Ịmụba Òtù Na-achị Isi
IJI welite ọnụ ọgụgụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, na-amalite July 1, 1994, e tinyewo onye ọzọ isonyere ndị okenye 11 na-eje ozi ugbu a. Onye ọhụrụ ahụ bụ Gerrit Lösch.
Nwanna Lösch banyere n’ije ozi oge nile na November 1, 1961, gụsịakwa akwụkwọ na klasị nke 41 nke ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead. O jere ozi n’ọrụ sekit na distrikti n’Austria malite 1963 ruo 1976. Ọ lụrụ nwanyị na 1967, ya na nwunye ya, Merete, mesịkwara jee ozi ruo afọ 14 dị ka ndị òtù ezinụlọ Betel nke Austria na Vienna. Afọ anọ gara aga e zigara ha n’isi ụlọ ọrụ Society dị na Brooklyn, New York, ebe Nwanna Lösch jeworo ozi n’Ụlọ Ọrụ Nduzi nakwa dị ka onye inyeaka nke Kọmitii Ije Ozi. N’ihi ahụmahụ ya dị iche iche n’ubi Europe na ya ịma asụsụ German, Bekee, Romanian, na Italian, ọ ga-etinye ihe bara uru n’ọrụ Òtù Na-achị Isi.