Gbaba n’Ime Jehova
“N’ime Gị, Jehova, ka m gbabaworo.”—ABỤ ỌMA 31:1.
1. Olee otú Abụ Ọma nke 31 si ekwupụta obi ike n’ike Jehova nwere inye ebe mgbaba?
OLU abụ ụtọ na-abụ banyere otu nwoke onye, ọ bụ ezie na ike gwụsịrị ya n’uche na n’anụ ahụ, tụkwasịrị onwe ya n’elu Jehova. Okwukwe na-enwe mmeri, ka ihe ndị e kwuru n’abụ nsọ ahụ na-ekwu. N’aka a gbasapụrụ agbasapụ nke Onye Kasị Ihe Nile Elu, nwoke a na-achọta ebe mgbaba pụọ n’aka ndị mkpagbu na-achụgharị ya. “N’ime Gị, Jehova, ka m gbabaworo,” ka abụ ya na-agụ. “Ekwela ka ihere mee m ruo mgbe ebighị ebi: n’ezi omume Gị mee ka m gbapụ.”—Abụ Ọma 31:1.
2. (a) Anyị pụrụ ịtụkwasị Jehova obi dị ka ebe anyị e wusiri ike na-adabere n’ogidi abụọ dị aṅaa? (b) Ụdị Chineke dị aṅaa ka Jehova bụ?
2 Ọbụ abụ ahụ nwere otu ebe mgbaba—nke kasị mma! Ka ihe ndị ọzọ bụrụ ihe a na-ejighị n’aka, ma eziokwu nke a na-adịgide: Jehova bụ ebe ya e wusiri ike, ebe ya siri ike. Obi ike ya dabeere n’ogidi abụọ e ji n’aka. Otu, okwukwe ya, nke Jehova na-agaghị eme ka ihere mee ya, nke abụọ kwa, ezi omume Jehova, nke pụtara na Ọ gaghị anọgide na-agbahapụ onye na-ejere Ya ozi. Jehova abụghị Chineke na-emenye ndị na-ejere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ihere; ọ bụghị onye na-adịghị emezu nkwa ya. Kama nke ahụ, ọ bụ Chineke nke eziokwu na onye na-enyeghachi ndị na-atụkwasị obi n’ebe ọ nọ n’eziokwu ụgwọ ọrụ. N’ikpeazụ, a ga-enyeghachi ụgwọ ọrụ maka okwukwe! Ụzọ mgbapụ ga-abịa!—Abụ Ọma 31:5, 6.
3. Olee otú ọbụ abụ ahụ si bulie Jehova elu?
3 Ka ọ na-arọ abụ ya n’olu na-abụ ọ latụ elu ọ latụ ala, ndị na-esite n’ụda olu na-egosipụta iru újú na ahụhụ gaa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị elu na-ekwupụta obi ike, ọbụ abụ ahụ na-achọta ume nke dị n’ime. Ọ na-ebuli Jehova elu maka ịhụnanya ebere Ya. “Onye a gọziri agọzi ka Jehova bụ,” ka ọ bụrụ, “n’ihi na O mewo ka ebere Ya dị ebube n’ebe m nọ n’obodo e wusiri ike.”—Abụ Ọma 31:21.
Oké Ìgwè Ndị Ukwe nke Ndị Nkwusa Alaeze
4, 5. (a) Oké ìgwè ndị ukwe dị aṅaa na-eto Jehova taa, oleekwa otú ha siworo mee nke ahụ n’ime afọ ije ozi nke a gara aga? (Lee chaatị dị na peji nke 12-15.) (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta si egosi na e nwere ọtụtụ ndị ọzọ dị njikere isonye n’ukwe nke ndị nkwusa Alaeze? (Lee chaatị.) (ch) Ìgwè dị aṅaa n’ọgbakọ unu pụrụ ịkwụ n’ahịrị isonye n’ukwe ahụ?
4 Taa, okwu nke abụ ahụ amalitewo ịdapụta ọzọ. Ọ dịghị onye mmegide ọjọọ ọ bụla, ọdachi ọ bụla na-emere onwe ya, ma ọ bụ ahụhụ ọnọdụ akụ na ụba ọ bụla pụrụ ịkwụsị abụ otuto ndị a na-abụku Jehova; n’eziokwu, ebere Jehova adịwo ebube nye ndị ya. Gburugburu ụwa n’afọ ije ozi gara aga, oké ìgwè ndị ukwe, nke ọnụ ọgụgụ ha kasị elu bụ́ 4,709,889 n’ime 231 ala, bụrụ abụ ozi Alaeze Chineke. Ọchịchị eluigwe nke Jehova n’aka Kraịst Jisọs bụ ebe mgbaba nke na-agaghị emechu ha ihu. N’afọ gara aga, ndị nkwusa ndị a nke Alaeze sitere na 73,070 ọgbakọ tinyere ngụkọta nke 1,057,341,972 hour n’ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ. Nke a akpatawo 296,004 mmadụ igosipụta nrara ha raara onwe ha nye Chineke site na baptism ime mmiri. Leekwa ka ndị nile bịara Mgbakọ Mba Nile nke Izi Ihe Chineke e nwere na Kiev, Ukraine, n’August a gara aga, si nwee ihe ijuanya magburu onwe ya. Ha hụrụ ka ihe akụkọ weere ọnọdụ, kirie ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu e metụworo ndekọ ya nke ezi ndị Kraịst e mere baptism! Dị ka e buru n’amụma n’Aịsaịa 54:2, 3, ndị Chineke na-agbasa n’ọnụ ọgụgụ a na-enwebeghị ihe yiri ya na mbụ.
5 Otú ọ dị, ndị ọzọ ji obi ha chọọ ịghọ ndị Alaeze Chineke ga-achị kwụ n’ahịrị isonye n’ìgwè ndị ukwe ahụ. N’afọ gara aga, Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs bụ nke ngụkọta dị ịtụnanya nke 11,865,765 mmadụ bịara. E nwere olileanya na ọtụtụ n’ime ndị a ga-eru eru ịbụ abụ Alaeze ahụ site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ n’ime afọ ije ozi nke a. Leenụ ka olileanya ahụ ga-esi mee ka ọnụma jupụta onye iro nke eziokwu ahụ, Setan Ekwensu, n’obi!—Mkpughe 12:12, 17.
6, 7. Kọwaa otú otu nwoke nwere mmasị si merie mmenye ụjọ nke ndị mmụọ ọjọọ site n’enyemaka Jehova.
6 Setan ga-anwa igbochi ndị ọzọ ka ha ghara itinye olu ha n’oké ukwe ahụ. Dị ka ihe atụ, ndị nkwusa na Thailand na-achọta ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị ndị mmụọ ọjọọ ji imenye ha egwu na-eti ihe otiti. Otú ọ dị, atọhapụwo ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi site n’enyemaka Jehova. Mgbe o letasịrị otu dibịa afa n’ihi oké ọchịchọ ịmata ihe, otu nwoke nọrọ n’okpuru ike ndị mmụọ ọjọọ ruo afọ iri. Ọ gbalịri ime ka o nwere onwe ya pụọ n’ike ha site n’enyemaka otu onye ụkọchukwu, ma o nweghị ezi ọganihu ọ bụla. Otu onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova maliteere nwoke a ọmụmụ Bible ma kụziere ya site na Bible ụzọ e nwere nanị ya isi nwere onwe ya pụọ n’ike ndị mmụọ ọjọọ—nara ezi ihe ọmụma nke eziokwu, nwee okwukwe na Jehova Chineke, kpọkuokwa ya n’ekpere.—1 Ndị Kọrint 2:5; Ndị Filipaị 4:6, 7; 1 Timoti 2:3, 4.
7 N’abalị mgbe nkwurịta okwu a gasịrị, nwoke ahụ rọrọ nrọ, ebe nna ya nwụrụ anwụ nọ na ya yie ya egwu ma ọ bụrụ na ọ laghachighị bụrụ onye ya na ndị mmụọ ọjọọ na-akpakọrịta. Ezinụlọ ya malitere ịta ahụhụ. N’adịghị njikere ịbụ onye a rafuru, nwoke ahụ gara n’ihu n’ọmụmụ Bible ya ma malite ịga nzukọ. N’oge otu n’ime ọmụmụ ihe ndị ahụ, onye ọsụ ụzọ ahụ kọwara na mgbe ụfọdụ ihe ọrụ dị iche iche e ji eme ihe mgbaasị pụrụ imeghere ndị mmụọ ọjọọ ụzọ imenye ndị na-achọ inwere onwe ha pụọ n’ike ha ụjọ. Nwoke ahụ chetara na ya nwere mmanụ ụfọdụ o jiworo mee ihe dị ka ọgwụ isi ọma. Ọ matara ugbu a na ya ga-atụfu ya. Kemgbe ọ tụfuru ya, ndị mmụọ ọjọọ enyebeghịkwa ya nsogbu ọzọ. (Tụlee Ndị Efesọs 6:13; Jemes 4:7, 8.) Ya na nwunye ya na-enwe ọganihu dị mma n’ọmụmụ ihe ha, na-abịachikwa nzukọ dị iche iche anya maka ntụziaka Bible.
8, 9. Ihe mgbochi ndị ọzọ dị aṅaa ka ụfọdụ ndị nkwusa Alaeze meriworo?
8 Ihe mgbochi ndị ọzọ pụrụ ịbịada ụda nke ozi ọma ahụ. N’ihi ọnọdụ akụ na ụba sibigara ike ókè na Ghana, a chụwo ndị ọrụ n’ọrụ. Ọnụ ahịa ihe ndị e ji ebi ndụ arịwo elu ọjị, bụ́ nke na-eme ka ọ bụrụ nnọọ nsogbu inweta ihe ndị dịkarịsịrị nta dị mkpa maka ndụ. Olee otú ihe siworo na-agara ndị Jehova? Site n’ịtụkwasị Jehova obi, ọ bụghị n’onwe ha. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị otu nwoke hapụrụ otu envelopu e mechiri emechi na table dị n’ebe nnabata ndị ọbịa n’alaka ụlọ ọrụ. N’ime envelopu ahụ e nwere $200, ma ọ bụ ụgwọ ọnwa atọ nke ụgwọ dịkarịsịrị nta a na-akwụ. Envelopu ahụ sitere n’aka onye nyere onyinye nke na-achọghị ka a mara ya, ma n’elu ya e dekwasịrị ihe a: “A napụrụ m ọrụ m, ma Jehova enyewo m ọzọ. Ana m ekele ya na Ọkpara ya, Kraịst Jisọs. Iji nye aka n’ịgbasa ozi ọma nke Alaeze ahụ tupu ọgwụgwụ ahụ abịa, m na-etinye onyinye dị nta.”—Tụlee 2 Ndị Kọrint 9:11.
9 Ịbịa nzukọ na-enye aka ịzụ ndị na-esonye n’oké ukwe ahụ nke otuto nye Jehova. (Tụlee Abụ Ọma 22:22.) Otú a, n’akụkụ ebe ndịda nke Honduras, e nwere ọgbakọ a na-akpọ El Jordán. Gịnị pụrụ nnọọ iche banyere ìgwè nta a? Ọ bụ ịkwesị ntụkwasị obi ha n’ịbịa nzukọ. N’ime ndị nkwusa 19 ahụ, 12 aghaghị ịgafe otu osimiri sara mbara iji bịa nzukọ kwa izu. Nke a abụghị oké nsogbu n’oge ọkọchị, ebe ha pụrụ ịgafere osimiri ahụ na-eji nkume ndị dị n’ime ya eme ihe dị ka nkume nzọụkwụ. Otú ọ dị, n’udu mmiri, ọnọdụ na-agbanwe. Ihe bụbu warawara mmiri na-adịghị atụ egwu na-aghọ idei mmiri na-achị ọkụ ọkụ nke na-eburu ihe ọ bụla nọchiri ya ụzọ. Iji merie ihe mgbochi a, ụmụnna nwoke na nwanyị ahụ aghaghị ịma egwu mmiri. Tupu ha anagafere, ha na-etinye uwe ọmụmụ ihe ha n’ime otu tina (pan ígwè) wee jiri akpa plastik kpuchie ya. Onye kasị egwu mmiri na-eji tina ahụ eme ihe dị ka ihe ise n’elu mmiri ma na-eduru ìgwè ahụ gafere. Mgbe ha gafesịrị n’enweghị ihe ọghọm, ha na-ehichasị ahụ, yiri uwe, wee bịarute n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ihu ọchị ma na-egbukepụ ọcha!—Abụ Ọma 40:9.
Ebe Siri Ike Anyị Pụrụ Ibi Na Ya
10. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji chigharịkwuru Jehova n’oge nrụgide?
10 Ma ị̀ nọ n’okpuru mwakpo ndị mmụọ ọjọọ kpọmkwem ma ọ bụ na-enwe nrụgide site n’ihe ndị ọzọ, Jehova pụrụ ịbụ ebe gị e wusiri ike. Kpọkuo ya n’ekpere. Ọ na-aṅa ntị nke ọma ọbụna n’ube kasị ghara ịdapụta ụda nke ndị ya. Ọbụ abụ ahụ hụrụ na nke ahụ bụ eziokwu ma dee, sị: “Tọọrọ m ntị Gị n’ala; napụta m ngwa ngwa: ghọọrọ m oké nkume nke ebe siri ike, bụ́ ụlọ nke ebe e wusiri ike nke ukwuu ịzọpụta m. N’ihi na nkume m dị elu na ebe m e wusiri ike ka Ị bụ; ọzọ, n’ihi aha Gị Ị ga-edu m, duokwa m nwayọọ. Ị ga-eme ka m si n’ụgbụ nke ha zobeere m pụta; n’ihi na Gị onwe gị bụ ebe m siri ike.”—Abụ Ọma 31:2-4.
11. Kọwaa ihe mere ebe siri ike nke Jehova ji ghara ịbụ nke nwa oge.
11 Jehova na-enye ọ bụghị nanị ebe mgbaba na-adịru nwa oge kama ebe siri ike a na-apụghị ịwaba na ya bụ́ ebe anyị pụrụ ibi ná ntụkwasị obi. Idu ndú na nduzi ya emechubeghị ndị ya ihu. Ike Chineke ga-eme ka atụmatụ aghụghọ nile nke Setan na ndị ọjọọ ya ghara ịba uru. (Ndị Efesọs 6:10, 11) Ka anyị na-atụkwasị Jehova obi anyị nile, ọ ga-adọpụ anyị n’ebe ọnyà nile nke Setan dị. (2 Pita 2:9) N’ime afọ anọ gara aga, e mepewo ọrụ nkwusa Ndịàmà Jehova n’ihe dị ka 35 mba dị iche iche. Ọzọ, n’akụkụ dị iche iche nke ụwa ebe ọnọdụ ọha na eze, akụ na ụba, ma ọ bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-adọla nkwusa nke ozi ọma ahụ azụ, ụfọdụ ndị yiri atụrụ akwagawo n’ebe a pụrụ irute ha karị n’enweghị nsogbu. Japan bụ otu ebe dị otú ahụ.
12. Olee otú otu onye ọsụ ụzọ na Japan si mee Jehova ebe ya e wusiri ike?
12 Na Japan enwewo nnubata nke ndị ọrụ si ofesi, e guzobewokwa ọtụtụ ọgbakọ ndị na-asụ asụsụ mba ndị ọzọ. Ahụmahụ nke otu nwanna n’otu ọgbakọ Japanese na-eme ihe atụ otú ubi a nke ndị na-asụ asụsụ ndị mba ọzọ si na-amịpụta mkpụrụ. Ọ chọrọ ịga jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Otú ọ dị, ọ nọworị na-eduzi ọmụmụ Bible iri n’ebe ọ nọ. Otu n’ime ndị enyi ya ji njakịrị kwuo, sị: “Ọ bụrụ na ị gaa n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, ị gaje iduzi 20 ọmụmụ Bible n’ebe ahụ!” E kenyere ya ọrụ, o wee gaa Hiroshima. Ma mgbe ọnwa anọ gasịrị, o nwere nanị otu ọmụmụ Bible. Otu ụbọchị ọ kpọtụụrụ otu nwoke si Brazil bụ́ onye na-asụ nanị Portuguese. Ebe nwanna nwoke ahụ na-apụghị iso nwoke ahụ kwurịta okwu, ọ zụtara otu akwụkwọ ọmụmụ ihe n’asụsụ Portuguese. Mgbe ọ mụtasịrị okwu ụfọdụ dị mfe maka nkwurịta okwu, o letara nwoke ahụ ọzọ. Mgbe nwanna ahụ kelere ya n’asụsụ Portuguese, o juru nwoke ahụ anya, sitekwa ná nnukwute mmụmụ ọnụ ọchị, meghee ụzọ ya nke ọma ma kpọbata ya. A malitere ọmụmụ Bible. N’oge na-adịghị anya, nwanna ahụ na-eduzi ngụkọta nke 22 ọmụmụ ihe, 14 n’asụsụ Portuguese, 6 na Spanish, na 2 na Japanese!
Iji Obi Ike Na-eme Nkwusa
13. N’ihi gịnị ka onye ọ bụla na-ekwesịghị iji nwaa imenye anyị ihere iji banye n’ijere Jehova ozi?
13 Ndị Jehova ji obi ike na-abụ abụ Alaeze ahụ na-enwe okwukwe zuru ezu na Jehova bụ ebe mgbaba ha. (Abụ Ọma 31:14) A gaghị eme ka ihere mee ha—Jehova agaghị emechu ha ihu, n’ihi na ọ ga-emezu okwu ya. (Abụ Ọma 31:17) A ga-emenye Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ na-eso ya ihere. Ebe e nyere ndị Jehova ọrụ ikwusa ozi nke ihere na-adịghị ya, ndị ọzọ adịghị eji imenye ha ihere eme ka ha mee nkwusa. Ọ bụghị otú ahụ ka Jehova si akpali ndị mmadụ ife Ya ofufe, Ọkpara ya adịghịkwa eme otú ahụ. Mgbe obi ndị mmadụ jupụtara n’okwukwe na ekele maka ịdị mma na ebere ịhụnanya Jehova, ọ bụ ezi ọnọdụ nke obi ha na-akwali ọnụ ha ikwu okwu. (Luk 6:45) Otú a, oge ọ bụla anyị tinyere n’ije ozi kwa ọnwa, karịsịa ọ bụrụ na oge ahụ nọchitere anya ihe kasị mma anyị pụrụ ime, dị mma, ọ dịghị eme ihere. Ọ̀ bụ na Jisọs na Nna ya egosighị ekele zuru ezu maka mkpụrụ ego nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ?—Luk 21:1-4.
14. Olee ihe ị pụrụ ikwu banyere ọrụ ọsụ ụzọ? (Leekwa chaatị ahụ.)
14 Nye ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị nkwusa, itinye obi dum n’ofufe ha gụnyere ije ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile—890,231 bụ ọnụ ọgụgụ kasị elu n’afọ gara aga! Ọ bụrụ na a nọgide na-enwe ọganihu e nwere n’afọ gara aga, ọnụ ọgụgụ a nwere ike ịgafe 1,000,000. Ahụmahụ na-esonụ na-egosi otú otu nwanna nwanyị na Nigeria si sonye n’ìgwè ndị ọsụ ụzọ. Ọ na-ede, sị: “Mgbe m na-achọ ịgụsị akwụkwọ sekọndrị, m gara inye aka n’isiri ndị bịara ụlọ akwụkwọ ndị ọsụ ụzọ nke Ndịàmà Jehova nri. M zutere ụmụnna nwanyị abụọ n’ebe ahụ bụ́ ndị tọrọ nne nne m. Mgbe m chọpụtara na ha bụ ndị ọsụ ụzọ bịara ụlọ akwụkwọ ahụ, m chere n’ime onwe m, ‘Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ahụ pụrụ ịsụ ụzọ, n’ihi gịnị ka m na-apụghị?’ Ya mere mgbe m gụsịrị akwụkwọ, mụ onwe m ghọkwara ọsụ ụzọ oge nile.”
15. N’ụzọ dị aṅaa ka ịgba àmà mberede pụrụ isi meghee ụzọ ka ndị ọzọ gbaba n’ime Jehova?
15 Ọ bụghị mmadụ nile pụrụ ịsụ ụzọ, ma ha pụrụ ịgba àmà. Na Belgium otu nwanna nwanyị gbara 82 afọ gara ịzụta anụ. Ọ chọpụtara na nwunye onye ahụ na-egbu anụ na-enwe nnọọ nchekasị n’ihi nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị e nwere. Ya mere nwanna nwanyị ahụ jikọtara traktị Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kwere? na ego mgbe ọ kwụrụ ụgwọ. Mgbe nwanna nwanyị ahụ laghachiri n’ụlọ ahịa ahụ, nwunye onye ahụ na-egbu anụ, n’echerụtụghị echere, jụrụ ihe Bible kwuru banyere ma à ga-enwe agha ụwa nke atọ. Nwanna nwanyị ahụ wetaara ya akwụkwọ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya? Ụbọchị ole na ole n’ihu, ka nwanna nwanyị ahụ meworo okenye batara n’ụlọ ahịa ahụ, nwunye onye ahụ na-egbu anụ nwere ajụjụ ndị ọzọ ịjụ ya. Nwanna nwanyị ahụ nwere ọmịiko n’ahụ nwanyị a; ọ ghaghị nnọọ ikwu ka ya duziere ya ọmụmụ Bible, a nabatakwara nke a. Ugbu a, nwunye onye ahụ na-egbu anụ chọrọ ka e mee ya baptism. Gịnị banyere onye ahụ na-egbu anụ? Ọ gụrụ traktị ahụ, ọ na-amụkwa Bible ugbu a.
‘Ntụkọba nke Ezi Ihe’
16. Olee otú Jehova siworo setịpụ ntụkọba nke ezi ihe maka ndị ya?
16 N’ụbọchị ndị a jupụtara ná nrụgide, ọ̀ bụ na Jehova ‘emebeghị ka ebere ya dị ebube’ nye ndị gbabaworo n’ime ya? Dị ka nna nke na-ahụ n’anya, nke na-echebe nwa ya, Jehova esetịpụwo ntụkọba nke ezi ihe maka ụmụ ya n’elu ala. Ọ nọwo na-awụkwasị ha obi ụtọ n’anya ndị nile na-ekiri ha, dị nnọọ ka ọbụ abụ ahụ na-ekwu: “Lee ka ezi ihe Gị si baa ụba, nke Ị tụkọbaworo nye ndị na-atụ egwu Gị, nke Ị rụworo nye ndị na-agbaba n’ime Gị n’ihu ụmụ mmadụ.”—Abụ Ọma 31:19, 21.
17-19. Na Ghana, ihe ọma dị aṅaa ka otu nwoke meworo agadi idebanye alụmdi na nwunye ya n’akwụkwọ rụpụtara?
17 Ya mere, ndị ụwa na-aghọ ndị akaebe nke ịkwụwa aka ọtọ nke ndị na-efe Jehova, ọ na-atụkwa ha n’anya. Dị ka ihe atụ, na Ghana, otu nwoke gbara 96 afọ gara n’ọfịs onye na-edebanye alụmdi na nwunye n’akwụkwọ ma kwuo ka e debanye alụmdi na nwunye mbikọta ọnụ ya dịworo 70 afọ ugbu a. Onye ọrụ alụmdi na nwunye ahụ kụjara ma jụọ: “Ì ji n’aka na nke ahụ bụ ihe ị chọrọ ime? N’afọ ndụ gị?”
18 Nwoke ahụ kọwara: “M chọrọ ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma kere òkè n’ọrụ kasị mkpa tupu ọgwụgwụ nke ụwa—ọrụ nke ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ọrụ a na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Ndịàmà Jehova na-erubere iwu obodo isi, gụnyere iwu banyere idebanye alụmdi na nwunye n’akwụkwọ. Ya mere biko debanyere m ya.” O riri onye ọrụ ahụ ọnụ. Ọ gara n’ihu idebanye ya, obi tọkwara nwoke ahụ meworo okenye ụtọ na ya nwere ugbu a alụmdi na nwunye iwu kwadoro.—Tụlee Ndị Rom 12:2.
19 Mgbe nke ahụ gasịrị, onye ahụ na-edebanye alụmdi na nwunye n’akwụkwọ tụgharịrị uche n’ihe ndị ọ nụworo. “Ndịàmà Jehova . . . ọrụ kasị mkpa . . . ọgwụgwụ ụwa . . . Alaeze Chineke . . . ndụ ebighị ebi.” N’ijuanya banyere ihe ihe a dum pụtara ná ndụ nke nwoke gbara 96 afọ, o kpebiri ịchọta Ndịàmà iji lebakwuo anya n’okwu ahụ. Ọ nakweere ọmụmụ Bible ebe obibi ma nwee ọganihu dị ngwa. Taa, onye a na-edebanye alụmdi na nwunye n’akwụkwọ bụ Onyeàmà e mere baptism. Otú a, mgbe anyị rubeere Jehova isi ọbụna n’ihe ndị ọzọ pụrụ ile anya dị ka ihe ndị dị nta, ọ pụrụ ịrụpụtara anyị na ndị na-ekiri akparamagwa anyị ihe ọma a na-apụghị ịkọ n’ọnụ.—Tụlee 1 Pita 2:12.
20. Na Myanmar, olee otú ịkwụwa aka ọtọ nke otu nwanna nwanyị na-eto eto si duba n’ịgba àmà dị mma?
20 Ndị meworo okenye kweworo ka eziokwu ahụ kpụzie ha ịbụ ndị na-akwụwa aka ọtọ na-esetịpụrụ ndị na-eto eto ihe nlereanya ọma n’ụwa nke a nke emeghị ihe n’eziokwu. Na Myanmar ka otu nwanna nwanyị dị otú ahụ bụ́ onye na-eto eto bi. O sitere n’ezinụlọ dara ogbenye na nke e ledara anya nke nwere ụmụ iri. Nna ya, onye laworo ezumike nká, bụ ọsụ ụzọ oge nile. Otu ụbọchị n’ụlọ akwụkwọ, nwanna nwanyị ahụ hụrụ otu mgbaaka diamọnd, bụ́ nke o wegaara onye nkụzi ya ozugbo. Mgbe klasị ahụ zukọrọ n’ụbọchị na-eso ya, onye nkụzi ahụ gwara klasị ahụ otú e si chọta mgbaaka ahụ ma weta ya ka e weghachiri ya onye nwe ya. Mgbe ahụ ọ gwara nwanna nwanyị ahụ na-eto eto ka o guzo n’ihu klasị ahụ dum ma kọwaa ihe mere o jiworo mee nke a, ebe ọ maara na ụmụaka ndị ọzọ pụrụ ịhọrọwo idebe ya. Nwanna nwanyị ahụ kọwara na ya bụ Onyeàmà Jehova nakwa na Chineke ya enweghị mmasị n’izu ohi ma ọ bụ ụdị ọ bụla nke emeghị ihe n’eziokwu. Ụlọ akwụkwọ ahụ dum nụrụ banyere ya, na-enye nwanna anyị nwanyị ka na-eto eto ohere ịgbara ndị nkụzi nakwa ụmụ akwụkwọ àmà.
21. Ka ndị na-eto eto na-atụkwasị Jehova obi, olee otú akparamagwa ha si enwe mmetụta n’ebe ọ nọ?
21 Na Belgium otu onye nkụzi kwuru ihe na-adọrọ mmasị n’ime klasị banyere Ndịàmà Jehova. Ọ hụwo akparamagwa nke otu n’ime ụmụ klasị ya, onye bụkwa nwanna nwanyị na-eto eto, wee sị: “Enwere m ugbu a echiche ọzọ banyere Ndịàmà Jehova. Mkpọrọmasị edubawo m n’iche na ha ga-abụ ndị kasị ghara ịdị na-ekwe ndị ọzọ biri. Ha nwapụtara onwe ha ịbụ ndị kasị na-ekwe ndị ọzọ biri, ma ghara ịdị na-emebi ụkpụrụ ha dị iche iche.” Kwa afọ ndị nkụzi na-enye ụmụ klasị ha kasị mma ihe nrite. N’etiti ihe ndị ọzọ a na-erite bụ nke a na-erite maka akparamagwa. Ruo afọ atọ n’esepụghị aka, onye nkụzi a enyewo ụmụ Ndịàmà Jehova ihe nrite maka akara atọ ndị kasị elu. Otú a ka ọ na-adịkarị n’ebe ndị ji ịnọgidesi ike n’ihe na-atụkwasị Jehova obi nọ.—Abụ Ọma 31:23.
22. Gịnị bụ abụ mmeri e ji mechie Abụ Ọma nke 31, oleekwa otú nke ahụ si enyere anyị aka n’ụbọchị ikpeazụ ndị a nke usoro ihe nke a?
22 Abụ Ọma nke 31 ji abụ mmeri mechie: “Dịnụ ike, ka obi unu nweekwa ume, unu nile ndị na-echere Jehova.” (Abụ Ọma 31:24) Ya mere, ka anyị na-eche ụbọchị ndị ikpeazụ nke usoro ihe ọjọọ Setan ihu, kama ịhapụ anyị ma ọlị, Jehova ga-abịakwu anyị nso nke ukwuu ma tinye ike nke ya onwe ya n’ime anyị. Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, ọ dịghịkwa ada ada. Ọ bụ ebe mgbaba anyị; ọ bụ ụlọ elu anyị dị ike.—Ilu 18:10.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jiri obi ike mee Jehova ebe mgbaba anyị?
◻ Olee ihe àmà e nwere nke na oké ìgwè ndị ukwe na-abụ abụ Alaeze n’obi ike?
◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na ụgbụ Setan agaghị amata ndị Jehova n’ọnyà?
◻ Ntụkọba dị aṅaa ka Jehova setịpụworo maka ndị na-agbaba n’ime ya?
[Chaatị dị na peeji nke 12-15]
AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1993 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE
(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)
[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]
Ndị gbabara n’ime Jehova mejupụtara oké ìgwè ndị ukwe nke ndị nkwusa Alaeze—4,709,889!
1. Senegal
2. Brazil
3. Chile
4. Bolivia