Ị̀ Pụrụ Inwe Ndidi?
JEHOVA gwara Abram: “Si n’ala gị . . . jee nke gị ruo ala ahụ nke M ga-eme ka ị hụ ya anya: M ga-emekwa gị ka ị ghọọ mba ukwu, M ga-agọzikwa gị, mee ka aha gị dị ukwuu.” (Jenesis 12:1, 2) Abram dị 75 afọ mgbe ahụ. O rubere isi ma jiri amamihe nwee ndidi n’ihe fọrọ ná ndụ ya, na-echere Jehova.
E mesịa, Chineke kwere Abraham (Abram) nwere ndidi nkwa nke a: “Mee elu mee ala n’ịgọzi M ga-agọzi gị, n’ime ka a baa ụba M ga-eme ka ị baa ụba.” Pọl onyeozi gbakwụnyere: “Otú a o wee nwee ogologo ntachi obi, wee natakwa nkwa ahụ.”—Ndị Hibru 6:13-15.
Gịnị bụ ndidi? Akwụkwọ ọkọwa okwu dị iche iche na-akọwa ya dị ka ikike “iji ịdị jụụ chere maka ihe” ma ọ bụ igosipụta “nnagide ọnọdụ n’okpuru mkpasu iwe ma ọ bụ ndọlị.” Ya mere a na-etinye ndidi gị n’ule mgbe ọ dị mkpa ka i chere mmadụ ma ọ bụ maka otu ihe, ma ọ bụ mgbe a kpasuru gị iwe ma ọ bụ nọrọ n’okpuru nrụgide. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ onye nwere ndidi na-anọgide jụụ; onye na-enweghị ndidi na-eme ihe ọkụ ọkụ ma na-enwe mgbakasị ahụ.
Ụwa Ọgbara Ọhụrụ Anyị nke Enweghị Ndidi
Karịsịa n’ọtụtụ n’obodo ukwu dị iche iche, a dịghị emesi inwe ndidi ike kama ọ bụ ime ọsọ ọsọ. Nye ọtụtụ nde mmadụ bi n’obodo ukwu ndị jupụtara ná mmadụ, ụbọchị nke ọ bụla na-amalite mgbe mgbịrịgba ụtụtụ kụrụ. Nke ahụ na-amalite ịgba ọsọ ọsọ—ịga otu ebe, ịhụ mmadụ, imezu otu ihe. Ọ̀ bụ ihe ijuanya na ọtụtụ ndị na-anọ n’oké nrụgide ma ghara inwe ndidi?
Ahụ ọ̀ na-agbakasị gị mgbe ị na-eche mmehie ihe nke ndị ọzọ ihu? “Emeghị ihe kpọmkwem mgbe a kara aka na-ewe m iwe,” ka Albert kwuru. Ihe kanụ ga-ekwenye na ịnọ na-eche onye kwesịrị iruteworị na-eweta nrụgide, karịsịa ma ọ bụrụ na e nwere ihe a na-agbara. Banyere Eze Newcastle, onye Britain bụ́ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na narị afọ nke 18, e kwuru, sị: ‘Ọ na-atụfu ọkara otu hour n’ụtụtụ, bụ́ nke ọ na-achụso n’ụbọchi dum ma ghara inweta ya.’ Ọ bụrụ na ị ghaghị ịdabere n’ụdị onye dị otú ahụ kwa ụbọchị, ị̀ ga-anọgide na-enwe ndidi?
Mgbe ị na-akwọ ụgbọ ala, a na-akpasu gị iwe ọsọ ọsọ, na-ala azụ ichere, ma ọ bụ a na-anwa gị ịgba ọnwụ ọnwụ? N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, enweghị ndidi na-ewetakarị ọdachi. N’ime 1989, n’ihe bụbu West Germany, ihe karịrị 400,000 ihe ọghọm okporo ụzọ kpatara mmerụ ahụ ma ọ bụ ọnwụ. N’ime ndị a, ịgba ọnwụ ọnwụ ma ọ bụ nso nso karị n’azụ ụgbọ ala nọ n’ihu kpatara 1 n’ime 3. Ya mere, ọ dịkarịa ala ruo ókè ụfọdụ, enweghị ndidi bụ ihe kpatara mmerụ ahụ ma ọ bụ ọnwụ nke ihe karịrị 137,000 mmadụ. Lee oké ụgwọ ọrụ ọ bụ ịkwụ maka enweghị ndidi!
“Ọ na-esiri m ike ịnọgide na-enwe ndidi mgbe mmadụ na-amabanye ọnụ mgbe nile,” ka Ann mere mkpesa ya, “ma ọ bụ mgbe mmadụ na-etu ọnụ nke ukwuu.” Karl-Hermann kwetara na “ndị na-eto eto na-enweghị nkwanye ùgwù ọ bụla maka ndị agadi” mara ndidi ya aka.
Ndị a na ọnọdụ ndị ọzọ pụrụ ime ka ị ghara inwe ndidi. Mgbe ahụ, olee otú ị pụrụ isi zụlite ndidi?
Jehova Pụrụ Iwusi Ndidi Gị Ike
Ọtụtụ ndị na-eche na ndidi na-egosipụta enweghị ike ime mkpebi ma ọ bụ adịghị ike. Ma, nye Jehova, ọ na-ebu akara nke ike. Ya onwe ya ‘na-atachi obi n’ihi na o zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.’ (2 Pita 3:9) Ya mere, Iji wusie ike i nwere iji ịnagide ọnọdụ ike, rapagide n’ahụ Jehova ma jiri obi gị nile dabere n’ebe ọ nọ. Imesiwanye mmekọrịta gị na Chineke ike bụ otu nzọụkwụ kasị mkpa iji zụlite àgwà inwe ndidi.
Ọzọkwa, ọ dị oké mkpa ịmara nzube dị iche iche nke Jehova maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ. Abraham “na-ele anya obodo ahụ nke nwere ntọala ahụ [Alaeze Chineke], nke Chineke bụ onye ọkà ya na onye rụrụ ya.” (Ndị Hibru 11:10) N’otu aka ahụ, ọ ga-aba uru inwe echiche doro anya banyere nkwa nile nke Chineke na inwe afọ ojuju n’ichere Jehova. Mgbe ahụ ị ga-aghọta na ndidi, kama igosipụta ịdị na-ala azụ ma ọlị, n’ezie na-akpọta ndị mmadụ n’ezi ofufe. N’ihi ya, “na-agụkwanụ ogologo ntachi obi Onyenwe anyị na ọ bụ nzọpụta.”—2 Pita 3:15.
Gịnị ma ọ bụrụ na ọnọdụ ndị nke onwe gị anwalee ndidi gị n’ụzọ fọrọ nke nta ka ọ ghara ikwe nnagide? Ndị na-ekweghị ekwe hà na-etinye gị ná nrụgide na-agbakasị ahụ? Ị̀ nọwo n’ọrịa ruo ihe yiri oge na-adịghị agwụ agwụ? N’ọnọdụ dị otú ahụ, buru n’obi ihe Jemes onye na-eso ụzọ dere. Mgbe o zosịrị aka n’usoro nke ndị amụma tụpụtara n’inwe ndidi, o kpughere ihe nzuzo nke ịnọgide jụụ n’okpuru nrụgide siri oké ike. Jemes sịrị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu na-ahụju anya? ya kpee ekpere.”—Jemes 5:10, 13.
Jiri ezi obi rịọ Chineke n’ekpere ka o wusie ndidi gị ike ma nyere gị aka ịchịkwa mmụọ gị n’okpuru ule. Chigharịkwuru Jehova ugboro ugboro, ọ ga-enyekwara gị aka ịchọpụta ọnọdụ ma ọ bụ àgwà ndị ọzọ ndị na-eyikarị ịdị jụụ gị egwu. Ibu ụzọ kpee ekpere tupu ọnọdụ ndị pụrụ itinye mmadụ n’ule abịa pụrụ inyere gị aka ịnọgide jụụ.
Echiche Kwesịrị Ekwesị Banyere Onwe Onye na Ndị Ọzọ
Iji nọgide na-enwe ọnọdụ uche dị nwayọọ, ị ghaghị ile onwe gị na ndị ọzọ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Nke a pụrụ ikwe omume site n’ezi ọmụmụ ihe nke Bible, n’ihi na ọ na-egosi na onye ọ bụla nwere ezughị okè e ketara eketa, n’ihi ya kwa nwere adịghị ike ndị nke ya. Ọzọkwa, ihe ọmụma Bible ga-enyere gị aka ito eto n’ịhụnanya. Àgwà nke a dị mkpa iji gosipụta ndidi n’ebe ndị ọzọ nọ.—Jọn 13:34, 35; Ndị Rom 5:12; Ndị Filipaị 1:9.
Ịhụnanya na ọchịchọ dị ọkụ ịgbaghara pụrụ ime ka ị dajụọ mgbe iwe were gị. Ọ bụrụ na mmadụ nwere àgwà ndị na-akpasu gị iwe, ịhụnanya ga-echetara gị na ọ bụ àgwà ya bụ ihe ndị na-adịghị amasị gị, ọ bụghị onye ahụ. Tụlee ọtụtụ mgbe adịghị ike ndị nke gị onwe gị na-aghaghị ịnwalewo ndidi Chineke, ọ ghaghịkwa ịkpasuwo ndị ọzọ oké iwe.
Echiche ziri ezi banyere onwe gị ga-enyekwara gị aka iji ndidi chere. Dị ka ihe atụ, ị̀ nọwo na-achọ inweta ihe ùgwù dị iche iche n’ije ozi Jehova, ma nwee nanị mmechuihu? Ị̀ na-ahụ ka ndidi gị na-agwụsị dị ka icheku ọkụ ndị na-anyụ anyụ? Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, mgbe ahụ cheta ọtụtụ enweghị ndidi gbara mkpọrọgwụ ná mpako. “Ọ dị mma, bụ́ onye mmụọ ya nwere ogologo ntachi obi, karịa onye mmụọ ya dị elu,” ka Solomọn kwuru. (Eklisiastis 7:8) Ee, mpako bụ otu ihe bụ isi na-egbochi ịzụlite ndidi. Ọ̀ bụ na ọ bụghị eziokwu na ọ na-adịkarịrị onye dị umeala n’obi mfe iji ịnọ jụụ chere? Ya mere, zụlite umeala n’obi, ị ga-enwekwa ike karị ịnakwere igbu oge n’udo nke uche.—Ilu 15:33.
Ndidi Na-akwụ Ụgwọ Bara Ụba
A maara Abraham n’ụzọ bụ isi maka okwukwe ya. (Ndị Rom 4:11) Ma, ndidi mere ka okwukwe ya dịgide. Gịnị bụ nkwụghachi ụgwọ ya maka ichere Jehova?
E nyere Abraham ntụkwasị obi Jehova ka ukwuu. Aha Abraham si otú a dị ukwuu, ụmụ ya ghọkwara mba dị ukwuu. Mba nile nke ụwa pụrụ ịgọzi onwe ha site ná mkpụrụ ya. Abraham jere ozi dị ka onye na-ekwuchitere Chineke na ọbụna dị ka otu ụdị nke Onye Okike. À pụrụ inwe nkwụghachi ụgwọ ọ bụla ka ukwuu maka okwukwe na ndidi Abraham?
“Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne” n’ebe ndị Kraịst ji ndidi nagide ule dị iche iche nọ. (Jemes 5:10, 11) Ndị dị otú ahụ na-enwe akọ na uche dị ọcha n’ihi ime uche ya. Mgbe ahụ, n’ọnọdụ nke gị, ọ bụrụ na i chere Jehova ma jiri ndidi nagide ọnwụnwa, ike i nwere iji nagide ọnọdụ ga-arụpụta nnwapụta na ngọzi Jehova.
Ndidi na-abara ndị Chineke uru nke ọma n’akụkụ nile nke ndụ. Abụọ n’ime ndị na-ejere Jehova ozi, aha ha bụ Christian na Agnes chọpụtara nke a mgbe ha kpebiri ikwe nkwa ọlụlụ. Ha gburu oge ná nkwa ọlụlụ iji kwanyere ndị nne na nna Christian, bụ́ ndị chọrọ oge iji mata Agnes ùgwù. Mmetụta dị aṅaa ka omume nke a nwere?
“Nanị n’ikpeazụ ka anyị matara otú nne na nna m si nwee mmasị dị ukwuu ná ndidi anyị,” ka Christian na-akọwa. “Anyị iji ndidi chere emebighị mmekọrịta dị n’etiti mụ na nwunye m. Ma ọ bụ blọkụ mbụ e ji ewu ụlọ ná mmekọrịta anyị na nne na nna m.” Ee, ndidi na-akwụ ụgwọ ọrụ bara ụba.
Ndidi na-akwalitekwa udo. Ezinụlọ na ndị enyi ga-enwe ekele na ị dịghị esere obere ndahie ọ bụla okwu. Ịdị jụụ na nghọta gị mgbe ndị ọzọ hiere ụzọ ga-egbochi ọnọdụ ndị na-emenye ihere. Otu ilu ndị China na-asị: “Ndidi n’oge a na-ewe iwe ga-anapụta gị n’otu narị ụbọchị nke obi ilu.”
Ndidi na-akwalite ụdị onye ị bụ, ya bụ na-etekwasị àgwà ọma ndị ọzọ agba nke ịdịgide adịgide. Ọ na-eme ka okwukwe gị na-adịgide adịgide, udo gị na-adịte anya, na ịhụnanya gị ịbụ nke kwụrụ chịm. Inwe ndidi ga-enyere gị aka inwe ọṅụ mgbe ị na-egosipụta obi ọma, ịdị mma, na ịdị nwayọọ. Inwe ndidi na-ewulite ume dị mkpa iji zụlite ogologo ntachi obi na njide onwe onye.
Mgbe ahụ, jiri ndidi chere mmezu nke nkwa nile nke Jehova, a na-ekwekwa gị nkwa ọdịnihu dị ebube. Dị ka Abraham, ka i ‘site n’okwukwe na ndidi keta nkwa ndị ahụ.’—Ndị Hibru 6:12.
[Foto dị na peeji nke 23]
Iso Jehova nwee mmekọrịta chiri anya ga-enyere gị aka inwe ndidi, dị ka Abraham mere