dịghị mgbe ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke a doworo anya karịa na narị afọ nke 20 nke a—“mgbe ikpeazụ” ndị a mgbe ịkpọasị agbụrụ, ime ihe ike, na ụdị ọ bụla nke omume rụrụ arụ na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti, ka ha na-aghọta mkpụrụ nke ekweghị na Chineke, echiche mmụta evolushọn. (2 Timoti 3:1-5, 13; 2 Pita 3:3, 4) Ọ bụ ‘adịghị ná ndokwa ụwa ọhụrụ’ nke ma òtù UN ma okpukpe ndị kerisịrị ekeri nke ụwa na-apụghị idokwa.
3. Ihe ndị dị aṅaa na-eme eme ka e buru amụma ha banyere ụbọchị anyị?
3 Okwu amụma Chineke na-eme ka anyị mara na ndị mmụọ ọjọọ apụkwuruwo “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi, ime ka ha zukọọ ibu agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile . . . n’ebe ahụ nke a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha–Magedọn.” (Mkpughe 16:14, 16) N’isi nso, ihe egwu site n’aka Jehova ga-ekpuchi ndị eze ahụ, ma ọ bụ ndị na-achị isi. Ọ ga-adị ka ụjọ dakwasịrị ndị Kenean mgbe Joshua na ndị Israel bịara imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ha. (Joshua 2:9-11) Ma taa, ọ bụ onye ahụ nke Joshua mere ihe atụ ya, Kraịst Jisọs—“Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile”—bụ onye ‘ga-etigbu mba nile, werekwa mkpanaka nke ígwè zụọ ha dị ka atụrụ’ ná ngosipụta nke “iwe Chineke Onye pụrụ ime ihe nile.”—Mkpughe 19:15, 16.
4, 5. Olè ndị ga-enweta nzọpụta, n’ihi gịnịkwa?
4 Ònye ga-enweta nzọpụta n’oge ahụ? Ndị a gbapụtara ga-abụ, ọ bụghị ndị ụjọ rikpuru, kama ndị nile zụlitere egwu nsọpụrụ ofufe maka Jehova. Kama ịbụ ndị nwere amamihe n’anya onwe ha, ndị a na-esi ‘n’ihe ọjọọ wezụga onwe ha.’ N’umeala n’obi, ha na-eji ihe dị mma azụ uche ha, ka e wee ghara inwe ohere maka ihe ọjọọ n’echiche ha. Ha na-enwe obi ụtọ ná nkwanye ùgwù na-ewuli elu maka Eze Onyenwe anyị Jehova, “Onyeikpe ụwa nile,” onye na-achọ igbusisị onye ọ bụla na-arapara n’ihe ọjọọ, dị ka o kpochapụrụ ndị Sọdọm ahụ rụrụ arụ. (Jenesis 18:25) N’ezie, nye ndị Chineke, “egwu Jehova bụ isi iyi nke ndụ, isi n’ọnyà nile nke ọnwụ wezụga onwe [ha].”—Ilu 14:27.
5 N’ụbọchị a nke ikpe Chineke, ndị nile na-enyefe Jehova onwe ha kpam kpam n’egwu nke ịnwa anwa mejọọ ya ga-aghọta eziokwu ahụ e kwupụtara n’ụzọ ihe atụ n’Ilu 3:8: “[Egwu Jehova] bụrụ ihe na-agwọ otubo gị, ya bụrụkwa ụmị dịịrị ọkpụkpụ gị nile.”
Ịsọpụrụ Jehova
6. Gịnị kwesịrị ịkwali anyị ịṅa ntị n’Ilu 3:9?
6 Egwu Jehova anyị nwere site n’obi ekele, ya na ịhụnanya siri ike maka ya, kwesịrị ịkwali anyị ịṅa ntị n’Ilu 3:9: “Sọpụrụ Jehova site n’akụ̀ gị, sitekwa ná mkpụrụ mbụ nke ihe omume gị nile.” A naghị arụgide anyị iji onyinye anyị sọpụrụ Jehova. Ndị a kwesịrị ịbụ n’afọ ofufo, dị ka e gosiri ihe dị ka ugboro 12 site n’Ọpụpụ 35:29 ruo Deuterọnọmi 23:23 n’ihe banyere àjà ndị a chụrụ n’Israel oge ochie. Mkpụrụ mbụ ndị a a na-enye Jehova kwesịrị ịbụ onyinye ndị kachasị mma anyị pụrụ inye, ná mmata nke ịdị mma na ebere anyị nwetaworo n’aka ya. (Abụ Ọma 23:6) Ha kwesịrị igosipụta mkpebisi ike anyị ‘ibu ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya.’ (Matiu 6:33) Gịnịkwa na-esite n’iji akụ̀ anyị na-asọpụrụ Jehova? “Ọba gị nile ga-ejupụtakwa n’ihe nriju afọ, ebe nzọcha mkpụrụ vine gị nile ga-etiwakwa ná mmanya vine ọhụrụ.”—Ilu 3:10.
7. Mkpụrụ mbụ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị inye Jehova, gịnị ka ọ ga-arụpụtakwa?
7 Ụzọ bụ isi Jehova si agọzi anyị bụ nke ime mmụọ. (Malakaị 3:10) Ya mere, mkpụrụ mbụ anyị na-enye ya kwesịrị ịbụ nke ime mmụọ n’ụzọ bụ isi. Anyị kwesịrị iji oge, ume, na ike anyị mee ihe n’ime uche ya. Nke a n’akụkụ nke ya ga-azụ anyị, n’otu ụzọ ahụ nke ihe omume dị otú ahụ si ghọọ “ihe oriri” na-enye ume nye Jisọs. (Jọn 4:34) A ga-eme ka ọba anyị nke ime mmụọ jupụta, ọṅụ anyị kwa, nke e ji mmanya ọhụrụ mee ihe atụ ya, ga-etiwakwa. Tinyere nke ahụ, ka anyị ji ntụkwasị obi na-ekpe ekpere maka afọ ojuju nke nri anụ ahụ kwa ụbọchị, anyị pụrụ mgbe nile ịtụ ụtụ n’afọ ofufo site n’ihe anyị nwere ná nkwado nke ọrụ Alaeze zuru ụwa ọnụ. (Matiu 6:11) Ihe nile anyị nwere, gụnyere ihe ndị a na-ahụ anya, bịaara anyị site n’aka Nna anyị na-ahụ n’anya nke eluigwe. Ọ ga-awụpụkwuru anyị ngọzi, ruo n’ókè nke anyị jiri akụ̀ ndị a mee ihe iji nye ya otuto.—Ilu 11:4; 1 Ndị Kọrint 4:7.
Ịba Mba nke Ịhụnanya
8, 9. Olee otú anyị kwesịrị isi lee ịba mba na ịdọ aka ná ntị anya?
8 N’amaokwu nke 11 na 12, Ilu isi 3 kwukwara ọzọ banyere mmekọrịta obi ụtọ nke nna na nwa nke dị n’ime ezinụlọ ndị na-atụ egwu Chineke, nakwa n’etiti Jehova na ụmụ ime mmụọ ya ọ hụrụ n’anya nke ukwuu n’elu ụwa. Anyị na-agụ: “Nwa m, ajụla ịdọ aka ná ntị nke Jehova: ike agwụkwala gị n’ịba mba Ya: n’ihi na onye Jehova na-ahụ n’anya ka Ọ na-abara mba; ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.” Ndị ụwa kpọrọ ịba mba asị. Ndị Jehova kwesịrị ịnabata ya. Pọl onyeozi hotara okwu ndị a site n’Ilu, na-asị: “Nwa m, agụla ya n’ihe nta, bụ́ ozizi Onyenwe anyị na-ezi gị site n’inye gị ahụhụ, adakwala mbà mgbe Ọ na-atụ gị mmehie gị n’anya, n’ihi na onye Onyenwe anyị hụrụ n’anya ka Ọ na-ezi ihe site n’inye ya ahụhụ . . . Ozizi nile site n’inye ahụhụ na-adị ka ihe na-adịghị eweta ọṅụ n’oge dị ugbu a, kama mwute: ma e mesịa ọ na-enyeghachi ndị ahụ e werewooro ya nwapụta ha mkpụrụ nke dị n’udo, bụ́ mkpụrụ nke ezi omume.”—Ndị Hibru 12:5, 6, 11.
9 Ee, ịba mbà na ịdọ aka ná ntị bụ akụkụ dị mkpa nke ọzụzụ nke onye ọ bụla n’ime anyị, ma ànyị natara ya n’aka ndị mụrụ anyị, site n’ọgbakọ ndị Kraịst, ma ọ bụ ka anyị na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ n’oge ọmụmụ ihe onwe onye anyị. Ọ bụ okwu ọnwụ na ndụ anyị ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị, dị ka Ilu 4:1, 13 na-ekwukwa: “Ụmụ m, nụrụnụ ịdọ aka ná ntị nke nna, tọọkwanụ ntị n’ala ịma nghọta. Jide ịdọ aka ná ntị aka; ahala ya aka: chebe ya; n’ihi na ya onwe ya bụ ndụ gị.”
Obi Ụtọ Kasịnụ
10, 11. Gịnị bụ akụkụ ụfọdụ nke okwu ndị na-atọ ụtọ dị n’Ilu 3:13-18?
10 Leenụ aha okwu mara mma sochirinụ, n’ezie ‘okwu eziokwu ndị na-atọ atọ ma zie ezi’! (Eklisiastis 12:10) Okwu ndị a Solomọn kwuru n’ike mmụọ nsọ na-akọwa ezi obi ụtọ. Ha bụ okwu ndị anyị kwesịrị idekwasị n’obi anyị. Anyị na-agụ:
11 “[Obi ụtọ na-adịrị, NW] mmadụ nke chọtaworo amamihe . . . ya na mmadụ nke na-enwepụta nghọta. N’ihi na ọzụzụ ahịa ya dị mma karịa ọzụzụ ahịa ọla ọcha, uru ya dị mma karịa ọlaedo ọma. Ihe dị oké ọnụ ahịa ka ọ bụ karịa ruby: ihe nile kwa nke na-atọ gị ụtọ, ha agaghị aha ka ya. Ụbọchị ndụ dị ogologo dị n’aka nri ya; n’aka ekpe ya ka akụ̀ na nsọpụrụ dị. Ụzọ ya nile bụ ụzọ nke ịdị ụtọ, okporo ụzọ ya nile bụkwa udo. Osisi na-enye ndụ ka ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka: ee, onye ọ bụla nke na-ejisi ya aka ike bụ onye [obi ụtọ, NW].”—Ilu 3:13-18.
12. Olee otú amamihe na nghọta kwesịrị isi baara anyị uru?
12 Amamihe—lee ka e si kpọtụ nke a aha n’akwụkwọ Ilu mgbe mgbe, ugboro 46 ná ngụkọta! “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.” Nke a bụ amamihe Chineke, nke bara uru, nke dabeere n’ihe ọmụma nke Okwu Chineke nke na-enyere ndị ya aka ịgbaziri onwe ha ụzọ gabiga ifufe dị ize ndụ na-efe n’ụwa Setan. (Ilu 9:10) Nghọta, nke e zoro aka na ya ugboro 19 n’Ilu, bụ ihe ya na amamihe na-agakọ, na-enyere anyị aka ịlụso ihe aghụghọ nile nke Setan ọgụ. N’ịrụ arụrụala ya nile nke aghụghọ, Onye Iro ukwu ahụ nwere ọtụtụ puku afọ nke ahụmahụ. Ma anyị nwere ihe bara uru nke ukwuu karịa ahụmahụ dị ka onye ozizi—nghọta Chineke, ikike ịma ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ na ịhọrọ ụzọ ziri ezi ịgbaso. Nke ahụ bụ ihe Jehova na-akụziri anyị site n’Okwu ya.—Ilu 2:10-13; Ndị Efesọs 6:11.
13. Gịnị pụrụ ichebe anyị n’oge ọnọdụ akụ na ụba siri ike, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
13 Ọgba aghara ọnọdụ akụ na ụba n’ụwa taa bụ ihe na-ebute mmezu nke amụma dị n’Ezikiel 7:19 ụzọ: “Ọlaọcha ha ka ha ga-atụfu n’èzí nile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe ịsọ nsọ; ọlaọcha ha na ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha n’ụbọchị nrubiga ókè nke iwe Jehova.” Akụ̀ na ụba nile a na-ahụ anya n’ụwa erutụdịghị ka ike nzọpụta nke amamihe na nghọta. Eze Solomọn nwere amamihe kwuru n’oge ọzọ, sị: “Amamihe bụ ndo, ego bụkwa ndo: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” (Eklisiastis 7:12) Obi ụtọ n’ezie na-adịrị ndị nile taa na-ejegharị n’ụzọ Jehova nke ịdị ụtọ na ndị ji amamihe na-ahọrọ “ụbọchị ndụ dị ogologo,” ndụ ebighị ebi nke bụ onyinye Chineke nyere onye ọ bụla na-etinye okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs!—Ilu 3:16; Jọn 3:16; 17:3.
Ịzụlite Ezi Amamihe
14. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova gosipụtaworo amamihe kwesịrị nṅomi?
14 O kwesịrị ekwesị ka anyị bụ́ ụmụ mmadụ, ndị e kere n’onyinyo Chineke, gbalịsie ike ịzụlite amamihe na nghọta, àgwà ndị Jehova n’onwe ya gosipụtara mgbe ọ na-arụ ọrụ okike ya ndị dị ebube. “Jehova jiri amamihe tọọ ntọala ụwa; o doziri eluigwe site ná nghọta.” (Ilu 3:19, 20) Ọ gara n’ihu ike ihe ndị dị ndụ, ọ bụghị site n’usoro dị omimi, nke a na-apụghị ịkọwa akọwa, nke evolushọn, kama site n’ọrụ nke ike ihe kpọmkwem, nke ọ bụla “n’ụdị ya” nakwa maka nzube amamihe dị na ya. (Jenesis 1:25, NW) Mgbe e mesịrị mee ka mmadụ pụta ya na ọgụgụ isi na ikike karịrị nke anụmanụ ndị ahụ nke ukwuu, mkpu ọṅụ nke ụmụ ndị ikom bụ́ ndị mmụọ ozi nke Chineke aghaghị ịdapụtawo ụda ọtụtụ ugbo n’eluigwe nile. (Tụlee 38:1, 4, 7.) Ikike Jehova ibu ụzọ hụ ihe dị n’ihu, amamihe ya, na ịhụnanya ya pụtara ìhè nke ọma n’ihe nile o mere n’elu ụwa.—Abụ Ọma 104:24.
15. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ezughị ezu ịzụlite amamihe? (b) Obi ike dị aṅaa ka Ilu 3:25, 26 kwesịrị ịkpalite n’ime anyị?
15 Anyị agaghị nanị azụlite àgwà Jehova ndị bụ́ amamihe na nghọta kamakwa anyị ga-ejigidesikwa ha aka ike, ghara ịha aka mgbe ọ bụla n’ọmụmụ ihe anyị nke Okwu ya. Ọ na-enye anyị ndụmọdụ, sị: “Nwa m, ekwela ka ha si n’anya gị abụọ wezụga onwe ha; chebe nzube ihe na izuzu; ha ga-abụkwara mkpụrụ obi gị ndụ, bụkwaara olu gị amara.” (Ilu 3:21, 22) Anyị pụrụ isi otú a jegharịa ná ntụkwasị obi na n’udo nke uche, ọbụna n’oge ụbọchị ‘mbibi mberede’ ahụ na-abịa dị ka onye ohi ga-abịakwasị ụwa Setan. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3) N’oge oké mkpagbu ahụ n’onwe ya, “atụla egwu site n’oké egwu mberede, ma ọ bụ site n’ikuku siri ike nke ndị na-emebi iwu, mgbe ọ na-abịa: n’ihi na Jehova ga-abụ ntụkwasị obi gị, ọ ga-edebekwa ụkwụ gị ka a ghara ijide ya.”—Ilu 3:23-26.
Ịhụnanya Maka Ime Ezi Ihe
16. Ihe omume dị aṅaa ka a chọrọ n’aka ndị Kraịst tinyere ịnụ ọkụ n’obi ha n’ozi ahụ?
16 Ụbọchị ndị a bụ maka ịnụ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ ka ọ bụrụ àmà nye mba nile. Ma a ghaghị iji ọrụ ndị ọzọ nke ndị Kraịst sochie ọrụ ịgba àmà nke a, dị ka a kọwara n’Ilu 3:27, 28: “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya. Asịla mmadụ ibe gị, Jee, lata, echi ka m ga-enye gị; mgbe ọ dị n’aka gị.” (Tụlee Jemes 2:14-17.) Ebe akụkụ ka ukwuu nke ụwa nọ n’agbụ nke ịda ogbenye na ụnwụ nri, a kpọwo òkù ndị dị ngwa inyere mmadụ ibe anyị aka, karịsịa ụmụnna anyị nke ime mmụọ. Olee otú Ndịàmà Jehova siworo zaghachi?
17-19. (a) Mkpa dị aṅaa dị ngwa ka e gboro na 1993, oleekwa nzaghachi ọ kpalitere? (b) Gịnị na-egosipụta na ụmụnna anyị nọ n’ihe isi ike “na-emeribiga ókè”?
17 Were otu ihe atụ: N’afọ gara aga, òkù dị ngwa sitere n’ebe bụbu Yugoslavia. Òtù ndị bụ́ ụmụnna ná mba ndị dị gburugburu zaghachiri n’ụzọ dị ebube. N’ime ọnwa ndị ahụ na-atụ oké oyi nke oge oyi, o kwere omume ka ọtụtụ ụgbọ bu ihe enyemaka banye n’ebe ahụ a na-alụ agha, na-ebubara Ndịàmà nọ ná mkpa akwụkwọ ndị ọhụrụ, uwe oyi, nri, na ọgwụ. N’otu oge, ụmụnna ahụ tinyere akwụkwọ maka ikike ibuba tọn 15 nke ihe enyemaka, ma mgbe ha nwetara nkwado ya, ọ bụ maka 30 tọn! Ndịàmà Jehova n’Austria bugara gwongworo atọ ọzọ ngwa ngwa. Ná ngụkọta, 25 tọn ruru n’ebe e zigara ha. Lee ka ụmụnna anyị si nwee obi ụtọ ịnata ihe ime mmụọ na anụ ahụ ndị a n’ụba!
18 Olee otú ndị ahụ natara ha si zaghachi? Ná mmalite afọ a, otu onye okenye dere, sị: “Ụmụnna nwoke na nwanyị nọ na Sarajevo dị ndụ, ahụ dịkwa ha, nke kasịkwa mkpa, anyị ka siri ike n’ime mmụọ iji nagide agha nzuzu nke a. Ọnọdụ ahụ siri ike nke ukwuu n’ihe banyere nri. Ka Jehova gọzie unu ma nyeghachi unu ụgwọ ọrụ maka mgbalị ndị unu meworo maka anyị. Ndị isi ọchịchị nwere nkwanye ùgwù pụrụ iche maka Ndịàmà Jehova n’ihi ụzọ ndụ ha kwesịrị nṅomi na n’ihi ùgwù ha na-akwanyere ndị isi ọchịchị. Anyị nwekwara ekele maka nri ime mmụọ unu buteere anyị.”—Tụlee Abụ Ọma 145:18.
19 Ụmụnna ndị a nọ n’ihe ize ndụ egosiwokwa obi ekele ha site n’ozi ubi ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje. Ọtụtụ ndị agbata obi na-abịakwute ha na-asị ka e duziere ha ọmụmụ Bible ebe obibi. N’obodo Tuzla, ebe e bugara tọn ise nke nri enyemaka, 40 ndị nkwusa nyere akụkọ 25 hour n’otu n’otu nke ije ozi ná nkezi maka ọnwa ahụ, n’inye ndị ọsụ ụzọ itoolu nọ n’ọgbakọ ahụ nkwado dị mma. Ha nwere ọnụ ọgụgụ dị ịrịba ama nke 243 ndị bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs. Ezi ụmụnna ndị a “na-emeribiga ókè site n’aka Onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya.”—Ndị Rom 8:37.
20. Ịha “nhata” dị aṅaa werewooro ọnọdụ n’ebe bụbu Soviet Union?
20 Mmesapụ aka e gosipụtara site n’ọtụtụ nnukwute gwongworo ndị bu nri na uwe oyi maka inyeaka bụ́ ndị e bugara n’ebe bụbu Soviet Union abụwokwa nke e mere ihe hà ka ya dị ka ịnụ ọkụ n’obi nke ụmụnna nọ n’ebe ahụ. Dị ka ihe atụ, na Moscow ndị bịara Ememe Ncheta n’afọ a bụ 7,549, ma e jiri ya tụnyere 3,500 n’afọ gara aga. N’ime otu oge ahụ, ọgbakọ ndị dị n’obodo ahụ rịrị elu site na 12 ruo 16. N’ebe nile bụbu Soviet Union (e wezụga Baltic States), ịrị elu nke ọnụ ọgụgụ ọgbakọ bụ pasent 14, ná ndị nkwusa Alaeze 25 pasent, na ná ndị ọsụ ụzọ 74 pasent. Leenụ aha mmụọ ịnụ ọkụ n’obi na iji onwe onye achụ àjà nke ahụ bụ! Ọ na-echetara anyị narị afọ mbụ mgbe e nwere “nhata.” Ndị Kraịst nwere ihe ime mmụọ na nke anụ ahụ nyere onyinye ná mmesapụ aka nye ndị nọ n’ebe ihe na-adịchaghị mma, ebe ịnụ ọkụ n’obi nke ndị a ihe na-esiri ike wetaara ndị nyere ha onyinye ọṅụ na agbamume.—2 Ndị Kọrint 8:14.
Kpọọ Ihe Ọjọọ Asị!
21. Olee otú e si gosi ọdịiche dị n’etiti ndị maara ihe na ndị nzuzu n’okwu mmechi nke Ilu isi 3?
21 Isiakwụkwọ nke atọ nke Ilu nyeziri usoro okwu nke ọdịiche dị iche iche, jiri agbamume nke a na-emechi: “Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo, ahọpụtakwala òtù efu n’ụzọ ya nile. N’ihi na ihe arụ n’anya Jehova ka onye sihere esihie bụ: ma n’aka ndị ziri ezi ka izu nzuzo Ya dị. Ọbụbụ ọnụ Jehova dị n’ụlọ onye na-emebi iwu; ma ebe obibi ndị ezi omume ka Ọ na-agọzi. Ọ bụrụ na ọ bụ ndị na-akwa emo ka Ya onwe ya na-akwa emo, ma ọ bụ ndị dị umeala n’obi ka Ọ na-enye amara. Nsọpụrụ ka ndị maara ihe ga-eketa; ma ndị nzuzu na-ebuli nlelị.”—Ilu 3:29-35.
22. (a) Olee otú anyị pụrụ isi zere ihe ga-adabara ndị nzuzu? (b) Gịnị ka ndị maara ihe na-akpọ asị, gịnịkwa ka ha na-azụlite, na-enye ụgwọ ọrụ dị aṅaa?
22 Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị a gụnyere n’etiti ndị nzuzu? Anyị aghaghị ịmụta ịkpọ ihe ọjọọ asị, ee, na-asọ nsọ ihe Jehova na-asọ nsọ—ụzọ aghụghọ nile nke ụwa nke a nke ime ihe ike, nke ikpe ọbara mara. (Leekwa Ilu 6:16-19.) N’ụzọ dị iche, anyị aghaghị ịzụlite ihe ọma—ịkwụwa aka ọtọ, ezi omume, na umeala n’obi—ka anyị wee nweta “akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ” site n’ịdị obi umeala na ịtụ egwu Jehova. (Ilu 22:4) Nke a ga-abụ ụgwọ ọrụ ga-abịara anyị nile ji ịnọgidesi ike n’ihe tinye okwu iwu ahụ n’ọrụ nke bụ́: “Tụkwasị Jehova obi gị nile.”
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Olee otú amaokwu na-achị ihe ọmụmụ a si baa uru taa?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi sọpụrụ Jehova?
◻ N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji were ịdọ aka ná ntị n’ihe nta?
◻ Olee ebe a ga-achọta obi ụtọ kasị ukwuu?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi hụ ezi ihe n’anya ma kpọọ ihe ọjọọ asị?
[Foto dị na peeji nke 18]
A ga-agọzi ndị chụrụ ihe kasị mma ha nwere n’àjà nye Jehova n’ụba