Ịnọgide Na-enwe Nkwekọrịta n’Etiti Ndị Okenye na Ndị Ohu Na-eje Ozi
NTAKỊRỊ oge ka Pentikọst 33 O.A. gasịrị, ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa bilitere n’ọgbakọ ndị Kraịst ahụ e guzobere ọhụrụ. E meworị ndokwa iji lekọta ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị nọ ná mkpa. Ma mgbe oge ụfọdụ gasịrị “ndị Juu na-asụ asụsụ Grik malitere ịtamu megide ndị Hibru, n’ihi na e lefuuru ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ anya n’ije ozi, bụ́ ikere ndị Kraịst òkè, kwa ụbọchị.”—Ọrụ 6:1.
Mkpesa ndị a ruru ndị ozi ntị. “Ndị ozi iri na abụọ ahụ wee kpọọ ọha ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwute ha, sị, Ọ dịghị ụtọ ka anyị hapụ okwu Chineke, jeere table ozi. Kama, ụmụnna anyị, chọpụtanụ n’etiti unu ndị ikom asaa ndị a gbaara ha ezi àmà, ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe, ndị anyị ga-eme ndị isi ọrụ a dị mkpa.”—Ọrụ 6:2, 3.
Nke a na-egosipụta ụkpụrụ dị mkpa nke nhazi n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. A na-eji ndị ikom ụfọdụ ji ihe akpọrọ ihe eme ihe n’ilekọta ihe ndị na-apụta mgbe mgbe, ebe ndị ọzọ na-elekọta ihe ime mmụọ ndị ka gbaa ọkpụrụkpụ. E nwere ndị setịpụrụ ihe nlereanya nke a. N’Israel oge ochie, a họpụtara Erọn na ụmụ ya ije ozi dị ka ndị nchụàjà ịchụrụ Chineke àjà. Otú ọ dị, Jehova nyere ntụziaka na ndị Livaị ga-enyere ha aka site ‘n’ilekọta ihe nile nke ụlọ ikwuu nzute.’ (Ọnụ Ọgụgụ 3:5-10) N’otu aka ahụ, ndị ohu na-eje ozi na-enyere ndị nlekọta nke taa aka.
Ọrụ Ndị Okenye na Ndị Ohu Na-eje Ozi
Akwụkwọ Nsọ na-edepụta iru eru ndị dị elu maka ma ndị okenye ma ndị ohu na-eje ozi. (1 Timoti 3:1-10, 12, 13; Taịtọs 1:6-9) Ha abụghị ndị na-amarịta aka kama ha na-arụ ọrụ maka otu ihe mgbaru ọsọ ahụ—iwuli ọgbakọ elu. (Tụlee Ndị Efesọs 4:11-13.) Otú o sina dị, e nwere ọdịiche ụfọdụ dị n’ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ. Na 1 Pita 5:2 a gwara ndị nlekọta, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ nta Chineke nke dị n’etiti unu, na-elekọta ha anya, ọ bụghị n’ihi na mkpa na-akpa unu, kama site n’ọchịchọ obi, dị ka Chineke chọrọ; ọ bụghịkwa n’ihi uru na-eweta ihere, kama n’ihi na unu dị ọkụ n’obi.” Ha na-aza Chineke ajụjụ otú ha si elekọta ihe a dị nsọ e nyere ha n’aka ilekọta.—Ndị Hibru 13:17.
Olee banyere ndị ohu na-eje ozi? Akwụkwọ Nsọ ekwughị na ha ga-enwe otu iru eru ahụ n’ikike ha nwere izi ihe. Ọrụ ha dịtụ iche na nke ndị okenye. Na narị afọ mbụ O.A., ihe ịrụ ụka adịghị ya na e nwere ọtụtụ ihe ndị na-emetụtachaghị ihe ime mmụọ, ndị na-apụta mgbe mgbe, ndị chọrọ ike ọkpụkpụ aka ndị chọrọ nlebara anya, ma eleghị anya gụnyere nzụta nke ihe ndị e ji edepụta Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ ọbụna idepụta ya edepụta.
Taa, ndị ohu na-eje ozi ka nọgidere na-arụzu ọrụ dị iche iche dị mkpa n’ime ọgbakọ, dị ka ilekọta ihe ndekọ ego ọgbakọ na ókèala, ikesa magazin na akwụkwọ, na ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze. A pụrụ ọbụna iji ụfọdụ ndị ohu na-eje ozi ndị nwere ikike ime ya mee ihe n’izi ihe, mgbe ụfọdụ na-eduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ dị iche iche, na-eme akụkụ ụfọdụ ná Nzukọ Ije Ozi, na-ekwukwa okwu ihu ọha.
Mgbe ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ji nkwekọrịta na-arụkọ ọrụ ọnụ, a na-elekọta mkpa dị iche iche nke ọgbakọ—ma nke ime mmụọ ma nke nhazi—n’ụzọ guzoziri eguzozi. Mgbe ahụ ndị òtù nke ọgbakọ na-enwe ọṅụ, dị ike, ma na-arụpụta ihe n’ụzọ ime mmụọ. Cheta ihe Pọl degaara ndị e tere mmanụ nọ n’Efesọs: “Onye ahụ nile, ebe a na-ewere nkwonkwo nile ọ bụla nke nnyezu kwụkọọ ya nke ọma jikọkwa ya, dị ka ịrụsi ọrụ ike nke akụkụ nile ọ bụla n’otu n’otu n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha si dị, ahụ nile ahụ na-esite na Ya na-eme ka ahụ baa ụba iwuli onwe ya elu dị ka ụlọ n’ime ịhụnanya.”—Ndị Efesọs 4:16.
Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi aghaghị ịgbalịsi ike ịzụlite ụdị nkwekọrịta dị otú ahụ, ya bụ, ikwekọrịta, inwe otu olu, imekọ ihe ọnụ, na ịdị n’otu. Otú ọ dị, ụdị nkwekọrịta dị otú ahụ adịghị abịara onwe ya. A ghaghị ịzụlite ya ma jiri ezi nlezianya chebe ya.
Ihe Ndị Okenye Pụrụ Ime
Otu nzọụkwụ dị mkpa bụ ịmata na mmekọrịta dị n’ebe onye okenye na ohu na-eje ozi nọ abụghị nke ọga n’ebe odibo nọ ma ọ bụ nke onye were mmadụ n’ọrụ n’ebe onye o were n’ọrụ nọ. Ebe e nwere ezi nkwekọrịta, ndị okenye na-ele ndị ohu na-eje ozi anya dị ka ndi ozi ibe ha nke Chineke. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 3:6-9.) “N’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ,” ka Ndị Rom 12:10 na-asị. Ya mere, ndị okenye na-ezere imeso ndị ohu na-eje ozi n’ụzọ ndị pụrụ iyi ka ọ bụ nleda anya ma ọ bụ mweda ala. Ha na-agba ume ibute ụzọ n’ime ihe nke ziri ezi kama ịkatọ ya. Iji nkwanye ùgwù na-emeso ndị ohu na-eje ozi na-eme ka ha wepụta àgwà ha kasị mma ma na-enyere ha aka inwe mmasị n’ọrụ ha n’ime ọgbakọ.
Ndị okenye kwesịkwara iburu n’uche na ọrụ e kenyere ha bụ́ ịzụ atụrụ Chineke nke e nyere ha ilekọta gụnyere ụmụnna nwoke ndị na-eje ozi dị ka ndị ohu na-eje ozi. N’eziokwu, a tụrụ anya na ndị ikom dị otú ahụ ji ihe akpọrọ ihe ga-abụ ndị Kraịst tozuru okè. Otú o sina dị, dị ka ndị ọzọ nile n’ime ìgwè ahụ, ha chọrọ nlebara anya n’otu n’otu site n’oge ruo n’oge. Ndị okenye kwesịrị inwe mmasị dị ukwuu n’uto ime mmụọ ha.
Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl onyeozi zutere nwa okorobịa ahụ bụ́ Timoti, ọ ghọtara ozugbo ahụ nkà Timoti nwere, wee ‘chọọ ka o soo ya pụọ.’ (Ọrụ 16:3) Timoti jere ozi dị ka onye ya na Pọl so eme njegharị, n’ihi ya na-anata ọzụzụ bara uru nke ukwuu. Leenụ, ọtụtụ afọ ka e mesịrị, Pọl pụrụ idere ndị Kraịst nọ ná Kọrint, sị: “M ziteere unu Timoti, bụ́ nwa m n’ime Onyenwe anyị, bụrụkwa onye m hụrụ n’anya, onye kwesịrị ntụkwasị obi, ọ ga-echetara unu ụzọ m nile nke dị n’ime Kraịst”!—1 Ndị Kọrint 4:17.
Ndị okenye, ùnu amalitewo iji nkà nile nke ndị ohu na-eje ozi nọ n’ọgbakọ unu nwere na-eme ihe? Ùnu na-enyere ha aka inwe ọganihu site n’inye ha ọzụzụ n’otu n’otu n’ikwu okwu ihu ọha na n’ime nnyocha n’ime Bible? Ùnu akpọwo ndị ruru eru òkù isoro unu jee nleta ọzụzụ atụrụ? Ùnu na-eso ha arụkọ ọrụ n’ozi ubi? N’ilu Jisọs banyere talent ahụ, onyenwenụ ahụ gwara ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “I mere nke ọma, ezi ohu nke kwesịrị ka a tụkwasị gị obi.” (Matiu 25:23) Ùnu na-etokwa n’otu aka ahụ, ma na-aja mma nke ọma n’ebe ndị ohu na-eje ozi ndị ji ịdị umeala n’obi na-arụ ọrụ ha nke ọma? (Tụlee Ilu 3:27.) Ọ bụrụ na unu adịghị eme ya, hà ga-eche na e nweghị mmasị n’ọrụ ha?
Nkwurịta okwu dịkwa oké mkpa n’otu aka ahụ iji nwee mmekọrịta ọrụ nke nkwekọrịta. (Tụlee Ilu 15:22.) E kwesịghị ikenye ma ọ bụ napụ ọrụ n’enweghị ihe kpatara ya ma ọ bụ aghara aghara. Ndị okenye kwesịrị iji ekpere tụlee ụzọ kasị mma a pụrụ isi jiri nkà nwanna nwere mee ihe n’ime ọgbakọ. (Tụlee Matiu 25:15.) Mgbe e kenyere ọrụ, e kwesịrị ịgwa nwanna n’ụzọ doro anya kpọmkwem ihe a chọrọ ka o mee. “Mgbe ọ na-adịghị ezi ndụmọdụ ọ bụla dị,” ka Ilu 11:14 na-adọ aka ná ntị, “ndị ahụ ga-ada.”
Ọ bụghị ihe kasị mma nanị ịgwa nwanna ka o weghara ngalaba ihe ndekọ ego, magazin, ma ọ bụ akwụkwọ site n’aka nwanna ọzọ. Mgbe ụfọdụ nwanna e kenyere ọrụ ọhụrụ na-anata ọtụtụ ihe ndekọ ndị na-ezighị ezi ma ọ bụ ndị na-ezughị ezu. Lee ka o si akụda mmụọ! “Ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro,” ka 1 Ndị Kọrint 14:40 na-atụzi. Ndị okenye kwesịrị ibute ụzọ n’ịzụ ụmụnna, na-eme ka ha mata usoro dị iche iche nke ime ihe nke ọgbakọ ma na-esetịpụ ihe nlereanya n’onwe ha n’ịgbaso usoro ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ndị okenye ka ọ dịịrị ime ndokwa ka a gụzie ihe ndekọ ego ọgbakọ n’ọnwa atọ ọ bụla. Ileghara ndokwa dị otú ahụ nke dị mkpa anya pụrụ iduje ná nsogbu dị iche iche ma mebie nkwanye ùgwù nke ndị ohu na-eje ozi nwere maka ntụziaka dị iche iche nke nzukọ.
Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na nwanna yiri ka ọ na-eleghara otu ọrụ e kenyere ya anya? Kama iwepụ ya ozugbo ahụ n’ọrụ e kenyere ya, ndị okenye kwesịrị isoro ya kwurịta ya. Ma eleghị anya nsogbu ahụ pụrụ ịbụ enwetaghị ọzụzụ. Ọ bụrụ na nwanna ahụ anọgide na-enwe ihe isi ike n’ilekọta ọrụ ya, ma eleghị anya ọ pụrụ ime nke ọma n’ọrụ ọzọ.
Ndị okenye pụkwara ịkwalite nkwekọrịta site n’igosipụta ịdị umeala n’obi. Ndị Filipaị 2:3 na-agba ndị Kraịst ume ka ha ghara ime “ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma.” N’ihi ya onye okenye kwesịrị ikwenye mgbe onye atendantị duziri ya ịnọdụ ala n’otu oche n’ime ụlọ nzukọ, ọ bụghị ichewe na n’ihi na ya bụ onye okenye, ọ dịghị ya mkpa irube isi. Ma eleghị anya onye atendantị ahụ nanị na-agbaso aro ahụ a tụrụ ịdị na-anọdụ ala n’akụkụ dịgasị iche iche n’ime ụlọ nzukọ, ọ bụ ezie na o kwesịrị icheta na ọ dịghị iwu e tiri na mmadụ nile ga-emerịrị otú ahụ.a Onye okenye ga-ezere ịgbanwe mkpebi dị iche iche metụtara ihe ndị e kenyere ohu na-eje ozi n’ụzọ na-adịghị mkpa.
Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ Ọrụ Maka Nkwekọrịta
“Ndị ohu na-eje ozi n’otu aka ahụ kwesịkwara ịbụ ndị ji ihe kpọrọ ihe,” ka Pọl onyeozi kwuru. (1 Timoti 3:8, NW) Iji ọrụ ha kpọrọ ihe—dị ka akụkụ nke ozi ha dị nsọ—na-eme ihe dị ukwuu n’igbochi ọnọdụ iwe ibilite. Ọ bụrụ na ị bụ ohu na-eje ozi, ị̀ na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ gị? (Ndị Rom 12:7, 8) Ì tinyewo mgbalị iji ghọọ onye dị nkà n’ilekọta ọrụ gị? Ị̀ bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi, daberekwa na ya? Ị̀ na-egosi mmụọ nke iwepụta onwe onye ma a bịa n’ọrụ dị iche iche? Otu ohu na-eje ozi n’otu ala n’Africa na-elekọta ọrụ atọ dị iche iche n’ọgbakọ. Gịnị bụ omume ya? “Eem, ọ pụtara nanị ịrụsikwu ọrụ ike,” ka ọ na-asị, “ịrụsi ọrụ ike adịghịkwa egbu mmadụ.” N’ezie, ndị ahụ na-ewepụta onwe ha na-enwe obi ụtọ kasịnụ.—Ọrụ 20:35.
Ị pụkwara ime ihe dị ukwuu iji kwalite nkwekọrịta site n’ikwenyere ndị okenye n’ụzọ zuru ezu. “Na-ekwenyenụ ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha,” ka Ndị Hibru 13:17 na-asị, “n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaraghị unu uru.” N’eziokwu, ndị okenye bụ ndị na-ezughị okè, ọ pụkwara ịdị mfe ịhụta mmejọ n’ebe ha nọ. Ma àgwà nke ịchọpụta mmejọ na-azụlite enweghị ntụkwasị obi. Ọ pụrụ imebi ọṅụ gị, metụtakwa ndị ọzọ nọ n’ime ọgbakọ n’ụzọ na-adịghị mma. N’ihi ya Pita onyeozi nyere okwu ndụmọdụ nke a: “Unu ndị bụ́ nwata, doonụ onwe unu n’okpuru ndị okenye. Ma unu nile were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, ijerịtara ibe unu ozi . . . Wedanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka O wee welie unu elu n’oge nke Ya.”—1 Pita 5:5, 6.
Ndụmọdụ dị otú ahụ kwesịrị ekwesị karịsịa ma ọ bụrụ na ọ dị gị ka a na-eleghara gị anya maka ihe ùgwù ije ozi dị iche iche. Eleghị anya ị nọwo “na-agbaso ọnọdụ onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya,” ma a họpụtabeghị gị. (1 Timoti 3:1) Obi dị umeala pụrụ inyere gị aka ịnọgide na-enwe ‘àgwà nke ichere.’ (Abụ Ákwá 3:24) Kama inwe obi ilu n’ebe ndị okenye nọ—nke e ji n’aka na ọ ga-emebi mmekọrịta ọrụ nke gị na ha—jụọ ha ma ọ̀ dị akụkụ ụfọdụ ndị ị pụrụ imeziwanye ihe. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-ahụ ezi ịdị njikere gị ịnara na itinye ndụmọdụ n’ọrụ dị ka ihe àmà nke uto ime mmụọ.
Ịdị umeala n’obi n’ụzọ nke Chineke na ịma ebe ikike mmadụ jedebere pụrụ inyere ohu na-eje ozi aka ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi ma ọ bụrụ na o nwere nkà ndị pụrụ iche ma ọ bụ ọnọdụ agụmakwụkwọ na ọkwá karịrị nke ndị ọzọ. Lee ka ọ pụrụ isi bụrụ ihe ọnwụnwa nye ya ịgbalị iji mekarịa ndị okenye ma ọ bụ ịdọta mmasị n’ebe nkà ndị o nwere dị! Ilu 11:2 na-echetara anyị na “n’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị.” Nwanna dị umeala n’obi maara ebe ikike ya jedebere. Ọ dị njikere iji nwayọọ na-arụ ọrụ n’okpuru na iji nkà ndị o nwere kwadoo ndị okenye. Ịma ebe ike ya jedebere pụkwara inyere ya aka ịghọta na ọ bụ ezie na ọ pụrụ inwe ihe ọmụma dị ukwuu n’ụzọ nke ụwa, ọ ka pụrụ ịnọ n’ụkọ n’akụkụ ndị ahụ dị mkpa nke amamihe na nghọta ime mmụọ—àgwà ndị okenye pụrụ inwe karịa ya.—1 Ndị Kọrint 1:26–2:13; Ndị Filipaị 1:9.
N’ụzọ doro anya, ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-arụ ọrụ ndị dị mkpa. N’ịgbakọ aka ọnụ ha pụrụ ime ihe dị ukwuu iji wulie mmadụ nile nọ n’ọgbakọ elu. Ma iji mee nke ahụ, ha aghaghị iji nkwekọrịta na-arụkọ ọrụ ọnụ, ‘n’obi dị umeala na ịdị nwayọọ nile, n’ogologo ntachi obi, na-anagiderịta ibe ha n’ime ịhụnanya; na-anụ ọkụ n’obi idebe ịdị n’otu nke Mmụọ Nsọ n’ime ihe okike nke bụ́ udo.’—Ndị Efesọs 4:2, 3.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Ndị okenye na-ele ndị ohu na-eje ozi anya, ọ bụghị dị ka ndị nọ n’okpuru, kama ndị ozi ibe ha nke Chineke