N’ihi Gịnị Ka O Ji Bụrụ Oge Ime Mkpebi?
NA NARỊ afọ nke 16 T.O.A., Chineke họọrọ ndị Israel dị ka ‘ihe nke aka ya n’etiti ndị nile, mba dị nsọ.’ (Ọpụpụ 19:5, 6) N’oge na-adịghị anya ha tụfuru ịdị nsọ ha, ịdị ọcha okpukpe ha, na-ekwere ka ikpere arụsị na omume ndị rụrụ arụ nke mba ndị gbara ha agbata obi metọọ ha. Ha si otú a kpughee onwe ha ịbụ “ndị kwesiri olu ike.” (Deuterọnọmi 9:6, 13; 10:16; 1 Ndị Kọrint 10:7-11) N’ime ogologo oge karịrị narị afọ atọ mgbe ọnwụ Joshua gasịrị, Jehova welitere ndị ikpe, bụ́ ndị nduzi kwesịrị ntụkwasị obi ndị kwesịrị iduru ndị Israel laghachi n’ezi ofufe. Otú ọ dị, ndị ahụ “ekweghị ka ihe si n’omume nile ha, ma ọ bụ n’ụzọ ha siri ike, dapụ.”—Ndị Ikpe 2:17-19.
Mgbe nke ahụ gasịrị, Chineke welitere ndị eze na ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi ka ha kpalie ndị ahụ ka ha laghachi n’ezi ofufe. Azaraịa onye amụma gbara Eze Esa na ndị obodo ya ume ka ha chọọ Jehova: “Ọ bụrụkwa na unu achọọ Ya, Ọ ga-eme ka unu chọta Ya; ma ọ bụrụ na unu ahapụ Ya, Ọ ga-ahapụ unu.” Esa rụrụ ọrụ ndozigharị okpukpe n’alaeze Juda. (2 Ihe Emere 15:1-16) N’ihi ya, ọ dịrị mkpa ka Chineke mee ka ọkpụkpọ òkù Joel onye amụma dịghachi ọhụrụ. (Joel 2:12, 13) Ọbụna mgbe nke ahụ gasịrị, Zefanaịa gbara ndị bi na Juda ume ‘ịchọ Jehova.’ Eze Josaịa bụ nwata mere otú ahụ ná mkpọsa nke ndozigharị ihe iji wepụsịa ikpere arụsị na mmerụ.—Zefanaịa 2:3; 2 Ihe Emere 34:3-7.
N’agbanyeghị mkpirikpi oké ihe omume ndị dị otú ahụ nke nchegharị, ọnọdụ okpukpe nke ndị ahụ na-akawanye njọ. (Jeremaịa 2:13; 44:4, 5) Jeremaịa katọrọ usoro okpukpe nke e ji ihe omume ikpere arụsị metọọ, na-akọwa ya dị ka nke na-enweghị ndozigharị: “Onye Etiopịa, ọ̀ ga-agbanwe akpụkpọ ahụ ya? ma ọ bụ agụ, ọ̀ ga-agbanwe àgwà ya? ọ bụrụ otú a unu onwe unu pụrụ kwa ime ezi ihe, bụ́ ndị e mere ka unu mụta ime ihe ọjọọ.” (Jeremaịa 13:23) N’ihi nke a, Chineke nyere alaeze Juda ntaramahụhụ siri ike. E bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya na 607 T.O.A., e burukwaara ndị lanarịrị laa Babilọn dị ka ndị ohu, ebe ha nọgidere ruo 70 afọ.
Mgbe oge ahụ gasịrị, Chineke gosiri obi ebere. Ọ kpaliri Eze Saịrọs ime ka ndị Israel nwere onwe ha, bụ́ nke ihe fọdụrụnụ n’ime ha laghachiri Jerusalem iwughachi ụlọ nsọ ahụ. Kama iji ihe a dum mụrụ akọ, ha sikwara n’ezi ofufe kpafuo ọzọ, na-eme ka Jehova Chineke kpọghachi òkù ya: “Laghachikwutenụ m, Mụ onwe m ga-alaghachikwutekwa unu.”—Malakaị 3:7.
Ihe Mere E Ji Jụ Israel
Gịnị bụ ọnọdụ okpukpe nke ndị Israel n’oge Jisọs? Ndị ndú okpukpe dị ihu abụọ bụ “ndị ndú kpuru ìsì” ndị na-akụzi “ihe mmadụ nyere n’iwu ka ha bụrụ ozizi ha.” ‘Ha na-ejehie n’ihe Chineke nyere n’iwu n’ihi ozizi e nyere ha n’aka.’ Ndị ahụ sọpụụrụ Chineke “n’egbugbere ọnụ ha,” ma obi ha dị anya n’ebe ọ nọ. (Matiu 15:3, 4, 8, 9, 14) Dị ka otu mba hà gaje ịnata ohere ọzọ iji chegharịa? Ee e. Jisọs sịrị: “A ga-anara unu alaeze Chineke, wee nye mba ọzọ nke na-amị mkpụrụ ya.” Ọ gara n’ihu kwuo, sị: “A na-ahapụrụ unu ụlọ unu,” bụ́ ụlọ nsọ dị na Jerusalem, “ka ọ tọgbọrọ n’efu.” (Matiu 21:43; 23:38) Ndahie ha hibigara nne ókè. Ha jụrụ Jisọs dị ka Mesaịa ma mee ka ọ nwụọ, na-ahọrọ Siza nke Rom bụ́ onye ọchịchị nchịgbu dị ka eze ha.—Matiu 27:25; Jọn 19:15.
Ndị Israel achọghị ịghọta na oge ahụ Jisọs jere ozi ya bụ oge nke ikpe. Nye ndị na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi bi na Jerusalem, Jisọs sịrị: “Ị maghị oge nleta gị.”—Luk 19:44.
Na Pentikọst 33 O.A., Chineke hiwere mba, ma ọ bụ ndị ọhụrụ, ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na-eso ụzọ Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ndị a ga-ahọta site n’ebo na mba nile. (Ọrụ 10:34, 35; 15:14) È nwere olileanya ọ bụla na a ga-emesị dozigharịa usoro okpukpe ndị Juu? Ìgwè ndị agha Rom nyere azịza ya na 70 O.A., na-azachapụ Jerusalem kpam kpam. Chineke ajụwo usoro okpukpe ahụ kpam kpam.—Luk 21:5, 6.
Oké Ndapụ n’Ezi Ofufe nke Krisendọm
Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ mejupụtakwara “mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.” (1 Pita 2:9; Ndị Galetia 6:16) Ma ọbụna ọgbakọ mbụ ahụ nke ndị Kraịst ejigideghị ịdị ọcha okpukpe ya ruo ogologo oge.
Akwụkwọ Nsọ buru amụma oké ndapụ n’ezi ofufe, ma ọ bụ ndapụ n’okwukwe ahụ nke bụ ezie. Ata ihe atụ ndị ahụ nke ilu Jisọs, ya bụ, ndị Kraịst adịgboroja, ga-anwa ịkpagbu ọka ihe atụ ndị ahụ, ma ọ bụ ezi ndị Kraịst, ndị e ji mmụọ Chineke tee mmanụ. Ilu ahụ na-ekpughe na mgbasa nke Iso Ụzọ Kraịst ụgha, nke onye isi ndị iro Chineke, bụ́ Ekwensu, ga-akwalite, na-achọ ịmalite, “mgbe mmadụ na-arahụ ụra.” Nke a weere ọnọdụ mgbe ọnwụ ndị ozi kwesịrị ntụkwasị obi nke Kraịst gasịrị, n’oge iro ụra ime mmụọ nke sochirinụ. (Matiu 13:24-30, 36-43; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:6-8) Dị ka ndị ozi ahụ buru n’amụma, ọtụtụ ndị Kraịst adịgboroja rịbatara n’ìgwè ahụ. (Ọrụ 20:29, 30; 1 Timoti 4:1-3; 2 Timoti 2:16-18; 2 Pita 2:1-3) Jọn bụ onye nke ikpeazụ nwụrụ n’etiti ndị ozi ahụ. N’ihe dị ka n’afọ 98 O.A., o dere na “oge hour ikpeazụ,” akụkụ ikpeazụ nke oge ndị ozi, amaliteworị.—1 Jọn 2:18, 19.
Site n’onye ọchịchị alaeze ukwu Rom bụ́ Constantine ịkwado njikọ nke okpukpe na ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọnọdụ ime mmụọ, ozizi, na omume nke Krisendọm ji ọsọ retọọ. Ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwenyere na “mmeri nke Chọọchị n’ime narị afọ nke anọ” bụ, site n’ụzọ ndị Kraịst si ele ihe anya, “ọdachi.” ‘Krisendọm tụfuru ọ̀tụ̀tụ̀ omume ya dị elu’ ma nakwere ọtụtụ omume na nkà ihe ọmụma site n’aka ndị ọgọ mmụọ, dị ka “ofufe Meri” na ofufe nke “ndị senti,” nakwa echiche nke Atọ n’Ime Otu.
Mgbe mmeri ụgha ya gasịrị, ọnọdụ Krisendọm retọrọ. Iwu ike na nkọwa ozizi dị iche iche site n’aka ndị popu na kansụl dị iche iche, ka a hapụgodi Njụta Okwukwe, Agha Ntụte, na agha “nsọ” ndị ahụ n’etiti ndị Katọlik na Protestant, wepụtara usoro okpukpe nke na-enweghị ndozigharị.
N’akwụkwọ ya bụ́ A World Lit Only by Fire, William Manchester na-ede, sị: “Ndị popu na narị afọ nke iri na ise na iri na isii biri ndụ dị ka ndị ọchịchị alaeze ukwu Rom. Ha bụ ndị ikom kasị baa ọgaranya n’ụwa, ha na ndị kadịnal ha mekwuru onwe ha ka ha baa ọgaranya site n’ire ọkwá dị iche iche ere.” N’oge oké ndapụ n’ezi ofufe ahụ, ìgwè ndị dị nta ma ọ bụ ndị mmadụ n’otu n’otu chọsiri ike ịchọpụtaghachi ezi Iso Ụzọ Kraịst, na-egosipụta àgwà dị iche iche nke ọka ihe atụ ahụ. Ọtụtụ mgbe ha kwụrụ ụgwọ dị elu. Otu akwụkwọ ahụ na-asị: “Mgbe ụfọdụ o yiri ka ezi ndị senti nke Iso Ụzọ Kraịst, ma nke ndị Protestant ma nke ndị Katọlik, aghọwo ndị na-eji ojii nwụrụ n’ihi okwukwe ha ka ire ọkụ na-eripịa ha.” Ndị ọzọ, ndị a na-akpọ Ndị Ndozigharị dị ka Martin Luther na John Calvin, jisiri ike mepụta usoro okpukpe ndị dịgidere adịgide ndị dị iche pụọ na Chọọchị Katọlik ma ka nwekwaa ozizi ndị bụ isi ya. Aka ha dịkwa n’ụzọ miri emi n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
N’ubi ndị Protestant, e nwere mgbalị inwe ihe a na-akpọ ntụteghachi okpukpe. N’ime narị afọ nke 18 na 19, dị ka ihe atụ, mgbalị ndị a rụpụtara ọrụ ozi ala ọzọ kporo ọkụ. Otú ọ dị, dị ka ndị ọzụzụ atụrụ ahụ n’onwe ha kwenyere, taa ọnọdụ ime mmụọ nke ìgwè atụrụ Protestant eyitụghị ihe na-agba ume. Ọkà mmụta okpukpe ndị Protestant bụ́ Oscar Cullmann n’isi nso a kwetara na “n’ime chọọchị ndị ahụ n’onwe ha, e nwere ọgba aghara nke okwukwe.”
A kwalitewokwa ndozigharị na ndozigharị mmegide n’ime Chọọchị Katọlik. Malite na narị afọ nke 11 ruo na 13, n’agbanyeghị mmerụ gbasara ebe nile na oké ọgaranya nke ndị ndú okpukpe, e hiwere ìgwè ndị mọnk ndị gbasochiri nkwa ogbenye anya. Ma ndị nọ n’usoro ịchịisi okpukpe leruru ha anya nke ukwuu, dịkwa ka ndị mmụta na-ekwu, kpagbuokwa ha. Mgbe ahụ ka Ndozigharị Mmegide nke narị afọ nke 16 malitere, bụ́ nke Kansụl nke Trent kwalitere ma bụrụ nke e chere ihu karịsịa n’iguzogide Ndozigharị Ndị Protestant.
Ná nkera nke mbụ nke narị afọ nke 19, n’oge mweghachi okpukpe, Chọọchị Katọlik weere nguzo nke ịbụisi na nke achọghị mgbanwe. Ma, a pụghị ikwu na e mere ndozigharị ihe ndị ọ bụla iji weghachi ezi Iso Ụzọ Kraịst. Kama nke ahụ, ndị a bụ nanị mgbalị dị iche iche iji mesiwanye ịbụisi ndị ndú okpukpe ike ka a na-enwe mgbanwe okpukpe, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na nke usoro ọha mmadụ nke ụwa.
N’isi nso a karị, n’afọ ndị 1960, o yiri ka Chọọchị Katọlik ọ̀ chọrọ ịbanye n’usoro nke oké mgbanwe site na kansụl zuru ụwa ọnụ nke Vatican nke Abụọ. Otú ọ dị, popu e nwere mgbe ahụ kwụsịrị ihe a sịrị na ọ bụ ime ka a dị ọhụrụ nke òtù kansụl n’ike iji gbochie mmụọ nke ndị òtù chọọchị na-achọ mgbanwe. Ọnọdụ nke a, nke ụfọdụ na-akpọ mweghachi nke Wojtyła, ka otu ìgwè ndị Katọlik kọwaworo dị ka “ụdị ọhụrụ nke ọchịchị Constantine.” Dị ka e kwuru n’akwụkwọ ndị Jesuit bụ́ La Civiltà Cattolica, Chọọchị Katọlik, dị ka okpukpe ndị ọzọ, na-eche ihu “ọgba aghara nke ruru ala ma zuo ụwa ọnụ: o ruru ala n’ihi na ọ gụnyere kpọmkwem mkpọrọgwụ nile nke okwukwe na ndụ onye Kraịst; o zuru ụwa ọnụ n’ihi na ọ gụnyere akụkụ nile nke Iso Ụzọ Kraịst.”
Okpukpe nile nke Krisendọm enwebeghị n’ezie usoro nke ndozigharị ihe, ha apụghịkwanụ, ebe ọ bụ na ezi Iso Ụzọ Kraịst bụ nke a ga-eweghachi nanị n’oge “owuwe ihe ubi,” site ná nchịkọta nke ọka ihe atụ ahụ n’ime otu ọgbakọ nke dị ọcha. (Matiu 13:30, 39) Ogologo ndepụta nke mpụ na mmehie ihe e mere n’aha okpukpe, ma hà na-azọrọ ịbụ ndị Kraịst ma ọ bụ na ha adịghị, na-ewelite ajụjụ bụ́, Ezi uche ọ̀ dị n’ịtụ anya ezi ndozigharị ihe site n’aka Krisendọm?
Ndozigharị Ihe Ọ̀ Bụ Ihe A Na-apụghị Ime Eme
Akwụkwọ Mkpughe, ma ọ bụ Apọkalips, na-ekwu banyere oké nwanyị na-akwa iko nke ihe atụ nke nwere aha dị omimi bụ́ “Babilọn Ukwu ahụ.” (Mkpughe 17:1, 5) Ruo ọtụtụ narị afọ ndị na-agụ Bible achọwo ịkọwa ihe omimi nke ihe atụ a. Akụ̀ na ịrụ arụ nke ndị ndú okpukpe sọrọ ọtụtụ ndị oyi. Ụfọdụ chere na Babilọn Ukwu ahụ nọchitere anya usoro ndị isi chọọchị. N’etiti ha e nwere Jan Hus, ụkọchukwu ndị Katọlik bụ́ onye Bohemia, onye a kpọrọ ọkụ ná ndụ na 1415, na Aonio Paleario, onye Itali na-arụ ọrụ maka ọdịmma ụmụ mmadụ, bụ́ onye a kwụwara n’elu ma kpọọ ya ọkụ na 1570. Ha abụọ gbalịrị n’enweghị ihe ịga nke ọma idozigharị Chọọchị Katọlik n’olileanya nke na ọ ga-alaghachi ‘n’ùgwù mbụ ya.’
N’ụzọ dị iche, isi nke 17 na 18 nke Mkpughe na-egosi na Babilọn Ukwu ahụ na-anọchite anya alaeze ụwa nke okpukpe ụgha nile.a ‘Oké nwanyị a na-akwa iko’ ọtụtụ ndị mejupụtara enweghị ndozigharị n’ihi na “mmehie ya nile rapakọọrọ n’otu ruo eluigwe.” N’ezie, na narị afọ nke 20 nke a, ihe dị ka okpukpe nile, ọ bụghị nanị ndị nke Krisendọm, na-ekerịta ibu ọrụ maka agha ndị nọgidere na-awụfu ọbara dị ukwuu na maka ajọ nretọ nke omume nke na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. N’ihi ya, Chineke ekpebiwo mbibi “Babilọn.”—Mkpughe 18:5, 8.
Ugbu a Bụ Oge Isi “n’Ime Ya Pụta”
Mmezu nke amụma ndị dị na Bible na-ekpughe na ụbọchị anyị kwekọrọ ‘n’ọgwụgwụ’ nke ajọ ‘usoro ihe’ nke a. (Matiu 24:3) Onye ọ bụla ji ezi obi chọọ ife Chineke apụghị ịgbaso echiche na nhọrọ ndị nke onwe ya. Ọ ghaghị ‘ịchọ Jehova mgbe a pụrụ ịchọta ya,’ ee, kpọmkwem ugbu a, n’ihi na “mkpagbu ukwu” ahụ Jisọs buru amụma ya dị nso. (Aịsaịa 55:6; Matiu 24:21) Dị ka ọ dịrị n’ọnọdụ ndị Israel, Chineke agaghị agbachi ịrụ arụ nke okpukpe nkịtị nanị n’ihi na ọ na-etu ọnụ ịbụ nke ọkpụtọrọkpụ. Kama ịgbalịsi ike idozi ụgbọ mmiri nke na-aghaghị ikpu, ndị nile chọrọ nnwapụta na nzọpụta Chineke aghaghị irube isi n’iwu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke Mkpughe 18:4 n’egbughị oge: “Ndị nke m, sinụ n’ime [Babilọn Ukwu ahụ] pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.”
Ma ọ̀ bụ “pụta” gawa ebee? Olee ebe ọzọ a ga-achọta nzọpụta? Ọ̀ bụ na e nweghị ihe ize ndụ nke ịchọ nchebe n’ebe na-ezighị ezi? Olee otú a pụrụ isi mata okpukpe nanị ya nwere nkwado Chineke? A pụrụ ịchọta azịza ndị ọ bụ nanị ha ka a pụrụ ịtụkwasị obi n’ime Okwu Chineke. (2 Timoti 3:16, 17) Ndịàmà Jehova na-akpọ gị òkù inyocha Bible n’ụzọ chiri anya karị. Ị ga-enwe ike ịghọta ndị ọ bụ ha ka Chineke họpụtaworo ịbụrụ “aha ya otu ndị,” ndị ọ ga-echebe n’ụbọchị iwe ya na-eru nso.—Ọrụ 15:14; Zefanaịa 2:3; Mkpughe 16:14-16.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji mata Babilọn Ukwu ahụ nke ihe atụ n’ụzọ ziri ezi nke kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ, lee isiakwụkwọ nke 33 ruo 37 nke akwụkwọ Revelation—Its Grand Climax At Hand!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1988.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ọ bụrụ na ụgbọ mmiri okpukpe gị na-ekpu ekpu, chigharịkwuru ụgbọ mmiri nzọpụta nke ezi Iso Ụzọ Kraịst