Jehova Mere Ka Ọ Nara Amara nke Ukwuu
“EKELE, gị onye Chineke meworo ka ị nara amara, Onyenwe anyị nọnyere gị.” Lee aha ekele nke ahụ bụ! Ọ dịghị onye ọzọ kwuru ya ma ọ bụghị mmụọ ozi Gebriel. Ọ na-agwa nwa agbọghọ dị umeala n’obi—Meri, nwa nwanyị nke otu nwoke aha ya bụ Heli—okwu. Afọ o mere bụ 3 T.O.A., ebe o mekwara bụ obodo Nazaret.—Luk 1:26-28.
E kwere Meri ná nkwa ọlụlụ nye Josef onye na-akwa nkà. Dị ka iwu na omenala ndị Juu si dị, e lere ya anya dị ka nwunye ọ lụrụ alụ. (Matiu 1:18) Dị ka Meri, o sitere n’ọnọdụ dị ala ná ndụ. Mgbe ahụ, n’ihi gịnị ka mmụọ ozi ahụ ji kelee ya dị ka onye e mere ka ọ nara amara dị ukwuu?
Ihe Ùgwù Ya Dị Ebube
Gebriel kwukwasịrị: “Atụla egwu, Meri: n’ihi na Chineke meere gị amara. Leekwa, ị ga-atụrụ ime, mụta Nwa nwoke, kpọọ aha Ya Jisọs. Nwa nwoke ahụ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa Ya Ọkpara nke Onye kachasị ihe nile elu: Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa Ya ocheeze nna Ya, Devid: Ọ ga-abụkwa eze ụlọ Jekọb ruo mgbe nile ebighị ebi; alaeze Ya agaghị agwụkwa agwụ.”—Luk 1:29-33.
N’iju anya na n’ịbụ onye ihe riri ọnụ, Meri jụrụ, sị: “Ihe a ga-esi aṅaa mee, ebe ọ dịghị nwoke m maara?” Gebriel zara, sị: “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe nile elu ga-ekpuchikwa gị: n’ihi nke a Ihe dị nsọ nke ị dị ime Ya, a ga-akpọ Ya Ọkpara Chineke.” Iji wepụ ihe ịrụ ụka ọ bụla, mmụọ ozi ahụ gbakwụnyere: “Leekwa, Elizabet onye ikwu gị, ya onwe ya, atụrụwokwa ime nwa nwoke n’agadi ya: nke a bụkwa ọnwa nke isii ya, bụ́ onye a na-akpọ nwanyị àgà. N’ihi na ọ dịghị okwu ọ bụla si Chineke n’ọnụ pụta nke na-agaghị adị irè.”—Luk 1:34-37.
Meri nakweere ihe ùgwù nke a dị ebube nke ije ozi ozugbo. N’obi dị ọkụ, ma n’obi umeala, ọ zaghachiri, sị: “Lee, abụ m ohu nwanyị nke Onyenwe anyị; ya dịrị m ka okwu gị si dị.” Mgbe ahụ, Gebriel hapụrụ ya. Meri ji ọsọ gbaga n’obodo ukwu dị n’ógbè ugwu ugwu nke Juda. Ka ọ na-erute n’ụlọ Zakaraịas onye nchụàjà na nwunye ya, Elizabet, ọ hụrụ ọnọdụ kpọmkwem dị ka mmụọ ozi ahụ kọwara ha. Lee ka ọṅụ si jupụta Meri n’obi! Ihe juru ya ọnụ bụ okwu otuto nye Jehova.—Luk 1:38-55.
Ọ Ghọọ Nwunye Josef
Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke gaje ịmụpụta Jisọs n’anụ ahụ, n’ihi na e buru ọmụmụ nwa dị otú ahụ n’amụma. (Aịsaịa 7:14; Matiu 1:22, 23) Ma gịnị mere e ji chọọ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke e kweworo ná nkwa ọlụlụ? Iji mee ka e nwee nna nkuchi nke pụrụ inye nwa ahụ ikike iwu kwadoro inweta ocheeze nke Eze Devid. Ma Josef ma Meri sicha n’agbụrụ Juda, ha bụchakwa ụmụ Eze Devid. Ya mere a ga-eguzobe ikike inweta ocheeze nke Jisọs okpukpu abụọ. (Matiu 1:2-16; Luk 3:23-33) Nke a mere mmụọ ozi ahụ ji mesịa mesie Josef obi ike na o kwesịghị ịla azụ n’ịnara Meri dị ka nwunye ya iwu kwadoro, ọ bụ ezie na ọ dị ime.—Matiu 1:19-25.a
Iwu ịtụ ụtụ isi Augustus Caesar mara mere ka ọ dị Josef na Meri mkpa idebanye aha ha n’akwụkwọ na Betlehem. Ka ha nọ n’ebe ahụ, ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. Ndị na-azụ atụrụ bịara ịhụ nwa ọhụrụ ahụ, ha tokwara Nna ya, bụ́ Jehova. Mgbe 40 ụbọchị nke ime ka a dị ọcha bụ́ nke a chọrọ n’Iwu Mosis gasịrị, Meri gara n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem ije nye ihe mkpuchi maka mmehie ya. (Levitikọs 12:1-8; Luk 2:22-24) Ee, ebe ọ bụ na a tụghị ime Meri n’enweghị mmehie, ya mere o nwereghị onwe ya pụọ ná ntetọ nke mmehie, a ghaghị ikpuchi ezughị okè ndị o nwetara site n’ọmụmụ site n’ịchụ àjà mkpuchi mmehie.—Abụ Ọma 51:5.
Ka Meri na Josef nọ n’ụlọ nsọ ahụ, Simeọn meworo okenye na onye amụma nwanyị bụ́ Ana meworo agadi nwere ihe ùgwù nke ịhụ Ọkpara Chineke ahụ. Ọ bụghị Meri ka e lekwasịrị anya. (Luk 2:25-38) E mesịa, Ndị Na-agụ Kpakpando kpọrọ isiala ọ bụghị nye ya kama nye Jisọs.—Matiu 2:1-12.
Mgbe ha gbalagasịrị Ijipt ma nọgide n’ebe ahụ ruo mgbe Herọd nwere obi ọjọọ nwụrụ, nne na nna Jisọs laghachiri ma biri n’obodo nta bụ́ Nazaret. (Matiu 2:13-23; Luk 2:39) Ọ bụ n’ebe ahụ ka Josef na Meri zụlitere Jisọs n’okpuru ọnọdụ ezinụlọ nke ndị na-atụ egwu Chineke.
Meri Nwere Ụmụaka Ndị Ọzọ
Ka oge na-aga, Meri na Josef mere ka Jisọs nwee ụmụnne nwoke na nwanyị n’anụ ahụ. Mgbe ozi Jisọs wetara ya n’obodo ya bụ́ Nazaret, ndị ya na ha maara mgbe ọ bụ nwata matara onye ọ bụ. “Nwoke a, ọ́ bụghị Nwa onye ọkà anyị?” ka ha jụrụ. “Á dịghị akpọ nne Ya Meri? na ụmụnne Ya ndị ikom, Jemes, na Josef, na Saịmọn, na Judas? Na ụmụnne Ya ndị inyom, hà nile anọghị n’etiti anyị?” (Matiu 13:55, 56) Ndị Nazaret na-ezo aka n’ezinụlọ anụ ahụ nke Josef na Meri, gụnyere ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị ha maara dị ka ụmụnne nwoke na nwanyị Jisọs n’anụ ahụ.
Ụmụnne nwoke na nwanyị ndị a abụghị ụmụnne nne ma ọ bụ nna Jisọs. Ha abụghịkwanụ ndị na-eso ụzọ ya, ma ọ bụ ụmụnne nwoke na nwanyị n’ime mmụọ, n’ihi na Jọn 2:12 na-egosi ọdịiche doro anya n’etiti ìgwè abụọ ahụ site n’ikwu, sị: “Ọ [Jisọs] rịdara Kapanaum, Ya onwe ya, na nne Ya, na ụmụnne Ya, na ndị na-eso ụzọ Ya.” Ọtụtụ afọ n’ihu na Jerusalem, Pọl onyeozi hụrụ Sifas, ma ọ bụ Pita, ma gbakwụnye, sị: “Ahụghị m nke ọ bụla ná ndị ozi ndị ọzọ; ahụrụ m nanị Jemes, nwanne Onyenwe anyị.” (Ndị Galetia 1:19, The Jerusalem Bible) Ọzọkwa, okwu ahụ bụ na Josef ‘amaghịkwa Meri ruo mgbe ọ mụpụtara Nwa nwoke’ na-egosi na nna kuchiri Jisọs so ya nwee mmekọahụ mgbe e mesịrị wee bụrụ nna nye ụmụ ya ndị ọzọ. (Matiu 1:25) N’ihi ya, Luk 2:7 kpọrọ Jisọs “nwa nwoke mbụ” ya.
Nne nke Na-atụ Egwu Chineke
Dị ka nne nke na-atụ egwu Chineke, Meri so Josef rụkọọ ọrụ n’inye ụmụ ya ntụziaka n’ezi omume. (Ilu 22:6) Na ọ bụ onye ji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ ka a pụrụ ịhụta n’okwu ya bara ụba n’ihe ime mmụọ mgbe Elizabet kelere ya. N’oge ahụ nne Jisọs kwughachiri echiche ndị dị n’abụ Hana ma gosipụta ihe ọmụma nke abụ ọma, ihe odide ndị nke akụkọ ihe mere eme na ndị nke amụma, na akwụkwọ dị iche iche nke Mosis. (Jenesis 30:13; 1 Samuel 2:1-10; Ilu 31:28; Malakaị 3:12; Luk 1:46-55) Meri eburuwo ihe ndị mere eme na okwu dị iche iche nke amụma n’isi, were ha n’ihe dị oké ọnụ ahịa n’obi ya, tụgharịakwa uche na ha. Ya mere o jikeere ejikere nke ọma ikere òkè n’inye nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs ntụziaka nke ndị nne na nna.—Luk 2:19, 33.
Jisọs e ziri ihe nke ọma onye dị afọ 12 na-egosipụta ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ nke na-atụ ndị gụrụ akwụkwọ n’ụlọ nsọ ahụ n’anya. N’ihi na ya na ndị mụrụ ya anọkwaghị n’oge Ememe Ngabiga ahụ, nne ya sịrị: “Nwa m, Gịnị mere I meso anyị otú a? lee, nna Gị na mụ onwe m na-achọ Gị n’obi ụfụ.” Jisọs zaghachiri, sị: “Gịnị mere unu na-achọ m? ùnu amataghị na aghaghị m ịdị n’ihe nke Nna m?” N’enweghị ike ịghọta ihe nzaghachi nke a pụtara, Meri tinyere ya n’obi ya. Ka ha laghachiri Nazaret, Jisọs “na-aga n’ihu n’amamihe na ogologo, na-agakwa n’amara n’ebe Chineke na mmadụ nọ.”—Luk 2:42-52.
Meri dị ka Onye Na-eso Ụzọ Jisọs
Lee ka o si kwesị ekwesị na Meri ga-emesị ghọọ onye na-eso ụzọ Jisọs nke tinyere obi ya n’ọrụ! Ọ dị obi umeala, gharakwa inwe oké ọchịchọ ọ bụla nke ịghọ onye a ma ama n’agbanyeghị ọrụ pụrụ iche Chineke nyere ya. Meri maara Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na i nyochaa ya n’onwe gị, ị gaghị ahụ ka a kọwara ya dị ka onye nwere ìhè halo, na-anọdụ n’elu ocheeze dị ka “nne bụ́ eze nwanyị” na onye jupụtara ná mgbukepụ nke ebube Kraịst. Kama nke ahụ, ị ga-ahụ ya n’akụkụ na-apụtaghị ìhè ma ọlị, n’abụghị onye a ma ama.—Matiu 13:53-56; Jọn 2:12.
Jisọs gbochiri mbilite nke ihe ọ bụla dị ka ikpere Meri n’etiti ụmụazụ ya. Ka ọ na-ekwu okwu n’otu oge, “otu nwanyị site n’ìgwè mmadụ ahụ tiri mkpu sị, ‘Ngọzi na-adịrị akpa nwa buru gị na ara nke nyere gị nri!’ ‘Kama nke ahụ,’ ka ọ zaghachiri, ‘ngọzi na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke na-edebekwa ya.’” (Luk 11:27, 28, The New American Bible, nke ndị Òtù Bible Katọlik nke America sụgharịrị) N’otu oriri agbamakwụkwọ, Jisọs gwara Meri, sị: “Nwanyị, gịnị ka Mụ na gị nwekọrọ? oge hour nke m a ka abịarughị.” (Jọn 2:4) Nsụgharị ndị ọzọ na-agụ, sị: “Hapụrụ m okwu ahụ.” (Weymouth) “Anwala ịtụziri m ihe.” (An American Translation) Ee, Jisọs sọpụụrụ nne ya, ma o feghị ya ofufe.
Ihe Ùgwù Ebighị Ebi Dị Iche Iche
Lee oké ihe ùgwù ndị Meri nwere! Ọ mụrụ Jisọs. E mesịa ọ bụụrụ nwatakịrị ahụ nne, zụọkwa ya. N’ikpeazụ, o gosipụtara okwukwe, na-aghọ onye na-eso ụzọ Kraịst na nwanna ya nwanyị n’ime mmụọ. N’anya ikpeazụ anyị ga-ele Meri site n’Akwụkwọ Nsọ, anyị na-ahụ ya n’ọnụ ụlọ dị n’elu na Jerusalem. Ọ nọ ebe ahụ ya na ndị ozi Jisọs, ụmụ ya ndị ikom ndị ọzọ, na ndị inyom ụfọdụ kwesịrị ntụkwasị obi—ha nile bụcha ndị na-efe Jehova.—Ọrụ 1:13, 14.
Ka oge na-aga, Meri nwụrụ, anụ ahụ ya laghachikwara n’ájá. Dị ka ụmụazụ mbụ ndị ọzọ e tere mmanụ nke nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya, ọ nọrọ n’ụra ọnwụ ruo oge nke Chineke iji kpọlite ya dị ka mmụọ e kere eke na-enwe ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. (1 Ndị Kọrint 15:44, 50; 2 Timoti 4:8) Lee aha obi ụtọ ‘onye nke a e mere ka ọ nara amara nke ukwuu’ na-aghaghị inwe ugbu a n’ihu Jehova Chineke na Jisọs Kraịst!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a À sị na Meri abụghị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ònye gaara achọworị ịlụ ya? Ndị Juu na-esi ọnwụ na nwa agbọghọ aghaghị ịbụ onye na-amaghị nwoke.—Deuterọnọmi 22:13-19; tụlee Jenesis 38:24-26.
[Foto dị na peeji nke 31]
E mere ka Meri nara amara nke ukwuu dị ka nne Jisọs