Nweenụ Obi Ọmịiko
“Yikwasịnụ obi ebere, obi ọma.” —NDỊ KỌLỌSI 3:12.
1. N’ihi gịnị ka e ji nwee oké mkpa maka ọmịiko taa?
ỌDỊGHỊ mgbe ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme mgbe ọtụtụ mmadụ otú a nọworo ná mkpa nke enyemaka ọmịiko. Enyemaka na-adị ọtụtụ nde mmadụ mkpa n’ihi ọrịa, agụụ, enweghị ọrụ, mpụ, agha, ọgba aghara, na ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ma e nwere nsogbu ọbụna nke ka njọ, nke ahụ bụkwa ọnọdụ ime mmụọ dị njọ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Setan, onye maara na oge ya dị mkpirikpi, “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9, 12) N’ihi ya, ndị na-anọghị n’ime ezi ọgbakọ ndị Kraịst kasị nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịtụfu ndụ ha, Bible gụpụkwara olileanya ọ bụla maka mbilite n’ọnwụ nye ndị e gburu n’ụbọchị ikpe na-abịanụ nke Chineke.—Matiu 25:31-33, 41, 46; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9.
2. N’ihi gịnị ka Jehova jiworo ghara ibibi ndị ajọ omume?
2 Ma, ruokwa ná ngwụsị oge a, Jehova Chineke anọgidewo na-enwe ndidi na ọmịiko n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị ajọ omume nọ. (Matiu 5:45; Luk 6:35, 36) O mewo nke a n’ihi otu ihe ahụ mere o ji gbuo oge n’ịta mba Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi ahụhụ. “Mụ onwe m na-adị ndụ, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị Jehova pụta), ọnwụ nke onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ ma ọlị; kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ: chigharịanụ, sinụ n’ụzọ ọjọọ nile unu chigharịa; ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka unu ga-anwụ, ụlọ Israel?”—Ezikiel 33:11.
3. Olee ihe atụ anyị nwere nke ọmịiko Jehova maka ndị na-abụghị ndị ya, gịnịkwa ka anyị na-amụta site na nke a?
3 E gosikwara ndị Nineve na-eme ajọ omume ọmịiko Jehova. Jehova zigara onye amụma ya bụ́ Jona ije dọọ ha aka ná ntị banyere mbibi na-abịanụ. Ha meghachiri omume n’ụzọ dị mma ná nkwusa nke Jona wee chegharịa. Nke a kwaliri Chineke ahụ nwere ọmịiko, bụ́ Jehova, ịhapụ ibibi obodo ahụ n’oge ahụ. (Jona 3:10; 4:11) Ọ bụrụ na Chineke meere ndị Nineve ebere, bụ́ ndị gaara enweworị ike ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ, lee ka ọ na-aghaghị isi nwee ọmịiko karị maka ndị mmadụ taa bụ́ ndị na-eche mbibi ebighị ebi ihu!—Luk 11:32.
Ọrụ Ọmịiko nke A Na-arụtụbeghị Ihe Yiri Ya
4. Olee otú Jehova si na-egosi ndị mmadụ ọmịiko taa?
4 N’ikwekọ n’àgwà ọmịiko ya, Jehova enyewo Ndịàmà ya ọrụ nke ịnọgide jiri ‘ozi ọma nke alaeze’ na-eje eleta ndị agbata obi ha. (Matiu 24:14) Mgbe ndị mmadụ jikwa obi ekele zaghachi n’ọrụ a na-azọpụta ndụ, Jehova na-emepe obi ha ịghọta ozi Alaeze ahụ. (Matiu 11:25; Ọrụ 16:14) N’iṅomi Chineke ha, ezi ndị Kraịst na-egosi ọmịiko site n’ịkpọtụghachiri ndị nwere mmasị, na-enyere ha aka, n’ebe o kwere omume, site n’ọmụmụ Bible. Ya mere, na 1993, ihe gafere nde Ndịàmà Jehova anọ na ọkara, n’ime 231 mba, tinyere ihe gafere otu ijeri hour na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-amụkwara ndị agbata obi ha Bible. Ndị ọhụrụ ndị a nwere mmasị, n’otu aka ahụkwa, nwere ohere nke ịrara ndụ ha nye Jehova na isonyere ìgwè nke Ndịàmà ya e mere baptism. Otú a, ha na-etinyekwa onwe ha n’ọrụ ọmịiko a a na-arụtụbeghị ihe yiri ya mbụ n’ihi ndị gaje ịbụ ndị na-eso ụzọ bụ́ ndị ka tọrọ atọ n’ime ụwa na-anwụ anwụ nke Setan.—Matiu 28:19, 20; Jọn 14:12.
5. Mgbe ọmịiko Chineke ruru njedebe ya, gịnị ga-eme okpukpe nke na-ekwu ihe ndị na-ezighị ezi banyere Chineke?
5 N’isi nso Jehova ga-eme ihe dị ka “onye agha.” (Ọpụpụ 15:3) N’ihi ọmịiko maka aha ya na maka ndị ya, ọ ga-ekpochapụ ajọ omume ma guzobe ụwa ọhụrụ nke ezi omume. (2 Pita 3:13) Ndị mbụ ga-enweta ahụmahụ nke ụbọchị iwe Chineke ga-abụ chọọchị dị iche iche nke Krisendọm. Ọbụna dị ka Chineke na-anapụtaghị ụlọ nsọ nke ya dị na Jerusalem n’aka eze Babilọn, otú ahụ ka ọ na-agaghịkwa anapụta òtù okpukpe dị iche iche kwuworo ihe ndị na-ezighị ezi megide ya. Chineke ga-etinye ya n’ime obi nke ndị òtù Mba Ndị Dị n’Otu ibibi Krisendọm na ụdị nile ọzọ nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:16, 17) “Ma Mụ onwe m kwa,” ka Jehova na-ekwu, “anya m agaghị enwe ebere, M gaghị enwekwa ọmịiko, ụzọ ha ka M ga-etinyekwasị n’isi ha.”—Ezikiel 9:5, 10.
6. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka e si akwali Ndịàmà Jehova igosi ọmịiko?
6 Mgbe oge ka dị, Ndịàmà Jehova nọgidere na-egosi ọmịiko maka ndị agbata obi ha site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi nzọpụta nke Chineke. Dịkwa ka e si kee mmadụ, mgbe o kwere mee, ha na-enyekwara ndị nọ ná mkpa ihe nkịtị aka. Otú ọ dị, n’akụkụ nke a, ibu ọrụ mbụ ha nwere bụ ilekọta mkpa nke ndị òtù ezinụlọ ha chiri anya na ndị ezinụlọ nke okwukwe ha. (Ndị Galetia 6:10; 1 Timoti 5:4, 8) Ọtụtụ ọrụ enyemaka nke Ndịàmà Jehova na-arụ n’ihi ndị kwere ekwe ibe ha bụ́ ndị ụdị ọdachi dị iche iche dakwasịworo abụwo ihe atụ nke ọmịiko ndị dị ịrịba ama. Ka o sina dị, ọ dịghị mkpa na ndị Kraịst ga-echere ruo mgbe ọnọdụ dị njọ tupu ha egosi ọmịiko dị nro. Ha na-egosipụta àgwà nke a ngwa ngwa n’ịnagide ọnọdụ ọma na nke ọjọọ nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị.
Akụkụ nke Mmadụ Ọhụrụ Ahụ
7. (a) Ná Ndị Kọlọsi 3:8-13, olee otú e si jikọta ọmịiko na mmadụ ọhụrụ ahụ? (b) Gịnị ka mmetụta ịhụnanya na-eme ka ọ dịrị ndị Kraịst mfe karị ime?
7 Ọ bụ eziokwu na ọdịdị mmadụ anyị nke na-emehie emehie na mmetụta ọjọọ nke ụwa Setan bụ ihe mgbochi nye anyị ịbụ ndị nwere ọmịiko dị nro. Ọ bụ nke ahụ mere Bible ji na-agba anyị ume ịtụpụ “iwe, ọnụma, obi ọjọọ, nkwulu, ikwu okwu ihere.” Kama nke ahụ a na-adụ anyị ọdụ ‘iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ’—àgwà nke kwekọrọ n’onyinyo Chineke. Nke mbụ, a na-enye anyị iwu iyikwasị onwe anyị “obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” Bible gosiziri anyị ụzọ dị irè a pụrụ isi gosipụta àgwà ndị a. “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.” Ọ dị mfe karị ịdị na-agbaghara ma ọ bụrụ na anyị azụlitewo “obi ebere” maka ụmụnna anyị.—Ndị Kọlọsi 3:8-13.
8. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa inwe mmụọ mgbaghara?
8 N’aka nke ọzọ, egosighị mgbaghara ọmịiko na-etinye mmekọrịta nke anyị na Jehova n’ihe ize ndụ. Jisọs gosiri nke a n’ụzọ siri ike n’ilu ya nke ohu ahụ na-adịghị agbaghara, nke onye nwe ya tinyere n’ụlọ mkpọrọ “ruo mgbe ọ ga-akwụghachi ụgwọ nile o ji.” Mmeso a kwesịrị ohu ahụ n’ihi na n’ụzọ na-eju anya o gosighị ọmịiko n’ebe ohu ibe ya nọ bụ́ onye rịọrọ ka o meere ya ebere. Jisọs mechiri ilu ahụ site n’ikwu, sị: “Otú a ka Nna m nke eluigwe ga-emekwa unu, ọ bụrụ na unu agbagharaghị, onye ọ bụla mmehie nwanne ya, site n’obi unu.”—Matiu 18:34, 35.
9. Olee otú e si jikọta ọmịiko na akụkụ kasị mkpa nke mmadụ ọhụrụ ahụ?
9 Inwe ọmịiko dị nro bụ akụkụ dị mkpa nke ịhụnanya. Ịhụnanya bụkwa akara e ji amata ezi Iso Ụzọ Kraịst. (Jọn 13:35) Ya mere, nkọwa Bible nyere mmadụ ọhụrụ ahụ si otú a mechie: “N’elu ihe ndị a nile yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ́ ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsi 3:14.
Anya Ụfụ—Ihe Na-egbochi Ọmịiko
10. (a) Gịnị pụrụ ime ka ekworo gbanye mkpọrọgwụ n’ime obi anyị? (b) Mkpụrụ ọjọọ dịgasị aṅaa pụrụ isi n’ekworo pụta?
10 N’ihi ọdịdị mmadụ anyị na-emehie emehie, mmetụta nke anya ụfụ pụrụ ịgbanye mkpọrọgwụ n’ime obi anyị n’ụzọ dị mfe. A pụrụ iji nkà ọnatara chi ma ọ bụ ihe onwunwe ndị anyị na-enweghị gọzie nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị. Ma ọ bụkwanụ ma eleghị anya mmadụ anatawo ngọzi ime mmụọ na ihe ùgwù ndị pụrụ iche. Ọ bụrụ na anyị enweere ndị dị otú ahụ anya ụfụ, ànyị ga-enwe ike iji ọmịiko dị nro na-emeso ha ihe? Ee e, ma eleghị anya. Kama nke ahụ, mmetụta nke ekworo pụrụ imesịa gosipụta onwe ha n’okwu nkatọ ma ọ bụ omume obi ọjọọ, n’ihi na Jisọs kwuru banyere ụmụ mmadụ, sị: “Ọnụ ya na-ekwu okwu site n’ihe nke obi nwebigara ókè.” (Luk 6:45) Ndị ọzọ pụrụ ịkwado nkatọ dị otú ahụ. A pụrụ isi otú a mebie udo nke ezinụlọ ma ọ bụ nke ọgbakọ ndị Chineke.
11. Olee otú ụmụnne iri nke Josef si kpapụ ọmịiko n’ime obi ha, gịnịkwa si n’ime ya pụta?
11 Tụlee ihe mere n’otu ezinụlọ buru ibu. Ụmụ iri Jekọb ndị kasị mee okenye zụlitere ekworo maka nwanne ha nwoke nke nta bụ́ Josef n’ihi na ọ bụ onye nna ha hụkarịsịrị n’anya. Dị ka ihe si n’ime ya pụta, “ha apụghịkwa ịgwa ya okwu n’udo.” Ka e mesịrị, e ji nrọ ndị sitere n’aka Chineke gọzie Josef, na-anwapụta na o nwere ihu ọma Jehova. Nke a mere ụmụnne ya ndị nwoke ji “kpọọ ya asị ọzọ karị.” N’ihi na ha efopụghị ekworo n’obi ha, ọ kpapụrụ ọmịiko ma duje ná mmehie dị oké njọ.—Jenesis 37:4, 5, 11.
12, 13. Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe mmetụta nke ekworo batara n’ime obi anyị?
12 N’obi ịta mmiri, ha renyere Josef n’ohu. Ná mgbalị iji kpuchie njehie ha, ha ghọgburu nna ha iche na anụ ọhịa egbuworị Josef. Ọtụtụ afọ ka e mesịrị mmehie ha pụtara ìhè mgbe ụnwụ nri manyere ha ije Ijipt ịzụta ihe oriri. Onye nlekọta ihe oriri ahụ, bụ́ onye ha na-amataghị na ọ bụ Josef, boro ha ebubo ịbịa nledo wee gwa ha ka ha ghara ịchọ enyemaka ya ọzọ nanị ma hà dutere nwanne ha nwoke nke ikpeazụ, bụ́ Benjamin. Ka ọ dị ugbu a Benjamin aghọwo onye nna ha hụkarịsịrị n’anya, ha makwaara na Jekọb agaghị achọ ịhapụ ya ka o jee.
13 Ya mere ka ha na-eguzo n’ihu Josef, akọ na uche ha kwaliri ha ikweta, sị: “N’ezie ndị ikpe maworo banyere nwanne anyị [Josef] ka anyị bụ, n’ihi na anyị hụrụ mkpagbu nke mkpụrụ obi ya, mgbe ọ na-arịọ anyị arịrịọ amara, ma anyị anụghị; n’ihi ya ka mkpagbu a bịakwasịworo anyị.” (Jenesis 42:21) Site ná mmeso ọmịiko ya ma bụrụ nke guzosiri ike, Josef nyeere ụmụnne ya aka igosipụta izi ezi nke nchegharị ha. Mgbe ahụ ka o kpugheere ha onye ọ bụ ma were amara gbaghara ha. E weghachiri ịdị n’otu ezinụlọ. (Jenesis 45:4-8) Dị ka ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịmụta ihe site na nke a. N’ịmata ihe ọjọọ ndị na-esite n’inwe anya ụfụ, anyị kwesịrị ikpegara Jehova ekpere maka enyemaka n’iji “obi ebere” dochie anya mmetụta ekworo.
Ihe Ndị Ọzọ Na-egbochi Ọmịiko
14. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zere ịbụ ndị e kpughere n’ụzọ na-adịghị mkpa nye ime ihe ike?
14 Ihe mgbochi ọzọ dị na anyị inwe ọmịiko pụrụ ịbịa site n’ịdị na-ekpughe onwe anyị n’ụzọ na-adịghị mkpa nye ime ihe ike. Egwuregwu na ntụrụndụ ndị na-egosi ime ihe ike na-akwalite agụụ ịkwafu ọbara. N’oge Bible, ndị ọgọ mmụọ na-ekiri asọmpi nke ndị ji mma na-eme egwuregwu na ụdị ịta mmadụ ahụhụ ndị ọzọ n’ụzọ chiri anya n’ámá egwuregwu dị iche iche nke Alaeze Ukwu Rom. Ụdị ntụrụndụ dị otú ahụ, dị ka otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, “bibiri mmetụta nke ebere maka ịta ahụhụ nke na-eme ka mmadụ dị iche pụọ n’anụ ọhịa.” Ihe dị ukwuu ná ntụrụndụ nke ụwa nke oge a nwere otu ụdị mmetụta ahụ. Ọ dị ndị Kraịst, bụ́ ndị na-agbalịsi ike inwe ọmịiko dị nro, mkpa ịbụ ndị na-eme nhọrọ n’ụzọ dị ukwuu n’ụdị ihe ọgụgụ, ihe nkiri, na usoro ihe omume TV, ndị ha na-ahọrọ. N’ụzọ amamihe ha na-eburu okwu ndị ahụ nke Abụ Ọma 11:5 n’uche: “Onye na-ahụ ihe ike n’anya ka [Jehova] na-akpọ asị.”
15. (a) Olee otú mmadụ pụrụ isi gosipụta ajọ ụkọ nke ọmịiko? (b) Olee otú ezi ndị Kraịst si azaghachi n’ebe mkpa nke ndị kwere ekwe ibe ha na ndị agbata obi dị?
15 Onye na-eche nanị banyere onwe ya yikarịkwara ka ọ gaghị enwe ọmịiko. Nke a siri ike, dị ka Jọn onyeozi na-akọwa, sị: “Onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa nke a o ji biri, nke hụkwara nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa, o wee mechigide ya obi ebere ya, ịhụnanya Chineke si aṅaa dịgide n’ime ya?” (1 Jọn 3:17) Onye nchụàjà ahụ bụ́ onye ezi omume n’anya onwe ya na onye Livaị dị n’ilu Jisọs banyere onye Sameria nwere omume onye agbata obi gosiri ụdị enweghị ọmịiko dị otú ahụ. Mgbe ha hụrụ ọnọdụ ọjọọ nke nwanne ha nwoke bụ́ onye Juu nọ n’ọnọdụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma, ndị a gafere n’akụkụ nke ọzọ nke ụzọ ahụ ma gawara onwe ha. (Luk 10:31, 32) N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ndị Kraịst nwere ọmịiko na-azaghachi ngwa ngwa ná mkpa anụ ahụ na nke ime mmụọ nke ụmụnna ha. Dịkwa ka onye Sameria ahụ dị n’ilu Jisọs, ha na-enwekwa nchegbu banyere mkpa nke ndị ha na-amaghị mbụ. Otú a ha na-eji ọṅụ enye oge, ike, na ihe onwunwe ha iji mee ka ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ahụ gaa n’ihu. N’ụzọ dị otú a ha na-atụnye ụtụ ná nzọpụta nke ọtụtụ nde mmadụ.—1 Timoti 4:16.
Ọmịiko Maka Ndị Na-arịa Ọrịa
16. Ihe mgbochi dịgasị aṅaa ka anyị na-ezute n’ime ihe banyere ọrịa?
16 Ọrịa bụ òkè nke ihe a kpọrọ mmadụ na-ezughị okè nke na-anwụ anwụ ketara. Ndị Kraịst adịghị iche, ihe kakwa n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha abụghị ndị ọkachamara na nkà ime ọgwụ, ha apụghịkwa ịrụ ọrụ ebube dị ka ụfọdụ ndị Kraịst oge gboo rụrụ bụ́ ndị natara ike dị otú ahụ site n’aka Kraịst na ndị ozi ya. Site n’ọnwụ ndị ozi Kraịst na ndị ha na ha mekọrọ ihe kpọmkwem, ụdị ike ọrụ ebube dị otú ahụ gabigara. Ya mere a kpaara ike anyị nwere ókè inyere ndị na-arịa ọrịa anụ ahụ aka, gụnyere arụzighị ọrụ nke ụbụrụ na ịhụ na ịnụ ihe ndị na-adịghị adị.—Ọrụ 8:13, 18; 1 Ndị Kọrint 13:8.
17. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ụzọ e si mesoo nwoke ahụ na-arịa ọrịa nke mmadụ nwụnahụkwara bụ́ Job?
17 Ịda mbà n’obi na-esochikarị ọrịa. Dị ka ihe atụ, Job na-atụ egwu Chineke dara mbà n’obi nke ukwuu n’ihi ọrịa siri ike na ọdachi dị iche iche Setan tụkwasịrị ya. (Job 1:18, 19; 2:7; 3:3, 11-13) Ọ dị ya mkpa inwe ndị enyi ga-eji ọmịiko dị nro mesoo ya na ndị ga-ekwu okwu n’ụzọ ‘ngụgụ.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Kama nke ahụ, mmadụ atọ sị na ha bụ ndị nkasi obi letara ya ma ruo ná nkwubi okwu ndị na-ezighị ezi ngwa ngwa. Ha mere ka ọnọdụ ịda mbà n’obi nke Job ka njọ site n’ịtụ aro na ọdachi ya dị iche iche bụ n’ihi mmejọ ya ụfọdụ. N’ịbụ ndị nwere ọmịiko dị nro, ndị Kraịst ga-ezere ịdaba n’otu ụdị ọnyà ahụ mgbe ndị kwere ekwe ibe ha na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee ịda mbà n’obi. Mgbe ụfọdụ, isi ihe dị ndị dị otú ahụ mkpa bụ nleta obi ọma ole na ole nke ndị okenye ma ọ bụ ndị Kraịst ndị ọzọ tozuru okè bụ́ ndị ga-eji ọmịiko ṅaa ntị, gosi nghọta, ma nye ndụmọdụ ịhụnanya sitere n’Akwụkwọ Nsọ.—Ndị Rom 12:15; Jemes 1:19.
Ọmịiko Maka Ndị Na-adịghị Ike
18, 19. (a) Olee otú ndị okenye kwesịrị isi mesoo ndị na-adịghị ike ma ọ bụ ndị na-ehie ụzọ? (b) Ọbụna a sị na ọ dị mkpa iguzobe kọmitii ikpe, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị okenye jiri ọmịiko dị nro mesoo ndị mere ihe ọjọọ?
18 Ndị okenye karịsịa aghaghị inwe ọmịiko dị nro. (Ọrụ 20:29, 35) “Anyị, bụ́ ndị nwere ike, anyị aghaghị ibu adịghị ike nile nke ndị na-enweghị ike,” ka Bible nyere n’iwu. (Ndị Rom 15:1) N’ịbụ ndị na-ezughị okè, anyị nile na-emejọ ihe. (Jemes 3:2) A chọrọ ịdị nro n’imeso onye “nọ ná ndahie.” (Ndị Galetia 6:1) Ọ dịghị mgbe ndị okenye ga-achọ ịdị ka ndị Farisii ahụ bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha bụ́ ndị na-ejighị ezi uche eme ihe ná ntinye ha na-etinye Iwu Chineke n’ọrụ.
19 N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ndị okenye na-agbaso ihe nlereanya ọmịiko dị nro nke Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Ọrụ ha bụ́ isi bụ ịzụ, ịgba ume, na inye atụrụ Chineke ume ọhụrụ. (Aịsaịa 32:1, 2) Kama ịgbalị iji ọtụtụ ụkpụrụ iwu chịkwaa ihe, ha na-echigharịkwuru ụkpụrụ ọma ndị dị n’ime Okwu Chineke. N’ihi ya, ọrụ ndị okenye kwesịrị ịbụ iwuli elu, iweta n’obi ụmụnna ha ọṅụ na ekele maka ịdị mma Jehova. Ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe ha emee ntakịrị mmejọ ụfọdụ, onye okenye dị ka ọ na-adịkarị ga-ezere inye ya mgbazi n’ebe ndị ọzọ ga-anụ ya. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ikwudi okwu, mmetụta nke ọmịiko dị nro ga-akpali onye okenye ahụ ịkpọpụ onye ahụ n’akụkụ ma kwurịta nsogbu ahụ n’ebe ndị ọzọ na-agaghị anụ ya. (Tụlee Matiu 18:15.) N’agbanyeghị otú mmadụ siruru n’ike iso mekọọ ihe, otú onye okenye ahụ ga-esi kwuo okwu kwesịrị ịbụ n’ụzọ ndidi na nke enyemaka. Ọ dịghị mgbe ọ ga-achọ ịchọ ihe ọ ga-ejide aka iji chụpụ onye dị otú ahụ n’ọgbakọ. Ọbụna mgbe ọ dị mkpa ka e guzobe kọmitii ikpe, ndị okenye ga-egosi mmetụta ọmịiko dị nro n’imeso onye ahụ tinyere aka ná mmehie dị oké njọ. Ịdị nro ha pụrụ inye aka ime ka onye ahụ nwee nchegharị.—2 Timoti 2:24-26.
20. Olee mgbe ngosipụta ọmịiko nke mmetụta uche na-ekwesịghị ekwesị, n’ihi gịnịkwa?
20 Otú ọ dị, e nwere mgbe ụfọdụ mgbe ohu Jehova na-apụghị igosi ọmịiko. (Tụlee Deuterọnọmi 13:6-9.) Onye Kraịst ‘ịghara’ iso enyi ma ọ bụ onye ikwu nke dị ezi nso bụ́ onye a chụpụworo n’ọgbakọ ‘mekọọ ihe’ pụrụ ịbụ ezigbo ule. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ dị mkpa ka mmadụ ghara ikwenyere mmetụta nke obi ebere. (1 Ndị Kọrint 5:11-13) Nguzosi ike dị otú ahụ pụrụ ọbụna ịgba onye ahụ na-ehie ụzọ ume ichegharị. Ọzọkwa, n’imeso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe mmadụ, ndị Kraịst aghaghị izere ngosipụta ọmịiko ndị na-ekwesịghị ekwesị ndị pụrụ iduje ná mmekọahụ rụrụ arụ.
21. N’akụkụ ndị ọzọ dịgasị aṅaa ka ọ dị anyị mkpa igosi ọmịiko dị nro, gịnịkwa bụ abamuru ya?
21 Ohere adịghịrị anyị ịtụle ọtụtụ akụkụ nile ebe ndị a chọrọ mmetụta ọmịiko dị nro—n’imeso ndị agadi, ndị mmadụ nwụnahụrụ, ndị na-enweta mkpagbu site n’aka ndị di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe. E kwesịkwara n’otu aka ahụ iji ọmịiko dị nro mesoo ndị okenye na-arụsi ọrụ ike. (1 Timoti 5:17) Kwanyere ha ùgwù, nyekwa ha nkwado. (Ndị Hibru 13:7, 17) “Unu nile . . . bụrụnụ . . . ndị nwere obi ọmịiko,” ka Pita onyeozi dere. (1 Pita 3:8) Site n’ime omume n’ụzọ dị otú a n’ọnọdụ nile ndị chọrọ ya, anyị na-akwalite ịdị n’otu na obi ụtọ n’ọgbakọ ma na-adọta ndị nọ n’èzí n’ebe eziokwu ahụ dị. Karịsịa, anyị si otú a na-asọpụrụ Nna anyị nke nwere ọmịiko dị nro, bụ́ Jehova.
Ajụjụ ná Ntụleghachi
◻ Olee otú Jehova si egosi ọmịiko maka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa inwe ọmịiko dị nro?
◻ Gịnị bụ ihe mgbochi ụfọdụ dị n’anyị inwe ọmịiko dị nro?
◻ Olee otú anyị kwesịrị isi mesoo ndị ọrịa na ndị dara mbà n’obi?
◻ Olee ndị karịsịa ka ọ dị mkpa inwe ọmịiko dị nro, n’ihi gịnịkwa?
[Igbe dị na peeji nke 19]
NDỊ FARISII NA-ENWEGHỊ ỌMỊIKO
E ZUBERE ụbọchị Sabat ahụ nke ezumike ịbụrụ ndị Chineke ngọzi ime mmụọ na nke anụ ahụ. Otú ọ dị, ndị ndú okpukpe ndị Juu mere ọtụtụ ụkpụrụ iwu ndị merụrụ iwu Sabat nke Chineke ma mee ka ọ bụrụ ibu nye ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla enwee ihe ọghọm ma ọ bụ ọrịa, ọ pụghị ịnata enyemaka n’ụbọchị Sabat ọ gwụla ma ndụ ya ọ nọ n’ihe ize ndụ.
Ụfọdụ ndị Farisii kwụsiri ike ná nkọwa nke ha nke iwu Sabat nke na ha sịrị: “Mmadụ adịghị akasi ndị na-eru újú obi, ma ọ bụkwanụ leta ndị ọrịa n’ụbọchị Sabat.” Ndị ndú okpukpe ndị ọzọ nyere ohere maka nleta ndị dị otú ahụ n’ụbọchị Sabat ma tụpụta iwu: “A machibidoro anya mmiri.”
Ya mere, n’ụzọ ziri ezi Jisọs mara ndị ndú okpukpe ndị Juu ikpe n’ihi ileghara ihe ndị ka mkpa Iwu ahụ chọrọ anya, ndị dị ka ikpe ziri ezi, ịhụnanya, na ebere. Ka a sịkwa ihe mere o ji gwa ndị Farisii ahụ, sị: “[Unu] na-eme okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu site n’ozizi e nyere unu n’aka idebe”!—Mak 7:8, 13; Matiu 23:23; Luk 11:42.
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Na 231 ala Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ ọmịiko a na-arụtụbeghị ihe yiri ya n’ebe obibi ndị mmadụ, n’okporo ámá, ọbụna n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche
[Foto dị na peeji nke 18]
Mkpughepụ nye ime ihe ike, dị ka nke a na-eme na TV, na-emebi ọmịiko dị nro