Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 9/15 p. 21-24
  • Ekwela Ka Owu Ọmụma Bibie Ndụ Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekwela Ka Owu Ọmụma Bibie Ndụ Gị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Ị Pụrụ Ime?
  • Kwee Ka Ndị Enyi Nye Aka
  • Jehova Na-eche Banyere Anyị
  • Atala Chineke Ụta
  • Olee Otú A Pụrụ Isi Nyere Ndị Owu Na-ama Aka?
  • Ịnagide Owu Ọmụma
    Teta!—2004
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Ọtụtụ Ndị Owu Na-ama?
    Teta!—2004
  • Ihe Ị Ga-eme ma I Chee na Ndị Enyi Gị Na-agbara Gị Ọsọ
    Teta!—2015
  • Ị Pụrụ Imeri Owu Ọmụma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 9/15 p. 21-24

Ekwela Ka Owu Ọmụma Bibie Ndụ Gị

OWU ọmụma pụrụ ibibi ndụ ndị agadi nakwa nke ndị na-eto eto. Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Judith Viorst na-ekwu na magazin bụ́ Redbook, sị: “Owu ọmụma dị ka nkume dọrọ n’obi. . . . Owu ọmụma na-eme ka anyị tọgbọrọ chakoo, na-adakwa mbà. Owu ọmụma na-eme ka ọ dị anyị ka anyị bụ nwa na-enweghị nne, dị ka atụrụ kpafuru akpafu, nke dị ntakịrị nke ukwuu ma fuo n’ime ụwa nke sara mbara nke ukwuu nke na-adịghịkwa eche banyere onye ọ bụla.”​—⁠September 1991.

Nkewapụ site ná ndị enyi, gburugburu ebe a na-amaghị nke ọma, ịgba alụkwaghịm, ịbụ onye mmadụ nwụnahụrụ, ma ọ bụ ndakpọ nke nkwurịta okwu​—⁠ụdị ihe dị iche iche pụrụ ime ka ị bụrụ onye owu na-ama. Ọbụna mgbe ndị ọzọ gbara ha gburugburu, ụfọdụ na-abụ ndị nọ n’oké owu ọmụma.

Gịnị Ka Ị Pụrụ Ime?

Ọ bụrụ na owu ọmụma ejide gị, ọ̀ bụ iwu na ị ga-abụrịrị onye na-enweghị enyemaka? Ị̀ pụrụ ime ihe ọ bụla iji gbochie owu ọmụma iji nke nta nke nta bibie gị ma ọ bụ mịkọrọ ọchịchọ gị ịdị ndụ? N’ezie ị pụrụ. E nwere okwu ndụmọdụ dị ukwuu ndị na-enye aka. E nyekwara ezi ndụmọdụ dị ukwuu n’ime Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ Bible. Ụdị agbamume dị otú ahụ pụrụ ịbụ nanị ihe dị gị mkpa iji lụsoo owu ọmụma ọgụ.​—⁠Matiu 11:​28, 29.

Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe na-agba ume ịgụ banyere Rut, nwa agbọghọ biri n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’ihe dị ka 3,000 afọ gara aga. Ọ nọ n’ọnọdụ nke inwe owu ọmụma. Mgbe di ya nwụrụ, o sooro nne di ya jee biri na gburugburu ebe ọ na-amaghị nke ọma nke Israel. (Rut 2:11) Ọ bụ ezie na e kewapụrụ ya site n’ezinụlọ ya na ndị enyi ya mbụ ma bụrụ onye ọbịa n’ala ọzọ, e nweghị ihe àmà ọ bụla n’ime Bible nke na-egosi na o kwere ka owu ọmụma rikpuo ya. Ị pụrụ ịgụ akụkọ banyere ya n’ime akwụkwọ Bible bụ́ Rut.

Dị ka Rut, ọ dị gị mkpa ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi. Otú i si eche echiche banyere ihe na ihe omume dị iche iche pụrụ ịkwalite owu ọmụma. Ann, onye lekọtara nna ya ruo afọ anọ n’ime ọrịa nke na-eweta ike ọgwụgwụ, kwadoro na nke a bụ eziokwu. Mgbe ọ nwụrụ Ann nwere oké owu ọmụma. “Ọ dị m ka m tọgbọ chakoo, n’abaghị uru ọ bụla​—⁠dị ka a ga-asị na ọ dịkwaghị onye m dị mkpa ọzọ,” ka ọ na-asị. “Ma echere m eziokwu ahụ bụ́ na ndụ m agbanwewo ugbu a ihu, aghọtakwara m na iji lụsoo owu ọmụma m ọgụ, aghaghị m iji ọnọdụ ndị m nwere ugbu a mee ihe n’ụzọ kasị mma.” Mgbe ụfọdụ ị pụghị ịgbanwe ọnọdụ gị, ma o yiri ka ị pụrụ ịgbanwe omume gị n’ebe ha dị.

Iji ọrụ n’aka n’ihe omume na-akwụghachi ụgwọ abụghị ngwọta zuru ezu n’ịlụso owu ọmụma ọgụ, ọ bụ ezie na ọ na-enye aka. Irene, bụ́ onye ghọrọ nwanyị di ya nwụrụ nanị ka ọnwa isii nke alụmdi na nwunye gasịrị, chọpụtara na nke a bụ eziokwu n’ọnọdụ ya. “Ahụrụ m na owu ọmụma na-abịa karịsịa mgbe ọ na-enwekebeghị ihe m na-eme,” ka ọ na-asị, “ya mere etinyere m uche n’isoro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe na inyere ha aka ịnagide nsogbu ha dị iche iche.” Inyere ndị ọzọ aka na-eweta obi ụtọ, ndị Kraịst kwa owu na-ama pụrụ ịchọta ihe dị ukwuu ha ga-eme n’ọrụ Onyenwe anyị.​—⁠Ọrụ 20:35; 1 Ndị Kọrint 15:58.

Kwee Ka Ndị Enyi Nye Aka

Magazin bụ́ The New York Times Magazine na-akọwa ụmụaka owu na-ama dị ka ndị “ọnyá nke enweghị ndị enyi” merụworo ahụ. (April 28, 1991) Ọtụtụ ndị owu na-ama, ma ndị okenye ma ụmụaka, na-enwe mmetụta nke enweghị ndị enyi. Ya mere, ọ bara ezigbo uru inwe ezi ọbụbụenyi nke ọgbakọ ndị Kraịst na-eche banyere ndị ọzọ na-enye. Rụsie ọrụ ike ịgbasawanye ìgwè ndị enyi gị n’ime ọgbakọ, kwee ka ha nyere gị aka n’ụzọ ọ bụla ha nwere ike. Nke a bụ otu ihe mere e ji enwe ndị enyi​—⁠inye nkwado n’oge nsogbu.​—⁠Ilu 17:17; 18:24.

Otú ọ dị, mara na n’ihi ihe mgbu mmetụta uche gị, ị pụrụ n’ezie ime ka o siere ndị enyi ike inyere gị aka. N’ụzọ dị aṅaa? Onye na-ede ihe bụ́ Jeffrey Young na-akọwa, sị: “Ụfọdụ ndị owu na-ama . . . na-achụ ndị gaje ịbụ ndị enyi site n’iweghara mkparịta ụka nanị ha ma ọ bụ site n’ikwu ihe ndị jọrọ njọ ma ọ bụ ndị na-ekwesịghị ekwesị. N’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ, ndị nọ n’owu ọmụma na-adịghị ala ala yiri ka ha na-emebi mmekọrịta ndị chiri anya.”​—⁠U.S.News & World Report, September 17, 1984.

Mgbe ụfọdụ ị pụrụ ime ka ihe ka njọ site n’ikewapụ onwe gị n’ebe ndị ọzọ nọ. Peter, bụ́ nwoke nke nọ n’ime 50 afọ na ụma ya mere nke ahụ. Ka nwunye ya nwụsịrị, ọ hụrụ onwe ya ka ọ na-esi n’ebe ndị ọzọ nọ ewezụga onwe ya, ọ bụ ezie na n’ime obi ya ọ chọrọ enyemaka ha. “Ụbọchị ụfọdụ,” ka ọ na-asị, “apụghị m nnọọ ịnọ ná mkpakọrịta nke ndị ọzọ, ka oge na-agakwa achọtara m onwe m ka m na-ekewapụ onwe m n’ebe ndị mmadụ nọ.” Nke a pụrụ ịdị ize ndụ. Ọ bụ ezie na oge nke mmadụ ịnọ nanị ya na-aba uru, nkewapụ iche na-ebibi ebibi. (Ilu 18:1) Peter chọpụtara nke a. Ọ na-asị: “Emesịrị m merie nke a, chee ọnọdụ m ihu, sitekwa n’enyemaka nke ndị enyi m, enwere m ike iwuzighachi ndụ m.”

Otú ọ dị, ewela ya na ndị ọzọ nwere otú o si bụrụ ọrụ dịịrị ha inye aka. Anwala ịdị na-achọkarị ihe. N’obi ụtọ nakwere obi ọma ọ bụla e gosiri, gosikwa ekele maka ya. Ma burukwa okwu ndụmọdụ ọma nke a a na-achọta n’Ilu 25:17 n’uche: “Mee ka ụkwụ gị kọọ ụkọ n’ụlọ mmadụ ibe gị; ka ihe gị wee ghara iju ya afọ, o wee kpọọ gị asị.” Frances, onye chere oké owu ọmụma ihu mgbe di ya nwụrụ ka 35 afọ nke alụmdi na nwunye gasịrị, na-eche na nlezianya dị otú ahụ dị mkpa. “Atụla anya ihe gabigara ókè,” ka ọ na-asị, “achọkwala ihe gabigara ókè site n’aka ndị ọzọ. Anọla mgbe nile n’ọnụ ụzọ mmadụ na-achọ enyemaka.”

Jehova Na-eche Banyere Anyị

Ọbụna a sị na ụmụ mmadụ emeghị ihe ị tụrụ anya ya mgbe ụfọdụ, ị ka pụrụ inwe Jehova Chineke dị ka Enyi gị. Jide n’aka na ọ na-eche banyere gị. Mee ka obi ike i nwere n’ebe ọ nọ sie ike, nọgidekwa na-achọ ebe mgbaba ná nlekọta nchebe ya. (Abụ Ọma 27:10; 91:1, 2; Ilu 3:​5, 6) Rut ahụ bụ́ onye Moab mere nke a, bụrụkwa onye a gọziri n’ụba. Leenụ, ọ ghọrọ ọbụna nne nne ochie nke Jisọs Kraịst!​—⁠Rut 2:12; 4:17; Matiu 1:​5, 16.

Na-ekpegara Jehova ekpere mgbe nile. (Abụ Ọma 34:4; 62:7, 8) Margaret chọtara ekpere dị ka ihe na-enye ume dị ukwuu n’ịnagide owu ọmụma. Ya na di ya keere òkè n’ozi oge nile ruo mgbe di ya nwụrụ n’okorobịa. “M na-ahụ ya mgbe nile dị ka ihe dị mma ikpe ekpere n’olu dara ụda wee gwa Jehova ihe nile, egwu na nchegbu m nile,” ka ọ na-asị. “Nke ahụ nyeere m aka ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị mgbe owu ọmụma bịara. Ịhụkwa ka Jehova na-aza ekpere ndị ahụ nyere m obi ike.” Ọ na-erite uru dị ukwuu site n’ịgbaso okwu ndụmọdụ nke Pita onyeozi: “Wedanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka O wee welie unu elu n’oge nke Ya; na-atụkwasịnụ Ya nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi.”​—⁠1 Pita 5:​6, 7; Abụ Ọma 55:22.

Iso Jehova nwee ezi mmekọrịta ga-enyere gị aka ijigide ihe ndị owu na-ama na-atụfukarị​—⁠ùgwù onwe onye. Mgbe di ya nwụrụ n’ihi ọrịa cancer, onye nta akụkọ bụ́ Jeannette Kupfermann dere banyere “mmetụta dị iche iche nke ùgwù onwe onye dị ala na abaghị n’ihe.” O kwuru, sị: “Ọ bụ echiche nke a nke abaghị n’ihe bụ nke na-eduje ọtụtụ ndị inyom di ha nwụrụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ịda mbà n’obi nke na-akpata mmadụ igbu onwe ya.”

Cheta na Jehova ji gị kpọrọ oké ihe. Ọ naghị eche na ị baghị n’ihe. (Jọn 3:16) Chineke ga-akwado gị dị ka ọ kwadoro ndị ya bụ́ ụmụ Israel n’oge ndị gara aga. Ọ gwara ha, sị: “Ajụghị m gị ajụ: atụla egwu, gị ka M nọnyeere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke gị: M ga-agba gị ume; ee, M ga-enyere gị aka; ee, M ga-eji aka nri nke ezi omume m kwagide gị.”​—⁠Aịsaịa 41:​9, 10.

Atala Chineke Ụta

Karịsịa, atala Chineke ụta n’ihi owu ọmụma gị. Ọ bụghị Jehova kpatara ya. Nzube ya mgbe nile bụ ka gị, na ihe nile a kpọrọ mmadụ nwee mmekọrịta ndị ibe nke dị mma nke na-eju afọ. Mgbe Chineke kere Adam, ọ sịrị: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ nanị ya; M ga-emere ya onye inye aka kwesịrị ya.” (Jenesis 2:18) Nke ahụ bụkwa ihe Chineke mere mgbe o kere Iv, nwanyị mbụ. E wezụga nnupụisi ọjọọ, nwoke na nwanyị na ezinụlọ nile ha mụpụtara adịghị mgbe ha gaara enweworị owu ọmụma.

Otú ọ dị, nkwere nwa oge nke Jehova kwere ka ajọ omume dịrị nyere owu ọmụma ohere itolite na nhụjuanya ndị ọzọ ịpụta. Otú ọ dị, buru n’uche n’ụzọ doro anya na nke a bụ ruo nwa oge. Ule dị iche iche nke owu ọmụma na-eyi ihe na-esichaghị ike ịnagide mgbe i bu ihe Chineke ga-emere gị n’ime ụwa ọhụrụ ya n’uche lee ha anya. Ka ọ dịgodị ugbu a, ọ ga-akwado ma kasie gị obi.​—⁠Abụ Ọma 18:2; Ndị Filipaị 4:​6, 7.

Ịmata nke a pụrụ inye gị ume. Mgbe Frances (e hotara na mbụ) ghọrọ nwanyị di ya nwụrụ, ọ chọtara oké nkasi obi n’okwu ndị ahụ dị n’Abụ Ọma 4:8, karịsịa n’abalị: “N’udo ka m ga-eji otu mgbe ahụ dinaa ala, rahụ ụra: n’ihi na Gị onwe gị, Jehova, nanị Gị, na-eme ka m biri ná ntụkwasị obi.” Tụgharịa uche ná mmetụta ndị dị ka ndị ahụ a na-achọta n’akwụkwọ Abụ Ọma. Chesie echiche ike n’otú Chineke si eche banyere gị, dị ka e kwupụtara n’Abụ Ọma 23:​1-⁠3.

Olee Otú A Pụrụ Isi Nyere Ndị Owu Na-ama Aka?

Ụzọ bụ́ isi nke isi nyere ndị owu na-ama aka bụ igosi ha ịhụnanya. Ugboro ugboro, Bible na-agba ndị Chineke ume ka ha na-egosirịta ibe ha ịhụnanya, karịsịa n’oge ule. “N’akụkụ ịhụnanya unu n’ebe ụmụnna unu nọ, ka ihe mmadụ ibe unu na-atọrịta unu ụtọ nke ukwuu,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Rom 12:10) N’eziokwu, Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:8) Olee otú ị pụrụ isi gosi ndị owu na-ama ịhụnanya?

Kama ịjụ ma ọ bụ leghara ndị owu na-ama anya, ndị na-echegbu onwe ha banyere ndị ọzọ pụrụ igosi mmetụta ịhụnanya ha site n’iji ndidi na-enyere ha aka mgbe ọ bụla o kwere mee. Ha pụrụ ịdị ka nwoke ahụ bụ́ Job, onye sịrị: “M mere onye e wedara n’ala nke na-etiku m ka o wepụga onwe ya, ya na nwa mgbei, bụ́ onye na-enweghị onye na-enyere ya aka. . . . M na-emekwa obi nwanyị di ya nwụrụ ka o tie mkpu ọṅụ.” (Job 29:​12, 13) Ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’ime ọgbakọ ndị Kraịst na ndị enyi nwere ọmịiko pụrụ ime ihe n’otu ụzọ nchebara echiche ahụ, site n’inyezu mkpa bụ isi nke ụmụ mmadụ nke nghọta, ịhụnanya, na nkasi obi. Ha pụrụ igosi mmetụta obi ebere, mgbe ụfọdụkwa ha pụrụ imeju mkpa nke ịgwa onye a tụkwasịrị obi okwu.​—⁠1 Pita 3:8.

Ọtụtụ mgbe, ọ bụ ụmụ obere ihe ndị enyi na-emere ndị owu na-ama bụ ihe ndị dị oké mkpa. Dị ka ihe atụ, mgbe onye a hụrụ n’anya nwụnahụrụ onye kwere ekwe ibe anyị, a pụrụ ịrụzu ihe ọma dị ukwuu site n’omume obi ọma dị iche iche nke ezi ọbụbụenyi. Agụpụla ụmụ obere obi ọma, dị ka ịkpọ òkù maka nri, iji ọmịiko aṅa ntị, ma ọ bụ mkparịta ụka na-agba ume. Ihe ndị a dị irè nke ukwuu n’inyere mmadụ aka ịlụso owu ọmụma ọgụ.​—⁠Ndị Hibru 13:16.

Ma eleghị anya anyị nile ga-enwe oge ụfọdụ nke owu ọmụma site na mgbe ruo na mgbe. Ma, ọ dịghị mkpa na owu ọmụma ga-aghọ ihe otiti. Jiri ihe omume ndị bara uru, ndị na-arụpụta ihe mejupụta ndụ gị. Kwee ka ndị enyi nye aka mgbe ha pụrụ. Nwee obi ike n’ebe Jehova Chineke nọ. Buru nkwa ahụ na-agba ume nke e dekọrọ n’Abụ Ọma 34:19 n’uche: “Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.” Chigharịkwuru Jehova maka enyemaka, ekwekwala ka owu ọmụma bibie ndụ gị.

[Igbe dị na peeji nke 24]

ỤZỌ ỤFỌDỤ ISI LỤSOO OWU ỌMỤMA ỌGỤ

▪ Nọrọ Jehova nso

▪ Chọọ nkasi obi site n’ịgụ Bible

▪ Na-enwe echiche ziri ezi nke onye Kraịst

▪ Jiri ọrụ n’aka n’ihe omume bara uru

▪ Gbasawanye ìgwè ndị enyi gị

▪ Mee ka ọ dịịrị ndị enyi mfe inye aka

▪ Ekewapụla onwe gị iche, kama zụlite ịhụnanya nwere omume enyi

▪ Nwee obi ike na Jehova na-eche banyere gị

[Igbe dị na peeji nke 24]

ỤZỌ Ị PỤRỤ ISI NYERE NDỊ OWU NA-AMA AKA

▪ Nye nghọta, ịhụnanya, na nkasi obi

▪ Mejuo mkpa nke ịgwa onye a tụkwasịrị obi okwu

▪ Nọgide na-eme ụmụ obere ihe ndị na-enye aka

[Foto dị na peeji nke 23]

N’agbanyeghị ọnọdụ ya ndị siri ike, e nweghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na Rut kwere ka owu ọmụma bibie ndụ ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya