Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 10/1 p. 26-30
  • Ị̀ Na-enyere Nwa Gị Aka Ịhọrọ Jehova?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-enyere Nwa Gị Aka Ịhọrọ Jehova?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Ndị Ntorobịa Ụfọdụ Ji Agbahapụ Jehova
  • Malite n’Oge
  • Nye Ụmụ Gị Oge Gị
  • Ezi Mkpakọrịta na Ihe Nlereanya
  • Ọṅụ Dị n’Ịhụ Ka Ụmụaka Na-ahọrọ Jehova
  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ịzulite Ezinụlọ Siri Ike N’ụzọ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Kụziere Ụmụ Gị Ịhụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ndị Nne na Nna—Bụrụnụ Ezi Ihe Nlereanya Nye Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 10/1 p. 26-30

Ị̀ Na-enyere Nwa Gị Aka Ịhọrọ Jehova?

“ECHERE m na ịmụ Bible na-agwụ ike ma na-atụ ọ̀bọ̀ n’ezie. Na nzuzo, ekpebiri m n’ime obi m na agaghị m abụ otu n’ime Ndịàmà Jehova mgbe m tolitere,” ka otu nwa okorobịa kwupụtara. Ọ bụ ezie na e nwere olileanya na ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụaka ndị nọ n’ezinụlọ nke ndị Kraịst ga-emesịa họrọ iguzo n’akụkụ nke Jehova, ndị na-eto eto dị ka ya pụrụ inwe ihe isi ike ịhọrọ Jehova dị ka Chineke ha.

Ndị mụrụ ụmụ mgbe ụfọdụ adịghị ama ụzọ isi duzie ụmụ ha n’ụzọ dị irè. Ha na-enwe nnyocha obi dị ukwuu dị ka otu nna nke nọ ná nchekasị, bụ́ onye kwuru n’otu mgbe, sị: “N’ikwu eziokwu, e nwere mgbe m na-ele anya n’ihu ụmụ m nọ na-ehi ụra, anya mmiri nke ndakpọ olileanya ka dị ha na ntì, wee na-eche ma ọ bụ na mụ ekwesịghịrị ịdị na-emere ha ebere karị.” Ụmụ ya nwoke abụọ tolitere ma họrọ ijere Jehova ozi.

Ma, e nwere ndị ntorobịa na-agbahapụ Jehova ma hapụ òtù nke ndị Kraịst banye n’ụwa Setan. Ya mere olee nnọọ otú ndị mụrụ ụmụ ga-esi nwee ihe ịga nke ọma n’inyere ụmụ ha aka ịhọrọ Jehova? Iji zaa ajụjụ ahụ, ka anyị buru ụzọ chọpụta ihe mere ndị ntorobịa ụfọdụ ji agbahapụ Jehova mgbe ndị mụrụ ha na-achọsi ike ka ha na ya nọrọ.

Ihe Mere Ndị Ntorobịa Ụfọdụ Ji Agbahapụ Jehova

Otu n’ime ihe ndị na-akpatakarị ya bụ na ụfọdụ ndị ntorobịa adịghị amata Jehova ma ọ bụ ụzọ ya nile n’ezie mgbe ọ bụla. Ọ bụ ezie na ha na-eje nzukọ ndị Kraịst malite na nwa ọhụrụ, ha na-eme ya nanị iji mezuo iwu, e nweghịkwa ezi ọchịchọ a na-achọ Jehova. (Aịsaịa 55:6; Ọrụ 17:27) Nzukọ ndị Kraịst gwụrụ nwatakịrị nwoke ahụ e hotara n’elu ike n’ihi na ọ ghọtaghị ihe ndị ọkà okwu nọ n’elu ikpo okwu na-ekwu.

A na-akụnye mkpụrụ nke eziokwu n’ime ụfọdụ, ma ha na-ekwere ka obi ha bụrụ nke ụzọ ndụ ime otú masịrị mmadụ, nke ịchụso ihe onwunwe doro anya nke ụwa Setan dọọrọ. Ụfọdụ apụghị ịnagide ọchịchọ sibigara ike ókè nke isonyere na ịdị ka ndị ọgbọ ha.​—⁠1 Ihe Emere 28:9; Luk 8:12-⁠14; 1 Ndị Kọrint 15:33.

Otú ọ dị, gburugburu ụwa, ọtụtụ ụmụaka n’ime ezinụlọ nke ndị Kraịst ahọrọwo iguzo n’akụkụ nke Jehova. Ọ̀ dị ihe a pụrụ ịmụta site na nzọụkwụ ndị dị irè ndị mụrụ ha gbasoro?

Malite n’Oge

Otu isi ihe dị mkpa n’inyere ụmụ gị aka ịhọrọ Jehova bụ ịmalite n’oge. N’ọnọdụ ka ukwuu, mmetụta ndị e nwetara na ihe ndị a mụtara mgbe obi ka dị nro ma na-anabata ihe ga-adịru ogologo ndụ nile. (Ilu 22:6) Ya mere malite n’oge gwawa ụmụ gị banyere ịdị mma Jehova, ịhụnanya na ịdị ebube ya, na-agbalịsi ike iwulite n’ime obi ha ịhụnanya maka Jehova na ekele maka ihe Jehova mewooro ha. Iji mezuo nke a, ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ ejiwo ụbara isiokwu banyere ihe okike dị iche iche nke Jehova ndị a na-achọta ná mbipụta dị iche iche nke Watchtower Society mee ihe n’ụzọ gara nke ọma.

Nrubeisi na nkwanye ùgwù maka Jehova na ofufe ya so n’àgwà ndị ọzọ a na-aghaghị ịkụbanye n’oge ná ndụ. Ọ bụ ihe na-akpali akpali ịhụ ụmụaka ndị na-erubeghị ogo ije akwụkwọ ná nzukọ ndị Kraịst ka ha na-agbalị idetu ihe ole na ole na ịsapeta n’ime Bible nke ha akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche ma ọ bụ soro ndị mụrụ ha jee n’ụlọ ịsa ahụ ije jiri mmiri oyi saa ihu ha mgbe ụra malitere ịtụ ha. Ndị a bụ ihe ndị dị mfe, ma lee ka ha si dị mkpa n’imesi ya ike n’uche ndị na-eto eto na e kwesịrị igosi Jehova nkwanye ùgwù na nrubeisi!

Inye ntụziaka onwe onye e ji kpọrọ ihe nke sitere na Bible kwesịkwara ịmalite n’oge. Mgbe ụmụ ha nwoke dị afọ abụọ, otu di na nwunye malitere iso ha na-agụ akwụkwọ Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti.a N’ikpeazụ, mgbe ụmụaka ndị nwoke ahụ malitere ije akwụkwọ, ha ga-ebili n’isi ụtụtụ ọ bụla soro nne ha mụọ ihe n’Akwukwọm nke Akukọ Bible na Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.* Ihe ga-esochi nke a bụ ntụle nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ nke nna ha ga-eduzi tupu e rie nri ụtụtụ. A kwụghachiri mgbalị nke nne na nna ahụ ụgwọ mgbe ụmụ ha nwoke họọrọ n’oge na-adịbeghị anya ijere Jehova ozi, na-egosipụta nraranye ha site na baptism ime mmiri mgbe ha dị afọ 10 na 11.

Otu ezigbo nwa okorobịa nke na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society na Japan chetaghachiri na mgbe ọ dị ntakịrị, nne ya nyeere ya aka ịzụlite mmekọrịta nke ya na Jehova site n’ịnọ ya n’akụkụ n’abalị, na-enyere ya aka ikpe ekpere. Ọ dịghị mgbe o chezọrọ ihe a kụziiri ya​—⁠n’agbanyeghị ebe o jere ma ọ bụ ihe ọ na-eme, Jehova nọ nso mgbe nile, dịkwa njikere inye aka.

Ndị mụrụ ụmụ nwere ihe ịga nke ọma na-amụta ịchọpụta omume ndị na-adịghị mma nke bụ n’ihi ezughị okè e ketara eketa nke ụmụ ha, ndị ahụ mụrụ ụmụ na-amalitekwa n’oge inyere ụmụ ha aka ịgbazi ndị a. (Ilu 22:15) A ghaghị ime ihe n’oge banyere ọchịchọ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, isi ike, nganga, na ịdị na-akatọ ndị ọzọ gabiga ókè. Ma e meghị otú ahụ, mkpụrụ ndị dị otú ahụ ga-emesịa ghọọ inupụ isi megide Chineke na ụzọ ya nile. Dị ka ihe atụ, ndị nne na nna nwere nzube ọma ma bụrụ ndị na-agba nkịtị gabiga ókè na-ekwekarị ka ụmụ ha zụlite omume nke iche nanị banyere onwe ha. Ọ na-esiri ụmụaka ndị a ike ịkwanyere ndị mụrụ ha ma ọ bụ Jehova ùgwù, na-aghọ ndị yiri ‘ndị na-enweghị ekele’ e hotara n’ime Bible. (Ilu 29:21, NW) N’aka nke ọzọ, ndị a na-enye ọrụ n’ụlọ, ndị a na-akụzikwara ịmụrụ anya n’ebe mkpa ndị ọzọ dị yiri ka ha na-aka enwe ekele nye ma ndị mụrụ ha ma Jehova.

Ihe ọzọ dị mkpa bụ ịmalite n’oge na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke nke nwatakịrị pụrụ iru n’ụzọ ezi uche dị na ya. Ọ bụrụ na e meghị nke a n’oge na n’ụzọ nwere nkwekọ, ndị ọzọ pụrụ iji ihe mgbaru ọsọ ndị dị iche mejuo uche na obi ya. E kwesịrị ịgụnye ịgụzu Bible dum, ịmụ otu n’ime mbipụta nke Watchtower Society n’onwe onye, isonye n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ịghọ onye nkwusa nke ozi ọma, na ime baptism n’ihe mgbaru ọsọ ndị a.

Takafumi na-echeta na nne ya mere ka ya nwee àgwà nke ịdị na-agụ magazin Ụlọ Nche na Teta! site n’idepụta ajụjụ ndị dị mfe na ịhapụ ha n’elu table kichin ka ọ chọta azịza ha mgbe ọ lọtara site n’ụlọ akwụkwọ. Yuri na-echeta na iso ndị ọsụ ụzọb na-eje ozi n’ebe e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị ozi bụ́ ndị Kraịst nọọ ụbọchị ole na ole, iso ha na-eje ozi, ịhụ ka ha na-esi nri ndị dị ụtọ, nakwa ịhụ ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi ha, nwere mmetụta dị ukwuu n’ọchịchọ ya ijere Jehova ozi n’otu ụzọ ahụ. Ọtụtụ ndị ntorobịa na-akọ na ndị mụrụ ha na-eduta ha Betel mgbe mgbe, dị ka a na-akpọ isi ụlọ ọrụ na alaka dị iche iche nke Watch Tower Society, ebe ha pụrụ ịhụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ ndị ọzọ ndị ji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ mere nleta mgbe ha bụ ụmụaka na-eje ozi ugbu a na Betel dị iche iche gburugburu ụwa.

Nye Ụmụ Gị Oge Gị

Ọdịdị na otú oge gị na ụmụ gị na-anọ haruru yiri ka ọ ga-enwe mmetụta kpọmkwem na ma hà ga-ahọrọ ijere Jehova ozi ma ọ bụ na ha agaghị ahọrọ. Ha na-adị ngwa ịchọpụta otú oge na nkwadebe ị na-etinye n’ọmụmụ Bible ị na-eduziri ha haruru. Ọ bụrụ na ị pụghị icheta ebe unu kwụsịrị n’ọmụmụ ihe gara aga ma ọ bụ ọ bụrụ na ị kagbuo ọmụmụ ihe ahụ n’ihi ihe ndị na-enweghị isi, ị na-ezi ha na ọmụmụ ihe ahụ adịchaghị mkpa. Otú ọ dị, mgbe ha na-ahụ na ndị mụrụ ha na-eji ihe ụfọdụ achụ àjà n’ihi ọmụmụ ihe ahụ, na-akwadebe nke ọma maka ya ma na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ mgbe nile n’agbanyeghị ihe ọ bụla dapụtaranụ, a na-ezi ha ihe ọzọ dị iche kpam kpam. Ọ bụ ezie na ọ bụghị iwu, ụfọdụ ndị nne na-ejike ejike maka ọmụmụ ihe nke ụmụ ha, n’otu aka ahụ ha si ejike mgbe a na-eje nzukọ dị iche iche ma ọ bụ na-eduziri onye agbata obi ọmụmụ Bible. Echiche a na-enye bụ na ofufe Jehova dị mkpa.

A ga-achọ oge na mgbalị dị ukwuu iji mee ka ọmụma Bible nke ụmụ gị bụrụ nke dị ụtọ, nke na-eru n’obi ha. Ọ na-emetụta ụmụ ntakịrị karịsịa mgbe ha hụrụ ka a na-eme ihe ngosi nke ihe ndị ha na-amụta n’ihu ha. Dị ka ihe atụ, otu nna nyeere ụmụ ya aka iji uche hụ mbilite n’ọnwụ site n’ime ihe ngosi nke ihe ndekọ Bible banyere mbilite n’ọnwụ nke Lazarọs. Ọ banyere n’ime ebe a na-ekowe uwe wee pụtazie dị ka Lazarọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite.​—⁠Jọn 11:​17-⁠44.

Ka ụmụaka na-etoru ogo mmadụ, ọ na-ewe ọbụna oge na nkà ka ukwuu iji mee ihe banyere nruju mmetụta uche, obi abụọ, na nchegbu ndị ha na-eche ihu. Oge nke ndị nne na nna na-ahụ n’anya, ndị nwere uche, setịpụrụ n’oge a dị oké mkpa ma ọ bụrụ na ụmụaka ahụ ga-azụlite ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Otu nna mụrụ ụmụ anọ nke nwere ihe ịga nke ọma kọrọ na mgbe ụmụ ya chere nsogbu dị iche iche ihu, ọ na-eme nnyocha ma soro ha na-ekwurịta ihe odide ndị metụtara ya ndị dị n’ime mbipụta dị iche iche nke Watchtower kwa ụbọchị ruo mgbe e meriri nsogbu ahụ kpam kpam.

Otu nne ji ụmụ abụọ nke ji ọrụ n’aka nke bụ onye ọsụ ụzọ chọpụtara na ada ya nwanyị na-ekewapụ onwe ya iche ma gharakwa ịdị na-enwe ọṅụ n’ihe omume dị iche iche nke ọchịchị Chineke. Ya mere nne ahụ kpebisiri ike ịnọ n’ụlọ n’ehihie ọ bụla mgbe nwa ahụ si n’ụlọ akwụkwọ lọta, na-esoro ada ya ahụ na-enwe nkwurịta okwu ka ha na-aṅụ tii. Site ná mkparịta ụka ahụ chiri anya nke nne na ada, nwa agbọghọ ahụ nwetara enyemaka ahụ dị ya mkpa. Ugbu a, mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na mahadum, o sonyeworo nne ya n’ozi ọsụ ụzọ.​—⁠Ilu 20:5.

Ezi Mkpakọrịta na Ihe Nlereanya

Tinyere inye oge ha, ndị mụrụ ụmụ aghaghị inye ụmụ ha ezi mkpakọrịta. Ilu 13:20 na-asị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.”

Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ nwere ihe ịga nke ọma na-amata ịbụ eziokwu nke ilu ahụ. Otu nna mụrụ ụmụ anọ na-asị: “Mgbe m leghachiri anya azụ, ana m eche na ọ bụ ìgwè gbasapụrụ agbasapụ nke ndị enyi ụmụ anyị bụ́ ndị nọ n’eziokwu nyere aka ịkpali ha ijere Jehova ozi. M gbara ha ume imeta ndị enyi n’ọgbakọ ndị ọzọ tinyekwara na nke anyị na ịzụlite ọbụbụenyi ndị ahụ.” Otu onye Kraịst bụ́ onye okenye nke jeworo ozi na Betel ruo ọtụtụ afọ chetaghachiri: “Mgbe m dị ntakịrị, anyị bi n’obere ụlọ, ma a na-enyekarị ya dị ka ebe obibi nke onye nlekọta sekit. Tụkwasịkwa, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nọ n’ọgbakọ na-eso anyị eri nri abalị mgbe nile. Ha na-asa ahụ n’ụlọ anyị ma soro anyị kpakọrịta. Ịnụ ahụmahụ ha dị iche iche na ịhụ ọṅụ ha nyeere m aka ịzụlite mmasị maka ozi oge nile.”

Ezi mkpakọrịta na-enyere ndị na-enwe ihe isi ike aka. Otu nne nke nwa ya nwoke na-enwe ihe isi ike sooro onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova kwurịta nsogbu ahụ. Ọ tụrụ aro nne ya ịkpọrọ nwa ahụ jee ozi ubi. “Ọ bụrụ na i mee ya, ọnọdụ ime mmụọ ya na ihe ndị ọzọ nile ga-aka mma,” ka onye nlekọta ahụ kwuru. Nne ahụ na-akọ, sị: “N’ọgbakọ anyị, e nwere ndokwa e mere maka ịgba àmà uhuruchi, ọtụtụ ụmụaka kwa ndị ruru ogo ije akwụkwọ, ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ oge nile ndị ka mee okenye, na ma ọ dịkarịa ala otu onye okenye keere òkè na ya. Na mbụ ọ bụ ọgụ na mgba ime ka nwa m nwoke na-ejechi anya, ma nke ahụ adịteghị anya ebe ọ na-alọta n’ụlọ mgbe nile na-enwe ihu ọchị karị, bụrụkwa onye ezi mkpakọrịta ahụ gbara ume. N’oge ọ ka bụ nwa akwụkwọ na mahadum, o mere baptism ma jeekwa ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ọ bụla, mgbe ọ gụsịkwara akwụkwọ, ọ ghọrọ onye ọsụ ụzọ oge nile.” Ezi mkpakọrịta tinyere ime uche Jehova rụpụtara ihe ndị dị mma.

Ọ pụrụ ịbụ na e nweghị n’ógbè unu ndị na-eto eto ndị pụrụ inwe ezi mmetụta n’ahụ nwa gị, ma otu ihe nke ọtụtụ ndị ntorobịa họọrọ ijere Jehova ozi na-ekwughachi na-emetụta ihe nlereanya nke ndị mụrụ ha. Ọtụtụ ndị ntorobịa nwere mmasị n’ahụ ndị mụrụ ha, chọọkwa iṅomi ha. Yuri na-echeta omume ile ọbịa nke nne ya na otú o si elekọta ndị ọzọ, na-akpọ ha na telifon ma na-esiri ndị na-arịa ọrịa nri. Tatsuo, onye sitere n’ezinụlọ nwere ụmụ nwoke anọ, ha nile etopuchaala ugbu a ma na-ejere Jehova ozi, kwuru, sị: “Mama m enweghị ike ịdị na-amụchiri anyị ihe anya n’ihi na Papa bụ onye na-ekweghị ekwe, o nwetakwara mmegide dị ukwuu site n’aka ndị ikwu. Ma ịhụ nguzo ya maka eziokwu ahụ na ọṅụ ya n’ijere Jehova ozi nwere oké mmetụta n’ahụ m. Ọ dịkwa njikere ịmụrụ anya ruo n’isi ụtụtụ iji nyere anyị aka ná nsogbu anyị dị iche iche.” Okwu amamihe nke ndị mụrụ ụmụ nwere ike mgbe e ji ọrụ ikwesị ntụkwasị obi sochie ya. Yoichiro kwuru banyere ndị mụrụ ya, sị: “Apụghị m icheta ma ọ̀ dị mgbe ha kwuru ihe na-adịghị mma banyere ndị ọzọ nọ n’ime ọgbakọ; ha ekweghịkwa ka anyị bụ́ ụmụaka jiri mmejọ ndị ọzọ gbaa asịrị.”​—⁠Luk 6:​40-⁠42.

Ọṅụ Dị n’Ịhụ Ka Ụmụaka Na-ahọrọ Jehova

E nweghị usoro nke na-apụghị ịda ada iji nyere ụmụaka aka ịhọrọ Jehova. A ga-enwe ọtụtụ oge nke nchegbu. Ma nna ahụ nọ ná nchekasị nke e hotara ná mmalite sịrị: “Dị ka ndị mụrụ ụmụ anyị na-agbalị mgbe nile n’ikwesị ntụkwasị obi ịgbaso aro dị iche iche nke nzukọ Jehova a na-ahụ anya. Nke a bụ oké ihe enyemaka n’imeri nsogbu.” Mgbalị nile ha gara nke ọma.

Ee, site n’ime ihe nile i nwere ike ime iji gbasoo nduzi Bible, na-enye ụmụ gị ezi ihe ndị mere ha ga-eji hụ Jehova n’anya, nke e ji ihe nlereanya ikwesị ntụkwasị obi gị na mgbalị sitere n’obi iji nye aka kwadoo, gị onwe gị kwa pụrụ ịhụ ka e ji ihe ịga nke ọma gọzie mgbalị gị nile. Ì chetara nwa okoro ahụ e hotara ná mbụ, bụ́ onye kpebiburu ịhapụ ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova? Otú ọ dị, mgbe nne ya nyesịịrị ya aka n’ụzọ gara nke ọma gabiga afọ ndị ahụ siiri ya ike, o kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ na ike agwụghị ya!” Ị pụkwara inwe ụdị ihe ọma dị otú ahụ ga-esi na ya pụta n’ebe ụmụ gị nọ.​—⁠Ndị Galetia 6:9.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b A na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova ndị ọsụ ụzọ. Onye ọsụ ụzọ inyeaka na-etinye ma ọ dịkarịa ala 60 hour n’ozi kwa ọnwa, onye ọsụ ụsọ oge nile 90 hour, na onye ọsụ ụzọ pụrụ iche 140 hour.

[Foto dị na peeji nke 30]

Ị̀ pụrụ iji ncheta obi ụtọ leghachi anya azụ n’ịzụ nwa?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya