Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 10/15 p. 21-26
  • Ị̀ Na-agbaghara Dị Ka Jehova Na-agbaghara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-agbaghara Dị Ka Jehova Na-agbaghara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mosis Arịọchitere Ndị Ọzọ​—⁠Jehova Na-aṅa Ntị
  • Ikpere Arụsị Manase na Ịkwa Iko Devid
  • Nrara Solomọn Raara Ụlọ Nsọ ahụ Nye
  • Mgbaghara n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst
  • ‘Werenụ Amara Na-agbaghara Onwe Unu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Jehova, Chineke nke “Na-agbaghara Mmehie”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Jehova Bụ Onye Kacha Agbaghara Mmehie
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Na-agbaghara Mmehie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 10/15 p. 21-26

Ị̀ Na-agbaghara Dị Ka Jehova Na-agbaghara?

“Ọ bụrụ na unu agbaghara mmadụ ndahie nile ha, Nna unu ga-agbagharakwa unu. Ma ọ bụru na unu agbagharaghị mmadụ ndahie nile ha, Nna unu agaghị agbaghara unu ndahie unu.”​—⁠MATIU 6:​14, 15.

1, 2. Ụdị Chineke dị aṅaa dị anyị mkpa, n’ihi gịnịkwa?

“JEHOVA nwere obi ebere, na-emekwa amara, Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ na-abakwa ụba n’ebere. Ọ bụghị ruo mgbe nile ka Ọ ga na-ese okwu; Ọ bụghịkwa ruo mgbe ebighị ebi ka Ọ ga na-edebe iwe. Ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka O meworo anyị, ọ bụghịkwa dị ka ajọ omume nile anyị si dị ka O mesoworo anyị. N’ihi na dị ka ịdị elu nke eluigwe si dị n’elu ụwa, otú a ka ebere Ya dị ike n’ahụ ndị na-atụ egwu Ya. Dị ka Ihu anyanwụ si dị anya n’Ọdịda anyanwụ, otú a ka O meworo ka njehie nile anyị dị anya n’ebe anyị nọ. Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu Ya. N’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.”​—⁠Abụ Ọma 103:​8-⁠14.

2 Ịbụ ndị a tụrụ ime ha ná mmehie ma mụpụta n’ajọ omume, na-enwe ezughị okè e ketara eketa nke na-agbalị mgbe nile iduje anyị n’ohu nke iwu mmehie, anyị nwere nnọọ mkpa nke Chineke ‘na-echeta na e ji ájá kpụọ anyị.’ Narị afọ atọ mgbe Devid kọwasịrị Jehova n’ụzọ ahụ magburu onwe ya n’Abụ Ọma nke 103, onye ọzọ so dee Bible, bụ́ Maịka, bulikwara otu Chineke a elu n’otu ụzọ ahụ maka iji amara agbaghara mmehie e meburu: “Olee chi a pụrụ iji atụnyere gị: na-ewepụ ngahie, na-agbaghara mpụ, na-adịghị ebu iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi kama na-enwe obi ụtọ n’igosi ebere? Otu ugbo ọzọ nwee ọmịiko n’ahụ anyị, zọda njehie anyị, tụba mmehie anyị nile n’ime ala ala osimiri.”​—⁠Maịka 7:​18, 19, The Jerusalem Bible.

3. Gịnị ka ịgbaghara mmehie pụtara?

3 N’Akwụkwọ Nsọ Grik, okwu bụ maka “gbaghara” pụtara “ịhapụ.” Rịba ama na Devid na Maịka, ndị e hotara n’elu, nyere otu isi ihe ahụ ọ pụtara n’okwu ndị mara mma ma na-akọwa ihe. Iji ghọta n’ụzọ zuru ezu ókè dị ịtụnanya nke mgbaghara Jehova na-eru, ka anyị tụleghachi ole na ole nke ọtụtụ ihe atụ ebe e tinyere ya n’ọrụ. Nke mbụ na-egosi na a pụrụ ichigharị uche Jehova site ná mbibi gaa ná mgbaghara.

Mosis Arịọchitere Ndị Ọzọ​—⁠Jehova Na-aṅa Ntị

4. Mgbe e gosipụtasịrị ike Jehova ndị dị aṅaa ka ụmụ Israel ka tụrụ egwu ịbanye n’Ala Nkwa ahụ?

4 Jehova si n’Ijipt kpọpụta mba Israel n’enweghị nsogbu ruokwa ná nso nke ala ahụ o kweworo ha ná nkwa dị ka ala ha, ma ha jụrụ ịga n’ihu, ebe ha bụ ndị na-atụ egwu ndị mmadụ nkịtị nọ na Kenean. Mgbe ha hụsịrị ka Jehova jisịrị ihe otiti iri na-eweta mbibi gbapụta ha site n’Ijipt, meghee ụzọ mgbapụ gafee Osimiri Uhie, bibie ndị agha Ijipt nwara ịchụso ha, soro ha guzobe ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’Ugwu Saịnaị nke mere ha mba Jehova họọrọ, ma si n’ụzọ ọrụ ebube nye ha manna si n’eluigwe kwa ụbọchị ịkwagide ha, ha tụrụ egwu ịbanye n’Ala Nkwa ahụ n’ihi ụfọdụ ndị kenean tofere uto ókè!​—⁠Ọnụ Ọgụgụ 14:​1-⁠4.

5. Olee otú ndị nledo abụọ kwesịrị ntụkwasị obi si gbalịa ịkpali ụmụ Israel ime ihe?

5 Mosis na Erọn wee daa kpuo ihu ha n’ala n’ụjọ. Joshua na Keleb, ndị nledo abụọ kwesịrị ntụkwasị obi, gbalịrị ịkpali ụmụ Israel ime ihe: ‘Ala ahụ dị mma nke ukwuu, ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya. Jehova nọnyeere anyị, unu atụla egwu ha.’ Kama ịbụ ndị okwu ndị ahụ gbara ume, ndị ahụ egwu ji, na-enupụ isi nwara ịtụ Joshua na Keleb nkume.​—⁠Ọnụ Ọgụgụ 14:​5-⁠10.

6, 7. (a) Gịnị ka Jehova kpebiri ime mgbe ụmụ Israel jụrụ ịzọrọ ije baa n’Ala Nkwa ahụ? (b) N’ihi gịnị ka Mosis ji ghara ikwenye n’ikpe Jehova mara ụmụ Israel, gịnịkwa ka nke a rụpụtara?

6 Iwe were Jehova! “Jehova wee sị Mosis, Ruo olee mgbe ka ndị nke a ga-elelị m anya? ọ̀ bụkwa ruo olee mgbe ka ha na-agaghị ekwe na Mụ, n’ihi ihe ịrịba ama nile nke M meworo n’etiti ha? M ga-ewere ajọ ọrịa na-efe efe tigbuo ha, M ga-anapụkwa ha ihe ha nwere, M ga-emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu dịkwa ike karịa ha. Mosis wee sị Jehova, Ndị Ijipt ga-anụkwa ya; n’ihi na I weere ike Gị mee ka ndị nke a si n’etiti ha rịgopụta; ha ga-agwakwa ndị bi n’ala nke a okwu a . . . Ma a sị na I mee ka ndị nke a nwụọ dị ka otu onye, mba nile ndị nụworo akụkọ banyere Gị ga-ekwukwa, sị, N’ihi na Jehova apụghị ime ka ndị nke a baa n’ala ahụ nke Ọ ṅụụrụ ha iyi inye ha, n’ihi ya ka O gbuworo ha n’ọzara.”​—⁠Ọnụ Ọgụgụ 14:​11-⁠16.

7 Mosis rịọrọ maka mgbaghara, n’ihi aha Jehova: “Biko, gbaghara ajọ omume nke ndị nke a dị ka ịdị ukwuu nke ebere Gị si dị, na dị ka Ị gbagharawooro ndị nke a, site n’Ijipt wee ruo ugbu a. Jehova wee sị, Agbagharawo m dị ka okwu gị si dị.”​—⁠Ọnụ Ọgụgụ 14:​19, 20.

Ikpere Arụsị Manase na Ịkwa Iko Devid

8. Ihe ndekọ dị aṅaa ka Eze Manase nke Juda nwere?

8 Ihe nlereanya pụrụ iche nke mgbaghara Jehova bụ n’ọnọdụ nke Manase, nwa nke ezi Eze Hezekaịa. Manase dị afọ 12 mgbe ọ malitere ịbụ eze na Jerusalem. O wuru ebe dị elu dị iche iche, guzobe ebe ịchụàjà nye Beal, meekwa Asherọt, kpọọkwa isiala nye kpakpando nke eluigwe, o jiri igwe ojii tụọ isi ọma na isi ọjọọ ma mee mgbaasị, mee ndị na-ajụ ndị mmụọ ase na ndị dibịa afa, dọba arụsị a pịrị apị nke ihe oyiyi n’ụlọ nsọ Jehova, meekwa ka ụmụ ya ndị ikom gabiga n’ime ọkụ n’ime Ndagwurugwu nwa Hinọm. “O mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova hie nne” ma “mee ka Juda na ndị bi na Jerusalem sihie ụzọ, ime ihe ọjọọ karịa mba ọzọ, bụ́ ndị Jehova kpochapụrụ n’ihu ụmụ Israel.”​—⁠2 Ihe Emere 33:​1-⁠9.

9. Olee otú e si mee ka ihu Jehova dajụọ n’ebe Manase nọ, gịnịkwa ka nke a rụpụtara?

9 N’ikpeazụ, Jehova mere ka ndị Asiria bịakwasị Juda, ha wee jide Manase ma kpụga ya Babilọn. “Ma mgbe a na-akpagbu ya, ọ chọọ ka ihu Jehova, bụ́ Chineke ya, dajụọ, wee huruo ala nke ukwuu n’ihu Chineke nke nna ya hà. O wee kpeere Ya; O wee kwe ka ọ rịọta ihe ọ rịọrọ, wee nụrụ arịrịọ amara ya, mee ka ọ lata na Jerusalem baa n’alaeze ya.” (2 Ihe Emere 33:​11-⁠13) Mgbe ahụ Manase wezụgara chi nile nke ndị ala ọzọ, arụsị a pịrị apị, na ebe ịchụàjà nile ma kpofuo ha n’azụ obodo. Ọ malitere ịchụ àjà n’elu ebe ịchụàjà nke Jehova ma mee ka Juda malite ife ezi Chineke ahụ ofufe. Nke a bụ ngosipụta dị ịtụnanya nke njikere Jehova dị ịgbaghara mmehie mgbe obi umeala, ekpere, na ihe e mere iji dozie njehie na-amịpụta mkpụrụ nke kwesịrị nchegharị!​—⁠2 Ihe Emere 33:​15, 16.

10. Olee otú Devid si gbalịa ikpuchi mmehie ya n’ihe banyere nwunye Uraịa?

10 Mmehie ịkwa iko nke Eze Devid mere n’ebe nwunye Uraịa onye Het nọ bụ nke a ma ama nke ọma. Ọ bụghị nanị na ọ kwasoro nwanyị ahụ iko kamakwa o mepụtara ihe mkpuchi dị ukwuu mgbe ọ tụụrụ ime. Eze ahụ nyere Uraịa ikike ịhapụ ihu agha gaa zutụ ike, na-atụ anya ka ọ gaa n’ụlọ ya ma soro nwunye ya nwee mmekọahụ. Ma, n’ihi ùgwù o nwere maka ndị agha ibe ya nọ n’ihu agha, Uraịa jụrụ ime otú ahụ. Mgbe ahụ Devid kpọrọ ya òkù ka ọ bịa rie nri, meekwa ka ọ ṅụbiga mmanya ókè, ma Uraịa ka jụkwara ịgakwuru nwunye ya. Mgbe ahụ Devid zigaara ọchịagha ya ozi ka o tinye Uraịa n’ebe ọgụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ, iji gbuo Uraịa, nke bụkwanụ ihe merenụ.​—⁠2 Samuel 11:​2-⁠25.

11. Olee otú e si mee ka Devid chegharịa site ná mmehie ya, ma gịnị ka ọ tara ahụhụ ya?

11 Jehova zigara onye amụma ya bụ́ Netan jekuru Devid iji kpughe mmehie eze ahụ. “Devid wee sị Netan, Emehiewo m megide Jehova. Netan wee sị Devid, Jehova emewokwa ka mmehie gị gabiga; ị gaghị anwụ.” (2 Samuel 12:13) Devid nwere mwute obi ọmụma ikpe banyere mmehie ya ma kwupụta nchegharị ya n’ekpere si n’ala ala obi nke o kpegaara Jehova: “N’ihi na àjà adịghị atọ Gị ụtọ; ka m wee nye ya: Àjà nsure ọkụ adịghị atọ Gị ụtọ. Àjà nile nke Chineke bụ mmụọ tiwara etiwa: Obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, Ị dịghị eleda ya anya.” (Abụ Ọma 51:​16, 17) Jehova eledaghị ekpere Devid anya, bụ́ nke e kpere site n’obi tiwara etiwa. Ma, Devid nwetara oké ntaramahụhụ, n’ikwekọ n’okwu Jehova banyere mgbaghara mmehie n’Ọpụpụ 34:​6, 7: “Ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.”

Nrara Solomọn Raara Ụlọ Nsọ ahụ Nye

12. Gịnị ka Solomọn rịọrọ n’oge nraranye nke ụlọ nsọ ahụ, gịnịkwa ka Jehova zaghachiri?

12 Mgbe Solomọn wusịrị ihe owuwu nke ụlọ nsọ Jehova, o kwuru n’ekpere ya nke nraranye, sị: “Geekwa ntị arịrịọ amara nile nke ohu Gị, na nke ndị Gị, bụ́ Israel, mgbe ha na-ekpe ekpere n’ebe ebe a dị: Gị onwe gị sikwa n’ebe obibi Gị, bụ́ site n’eluigwe, nụrụ; mgbe Ị nụworo, Gị gbagharakwa.” Jehova zaghachiri, sị: “A sị na egbochie m eluigwe, mmiri ozuzo wee ghara ịdị, ma ọ bụ a sị na enye m igurube iwu iripịa ala, ma ọ bụ a sị na ezite m ajọ ọrịa na-efe efe n’etiti ndị m; ọ bụrụ na ndị m, bụ́ ndị a kpọkwasịrị ha aha m, eweda onwe ha n’ala, kpee ekpere, chọọ ihu m, si n’ụzọ ọjọọ ha nile laghachi; Mụ onwe m ga-esikwa n’eluigwe nụrụ, gbaghara ha mmehie ha, mee ka ala ha dịrị ndụ.”​—⁠2 Ihe Emere 6:21; 7:13, 14.

13. Gịnị ka Ezikiel 33:​13-⁠16 na-egosi banyere otú Jehova si ele mmadụ anya?

13 Ka Jehova na-ele gị anya, ọ na-anara gị ná ndabere nke ihe ị bụ ugbu a, ọ bụghị ihe ị bụworo. Ọ ga-adị dị ka Ezikiel 33:​13-⁠16 kwuru: “Mgbe M na-asị onye ezi omume, na ọ ghaghị ịdị ndụ; onye ahụ ewee tụkwasị obi n’ezi omume ya, mee ajọ omume, ezi omume ya nile, a gaghị echeta ha; ma n’ajọ omume ya nke o meworo, n’ime ya ka ọ ga-anwụ. Ọzọ, mgbe M na-asị onye na-emebi iwu, Ị ghaghị ịnwụ; o wee si ná mmehie ya chigharịa, mee ihe e kpere n’ikpe na ezi omume; a sị na onye na-emebi iwu enyeghachi ihe ibé, kwụghachi ihe ọ pụnaara mmadụ n’ike, jegharịa n’ụkpụrụ nile nke ndụ, ghara ime ajọ omume; ọ ghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ. Mmehie ya nile nke o mehieworo a gaghị echeta ha megide ya: ihe e kpere n’ikpe na ezi omume ka o meworo; ọ ghaghị ịdị ndụ.”

14. Gịnị dị iche banyere mgbaghara Jehova?

14 Mgbaghara mmehie nke Jehova Chineke na-enye anyị na-enwe ihe na-esetịpụ ya iche, ihe nke na-esiri ụmụ mmadụ e kere eke ike ịgbakwụnye ná mgbaghara nke ha na-enyerịta ibe ha​—⁠ọ na-agbaghara ma na-echezọ. Ụfọdụ ndị ga-asị, ‘Apụrụ m ịgbaghara ihe i meworo, ma apụghị m (ma ọ bụ agaghị m) echezọ ya.’ N’ụzọ dị iche, rịba ama ihe Jehova sịrị na ya ga-eme: “M ga-agbaghara ajọ omume ha, M gaghị echetakwa mmehie ha ọzọ.”​—⁠Jeremaịa 31:34.

15. Ihe ndekọ dị aṅaa nke mgbaghara ka Jehova nwere?

15 Jehova anọwo na-agbaghara ndị na-efe ya ofufe n’elu ala ruo ọtụtụ puku afọ. Ọ nọwo na-agbaghara mmehie ndị ha maara na ha mere, tinyekwara ọtụtụ ha na-amaghị banyere ha. Onyinye ya nke ebere, ogologo ntachi obi, na mgbaghara abụrụwo ndị na-adịghị agwụ agwụ. Aịsaịa 55:7 na-asị: “Onye na-emebi iwu, ya hapụ ụzọ ya, onye na-eme ajọ ihe, ya hapụ echiche ya nile: ya laghachikwutekwa Jehova, Ọ ga-enwekwa obi ebere n’ahụ ya; ya laghachikwutekwa Chineke anyị, n’ihi na Ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụba.”

Mgbaghara n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst

16. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jisọs ịdị na-agbaghara kwekọrọ na nke Jehova?

16 Akụkọ dị iche iche nke mgbaghara Chineke jupụtara ná ndekọ ndị e mere n’ime Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Jisọs na-ekwu banyere ya mgbe mgbe, na-egosi na ọ na-ekwekọ n’uche Jehova n’okwu ahụ. Echiche Jisọs sitere n’ebe Jehova nọ, ọ na-egosipụta Jehova, ọ bụ onyinyo nke ụdị Jehova; ịhụ ya bụ ịhụ Jehova.​—⁠Jọn 12:45-⁠50; 14:9; Ndị Hibru 1:3.

17. Olee otú Jisọs si mee ihe atụ mgbaghara Jehova na-agbaghara “n’ụba”?

17 Na Jehova na-agbaghara mmehie n’ụba bụ nke e gosipụtara n’otu ihe atụ Jisọs, nke otu eze gbaghaara otu ohu ụgwọ 10,000 talent (ihe dị ka ₦726,000,000). Ma mgbe ohu ahụ na-agaghị agbaghara onye ohu ibe ya ụgwọ nke otu narị denari (ihe dị ka ₦1,320), eze ahụ were iwe nke ukwuu. “Ajọ ohu, agbaghaara m gị ụgwọ ahụ nile, n’ihi na ị rịọrọ m: ò kwesịghịkwa gị imere ohu ibe gị ebere? Onyenwe ya were iwe, wee rara ya nye n’aka ndị mmekpa ahụ, ruo mgbe ọ ga-akwụghachi ụgwọ nile o ji.” Mgbe ahụ Jisọs nyere ihe mmụta ya: “Otú a ka Nna m nke eluigwe ga-emekwa unu, ọ bụrụ na unu agbagharaghị, onye ọ bụla mmehie nwanne ya, site n’obi unu.”​—⁠Matiu 18:​23-⁠35.

18. Olee otú ụzọ Pita si ele mgbaghara anya si dị iche n’ụzọ Jisọs si ele ya anya?

18 Kpọmkwem tupu Jisọs enye ihe atụ ahụ dị n’elu, Pita bịakwutere Jisọs ma jụọ, sị: “Onyenwe anyị, ugbo olè ka nwanna m ga-emehie megide m, ewe m gbaghara ya? Ruo ugbo asaa?” Pita chere na ya na-emesapụ aka nke ukwuu. Ọ bụ ezie na ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii setịpụrụ ókè nke mgbaghara mmehie, Jisọs gwara Pita, sị: “Asịghị m gị, Ruo ugbo asaa, kama, [Ruo ugbo iri asaa na asaa, NW].” (Matiu 18:​21, 22) Ugbo asaa agaghị ezu ma ọlị maka otu ụbọchị, dị ka Jisọs kwuru: “Na-ezenụ onwe unu: ọ bụrụ na nwanna gị emehie, baara ya mba; ọ bụrụkwa na ọ chegharịa, gbaghara ya. Ọ bụrụkwa na o mehiere megide gị ugbo asaa n’otu ụbọchị, wee chigharịa ọzọ n’ebe ị nọ ugbo asaa, sị, Echegharịa m; ị ga-agbaghara ya.” (Luk 17:​3, 4) Mgbe Jehova gbaghaara mmehie, ọ dịghị eme ndekọ ya​—⁠ihe obi ụtọ nye anyị.

19. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nweta mgbaghara Jehova?

19 Ọ bụrụ na anyị nwere obi umeala iji chegharịa ma kwupụta mmehie anyị, Jehova na-ekwere ịzaghachi n’ihi anyị: “Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, ọ bụ Onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa Onye ezi omume, ka O wee gbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume nile.”​—⁠1 Jọn 1:9.

20. Ụdị ịdị njikere dị aṅaa maka ịgbaghara ka Stifen gosiri?

20 Onye na-eso ụzọ Jisọs bụ́ Stifen, ná mmụọ mgbaghara dị ịrịba ama, jiri oké olu kwupụta arịrịọ nke a ka ìgwè mmadụ ahụ iwe ji na-atụ ya nkume: “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m nke ọma. O wee gbuo ikpere n’ala, werekwa oké olu tie mkpu, sị, Onyenwe anyị, atụkwasịla mmehie a n’isi ha. Mgbe o kwusịrị okwu a, o wee daa n’ụra.”​—⁠Ọrụ 7:​59, 60.

21. N’ihi gịnị ka njikere Jisọs dị ịgbaghara ndị agha Rom ahụ ji bụrụ ihe dị nnọọ ịtụnanya?

21 Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya dị ịtụnanya ọbụna karị nke ịdị njikere ịgbaghara. Ndị iro ya ejidewo ya, kpee ya ikpe n’ụzọ iwu na-akwadoghị, maa ya ikpe, jiri ya mee ihe ọchị, bụọ ya ọnụ mmiri, jiri ụtarị nwere ọtụtụ eriri akpụkpọ anụ nke yikarịrị ka o nwere mpekele ọkpụkpụ na ígwè n’ime ha pịa ya ihe, ma n’ikpeazụ kpọgide ya n’osisi ruo ọtụtụ hour. Ndị Rom tinyere aka n’ọtụtụ n’ime ihe ndị a. Ma, ka Jisọs na-anwụ n’elu osisi ịta ahụhụ ahụ, ọ gwara Nna ya nke eluigwe banyere ndị agha ahụ kpọgburu ya, sị: “Nna, gbaghara ha; n’ihi na ha amataghị ihe ha na-eme.”​—⁠Luk 23:34.

22. Okwu ndị dị aṅaa sitere n’Ozizi Elu Ugwu ahụ ka anyị na-aghaghị ịgbalị itinye n’omume?

22 N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs ekwuworị, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere nye ndị na-esogbu unu.” Ruo n’ọgwụgwụ nke ozi elu ala ya, o rubere isi n’ụkpụrụ ahụ n’onwe ya. Nke ahụ ọ̀ bụ ịchọ ihe siri oké ike n’aka anyị, bụ́ ndị na-agbaso adịghị ike nke anụ ahụ anyị dara ada mgba? Ọ dịkarịa ala anyị kwesịrị ịgbalị itinye okwu ndị ahụ Jisọs ziri ndị na-eso ụzọ ya mgbe o nyesịrị ha ekpere ihe atụ ahụ n’omume: “Ọ bụrụ na unu agbaghara mmadụ ndahie nile ha, Nna unu ga-agbagharakwa unu. Ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị mmadụ ndahie nile ha, Nna unu agaghị agbaghara unu ndahie unu.” (Matiu 5:44; 6:14, 15) Ọ bụrụ na anyị na-agbaghara mmehie dị ka Jehova na-agbaghara, anyị ga-agbaghara ma chezọọ.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee otú Jehova na-esi emeso mmehie anyị, n’ihi gịnịkwa?

◻ N’ihi gịnị ka e ji weghachi Manase n’alaeze ya?

◻ Akụkụ pụrụ iche dị aṅaa nke mgbaghara mmehie Jehova bụ ihe ịma aka nye ụmụ mmadụ iṅomi?

◻ Olee otú njikere Jisọs dị ịgbaghara mmehie si bụrụ ihe dị nnọọ ịtụnanya?

[Foto dị na peeji nke 24]

Netan nyeere Devid aka ịhụ mkpa maka mgbaghara Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya