Ili Pita—Ọ̀ Dị n’Ime Vatican?
“AHỤWO ili nke Eze Ndị Ozi.” Ọkwà mmeri ahụ nke Pope Pius nke Iri na Abụọ mara bụ nke redio nke Vatican kpọsara. Ọ bụ ngwụsị afọ 1950, e mesịwokwa usoro dị mgbagwoju anya nke ngwupụta ihe e mere n’okpuru St. Peter’s Basilica n’oge na-adịbeghị anya. Dị ka ụfọdụ si kwuo, ihe si ná nnyocha ihe ndị e gwupụtara n’ime ala pụta gosiri na e liri Pita n’ezie na Vatican. Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile kwetara.
Nye ndị Katọlik, St. Peter’s Church na Vatican dị mkpa n’ụzọ pụrụ iche. “Nzube bụ isi nke njem dị nsọ a gara na Rom bụ iji zute onye nọchiri Pita na ịnata ngọzi ya,” ka akwụkwọ nduzi ndị Katọlik kwuru, “n’ihi na Pita bịara na Rom, ọ bụkwa ebe ahụ ka e liri ya.” Ma è liri Pita na Rom n’ezie? Ili ya ọ̀ dị na Vatican? À chọtawo ọkpụkpụ ya?
Ihe Omimi nke Nkà Mmụta Ihe Ndị E Gwupụtara n’Ala
Ngwupụta ihe ndị ahụ e mere, nke malitere ihe dị ka 1940 ma nọruo ihe dị ka afọ iri, abụwo isiokwu na-akpata oké ihe iseokwu. Gịnị ka ndị ọkà mmụta ihe ndị e gwupụtara n’ala nke popu họpụtara chọpụtara? Otu ihe bụ, ebe ndị na-ekpere arụsị na-eli ozu nke nwere ọtụtụ ili. N’etiti ha, n’okpuru ihe a maara ugbu a dị ka ebe ịchụ àjà popu, ha chọpụtara otu aedicula, ya bụ, ihe ncheta nke a haziri ịbụ ebe a ga na-edebe ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ ihe oyiyi, bụ́ nke a rụnyere ná mgbidi nke e ji ájá uhie tee, werekwa mgbidi dị n’akụkụ ya abụọ kpuchie ya. N’ikpeazụ, n’ụzọ dịkwa nnọọ omimi, a hụkwara ọkpụkpụ ụfọdụ nke mmadụ, bụ́ ndị e kwuru na ha sitere n’otu n’ime mgbidi ndị ahụ dị ya n’akụkụ abụọ.
Nke a bụ ebe nkọwa dị iche iche e mere si malite. Dị ka ọtụtụ ndị ọkà mmụta Katọlik si kwuo, ihe ndị ahụ a chọpụtara kwadoro ọdịnala nke ebe obibi Pita na ogbugbu e gburu ya na Rom n’oge ọchịchị Nero, eleghị anya n’oge mkpagbu nke 64 O.A. Ọbụna na e kwuwo na ọkpụkpụ ndị ahụ bụ ihe ncheta mgbe ochie nke onye ozi ahụ, a pụkwara ịmata ya otú ahụ site n’ihe e dere nke, dị ka otu nkọwa si dị, na-agụ, “Pita nọ ebe a.” O yiri ka Pope Paul nke Isii ọ na-aja nkọwa a na-enweghị ndabere mma mgbe na 1968 ọ mara ọkwà nchọpụta nke “ozu dị oké egwu nke St. Pita, nke kwesịrị ofufe na nsọpụrụ anyị nile.”
Otú ọ dị, tinyere nkọwa ndị ahụ, e nwekwara nrụrịta ụka. Onye Katọlik bụ onye ọkà mmụta ihe ndị e gwupụtara n’ala bụ́ Antonio Ferrua, bụ́ onye Jesuit so mee ngwupụta ihe ahụ na Vatican, ekwuwo ọtụtụ ugbo na ‘e nyebeghị ya ohere ibipụta’ ihe nile ọ maara n’okwu ahụ, ihe ndị o doro anya na ha ga-emegide nzọrọ ahụ bụ́ na a chọtawo ozu Pita. Ọzọkwa, akwụkwọ na-akọrọ ndị mmadụ banyere Rom, nke Kadịnal Poupard nke ndị Katọlik dere ma bipụta na 1991, kwuru na “nnyocha n’ụzọ sayensị nke e nyochara ọkpụkpụ mmadụ ndị achọtara n’okpuru ntọala nke Red Wall adịghị ka o nwere ihe jikọrọ ha na Pita onyeozi.” N’ụzọ dị nnọọ ịtụnanya, ná mbipụta ọhụrụ ya na-esonụ (ka e mesịrị na 1991), ahịrị okwu ahụ miri ala, a gbakwụnyekwara isiakwụkwọ ọhụrụ, nke a kpọrọ “Ihe E Ji n’Aka: Pita nọ na St. Peter’s.”
Nkọwa nke Ihe Ndị A Chọpụtara
O doro anya na ihe ndị ahụ a chọpụtara bụ ndị a pụrụ ịkọwa, ha na-ekwukwa ihe dịgasị iche nye ndị dị iche iche. N’ezie, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke Katọlik ọnụ kasị eru n’okwu ghọtara na “nsogbu akụkọ ihe mere eme nile nke ogbugbu e gburu Pita na Rom, nakwa ebe e liri ya, bụ nke a na-enyo enyo.” Gịnị ka ihe ndị ahụ a chọpụtara na-ekpughe?
Ihe ncheta aedicula ahụ, dị ka ndị na-achọ ịkwado ọdịnala Katọlik si kwuo, bụ “ihe ncheta” otu nwoke a na-akpọ Gaius, bụ́ onye ụkọchukwu biri ndụ ná mmalite nke narị afọ nke atọ, zoro aka na ya. Dị ka Eusebius nke Siseria, bụ́ onye ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke anọ si kwuo, Gaius kwuru na ya pụrụ ‘igosi ihe ncheta Pita n’Ugwu Vatican.’ Ndị na-akwado ọdịnala na-azọrọ na e liri onyeozi ahụ ebe ahụ, n’okpuru ihe ncheta nke e mesịrị mara dị ka “ihe ncheta nke Gaius.” Otú ọ dị, ndị ọzọ na-akọwa ihe a chọtara n’ihe ndị ahụ e gwupụtara n’ime ala n’ụzọ dị nnọọ iche, na-arụtụ aka na ndị Kraịst mbụ etinyekebeghị uche ha n’olili ndị ha nwụrụ anwụ, na ọbụna ọ bụrụ na e gburu Pita n’ebe ahụ, inwetaghachi ozu ya gaara abụ ihe na-eyitụghị ihe ga-ekwe omume. (Lee igbe, peji nke 29.)
E nwere ndị na-ekwenyeghị na “ihe ncheta nke Gaius” ahụ (ọ bụrụ na nke ahụ bụ ihe a hụrụ) bụ ili. Ha nọgidere na-ekwu na ọ bụ ihe ncheta nke e wuru iji kwanyere Pita ùgwù ná nso nke ngwụsị narị afọ nke abụọ, mgbe e mesịkwara ‘a bịara lee ya anya dị ka ihe ncheta ili.’ Otú ọ dị, dị ka onye ọkà mmụta okpukpe bụ́ Oscar Cullmann si kwuo, “ihe ndị e gwupụtara na Vatican egosighị ili Pita ma ọlị.”
Gịnị banyere ọkpụkpụ ndị ahụ? E kwesịrị ikwu na ebe ọkpụkpụ ndị ahụ si pụta n’ezie ka bụkwa ihe omimi. Ebe ọ bụ na n’ime narị afọ mbụ obodo nta nke ndị na-ekpere arụsị guzo n’elu ihe a ma ugbu a dị ka Ugwu Vatican, e liri ọtụtụ ozu ụmụ mmadụ n’ógbè ahụ, a chọtawokwarị ọtụtụ n’ime ha. Ihe odide ahụ na-ezughị ezu (ma eleghị anya nke e dere na narị afọ nke anọ) nke ndị ụfọdụ na-asị na ọ na-egosi ebe ahụ a hụrụ ọkpụkpụ ndị ahụ dị ka ili onyeozi ahụ, pụrụ, n’ụzọ kasị mma, izo aka “n’ihe e chere bụ ịdị adị nke ọkpụkpụ Pita.” Ọzọkwa, ọtụtụ ndị ọkà n’ihe banyere ihe odide chere na ihe odide ahụ pụrụ ọbụna ịpụta “Pita anọghị ebe a.”
‘Ọdịnala A Na-apụghị Ịdabere na Ya’
“Isi iyi ihe ọmụma nke oge ochie, ndị e kwesịrị ịdabere na ha karị akpọtụghị ebe e gburu [Pita] aha, ma n’etiti isi iyi ihe ọmụma ndị e mesịrị nweta na ndị a na-apụghị ịdaberecha na ha, e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nkwekọrịta na ọ bụ n’ógbè Vatican,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ D. W. O’Connor kwuru. N’ihi ya ọchịchọ a na-achọ ili Pita na Vatican dabeere n’ọdịnala ndị a na-apụghị ịdabere na ha. “Mgbe ihe ncheta mgbe ochie ghọrọ ihe dị oké mkpa,” ka O’Connor na-ekwu, “ndị Kraịst bịara kweta n’ezi obi na [ihe ncheta] Pita ahụ n’ezie gosiri kpọmkwem ebe e wuru ili ya.”
Ọdịnala ndị a sooro nsọpụrụ a na-enye ihe ncheta mgbe ochie nke Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị tokọọ. Site na narị afọ nke atọ na anọ gaa n’ihu, chọọchị dị iche iche webatara ihe ncheta mgbe ochie, ndị bụ ezie na ndị na-abụghị ezie—ọ bụghịkwa n’enweghị uru akụ̀ na ụba—ná mgbalị a na-eme inweta ọkaaka “ime mmụọ” na ịkwalite ịchịisi nke ha. Ya mere, n’ihi ịbụ ndị kwetara na ozu Pita nwere ike ọrụ ebube, ndị na-eme njem nsọ jere n’ebe e chere na ọ bụ ili ya. Ná ngwụsị narị afọ nke isii, ndị kwere ekwe na-atụgabu mpekele ihe dị iche iche e ji nlezianya tụọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’ime “ili” ahụ. “N’ụzọ dị ịrịba ama,” ka otu akụkọ ọgbara ọhụrụ kwuru, “ọ bụrụ na okwukwe nke onye ahụ na-arịọ arịrịọ kwụrụ chịm, mgbe e si n’ili ahụ weghachi ákwà ahụ, ọ ga-ejupụta n’ihe ọma Chineke, ọ ga-adịkwa arọ karịa ka ọ dịbu.” Nke a na-egosi ọ̀tụ̀tụ̀ njikere a dị ikwere ihe ọ bụla n’oge ahụ.
Ruo ọtụtụ narị afọ, akụkọ mgbe ochie ndị dị ka nke a na ọdịnala dị iche iche ndị na-enweghị ntọala tinyere ihe dị ukwuu n’uto nke ùgwù Basilica nke Vatican. Otú ọ dị, e welitere echiche ndị megidere ya. Na narị afọ nke 12 na 13, ndị okpukpe Waldenses katọrọ imebiga ihe ókè ndị a ma, site na Bible, kọwaa na Pita abịatụbeghị Rom. Ọtụtụ narị afọ ka nke a gasịrị, ndị na-akwado Oké Mgbanwe ndị Protestant rụkwara ụka n’otu ụzọ ahụ. Na narị afọ nke 18, ndị ọkà ihe ọmụma ụwa a ma ama lere ọdịnala ahụ anya dị ka nke na-enweghị ihe ndabere, ma n’akụkọ ihe mere eme ma n’Akwụkwọ Nsọ. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta aka siri ike, ndị Katọlik na ndị ọzọ, nwekwara otu ụdị echiche ahụ ruokwa taa.
Pita Ọ̀ Nwụrụ na Rom?
Pita, onye ọkụ azụ dị umeala n’obi bụ́ onye Galili, n’ezie enwetụghị echiche nke ịdị ukwuu karịa ndị okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ. Kama nke ahụ, ọ kọwara onwe ya dị ka “okenye ibe” ha. (1 Pita 5:1-6, Revised Standard Version) Ọdịdị ịdị umeala n’obi nke Pita dị nnọọ iche n’oké ememe gbara ihe e chere na ọ bụ ili ya gburugburu, dị ka onye ọ bụla jere leta Vatican Basilica pụrụ ịhụ.
Iji gosipụta ịdị elu ya karịa òtù ndị Kraịst ndị ọzọ, Chọọchị Katọlik achọwo ịkwado ọdịnala ahụ ‘bịara n’ikpeazụ na nke a na-apụghị ịdaberecha na ya’ nke kwuru na Pita bitụrụ ruo oge ụfọdụ na Rom. Otú ọ dị, n’ụzọ dị ịtụnanya, ọdịnala ochie ndị ọzọ na-eche na ebe e liri ya bụ n’akụkụ ọzọ na Rom, ọ bụghị na Vatican. Ma, gịnị mere na ọ gaghị arapagidesi ike n’eziokwu ndị e dekọrọ n’ime Bible, bụ́ nanị ebe a ga-esi nweta ihe ọmụma ndị bụ ezie banyere Pita? Site n’Okwu Chineke o doro anya na, n’irube isi na nduzi ọ natara site n’aka òtù na-achị isi nke ọgbakọ ndị Kraịst na Jerusalem, Pita rụrụ ọrụ ya n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke ụwa oge ochie, tinyere Babilọn.—Ndị Galetia 2:1-9; 1 Pita 5:13; tụlee Ọrụ Ndị Ozi 8:14.
Mgbe ọ na-edere ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ, ihe dị ka 56 O.A., Pọl onyeozi kelere ihe dị ka 30 ndị nọ n’ọgbakọ ahụ n’akpọtụdịghị Pita aha. (Ndị Rom 1:1, 7; 16:3-23) E mesịa, n’agbata 60 na 65 O.A., Pọl dere akwụkwọ ozi isii site na Rom, ma a kpọtụghị Pita aha—ihe àmà nke ihe ndị mere eme nke na Pita anọghị n’ebe ahụ.a (Tụlee 2 Timoti 1:15-17; 4:11.) A kọwara ọrụ ndị Pọl rụrụ na Rom ná ngwụsị nke akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi, ma otu ugbo ọzọ, e hotatụghị Pita. (Ọrụ 28:16, 30, 31) N’ihi ya, ezi nnyocha nke ihe àmà Bible, nke a na-ejighị echiche e nweburu mbụ mee, pụrụ iduje nanị ná nkwubi okwu bụ́ na Pita ekwusaghị ozi ọma na Rom.b
“Ịkasị elu” nke popu dabeere n’ọdịnala a na-apụghị ịdabere na ha na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a sụgharịrị isi. Jisọs, ọ bụghị Pita, bụ ntọala nke Iso Ụzọ Kraịst. ‘Kraịst bụ isi nzukọ ya,’ ka Pọl kwuru. (Ndị Efesọs 2:20-22; 5:23) Ọ bụ Jisọs Kraịst ka Jehova zitere ịgọzi na ịzọpụta ndị nile nwere okwukwe.—Jọn 3:16; Ọrụ 4:12; Ndị Rom 15:29; leekwa 1 Pita 2:4-8.
Ya mere, ihe chere ndị nile na-aga ebe ha ji ezi obi kwere na ọ bụ ili Pita iji ‘zute onye nọchiri ya’ ihu bụ nsogbu nke ma hà ga-anabata ‘ọdịnala a na-apụghị ịdabere na ha’ ka ọ bụ kwere Okwu Chineke nke kwesịrị ịtụkwasị obi. Ebe ndị Kraịst chọrọ ka ofufe ha bụrụ nke Chineke na-anabata, ha ‘na-elegide Jisọs anya, bụ́ Onye Mmezu nke okwukwe ha,’ na n’ihe nlereanya zuru okè nke ọ hapụụrụ anyị ịgbaso.—Ndị Hibru 12:2; 1 Pita 2:21.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ihe dị ka afọ 60-61 O.A., Pọl dere akwụkwọ ozi ya nye ndị Efesọs, ndị Filipaị, ndị Kọlọsi, Faịlimọn, na ndị Hibru; ihe dị ka 65 O.A., o dere akwụkwọ ozi ya nke abụọ nye Timoti.
b A tụlere ajụjụ bụ “Ọ̀ Dị Mgbe Pita Nọ na Rom?” n’Ụlọ Nche (Bekee) nke November 1, 1972, peji nke 669-671.
[Igbe dị na peeji nke 29]
“Ihe ndị e gwupụtara n’ala egosighị ihe àmà doro anya nke ili dị n’okpuru Aedicula; ndị Kraịst apụghịkwa n’ezie ikwu hoo haa na e nwetaghachiri ozu St. Pita site n’aka ndị gburu ya maka olili. N’ihe omume na-eme dị ka o kwesịrị, ozu nke onye bụ́ onye ala ọzọ (peregrinus), nakwa dị ka usoro iwu si dị onye ome mpụ nkịtị, pụrụ ịbụ nke a tụbararịị n’ime Tiber. . . . Ọzọkwa, a garaghị enwe otu ụdị mmasị ahụ e nwere n’ichebe ozu ndị ochie n’oge gboo a dị ka e nwere ya mgbe oge na-aga, mgbe nkwenkwe n’ọgwụgwụ dị nso nke ụwa nyụrụla ọkụ, òtù nzuzo nke ndị e gburu n’ihi okwukwe ha amaliteworị na-arịpụta isi ya. Ya mere, ikwe omume nke ozu St. Pita n’ezie ịbụ nke a na-enwetaghachighị maka olili bụ nke bụ ezie.”—The Shrine of St. Peter and the Vatican Excavations, nke Jocelyn Toynbee na John Ward Perkins dere.