Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ọ̀ ga-ekwesị ekwesị ịnara ọgwụ ọkụ aka ma ọ bụ ọgwụ ọgbụgba ọzọ nwere mmiri ọgwụ “albumin” e si n’ọbara mmadụ nweta?
N’ikwu eziokwu, onye Kraịst ọ bụla aghaghị ikpebiri onwe ya nke a.
Ndị ohu Chineke chọrọ n’izi ezi irube isi n’ụkpụrụ iwu a na-achọta n’Ọrụ Ndị Ozi 15:28, 29, bụ́ ịhapụ ọbara. N’ihi ya, ndị Kraịst agaghị eri anụ a na-ebepụghị ọbara ya ma ọ bụ ihe ndị dị ka ngwọngwọ ọbara. Ma iwu Chineke metụtakwara nlekọta ọgwụ na ahụ ike. Ndịàmà Jehova na-eji kaadị na-ekwu na ha na-ajụ ‘mmịnye ọbara, ọbara dum, mkpụrụ ndụ ọbara uhie uhie, mkpụrụ ndụ ọbara ọcha, platelet, ma ọ bụ plasma (mmiri ọbara).’ Ma, gịnị banyere ọgwụ ọgbụgba serum ndị nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke protein (ihe na-edozi ahụ) dị n’ọbara?
Ọ dịwo anya Ndịàmà matara na nke a bụ okwu dịịrị mmadụ ikpebiri onwe ya n’ikwekọ n’akọ na uche e ji Bible zụọ nke onye ọ bụla. E gosipụtara nke a ‘n’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ’ nke Ụlọ Nche June 1, 1990, bụ́ nke tụlere ọgwụ ọgbụgba serum nke onye dibịa pụrụ ikwu ka a gbaa ma ọ bụrụ na e kpughepụrụ mmadụ nye ụdị ọrịa ụfọdụ. Ihe ndị na-akpa ike n’ọgwụ ọgbụgba ndị dị otú ahụ abụchaghị mmiri ọbara kama ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ sitere ná mmiri ọbara nke ndị zụliteworo nguzogide nye ọrịa ahụ. Ụfọdụ ndị Kraịst chere na ha pụrụ ịnakwere ọgwụ ọgbụgba ndị dị otú ahụ n’ezi akọ na uche arịbawo ama na ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ site n’ọbara nwanyị dị ime na-abanye n’ọbara nwa nọ n’akpa nwa ya. “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” hotara nke a, nakwa eziokwu ahụ bụ na albumin ụfọdụ na-esite na nwanyị di ime banye n’ime nwa ọhụrụ ya.
Ọtụtụ na-ewere nke a dị ka ihe dị ịrịba ama, ebe ọ bụ na ọgwụ ọkụ aka ụfọdụ a na-ejighị ọbara kwadebe pụrụ inwe ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ nta nke albumin mmiri ọbara bụ́ nke e ji mee ihe ma ọ bụ nke e tinyere iji mee ka ihe ndị e ji mee ha dịgide mgbe a na-emepụta ha. Ka ọ dị ugbu a a na-ejikwa ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke albumin eme ihe n’ọgwụ ọgbụgba nke mmiri ọgwụ ahụ mmadụ mepụtara bụ́ EPO (erythropoietin). Ụfọdụ Ndịàmà anarawo ọgwụ ọgbụgba EPO n’ihi na ọ pụrụ ime ka mmepụta nke mkpụrụ ndụ ọbara uhie uhie dị ngwa wee si otú ahụ mee ka onye dibịa ghara inwe mmetụta nke na mmịnye ọbara pụrụ ịdị mkpa.
A pụrụ iwepụta ọgwụ ndị ọzọ n’ọdịnihu bụ́ ndị metụtara ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ nta nke albumin, ebe ọ bụ na ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ na-emepụta ihe ndị ọhụrụ ma ọ bụ na-agbanwe usoro e ji mepụta ndị dị adị. N’ihi ya ndị Kraịst pụrụ ịchọ ịchọpụta ma albumin ọ̀ dị n’ọgwụ ọkụ aka ma ọ bụ n’ọgwụ ọgbụgba ndị ọzọ nke dọkịta kwuru ka a gbaa. Ọ bụrụ na ihe edoghị ha anya ma ọ bụ nwee ihe mere a ga-eji kwere na e tinyere albumin na ya, ha pụrụ ịjụ dibịa ha.
Dị ka a rịbara ama, ọtụtụ Ndịàmà ajụbeghị ịnakwere ọgwụ ọgbụgba nke nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke albumin. Ma, onye ọ bụla chọrọ ịmụ ihe banyere okwu ahụ nke ọma karị tupu o mee mkpebi onwe onye kwesịrị ịtụleghachi ihe ọmụma e wepụtara n’ime “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke Ụlọ Nche June 1, 1990.