Chineke nke Na-apụghị Ịghạ Ụgha Kwagidere Ya
DỊ KA MARY WILLIS SI KỌỌ
Mmetụta dị iche iche nke ndakpọ akụ na ụba ụwa erutewo ná mpụga nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia na 1932. N’afọ ahụ, mgbe m dị nanị afọ 19, mụ na Ellen Davies naara ọrụ nkwusa nke ijezu ihe dị ka 100,000 square kilomita. Ebe mmalite anyị gaje ịbụ obodo nta bụ́ Wiluna, ihe dị ka 950 kilomita n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ site n’ebe anyị bi na Perth, isi obodo nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia.
KA ANYỊ na-aga ebe ahụ, mụ na Ellen chọtara onwe anyị ka anyị na otu onye nche nwere omume enyi n’ụgbọ okporo ígwè na-ekerịta ụlọ ụgbọ nke ngwụsị. Ka ụgbọ ahụ na-akwụsị n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè nke ọ bụla, onye nche ahụ ji obi ọma na-agwa anyị ogologo oge anyị ga-anọru. Nke a nyere anyị ohere ịpụ gaa gbaara ndị bi n’ebe ndị ahụ dịpụrụ adịpụ ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị àmà. Anyị mesịrị rute n’obodo ahụ ebe a na-egwupụta ihe n’ala bụ́ Wiluna n’oge oké ifufe uzuzu na-efesi ike.
Otú ọ dị, ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị na Wiluna di ihe dị ka kilomita atọ site n’etiti obodo ahụ. Ọ dịghị nke n’ime anyị abụọ buru oké ibu, anyị bukwa katọn akwụkwọ atọ buru ibu nakwa igbe ákwà abụọ. Gịnị ka anyị ga-eme? Anyị konyere otu katọn n’elu mkpara osisi, nke ọ bụla n’ime anyị ga-ejidekwa otu isi nke mkpara osisi ahụ. N’ụzọ dị otú a anyị busịrị katọn ndị ahụ, n’otu n’otu. O were ije ugboro asaa iji busịa katọn atọ ahụ na igbe ákwà anyị ndị ahụ gabiga kilomita atọ banye n’ime obodo. Anyị kwụsịrị ọtụtụ ugboro iji zuo ike n’ihi na aka malitere ịfụ anyị ụfụ nke ukwuu.
N’agbanyeghị uzuzu ahụ, aka ịfụ ụfụ, na ụkwụ ndị ike gwụrụ, ihe ịma aka na ahụmahụ ahụ tọrọ anyị ụtọ. Anyị abụọ nwere mmetụta nke na Jehova nọnyeere anyị, na ọ na-akwado anyị iji nagide mmalite a siri ike nke ime nkwusa n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ. Ngwa ngwa anyị hụkwara ngọzi ya n’ọrụ anyị, n’ihi na mgbalị anyị ná njem ahụ rụpụtara nwa okoro bụ́ Bob Horn ịnakwere eziokwu Bible. Anyị ṅụrịrị ọṅụ na Bob pụrụ itinye afọ ụfọdụ n’ozi Betel nakwa na ọ nọgidere na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 50 afọ ruo ọnwụ ya na 1982.
Site na Wiluna anyị rụrụ ọrụ n’ógbè ndị dị n’ụzọ njem anyị nke ihe karịrị 725 kilomita ruo Geraldton n’ụsọ osimiri. Site n’ebe ahụ, anyị laghachiri azụ na Perth. N’abalị ụfọdụ anyị na-arahụ n’ọnụ ụlọ ndị tọgbọ nkịtị a na-anọ na-echere ụgbọ okporo ígwè, otu mgbe kwa n’ikpo ahịhịa dị n’akụkụ ụzọ okporo ígwè ahụ.
Anyị ji ihe e ji afụchi pilo e kpojuru biskit anyị ji nri ọka ghee n’aka anyị. Ndị a bụ nri anyị bụ isi maka ọkara mbụ nke njem anyị. Mgbe ụfọdụ anyị na-enweta nri anyị site n’ịsa efere na ihichasị ala ụlọ n’ụlọ obibi ụmụ akwụkwọ na ebe ndị a na-ere nri. N’oge ndị ọzọ anyị na-arụ ọrụ n’oké anwụ na-atụtụ ahụekere ma ọ bụ agwa. Onyinye ndị sitere n’aka ndị nwere mmasị nakweere akwụkwọ e ji amụ Bible nyere aka ịhụ maka mmefu ego anyị.
Ihe gbara m ume ijigide okwukwe na Jehova na iji obi ụtọ nagide ọtụtụ ọnọdụ ndị siri ike n’ụbọchị ndị ahụ bụ ihe nlereanya na ọzụzụ m natara n’aka nne m ná nwata.
Ihe Nketa Ndị Kraịst
Nne m nwere okwukwe siri ike n’Onye Okike, laakwa nnọọ azụ n’ókè m pụrụ icheta, ọ na-agwa anyị bụ ụmụntakịrị banyere ya. Otú ọ dị, e lere okwukwe ya ule dị ukwuu site n’ọnwụ nke nwanne anyị nwoke dị afọ asaa n’ajọ ihe mberede n’ụlọ akwụkwọ. Ma kama inwe obi ilu n’ebe Chineke nọ, mama ji ịnụ ọkụ n’obi malite ịmụ Bible. Ọ chọrọ ịmụta, ma ọ ga-ekwe omume, ihe na-akpata ụdị ọdachi ndị ahụ. Nnyocha ya nke eziokwu Bible bụ nke e nyere ụgwọ ọrụ, o gosipụtara nrara ya nye ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova site n’ime baptism ime mmiri ná mmalite afọ ndị 1920.
Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, nkwurịta okwu anyị na ya na-emesi ike mgbe mgbe ụzọ nkwa nile nke Chineke si bụrụ ihe ndị e ji n’aka. Ọ na-agba anyị ume mgbe nile iburu n’uche na n’agbanyeghị ihe pụrụ ime, ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha.’ (Taịtọs 1:2) Dị ka ihe si n’ime ya pụta, mụ na nwanne m nwanyị na ụmụnne anyị ndị nwoke abụọ, tinyere ezinụlọ anyị dị iche iche na ụmụ ụmụ anyị, bụcha taa ndị na-eto Jehova Chineke. Abụọ n’ime ụmụ nwanne m nwanyị, bụ́ Alan na Paul Mason, na-eje ozi dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị.
Ọchịchọ ná Nwata Izisa Ozi Ọma
Adịghị m eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, m wee hapụ akwụkwọ na 1926, mgbe m dị afọ 13. Ma, azụlitewo m ọchịchọ siri ike mụ iso ndị ọzọ kerịta ihe m na-amụta banyere Bible. Papa chere na amaghị m akwụkwọ otú zuru ezu inyere onye ọ bụla aka, ma Mama sịrị: “Ọbụna a sị na ọ gwa ndị mmadụ nanị maka agha Amagedọn nke na-eru nso nakwa na ndị dị umeala n’obi ga-eketa ụwa, nke ahụ ga-akpọsa Alaeze Chineke.” Ya mere amalitere m ikere òkè n’ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ mgbe m gbasịrị afọ iri na atọ, ọ bụ ezie na e meghị m baptism ruo 1930. Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, amalitere m ọrụ izi ozi ọma oge nile n’ebe dị gburugburu Perth.
N’afọ na-esonụ, 1931, anyị malitere iji aha ọhụrụ anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-eme ihe. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nwe ụlọ anabataghị ojiji anyị ji aha nsọ nke a nke Chineke eme ihe ma zaghachi n’iwe. Ma anọgidere m n’ozi ahụ n’agbanyeghị nzute ndị na-adịghị enye obi ụtọ. Obi siri m ike na Chineke adịghị agha ụgha mgbe o kwere nkwa na ndị na-ejere ya ozi pụrụ ‘ịdabere n’ike ahụ ọ na-enye.’—1 Pita 4:11; Ndị Filipaị 4:13.
Ịmata “Oké Ìgwè Mmadụ” Ahụ
Na 1935, anatara m ọrụ ịga n’akụkụ nke ọzọ nke kọntinenti ukwu Australia. Otú a, ruo ọtụtụ afọ nke ahụ gasịrị ejere m ozi dị ka onye ozi ọsụ ụzọ gburugburu ógbè New England nke steti New South Wales, ihe dị ka 4,000 kilomita site n’ebe m bibu na Perth.
Ruo mgbe ahụ anọwo m na-ekere òkè n’ihe nnọchiteanya nke achịcha na mmanya na-acha uhie uhie n’Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs a na-eme kwa afọ. Ọ bụ ezie na e lere nke a anya ịbụ ihe ziri ezi, karịsịa maka ndị ozi oge nile na-anụ ọkụ n’obi, ọ dịghị mgbe obi siri m ike na m nwere olileanya nke eluigwe. Mgbe ahụ, na 1935, e mere ka o doo anyị anya na a na-achịkọta oké ìgwè mmadụ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. Ọtụtụ n’ime anyị ṅụrịrị ọṅụ ịghọta na anyị bụ akụkụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ, anyị kwụsịkwara ikere òkè n’ihe nnọchiteanya ndị ahụ. (Jọn 10:16; Mkpughe 7:9) Eziokwu Bible na-enye ìhè na-egbukepụ egbukepụ n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, ọbụna dị ka Jehova kweworo nkwa ya.—Ilu 4:18.
Ụzọ Ndị Ọhụrụ Isi Mee Nkwusa
N’etiti afọ ndị 1930, anyị malitere iji ígwè phonograph eme ihe n’ozi anyị. Otú a, ọ dị mkpa ka a rụnye n’ịnyịnya ígwè anyị ndị siri ike ihe e ji ebu ibu n’ihu na n’akụkụ maka ọ bụghị nanị phonograph ahụ dị arọ kamakwa maka rekọd na akpa akwụkwọ anyị nile n’otu aka ahụ. Ọ dị m mkpa ilezi anya nke ukwuu mgbe ịnyịnya ígwè m bujuru ibu n’ihi na ọ bụrụ na ọ daa, ọ dị oké arọ nke ukwuu mụ inwe ike ibulite ya elu ọzọ!
N’ihe dị ka n’oge ahụ, anyị malitekwara ihe anyị kpọrọ ngagharị ihe ọmụma. Ka anyị na-aga n’okporo ámá ndị bụ isi nke obodo dị iche iche, anyị na-eyi obodobo akwụkwọ ndị e dekwasịrị ihe bụ́ ndị a madoro n’ahụ ma ọ bụ ndị e kokwasịrị n’ubu, bụ́ ndị bu okwu ndị na-adọrọ anya. Ahụrụ m ọrụ nke a ịbụ ule siri ike nke okwukwe, karịsịa mgbe a nwụchiri m ma kpọchie m n’abalị dum n’ụlọ mkpọrọ dị nta n’obodo Lismore. Ọ bụ ihe mweda n’ala ịbụ onye a kpọpụtara n’ụlọikpe n’ụbọchị na-esonụ n’ekweghịdị m bọọ isi m! Ma ọzọkwa Jehova kwadoro m dị ka o kwere ná nkwa. A kachapụrụ ikpe ahụ n’ihi na onye uwe ojii nwụchiri m kpesara nanị na obodobo akwụkwọ m megidere okpukpe ya.
Ịlaghachi Ebe Ọdịda Anyanwụ
Ná mmalite afọ ndị 1940, ọrụ ọsụ ụzọ m nke ime nkwusa kpọghachiri m n’obodo ndị dị n’ime ime n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia. N’ebe a, m nọgidere na-enwe ọmarịcha ahụmahụ na ngọzi ime mmụọ dị iche iche. Mgbe m nọ n’ebe e kenyere m ọrụ na Northam, ezutere m otu nwanyị ji ọrụ n’aka, bụ́ Flo Timmins, ihe dị ka 11 kilomita ná mpụga nke obodo. Ọ naara akwụkwọ bụ́ Reconciliation, tupu ogologo oge agaakwa ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova Chineke raara onwe ya nye. Ọ ka na-arụsi ọrụ ike n’ije ozi Alaeze, ada ya kwa, onye dị nanị afọ anọ mgbe ahụ, tolitekwara ịbụ onye ozi ọsụ ụzọ pụrụ iche.
Ma e nwere ahụmahụ ndị ọzọ a na-agaghị echefu echefu. Otu mgbe, mụ na onye òtù m ji ụgbọ anyị ịnyịnya na-adọkpụ na-agafe otu àkwà mmiri dị na Northam, na mberede ịnyịnya ahụ malitere ịgba oké ọsọ, na-emenye anyị egwu ka ọ na-agbafe mmiri ndị na-achị ọkụ ọkụ nke Osimiri Avon dị ebe dị anya n’ala ala. Mgbe ihe karịrị otu kilomita gasịrị, ịnyịnya ahụ kwụsịlatara.
Alụmdi na Ezinụlọ
Na 1950, alụrụ m Arthur Willis, onye bụwokwara ọsụ ụzọ ruo ọtụtụ afọ. Anyị biri n’ime obodo dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia bụ́ Pingelly, ebe e ji otu nwa nwoke, Bentley, na otu nwa nwanyị, Eunice, gọzie anyị. Mgbe ụmụaka ahụ na-achọ ịgụcha akwụkwọ, Arthur kpebiri ịmaliteghachi ịsụ ụzọ ọzọ. Ezi ihe nlereanya nke nna ha gbara ụmụ abụọ anyị ume ịmalite ịsụ ụzọ oge nile ngwa ngwa ha ruru eru.
Arthur na-akpọrọkarị ụmụaka ahụ gaa n’ebe ndị dị oké anya dị n’ime ime obodo ịga mee nkwusa. Mgbe ụfọdụ, ya na ha ga-ahapụ ụlọ ruo otu izu ma ọ bụ karịa n’otu mgbe, na-ebi n’ụlọ ntu kwa abalị. N’oge ndị a ha na-anọghị ya, m na-anọ n’ụlọ ilekọta azụmahịa arịa ụlọ nke ezinụlọ anyị, na-eme ka o kwe ha atọ omume ịsụ ụzọ.
Ozi n’Etiti Ndị Aborigine
Otu ụtụtụ kpọmkwem ozugbo ezinụlọ anyị latara site n’otu njem gaa n’ime obodo, otu onye ọbịa a na-atụghị anya ya bịara na nke anyị. Onye bịaranụ bụ onye Aborigine, bụ́ onye jụrụ, sị: “Gịnị ka m ga-eme iji laghachi?” Na mbụ o juru anyị anya. Mgbe ahụ Arthur chetara na ọ bụ otu nwoke a chụpụworo n’ọgbakọ ndị Kraịst ọtụtụ afọ gara aga n’ihi ịṅụbiga mmanya ókè. Eri mgbe ahụ ọ bụwo onye a ma ama n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ maka ịṅụ oké mmanya na maka ijigharị ụgwọ.
Arthur kọwara ihe dị ya mkpa ime ka e wee weghachi ya ná nzukọ Jehova nke dị ọcha. O jiri nwayọọ pụọ n’ekwughị ọtụtụ okwu, anyị nile na-echekwa banyere ihe ọ gaje ime. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị tụrụ anya ihe merenụ n’ọnwa ole na ole sochiri. Mgbanwe ndị nwoke ahụ mere yiri nnọọ ihe a na-apụghị ikwere ekwere! Ọ bụghị nanị na ọ na-enwere onwe ya pụọ ná nsogbu ịṅụ mmanya ya kama o jekwara leta ndị bi n’ógbè ahụ, na-echetara ha ụgwọ ndị o ji, mgbe ahụ kwụọ ụgwọ ihe o ji! Taa ọ bụ nwanna nwoke ọzọ n’okwukwe anyị, o jekwara ozi ruo oge ụfọdụ dị ka onye ozi ọsụ ụzọ.
E nwere ọtụtụ ndị Aborigine na Pingelly, anyị nwekwara ozi nke na-enye afọ ojuju karịsịa, na-enyere ndị ahụ dị umeala n’obi aka ịmụ na ịnakwere eziokwu nke Okwu Chineke. Lee nnọọ ihe na-ewusi okwukwe ike ọ bụwooro m inwewo òkè n’inyere ọtụtụ ndị Aborigine nke Australia aka ịmụta eziokwu ahụ!
A malitere otu ọgbakọ na Pingelly, ná mmalitekwa, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị nọ na ya bụ ndị Aborigine. Ọ dị mkpa ka anyị kụziere ọtụtụ n’ime ha ịgụ na ide ihe. E nwere ọtụtụ mkpọrọmasị megide ha n’afọ ndị mbụ ahụ, ma ndị bi n’obodo ukwu jiri nwayọọ nwayọọ malite ịkwanyere ndị Aborigine bụ́ Ndịàmà ùgwù maka ibi ndụ dị ọcha ha na ha ịbụ ụmụ amaala a pụrụ ịtụkwasị obi.
Enyemaka Jehova nke Na-adịghị Ada Ada
Di m ọma bụ́ Arthur, onye jewooro Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo 57 afọ, nwụrụ ná mmalite 1986. Ọ bụ onye ndị azụmahịa nile na Pingelly na ndị bi n’ógbè ahụ na-akwanyere ùgwù nke ukwuu. Ọzọkwa, Jehova kwagidere m, na-enye m ume ịnagide mfu mberede nke a.
Nwa m nwoke bụ́ Bentley, na-eje ozi dị ka onye okenye n’ebe ugwu nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia, ebe ya na nwunye ya, Lorna, zụliteworo ezinụlọ ha n’eziokwu ahụ. Ihe ọzọ nke na-enye m oké ọṅụ bụ na nwa m nwanyị, Eunice, agawo n’ihu n’ije ozi oge nile ruo taa. Ya na di ya, Jeff, bụcha ndị ọsụ ụzọ. Mụ na ha bi ugbu a, a na-agọzikwa m n’inwe ike ịrụ ọsụ ụzọ inyeaka site n’oge ruo n’oge.
Ruo ihe karịrị 60 afọ, enwewo m ahụmahụ nke mmezu nkwa ịhụnanya Jehova iwusi ndị na-ejere ya ozi ike na inyere ha aka ịnagide ọnọdụ ọ bụla ha pụrụ iche ihu. Ọ na-egbo mkpa anyị ọ bụla ma ọ bụrụ na anyị enweghị obi abụọ ọ bụla n’ebe ọ nọ ma ọ bụ zere ịghara iji ya kpọrọ ihe. E wusiwo okwukwe m ike ebe m nweworo mmetụta nke aka Chineke n’ọrụ, ahụwokwa m otú o si enye ngọzi ya ọbụna gabiga ihe anyị pụrụ ịghọta. (Malakaị 3:10) N’eziokwu, Chineke apụghị ikwu okwu ụgha!
[Foto dị na peeji nke 27]
Mary na 1933
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
Mary na Arthur ka ọtụtụ afọ gasịworo