Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 6/15 p. 12-17
  • Ịlụ Ọgụ Megide Aka Mmehie Ji Anụ Ahụ Dara Ada

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịlụ Ọgụ Megide Aka Mmehie Ji Anụ Ahụ Dara Ada
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aka Mmehie Ji Anụ Ahụ Dara Ada
  • Ịtụkwasị Uche n’Anụ Ahụ
  • Ịtụkwasị Uche na Mmụọ Nsọ
  • Nkwa nke Ndụ na Udo
  • Tụkwasị Uche ná Mmụọ Nsọ Ma Dị Ndụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Na-eje Ije Dị Ka Mmụọ Nsọ Si Chọọ Ka I wee Nweta Ndụ Na udo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Anyị Kwesịrị Ịna-ejide Onwe Anyị
    Bụkuo Jehova Abụ
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 6/15 p. 12-17

Ịlụ Ọgụ Megide Aka Mmehie Ji Anụ Ahụ Dara Ada

“Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ bụ ọnwụ; ma ịtụkwasị uche na Mmụọ Nsọ bụ ndụ na udo.”​—⁠NDỊ ROM 8:6.

1. Maka nzube dị aṅaa ka e ji kee ụmụ mmadụ?

“CHINEKE wee kee mmadụ n’onyinyo Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwanyị ka O kere ha.” (Jenesis 1:27) Onyinyo bụ oyiyi nke ihe ma ọ bụ isi iyi. Otú a, e kere ụmụ mmadụ ịbụ oyiyi nke ebube Chineke. Site n’igosipụta àgwà dị iche iche nke Chineke​—⁠dị ka ịhụnanya, ịdị mma, ezi ikpe, na ọnọdụ ime mmụọ⁠—​ná mgbalị ha nile, ha na-ewetara Onye Okike ha otuto na nsọpụrụ, nakwa obi ụtọ na afọ ojuju nye onwe ha.​—⁠1 Ndị Kọrint 11:7; 1 Pita 2:12.

2. Olee otú mmadụ abụọ mbụ ahụ si ghara iru akara?

2 A kwadebere mmadụ abụọ mbụ, ndị e kere n’izu okè, nke ọma maka ọrụ nke a. Dị ka enyo ndị e mere ka ha na-egbuke egbuke nke ukwuu, ha nwere ikike iwepụta oyiyi nke ebube Chineke n’ụzọ na-egbu maramara na n’obi ọcha. Otú ọ dị, ha kwere ka a gbachuo mgbuke ahụ mgbe ha kpachaara anya họrọ inupụrụ Onye Okike na Chineke ha isi. (Jenesis 3:6) Ka nke ahụ gasịrị, ha apụkwaghị ịnọgide na-ewepụta oyiyi nke ebube Chineke n’ụzọ zuru okè. Ha erughị ọ̀tụ̀tụ̀ nke ebube Chineke, ghara iru nzube e ji kee ha n’onyinyo Chineke. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha mehiere.a

3. Gịnị bụ ọdịdị bụ ezie nke mmehie?

3 Nke a na-enyere anyị aka ịghọta ọdịdị bụ ezie nke mmehie, nke na-emebi ngosipụta mmadụ na-egosipụta oyiyi Chineke na ebube. Mmehie na-eme ka mmadụ ghara ịdị nsọ, ya bụ, ruo unyi ma gbachuo agbachuo n’echiche nke ihe ime mmụọ na omume ọma. Ihe nile a kpọrọ mmadụ, n’ịbụ ụmụ Adam na Iv, bụ ndị a mụnyere n’ọnọdụ ahụ gbachuru agbachu na nke adịghị ọcha, na-ahapụ iru ihe Chineke tụrụ anya ya n’aka ha dị ka ụmụ ya. Gịnịkwa ka ọ rụpụtaworo? Bible na-akọwa, sị: “Dị ka mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.”​—⁠Ndị Rom 5:12; tụlee Aịsaịa 64:6.

Aka Mmehie Ji Anụ Ahụ Dara Ada

4-6. (a) Olee otú ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ si ele mmehie anya taa? (b) Gịnị na-esite n’echiche ndị e nwere ugbu a banyere mmehie apụta?

4 Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ taa adịghị eche banyere onwe ha dị ka ndị na-adịghị ọcha, ndị gbachuru agbachu, ma ọ bụ ndị mmehie. N’ezie, mmehie, dị ka okwu, adịkwaghị nnọọ ná nchịkọta okwu ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ. Ha pụrụ ikwu ma eleghị anya banyere ndahie, enweghị uche, na emeghị ezi ngụkọ. Ma mmehie? Mba! Ọbụna nye ndị ka na-azọrọ na ha kwenyere na Chineke, “nkụzi ya nile mejupụtara usoro nkwenkwe omume kama ịbụ ụkpụrụ iwu omume ọma, ‘aro 10’ ndị ahụ kama ịbụ iwu 10 ndị ahụ,” ka Alan Wolfe, prọfesọ ná nkà mmụta mmekọrịta ọha na eze, kwuru.

5 Gịnị siworo n’ụzọ echiche nke a pụta? Ngọnarị, ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, nleghara anya nke ịdị adị nke mmehie. Nke a emepụtawo ọgbọ nke ndị nwere echiche gbagọrọ agbagọ nke ukwuu banyere ezi ihe na ihe ọjọọ, ndị na-eche na ha nweere onwe ha isetịpụ ụkpụrụ ndị nke ha nke akparamagwa ma chee na ọ dịghị onye ha ga-aza ajụjụ ihe ọ bụla ha họọrọ ime. Nye ndị dị otú ahụ, inwe mmetụta dị mma agwụla ihe ọ̀tụ̀tụ̀ e nwere maka ikpebi ma otu ụzọ ime ihe ò kwesịrị ekwesị ma ọ bụ na o kwesịghị.​—⁠Ilu 30:​12, 13; tụlee Deuterọnọmi 32:​5, 20.

6 Dị ka ihe atụ, n’otu ihe omume mkparịta ụka na telivishọn, a kpọrọ ndị na-eto eto òkù ka ha kwupụta echiche ha banyere mmehie asaa ndị ahụ a sịrị na ha na-eweta ọnwụ.b “Nganga abụghị mmehie,” ka otu onye so ná mkparịta ụka ahụ kwuru. “I kwesịrị inwe mmetụta dị mma banyere onwe gị.” Banyere enweghị mmasị n’ihe ime mmụọ, onye ọzọ sịrị: “Ọ na-adị mma ịdị otú ahụ mgbe ụfọdụ. . . . Mgbe ụfọdụ ọ na-adị mma ịnọrọ ọdụ ma nye onwe gị oge onwe onye ụfọdụ.” Ọbụna onye nchịkọta ya kwuru okwu nke a dị mkpirikpi: ‘Mmehie asaa ndị ahụ na-eweta ọnwụ abụghị omume ọjọọ, kama nke ahụ, ihe mmanye zuru ụwa ọnụ nye ụmụ mmadụ ndị pụrụ iweta mgbakasị ahụ ma na-atọ ụtọ nke ukwuu.’ Ee, ihe so mmehie pụọ n’anya bụ mmetụta nke obi amamikpe, n’ihi na, e kwuwerị, obi amamikpe bụ kpọmkwem ihe megidere inwe mmetụta dị mma.​—⁠Ndị Efesọs 4:​17-⁠19.

7. Dị ka Bible na-ekwu, olee otú mmehie si emetụta ndi mmadụ?

7 N’ụzọ megidere nnọọ ihe a dum, Bible na-ekwu hoo haa, sị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Ọbụna Pọl onyeozi kwetara, sị: “Amatara m na ezi ihe adịghị ebi n’ime m, nke ahụ bụ, n’anụ ahụ m: n’ihi na ịchọ ihe ọma dị nso n’ebe aka m ga-eru, ma ịrụta ihe ọma adịghị nso n’ebe aka m ga-eru. N’ihi na ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme.” (Ndị Rom 7:​18, 19) N’ebe a Pọl adịghị emikpu n’imere onwe onye ebere. Kama nke ahụ, n’ihi na ọ ghọtazuru otú ihe a kpọrọ mmadụ garuworo n’erughị ebube Chineke, o nwere mmetụta na-egbu mgbu karị nke aka mmehie ji anụ ahụ dara ada. “Mmadụ nke hụjuru anya ka mụ onwe m bụ!” ka o kwupụtara, “ònye ga-adọpụta m n’ahụ nke ọnwụ a?”​—⁠Ndị Rom 7:24.

8. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị? N’ihi gịnị?

8 Gịnị bụ echiche gị n’okwu a? Ị pụrụ ikweta na dị ka nwa Adam, gị onwe gị, dị ka onye ọ bụla ọzọ, ezughị okè. Ma olee otú ihe ọmụma ahụ si emetụta echiche gị na ụzọ ndụ gị? Ị̀ na-anakwere ya dị ka eziokwu nke ndụ ma nanị gbachi nnọọ nkịtị na-eme ihe bụ echiche ebumpụta ụwa gị? Ka ị̀ na-anọgide na-etinye mgbalị ịlụso aka mmehie ji anụ ahụ dara ada ọgụ, na-agbalịsi ike igosipụta ebube Chineke n’ihe nile ị na-eme n’ụzọ na-egbuke egbuke dị ka o kwere omume? Nke a kwesịrị ịbụrụ onye ọ bụla n’ime anyị ihe a ga-echebasiri echiche ike n’ihi ihe Pọl kwuru: “Ndị dị ka anụ ahụ si chọọ na-atụkwasị uche n’ihe nke anụ ahụ; ma ndị dị ka Mmụọ Nsọ si chọọ na-atụkwasị uche n’ihe nke Mmụọ Nsọ. N’ihi na ịtụkwasị uche n’anụ ahụ bụ ọnwụ; ma ịtụkwasị uche na Mmụọ Nsọ bụ ndụ na udo.”​—⁠Ndị Rom 8:​5, 6.

Ịtụkwasị Uche n’Anụ Ahụ

9. N’ihi gịnị ka “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ” ji na-apụta ọnwụ?

9 Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru na “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ bụ ọnwụ”? Okwu ahụ bụ “anụ ahụ” bụ nke a na-ejikarị eme ihe na Bible iji gosi mmadụ n’ọnọdụ ezughị okè ya, ‘nke a tụrụ ime ya ná mmehie’ dị ka nwa nke Adam na-enupụ isi. (Abụ Ọma 51:5; Job 14:4) Otú a, Pọl na-adụ ndị Kraịst ọdụ ka ha ghara ịtụkwasị uche ha n’ọchịchọ, mkpali, na agụụ mmehie nile nke anụ ahụ na-ezughị okè, nke dara ada. N’ihi gịnịkwa? N’ebe ọzọ Pọl gwara anyị ihe ndị bụ ọrụ nke anụ ahụ wee tinyekwa ịdọ aka ná ntị nke a: “Ndị na-eme ihe dị otú a agaghị eketa alaeze Chineke.”​—⁠Ndị Galetia 5:​19-⁠21.

10. Gịnị ka “ịtụkwasị uche” pụtara?

10 Ma ọ̀ bụ na e nweghị ọdịiche dị ukwuu n’etiti ịtụkwasị uche n’ihe na ime ya eme? Ee, iche echiche banyere ihe adịghị eduba mgbe nile n’ime ya eme. Otú ọ dị, ịtụkwasị uche karịrị nanị ihe ịgbabata mmadụ n’uche ná mkpirikpi oge. Okwu Pọl ji mee ihe bụ phroʹne·ma na Grik, ọ na-egosikwa “ụzọ iche echiche, uche (a tụkwasịrị), . . . nzube, nchụso, mgbaso.” Ya mere, “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ” pụtara ịbụ onye agụụ nile nke anụ ahụ dara ada na-achịkwa, bi n’ime ya, na-eduzi, na-akpa ike n’ahụ ya.​—⁠1 Jọn 2:16.

11. Olee otú Ken si na-atụkwasị uche n’anụ ahụ, gịnị ka ọ rụpụtakwara?

11 E mere ihe atụ dị mma nke isi ihe ahụ site n’ụzọ nke Ken gbasoro. Mgbe ekworo na iwe bilitere n’obi Ken, Jehova Chineke dọrọ ya aka ná ntị: “N’ihi gịnị ka ị na-ewe iwe dị ọkụ? ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihu gị gbarụrụ? Ọ bụrụ na ị na-eme nke ọma, ọ́ bụghị mgbasa ihu ka ị ga-enwe? ọ bụrụkwa na i meghị nke ọma, n’ọnụ ụzọ ka mmehie na-amakpu dị ka anụ ọhịa: ọ bụkwa n’ebe ị nọ ka ọchịchọ ya dị, ma o kwesịrị ka gị onwe gị chịa ya.” (Jenesis 4:​6, 7) E nwere nhọrọ chere Ken ihu. Ọ̀ ga-amalite “na-eme nke ọma,” ya bụ, tinye uche ya, nzube ya, na nchụso ya n’ihe dị mma? Ka ọ̀ ga-anọgide na-atụkwasị uche n’anụ ahụ ma debe uche ya n’ọchịchọ ọjọọ jupụtara ya obi? Dị ka Jehova kọwara, mmehie ‘na-amakpu n’ọnụ ụzọ dị ka anụ ọhịa,’ na-eche ịmakwasị ma ripịa Ken ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwere ya. Kama ịlụso agụụ anụ ahụ ya ọgụ ma “chịa ya,” Ken kwere ka o duzie ya​—⁠gaa ná ngwụsị wetara ọdachi.

12. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị wee ghara ịga “n’ụzọ Ken”?

12 Gịnị banyere anyị taa? N’ezie anyị achọghị ịga “n’ụzọ Ken,” dị ka Jud kwara arịrị banyere ụfọdụ ndị n’etiti ndị Kraịst narị afọ mbụ. (Jud 11) Anyị ekwesịghị mgbe ọ bụla ilelị ihe ma na-eche na imejutụ agụụ onwe onye ma ọ bụ mebitụ ụkpụrụ nke nta site n’oge ruo n’oge adịghị emerụ ahụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, anyị kwesịrị ịmụrụ anya ịhụta mmetụta ọ bụla nke asọpụrụghị Chineke na nke na-emerụ emerụ nke pụrụ ịbata n’obi na n’uche anyị ma wepụ ya ngwa ngwa tupu ọ gbaa mkpọrọgwụ. Ịlụso aka mmehie ji anụ ahụ dara ada ọgụ na-amalite n’ime obi.​—⁠Mak 7:21.

13. Olee otú mmadụ pụrụ isi bụrụ onye ‘a na-anwa site n’agụụ ihe ọjọọ nke onwe ya’?

13 Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịhụchata ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ ma ọ bụ nke na-atụ ụjọ ma ọ bụ nke na-enye nnọọ echiche ọjọọ ma ọ bụ onyinyo na-akpali ọchịchọ mmekọahụ. Ọ pụrụ ịbụ foto dị n’akwụkwọ ma ọ bụ magazin, ọnọdụ ihe nkiri na sinima ma ọ bụ n’ihu telivishọn, mkpọsa azụmahịa n’elu bọdụ, ma ọ bụ ọbụna n’ọnọdụ na-eme eme n’ezie. Nke ahụ n’onwe ya ekwesịghị ịkụja anyị, ebe ọ bụ na ọ pụrụ ime​—⁠ọ na-emekwa. Otú ọ dị, onyinyo ma ọ bụ ọnọdụ ihe nkiri nke a, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdịwo nanị sekọnd ole na ole, pụrụ ịnọgide n’uche ma na-apụtaghachi site n’oge ruo n’oge. Gịnị ka ị na-eme mgbe nke ahụ na-eme? Ị̀ na-eme ihe ozugbo iji lụso echiche ahụ ọgụ ma wepụ ya n’uche gị? Ka ị̀ na-ekwere ka ọ dịgide n’uche gị, ma eleghị anya na-atụleghachi ahụmahụ ahụ mgbe ọ bụla echiche ahụ batara? Ime nke ikpeazụ ahụ bụ ịbanye n’ihe ize ndụ nke ịmalite usoro ihe omume Jemes kọwara: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụwooro ime, o wee mụpụta mmehie: mmehie ahụ, mgbe o tozuru okè, o wee mụpụta ọnwụ.” Ọ bụ ya mere Pọl ji sị: “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ bụ ọnwụ.”​—⁠Jemes 1:​14, 15; Ndị Rom 8:6.

14. Gịnị ka a na-eche anyị n’ihu kwa ụbọchị, oleekwa otú anyị kwesịrị isi meghachi omume?

14 Ebe anyị na-ebi n’ụwa ebe a na-eto mmekọahụ rụrụ arụ, ime ihe ike, na ịhụnanya nke ihe onwunwe​—⁠bụrụ ndị a na-egosipụta n’ezoghị ọnụ na n’ụzọ dị ukwuu n’akwụkwọ, magazin, sịnịma, ihe omume telivishọn, na n’egwú ndị na-ewu ewu⁠—​a na-awụkwasị anyị nnọọ echiche ndị dị njọ kwa ụbọchị. Gịnị bụ mmeghachi omume gị? Ihe a dum hà na-eme gị ihe ọchị ma bụụrụ gị ihe ntụrụndụ? Ka ọ̀ na-adị gị ka ọ dịrị Lọt onye ezi omume, onye “ibi obi n’agụụ ịkwa iko nke ndị na-emebi iwu na-ewute . . . nke ukwuu . . . were ọrụ ha nke na-emebi iwu mekpaa mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ”? (2 Pita 2:​7, 8) Iji nwee ihe ịga nke ọma n’ịlụso aka mmehie ji anụ ahụ dara ada ọgụ, ọ dị anyị mkpa ikpebisi ike ime dị ka ọbụ abụ ahụ mere: “M gaghị edo ihe jọgburu onwe ya n’ihu m: Akpọwo m ọrụ nke ndị na-ejehie asị; ọ gaghị arapara n’ahụ m.”​—⁠Abụ Ọma 101:3.

Ịtụkwasị Uche na Mmụọ Nsọ

15. Olee enyemaka anyị nwere n’ịlụso aka mmehie ji anyị ọgụ?

15 Otu ihe pụrụ inyere anyị aka ịlụso aka mmehie ji anụ ahụ dara ada ọgụ bụ ihe Pọl gara n’ihu ikwu: “Ma ịtụkwasị uche na Mmụọ Nsọ bụ ndụ na udo.” (Ndị Rom 8:6) Otú a, kama ịbụ onye anụ ahụ na-achị, anyị aghaghị ikwere ka uche anyị bịa n’okpuru mmetụta nke mmụọ nsọ ma too eto n’ihe ndị nke mmụọ nsọ. Gịnị ka ha bụ? Ná Ndị Filipaị 4:8, Pọl mere ndepụta ha: “Nke fọdụrụ, ụmụnna m, ka ihe bụ eziokwu hà, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ka ha hà, bụ́ ihe ziri ezi, ka ha hà, bụ́ ihe dị ọcha, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị ịhụnanya, ka ha hà, bụ́ ihe e kwuru nke ọma; ọ bụrụ na ịdị mma ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.” Ka anyị lerukwuo anya ala ma nwee nghọta ka mma nke ihe anyị kwesịrị ịnọgide na-agụkọ.

16. Àgwà dịgasị aṅaa ka Pọl gbara anyị ume ‘ịgụkọ,’ gịnịkwa ka nke ọ bụla gụnyere?

16 Nke mbụ, Pọl depụtara àgwà omume ọma asatọ ma jiri okwu bụ́ “ka ha hà” ma ọ bụ ihe yiri ya bute nke ọ bụla ụzọ. Okwu nke a na-egosi na a kparaghị ndị Kraịst ókè iche echiche nanị n’ihe metụtara Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ ozizi mgbe nile. E nwere ọtụtụ ụdị isiokwu dị iche iche anyị pụrụ ịtụkwasị uche anyị na ha. Ma ihe dị mkpa bụ na ha aghaghị iru ọ̀tụ̀tụ̀ àgwà omume ọma nke Pọl depụtara. Nke ọ bụla n’ìgwè “ihe” ndị Pọl zoro aka na ha kwesịrị ka anyị chebara ya echiche. Ka anyị tụlee ha n’otu n’otu.

◻ “Eziokwu” gụnyere ihe karịrị nanị ịbụ eziokwu ma ọ bụ ụgha. Ọ pụtara ịkwụwa aka ọtọ, kwesịkwa ntụkwasị obi, ihe bụ ezie, ọ bụghị nanị ime ngosi nke ịdị otú ahụ.​—⁠1 Timoti 6:20.

◻ “Ihe kwesịrị nsọpụrụ” na-ezo aka n’ihe ndị e buliri elu na ndị dị ùgwù. Ọ na-akpali echiche nke nsọpụrụ ofufe, ihe dị ebube, maa mma, kwesịrị nsọpụrụ karịa ịbụ nke rere ure ma rụọ arụ.

◻ “Ihe ziri ezi” pụtara iru ụkpụrụ Chineke, ọ bụghị nke mmadụ. Ndị ụwa na-eji atụmatụ omume na-ezighị ezi na-emejupụta uche ha, ma anyị ga na-eche echiche, na-enwekwa mmasị n’ihe ndị ziri ezi n’anya Chineke.​—⁠Tụlee Abụ Ọma 26:4; Emọs 8:​4-⁠6.

◻ “Ihe dị ọcha” pụtara ịdị ọcha na ịdị nsọ ọ bụghị nanị n’akparamagwa (ná mmekọahụ ma ọ bụ n’ihe ndị ọzọ) kamakwa n’echiche na ebumnobi. “Amamihe ahụ nke si n’elu bịa buru ụzọ dị ọcha,” ka Jemes kwuru. Jisọs, onye “dị ọcha,” bụ Ihe Nlereanya zuru okè anyị ga-atụle.​—⁠Jemes 3:17; 1 Jọn 3:3.

◻ “Ihe kwesịrị ịhụnanya” bụ ihe na-akpali ma na-akpasu ịhụnanya n’ime ndị ọzọ. Anyị gaje ‘ịtụgharị uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche,’ kama itinye uche anyị n’ihe ndị na-akpalite ịkpọasị, obi ilu, na esemokwu.​—⁠Ndị Hibru 10:24.

◻ “Ihe e kwuru nke ọma” apụtaghị nanị “ihe e kwuru n’ụzọ dị mma” ma ọ bụ “nke a na-akọrọ akụkọ ọma” kamakwa, n’echiche nke dị irè, ịbụ nke na-ewuli elu na nke a na-aja mma. Anyị na-atụkwasị uche anyị n’ihe ndị dị mma na ndị na-ewuli elu kama ịbụ n’ihe na-ewetu ala ma na-akpasu iwe.​—⁠Ndị Efesọs 4:29.

◻ “Ịdị mma” pụtara n’ụzọ bụ isi “ịdị mma nke ukwuu n’omume,” ma ọ pụrụ ịpụta ụdị ịdị mma nke ukwuu ọ bụla. Otú a, anyị pụrụ ịghọta àgwà, iru eru, na ihe ndị bara uru ndị ọzọ rụzuru n’ikwekọ n’ụkpụrụ Chineke.

◻ Ihe ndị kwesịrị “otuto” dị otú ahụ n’ezie ma ọ bụrụ na otuto ahụ na-esite n’ọnụ Chineke ma ọ bụ n’ọnụ ịbụ isi nke ya onwe ya nabatara n’ezie.​—⁠1 Ndị Kọrint 4:5; 1 Pita 2:14.

Nkwa nke Ndụ na Udo

17. Ngọzi ndị dị aṅaa na-esite ‘n’ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ’?

17 Mgbe anyị gbasoro okwu ịdọ aka ná ntị Pọl ma ‘na-agụkọ ihe ndị a,’ anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma ‘n’ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ.’ Ihe ọ ga-arụpụta abụghị nanị ngọzi nke ndụ, ya bụ, ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ e kwere nkwa ya, kamakwa udo. (Ndị Rom 8:6) N’ihi gịnị? N’ihi na e chebere uche anyị pụọ ná mmetụta ọjọọ nke ihe anụ ahụ dị iche iche, ịgba mgba dị ilu n’etiti anụ ahụ na mmụọ nsọ dị ka Pọl kọwara adịkwaghị enwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ anyị. Site n’iguzogide mmetụta nke anụ ahụ, anyị na-enwekwa udo nke Chineke “n’ihi na ịtụkwasị uche n’anụ ahụ, ya na Chineke dị n’iro.”​—⁠Ndị Rom 7:21-⁠24; 8:7.

18. Ọgụ dị aṅaa ka Setan na-alụ, oleekwa otú anyị pụrụ isi merie?

18 Setan na ndị ọrụ ya na-eme ihe nile ha pụrụ ime iji gbachuo ngosipụta anyị nke ebube Chineke. Ha na-anwa ịchịkwa uche anyị site n’ịwụkwasị ha agụụ anụ ahụ, na-amara na nke a ga-emesịa duje n’iso Chineke nọrọ n’iro na n’ọnwụ. Ma anyị pụrụ imeri n’ọgụ nke a. Dị ka Pọl, anyị onwe anyị kwa pụrụ ịkpọsa, sị: “Ekele dịrị Chineke ná ndọpụta sitere n’aka Jisọs Kraịst Onyenwe anyị” n’ihi inye anyị ụzọ isi lụso aka mmehie ji anụ ahụ dara ada ọgụ.​—⁠Ndị Rom 7:25.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Bible na-ejikarị okwu Hibru bụ́ cha·taʼʹ na okwu Grik bụ́ ha·mar·taʹno egosi “mmehie.” Okwu abụọ ndị a pụtara “erughị,” n’echiche nke enwetaghị ma ọ bụ erughị ihe mgbaru ọsọ, akara, ma ọ bụ ihe a tụdoro.

b Dị ka ọha matara, mmehie asaa ahụ na-eweta ọnwụ bụ nganga, anyaukwu, ọchịchọ ọjọọ, ekworo, nribiga ihe ókè, iwe, na enweghị mmasị n’ihe ime mmụọ.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Gịnị bụ mmehie, oleekwa otú ọ pụrụ isi jide anụ ahụ dara ada aka?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi lụso “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ” ọgụ?

◻ Gịnị ka anyị pụrụ ime iji kwalite “ịtụkwasị uche na Mmụọ Nsọ”?

◻ Olee otú “ịtụkwasị uche na Mmụọ Nsọ” si eweta ndụ na udo?

[Foto dị na peeji nke 15]

Ken kwere ka ọchịchọ anụ ahụ chịa ya ruo mbibi nke onwe ya

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya