Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 7/15 p. 4-7
  • N’ihi Gịnị Ka Egwu Ji Ejikpọ Ụwa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka Egwu Ji Ejikpọ Ụwa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Egwu Zuru Ụwa Ọnụ Dị Ịrịba Ama
  • Ihe Ụwa nke a Pụrụ Ịtụ Anya Ya
  • Oge Ọṅụ, Ọ Bụghị Egwu
  • Zụlite Obi Gị Ịtụ Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Tụọ Egwu Jehova, Nyekwa Aha Nsọ Ya Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ịmụta Otú E Si Achọta Obi Ụtọ n’Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • A Zaa Ajụjụ Anọ Banyere Ọgwụgwụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 7/15 p. 4-7

N’ihi Gịnị Ka Egwu Ji Ejikpọ Ụwa?

ÒNYE chọrọ ịdị na-ebi n’egwu? Ụmụ mmadụ n’ozuzu ha nwere ọchịchọ ịnọ ná ntụkwasị obi, n’enweghị iyi egwu nye ndụ ma ọ bụ ihe onwunwe ha. N’ihi ya, ọtụtụ na-akwapụ n’ebe mpụ jupụtara. Ma, ihe ndị na-akpata egwu dị n’ebe ọ bụla.

Ihe ize ndụ ndị sitere n’ihe ọghọm nke ngwá agha na ebe mmepụta nuklia na-akpalitere ihe a kpọrọ mmadụ egwu maka mbibi. Ime ihe ike na-arị elu ọjị na-akwalite egwu. Ọtụtụ nọ n’egwu na ọrịa AIDS ga-aghọ ntiwapụ ọrịa kasị eweta ọnwụ nke narị afọ a. Mbibi nke gburugburu ebe obibi anyị so n’ihe ndị ọzọ na-akpata egwu. Egwu ndị a hà dị ịrịba ama n’ụzọ pụrụ iche? Ànyị pụkwara ile anya mgbe ọ bụla ibi ndụ n’ime ụwa nke egwu dị otú ahụ na-adịghị na ya?

Egwu Zuru Ụwa Ọnụ Dị Ịrịba Ama

Egwu zuru ụwa ọnụ taa dị ịrịba ama n’ihi ihe e buru amụma ya n’ime Bible. N’amụma ya banyere mgbe ikpeazụ, Jisọs Kraịst zoro aka n’ọnọdụ dị iche iche ga-akpata egwu. Ọ sịrị: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” Jisọs kwukwara banyere “ihe na-emebi iwu ga-aba ụba.” Eri 1914, agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, na ihe na-emebi iwu, bụ́ ndị na-enweghị atụ, ewetawo egwu dị ukwuu na mfu nke ndụ.​—⁠Matiu 24:​7-⁠14.

Ọbụna àgwà ndị mmadụ na-eme ka a na-atụ egwu taa. Na 2 Timoti 3:​1-⁠4, anyị na-agụ okwu amụma ndị Pọl onyeozi kwuru: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” Ebe ndị dị otú ahụ gbara anyị gburugburu na mgbe ikpeazụ ndị a, ọ bụghị ihe ijuanya na e nwere egwu dị ukwuu!

Ihe Ụwa nke a Pụrụ Ịtụ Anya Ya

Jisọs ji oge a tụnyere mgbe ikpeazụ nke ụwa nke oge Noa. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na egwu dị ukwuu mgbe ahụ, n’ihi na ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme nke Bible na-asị: “E bibiri ụwa n’ihu Chineke, ụwa jupụtakwara n’ihe ike.” N’ihi ya, “Chineke wee sị Noa, Ọgwụgwụ anụ ahụ nile abịawo n’ihu m; n’ihi na ụwa jupụtara n’ihe ike.” (Jenesis 6:​11, 13) Ụwa ọjọọ ahụ jupụtara n’ihe ike nke na Chineke ji Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ weta ọgwụgwụ ya. Ma, n’ihi ịhụnanya, Jehova Chineke chebere Noa, onye na-eme ezi omume, na ezinụlọ ya.​—⁠2 Pita 2:5.

Ya mere gịnị ka ụwa dị ugbu a nke na-eme ihe ike pụrụ ịtụ anya ya? Ee, Chineke kpọrọ iji ime ihe ike na-eleghara ọdịmma ndị ọzọ anya asị. Nke a pụtara ìhè site n’okwu onye ọbụ abụ ahụ: “Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) Jehova wetara ụwa ime ike nke ụbọchị Noa ná njedebe. Otú ahụkwa, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya na Chineke ga-eweta ọgwụgwụ nye ụwa a ime ihe ike na-akpata ịtụ egwu na-eti ihe otiti?

Chineke nyere Pita onyeozi mmụọ nsọ ikwu banyere ọnụnọ Kraịst na ibu amụma ọdachi maka ụwa ọjọọ nke dị ugbu a. O dere, sị: “Ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa na mgbe ikpeazụ, na-aga dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị, na-asịkwa, Olee ebe nkwa nke [ọnụnọ, NW] Ya dị? n’ihi na site n’ụbọchị nna anyị ha dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide dị ka ha dịworo site ná mmalite nke okike.” Mgbe ahụ Pita jiri okwu bụ “eluigwe” nọchite anya usoro nke ịchịisi ezughị okè n’elu ihe a kpọrọ mmadụ na okwu bụ́ “ụwa” maka ọha mmadụ nke na-adịghị eme ezi omume. “N’ihi na,” ka ọ sịrị, “nke a mere ha nchefu n’ihi na ha na-achọ ya, na eluigwe dị site na mgbe ochie, ha na ala nke e sitere ná mmiri werekwa mmiri mee ka o guzokọọ n’otu, site n’okwu Chineke; nke e sitere n’aka ha mee ka ụwa nke dị n’oge ahụ [ụbọchị Noa] laa n’iyi, n’ihi na iju mmiri gbara ya: ma eluigwe nke dị ugbu a, ha na ụwa, ka a kpadoworo nye ọkụ site n’otu okwu ahụ, ebe a na-edebe ha nye ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”​—⁠2 Pita 3:​3-⁠7.

N’otu aka ahụ, Pọl kọwapụtara na Kraịst na ndị mmụọ ozi ya dị ike ga-abọ “ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs: bụ́ mmadụ ndị ga-ahụ ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, bụ́ mbibi ebighị ebi.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:​6-⁠9) Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-ekwu banyere nchịkọta nke mba nile maka “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,” ma na-eme ka anyị jide n’aka na Jehova ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa.’​—⁠Mkpughe 11:18; 16:14-⁠16.

Oge Ọṅụ, Ọ Bụghị Egwu

Kama ịtụ ụjọ n’ihi ihe Bible buru amụma ya maka ụwa nke a, ndị ziri ezi nwere ihe mere ha ga-eji nwee ọṅụ. N’isi nso Jehova ga-eweta ụwa ọjọọ nke a ná njedebe, ma a ga-eme nke a maka ọdịmma nke ndị na-ahụ ezi omume n’anya. Gịnị ga-esochi ọgwụgwụ nke a nke usoro ihe dị ugbu a nke Chineke ga-eweta? Eenụ, usoro ihe ọhụrụ n’okpuru Alaeze eluigwe nke Chineke, nke Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere ya! Ọ sịrị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ. Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:​9, 10) Olee mgbanwe ndị a pụrụ ịtụ anya ha mgbe a na-eme uche Chineke n’ụwa?

Agha na ihe ụjọ ya nile ga-agwụsịwo. Abụ Ọma 46:9 na-asị: “[Jehova Chineke] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; ọ na-esure ụgbọ [agha] ala nile n’ọkụ.” Mgbe ahụ ndị mmadụ “ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”​—⁠Maịka 4:4.

Ọrịa ndị na-eweta ọnwụ agakwaghị na-akpata egwu ma na-ewere ndụ ndị mmadụ. Nkwa Chineke bụ: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Lee aha ihe ọṅụ ọ bụ!

Egwu ndị e jikọrọ ha na mpụ na ime ihe ike ga-abụkwa ihe ndị oge ha gafeworo. Abụ Ọma 37:​10, 11 na-ekwe nkwa, sị: “Ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”

Olee otú a ga-esi jiri ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi dochie egwu ndị a na-atụ taa? Site n’otu gọọmenti ezi omume​—⁠Alaeze Chineke. Banyere oge anyị, Daniel 2:44 na-asị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” Eze Jehova họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst, ‘aghaghị ịbụ eze, ruo mgbe Chineke ga-edebeworị ndị iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya.’ (1 Ndị Kọrint 15:25) Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs ga-emezu nzube mbụ nke Chineke nke inwe paradaịs elu ụwa nke ụmụ mmadụ na-enwe ọṅụ bi n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.​—⁠Luk 23:43; Mkpughe 20:6; 21:1-⁠5.

N’ụwa Paradaịs ahụ, a ga-enwe otu egwu nke na-ewuli elu. Ọ ga-abụ “egwu Jehova.” (Ilu 1:7) N’ezie, anyị kwesịrị inwe egwu a ọbụna ugbu a, n’ihi na ọ bụ nsọpụrụ na egwu miri emi ya na ụjọ nke ime ihe ga-ewute Chineke n’ihi na anyị nwere ekele maka ịhụnanya ebere na ịdị mma ya. Egwu nke a na-achọ ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ na nrubeisi site n’ikwesị ntụkwasị obi nye ya.​—⁠Abụ Ọma 2:11; 115:11.

Ihe omume ndị na-atụ egwu na-aka oge ndị a akara dị ka mgbe ikpeazụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị anwapụta ịhụnanya anyị maka Chineke, anyị pụrụ inwe ọṅụ kama ịdị na-atụ egwu. Amụma dị iche iche nke Bible na-egosi na njedebe Chineke ga-eweta ụwa nke a na ya dị nso. A ga-eji ụwa ọhụrụ nke ezi omume nke Jehova Chineke kwere nkwa ya dochie ya. (2 Pita 3:13) N’ezie, n’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ a ga-enwe n’isi nso ụwa nke egwu na-adịghị ewuli elu na-adịghị na ya.

[Igbe dị na peeji nke 6]

IKE NKE OTU MKPỤRỤ

TOMASZ, nwa okoro si Poland, dabara ná nsogbu usoro iwu nke mere ka o si ná mba ya gbalaga. Ruo ọnwa isii ọ na-esogharị ụgbọ ala aga site n’otu ebe ruo ebe ọzọ na Europe, na-arahụ n’otu ụlọ ntu ma na-arụ ọrụ dị iche iche. Ka ọ dị na mgbe ahụ, otu ajụjụ nọgidere n’uche ya: Gịnị bụ nzube nke ndụ?

A zara ajụjụ Tomasz mgbe e nyere ya otu Ụlọ Nche n’asụsụ Polish. Ọ gụrụ ya ọtụtụ ugboro ma ghọta na magazin nke a bu eziokwu ahụ ọ nọworo na-achọ. Tomasz sooro ụgbọ ala ọ rịọtara ka o buru ya gaa 200 kilomita ruo alaka ụlọ ọrụ Watch Tower dị na Selters/Taunus, Germany. Ka ọ na-erute n’uhuruchi Monday, o wepụtara magazin Ụlọ Nche ya ma sị: “M ga-achọ ka mmadụ kọwakwuoro m ihe banyere ihe dị na magazin a. Gịnị ka ọ dị m mkpa ime?”

N’uhuruchi ahụ, abụọ n’ime Ndịàmà Jehova gwara Tomasz okwu banyere nzube nke ndụ, na-eji Bible eme ihe dị ka ihe ndabere nke nkwurịta okwu ha. N’ịnụ ọkụ n’obi iji mụtakwuo ihe, Tomasz na-alaghachi n’alaka ụlọ ọrụ ahụ kwa ụbọchị n’izu ahụ, na-amụ Bible na akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.

Tomasz kpebiri ịlaghachi Poland, ọ bụ ezie na ọ pụrụ izute nsogbu n’ebe ahụ. Ya mere, na Friday, nanị ụbọchị anọ ka o rutesịrị n’alaka ụlọ ọrụ nke Selters, Tomasz malitere njem ịga n’ala nna ya ha. Ọ malitere ozugbo iso Ndịàmà Jehova nọ na Poland na-amụ ihe. Tomasz nwere ọganihu dị ngwa ma jiri ịnụ ọkụ n’obi malite ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ọ na-amụta. N’October 1993, nanị ọnwa anọ ka nleta mbụ ya gaa na Selters gasịrị, e mere ya baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Nanị otu mkpụrụ Ụlọ Nche nyeere nwa okorobịa a aka ime nchọpụta maka nzube nke ndụ!

[Foto dị na peeji nke 7]

N’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ dị n’aka Jisọs Kraịst, ọ dịghị mgbe egwu ga-ejikpọ ụwa ọzọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya