Nọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe ma Dịrị Ndụ!
“GBAKỤTA Chineke azụ, nwụọ.” Azụ magazin anyị na-egosi nwunye Job, onye ji okwu ndị ahụ wakpo ya. Nke ahụ bụ ihe dị ka 3,600 afọ gara aga. Ma mwakpo ahụ e ji ọnụ wakpo ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi na-eme ka otu ihe iseokwu nke na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu ruo taa pụta ìhè. Job kwesịrị ntụkwasị obi enwewo mfu dị ukwuu—anụ ụlọ ya, ebe obibi ya, ụmụ ya iri. Ugbu a ọrịa dị oké njọ na-ata anụ ahụ ya ahụhụ, na-etinye ya n’ule ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. Gịnị kpatara ya? Onye iro ukwu nke Chineke na mmadụ, bụ́ Setan Ekwensu, na-achọ ịnwapụta otu ihe ịma aka na mmadụ apụghị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke n’okpuru ule siri ike.—Job 1:11, 12; 2:4, 5, 9, 10.
Taa, dị ka n’ụbọchị Job, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” Setan Ekwensu. (1 Jọn 5:19) N’ezie, nke ahụ bụ eziokwu taa ọbụna karị, n’ihi na ugbu a “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi,” ka a chụpụworo site n’eluigwe bịa n’ụwa nke a. (Mkpughe 12:9) Ọ bụ nke a kpatara oké ahụhụ ndị na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti n’oge anyị. Agha Ụwa Mbụ, nke tiwapụrụ na 1914, kara “mmalite ihe mgbu” nke gaworo n’ihu banye n’ime narị afọ nke 20 nke a akara.—Matiu 24:7, 8.
N’ime ụwa ọjọọ nke a, nke rụrụ arụ, ọ̀ dị mgbe ị na-eche na ị bịaruwo ná njedebe nke ọ̀tụ̀tụ̀ ntachi obi mmadụ? Ọ̀ dịwo mgbe ị jụrụ sị, ‘È nwere nzube ọ bụla ná ndụ?’ Ọ pụrụ ịdịworị Job otú ahụ, ma ọ dịghị mgbe ọ tụfuru okwukwe ya n’ebe Chineke nọ, ọ bụ ezie na o mehiere ihe. O kwupụtara mkpebi ya siri ike n’okwu ndị a: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m.” O nwere nchekwube na Chineke ‘ga-amara izu okè ya.’—Job 27:5; 31:6.
Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke n’onwe ya, tachikwara obi n’ule dị iche iche mgbe ọ nọ n’ebe a n’elu ala. Setan lụsoro Jisọs ọgụ n’ụzọ dị iche iche. O ji ohere nke mkpa anụ ahụ Jisọs mee ihe ma lee ndabere Ya n’Okwu Chineke ule, dị ka n’ugwu nke ọnwụnwa ahụ. (Matiu 4:1-11) Ọ majara Jisọs site n’ime ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ahụ si n’ezi ofufe dapụ na ndị ha ghọgbuworo kpagbuo ya, bo ya ebubo ikwulu Chineke, gbaakwa izu igbu ya. (Luk 5:21; Jọn 5:16-18; 10:36-39; 11:57) Ha mere Jisọs ihe dị njọ nke ukwuu karịa otú ndị nkasi obi ụgha atọ ndị ahụ mere Job.—Job 16:2; 19:1, 2.
N’ogige Getsemane, ka Jisọs na-abịaru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ule nke a nso, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ruo ọnwụ.” Mgbe ahụ, o wee “daa kpuchie ihu Ya n’ala, wee kpee ekpere, sị, Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ka iko a gabiga m: ma ọ bụghị dị ka Mụ onwe m na-achọ, kama dị ka Gị onwe gị na-achọ.” N’ikpeazụ, n’elu osisi ịta ahụhụ, n’imezu okwu amụma nke Abụ Ọma 22:1, Jisọs tiri mkpu, sị: “Chineke m, Chineke m, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka Ị hapụrụ nanị Mụ?” Ma Chineke ahapụghị Jisọs ma ọlị n’ihi na Jisọs gosiri mgbe nile iguzosi ike n’ezi ihe zuru okè nye Ya, na-esetịpụrụ ezi ndị Kraịst dum ihe nlereanya ha ga-agbaso. Jehova kwụghachiri iguzosi ike n’ezi ihe Jisọs ụgwọ site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ ma bulie ya elu gaa n’eluigwe kasị elu. (Matiu 26:38, 39; 27:46; Ọrụ 2:32-36; 5:30; 1 Pita 2:21) Chineke ga-akwụghachi ndị ọzọ nile guzosiri ike n’ezi ihe nye ya ụgwọ n’otu aka ahụ.
Ọ bụghị nanị na iguzosi ike n’ezi ihe Jisọs nyere azịza zuru ezu maka ihe ịma aka Setan kamakwa àjà nke ndụ mmadụ ya zuru okè mere ka e nwee mgbapụta, nke ụmụ mmadụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe pụrụ ịdabere na ya iji nweta ndụ ebighị ebi. (Matiu 20:28) Nke mbụ, Jisọs na-achịkọta otu “ìgwè atụrụ nta” e tere mmanụ ndị ga-aghọ ndị nketa ibe ya n’Alaeze eluigwe. (Luk 12:32) Mgbe nke a gasịrị, a na-achịkọta “oké ìgwè mmadụ” ịlanarị “oké mkpagbu ahụ,” isi na ya pụta inweta ndụ ebighị ebi n’ógbè Alaeze Chineke na-achị n’elu ala.—Mkpughe 7:9, 14-17.
Job kwesịrị ntụkwasị obi ga-eso n’etiti ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ ndị a ga-akpọlite mgbe ahụ ịghọ akụkụ nke ọha mmadụ “ụwa ọhụrụ” ahụ dị n’udo. (2 Pita 3:13; Jọn 5:28, 29) Dị ka e gosiri n’azụ magazin anyị, iguzosi ike n’ezi ihe nwere nkwụghachi ụgwọ ya n’ụbọchị Job mgbe Jehova “gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya.” O nwetawo ume ime mmụọ dị ka onye ‘na-ejighị egbugbere ọnụ ya mehie.’ Chineke gbatịkwuru ndụ ya ruo 140 afọ ndị ọzọ. N’ụzọ ihe onwunwe, o nyere Job okpukpu abụọ nke ihe nile o nwere na mbụ, Job “nwekwara ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ ndị inyom atọ,” e lekwara ụmụ ndị inyom ya anya dị ka ndị kasị maa mma n’ala ahụ nile. (Job 2:10; 42:12-17) Ma ihe ịga nke ọma ndị a nile bụ nanị ihe atụ dị nta nke ngọzi ndị ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ga-ama ụtọ ya na Paradaịs nke “ụwa ọhụrụ” ahụ. Ị pụkwara ikere òkè n’ọṅụ ahụ, dị ka peji ndị na-esonụ ga-akọwa!
[Foto dị na peeji nke 4]
Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè dị ka onye na-eguzosi ike n’ezi ihe