Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 5/15 p. 26-27
  • O Meghị Agadi Gabiga Ókè Ijere Jehova Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • O Meghị Agadi Gabiga Ókè Ijere Jehova Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Onye Na-apụghị n’Ụlọ Chineke”
  • Ngọzi A Na-atụghị Anya Ya
  • Ezi Ihe Nlereanya nke Ana
  • Otu Onye Nkụzi Agbanwee Echiche Ya
    Teta!—2009
  • Latvia Emeghachi Omume n’Ozi Ọma Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ime nke Ọma n’Ozi Jehova n’Oge Isi Awọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ijere Jehova Ozi Tupu Oge Ọdachi Erute
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 5/15 p. 26-27

O Meghị Agadi Gabiga Ókè Ijere Jehova Ozi

ỌTỤTỤ ndị meworo agadi na-eche na afọ ndị fọọrọ ha enwekebeghị olileanya ọ bụla maka obi ụtọ. Otu onye na-eme ihe nkiri a ma ama nke na-aka nká kwuru ọbụna, sị: “Emebisịwo m ndụ m, oge agafewokwa nke ukwuu ịgbanwe ya . . . Mgbe m na-agagharị nanị m, m na-echeghachi echiche ná ndụ m, obi adịghịkwa m ụtọ ụzọ m si mee ya . . . Ahụ adịghị eru m ala n’ebe nile, enweghịkwa m ike ịnọdụ otu ebe.”

Otu nwanyị mere agadi nke biri ndụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga enweghị nsogbu ọ bụla yiri nke ahụ. Ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ nke gbara 84 afọ, ma ọ dị ike, nwee obi ụtọ, bụrụkwa onye Chineke meere amara n’ụzọ dị ebube. Aha ya bụ Ana, o nwekwara ihe pụrụ iche ọ ga-eji nwee ọṅụ. Gịnị ka ọ bụ?

“Onye Na-apụghị n’Ụlọ Chineke”

Onye so dee Oziọma ndị ahụ bụ́ Luk mere ka anyị mata Ana. “Otu onye a na-akpọ Ana dịkwa,” ka o kwuru, “bụ́ onye amụma nwanyị, nwa nwanyị Fanuel, nke si n’ebo Asha pụta” n’Israel. Dị ka onye amụma nwanyị, o nwere onyinye nke mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ, Chineke, n’echiche pụrụ iche. Ana nwekwara ohere dị ebube nke ibu amụma n’otu oge a rịbara ama.

Luk na-asịkwa: “Nwanyị a aghọwo ezi agadi, ebe ya na di ya biri afọ asaa site na nwa agbọghọ ya, o wee nọdụ n’ọnọdụ nwanyị di ya nwụrụ ruo [iri afọ asatọ na anọ].” (Luk 2:​36, 37) O yiri ka Ana ọ̀ ghọrọ nwanyị di ya nwụrụ mgbe ọ ka dị nnọọ nta. Ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị Kraịst n’agbanyeghị afọ ndụ ha maara ụzọ o si bụrụ ihe na-egbu mgbu n’obi di mmadụ a hụrụ n’anya ifunahụ ya n’ọnwụ. Otú ọ dị, dị ka ọtụtụ n’ime ndị inyom na-atụ egwu Chineke n’ụbọchị anyị, Ana ekweghị ka ahụmahụ nke a dị mwute kwụsị ozi ọ na-ejere Chineke.

Luk na-agwa anyị na Ana ‘adịghị apụ n’ụlọ Chineke’ dị na Jerusalem. (Luke 2:37) O nwere ekele miri emi maka ngọzi nke na-abịa site n’ije ozi n’ụlọ Chineke. Ihe ndị o mere kpughere na, dị ka ọbụ abụ ahụ bụ́ onye Israel bụ́ eze Devid, o nwere nanị otu ihe ọ na-arịọ Jehova. Gịnị bụkwa nke ahụ? Devid bụrụ, sị: “Otu ihe ka m rịọworo n’aka Jehova, nke ahụ ka m na-achọ; ọ bụ ka m biri n’ụlọ Jehova ụbọchị nile nke ndụ m, ịhụ ịdị ụtọ Jehova, na ịjụta ihe n’ụlọ ukwu Ya.” (Abụ Ọma 27:4) Banyekwara nke a, Ana dị ka ụmụ nwanyị ndị Kraịst taa ndị na-achọta obi ụtọ n’ịnọ mgbe nile n’ebe ofufe nke Jehova.

Ana jeere Jehova ozi dị nsọ abalị na ehihie. O weere “obubu ọnụ na arịrịọ” mee nke a, na-egosipụta iru újú na ọchịchọ siri ike. (Luk 2:37) Ịnọ n’okpuru dịworo ọtụtụ narị afọ nke ndị Juu nọworo n’okpuru mba ndị Jentaịl, ya na ọnọdụ okpukpe na-eretọ eretọ nke ruru ọbụna n’ụlọ nsọ ahụ na òtù ndị nchụàjà ya, pụrụ isowo kpata obubu ọnụ na arịrịọ Ana na-arịọ Jehova Chineke. Ma o nwekwara ihe mere ọ ga-eji nwee obi ụtọ, karịsịa n’ihi otu ihe pụrụ iche mere n’otu ụbọchị oké ihe mere n’ezie n’afọ 2 T.O.A.

Ngọzi A Na-atụghị Anya Ya

N’ụbọchị nke a dị ịrịba ama nke ukwuu, nne ya, bụ́ Meri, na nna kuchiri ya, bụ́ Josef, kutere nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs n’ụlọ nsọ Jerusalem. Simeọn meworo agadi hụrụ nwa ọhụrụ ahụ ma kwuo okwu amụma ụfọdụ n’oge ahụ. (Luk 2:​25-⁠35) Ana nọ n’ụlọ nsọ ahụ dị ka ọ na-eme ya. Luk na-akọ sị, “O wee bịaruo ebe ahụ n’otu oge hour ahụ.” (Luk 2:38) Lee ka a na-aghaghị isiwo kpalie obi ụtọ n’ime Ana ka anya ya ndị na-eme agadi na-ekiri Mesaịa ọdịnihu ahụ!

Iri ụbọchị anọ tupu mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke emewo ka ndị na-azụ atụrụ nso Betlehem kụja n’okwu ndị a: “Lee, ana m ezi unu ozi ọma nke oké ọṅụ nke ga-adịrị ndị Israel nile: n’ihi na taa n’obodo Devid ka a mụrụ nye unu Onye nzọpụta, Nke bụ Kraịst Onyenwe anyị.” Oké ìgwè nke ndị agha eluigwe toro Jehova ma kwuokwa, sị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị ya ezi mma.” (Luk 2:​8-⁠14) N’otu aka ahụ, a kpaliri Ana ugbu a ịgba àmà banyere Onye ahụ nke gaje ịbụ Mesaịa!

Mgbe ọ hụrụ nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs, Ana n’otu aka ahụ “wee kelee Chineke, gwakwa ndị nile na-eche mgbapụta nke Jerusalem okwu banyere Ya.” (Luk 2:38) Dị ka Simeọn meworo agadi, onye nwekwara ihe ùgwù nke ịhụ nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs n’ụlọ nsọ ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ nọwo na-enwe ọchịchọ, na-ekpe ekpere, na-echere maka Onye Mgbapụta ahụ e kwere ná nkwa. Ozi ọma ahụ nke bụ na Jisọs bụ Onye ahụ tọgburu ya atọgbu nke na ọ gaghị edebere ya nanị onwe ya.

Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na Ana atụghị anya ịnọ ndụ mgbe Jisọs toro, gịni ka o mere? O jiri ọṅụ gbaara ndị ọzọ àmà banyere nnapụta nke a gaje inwe site na Mesaịa nke a na-abịanụ.

Ezi Ihe Nlereanya nke Ana

Mmadụ ole n’ime ndị ji okpukpe kpọrọ ihe n’ụwa ga-agba àmà dị otú ahụ ma ọ bụ ka nọgide na-efe ofufe abalị na ehihie n’afọ ndụ nke 84? O yiri ka ha ga-asịwo ka a kwụọ ha ụgwọ ezumike nká ọtụtụ afọ tupu o ruo. Ana na Simeọn dị iche. Ha setịpụrụ ezi ihe nlereanya maka ndị nile meworo agadi na-ejere Jehova ozi. N’ezie, ha hụrụ ụlọ ofufe Jehova n’anya ma too ya site n’obi ha dum.

N’Ana anyị nwere ihe nlereanya magburu onwe ya nke nwanyị di ya nwụrụ nke na-atụ egwu Chineke. N’ezie, nkọwa Luk nke agadi nwanyị a dị obi umeala ruru eru nke ọma n’iji ya tụnyere iru eru nke ezi nwanyị di ya nwụrụ e depụtara na 1 Timoti 5:​3-⁠16. N’ebe ahụ Pọl onyeozi na-ekwu na nwanyị dị otú ahụ di ya nwụrụ “na-anọgidekwa n’arịrịọ na ekpere ya abalị na ehihie,” ‘sosiekwa ọrụ ọma nile ọ bụla ike.’ Ana bụ nwanyị dị otú ahụ.

Taa, anyị na-ahụ ndị agadi nwanyị di ha nwụrụ bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ka ha na-ejere Chineke ozi dị nsọ abalị na ehihie n’ọtụtụ puku ọgbakọ Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa. Lee ka anyị si nwee ekele dị ukwuu inwe “Ana” ndị a nke oge ugbu a n’etiti anyị!

Ọbụna n’afọ ndụ nke ime okenye, ndị ikom na ndị inyom pụrụ ịrara onwe ha nye Chineke ma gosipụta nke a site na baptism mmiri. Ọ dịghị mgbe ndị mere agadi na-eme agadi gabiga ókè ijere Jehova ozi na ịgba àmà banyere Alaeze Mesaịa ahụ nke e guzobeworo n’eluigwe na nke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ngọzi ndị bara ụba n’isi nso. Ndị mere agadi na-ejere Chineke ozi dị nsọ ugbu a na-enye akaebe ngọzi Jehova n’isi ha, ọbụna dị ka a gọziri Ana n’ụzọ pụrụ iche ọtụtụ narị afọ gara aga. O meghị agadi gabiga òkè ijere Jehova ozi na ito aha ya dị nsọ​—⁠ha emeghịkwa agadị gabiga ókè.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya