Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 2/15 p. 13-17
  • Ndị E Chebere Ndụ Gabiga Mkpagbu Ukwu Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị E Chebere Ndụ Gabiga Mkpagbu Ukwu Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Dị Ka Ụbọchị Noa
  • Ụkpụrụ Narị Afọ Mbụ
  • Oké Ìgwè Mmadụ nke Ndị Lanarịrịnụ
  • Ịmụrụ Anya
  • Ụfọdụ ‘Agaghị Anwụ Ma Ọlị’
  • Olileanya E Ji n’Aka
  • À Ga-azọpụta Gị Mgbe Chineke Mere Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịnọ Na Nche Anyị Adịkwuo Ngwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Mmiri Ebibie Otu Ụwa—Ọ̀ Ga-eme Ọzọ?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ì Jikerewo Maka Ụbọchị Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 2/15 p. 13-17

Ndị E Chebere Ndụ Gabiga Mkpagbu Ukwu Ahụ

“Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta, ha sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ.”—MKPUGHE 7:14.

1. Olè ndị ga-anabata ndị a kpọlitere n’ọnwụ ná mbilite n’ọnwụ nke elu ala?

MGBE a kpọlitere ọtụtụ nde mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ ná “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume,” a gaghị eweghachi ha ná ndụ n’elu ala tọgbọ chakoo. (Ọrụ 24:15) Ha ga-eteta n’ime gburugburu ọnọdụ e meziwanyere n’ụzọ mara mma n’anya, ha ga-achọpụtakwa na a kwadebeworo ha ebe obibi, uwe, na ụba nke ihe oriri. Olè ndị ga-akwadebe ihe ndị a dum? N’ụzọ doro anya, a ga-enwe ndị bi n’ụwa ọhụrụ ahụ tupu mbilite n’ọnwụ nke elu ala amalite. Olè ndị ka ha bụ? Bible na-egosi na ha ga-abụ ndị lanarịrị oké mkpagbu ahụ na-abịanụ. N’ime nkụzi nile nke Bible, ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a bụ otu n’ime ndị kasị na-akpali akpali—na a ga-echebe ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ndụ gabiga oké mkpagbu ahụ, ha agaghịkwa anwụ anwụ ma ọlị. A nwapụtara ịbụ eziokwu nke olileanya nke a nke ọma n’Akwụkwọ Nsọ.

Dị Ka Ụbọchị Noa

2, 3. (a) Myirịta ndị dị aṅaa ka e nwetara n’etiti ụbọchị Noa na oge anyị? (b) Gịnị ka nlanarị nke Noa na ezinụlọ ya gabiga Iju Mmiri ahụ na-atụ aka?

2 Na Matiu 24:37-39, Jisọs Kraịst ji ụbọchị Noa tụnyere mgbe ikpeazụ, ebe anyị na-achọta onwe anyị ugbu a. Ọ sịrị: “Dị ka ụbọchị Noa dịrị, otú a ka ọbịbịa Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ na mgbe ahụ nke bu oké iju mmiri ahụ ụzọ na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-alụ nwunye, na-enyekwa n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa batara n’ụgbọ ya, ha amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile; otú a ka ọbịbịa Nwa nke mmadụ ga-adị.”

3 Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ kpochapụrụ ndị nile na-egeghị ntị n’ozi ịdọ aka ná ntị nke Chineke. Otú ọ dị, o kpochapụghị Noa na ezinụlọ ya. Ha “batara n’ụgbọ ya,” dị ka Jisọs kwuru. N’ihi nsọpụrụ Chineke ha, Jehova nyere ha ụzọ mgbapụ. Pita nke Abụọ 2:5, 9 na-atụ aka ná nlanarị nke Noa na ezinụlọ ya mgbe ọ na-asị: “Noa, onye mere ha asatọ, bụ́ onye na-ekwusa ezi omume, ka O [Chineke] chere, mgbe O mere ka iju mmiri bịakwasị ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Onyenwe anyị matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke.” Jisọs ji ụbọchị Noa tụnyere mgbe ikpeazụ iji gosi na ndị mmadụ n’ozuzu ha agaghị aṅa ntị n’ozi ịdọ aka ná ntị nke Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ime nke ahụ ọ na-akwadokwa na Noa na ezinụlọ ya rubeere Jehova Chineke isi, banye n’ụgbọ ahụ, wee lanarị oké Iju Mmiri ahụ. Nlanarị nke Noa na ezinụlọ ya lanarịrị na-atụ aka ná nlanarị nke ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi n’ọgwụgwụ ụwa nke a.

Ụkpụrụ Narị Afọ Mbụ

4. Ná mmezu nke okwu Jisọs, ihe omume ndị dị aṅaa dujere ná mbibi nke Jerusalem na 70 O.A.?

4 Jisọs kwukwara banyere ihe ndị ga-eme ná ngwụsị nke ụwa nke a. Na Matiu 24:21, 22, anyị na-agụ, sị: “Na mgbe ahụ ka mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya a ka adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị. Ọ bụrụkwa na e meghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.” Okwu ndị a nwere mmezu mbụ na narị afọ mbụ nke Oge Anyị. Na 66 O.A., ndị agha Rom gbara obodo Jerusalem gburugburu n’okpuru Cestius Gallus. Usuu ndị agha Rom ruru n’ọnọdụ nke ịkwatu mgbidi ụlọ nsọ ahụ, ọtụtụ ndị Juu dịkwa njikere ịchịli aka elu. Otú ọ dị, na mberede nakwa n’amaghị ihe kpatara ya, Cestius Gallus wezụgara usuu ndị agha ya. N’ịhụ ka ndị Rom laghachiri azụ, ndị Kraịst mere ihe dị n’okwu ndị a nke Jisọs, nke o kwuru ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso. Mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu; ndị nọkwa n’etiti ya, ka ha si n’ime ya wezụga onwe ha; ndị nọkwa n’ala ọzọ, ka ha ghara ịba n’ime ya.” (Luk 21:20, 21) Ndị Juu ghọrọ ndị Kraịst, ndị a họpụtara, mere ngwa ngwa gbahapụ obodo Jerusalem a mara ikpe ma bụrụ ndị e si otú ahụ chebe ndụ pụọ n’ajọ mbibi bịakwasịrị ya mgbe e mesịrị. Na 70 O.A., ndị agha Rom laghachitere n’okpuru Ọchịagha Titus. Ha mara ụlọ ikwuu ha na gburugburu Jerusalem, gbaakwa obodo ahụ gburugburu, ma bibie ya.

5. N’echiche dị aṅaa ka e mere ka mkpagbu bịakwasịrị Jerusalem dị mkpirikpi na 70 O.A.?

5 Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus na-akọ na 1,100,000 ndị Juu nwụrụ, ebe 97,000 lanarịrị ma bụrụ ndị a dọọrọ n’agha laa. Ndị Juu ahụ na-abụghị ndị Kraịst lanarịrịnụ abụghị ma ọlị “ndị a họpụtara” nke amụma Jisọs. N’ịgwa mba Juu ahụ na-enupụ isi okwu, Jisọs ekwuwo, sị: “Lee, a na-ahapụrụ unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu. N’ihi na asị m unu, Unu agaghị ahụ m ọzọ site n’ugbu a ma ọlị, ruo mgbe unu ga-asị, Onye a gọziri agọzi ka Onye ahụ bụ Nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị.” (Matiu 23:38, 39) Ọ dịghị ihe ndekọ ọ bụla e nwere na ndị Juu ahụ, bụ́ ndị ihe ribidoro n’ime Jerusalem, nabatara Jisọs dị ka Mesaịa, ghọọ ndị Kraịst, ma nata ihu ọma Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, e mere ka mkpagbu bịakwasịrị Jerusalem na 70 O.A. dị mkpirikpi. Ngechibido ikpeazụ nke ndị agha Rom adịteghị anya. Nke a nyere ohere ka ụfọdụ ndị Juu lanarị, ya bụrụgodị iji dọrọ ha n’agha gaa n’akụkụ dị iche iche nke Alaeze Ukwu Rom dị ka ndị ohu.

Oké Ìgwè Mmadụ nke Ndị Lanarịrịnụ

6, 7. (a) Obodo ukwu nke okpukpe dị aṅaa ka a ka ga-ebibi, dị ka akụkụ nke mkpagbu na-enweghị atụ dị aṅaa? (b) Gịnị ka Jọn buru n’amụma banyere oké mkpagbu na-abịakwasị ụwa nke a?

6 Ọ bụ ezie na mbibi Jerusalem na 70 O.A. wetara n’ezie “mkpagbu ukwu” n’ahụ obodo okpukpe ahụ, mmezu bụ́ isi nke okwu Jisọs ka gaje imezu emezu. Obodo okpukpe nke ka ukwuu, Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ga-enweta mkpagbu ukwu na-eweta ọnwụ nke mkpagbu na-enweghị atụ n’elu usoro ihe ndị ọzọ nke Setan ga-esochi ozugbo. (Matiu 24:29, 30; Mkpughe 18:21) Ihe dị ka 26 afọ mgbe mbibi Jerusalem gasịrị, Jọn onyeozi, ná Mkpughe 7:9-14, dere banyere mkpagbu ukwu nke a ga-ezu ụwa nile. O gosiri na oké ìgwè mmadụ ga-alanarị ya.

7 Ndị a lanarịrịnụ, ndị a kpọrọ “oké ìgwè mmadụ,” ka e ji otu omume siri ike ha mere mata. Dị ka Mkpughe 7:14 si kwuo, otu n’ime 24 ndị okenye n’eluigwe gwara Jọn sị: “Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta, ha sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ.” Ee, oké ìgwè mmadụ ahụ na-ebuli Jehova elu dị ka isi iyi nke nzọpụta ha. Ha nwere okwukwe n’ọbara Jisọs a wụsịrị ma nwee nguzo ezi omume n’ihu Onye Okike ha na Eze ya a họpụtara ahọpụta, bụ́ Jisọs Kraịst.

8. Mmekọrịta ọma dị aṅaa dị n’etiti “oké ìgwè mmadụ” ahụ na ihe fọdụrụ ahụ nke ụmụnna Jisọs e tere mmanụ?

8 Taa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ ise nke ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ na-adị ndụ n’okpuru idu ndú a na-ahụ anya nke Eze eluigwe ahụ bụ́ Jisọs Kraịst. Ha na-edo onwe ha n’okpuru Kraịst ma na-enwekwa mmekọrịta chiri anya ha na ụmụnna ya e tere mmanụ ka nọ n’elu ala. Banyere mmeso nke oké ìgwè mmadụ ahụ na-emeso ndị a e tere mmanụ, Jisọs sịrị: “N’ezie asị m unu, Ka ọ hà, bụ́ otú unu si mee ya nye otu onye n’ime ụmụnna m ndị a, bụ́ ndị dịkarịsịrị nta, Mụ ka unu mere ya nye.” (Matiu 25:40) N’ihi na ha na-enyere ụmụnna Kraịst e tere mmanụ aka n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị, a na-ekpe ndị nke oké ìgwè mmadụ ahụ ikpe dị ka ndị mere ezi ihe nye Jisọs n’onwe ya. Nke a na-enyere ha aka inwe mmekọrịta a tụkwasịrị obi n’ebe Jisọs Kraịst na Jehova Chineke nọ. Ha enwewo ihe ùgwù nke isonyere ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ n’ịbụ Ndịàmà Chineke na ndị na-aza aha ya.—Aịsaịa 43:10, 11; Joel 2:31, 32.

Ịmụrụ Anya

9, 10. (a) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nọgide na-enwe nguzo anyị nke ezi omume n’ihu Nwa nke mmadụ? (b) Olee otú anyị na-aghaghị isi na-eme omume iji “mụrụ anya”?

9 Oké ìgwè mmadụ ahụ aghaghị ijigidesi nguzo ezi omume ha ike n’ihu Nwa nke mmadụ ahụ n’alaghị azụ, nke na-achọ ịnọgide ná nche ruo kpọmkwem n’ọgwụgwụ. Jisọs kwuru nke a n’ụzọ doro anya mgbe o kwuru, sị: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà: n’ihi na otú a ka ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile. Ma mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka unu wee ka n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime, na iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”—Luk 21:34-36.

10 Iji nwee ihe ịga nke ọma n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ, anyị aghaghị inwe nnwapụta ya, bụ́ nke anyị na-agaghị enwe ma ọ bụrụ na anyị ekwere ka echiche ụwa nke a metụta anyị. Echiche ụwa na-ara ụra, ọ pụkwara ịrabanye mmadụ n’itinyebiga aka ókè n’ihe ụtọ nke anụ ahụ ma ọ bụ bụrụ onye e jiri nsogbu nke ndụ bogbuo obi ya nke na ọ dịkwaghị edebe ọdịmma Alaeze n’ọnọdụ mbụ. (Matiu 6:33) Ụzọ dị otú ahụ na-eme ka mmadụ daa mbà n’ụzọ ime mmụọ ma mee ya ka uche ghara ịdị ya n’ibu ọrụ ya n’ebe Chineke na ndị ọzọ nọ. Ọ pụrụ ịghọ onye na-adịghị ejekwa ozi ma ọ bụ tinye ọnọdụ ya n’ime ọgbakọ n’ihe ize ndụ site n’ime mmehie dị oké njọ, eleghị anya ọbụna na-egosi omume nke enweghị nchegharị. Onye ọ bụla n’ime oké ìgwè mmadụ ahụ aghaghị ilezi onwe ya anya. Ọ ghaghị ido onwe ya iche pụọ n’ụwa nke a na-adịghị asọpụrụ Chineke na omume ya nile.—Jọn 17:16.

11. Itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị aṅaa n’ọrụ ga-enyere anyị aka ịlanarị Amagedọn?

11 Iji mezuo nke ahụ, Jehova enyewo ihe dị anyị mkpa site n’Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na nzukọ ya a na-ahụ anya. Anyị aghaghị iji ndị a mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Ọzọ, anyị aghaghị ịdị na-ekpe ekpere ma na-erubere Chineke isi ma ọ bụrụ na anyị na-atụ anya inweta ihu ọma ya. Otu ihe bụ na anyị aghaghị ịzụlite ịkpọasị siri ike maka ihe ọjọọ. Ọbụ abụ ahụ sịrị: “Mụ na mmadụ efu anọkọghị; mụ na ndị ihu abụọ adịghị abakọkwa. Akpọwo m mkpọkọta ndị na-eme ihe ọjọọ asị, mụ na ndị na-emebi iwu adịghị anọkọkwa. Achịkọtakwala mkpụrụ obi m na ndị mmehie n’otu, achịkọtakwala ndụ m na ndị ọbara n’otu.” (Abụ Ọma 26:4, 5, 9) N’ime ọgbakọ ndị Kraịst, ọ dị ma ndị na-eto eto ma ndị agadi mkpa ịkpa ókè ná mkpakọrịta ha na ndị na-araraghị onwe ha nye Jehova. Iji nweta ihu ọma Chineke, anyị na-agbalịsi ike ịbụ ndị a na-apụghị ịta ụta nakwa ndị na-enweghị ntụpọ site n’ụwa. (Abụ Ọma 26:1-5; Jemes 1:27; 4:4) Otú a, anyị ga-ejide n’aka na Jehova agaghị ekpochapụ anyị na ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ọnwụ n’Amagedọn.

Ụfọdụ ‘Agaghị Anwụ Ma Ọlị’

12, 13. (a) Tupu ya akpọlite Lazarọs n’ọnwụ, gịnị ka Jisọs kwuru nke Mata na-aghọtachaghị? (b) Gịnị ka okwu Jisọs banyere ụfọdụ ‘na-agaghị anwụ anwụ ma ọlị’ na-apụtaghị?

12 Ọ bụ ihe na-akpali akpali ịtụgharị uche maka ịlanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a na ikwe omume nke ịbụ onye na-agaghị anwụ anwụ ma ọlị. Nke a bụ olileanya Jisọs nyere anyị. Kpọmkwem tupu ya akpọlite enyi ya nwụrụ anwụ bụ́ Lazarọs, Jisọs gwara nwanne nwanyị Lazarọs bụ́ Mata, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ: ọzọ, onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na Mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi. Ì kwere nke a?” Mata kwetara ná mbilite n’ọnwụ, ma ọ ghọtaghị ihe nile Jisọs na-ekwu.—Jọn 11:25, 26.

13 Jisọs ebughị n’uche na ndị ozi ya na-ekwesị ntụkwasị obi ga-anọgide na-adị ndụ n’anụ ahụ ma ghara ịnwụ anwụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, o mesịrị gosipụta na ndị na-eso ụzọ ya ga-anwụ. (Jọn 21:16-23) N’ezie ite ha mmanụ site na mmụọ nsọ na Pentikọst 33 O.A. pụtara na ha ga-anwụ iji nata ihe nketa eluigwe ha dị ka ndị eze na ndị nchụàjà. (Mkpughe 20:4, 6) Otú a, ka oge na-aga, ndị Kraịst nke narị afọ mbụ nwụchara. Otú ọ dị, ọ dị ihe mere Jisọs ji kwuo ihe o kwuru. Okwu ya banyere ịdị ndụ n’anwụghị anwụ ma ọlị ga-emezu.

14, 15. (a) Olee otú a ga-esi mezuo okwu Jisọs banyere ụfọdụ ‘na-agaghị anwụ anwụ ma ọlị’? (b) Gịnị bụ ọnọdụ nke ụwa nke a, ma olileanya dị aṅaa ka ndị ezi omume nwere?

14 Otu ihe bụ na ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi agaghị enwe ahụmahụ ọnwụ ebighị ebi ma ọlị. (Mkpughe 20:6) Ọzọ, okwu Jisọs na-atụ aka n’otu oge kpọmkwem n’ọdịnihu mgbe Chineke ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ ma hichapụ mmebi iwu n’elu ala, dị ka o mere n’ụbọchị Noa. Ndị na-ekwesị ntụkwasị obi a chọtara ka ha na-eme uche Chineke n’oge ahụ agaghị anwụ site n’ihe omume ikpe ikpe nke Chineke. Kama nke ahụ, dị ka Noa na ezinụlọ ya, ha ga-enwe ohere ịdị ndụ gabiga mbibi nke ụwa. Olileanya dị otú ahụ siri ike, ebe ọ dabeere n’ozizi Bible ma bụrụ nke ihe atụ dị iche iche na-eme ngosipụta ya. (Tụlee Ndị Hibru 6:19; 2 Pita 2:4-9.) Mmezu nke amụma Bible na-egosi na n’isi nso ụwa nke dị ugbu a nke ihe mejupụtara ya bụ ọha mmadụ ndị ajọ omume gaje ịbịa n’ọgwụgwụ ya ná mbibi. Ọnọdụ dị ugbu a bụ nke a na-apụghị imezighachi, n’ihi na ụwa jọrọ njọ n’ụzọ na-enweghị mmekwata. Ihe Chineke kwuru banyere ụwa nke ụbọchị Noa bụkwa eziokwu banyere ụwa taa. Mmebi iwu jupụtara obi ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, nchepụta echiche ha nile bụkwa nanị ihe ọjọọ mgbe nile.—Jenesis 6:5.

15 Jehova enyewo ụmụ mmadụ ohere nke ịchị ụwa ruo ọtụtụ narị afọ n’enweghị ntinye aka Chineke, ma oge ha afọla nke nta ka ọ gwụ. N’isi nso Jehova ga-ebipụ ndị ajọ omume nile nọ n’ụwa, dị nnọọ ka Bible kwuru. (Abụ Ọma 145:20; Ilu 2:21, 22) Otú ọ dị, ọ gaghị ebibikọta ndị ajọ omume na ndị ezi omume. Chineke emetụbeghị ihe dị otú ahụ! (Tụlee Jenesis 18:22, 23, 26.) N’ihi gịnị ka ọ ga-eji bibie ndi na-agbalịsi ike ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, n’egwu Chineke? Ọ bụ ihe ezi uche dị nnọọ na ya na ndị na-efe Jehova n’ikwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị dị ndụ mgbe mkpagbu ukwu ahụ na-amalite ga-achọta ihu ọma n’anya ya ma bụrụ ndị a na-agaghị ebibi, dị ka a na-ebibighị Noa na ezinụlọ ya mgbe ụwa mmebi iwu nke oge ya bịara ná ngwụsị dị oké njọ. (Jenesis 7:23) Ha ga-enweta nchebe Chineke ma lanarị ọgwụgwụ nke ụwa nke a.

16. Ihe ndị dị aṅaa dị ebube ga-eme n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, na-apụtara ndị lanarịrịnụ gịnị?

16 Gịnị ga-emezi? N’ime ụwa ọhụrụ, ngọzi ndị na-agwọ ọrịa ga-abịara ihe a kpọrọ mmadụ ka a na-etinye uru nke àjà mgbapụta Jisọs n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu. Bible na-ekwu banyere otu ihe atụ bụ́ ‘osimiri ihe atụ nke mmiri nke ndụ, na-enwu dị ka crystal, ka ọ na-esi n’ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ pụta, n’etiti ámá ya. N’akụkụ a na n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ ka osisi nke ndụ dịkwa, na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa: akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.’ (Mkpughe 22:1, 2) N’ụzọ dị ịtụnanya, ‘ime ka ahụ dị ike’ ahụ gụnyere mmeri a ga-emeri ọnwụ sitere n’Adam n’onwe ya! “O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.” (Aịsaịa 25:8) Otú a, ọ dịghị mkpa ka ndị lanarịrị mkpagbu ukwu ahụ baa n’ime ụwa ọhụrụ chee ọnwụ ihu!

Olileanya E Ji n’Aka

17. Ruo ókè ha aṅaa ka olileanya ahụ nke na ụfọdụ ga-alanarị Amagedọn ma ‘ghara ịnwụ anwụ ma ọlị’ bụ ihe e ji n’aka?

17 Ànyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu n’olileanya nke a dị egwu? Kpọmkwem! Jisọs mere ka Mata mara na oge na-abịa mgbe ndị mmadụ ga-adị ndụ n’anwụghị anwụ ma ọlị. (Jọn 11:26) Ọzọ, n’isi nke 7 nke Mkpughe Jisọs nyere Jọn, e kpughere na oké ìgwè mmadụ na-esi n’oké mkpagbu ahụ na-apụta, na-alanarị ya. Ànyị pụrụ ikwere Jisọs Kraịst na ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme banyere Iju Mmiri nke ụbọchị Noa? Ajụjụ ọ bụla adịghi ya! Ọzọ, Bible nwere ihe ndekọ ndị ọzọ nke oge dị iche iche mgbe Chineke chebere ndị ohu ya ndụ gabiga oge ikpe dị iche iche na ọdịda nke mba dị iche iche. À ga-atụ anya ihe ọ bụla dị ala n’aka ya n’ime oge ọgwụgwụ nke a? È nwere ihe ọ bụla na-agaghị ekwe Onye Okike ahụ omume?—Tụlee Matiu 19:26.

18. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume nke Jehova?

18 Site n’ijere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ugbu a, anyị nwere nkwa nke ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ ya. Nye ọtụtụ nde ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ ga-abịa site ná mbilite n’ọnwụ. Ma, n’ụbọchị anyị, ọtụtụ nde ndị Jehova—ee, oké ìgwè mmadụ nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ ma ọ bụ kpaara ókè—ga-enwe ihe ùgwù pụrụ iche nke ịbụ ndị e chebere ndụ gabiga mkpagbu ukwu ahụ. Ha agaghịkwa anwụ anwụ ma ọlị.

Biko Kọwaa

◻ Olee otú ụbọchị Noa si mee ihe atụ nlanarị nke Amagedọn?

◻ Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nọgide na-eguzo mgbe Jisọs bịara imezu ihe Jehova kpere n’ikpe?

◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ọ dịghị ndị lanarịrị Amagedọn mkpa ‘ịnwụ anwụ ma ọlị’?

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndị Kraịst gbanahụrụ mkpagbu Jerusalem

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya