A Ghaghịkwa Ibu Ụzọ Kwusaa Ozi Ọma nke A
“A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke m n’ihu mba nile.”—MAK 13:10.
1, 2. Gịnị bụ akara e ji amata Ndịàmà, n’ihi gịnịkwa?
N’IHI gịnị ka Ndịàmà Jehova ji eme nkwusa n’akwụsịghị akwụsị otú a? N’ezie a maara anyị n’ụwa nile n’ihi ozi ihu ọha anyị, ma ọ bụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’okporo ámá, ma ọ bụ ná nzute mberede. N’ọnọdụ ọ bụla kwesịrị ekwesị, anyị na-eme ka a mata anyị dị ka Ndịàmà, na-agbalịkwa iji akọ kwusaa ozi ọma ahụ anyị weere dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. N’ezie, anyị pụrụ ikwu na ozi a bụ akara e ji mara anyị!—Ndị Kọlọsi 4:6.
2 Chee nnọọ echiche banyere ya—mgbe ọ bụla ndị mmadụ hụrụ ìgwè ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị jiri ejiji dị mma ma buru akpa n’ógbè ha, gịnị na-abụkarị ihe mbụ na-agbata ha n’uche? Ọ̀ bụ, ‘Oo, ndị Katọlik a (ma ọ bụ Orthodox) abịakwa ọzọ!’ ma ọ bụ, ‘Ndị Pentecostal a (ma ọ bụ ndị Baptist) abịakwa ọzọ!’ Ee e. Ndị mmadụ maara na okpukpe ndị ahụ enweghị ezinụlọ dum ndị na-eje ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ma eleghị anya ìgwè okpukpe ụfọdụ na-eziga ụfọdụ “ndị ozi ala ọzọ” maka ije ozi mkpirikpi oge nke afọ abụọ n’ógbè ụfọdụ, ma ndị òtù ha ndị ọzọ adịghị ekere òkè n’ozi ọ bụla dị otú ahụ. Ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova ka a maara n’ụwa nile maka ịnụ ọkụ n’obi ha n’ikwusara ndị ọzọ ozi ha n’ọnọdụ ọ bụla kwesịrị ekwesị. A makwaara ha maka magazin ha, Ụlọ Nche na Teta!—Aịsaịa 43:10-12; Ọrụ 1:8.
Ịdị Iche n’Ebe Ndị Ụkọchukwu Krisendọm Dị
3, 4. Olee otú e si egosipụtakarị ndị ụkọchukwu Krisendọm n’usoro mgbasa ozi?
3 N’ụzọ dị nnọọ iche, akụkọ ozi dị iche iche ekpughewo ugboro ugboro ọtụtụ ndị ụkọchukwu n’ala ụfọdụ dị ka ndị na-edina ụmụntakịrị, ndị nrigbu na-adịghị ọcha, na ndị na-egwu wayo. Ọrụ ha nile nke anụ ahụ na ndụ okomoko ha pụtara ìhè nye mmadụ nile. Otu onye a ma ama nke na-ede egwú kwupụtara ya n’ụzọ ziri ezi n’egwú ya nke ọ kpọrọ “Jisọs Ọ̀ Ga-eyi Rolex [elekere mgbanaka dị oké ọnụ] n’Ihe Ngosi Telivishọn Ya?” Ọ na-ajụ ajụjụ bụ́: “Jisọs ọ̀ ga-abụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma Ọ bịa ọzọ n’Ụwa? Nwee ebe obibi Ya nke abụọ na Palm Springs [ógbè ndị aka ji akụ nke dị na California] ma gbalịa izochi ókè akụ Ya haruru?” Lee ka okwu Jemes si kwesị ekwesị: “Unu biri n’oké oriri na ọṅụṅụ n’elu ụwa, dịkwa ndụ ọjọọ dị ka ọ na-atọ ahụ unu ụtọ; unu zụrụ obi unu n’ụbọchị ogbugbu.”—Jemes 5:5; Ndị Galetia 5:19-21.
4 Ndị ụkọchukwu iso ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpakọrịta ọbụna na-ekerekwa òkè ná nhọpụta dị iche iche dị ka ndị na-azọ ọkwá ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ekpughe ha dị ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nke oge a. N’otu mgbe ahụkwa, ná mba ndị dị ka United States na Canada, oké mmefu nke ịgba akwụkwọ n’ụlọ ikpe na ikpe ikpe megide ndị ụkọchukwu n’ihi àgwà enweghị njide onwe onye ná mmekọahụ ha nke ha na ụmụntakịrị na ndị okenye, na-eme ka igbe ego nke okpukpe tọgbọrọ chakoo.—Matiu 23:1-3.
5. N’ihi gịnị ka ndị ụkọchukwu Krisendọm na-ejibeghị nwapụta onwe ha ịbụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche”?
5 N’ụzọ ziri ezi, Jisọs pụrụ ịgwa ndị ụkọchukwu nke oge ya, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ; n’ihi na unu yiri ili e teworo nzu, nke na-egosi onwe ha dị ka ihe ọma n’ìhè, ma n’ime ha jupụtara n’ọkpụkpụ nke ndị nwụrụ anwụ, na adịghị ọcha nile. Otú a unu onwe unu na-egosikwa onwe unu nye mmadụ n’ìhè dị ka ndị ezi omume, ma n’ime unu jupụtara n’ihu abụọ na ihe na-emebi iwu.” N’ihi ya, Chineke enyebeghị ndị ụkọchukwu nke Krisendọm ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ, ma ha bụ ndị Katọlik, Protestant, Orthodox, ma ọ bụ ndị na-esoghị n’òtù okpukpe ọ bụla a haziri ahazi. Ha anwapụtabeghị onwe ha ịbụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” nke e buru n’amụma.—Matiu 23:27, 28; 24:45-47.
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Buru Ụzọ Kwusaa Ozi Ọma Ahụ?
6. Ihe omume dịgasị aṅaa ga-ewere ọnọdụ n’isi nso?
6 Ná nsụgharị ya dị mkpirikpi nke iwu ahụ Jisọs nyere ikwusa ozi ọma ná mba nile, ọ bụ nanị Mak ji okwu bụ́ “ibu ụzọ” mee ihe. (Mak 13:10; tụlee Matiu 24:14.) Nsụgharị nke J. B. Phillips dere na-agụ, sị: “N’ihi na tupu ọgwụgwụ ahụ abịa a ghaghị ikwusara mba nile ozi ọma ahụ.” Ojiji e ji “ibu ụzọ” mee ihe dị ka nkọwa ngwaa na-egosi na ihe omume ndị ọzọ ga-esochi ọrụ izisa ozi ọma ahụ nke zuru ụwa ọnụ. Ihe omume ndị ahụ ga-agụnye oké mkpagbu ahụ e kwere nkwa ya na ịchịisi ezi omume nke Kraịst n’elu ụwa ọhụrụ ahụ.—Matiu 24:21-31; Mkpughe 16:14-16; 21:1-4.
7. N’ihi gịnị ka Chineke ji chọọ ka e buru ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ?
7 Ya mere n’ihi gịnị ka Chineke ji chọọ ka e buru ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ? Otu ihe kpatara ya bụ n’ihi na ọ bụ Chineke nke ịhụnanya, ikpe ziri ezi, amamihe, na ike. Ná mmezu nke okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Matiu 24:14 na Mak 13:10, anyị pụrụ ịhụ ngosipụta na-akpali akpali nke àgwà ndị a nke Jehova. Ka anyị nyochaa ha n’otu n’otu ná mkpirikpi wee hụ ihe jikọrọ ha na nkwusa nke ozi ọma ahụ.
Ozi Ọma ahụ na Ịhụnanya Jehova
8. Olee otú nkwusa nke ozi ọma ahụ si bụrụ ngosipụta nke ịhụnanya Chineke? (1 Jọn 4:7-16)
8 Olee otú ikwusa ozi ọma ahụ si egosipụta ịhụnanya Chineke? Nke mbụ, n’ihi na ọ bụghị ozi e zubere nanị maka otu agbụrụ ma ọ bụ ìgwè. Ọ bụ ozi ọma dịịrị “mba nile.” Chineke hụrụ ezinụlọ mmadụ n’anya nke ukwuu nke na o zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ịbụ àjà mgbapụta n’ihi mmehie nke ihe nile a kpọrọ mmadụ, ọ bụghị otu agbụrụ nanị. Jọn onyeozi dere, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. N’ihi na Chineke eziteghị Ọkpara Ya n’ụwa ka O kpee ụwa ikpe; kama ka e wee site n’aka Ya zọpụta ụwa.” (Jọn 3:16, 17) N’ezie, ozi ọma ahụ, bụ́ ozi nke na-ekwe nkwa ụwa ọhụrụ nke udo, nkwekọrịta, na ikpe ziri ezi, bụ ihe àmà nke ịhụnanya Chineke.—2 Pita 3:13.
Ozi Ọma ahụ na Ike Jehova
9. N’ihi gịnị ka Jehova na-ejighị jiri okpukpe ndị dị ike nke Krisendọm mee ihe iji kwusaa ozi ọma ahụ?
9 Olee otú e si egosipụta ike Jehova site ná nkwusa nke ozi ọma ahụ? Tụlee, ònye ka o jiworo mee ihe n’ịrụzu ọrụ a? Ọ̀ bụworịị òtù okpukpe ndị kasị ike nke Krisendọm, dị ka Chọọchị Roman Katọlik ma ọ bụ òtù okpukpe Protestant ndị a ma ama? Ee e, ntinye aka ha na-etinye ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-eme ka ha ghara iru eru maka ọrụ ahụ. (Jọn 15:19; 17:14; Jemes 4:4) Oké akụ na ụba nke ha nwere na mmekọrịta na mmetụta ha nwere n’ebe ndị na-achị achị nọ n’ọkwá dị elu maara amasịbeghị Jehova Chineke, ma ọ bụkwanụ nkà mmụta okpukpe ha ndị e jikọtara ya na omenala. A chọbeghị ike mmadụ iji mezuo uche Chineke.—Zekaraịa 4:6.
10. Ònye ka Chineke họrọwooro ime nkwusa ahụ?
10 Ọ bụ dị ka Pọl onyeozi kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara ọgbakọ Kọrint, sị: “Leenụ ọkpụkpọ unu, ụmụnna m, na ọ dịghị ọtụtụ ndị maara ihe dị ka anụ ahụ si mara ihe, ọ dịghị ọtụtụ ndị ike, ọ dịghị ọtụtụ ndị a mazuuru aha ha, ka a kpọrọ: kama ọ bụ ihe nzuzu nke ụwa ka Chineke họpụtara, ka O wee mee ka ihere mee ndị maara ihe; ọ bụkwa ihe na-adịghị ike nke ụwa ka Chineke họpụtara, ka O wee mee ka ihere mee ihe dị ike; ọ bụkwa ihe dị ala nke ụwa, na ihe a kpọrọ ihe efu, ka Chineke họpụtara, bụ́ ihe nke na-adịghị, ka O wee mee ka ihe nke na-adị ghara ịdị irè: ka anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, wee ghara ịnya isi n’ihu Chineke.”—1 Ndị Kọrint 1:26-29.
11. Eziokwu dịgasị aṅaa banyere Ndịàmà meworo ka ha dị iche?
11 Ndịàmà Jehova nwere mmadụ ole na ole bụ́ aka ji akụ n’etiti ha, ha enweghịkwa ndị ọ bụla dị ike n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Nnọpụiche ha kpam kpam n’okwu metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị pụtara na ha agaghị enwe ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla. N’ụzọ megidere nke ahụ, ha abụwo ọtụtụ mgbe ndị e mesoro mkpagbu jọgburu onwe ya nke ọ bụ ndị ndú okpukpe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpasuru n’ime narị afọ nke 20 a. Ma, n’agbanyeghị oké mmegide nke ndị na-eso ụzọ ọchịchị ndị Nazi, ndị Fascist, ndị Kọmụnist, ịhụ mba n’anya, na okpukpe ụgha na-akpasu megide ha, ọ bụghị nanị na Ndịàmà na-ekwusa ozi ọma n’ụwa nile kama ha amụbawokwa n’ọnụ ọgụgụ ha n’ụzọ na-atụ n’anya.—Aịsaịa 60:22.
12. N’ihi gịnị ka Ndịàmà jiworo nwee ihe ịga nke ọma?
12 Gịnị ka Ndịàmà ahụ na-ekwu na ọ bụ ya kpatara ihe ịga nke ọma ha? Jisọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa, sị: “Unu ga-anata ike, mgbe Mmụọ Nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndịàmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” Ya mere, gịnị kpọmkwem gaje ịbụ ebe ihe ịga nke ọma ha sitere? Jisọs sịrị: “Unu ga-anata ike, mgbe Mmụọ Nsọ ga-abịakwasịworị unu.” N’otu aka ahụ taa, ike nke sitere n’aka Chineke, ọ bụghị ike mmadụ, abụwo isi ihe kpatara ihe ịga nke ọma nke Ndịàmà n’ozi ha zuru ụwa ọnụ. N’iji ndị yiri ndị kasị bụrụ ndị na-adịghị ike eme ihe, Chineke na-arụzu ọrụ izi ihe kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme.—Ọrụ 1:8; Aịsaịa 54:13.
Ozi Ọma ahụ na Amamihe Jehova
13. (a) Gịnị mere Ndịàmà ji jiri afọ ofufo na-eje ozi n’adịghị anata ụgwọ ọ bụla? (b) Olee otú Jehova siworo zaghachi ịta ụta Setan?
13 Ọ bụ ndị wepụtara onwe ha na-ekwusa ozi ọma ahụ. Jisọs sịrị: “N’efu ka unu natara, nyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) Ya mere, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime Ndịàmà Jehova nke na-anata ụgwọ ọnwa maka ijere Chineke ozi, ha adịghịkwa achọ ya. N’ezie, ha adịghị ọbụna anakọta ego ná nzukọ ha dị iche iche. Obi dị ha ụtọ, inye Chineke ihe ọ ga-aza onye na-ebo ya ebubo, Setan bụ́ Ekwensu, site n’ozi achọghị ọdịmma onwe onye ha nke a raara nye ya. Onye mmegide a bụ́ mmụọ nke na-emegide Chineke si otú a kwuo na ụmụ mmadụ agaghị eji ọchịchọ achọghị ọdịmma onwe onye jeere Chineke ozi. N’amamihe ya, Jehova ewepụtawo azịza dị ukwuu nye ịta ụta nke Setan—ọtụtụ nde Ndịàmà bụ́ ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe ndị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’okporo ámá, na ná mberede.—Job 1:8-11; 2:3-5; Ilu 27:11.
14. Gịnị bụ “amamihe nke e zobeworo” nke Pọl na-ezo aka na ya?
14 Ihe àmà ọzọ nke amamihe Chineke n’ịhụ na e kwusara ozi ọma ahụ bụ na nkwa nke Alaeze ahụ n’onwe ya bụ ngosipụta nke amamihe Chineke. Pọl onyeozi dere, sị: “Amamihe bụ ihe anyị na-ekwu n’etiti ndị tozuru okè: ma ọ bụ amamihe nke na-abụghị nke oge a, ọ bụghịkwa nke ndị isi oge a, ndị a na-eme ka ha ghara ịdị irè: kama ihe anyị na-ekwu bụ amamihe Chineke n’ihe omimi, bụ́ amamihe nke e zobeworo, nke Chineke buru ụzọ kaa àkà mgbe oge ndị a akaerughị, iwetara anyị otuto.” “Amamihe nke e zobeworo” na-ezo aka n’ụzọ amamihe nke Chineke ga-eji weta nnupụisi ahụ a malitere n’Iden ná njedebe. E kpughere amamihe nke ihe omimi dị nsọ ahụ n’ime Jisọs Kraịst, onye bụ isi n’ozi ọma nke Alaeze Chineke.a—1 Ndị Kọrint 2:6, 7; Ndị Kọlọsi 1:26-28.
Ozi Ọma ahụ na Ikpe Ziri Ezi nke Chineke
15. Olee otú anyị si mara na Jehova bụ Chineke nke ikpe ziri ezi? (Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 33:5)
15 Ọ bụ n’ihe banyere ikpe ziri ezi karịsịa ka anyị na-ahụ ịdị mkpa nke okwu ahụ bụ́ “ibu ụzọ” nke dị na Mak 13:10. Jehova bụ Chineke nke ikpe ziri ezi nke e ji ebere mee ka ọ dị nro. Ọ na-ekwu site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Jeremaịa, sị: “Onye na-anya isi, ya nyaa isi na nke a, na o nwere uche n’ebe M nọ, wee mara m, na Mụ onwe m bụ Jehova Nke na-eme ebere na ikpe ziri ezi na ezi omume n’ụwa: n’ihi na ihe ndị a atọwo m ụtọ; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”—Jeremaịa 9:24.
16. Olee otú a pụrụ isi maa atụ na ikpe ziri ezi chọrọ ibu ụzọ nye ịdọ aka ná ntị?
16 Olee otú e si gosipụta ikpe ziri ezi nke Jehova n’ihe banyere ikwusa ozi ọma ahụ? Ka anyị jiri nne nke gheworo àkàrà nke a ga-ata mgbe ndị ọbịa bịara ka oge na-aga n’ụbọchị ahụ maa atụ ya. Ọ bụrụ na ọ hapụ ya n’elu table dị na kichin n’agwaghị ụmụ ya ihe ọ bụla banyere mgbe a ga-ata ya, gịnị ka ò yikarịrị ka ụmụaka ahụ ga-eme dị ka e si kee ha? Anyị nile nwere mgbe anyị bụ ụmụntakịrị! Ụmụ obere mkpịsị aka ga-enwe mmasị ịnwale àkàrà ahụ! Ugbu a ọ bụrụ na nne ahụ enyeghị ịdọ aka ná ntị kwesịrị ekwesị, ọ gaghị enwe ezigbo ihe mere ọ ga-eji nye ahụhụ. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na o kwuo n’ụzọ doro anya na a ga-ata àkàrà ahụ mgbe oge na-aga mgbe ndị ọbịa bịara, ya mere na e kwesịghị ịkpa ya aka, mgbe ahụ o nyewo ịdọ aka ná ntị n’ụzọ doro anya. Ọ bụrụ na e nwee nnupụisi, o nwere ikike ime ihe kpọmkwem nke zikwara ezi.—Ilu 29:15.
17. Olee otú Jehova siworo gosipụta ikpe ziri ezi n’ụzọ pụrụ iche kemgbe 1919?
17 Jehova, n’ikpe ziri ezi ya, agaghị eme ihe e kpere n’ikpe megide ajọ usoro ihe nke a n’ebughị ụzọ nye ịdọ aka ná ntị dị mkpa. Ya mere, karịsịa kemgbe 1919, ka Agha Ụwa nke Mbụ wetasịworo “mmalite ihe mgbu,” Jehova emewo ka Ndịàmà ya gaa gburugburu ụwa nile jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ozi ọma ahụ. (Matiu 24:7, 9, 14) Mba nile apụghị ikwupụta n’ụzọ ziri ezi na ha amaghị banyere ịdọ aka ná ntị a pụrụ iche.
Ruo n’Ókè Hà Aṅaa Ka E Jezuworo Ụwa?
18. (a) Olee ihe àmà e nwere nke ọrụ Ndịàmà ahụ n’ebe ndị dị anya? (b) Olee ihe atụ ndị ọzọ ị maara?
18 A pụrụ ịhụ ihe àmà na-egosi ịdị irè nke ọrụ izi ihe a zuru ụwa ọnụ site n’akwụkwọ bụ́ Last Places—A Journey in the North. Onye dere ya kwuru na mgbe ya nyochara ihe ndekọ ụgbọ mmiri maka agwaetiti ahụ dịpụrụ adịpụ bụ́ Foula, nke bụ́ otu n’ime Agwaetiti Dị Iche Iche nke Shetland n’ebe ugwu nke Scotland, ihe ndekọ ahụ gosiri “WKS (mkpọmkpọ ihe ndị mebiri emebi), RKS (oké nkume), LDGS (nkume ndị dị n’ala mmiri), na OBS (ihe mgbochi dị iche iche) gburugburu agwaetiti ahụ nile.” Ndị a “na-adọ onye ahụ na-anya ụgbọ mmiri aka ná ntị izere ebe ahụ. Mmiri ndị gbara Foula gburugburu bụ oké ogbunigwe, nke mere ka agwaetiti ahụ bụrụ ebe ndị na-anya ntakịrị ụgbọ mmiri, ndị njem otu ụbọchị nanị, na ọbụna ndị ọrụ obodo nke Eze Nwanyị na-apụghị ịbanye, ma o gbochighị—ka m nụrụ n’ime ụbọchị ole na ole—Ndịàmà Jehova.” Ọ gara n’ihu: “Ka ha nọ nnọọ na-awagharị n’ime ógbè ndị a na-ahazighị ahazi nke nnukwu obodo ukwu na Akụkụ Ụwa Ka Na-emepe Emepe na-achọ ndị a ga-atọghata, otú ahụ ka ha nọkwa na-agbasa okwukwe ha na Foula dị n’ebe dị anya.” O kwetara na a hapụrụ otu mkpụrụ Ụlọ Nche n’ọnụ ụzọ nke onye bi n’obodo ahụ bụ́ Andrew, ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ. Mgbe ahụ o kwukwasịrị: “Otu izu ka e mesịrị m gaje ịhụ otu mkpụrụ [Teta! n’asụsụ Danish] na Faeroe [agwaetiti dị iche iche nke North Sea] ọnwa abụọ kwa ka e mesịrị otu mkpụrụ [Ụlọ Nche n’asụsụ Danish] na Nuuq, Greenland.” Lee aha ihe àmà pụtara ìhè nke ọrụ ịnụ ọkụ n’obi nke Ndịàmà Jehova n’akụkụ ebe ugwu ndị ahụ bụ!
Gịnị Na-akwali Ndịàmà Ịnọgide Na-aga n’Ihu?
19, 20. (a) Gịnị na-akwali Ndịàmà Jehova ịnọgide na-eme nkwusa? (b) Olee ajụjụ ndị ọzọ a ga-aza?
19 N’eziokwu, ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ jekwuru ndị ị na-amaghị na mbụ abụghị ihe dị mfe, n’agbanyeghị afọ ole mmadụ pụrụ ịbụworị Onyeàmà. Gịnịzị na-akwali ndị Kraịst ndị a ịnọgide na-aga n’ihu? Nraranye ndị Kraịst ha na ịghọta na ha nwere ibu ọrụ. Pọl dere, sị: “N’ihi na a sị na ana m ezisa ozi ọma, enweghị m ihe ịnya isi; n’ihi na mkpa na-akpa m; n’ihi na ahụhụ dịịrị m, a sị na ezisaghị m ozi ọma.” Ezi ndị Kraịst nwere ozi nke pụtara ndụ, ya mere olee otú ọ pụrụ isi kwee omume hà ijichiri ya onwe ha? Ụkpụrụ ahụ kpọmkwem nke ikpe ọmụma ọbara n’ihi ịghara inye ịdọ aka ná ntị n’oge ihe ize ndụ bụ ihe nkwali iji kwusaa ozi ọma ahụ.—1 Ndị Kọrint 9:16; Ezikiel 3:17-21.
20 Mgbe ahụ olee otú e si ekwusa ozi ọma ahụ? Gịnị bụ isi ihe dị n’ihe ịga nke ọma nke Ndịàmà? Akụkụ dịgasị aṅaa nke ozi na nzukọ ha na-enye aka ime ka a mata ha dị ka ezi okpukpe ahụ? Isiokwu anyị na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo nkọwa banyere amamihe Chineke na ‘ihe omimi dị nsọ’ ahụ, lee akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke Abụọ, peji nke 1190, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Gịnị na-eme ka Ndịàmà Jehova dị iche ná ndị ụkọchukwu?
◻ Olee otú ime nkwusa ahụ si egosipụta ịhụnanya, ike na amamihe Chineke?
◻ Olee otú ikwusa ozi ọma ahụ si egosipụta ikpe ziri ezi Chineke?
◻ Gịnị na-akwali Ndịàmà Jehova ịnọgide n’ozi ha?
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
N’agbanyeghị otú ndị mmadụ pụrụ isi nọrọ n’ebe dịpụrụ adịpụ, Ndịàmà Jehova chọrọ ijekwuru ha