Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 3/1 p. 24-28
  • “Aka Jehova” ná Ndụ M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Aka Jehova” ná Ndụ M
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ Nkwusa n’Oge M Dị na Nwata
  • A Machibido Ọrụ Anyị Iwu na Canada
  • Ọtụtụ Akụkụ nke Ozi Oge Nile
  • Ịzụlite Ụmụ Anyị na Brazil
  • Ịlaghachi Canada
  • Nhọrọ Ndị Ziri Ezi M Mere Ewetara m Ngọzi Na-adịgide Adịgide
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ijere Jehova Ozi Dị Ka Ezinụlọ Dị n’Otu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Anyị Hụrụ Ọtụtụ Ụzọ Jehova Si Meere Anyị Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ịchụso Ihe Mgbaru Ọsọ nke M Setịpụrụ Mgbe M Dị Afọ Isii
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 3/1 p. 24-28

“Aka Jehova” ná Ndụ M

DỊ KA LAWRENCE THOMPSON SI KỌỌ

N’OTU abalị na 1946, mụ na papa m nọdụrụ ala n’ime ụgbọ ala na-ekiri ọkụ ndị na-egbu amụ̀má n’ebe ugwu ka ha na-awụgharị n’ihu igwe. Anyị kwurịtara okwu banyere ịdị ebube Jehova na ịdị ntakịrị anyị. Anyị chetaghachiri ihe ndị meworo n’afọ ndị gara aga mgbe a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Canada. Papa m mere ka ọ gbaa mkpọrọgwụ n’ime m otú Jehova si kwadoo anyị ma duzie ndị Ya n’afọ ndị ahụ.

ỌBỤ ezie na m dị nanị afọ 13, m pụrụ ịghọta eziokwu nke ihe Papa m na-ekwu. O mekwara ka ọ gbaa mkpọrọgwụ n’ime m bụ́ echiche nke ịdị ngwa na ibu ibu nke ọrụ nkwusa a ka ga-arụ. Papa hotara Ọnụ Ọgụgụ 11:23 ma mesie ya ike nye m na, n’ezie, aka Jehova adịghị mgbe ọ na-adị mkpụmkpụ. Ọ bụ nanị anyị enweghị okwukwe na ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ na-akpara ihe ọ ga-emere anyị ókè. Ọ bụ nkwurịta okwu dị oké ọnụ ahịa n’etiti nna na nwa, nke ọ na-adịghị ihe ga-eme ka m chezọọ ya.

Ịmụ mbipụta dị iche iche nke Watch Tower, karịsịa akwụkwọ Salvation, nke e bipụtara na 1939, metụtakwara ndụ m nke ukwuu mgbe m dị na nwata. M gaghị echezọ ma ọlị ihe atụ mmeghe nke akwụkwọ ahụ nke na-akpali akpali: “Ụgbọ okporo ígwè awara awara ahụ, nke jupụtara ná ndị njem, na-agba 160 kilomita kwa hour. Ọ ghaghị ịgafe osimiri ahụ n’elu otu àkwà mmiri nke gbara ngọ nke ukwuu nke na ndị nọ n’ụlọ nta ikpeazụ nke ụgbọ ahụ pụrụ ịhụ injin ya . . . Ndị ikom abụọ nọ n’ebe azụ . . . hụchatara na akụkụ ụfọdụ nke àkwà mmiri ahụ n’ebe isi ya nke ọzọ na-agba ọkụ na-adanye n’ime osimiri ahụ. Ha matara na ha na-eche oké ihe ize ndụ ihu. Nke ahụ bụ ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa. À pụrụ ịkwụsị ụgbọ okporo ígwè ahụ n’oge iji zọpụta ndụ nke ọtụtụ ndị o bu?”

N’iji ihe atụ ahụ mee ihe, akwụkwọ ahụ kwubiri, sị: “N’otu aka ahụ taa, mba nile na ndị mmadụ n’ụwa na-eche ọnọdụ kasị chọọ ime ihe ngwa ngwa ihu. A na-adọ ha aka ná ntị dị ka Chineke nyere iwu ya, na ọdachi nke Amagedọn na-eru nnọọ nso. . . . Ebe a dọworo ha aka ná ntị, onye ọ bụla nke a dọrọ aka ná ntị otú a aghaghị ịhọrọ ugbu a ụzọ ọ ga-agbaso.”

Ụgbọ okporo ígwè ahụ ji ọsọ na-agba, àkwà mmiri ahụ na-agba ọkụ, na ịdị ngwa nke ọrụ nkwusa ahụ bụ ihe ndị a kụbanyere n’uche m n’ụzọ na-adịgide adịgide.

Ọrụ Nkwusa n’Oge M Dị na Nwata

M malitere ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ na 1938, mgbe m dị afọ ise. Henry na Alice Tweed, ndị ọsụ ụzọ (ndị ozi oge nile) abụọ, ga-akpọrọ m, anyị ga-etinyekwa malite hour 10 ruo 12 kwa ụbọchị na-agwa ndị mmadụ okwu. Ụbọchị ndị ahụ zuru ezu n’ozi Jehova tọrọ m ụtọ nke ukwuu. Ya mere enwere m oké mkpali n’afọ na-esonụ mgbe Papa na Mama kwere ka m bụrụ onye nkwusa ma na-enye akụkọ ihe m rụtara n’ezie.

N’oge ndị ahụ m ka dị ná nwata, anyị keere òkè ná ngagharị mgbasa ozi, na-aga n’okporo ámá ndị bụ isi nke obodo ukwu na-eyi obodobo kaadị ndị e dekwasịrị ihe nke na-ekpughe okpukpe ụgha ma na-akpọsa Alaeze Chineke. Anyị jikwara ígwè okwu nta phonograph ndị a pụrụ ịdị na-ebugharị ebugharị ma na-akpọ ozi Bible kpọmkwem n’ọnụ ụzọ ndị nwe ụlọ. Anyị ga-akpọ okwu ndị J. F. Rutherford, onye isi oche Watch Tower Society, kwuru, bụ́ ndị m bu ụfọdụ n’ime ha n’isi. M ka pụrụ ịnụ ka ọ na-ekwu, sị: “E kwuwo ya ọtụtụ mgbe, Okpukpe bụ ọnyá na ihe aghụghọ!”

A Machibido Ọrụ Anyị Iwu na Canada

N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Canada, dị ka e meworo na Nazi Germany na n’ala ndị ọzọ. Ya mere anyị jiri nanị Bible mee ihe ma nọgide n’ọrụ Chineke nyere iwu ya n’irubere ntụziaka Bible isi. (Matiu 28:​19, 20; Ọrụ 5:29) Anyị mụtara ịnagide mwakpo ndị uwe ojii ná nzukọ anyị na n’ebe obibi anyị. Anyị nwetakwara ahụmahụ n’ịgba akaebe n’ihu ndị ọkàikpe na ịzaghachi ndị na-ajụgharị mmadụ ọnụ.

Mụ na nwanne m nwoke bụ́ Jim ghọrọ ndị ọkà n’isi n’ụgbọ ala na-agba agba tụsa akwụkwọ nta n’ọnụ ụzọ na n’ihu ụlọ ndị mmadụ. Tinyere nke ahụ, anyị rụrụ ọrụ dị ka ndị na-ebu ozi na, mgbe ụfọdụ, ndị nledo maka ndị na-agafe ókèala mba ịga mgbakọ na United States.

Ụlọ anyị dị ná mpụta Port Arthur (Thunder Bay ugbu a), Ontario, n’ihe dị ka otu hekta ala ma ọ bụ karịa nke osisi na ọhịa gbara gburugburu. Anyị nwere otu ehi, otu nwa ehi, èzì, na ọkụkọ​—⁠ha nile jekwara ozi dị ka ihe mmegharị anya maka ọrụ anyị nke inyere ndị na-eto eto ibe anyị aka bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị a na-achọgharị iji tụọ ha mkpọrọ maka ikwusa Alaeze Chineke.

N’abalị, ụgbọ ala nta, gwongworo, na trela bu ndị Kraịst na-eto eto ga-abata ma si n’ebe obibi anyị dịpụrụ iche pụọ. Anyị ga-enye ndị ntorobịa ndị a ụlọ, zoo ha, mee ka a ghara ịmata ha, ma nye ha nri, wee hapụ ha ka ha laa. Nne na nna m, tinyere ndị ọrụ mbụ ndị ahụ, bụ ndị ji mkpụrụ obi ha nile na-eje ozi, bụ́ ndị kpụziri obi nwata m ijere Jehova Chineke ozi na ịhụ ya n’anya.

N’August 1941, m raara ndụ m nye Jehova, e mekwara m baptism n’otu ọdọ mmiri dị nta dị n’ime ime ọhịa. Ole na ole n’ime anyị zukọrọ maka ihe omume nke a n’etiti abalị n’otu ọnụ ụlọ a mụnyere ọkụ n’ime ya. Ọ ghaghị ịbụ n’ihi iche na ọ dị ihe ha ga-ahụ, ndị uwe ojii gagharịrị ebe ahụ, mgbe nile ahụ jiri tọọchị na-enwu zaa na-enyochagharị ọdọ mmiri ahụ, ma ha ahụghị anyị.

Ọtụtụ Akụkụ nke Ozi Oge Nile

Na 1951, m gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị wee gaa njem ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1,600 kilomita iji were ọrụ ọsụ ụzọ na Cobourg, Ontario. Ọgbakọ dị ebe ahụ pere mpe, enweghịkwa m onye mụ na ya ga-asụkọ ụzọ. Ma icheta na aka Jehova adịghị mkpụmkpụ, m nwetara otu ọnụ ụlọ n’ego, na-esiri onwe m nri, nweekwa obi ụtọ ijere Jehova ozi. N’afọ na-esonụ a kpọrọ m òkù ịbịa jee ozi n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Toronto. N’ebe ahụ amụtara m ọtụtụ ihe bara uru ndị nụchara m maka ozi Alaeze n’ọdịnihu.

Mgbe m jeworo ozi na Toronto ihe karịrị otu afọ, mụ na Lucy Trudeau lụrụ di na nwunye, n’oge oyi kwa nke 1954, anyị natara ọrụ ọsụ ụzọ na Levis, Quebec. Ọnọdụ ihu igwe na-atụ oyi nke ukwuu, mwakpo ìgwè ndị na-eme ihe ike na ndị uwe ojii na-emenye mmadụ ụjọ, ọ bụkwa ihe ịma aka ịmụta French. N’ihe a nile aka Jehova adịghị mgbe ọ dịrị mkpụmkpụ, ya mere ọ bụ ezie na e nwere mgbe ihe na-esi ike, anyị nwekwara ọtụtụ ngọzi.

Dị ka ihe atụ, a gwara anyị ka anyị nyochaa ụgbọ mmiri abụọ (Arosa Star na Arosa Kulm) bụ́ ndị Society mere atụmatụ iji buru ndị na-abịa mgbakọ mba nile ndị buru ibu na Europe na 1955. N’ịchọsi ike inweta azụmahịa Society, ndị isi ọrụ ụlọ ọrụ ndị nwere ụgbọ mmiri na-ele anyị ọbịa mgbe ụfọdụ, nke bụ ihe ntụrụndụ dị ụtọ site n’ozi ndọlị na Quebec n’oge ahụ.

N’oge udu mmiri nke 1955, a kpọrọ m òkù ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, anyị tinyekwara oge oyi ahụ nile n’ileta ọgbakọ ndị dịpụrụ adịpụ n’ebe ugwu Ontario na-atụ oké oyi. N’afọ nke na-esonụ, anyị gara ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead dị na United States, e mesịakwa e kenyere anyị ọrụ dị ka ndị ozi ala ọzọ na Brazil, Ebe Ndịda Kọntinent America.

Anyị tinyere obi na mkpụrụ obi anyị n’ọrụ ọhụrụ e kenyere anyị, ngwa ngwa kwa nwee ike ikwusa na izi ihe n’asụsụ Portuguese. Ná mmalite 1957, e kenyekwara m ịrụ ọrụ dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ugbu a, kama oké oyi nke Ebe Ugwu, anyị aghaghị ịnagide ajọ okpomọkụ. Ọtụtụ mgbe anyị aghaghị ịkwụsị ma wepụ ájá na-ere ọkụ n’akpụkpọ ụkwụ anyị ma ọ bụ gbujite shugaken na-ata iji nwetaghachi ume ọhụrụ. Ma e nwere ọtụtụ ngọzi.

N’obodo Regente Feijo, m gwara onye isi ndị uwe ojii okwu, o nyekwara iwu ka e mechie ụlọ ahịa nile wee gwa onye ọ bụla ka ha gaa n’ámá obodo. N’okpuru osisi na-eme okooko osisi nke nwere akwụkwọ ndị dị obodobo, m gwara ndị obodo ahụ nile okwu Bible. Taa, e nwere ọgbakọ Ndịàmà n’ebe ahụ.

Ịzụlite Ụmụ Anyị na Brazil

Mgbe Lucy tụụrụ ime na 1958, anyị nọdụrụ na Juiz de Fora ma jee ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’afọ abụọ sochirinụ, a mụrụ ụmụ anyị nwanyị, Susan na Kim. Ha nwapụtara onwe ha ịbụ ezi ngọzi n’ozi anyị, na-aghọ ndị e ji eme ọnụ n’obodo. Mgbe anyị na-akwagharị ha n’ihe e ji akwagharị ụmụ ọhụrụ n’elu okporo ámá e ji nkume cobble rụọ, ndị mmadụ ga-apụta ikiri ha. Ebe ọ bụ na e nwere oké mkpa maka ndị nkwusa Alaeze na Recife, nke dị nnọọ n’ebe ndịda etiti ụwa, anyị kwagara n’ebe ahụ na-ekpo ọkụ nke ukwuu.

Na 1961, ọ bụghị nanị na m nwere ike inye aka ime ndokwa maka njem ụgbọ elu maka Ndịàmà na-aga mgbakọ na São Paulo kamakwa m gara mgbakọ ahụ a na-adịghị echezọ echezọ n’onwe m. Otú ọ dị, ihe dị ka 20 minit mgbe anyị fegoro n’elu, na mberede ụgbọ elu ahụ kpọrọ isi n’ala, na-atụsagharị ndị o bu n’ime ụgbọ elu ahụ. Ime ụgbọ elu ahụ ghasasịrị aghasasị; oche fokapụsịrị n’ebe a rụnyere ha, ndị njem merụsịkwara ahụ ma na-agba ọbara. Dị ka ihe obi ụtọ, onye na-anya ya nwere ike ịkwụsị ụgbọ ahụ ịdaru ala, anyị wee fedaa n’enweghị ihe ize ndụ. Ọ dịghị onye n’ime anyị merụrụ ahụ nke ukwuu nke na anyị apụghị ịga n’ihu gawa São Paulo n’ụgbọ elu ọzọ. Anyị nụrụ ụtọ mgbakọ magburu onwe ya, ma ekwuru m na m gaghị efekwa elu ọzọ!

Ma, mgbe m si mgbakọ ahụ lọta, ọrụ ọzọ nọ na-eche m. M gaje ilekọta otu mgbakọ n’ime ọhịa na Teresina, Piauí State. M ga-eji ụgbọ elu fega ebe ahụ. N’agbanyeghị otú egwu si na-atụ m, m naara ọrụ ahụ, na-adabere n’aka Jehova.

Na 1962, a mụrụ nwa anyị nwoke bụ́ Greg na Recife. Ọ bụ ezie na enwekwaghị m ike ịrụ ọrụ ọsu ụzọ, n’ihi na ugbu a m nwere ezinụlọ na-amụba amụba, m nwere ike inwe mmetụta dị mma n’ahụ ọgbakọ nta ahụ. Ụmụ m nwere ịnụ ọkụ n’obi mgbe nile isonyere anyị n’ozi, ebe anyị mere ka ọ na-atọ ha ụtọ. Nke ọ bụla n’ime ha, malite n’afọ nke atọ, nwere ike iche ozi ọma n’ihu mmadụ n’ọnụ ụzọ. Anyị mere ya àgwà anyị na anyị agaghị ahapụ ịga nzukọ ma ọ bụ ikere òkè n’ozi ubi. Ọbụna mgbe otu onye n’ezinụlọ dara ọrịa, nweekwa ike onye ọzọ anọnyere onye ahụ, ndị ọzọ ga-aga nzukọ ma ọ bụ kere òkè n’ozi ubi.

N’afọ ndị na-agafenụ, mgbe mgbe anyị na-atụle dị ka ezinụlọ ihe ụmụaka ahụ ga-amụ n’ụlọ akwụkwọ na ihe mgbaru ọsọ ha ná ndụ, na-akwadebe ha maka ọrụ ná nzukọ Jehova. Anyị leziri anya ghara ikpughepụ ha nye mmetụta ndị na-akụda mmụọ, dị ka telivishọn. Anyị enweghị TV n’ụlọ anyị ruo mgbe ụmụaka ahụ nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu. N’agbanyeghịkwa na anyị nwere ego ya, anyị ejighị ihe onwunwe zụtọọ ha. Dị ka ihe atụ, anyị zụtara nanị otu ịnyịnya ígwè, nke ha atọ ga na-ekerịta.

Anyị mekọrọ ihe ọnụ ruo ókè o kwere omume, na-atụ bọl nkata, na-egwu mmiri, na-eme njem dị ka ezinụlọ. Njem ndị anyị na-eme bụ maka ịga mgbakọ ndị Kraịst ma ọ bụ ileta ebe obibi Betel ná mba dị iche iche. Njem ndị a nyere anyị oge ikwukọrịta okwu ọnụ n’atụghị egwu ka mụ na Lucy wee nwee ike ịmata ihe dị n’obi ụmụ anyị. Anyị nwere ekele dị ukwuu maka Jehova maka afọ ndị ahụ dị ụtọ!

N’ikpeazụ, afọ iri anyị nọrọ n’Ebe Okpomọkụ nso etiti ụwa kpara ike ọjọọ ya n’ahụ ike Lucy. Ya mere, anyị nabatara mgbanwe ọrụ ịga n’ebe e nwere ihu igwe katụ mma n’ebe ndịda, na Curitiba, Paraná State.

Ịlaghachi Canada

Na 1977, mgbe ihe dị ka 20 afọ na Brazil gasịrị, mụ na Lucy na ụmụ anyị lọghachiri Canada iji nye aka ilekọta nna m ahụ na-arịa. Lee oké ọdịiche ọdịbendị nke ahụ bụụrụ ezinụlọ anyị! Ma ọ bụghị ọdịiche n’ụzọ ime mmụọ, ebe anyị nọgidere n’usoro ime ihe anyị, anyị na òtù ndị bụ́ ụmụnna bụ́ ndị Kraịst na-ahụ n’anya.

Na Canada ozi oge nile ghọrọ ọrụ ezinụlọ ka ụmụ agbọghọ m nke ọ bụla banyere n’ozi ọsụ ụzọ oge nile. Anyị nile keere òkè n’ọrụ azụmahịa ezinụlọ anyị. E tinyere ihe ọ bụla a rụtara n’ọrụ nwa oge n’ego mmefu iji na-elekọta ụlọ anyị na ụgbọ ala atọ ndị dị mkpa iji jezuo ókèala anyị dịsara adịsa. Kwa izu, mgbe ọmụmụ Bible ezinụlọ anyị gasịrị, anyị na-atụle atụmatụ ezinụlọ anyị. Ntụle ndị a nyere aka ịkọwara onye ọ bụla ebe anyị na-aga na ihe anyị ji ndụ anyị na-eme.

Nwa anyị nwoke, Greg, dị ka ụmụnne ya ndị nwanyị tọrọ ya, nwekwara ozi oge nile dị ka ihe mgbaru ọsọ ya. Eri mgbe ọ gbara afọ ise, o gosipụtara ọchịchọ ịrụ ọrụ n’otu alaka ụlọ ọrụ Society, nke a na-akpọ Betel. Ọ dịghị mgbe o chefuru ihe mgbaru ọsọ ahụ, mgbe ọ gasịkwara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ jụrụ mụ na nne ya, sị: “Ùnu chere na m kwesịrị itinye akwụkwọ maka Betel?”

Ọ bụ ezie na o metụrụ anyị n’obi nke ukwuu ikwe ka nwa anyị nwoke hapụ, anyị zaghachiri n’egbughị oge: “Ọ dịghị mgbe ị ga-enwe mmetụta nke aka Jehova dị ka ị ga-enwe ya na Betel​—⁠bụ́ ebe bụ isi nke nzukọ Jehova.” N’ime ọnwa abụọ ọ hapụrụ gaa Betel dị na Canada. Nke ahụ bụ na 1980, o jewokwa ozi ebe ahụ eri mgbe ahụ.

Afọ ndị 1980 wetara ihe ịma aka ndị ọhụrụ maka mụ na Lucy. Anyị laghachiri ebe anyị malitere​—⁠nanị anyị abụọ. Mgbe ahụ Susan alụwo di, ya na di ya na-arụkwa ọrụ ọsụ ụzọ, Kim na Greg na-ejekwa ozi na Betel. Gịnị ka anyị ga-eme? A zara ajụjụ ahụ ngwa ngwa na 1981 mgbe a kpọrọ anyị òkù ilekọta otu sekit na-asụ Portuguese, nke gbasara ihe dị ka 2,000 kilomita nke Canada. Anyị ka na-anụ ụtọ nke ọrụ ngagharị ahụ.

Kim alụworị di ma gaa Gilead, ya na di ya na-ejekwa ozi n’ọrụ sekit na Brazil ugbu a. Susan na di ya ka nọ na Canada, na-azụlite ụmụ ha abụọ, di Susan ka na-arụkwa ọrụ ọsụ ụzọ. Ọ bụ ezie na ezinụlọ anyị n’afọ ndị a abụwo nke e kewara n’ụzọ anụ ahụ n’ihi ọrụ anyị dị iche iche n’ozi oge nile, anyị ka nọgidere nso n’ime mmụọ na ná mmetụta uche.

Mụ na Lucy na-elepụ anya n’ọdịnihu obi ụtọ nke anyị na ụmụ anyị ịnọkọ n’ime ụwa ahụ e mere ka ọ dị ọcha. (2 Pita 3:13) Dị ka Mosis oge ochie, anyị enwewo n’onwe anyị ahụmahụ nke eziokwu dị n’azịza nke ajụjụ ahụ a na-atụghị anya azịza ya n’Ọnụ Ọgụgụ 11:23: “Aka Jehova, ọ̀ ghọwo mkpụmkpụ aka? ugbu a ka ị ga-ahụ ma okwu m ga-erere gị ma ọ bụ na ọ gaghị ere.” N’ezie, ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Jehova ịgọzi ndị na-ejere ya ozi maka ozi ha ji obi ha nile na-eje.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na nwunye m, Lucy

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya